Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Jehova Na-enye Amamihe”
    Ụlọ Nche—1999 | Nọvemba 15
    • Lee ekele anyị pụrụ inwe na ezi amamihe na àgwà ndị ọzọ ha na ya na-agakọ na-echebekwa anyị pụọ n’ụzọ ọjọọ nke ndị ikom na ndị inyom rụrụ arụ! Solomọn na-agbakwụnye na àgwà ndị a gaje “ịnapụta gị n’aka nwanyị [ala ọzọ, “NW”], n’aka nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu ire ụtọ; nke na-ahapụ di o nwere n’agbọghọ, ọgbụgba ndụ nke Chineke ya kwa, o chezọwo ya: n’ihi na ụzọ ịrịdaru ọnwụ ka ụlọ ya bụ, ọ bụkwa ụzọ ịrịdaru n’ebe ndị na-adịghị ndụ nọ ka ụzọ ya nile bụ. Ndị nile ndị na-abakwuru ya, ha adịghị alata, ha adịghị erukwa okporo ụzọ nile nke ndụ.”—Ilu 2:16-19.

      A na-akọwa “nwanyị ala ọzọ,” nwanyị akwụna, dị ka onye na-ahapụ “di o nwere n’agbọghọ.”a (Tụlee Malakaị 2:14.) O chezọọla mmachibido a machibidoro ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye nke bụ́ akụkụ nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ọpụpụ 20:14) Ụzọ ya nile na-eduga n’ọnwụ. Ndị so ya akpakọrịta nwere ike ghara ‘iru okporo ụzọ nile nke ndụ’ ma ọlị, ebe ọ bụ na ka oge na-aga, ha pụrụ iru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha na-enweghịzi ike ịlọghachi, ya bụ ọnwụ, bụ́ nke ha na-apụghị isi na ya lọghachi. Onye nwere nghọta na izuzu na-ama ihe ụrà nile nke omume rụrụ arụ ma jiri amamihe na-ezere ịdaba na ha.

  • “Jehova Na-enye Amamihe”
    Ụlọ Nche—1999 | Nọvemba 15
    • [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a E ji okwu ahụ bụ́ “onye ala ọzọ” mee ihe n’ebe ndị gbakụtara ihe Iwu ahụ kwuru azụ nọ wee si otú ahụ kewapụ onwe ha n’ebe Jehova nọ. N’ihi ya, a na-ezo aka na nwanyị akwụna—ọ bụchaghị onye mba ọzọ—dị ka “nwanyị ala ọzọ.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya