Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/1 p. 10-14
  • Ndị Na-eto Eto Ndị Nwere Obi Ụtọ n’Ozi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-eto Eto Ndị Nwere Obi Ụtọ n’Ozi Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe Nke Gị
  • Nweta Ihe Ọmụma
  • Na-etolite n’Inwe Ekele
  • Na-aga n’Ihu n’Ijere Chineke Ozi
  • Mee Ka Ọ Bụrụ Nzube Gị Ijere Chineke Ozi Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndị Na-eto Eto—Ka Ijere Jehova Ozi Na-agụsikwu Unu Agụụ Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ndị Ntorobịa, Họrọnụ Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • È Kwesịrị Ime Ndị Na-eto Eto Baptizim?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/1 p. 10-14

Ndị Na-eto Eto Ndị Nwere Obi Ụtọ n’Ozi Jehova

“Ọbụna na a na-amata nwata site n’omume ya nile, ma àgwà ya ọ̀ dị ọcha, Ziekwa ezie.”—ILU 20:11, New International Version.

1. Olee ihe ụfọdụ pụrụ iche Bible kwuru banyere Samuel?

NWATA ahụ bụ Samuel pụrụ ịdịworị nanị afọ atọ ruo ise mgbe ọ malitere ‘ije ozi’ n’ụlọ nsọ Jehova dị na Shailo. Otu n’ime ozi ndị ọ na-eje bụ ‘imeghepụ ọnụ ụzọ ụlọ Jehova.’ Bible kọrọ na “Samuel wee na-eto na-aga n’ihu, o wee dị mma, ma n’ebe Jehova nọ, ma n’ebe mmadụ nọ.” Mgbe o tolitere, o mere ka Israel maliteghachi ezi ofufe. O jeere Chineke ozi “ụbọchị nile nke ndụ ya.” Ọbụna mgbe ọ ghọworo “agadi na onye isi awọ,” ọ ka nọkwa na-agba ndị mmadụ ume ‘ịtụ egwu Jehova na ife ya ofufe n’eziokwu.’ Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ga-enwe ike ikwu ihe ọma ndị a banyere gị dị ka Bible kwuru ha banyere Samuel?—1 Samuel 1:24; 2:18, 26; 3:15; 7:2-4, 15; 12:2, 24.

2. Gịnị ka obere ụmụntakịrị na-amụta ná nzukọ dị iche iche nke ndị Jehova taa?

2 Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma ọ bụ na ị na-eje nzukọ ndị Kraịst ha na-enwe, legharịa anya n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe a na-amụ ihe ọmụmụ nke a. Ị na-ahụ ndị nọ n’afọ ndụ nile. Ma eleghị anya e nwere ndị ghọworo ‘ndị agadi na ndị isi awọ.’ E nwekwara ndị mụrụ ụmụ, ndị na-eto eto, ụmụntakịrị, ọbụna ụmụaka ndị e ku n’aka. Ndị ahụ kasị dịrị obere hà amalitewo ịmụta ihe? Ee. Jụọdị ndị ahụ a kpọ bịa nzukọ ndị ahụ mgbe ha dị ntakịrị. Ha ga-agwa gị n’eziokwu na malite n’oge ha dị nnọọ ntakịrị, ha na-amụta ịsọpụrụ Chineke, ịhụ ndị ya n’anya, na ịkwanyere ebe ndị a na-anọ efe ya ùgwù. Ka oge na-agabiga, ụmụntakịrị na-amụta eziokwu ndị dị ebube. Ọtụtụ ndị na-eto eto, mgbe ha tolitesịworo n’ihe ọmụma na nghọta, na-aghọ akụkụ nke ‘ìgwè ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ, ndị agadi ha na ụmụntakịrị’ ndị onye ọbụ abụ ahụ gbara ume ka ha “too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha ya dị elu, nanị ya.”—Abụ Ọma 148:12, 13.

3. Ò si aṅaa bụrụ na ndị na-eto eto ndị maara Bible na-ele ndụ anya n’ụzọ dị iche n’otú ndị na-amaghị ya si ele ya anya?

3 Ọ bụrụ na ị bụ nwata nke ndị mụrụ gị na-akpọ abịa nzukọ ndị dị otú a mgbe nile, ị bụ onye a gọziri agọzi n’ụzọ pụrụ iche. Nsogbu ndị dị n’ụwa na-enye ọtụtụ ndị na-eto eto ndị ọzọ nsogbu. Ụfọdụ pụrụ ịdị na-atụ egwu na ụmụ mmadụ ga-ebibi elu ala. Ị maara na Chineke agaghị ekwe ka nke ahụ mee, na ọ gaghị ekwe ka ụmụ mmadụ nọgide na-emebi ọmarịcha mbara ala nke a. Kama ikwe ka nke ahụ mee, dị ka Bible si kwuo, Chineke ‘gaje imebi ndị ahụ na-emebi ụwa,’ I maara na Bible na-ekwe nkwa na ọdịnihu dị mma n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume Chineke dị nso.—Mkpughe 11:18; Abụ Ọma 37:29; 2 Pita 3:13.

Okwukwe Nke Gị

4. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ịma ụzọ nile nke Chineke na-ebokwasị ndị na-eto eto, oleekwa otú nwata ahụ bụ Samuel si bụrụ ezi ihe nlereanya banyere nke a?

4 Ná mmalite, ụzọ nke okwukwe ndị Kraịst pụrụ ịbụworị nchụso nke ndị mụrụ gị. Ma eleghị anya ị bịara nzukọ ndị Kraịst n’ihi na ha kpọọrọ gị bịa, ọ pụkwara ịbụ na i keere òkè n’ijere Chineke ozi n’ihi na ha mere otú ahụ. Ma, ka oge na-aga, ijere Jehova ozi na irubere ya isi pụrụ ịghọ ihe ọṅụ nke gị. Nne nwata ahụ bụ Samuel malitere ya n’ụzọ ziri ezi, ma ọ ghaghị ime ihe n’onwe ya iji gbasoo ya. Anyị na-agụ, sị: “Ọbụna na a na-amata nwata site n’omume ya nile, ma àgwà ya ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezie,”—Ilu 20:11, NIV.

5. (a) Oké abamuru dị aṅaa ka Bible nwere? (b) Gịnị ka Pọl gwara Timoti banyere ịdị mkpa nke Okwu Chineke e dere ede?

5 Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị ihe Chineke na-achọ n’aka anyị. Ha na-egosi anyị n’ụzọ doro anya otú anyị ga-esi mee ihe na-atọ ya ụtọ, na-enye ihe ọmụma dị ukwuu ndị pụrụ ịrụpụtara anyị ezi ihe. Pọl onyeozi gwara nwa okoro ahụ na-enyere ya aka, bụ́ Timoti, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3: 16, 17.

6. Gịnị ka akwụkwọ Ilu kwuru banyere ịdị mkpa nke ihe ọmụma na amamihe Chineke?

6 Bible na-agwakwa anyị ka anyị ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị wee mara ihe.’ O kwuru ka anyị “zobe ihe nile” Chineke nyere n’iwu, ka anyị ‘kpọọ nghọta òkù,’ ka anyị ‘nọgidekwa na-egwupụta’ nghọta dị ka akụ zoro ezo nke dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụrụ na ị gbasoo ndụmọdụ nke a, mgbe ahụ, “ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.” Anyị na-achọtakwa ndụmọdụ nke a: “Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị: n’ihi na ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị na-edebe ụzọ m nile bụ. Nụrụnụ ịdọ aka ná ntị, wee mara ihe, unu ezekwala ya ndụ. Onye [obi ụtọ, NW] ka mmadụ nke na-ege m ntị bụ . . . N’ihi na onye na-achọta m achọtawo ndụ, ọ ga-enwepụtakwa n’aka Jehova na ihe ya ga-atọ ya ụtọ.” Ì ji Bible kpọrọ ihe ruo otú ahụ, na-etinyekwa mgbalị dị otú ahụ n’ịmụta ihe ndị dị na ya?—Ilu 2:1-5; 8: 32-35.

Nweta Ihe Ọmụma

7. Gịnị bụ ihe ndị kasị mkpa anyị kwesịrị ịmụta?

7 Ụfọdụ ndị na-eto eto maara ihe nile banyere egwuregwu, ma ọ bụ, ha pụrụ ịgwa gị ihe nile metụtara òtù egwú nke kasị na-amasị ha. Ihe ndị a na-adịrị ha mfe ịmụta na icheta n’ihi na ha nwere mmasị na ha. Ma ajụjụ kasị mkpa bụ, Gịnị ka ha maara banyere Chineke? Cheedị nnọọ echiche banyere ihe o meworo. Chineke mere eluigwe na ala, O buru amụma banyere ihe ụmụ mmadụ ga-eme na ihe ga-emenụ ogologo oge tupu ha emee. Ọ bụghị nanị na Bible na-agwa anyị banyere Chineke, kamakwa ọ na-akụziri anyị ụzọ anyị pụrụ isi mee ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ na-egosi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ obi ụtọ ugbu a, na ụzọ anyị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume. Nke ahụ ọ́ dịghị mkpa karị ịmata ndị meriri n’egwuregwu bọọlụ ma ọ bụ ịmụta aha ndị oti egwú ndị ụmụ mmadụ ga-echefu n’oge na-adịghị anya? —Aịsaịa 42:5, 9; 46:9, 10; Emọs 3:7.

8. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Josaịa na Jisọs setịpụrụ?

8 Mgbe nwa okoro ahụ bụ Eze Josaịa gbara 15 afọ, “ọ malitere ịchọ Chineke nke Devid nna ya.” Mgbe Jisọs dị 12 afọ, a hụrụ ya ka ọ “nọdụrụ n’etiti ndị ozizi” n’ụlọ nsọ Jehova, “na-anụ okwu ha, na-ajụkwa ha ajụjụ.”a N’agbanyeghị afọ ndụ ị nọ na ya, ì mewo dị ka Josaịa na Jisọs, n’iwulite ezi mmasị n’ịmụta banyere ihe ndị Chineke meworo na ndị ọ gaje ime n’ọdịnihu?—2 Ihe Emere 34:3; Luk 2:46.

9. (a) Nsogbu dị aṅaa ka ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe? (b) Gịnị pụrụ ime ka ịgụ ihe na ịmụ ihe dịrị mfe karị, ị̀ chọpụtawo na nke a bụ eziokwu n’onwe gị?

9 Otú ọ dị, ị pụrụ ikwu, sị: ‘Ịmụ ihe bụ ọrụ siri ike.’ Ọtụtụ ndị, ma ndị okenye ma ụmụntakịrị agụbeghị ihe dị ukwuu nke ga-eme ka ịgụ ihe bụrụ ihe dị mfe. Ka ị na-agụ ihe karị, otú a ka ịgụ ihe na-abụwanye ihe dị mfe. Ka ị na-amụ ihe karị, otú a ka ịmụta ihe na-adịwanye mfe. Ị na-atụkwasị ihe ọmụma ọhụrụ n’ihe ndị ị mabu ama, na-eme ka ọ dịrị gị mfe karị ịghọta na icheta ha.

10. (a) Olee ụzọ ị pụrụ isi rite uru karị site ná nzukọ ndị Kraịst? (b) Gịnị bụ ahụmahụ nke gị onwe gị n’ihe banyere nke a?

