Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 19 p. 102-106
  • Ịlụ Ọgụ Ọ̀ Dị Mma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịlụ Ọgụ Ọ̀ Dị Mma?
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kpọrọ Ha “Ụmụ Égbè Eluigwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “Na-agbasi Mgba Ọma nke Okwukwe Ike”
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 19 p. 102-106

ISI NKE 19

Ịlụ Ọgụ Ọ̀ Dị Mma?

Ị̀ MAARA ụmụ okoro ma ọ bụ ụmụ agbọghọ ndị na-agbalị ibuli onwe ha elu, na-egosikwa na ha dị ike?— Ị̀ na-enwe mmasị iso ha nọrọ? Ka ị̀ ga-enwe mmasị karị n’ebe onye nwere obiọma, nke na-achọkwa udo nọ?— Onye Ozizi Ukwu ahụ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, ebe ọ bụ na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’”—Matiu 5:9.

Ma mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ na-eme ihe na-akpasu anyị iwe. Ọ́ bụghị eziokwu?— Ya mere, ọ pụrụ ịdị anyị ka ọ bụ anyị megwara ha. N’otu oge, ihe a mere ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ha na Jizọs na-aga Jeruselem. Ka m kọọrọ gị banyere ya.

Mgbe ha gatetụworo aka, Jizọs zipụrụ mmadụ ole na ole n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha buru ụzọ gaa n’ime otu obodo nta nke ndị Sameria ịga chọta ebe ha ga-anọ zuo ike. Ma, ndị obodo ahụ achọghị ka ha nọrọ ebe ahụ, n’ihi na ndị Sameria na-ekpe okpukpe dị iche. Ha enweghịkwa mmasị n’ebe onye ọ bụla nke na-aga Jeruselem ịga fee ofufe nọ.

[Foto dị na peeji nke 102]

Gịnị ka Jems na Jọn chọrọ ime iji megwara ndị Sameria?

A sị na ọ bụ gị ka e mere ihe a, gịnị ka ị gaara eme? Ị̀ gaara ewe iwe? Ị̀ gaara achọ imegwara ha?— Ọ bụ ihe ndị na-eso ụzọ bụ́ Jems na Jọn chọrọ ime. Ha sịrị Jizọs: “Ị̀ chọrọ ka anyị gwa ọkụ ka o si n’eluigwe daa wee laa ha n’iyi?” Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kpọọ ha Ụmụ Égbè Eluigwe! Ma, Jizọs gwara ha na ọ dịghị mma imeso ndị ọzọ otú ahụ.—Luk 9:51-56; Mak 3:17.

Ọ bụ ezie na ndị mmadụ pụrụ ime anyị ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ. Ụmụaka ndị ọzọ nwere ike ha agaghị achọ ka anyị sonye n’egwuregwu ha. Ha pụrụ ọbụna ịsị anyị: “Anyị achọghị gị ebe a.” Mgbe ụdị ihe a mere, ọ pụrụ iwe anyị iwe, ọ́ bụghị ya? Ọ pụrụ ịdị anyị ka ọ bụ anyị megwara ha. Ma, ànyị kwesịrị imegwara?—

Wetagodị Bible gị. Ka anyị sapeta Ilu isi 24, amaokwu 29. Ebe ahụ na-agụ, sị: “Asịla, Dị ka o siri mee m, otú a ka m ga-eme ya; m ga-enyeghachi onye ahụ dị ka ọrụ ya si dị.”

Olee ihe i chere amaokwu a na-ekwu?— Ọ na-ekwu na anyị ekwesịghị ịgbalị imegwara. Anyị ekwesịghị imeso mmadụ mmeso ọjọọ nanị n’ihi na o mesoro anyị mmeso ọjọọ. Ọ bụrụkwanụ na mmadụ na-achọ gị okwu ka gị na ya wee lụọ ọgụ? Ọ pụrụ ịgbalị ịkpasu gị iwe site n’ịkọ gị ọnụ. Ọ pụrụ ịchị gị ọchị ma kwuo na ị na-atụ ụjọ. Ọ bụrụkwanụ na ọ kpọọ gị onye ụjọ? Gịnị ka i kwesịrị ime? Ì kwesịrị ịga lụwa ọgụ?—

Ọzọkwa, ka anyị lee ihe Bible na-ekwu. Sapeta Matiu isi 5, amaokwu 39. N’ebe ahụ Jizọs na-ekwu, sị: “Eguzogidela onye bụ ajọ mmadụ; kama onye ọ bụla mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịakwara ya nke ọzọ.” Gịnị ka i chere Jizọs bu n’obi? Ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na ọ bụrụ na mmadụ esuo gị ọkpọ n’otu akụkụ n’ihu gị, na i kwesịrị ịhapụ ya ka o suo gị ọkpọ n’akụkụ nke ọzọ?—

Ee e, ọ bụghị ihe Jizọs bu n’obi ma ọlị. Ịma mmadụ ụra dị iche n’isu ya ọkpọ. O yiri ịkwa mmadụ aka ma ọ bụ inu ya aka. Mmadụ pụrụ ịma anyị ụra ka anyị na ya wee lụọ ọgụ. Ọ chọrọ ka anyị wee iwe. Ọ bụrụkwa na anyị ewee iwe kwagwara ya aka ma ọ bụ nugwara ya aka, gịnị ga-eme?— Ma eleghị anya, anyị na ya ga-alụwa ọgụ.

