Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 8/1 p. 32
  • Amamihe Chineke—Olee Otú E Si Egosipụta Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Amamihe Chineke—Olee Otú E Si Egosipụta Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 8/1 p. 32

Amamihe Chineke—Olee Otú E Si Egosipụta Ya?

“AMAMIHE nke ogbenye ahụ bụ ihe a na-eleda anya, a dịghị anụkwa okwu ya nile.” Eze Solomọn maara ihe ji okwu ndị a mechie akụkọ ya banyere otu nwoke bụ́ ogbenye ma mara ihe, bụ́ onye zọpụtara otu obodo pụọ ná mbibi. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, “mmadụ echetaghị nwoke ahụ bụ́ ogbenye.”—Eklisiastis 9:14-16.

Ụmụ mmadụ na-eledakarị ndị na-enwechaghị ihe anya, ọbụna ma ọ bụrụ na ndị ogbenye a arụwo ọrụ ndị dị mma. Otú a ka ọ dịịrị n’ebe Jisọs nọ. Aịsaịa buru amụma banyere ya, sị: “E ledara ya anya, ọ bụkwa onye mmadụ hara aka; onye nwere ọtụtụ ihe mgbu na onye maara ọrịa nke ọma.” (Aịsaịa 53:3) Ụfọdụ ndị ledara Jisọs anya nanị n’ihi na ọ nọghị n’ọkwá ma ọ bụ bụrụ onye a ma ama dị ka ndị ndú nke oge ya. Ma, o nwere amamihe nke karịrị nnọọ nke mmadụ ọ bụla na-emehie emehie. Ndị nọ n’obodo Jisọs jụrụ ikweta na “Nwa onye ọkà” a gosipụtara amamihe dị otú ahụ ma rụọ ọrụ ndị dị ike otú ahụ. Otú ọ dị, nke ahụ bụ oké ihie ụzọ, n’ihi na ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu na Jisọs “[arụghị] ọtụtụ ọrụ dị ike n’ebe ahụ n’ihi ekweghị ekwe ha.” Lee ihe mfu ọ bụụrụ ndị ahụ!—Matiu 13:54-58.

Ka anyị ghara ihie otu ụzọ ahụ. “A gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile,” ka Jisọs kwuru. A na-amata ndị na-arụ ọrụ Chineke ma na-eme ka e nweta amamihe si n’eluigwe, ọ bụghị site n’ọkwá ha ma ọ bụ ọnọdụ ha nọ na ya n’etiti ọha mmadụ, kama site ná “mkpụrụ ọma” ha na-amịpụta—okwukwe ha na ọrụ ha ndị dabeere na Bible.—Matiu 7:18-20; 11:19.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya