N’ihi Gịnị Ka Ndị Ọma Ji Ata Ahụhụ?
AFỌ ahụ bụ 1914, ụwa emikpuwokwa onwe ya n’agha. Na mberede, ọrịa typhus tiwapụrụ n’ogige ebe a na-atụ ndị a dọtara n’agha mkpọrọ nke dị na Serbia. Ma nke ahụ bụ nanị mmalite. Ọrịa ahụ a na-atụ ụjọ gbasara ruo n’ebe ndị nkịtị nọ, kpatakwa ọnwụ nke 150,000 ndị mmadụ n’ime nanị ọnwa isii. N’etiti ọnọdụ ndị dị n’oge agha na mgbanwe ọchịchị weere ọnọdụ na Russia, nde mmadụ anọ nwụrụ n’ọrịa typhus. Ọ pụrụ izi ezi ma i kwubie na ọtụtụ ndị ọma na ndị ha nwụnahụrụ n’ezinụlọ ha so ná ndị nke ahụ dakwasịrị.
Nke a bụ nanị otu ihe atụ nke ọdachi na-adakwasị mmadụ. Gị onwe gị pụrụ ịhụworị ịta ahụhụ nke na-apụta mgbe ndị anyị hụrụ n’anya ghọrọ ndị ọrịa, ihe ọghọm, na otu ụdị ọdachi ma ọ bụ ọzọ dakwasịrị. Eleghị anya, ị na-enwe mwute mgbe onye ezi omume nọ ná mkpagbu ihe mgbu nke ọrịa a na-apụghị ịgwọ agwọ. Ma eleghị anya, ọ na-ewute gị nke ukwuu mgbe onye ọma—ma eleghị anya nwoke nwere ezinụlọ nke na-arụsi ọrụ ike—nwụrụ n’ihe ọghọm. Iru újú nke ndị ọ nwụnahụrụ pụrụ ime ka obi jọọ gị njọ n’ihi ha.
Ọtụtụ na-eche na e kwesịrị iji nnwere onwe pụọ n’ịta ahụhụ kwụghachi onye na-eme ihe ọma ụgwọ. Ọbụna na ụfọdụ na-ewere ịta ahụhụ dị ka ihe àmà nke na-egosi na onye ọ dakwasịrị bụ onye ajọ omume. Nke a bụ ịrụ ụka nke ndị ikom atọ bụ́ ndị dịrị ndụ n’ihe dị ka 3,600 afọ gara aga. Ha bụ ndị ọgbọ nke otu ezigbo nwoke aha ya bụ Job. Ka anyị laghachi n’ụbọchị ha ka anyị na-amalite ịchọ azịza nye ajụjụ ahụ bụ́, N’ihi gịnị ka ndị ọma ji ata ahụhụ?
Ịta Ahụhụ Nile nke Job
Mgbe mmadụ atọ Job chere na ha bụ ndị enyi ya letara ya, ọ na-ata ahụhụ n’ụzọ na-enweghị atụ site n’ihe mgbu na ọrịa. Ụmụ ya iri anwụnahụwo ya, ihe onwunwe ya nile efunahụwokwa ya. Ndị na-akwanyere Job ùgwù na mbụ kpọrọ ya asị. Ọbụna nwunye ya kwụsịrị inye ya nkwado, gbaakwa ya ume ka ọ kọchaa Chineke ma nwụọ.—Job 1:1–2:13; 19:13-19.
Ruo ụbọchị asaa ehihie na abalị, ndị bịara ileta Job nọ na-ekiri ahụhụ ọ na-ata n’ekwughị okwu ọ bụla. Mgbe ahụ otu onye n’ime ha boro ya ebubo maka ime ajọ omume bụ́ nke ha chere na e ji maka ya na-ata ya ahụhụ. “Biko, cheta,” ka nwoke ahụ bụ́ Elifaz kwuru: “Ònye laworo n’iyi, mgbe ya onwe ya bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ? Ma ọ bụ olee ebe e zipụworo [“e kpochapụworo,” New World Translation] ndị ziri ezi? Dị ka m hụworo anya, ndị na-egwu ajọ ihe dị ka ala ubi, ndị na-aghakwa mmegbu dị ka mkpụrụ ọghịgha, ha na-ewe ya dị ka ihe ubi. Site n’iku ume Chineke ka ha na-ala n’iyi, sitekwa n’ifufe nke iwe ya ka a na-eme ka ha gwụsịa.”—Job 4:7-9.
Ya mere, Elifaz rụrụ ụka na Chineke na-ata Job ahụhụ maka mmehie ya. Taakwa, ụfọdụ na-arụ ụka na ọdachi bụ aka ọrụ Chineke ndị a haziri iji taa ndị mmadụ ahụhụ maka ime ajọ omume. Ma Jehova adịghị ata Job ahụhụ maka ime ajọ omume. Anyị maara nke a n’ihi na Chineke mesịrị gwa Elifaz, sị: “Iwe m dị ọkụ megide gị, megidekwa ndị enyi gị abụọ: n’ihi na unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m, dị ka ohu m, bụ́ Job, kwuworo.”—Job 42:7.
Ụta Adịghịrị Chineke
Taa, ọtụtụ nde mmadụ—n’ezie tinyere ọtụtụ ndị ọma—bụ ndị dara ogbenye na ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Ndị ụfọdụ na-enwe obi ilu ma na-ata Chineke ụta maka nhụjuanya ha. Ma ọ bụghị ya ka ụta dịịrị maka ụnwụ nri. N’ezie, ọ bụ ya bụ Onye na-ewepụta ihe oriri maka ihe a kpọrọ mmadụ.—Abụ Ọma 65:9.
Ịchọ ọdịmma onwe onye, anyaukwu, na omume ndị ọzọ nke mmadụ pụrụ igbochi ibugara ndị agụụ na-agụ ihe oriri. Agha so n’ihe ndị na-akpata ụnwụ nri. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Agha pụrụ ịkpata oké ụnwụ ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị ọrụ ugbo ahapụ ọrụ ha ma sonye n’òtù ndị agha. N’ọnọdụ ụfọdụ, onye agha akpacharawo anya mee ka ụnwụ nri dịrị iji kwụwa onye iro ya agụụ ka o wee chịlie aka elu. Onye agha ahụ na-ebibi ihe oriri ndị e chekwara echekwa na ihe ọkụkụ ndị na-eto eto ma na-eguzobe ihe mgbochi iji gbubie ebe onye iro ahụ si enweta ihe oriri. Ihe mgbochi mere ka ihe oriri ndị e zipụrụ ghara irute n’ógbè Biafra n’oge Agha Obodo Nigeria (1967-1970). Nke ahụ kpatara ụnwụ nri, ma eleghị anya, ihe karịkwara otu nde ndị Biafra nwụrụ n’agụụ.”
Karịsịa, ụfọdụ tara Chineke ụta n’ụzọ na-ezighị ezi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ mgbe ọtụtụ ndị ọma tara ahụhụ ma nwụọ. Ma, ụmụ mmadụ na-emebi iwu Chineke site n’ịkpọ ibe ha asị na ibuso ibe ha agha. Mgbe a jụrụ Jisọs Kraịst banyere iwu bụ “nke mbụ n’ihe nile e nyere n’iwu,” ọ zara, sị: “Nke mbụ bụ, Nụrụ, Israel; Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ́ Chineke anyị, Onyenwe anyị [“Jehova, NW] bụ otu: ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum. Nke abụọ bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ọ dịghị ihe ọzọ e nyere n’iwu nke dịkarịrị ndị a.”—Mak 12:28-31.
Mgbe ụmụ mmadụ na-emebi iwu Chineke site n’igbu mmadụ n’ìgwè, ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ ịta ya ụta n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na nhụjuanya esi na nke ahụ pụta? Ọ bụrụ na onye bụ nne ma ọ bụ nna agwa ụmụ ya ka ha ghara ịlụso ibe ha ọgụ, ha wee leghara ezi ndụmọdụ ya anya, ọ̀ bụ ya ka ụta dịịrị ma ọ bụrụ na ha emerụọ ahụ? Ụta adịghịrị onye ahụ bụ nne ma ọ bụ nna dịkwa ka ọ na-adịghịrị Chineke maka nhụjuanya ụmụ mmadụ mgbe ndị mmadụ na-eleghara iwu Chineke anya.
Ọ bụ ezie na nhụjuanya pụrụ isi na ya pụta mgbe e leghaara iwu Jehova anya, Bible adịghị egosi na ọdachi nile bụ aka ọrụ Chineke nke a haziri iji taa ndị ajọ omume ahụhụ. Mgbe nne na nna anyị mbụ mehiere, ha tụfuru ngọzi na nchebe ya pụrụ iche. E wezụga n’oge ndị Chineke tinyere aka iji mezuo nzube nile nke Jehova, ihe meworo ihe a kpọrọ mmadụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị abụwo nke ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ nke a duziri: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11.
Ma Ndị Ọma ma Ndị Ọjọọ Na-ata Ahụhụ
N’ezie, ma ndị ọma ma ndị ọjọọ na-ata ahụhụ n’ihi mmehie na ezughị okè nke e bu pụta ụwa. (Ndị Rom 5:12) Dị ka ihe atụ, ndị ezi omume na ndị ajọ omume n’otu n’otu na-enwe ihe mgbu nke ọrịa. Onye Kraịst ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ Timoti rịara ‘ọrịa ọtụtụ mgbe.’ (1 Timoti 5:23) Mgbe Pọl onyeozi kwuru okwu banyere “ogwu n’anụ ahụ” nke ya, ọ pụrụ ịbụworị na ọ na-ezo aka ná mkpagbu ụfọdụ nke anụ ahụ. (2 Ndị Kọrint 12:7-9) Ọbụna nye ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe, Chineke adịghị ewepụ adịghị ike nile e bu pụta ụwa ma ọ bụ ohere nke ịda ọrịa ugbu a.
Ndị na-atụ egwu Chineke pụkwara ịta ahụhụ n’ihi ime mkpebi na-ezighị ezi ma ọ bụ etinyeghị ndụmọdụ Akwụkwọ nsọ n’ọrụ mgbe ụfọdụ. Iji maa atụ: Onye nupụụrụ Chineke isi ma lụọ onye na-ekweghị ekwe pụrụ inwe nsogbu alụmdi na nwunye ndị ọ pụrụ izereworị. (Deuterọnọmi 7:3, 4; 1 Ndị Kọrint 7:39) Ọ bụrụ na onye Kraịst adịghị eri nri na-edozi ahụ, gharakwa izu ike nke ọma, ọ pụrụ ịrịa ọrịa n’ihi ibibi ahụ ike ya.
Ịta ahụhụ mmetụta uche pụrụ ịpụta ma ọ bụrụ na anyị ekwenyere adịghị ike anyị ma tinye aka n’omume na-ezighị ezi. Ịkwa iko nke Eze Devid na Bat-sheba wetaara ya oké nhụjuanya. (Abụ Ọma 51) Mgbe ọ na-agbalị izochi ajọ omume ahụ, o nwetara oké ihe isi ike. “Mgbe m gbara nkịtị,” ka o kwuru, “ọkpụkpụ m nile kara nka site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị. . . . Ume m gbanwere n’ihe ịkpọ nkụ nke ụgụrụ.” (Abụ Ọma 32:3, 4) Mkpagbu n’ihi ikpe ọmụma ya mere ka Devid taa ahụ dị ka úkwù osisi pụrụ ịtụfu ihe na-enye ya ndụ n’oge ụkọ mmiri ozuzo ma ọ bụ n’oge okpomọkụ nke ụgụrụ. O doro anya na ọ tara ahụhụ n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ. Ma Abụ Ọma 32 na-egosi na ịta ahụhụ dị otú ahụ pụrụ ịkwụsị site na mmadụ iji nchegharị kwupụta mmehie ma nata mgbaghara Chineke.—Ilu 28:13.
Ndị ajọ mmadụ na-atakarị ahụhụ n’ihi ịgbaso ụzọ nke ime otú o si masị ha, ọ bụghị dị ka ịta ahụhụ sitere n’aka Chineke. Herọd Onye Ukwu dara ọrịa n’ihi àgwà ọjọọ. N’ụbọchị ya ndị ikpeazụ, Herọd “nwetara oké mmekpa ahụ,” ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kwuru. “O nwere ọchịchọ jọgburu onwe ya nke ịkọ onwe ya ọkọ, ime afọ ya jupụtara n’ọnyá, akụkụ ahụ o ji bụrụ nwoke na-ere ure ma na-agba ikpuru. Ọ gbalịrị n’efu inweta izu ike pụọ n’ịsụ ude na ntụbo ya site n’ịga na mmiri iyi na-ekpo ọkụ nke dị na Callirrhoe. . . . Ugbu a Herọd na-ata ahụhụ nke ihe mgbu ndị dị oké njọ nke na ọ gbalịrị iji mma magbuo onwe ya, ma nwa nwanne nna ya gbochiri ya.”—Josephus: The Essential Writings, nke Paul L. Maier sụgharịrị ma dezigharịa.
Ịrapara n’iwu Chineke na-eweta nchebe ụfọdụ megide ihe ndị dị ka ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. Ma, n’ihi gịnị ka o ji yie ka ndị ọma na-achọ ihu ọma ya na-enweta ókè dị ukwuu karị nke ịta ahụhụ?
Ihe Mere Ndị Na-atụ Egwu Chineke Ji Ata Ahụhụ
Otu isi ihe mere ndị na-atụ egwu Chineke ji ata ahụhụ bụ na ha bụ ndị ezi omume. E gosipụtara nke a n’ọnọdụ Josef bụ́ nwa nke nna ochie ahụ bụ Jekọb. Ọ bụ ezie na nwunye Pọtifa nọgidere na-agba Josef ume ka o soro ya nwee mmekọahụ, ọ jụrụ, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” (Jenesis 39:9) Nke a dubara n’ịtụ mkpọrọ na-ezighị ezi, Josef takwara ahụhụ n’ihi na ọ bụ onye ziri ezi.
Ma n’ihi gịnị ka Chineke ji ekwe ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi na-ata ahụhụ? Azịza ya dabeere n’otu ihe iseokwu nke mmụọ ozi ahụ na-enupụ isi bụ́ Setan Ekwensu welitere. Ihe iseokwu nke a metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Olee otú anyị si mara? N’ihi na e gosipụtara nke a n’ọnọdụ nke nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job, onye e hotara na mbụ.
N’otu nzukọ nke ụmụ mmụọ ozi Chineke n’eluigwe, Jehova jụrụ Setan, sị: “Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” Nzaghachi Ekwensu na-egosi na e nwere ihe ịma aka banyere ma ụmụ mmadụ hà ga-ejigide nguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova n’okpuru ule. Setan kwuru na Job jeere Chineke ozi n’ihi ihe onwunwe ndị e ji gọzie ya, ọ bụghị site n’ịhụnanya. Mgbe ahụ Setan sịrị: “Biko, setịpụ aka gị, metụ ihe nile [Job] nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta gị azụ n’ihu gị.” Jehova zaghachiri, sị: “Lee, ihe nile o nwere dị n’aka gị; nanị esetịla aka gị metụ ahụ ya!”—Job 1:6-12.
N’agbanyeghị ihe nile Setan pụrụ ime, Job nọgidere n’ụzọ ezi omume ma gosipụta na o jeere Jehova ozi site n’ịhụnanya. N’ezie, Job gwara ndị na-ebo ya ebubo, sị: “Ya bụụrụ m ihe arụ ọ bụrụ na agụọ m unu ná ndị ezi omume: ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m!” (Job 27:5) Ee, ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ezi ihe anọwo na-adị njikere ịta ahụhụ n’ihi ezi omume. (1 Pita 4:14-16) Bible na-akọ banyere ọtụtụ ndị nweworo ịhụnanya na-adịghị ada ada maka Chineke, ndị biworo ndụ ezi omume iji nye ya otuto ma gosipụta na nzọrọ Setan nke na ọ pụrụ ime ka ụmụ mmadụ nile wezụga onwe ha n’ebe Jehova nọ bụ ụgha. Mmadụ ọ bụla nke na-ata ahụhụ n’ihi ijigide nguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke pụrụ inwe obi ụtọ na ọ na-egosipụta na Ekwensu bụ onye ụgha, na-emekwa ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.
Chineke na-enwe mmetụta banyere ịta ahụhụ nke ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru, sị: “Jehova na-akwagide ndị nile na-ada ada, ọ na-ekulikwa ndị nile na-eruda n’ala.” (Abụ Ọma 145:14) Ọ pụrụ ịbụ na ndị raara onwe ha nye Jehova enweghị ume onwe onye zuru ezu iji nagide nhụjuanya nile nke ndụ na mkpagbu ha na-enweta dị ka ndị ya. Ma Chineke na-enye ha ume ma na-akwagide ha, na-enyekwa ha amamihe dị mkpa iji tachie obi n’ọnwụnwa ha nile. (Abụ Ọma 121:1-3; Jemes 1:5, 6) Ọ bụrụ na ndị mkpagbu egbuo ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe, ha nwere olileanya Chineke na-enye nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ọbụna ruo n’ókè ahụ, Chineke pụrụ imegharị mmetụta nile nke ahụhụ ọ bụla ndị ahụ hụrụ ya n’anya na-ata. O wetara ịta ahụhụ Job n’isi njedebe wee gọzie nwoke ahụ ziri ezi n’ụba. Anyị pụkwara inwe obi ike na Jehova agaghị ahapụ ndị ya n’oge anyị a.—Job 42:12-16; Abụ Ọma 94:14.
N’isi Nso—Nhụjuanya Agaghị Adịkwa!
Ya mere, mgbe ahụ, mmadụ nile na-ata ahụhụ n’ihi ezughị okè e bu pụta ụwa na ndụ a na-adị n’ime ajọ usoro ihe a. Ndị na-atụ egwu Chineke pụkwara ịtụ anya nhụjuanya n’ihi ijigide iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova. (2 Timoti 3:12) Ma ha pụrụ ịṅụrị ọṅụ, n’ihi na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-akwụsị anya mmiri nile, ọnwụ, iru újú, ịkwa ákwá, na ihe mgbu. Banyere nke a, Jọn onyeozi dere, sị:
“M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ. M wee hụ obodo nsọ ahụ, bụ́ Jerusalem Ọhụrụ, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, site n’ebe Chineke nọ, e doziwo ya dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọworo ya mma nye di ya. M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:1-5.
N’otu aka ahụ, Pita onyeozi kwupụtara, sị: “Dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Lee aha olileanya mara mma dị nnọọ n’ọdịnihu! Ịdị ndụ na paradaịs elu ala pụrụ ịbụ ihe ùgwù na-enye ọṅụ nke i nwere. (Luk 23:43) Ya mere, ekwela ka nhụjuanya nke oge ugbu a mee ka i nwee obi ilu. Kama nke ahụ, lepụ anya n’ọdịnihu site n’inwe nchekwube. Tụkwasị olileanya gị na obi ike gị n’ụwa ọhụrụ Chineke nke dị ezigbo nso. Na-agbaso ụzọ nke Jehova Chineke na-anabata, ị pụkwara ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa nke nhụjuanya nile na-adịghị na ya.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Collier’s Photographic History of the European War
[Foto dị na peeji nke 4]
Ọ bụ ezie na Job tara ahụhụ, ọ gbasoro ụzọ nke Chineke na-anabata
[Foto dị na peeji nke 7]
Ị pụrụ ịdị ndụ n’ime ụwa nke nhụjuanya nile na-adịghị na ya