ISI NKE 37
Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ọrụ na Ego
Ò nwetụla mgbe ị nọ na-echegbu onwe gị gbasara ọrụ ma ọ bụ ego? Ọ naghị adịcha mfe ịna-akpa afọ anyị, na-efekwa Jehova otú anyị kwesịrị isi na-efe ya. Baịbụl gwara anyị ihe ndị nwere ike inyere anyị aka.
1. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ọrụ?
Chineke chọrọ ka ọrụ anyị na-atọ anyị ụtọ. Baịbụl sịrị na “e nweghị ihe dị mma karịa mmadụ . . . ikpori ndụ n’ihi ọrụ ọ na-arụsi ike.” (Ekliziastis 2:24) Jehova na-arụsi ọrụ ike. Ọ bụrụ na anyị ana-arụsi ọrụ ike ka ya, anyị na-eme ihe dị ya mma, obi na-atọkwa anyị ụtọ.
Ọrụ dị mkpa. Mana, anyị ekwesịghị ikwe ka ọ dịrị anyị mkpa karịa ife Jehova. (Jọn 6:27) O kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị ebute ihe ndị gbasara ofufe ya ụzọ, na ya ga na-egboro anyị mkpa anyị.
2. Olee otú dị mma anyị kwesịrị isi na-ele ego anya?
Ọ bụ eziokwu na Baịbụl gwara anyị na ego “na-echebe mmadụ,” ma ọ gwakwara anyị na naanị ego agaghị eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. (Ekliziastis 7:12) Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị ka anyị ghara ịhụ ego n’anya, kama ‘ka ihe ndị dị ugbu a ju anyị afọ.’ (Gụọ Ndị Hibru 13:5.) Ọ bụrụ na ihe anyị nwere eju anyị afọ, anyị agaghị na-eche na anyị enweghị ọtụtụ ihe, ike ụwa agaghịkwa na-agwụ anyị. Anyị agaghị na-eji ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ. (Ilu 22:7) Anyị agaghịkwa abanye ná nsogbu maka na anyị gara gbaa chaa chaa ma ọ bụ na anyị tinyere aka n’azụmahia zụọ taa, baa echi.
3. Olee otú anyị ga-esi na-eji ego anyị eme ihe bara uru?
Jehova bụ Chineke na-emesapụ aka. Anyị na-eme ka ya ma ọ bụrụ na anyị “na-emesapụ aka, na-enyekwa ndị ọzọ ihe.” (1 Timoti 6:18) Anyị na-eji ego anyị eme ihe bara uru ma ọ bụrụ na anyị ejiri ya na-enye aka n’ọgbakọ, jirikwa ya na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, karịchaa ụmụnna anyị. Ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ihe anyị bu n’obi nye onyinye, ọ bụghị otú ihe anyị nyere hà. Anyị si n’ala ala obi anyị na-enye ndị ọzọ ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ, ihe anyị ga-adịkwa Jehova mma.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:35.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta uru anyị ga-erite ma anyị na-ele ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị, ihe anyị nwere ejukwa anyị afọ.
4. Ka otú i si arụ ọrụ gosi na ị na-asọpụrụ Jehova
Otú anyị si arụ ọrụ kwesịrị igosi otú anyị na Jehova dịruru ná mma. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a anyị lere, olee ihe masịrị gị gbasara otú Jason si akpa àgwà n’ebe ọ na-arụ ọrụ?
Olee ihe o mere nyeere ya aka ịna-ele ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị?
Gụọnụ Ndị Kọlọsi 3:23, 24. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere na otú anyị si ele ọrụ anya abụghị obere okwu?
Ọrụ dị mkpa. Mana, anyị ekwesịghị ikwe ka ọ dịrị anyị mkpa karịa ife Jehova
5. Ihe anyị nwere iju anyị afọ na-abara anyị uru
Ego anaghị eju ọtụtụ ndị eju. Ma, Baịbụl gwara anyị ka ọ ghara ịdị anyị otú ahụ. Gụọnụ 1 Timoti 6:6-8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ime?
Anyị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ọtụtụ ihe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere ezinụlọ ndị a ji enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha enweghị ego?
Gịnị ga-eme anyị ma ọ bụrụ na anyị enweela ego ma ka na-achọ ka anyị nwetakwuo? Jizọs mere ihe atụ gosiri ihe nwere ike ime anyị. Gụọnụ Luk 12:15-21. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka ị mụtara n’ihe atụ a Jizọs mere?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 15.
Gụọnụ Ilu 10:22 na 1 Timoti 6:10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ịbụ enyi Jehova na inwe ego, olee nke ka mkpa? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
Olee nsogbu ịchụ ego ọnwụ ọnwụ na-akpata?
6. Jehova ga na-egboro anyị mkpa anyị
Ihe gbasara ọrụ na ego nwere ike ime ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe anyị nwere ike ime ma anyị nwee nsogbu ọrụ ma ọ bụ nsogbu ego. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee nsogbu bịaara nwanna anyị kiriri na vidio a?
Gịnị ka o mere nyeere ya aka idi nsogbu ahụ?
Gụọnụ Matiu 6:25-34. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka Jehova kwere ndị niile na-ebute ofufe ya ụzọ nkwa na ọ ga-emere ha?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike ka ha nwee ike ịna-akpa afọ ezinụlọ ha, n’ihi ya, na ha agaghị na-agali ọmụmụ ihe kwa izu.
Olee amaokwu Baịbụl mere ka obi sie gị ike na ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ ná ndụ gị bụ ihe kacha mma ị ga-eme?
NCHỊKỌTA
Ọrụ na ego dị mkpa. Mana anyị ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị kwụsị ife Jehova.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị ga-enyere gị aka ịna-ele ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị?
Olee uru anyị na-erite ma ihe anyị nwere ju anyị afọ?
Olee otú ị ga-esi gosi na obi siri gị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere ndị ohu ya na ọ ga na-egboro ha mkpa ha?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ma Baịbụl ò kwuru na ego bụ ihe ọjọọ.
“Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Chọpụta otú anyị ga-esi jiri ego anyị mee Chineke obi ụtọ.
“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Ịgba chaa chaa ọ̀ bụ ihe egwuregwu?
Chọpụta ihe mere otu nwoke ịgba chaa chaa riri isi, onye na-ezukwa ohi, ji kwụsị àgwà ọjọọ ọ na-akpa ma gbanwee ndụ ya.
“Ihe Na-amasịkarị M Bụ Ịga Ebe A Na-eji Ịnyịnya Agba Ọsọ” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2011)