-
“Ọrụ Mmadụ Nile”Ụlọ Nche—1997 | Febụwarị 15
-
-
13. (a) Olee otú Eklisiastis 9:4, 5 si enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ịchụso iwu ewu ma ọ bụ ike? (b) Eziokwu dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị iche ihu ma ọ bụrụ na ndụ a bụ nanị nke dịnụ? (Lee nkọwa ala ala peji.)
13 Gịnị ka iwu ewu ma ọ bụ ịbụisi dị otú ahụ na-apụta ka oge na-aga? Ka otu ọgbọ na-aga ọzọ ana-abịa, ndị na-ewu ewu ma ọ bụ ndị nwere ike na-anwụ, e chezọọkwa ha. Nke ahụ bụ eziokwu banyere ndị na-ewu ihe owuwu, ndị egwú na ndị nkà ọzọ, ndị mgbanwe ọha mmadụ, na ndị ọzọ, dị nnọọ ka ọ bụ eziokwu banyere ihe ka ukwuu ná ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ndú ndị agha. Banyere ihe omume ndị ahụ, mmadụ ole n’otu n’otu kpọmkwem ka ị maara biri ndụ n’etiti afọ 1700 na 1800? Solomọn tụlere okwu n’ụzọ ziri ezi, na-asị: “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ. N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . e chezọwo ncheta ha.” (Eklisiastis 9:4, 5) Ọ bụrụkwa na ndụ a agwụla ndụ dịnụ, mgbe ahụ ịchụso iwu ewu ma ọ bụ ike bụ ihe efu n’ezie.a
-
-
“Ọrụ Mmadụ Nile”Ụlọ Nche—1997 | Febụwarị 15
-
-
a N’otu oge Ụlọ Nche (Bekee) kwuru okwu a jupụtara ná nghọta: “Anyị ekwesịghị imefụsị ndụ anyị n’ihe efu . . . Ọ bụrụ na ndụ a agwụla nke dịnụ, ọ dịghị ihe dị mkpa. Ndụ a dị ka bọl a tụliri n’ikuku nke na-ada ngwa ngwa n’ala. Ọ bụ onyinyo na-ala ọsọ ọsọ, okooko osisi na-achanwụ achanwụ, akwụkwọ ahịhịa a ga-egbutu ọ kpọnwụọkwa ngwa ngwa. . . . N’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ebighị ebi oge ndụ anyị bụ mpekere ihe na-erughị ihe ọ bụla. Na mmiri nke oge ọ bụghịdị ntapụ a ga-eji mee ihe ọ bụla. N’ezie [Solomọn] ziri ezi mgbe ọ tụleghachiri ọtụtụ nchegbu na ihe omume ụmụ mmadụ ma kpọọ ha ihe efu. Anyị na-ala ngwa ngwa nke na ọ baghịdị uru na anyị bịara, otu n’ime ọtụtụ ijeri ndị bịara ma laa, nke nanị ole na ole nnọọ na-amara na anyị nọrọ ebe a ma ọlị. Echiche a abụghị nke ịkpata enweghị olileanya ma ọ bụ mgbarụ ihu ma ọ bụ nke obi ilu ma ọ bụ nke na-akụnwụ ahụ. Ọ bụ eziokwu, eziokwu a ga-eche ihu, echiche a na-ahụ anya, ma ọ bụrụ na ndụ a agwụla nke dịnụ.”—August 1, 1957, peji nke 472.
-