Ma Jizọs achọghị ka ụmụazụ ya na-alụ ọgụ. Ya mere, ọ sịrị na ọ bụrụ na mmadụ amaa anyị ụra, anyị ekwesịghị ịmagwara ya. Anyị ekwesịghị iwe iwe lụwa ọgụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị akaghị onye ahụ malitere ọgụ ahụ mma.

Ọ bụrụ na nsogbu amalite, gịnị ka i chere na ọ bụ ihe kasị mma ime?— Ọ bụ isi ebe ahụ pụọ. Onye ahụ pụrụ ịkwa gị aka ma ọ bụ inu gị aka ugboro ole na ole ọzọ. Ma, ọ ga-akwụsị ebe ahụ ma eleghị anya. Mgbe i si ebe ahụ pụọ, ọ pụtaghị na ị dịghị ike. Ọ pụtara na ị dị ike n’ime ihe ziri ezi.

[Foto dị na peeji nke 104]

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ ime ka anyị na ya lụọ ọgụ?

Ma, oleekwanụ ihe ga-eme ma ị gaa lụwa ọgụ wee merie? Gịnị nwere ike ime?— Onye ahụ i tiri ihe pụrụ ịkpọrọ ndị enyi ya bịaghachi. Ha pụrụ ọbụna iji okpiri ma ọ bụ mma merụọ gị ahụ́. Ị̀ hụlanụ ihe mere Jizọs na-ejighị chọọ ka anyị na-alụ ọgụ?—

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị ahụ ka ndị ọzọ na-alụ ọgụ? Ànyị kwesịrị ịdụnyere otu akụkụ úkwù?— Bible na-agwa anyị ihe ziri ezi ime. Sapeta Ilu isi 26, amaokwu 17. Ọ na-ekwu, sị: “Onye na-ejide nkịta aka ná ntị ka ọ bụ, bụ́ onye na-agabiga, na-ewebiga iwe ókè n’ihi iseokwu na-abụghị nke ya.”

[Foto dị na peeji nke 105]

Olee otú itinye aka n’ọgụ ndị ọzọ na-alụ si yie ịdọgide nkịta aka ná ntị? Ọ pụrụ imerụ gị ahụ́, n’ihi ya, emela ya!

Gịnị ga-eme ma ị dọgide nkịta aka ná ntị? Ọ ga-afụ nkịta ahụ ụfụ, ọ ga-agakwa gị ezé, ọ́ bụghị ya? Ka nkịta ahụ na-agbalịsikwu ike inwere onwe ya, otú ahụ ka ị na-aghaghị ijisikwu ya aka ike ná ntị, otú ahụkwa ka iwe ga-ewekwu nkịta ahụ. Ọ bụrụ na ị hapụ ya, ọ ga-atasi gị arụ ike ma eleghị anya. Ma, ị̀ ga-enwe ike iguzoro ebe ahụ dọgide ya aka ná ntị ruo mgbe ebighị ebi?—

Ọ bụ ụdị nsogbu ahụ ka anyị ga-abanye na ya ma ọ bụrụ na anyị etinye aka n’ọgụ ndị ọzọ na-alụ. O nwere ike anyị amaghị onye malitere ọgụ ahụ ma ọ bụ ihe mere ha ji na-alụ ọgụ. Ọ pụrụ ịbụ na a na-etikasị mmadụ ahụ́, ma, ikekwe o zuru onye nke ọzọ ohi. Ọ bụrụ na anyị enyere ya aka, anyị na-enyere onye ohi aka. Nke ahụ agaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị, ọ̀ ga-abụ?

Ya mere, gịnị ka i kwesịrị ime ma ị hụ ka ndị mmadụ na-alụ ọgụ?— Ọ bụrụ n’ụlọ akwụkwọ, ị pụrụ ịgbara ọsọ gaa gwa onye nkụzi. Ọ bụrụkwa na ọ bụghị n’ụlọ akwụkwọ, ị pụrụ ịga kpọọ nne gị ma ọ bụ nna gị ma ọ bụ onye uwe ojii. Ee, ọbụna mgbe ndị ọzọ chọrọ ịlụ ọgụ, anyị kwesịrị ịdị na-eme udo.

[Foto dị na peeji nke 106]

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-alụ ọgụ?

Ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji zere ịlụ ọgụ. N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosi na anyị dị ike n’ime ihe ziri ezi. Bible na-ekwu na ‘ọ dịghị mkpa ka onye na-eso ụzọ Jizọs na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile ihe n’ụzọ dị nro.’—2 Timoti 2:24.

Ugbu a, ka anyị lee anya na ndụmọdụ ọma ndị ọzọ ga-enyere anyị aka izere ịlụ ọgụ: Ndị Rom 12:17-21 nakwa 1 Pita 3:10, 11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya