Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 4 p. 5
  • 2 Zere Ihe Ndị Na-agaghị Enyere Gị Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2 Zere Ihe Ndị Na-agaghị Enyere Gị Aka
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 Mara Ike Gị
    Teta!—2016
  • Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Okwu Mmalite
    Teta!—2016
  • Ọ̀ Ga-ekwe Omume Ịkwụsị Àgwà Ọjọọ?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 4 p. 5
Uwe e ji emega ahụ́, kanvas, ihe mmiri, na ihe e ji egere egwú e wepụtara n’abalị

ISIOKWU TETA! A | OTÚ Ị GA-ESI AKWỤSỊ ÀGWÀ RIRILA GỊ AHỤ́

2 Zere Ihe Ndị Na-agaghị Enyere Gị Aka

  • I kpebiri na ị ga na-eri nri na-edozi ahụ́, ma, ị gara na friji hụ aịs krim, ya ana-adọ gị akpịrị.

  • I kpebiri na ị ga-akwụsị ịṅụ sịga, ma, otu enyi gị nọ na-enye gị ya n’agbanyeghị na ọ ma na ị chọghịzi ịṅụ ya.

  • I kwuru na ị ga-emega ahụ́ taa, ma ike adịghị gị ịga were kanvas i ji agba ọsọ maka na ịchọwa ya bụụrụ gị oké ọrụ.

Ị̀ chọpụtara otú ihe atọ a anyị kwupụrụ ugbu a si yie ibe ha? Ihe ndị a chọpụtarala na-egosi na ihe ndị gbara anyị gburugburu na ndị anyị na ha na-anọkarị nwere ike ime ka ịkwụsị àgwà riri anyị ahụ́ dịrị anyị mfe ma ọ bụ siere anyị ike.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—Ilu 22:3.

Amaokwu Baịbụl a na-agwa anyị ka anyị kpachara anya ka anyị nwee ike izere ihe ọ bụla ga-eme ka ịkwụsị àgwà ndị anyị kpebiri ikwụsị siere anyị ike. (2 Timoti 2:22) Anyị kwesịrị ịma ebe anyị ga na-anọ, marakwa ụdị ndị anyị na ha ga na-anọ.

Na-eme ihe ga-eme ka o siere gị ike ịkpa àgwà ọjọọ na ihe ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịna-akpa àgwà ọma

IHE I NWERE IKE IME

  • Na-eme ihe ga-eme ka o siere gị ike ime ihe ọ bụla i kpebiri na ị gaghịzi na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i kpebiri na ị gaghịzi eri nri na-anaghị edozi ahụ́, gbalịa ka ị ghara ịna-ewebata ụdị nri ahụ n’ụlọ gị. Iri ya agaghị adịrị gị mfe n’ihi na ọ dịghị n’ụlọ gị.

  • Na-eme ihe ga-enyere gị aka ka ọ dịrị gị mfe ime ihe ọ bụla i kpebiri na ị ga na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-emega ahụ́ kwa ụtụtụ, gbaa mbọ wepụta ákwà i ji emega ahụ́ tupu gị alakpuo. Ị malitehaala ya, ọ gaghị adị anya ya amara gị ahụ́.

  • Mara ndị gị na ha kwesịrị ịna-akpa. Ọ naghị adị anya anyị akpawa àgwà ka ndị anyị na ha na-akpa. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) N’ihi ya, zere ndị ga-eme ka o siere gị ike ịkwụsị àgwà ndị i kpebiri ịkwụsị. Ndị enyi gị kwesịrị ịbụ ndị ga na-enyere gị aka ka ị na-akpa àgwà ọma.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ ỌZỌ GA-ENYERE GỊ AKA

“Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—Ilu 13:20.

“Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.”—Ilu 21:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya