Tụkwasị Jehova Obi!
“Tụkwasị Jehova obi gị nile.”—ILU 3:5.
1. Olee otú Ilu 3:5 si nwee mmetụta miri emi n’ahụ otu nwa okorobịa, na-arụpụtakwa ihe dị aṅaa dịtere anya?
ONYE jeworo ozi ala ọzọ ruo ogologo oge dere, sị: “‘TỤKWASỊ ONYENWE ANYỊ OBI GỊ NILE; ADABEREKWALA NÁ NGHỌTA NKE GỊ ONWE GỊ.’ Okwu ndị ahụ sitere na Bible, nke e wuuru ọbọ ma kokwasị n’elu ájá nke ụlọ m na-eleta, dọọrọ uche m. N’ụbọchị ahụ dum m tụgharịrị uche na ha. M̀ pụrụ, ka m jụrụ onwe m, ịtụkwasị Chineke obi m nile?” Onye a gbara 21 afọ mgbe ahụ. N’afọ ndụ nke 90 ma ka na-eje ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka onye okenye na Perth, Australia, ọ pụrụ ileghachi anya ná ndụ jupụtara ná mkpụrụ sitere n’ịtụkwasị Jehova obi ya nile, gụnyere 26 afọ nke oké ndọlị n’imeghe ókèala ndị ọhụrụ maka ndị ozi ala ọzọ na Ceylon (Sri Lanka ugbu a), Burma (Myanmar ugbu a), Malaya, Thailand, India, na Pakistan.a
2. Obi ike dị aṅaa ka Ilu 3:5 kwesịrị iwulite n’ime anyị?
2 “Tụkwasị Jehova obi gị nile”—okwu ndị a nke Ilu 3:5, dị ka e dere ya na Union Igbo Bible, kwesịrị ịkpali anyị nile ịnọgide na-enye Jehova ndụ anyị site n’obi dum, na-enwe obi ike na ọ pụrụ iwusi okwukwe anyị ike, ọbụna ruo n’ókè nke imeri ihe mgbochi ndị yiri oké ugwu. (Matiu 17:20) Ka anyị tụlee ugbu a Ilu 3:5 n’ọnọdụ ihe ndị e kwuru gburugburu ya.
Ntụziaka nke Onye Bụ Nna
3. (a) Agbamume dị aṅaa ka a ga-achọta n’isiakwụkwọ itoolu ndị mbụ nke Ilu? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tinyemie uche n’Ilu 3:1, 2?
3 Isiakwụkwọ itoolu ndị mbụ nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu jupụtara ná ntụziaka nke onye bụ nna, ndụmọdụ amamihe site n’aka Jehova maka mmadụ nile na-ele anya ịbụ ụmụ ya ndị ikom n’eluigwe ma ọ bụ “inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke” n’elu ụwa paradaịs. (Ndị Rom 8:18-21, 23) E nwere n’ebe a ndụmọdụ amamihe nke ndị nne na nna pụrụ iji zụlite ụmụ ndị ikom na ndị inyom. Nke pụrụ iche bụ okwu ndụmọdụ nke Ilu isi 3, nke malitere n’ịdọ aka ná ntị a: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu.” Ka ụbọchị ndị ikpeazụ nke ụwa ọjọọ Setan na-eru ngwụsị ha, ka anyị tinyekwuo uche n’ihe ncheta nile nke Jehova. Ụzọ ahụ pụrụ iyiwo nke dị ogologo, ma nkwa e kwere ndị nile tachiri obi bụ na “ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị”—ndụ ebighị ebi n’usoro ihe ọhụrụ nke Jehova.—Ilu 3:1, 2.
4, 5. (a) Mmekọrịta obi ụtọ dị aṅaa ka a kọwara na Jọn 5:19, 20? (b) Olee otú ndụmọdụ dị na Deuterọnọmi 11:18-21 si dị irè ruo ụbọchị anyị?
4 Mmekọrịta obi ụtọ n’etiti nna na nwa ya nwoke pụrụ ịbụ ihe kasị dị oké ọnụ ahịa. Onye Okike anyị, Jehova Chineke, mere ka ọ dị otú ahụ. Kraịst Jisọs kwuru banyere mmekọrịta chiri anya nke ya onwe ya n’ebe Jehova nọ: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla Ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara Ya na-emekwa otú ahụ. N’ihi na Nna m na-ahụ Ọkpara Ya n’anya, na-egosikwa Ya ihe nile Ya onwe ya na-eme.” (Jọn 5:19, 20) Jehova zubere na mmekọrịta chiri anya dị otú ahụ kwesịrị ịdị n’etiti ya na ezinụlọ ya dum n’elu ụwa, dịkwa ka n’etiti ndị nna bụ mmadụ na ụmụ ha.
5 A gbara ume inwe mmekọrịta ezinụlọ nke ntụkwasị obi n’Israel oge ochie. N’ebe ahụ Jehova dụrụ ndị bụ nna ọdụ, sị: “Unu ga-edokwa okwu ndị a n’obi unu na n’ime mkpụrụ obi unu; unu ga-ekekwa ha n’elu aka unu ka ha bụrụ ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa mkpọnihu n’etiti anya unu. Unu ga-ezi ụmụ unu ha, n’ikwu okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị a-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ. Ị ga-edekwasịkwa ha n’awara ụzọ abụọ nke ụlọ gị, na n’ọnụ ụzọ ama gị nile: ka ụbọchị unu wee baa ụba, ha na ụbọchị ụmụ unu, n’elu ala ahụ nke Jehova ṅụụrụ nna unu ha iyi inye ha, dị ka ụbọchị eluigwe nke dị n’elu ụwa.” (Deuterọnọmi 11:18-21) Okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Onye Okike Ukwu anyị, Jehova Chineke, pụrụ n’ezie ime ka ya na ndị nne na nna na ụmụ ha nwee mmekọrịta chiri anya, nakwa ya na ndị ọzọ nile na-ejere ya ozi n’ọgbakọ ndị Kraịst.—Aịsaịa 30:20, 21.
6. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihu ọma n’ebe Chineke na mmadụ nọ?
6 Okwu ndụmọdụ amamihe nke onye bụ nna maka ndị Chineke, ndị agadi na ndị na-eto eto, gara n’ihu n’amaokwu nke 3 na 4 nke Ilu isi 3: “Ekwela ka ebere na eziokwu hapụ gị: kee ha n’olu gị; dee ha n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi gị: chọtakwa amara na ezi uche n’anya Chineke na mmadụ.” Jehova Chineke n’onwe ya kasị egosipụta ebere na eziokwu. Dị ka Abụ Ọma 25:10 na-asị, “okporo ụzọ nile nke Jehova bụ ebere na eziokwu.” N’iṅomi Jehova, anyị kwesịrị iwere àgwà ndị a na ike nchebe ha dị ka akụ̀, na-eji ha akpọrọ ihe dị ka ọla olu dị oké ọnụ ahịa ma dekwasị ha n’ụzọ na-apụghị ihicha ehicha n’elu obi anyị. Ya mere, anyị pụrụ ikpesi ekpere ike, sị: “Jehova, ka ebere Gị na eziokwu Gị na-echezi m mgbe nile.”—Abụ Ọma 40:11.
Ntụkwasị Obi Na-adịgide Adịgide
7. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo gosi onwe ya ịbụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?
7 Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary kọwara ịtụkwasị obi dị ka “nchekwube e ji n’aka n’ejimara, ikike, ume, ma ọ bụ ime ihe n’eziokwu nke mmadụ ma ọ bụ nke otu ihe.” E kegidesiri ejimara Jehova ike n’ebere ya. Anyị pụkwara inwe obi ike zuru ezu n’ikike ya ime ihe o kwere nkwa ya, n’ihi na aha ya kpọmkwem, bụ́ Jehova, na-akọwa ya dị ka Onye Nzube ukwu. (Ọpụpụ 3:14; 6:2-8) Dị ka Onye Okike, ọ bụ Isi Mmiri nke ume na ike dị ukwuu. (Aịsaịa 40:26, 29) Ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke eziokwu, n’ihi na Chineke ‘apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18) N’ihi ya, a gbara anyị ume inwe ntụkwasị obi zuru ezu na Jehova, Chineke anyị, Isi Iyi ukwu nke eziokwu nile, onye nwere ike ime ihe nile iji chebe ndị na-atụkwasị ya obi na ime ka nzube ukwu ya nile nwee ihe ịga nke ọma dị ebube.—Abụ Ọma 91:1, 2; Aịsaịa 55:8-11.
8, 9. N’ihi gịnị ka inwe ntụkwasị obi ji dị ụkọ n’ụzọ dị mwute n’ụwa, oleekwa otú ndị Jehova si dị iche?
8 N’ụwa retọrọ eretọ nke dị anyị gburugburu, ntụkwasị obi dị ụkọ n’ụzọ dị mwute. Kama ya, anyị na-ahụ anyaukwu na mmekpu n’ebe nile. Ihu akwụkwọ nke mbipụta May 1993 nke magazin bụ́ World Press Review bu ná mkpụrụ akwụkwọ dị okpotokpo ozi bụ́: “NTIWAPỤ NKE MMEKPU—Ego Ruru Unyi n’Ime Ndokwa Ụwa Ọhụrụ. Ndị mmadụ na omume ndị na-akpata mmekpu gbasapụrụ site na Brazil ruo Germany, site United States ruo Argentina, site Spain ruo Peru, site Itali ruo Mexico, site Vatican ruo Russia.” Ebe ọ gbara mkpọrọgwụ n’ịkpọasị, anyaukwu, na atụkwasịghị obi, ihe ahụ a na-akpọ ndokwa ụwa ọhụrụ nke ụmụ mmadụ na-eweta nanị mmụba nke nhụjuanya nye ihe a kpọrọ mmadụ.
9 N’ụzọ dị iche site ná mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ ịbụ “mba ahụ nke Jehova bụ Chineke ya.” Nanị ha pụrụ ikwu n’eziokwu sị, “Na Chineke ka anyị tụkwasịrị obi.” Onye ọ bụla n’ime ha pụrụ iti mkpu n’ọṅụ sị: “N’ime Chineke ka m ga-eto okwu Ya. . . . Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu.”—Abụ Ọma 33:12; 56:4, 11.
10. Gịnị nyeworo ọtụtụ ndị Kraịst na-eto eto ume ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe?
10 N’otu ala dị n’Esia ebe ọtụtụ puku Ndịàmà na-eto eto taworo ahụhụ iti ihe na ịga mkpọrọ, ịtụkwasị Jehova obi enyewo ihe ka ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ike ịtachi obi. N’otu abalị n’ime ụlọ mkpọrọ, otu Onyeàmà na-eto eto nke e mekpọworo ọnụ nke ukwuu n’ụzọ obi ọjọọ chere na ya apụkwaghị idi ya ọzọ. Ma onye ntorobịa ọzọ zooro ezo bịakwute ya n’ọchịchịrị. Ọ takwụnyeere ya ná ntị, sị: “Ike agwụla gị; m gọnahụrụ okwukwe m, eri mgbe ahụ kwa enwebeghị m udo nke uche.” Onye ntorobịa nke mbụ mere ka mkpebi ya dị ọhụrụ iguzosi ike. Anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi zuru ezu na Jehova na ọ ga-enyere anyị aka imeri mgbalị ọ bụla Setan tinyere iji richapụ nguzosi ike anyị n’ezi ihe.—Jeremaịa 7:3-7; 17:1-8; 38:6-13, 15-17.
11. Olee otú e si na-akpali anyị ịtụkwasị Jehova obi?
11 Ihe mbụ e nyere n’iwu na-agụ n’akụkụ ụfọdụ sị: “Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum.” (Mak 12:30) Ka anyị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, eziokwu ndị ahụ dị ebube anyị na-amụta na-abami abami n’ime obi anyị ka e wee kpalie anyị itinye onwe anyị dum n’ije ozi nke Chineke anyị dị ebube, Eze Onyenwe anyị Jehova. Ọ bụ obi nke na-ejubiga ókè n’ekele maka ya—maka ihe nile ọ kụziwooro anyị, mewooro anyị, ọ ka ga-emekwara anyị—ka e ji akpali anyị ịtụkwasị obi ná nzọpụta ya n’enweghị obi abụọ.—Aịsaịa 12:2.
12. N’afọ ndị na-agafenụ, olee otú ọtụtụ ndị Kraịst siworo gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi?
12 A pụrụ ịzụlite ntụkwasị obi nke a n’ime ọtụtụ afọ. Otu Onyeàmà Jehova nke dị umeala n’obi bụ́ onye jeworo ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ihe karịrị 50 afọ n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brooklyn, na-amalite n’April 1927, dere, sị: “Ná ngwụsị nke ọnwa ahụ m natara ego mmachi akpa dị $5.00 nke e tinyere n’envelopu ya na kaadị mara mma e dekwasịrị okwu Bible dị n’Ilu 3:5, 6 . . . E nwere ihe nile mere a ga-eji tụkwasị Jehova obi, n’ihi na n’isi ụlọ ọrụ ahụ m ghọtara ngwa ngwa na Jehova nwere ‘ohu kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche’ nke ji ikwesị ntụkwasị obi na-elekọta ọdịmma nile nke Alaeze n’ebe a n’elu ụwa.—Matiu 24:45-47.”b Obi onye Kraịst a tụkwasịrị, ọ bụghị n’ịhụnanya ego, kama n’inweta “akụ̀ na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe.” N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ puku ndị na-eje ozi n’ụlọ obibi Betel dị iche iche nke Watch Tower Society gburugburu ụwa na-eme otú ahụ n’okpuru otu ụdị nke ịṅụ iyi ịda ogbenye nke iwu kwadoro. Ha na-atụkwasị Jehova obi inye ha ihe ọ bụla dị ha mkpa kwa ụbọchị.—Luk 12:29-31, 33, 34.
Dabere na Jehova
13, 14. (a) Ọ̀ bụ ole ebe nanị ka a pụrụ ịchọta okwu ndụmọdụ tozuru okè? (b) Gịnị ka a na-aghaghị izere iji lanarị mkpagbu?
13 Nna anyị nke eluigwe na-agwa anyị sị: “Adaberekwala nghọta gị.” (Ilu 3:5) Ndị ụwa na-enye ndụmọdụ na ndị ọkà ná mmụta banyere akparamagwa mmadụ apụghị mgbe ọ bụla ịtụ anya iru nso n’amamihe na nghọta nke Jehova na-egosipụta. “Nghọta ya enweghị ọnụ ọgụgụ.” (Abụ Ọma 147:5) Kama ịdabere n’amamihe nke ndị a ma ama n’ụwa ma ọ bụ ná mmetụta uche nke anyị dị nzuzu, ka anyị legara Jehova, Okwu ya, na ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst anya maka okwu ndụmọdụ tozuru okè.—Abụ Ọma 55:22; 1 Ndị Kọrint 2:5.
14 Amamihe mmadụ ma ọ bụ nganga n’ihi ọkwá mmadụ agaghị abara anyị uru ọ bụla n’ụbọchị oké ule nke ji ọsọ na-abịarute. (Aịsaịa 29:14; 1 Ndị Kọrint 2:14) Na Japan n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, otu onye na-azụ atụrụ Chineke bụ́ onye nwere ike ọrụ ma dị mpako họọrọ ịdabere ná nghọta nke ya. N’okpuru nrụgide ọ ghọrọ onye si n’ezi ofufe dapụ, ihe kakwa n’ọnụ ọgụgụ n’ime ìgwè atụrụ ahụ kwụsịkwara ọrụ n’ihi mkpagbu. Otu nwanna nwanyị bụ́ onye Japan bụ́ onye na-anọgidesi ike n’ihe, onye ji obi ike lanarị ajọ mmeso n’ụlọ mkpọrọ ruru unyi, kwuru, sị: “Ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi enweghị ike pụrụ iche ọ bụla ime ihe, ha apụtaghịkwa ìhè. N’ezie anyị nile aghaghị ịtụkwasị Jehova obi anyị dum mgbe nile.”c
15. Àgwà Chineke dị aṅaa dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị gaje ime ihe na-atọ Jehova ụtọ?
15 Ịtụkwasị Jehova obi, kama ịtụkwasị nghọta nke anyị, metụtara ịdị umeala n’obi. Lee ka àgwà nke a si dị ndị nile chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ mkpa! Eenụ, ọbụna Chineke anyị, ọ bụ ezie na ọ bụ Eze Onyenwenụ nke eluigwe na ala nile, na-egosipụta umeala n’obi n’ụzọ o si emeso ihe o kere eke nwere ọgụgụ isi. Anyị pụrụ inwe obi ekele maka nke ahụ. “[Ọ] na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie.” (Abụ Ọma 113:6, 7) Site n’oké ebere ya, ọ na-agbaghara adịghị ike anyị nile ná ndabere nke onyinye kasịnụ o nyere ihe a kpọrọ mmadụ, àjà mgbapụta dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, Kraịst Jisọs. Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele maka obi ebere nke a na-erughịrị anyị!
16. Olee otú ụmụnna ndị ikom pụrụ isi ruo eruo maka ihe ùgwù n’ọgbakọ?
16 Jisọs n’onwe ya na-echetara anyị, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; onye ọ bụla nke ga-ewedakwa onwe ya, a ga-eweli ya elu.” (Matiu 23:12) N’umeala n’obi, ụmụnna e mere baptism kwesịrị ịgbalị iru eru maka ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ma, ndị nlekọta kwesịrị iwere nhọpụta ha, ọ bụghị dị ka ihe na-egosi ọkwá, kama dị ka ohere ịrụ ọrụ, n’ịdị umeala n’obi, n’obi ekele, n’ọchịchọ obi, dị ka Jisọs, onye sịrị: “Nna m na-arụ ọrụ ugbu a, Mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.”—Jọn 5:17; 1 Pita 5:2, 3.
17. Gịnị ka anyị nile kwesịrị ịghọta, na-eduje n’ọrụ dị aṅaa?
17 Ka anyị jiri umeala n’obi na ekpere na-anakwere mgbe nile na ọ dịghị ihe ọzọ anyị bụ e wezụga uzuzu n’anya Jehova. Mgbe ahụ, lee oké ọṅụ anyị ga-enwe na “ebere nke Jehova na-esi na mgbe ebighị ebi wee ruo mgbe ebighị ebi n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya, ezi omume Ya dịkwaara ụmụ ụmụ”! (Abụ Ọma 103:14, 17) Ya mere anyị nile kwesịrị ịbụ ndị mmụta dị uchu nke Okwu Chineke. Oge e tinyere n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ, na ná nzukọ ọgbakọ, kwesịrị iso na hour anyị ndị kasị dị oké ọnụ ahịa kwa izu. N’ụzọ dị otú a anyị na-ewulite “ihe ọmụma nke Onye Nsọ.” Nke ahụ “bụkwa nghọta.”—Ilu 9:10.
“N’ụzọ Gị Nile . . .”
18, 19. Olee otú anyị pụrụ isi tinye Ilu 3:6 n’ọrụ ná ndụ anyị, na-arụpụtakwa ihe dị aṅaa?
18 Iji duru anyị gakwuru Jehova, Chineke nke bụ́ Isi Iyi nke nghọta, Ilu 3:6 kwuziri: “N’ụzọ gị nile mara Ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” Ịmara Jehova metụtara ịnọ ya nso n’ekpere. Ebe ọ sọrọ anyị nọrọ na n’agbanyeghị ọnọdụ pụrụ ibilite, anyị nwere ụzọ na-enweghị ihe mgbochi isi bịakwute ya n’ekpere. Ka anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị kwa ụbọchị, ka anyị na-akwadebe ije ozi ubi, ka anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwusa Alaeze ya, ekpere anyị na-anọgide na-ekpe pụrụ ịbụ na ọ ga-agọzi ọrụ anyị. Otú a, anyị pụrụ inwe ihe ùgwù na ọṅụ ahụ na-enweghị atụ nke ‘iso Chineke na-ejegharị,’ nwee obi ike na ọ ‘ga-emekwa ka okporo ụzọ anyị nile zie ezi,’ dị ka o meere Inọk, Noa, na ndị Israel na-ekwesị ntụkwasị obi, dị ka Joshua na Daniel, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke.—Jenesis 5:22; 6:9; Deuterọnọmi 8:6; Joshua 22:5; Daniel 6:23; leekwa Jemes 4:8, 10.
19 Mgbe anyị na-eme ka Jehova mara ihe ndị anyị na-arịọ, anyị pụrụ inwe obi ike na ‘udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi anyị na echiche uche anyị nche n’ime Kraịst Jisọs.’ (Ndị Filipaị 4:7) Udo nke a nke Chineke, nke a na-egosipụta n’ọnọdụ ihu nke na-aṅụrị ọṅụ, pụrụ ime ka ndị nwe ụlọ anyị na-ezute n’ọrụ nkwusa anyị nụrụ ozi anyị. (Ndị Kọlọsi 4:5, 6) Ọ pụkwara ịgba ndị ndọli na ikpe na-ezighị ezi juru eju n’ụwa nke taa na-eti ihe otiti ume, dị ka ihe ndekọ na-esonụ na-egosi.d
20, 21. (a) N’oge ihe egwu nke ndị Nazi, olee otú ịnọgidesi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova si gbaa ndị ọzọ ume? (b) Mkpebisi ike dị aṅaa ka olu Jehova kwesịrị ịkpali n’ime anyị?
20 Max Liebster, onye Juu site n’ọmụmụ bụ́ onye sitere n’ihe yiri ọrụ ebube lanarị Oké Mgbukpọ ahụ, kọwara njem ya gaa n’ogige mgbukpọ ndị Nazi n’okwu ndị a: “E mechibidoro anyị n’ime ihe e ji ebu ndị mmadụ nke e dozigharịrị ka ọ bụrụ ime ụlọ ngá dị iche iche nke ga-aba mmadụ abụọ. N’ịbụ onye a kwakpuru n’ime otu n’ime ha, m wee chee otu onye mkpọrọ nke anya ya abụọ gosipụtara ịdị jụụ ihu. Ọ nọ ebe ahụ n’ihi nsọpụrụ o nwere maka iwu Chineke, na-ahọrọ ije mkpọrọ, na ọnwụ nke pụrụ ịdapụta, kama ịwụsị ọbara ndị ọzọ. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. A napụwo ya ụmụ ya n’ike, nwunye ya abụwokwa onye e gburu. Ọ na-atụ anya ka e mee ya ihe e mere nwunye ya. Njem ụbọchị iri na anọ ahụ wetara azịza nke ekpere m nile, n’ihi na ọ bụ na njem nke a ka m chọtara olileanya nke ndụ ebighị ebi.”
21 Mgbe a tọhapụsịrị ya site ‘n’olulu ọdụm’ n’Auschwitz, dị ka o si kpọọ ya, e meekwa ya baptism, nwanna nwoke a lụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, onye a tụwokwara mkpọrọ n’onwe ya na onye nna ya taworo ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ dị na Dachau. Mgbe nna ya nọ n’ebe ahụ, ọ nụrụ na e jidewokwa nwunye ya na nwatakịrị ya nwanyị. Ọ kọwara mmeghachi omume ya otú a: “Echegburu m onwe nke ukwuu. Otu ụbọchị mgbe anyị kwụrụ n’ahịrị echere ije saa ahụ, m nụrụ otu olu nke na-ehota ihe dị n’Ilu 3:5, 6 . . . Ọ dara ụda dị ka olu nke si n’eluigwe ada. Ọ bụ nnọọ ihe m chọrọ iji nweghachi nguzozi m.” N’ezie, olu ahụ bụ otu onye ọzọ a tụrụ mkpọrọ nke na-ehota akụkụ akwụkwọ nsọ nke a, ma ihe ahụ mere na-emesi ike ike nke Okwu Chineke pụrụ ịkpa n’ahụ anyị. (Ndị Hibru 4:12) Ka olu Jehova gwa anyị okwu n’ụzọ dị ike site n’isiokwu anyị dịịrị afọ 1994: “Tụkwasị Jehova obi gị nile”!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ịtụkwasị Jehova Obi M Nile,” dị ka Claude S. Goodman si kọọ, Ụlọ Nche (Bekee), December 15, 1973, peji nke 760-765.
b Lee isiokwu bụ́ “Ikpebisi Ike Ito Jehova,” dị ka Harry Peterson si kọọ, Ụlọ Nche (Bekee), July 15, 1968, peji nke 437-440.
c Lee isiokwu bụ́ “Jehova Adịghị Agbakụta Ndị Ozi Ya Azụ,” dị ka Matsue Ishii si kọọ, Ụlọ Nche, May 1, 1988, peji nke 21-25.
d Leekwa Isiokwu bụ́ “Mgbapụta! Igosi Onwe Anyị Ndị Nwere Ekele,” dị ka Max Liebster si kọọ, Ụlọ Nche, April 1, 1979, peji nke 25-29.
Ná Nchịkọta
◻ Ụdị ndụmọdụ dị aṅaa ka e nyere n’Ilu?
◻ Olee otú ịtụkwasị Jehova obi si abara anyị uru?
◻ Gịnị ka anyị ịdabere na Jehova gụnyere?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mara Jehova n’ụzọ anyị nile?
◻ Olee otú Jehova si eme ka ụzọ anyị zie ezi?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ozi ọṅụ nke Alaeze ahụ na-adọrọ mmasị ndị nwere obi eziokwu