10 Gịnị pụrụ inyere gị aka ịmụtakwu ihe banyere Chineke? Ma eleghị anya ị pụrụ ịdị na-abịachikwu nzukọ ndị Kraịst anya karị. Ị̀ pụrụ ime nkwadebe tupu oge eruo ma kere òkè n’ezie? Dị ka ihe atụ, Ị̀ pụrụ inweta ihe ọmụma dị omimi karị site n’ihe ọmụmụ nke a site n’ịtụle akụkụ Akwụkwọ nsọ ndị a kpọtụrụ uche ma e hotaghị okwu sitere na ha? Ì detuwo otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ abụọ n’akụkụ peji ahụ iji chetara onwe gị ihe akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ tụkwasịrị n’amaokwu ahụ ma ọ bụ n’ihe mmụta ahụ dum? Ì nwere àgwà nke itinye, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a n’azịza gị iji gosi nghọta i nwere maka ọmụmụ ihe ahụ nke sitere n’Akwụkwọ nsọ? Otu onye okenye ọgbakọ nke jechiworo nzukọ anya ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ọ na-esiri m ike ịtụkwasị uche m n’ihe ọmụmụ ọ bụla nke m na-emeghịrị ezi nkwadebe, ma ọ na-abụ ihe ezi obi ụtọ ịgbaso nke m mụzuworo nke ọma.”

11. Olee ụzọ ị pụrụ isi rite uru karị site n’okwu ndị dabeere na Bible, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ji dị oké mkpa?

11 Mgbe ị na-ege ntị n’okwu ndị dabeere na Bible, ị̀ na-edetu ụmụ obere ihe iji nyere gị aka ịtụle otú e si na-ewulite okwu ahụ, ijikwa mee ka uche gị nọgide n’ihe a na-ekwu? Ị̀ na-eji ihe ị na-anụ na-atụnyere ihe ndị ị mabu ama, ka o wee dịrị gị mfe karị ịghọta ya, ka i wee chetakwa ya nke ọma karị? Jisọs kpere ekpere, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ̀ bụ na ihe ọmụma nke na-eduje ná ndụ abụghị ihe ọmụma kasị mma ị pụrụ inweta? Rịba ama ihe Bible kwuru banyere nke a: “N’ihi na Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta: N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.”—Ilu 2:6, 10, 11.

Na-etolite n’Inwe Ekele

12. Gịnị bụ ihe ụfọdụ pụtara ìhè Chineke mewooro anyị?

12 Ànyị nwere ekele n’ezie maka ihe Chineke mewooro anyị? O kere ụwa nke mara mma wee kwadebe ya maka ndụ. O kere ndị nne na nna mbụ anyị, wee si otú a na-eme ka o kwe omume ịmụ anyị. O mere ndokwa ka anyị nwee nkwado nke ezinụlọ na ọgbakọ nke na-ahụ n’anya. (Jenesis 1:27, 28; Jọn 13:35; Ndị Hibru 10:25) O zitere Ọkpara nke ya onwe ya n’elu ala izikwu anyị ihe banyere Ya onwe ya, nakwa iweta ihe mgbapụta nke na-eme ka o kwe omume inweta ndụ ebighị ebi. Ì nwere ekele n’ezie maka onyinye ndị dị otú ahụ dị ebube? Hà na-akpali gị ịnara ọkpụkpọ òkù ya ịbịa mụta ihe banyere ya na ijere ya ozi?—Matiu 20:28; Jọn 1:18; Ndị Rom 5:21.

13. Gịnị mere i ji chee na Chineke nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ n’otu n’otu nọ?

13 Onye Okike nke eluigwe na ala nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Ọ kpọrọ Abraham “enyi m,” ọ gwakwara Moses, sị: “Amawo m gị n’aha.” (Aịsaịa 41:8, NW; Ọpụpụ 33:12) Akwụkwọ Mkpughe na-egosi na Chineke nwere akwụkwọ ihe atụ, ma ọ bụ “akwụkwọ nke ndụ,” bụ́ ebe aha nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi dị “site n’oge ịtọ ntọala ụwa.” Aha gị ọ̀ ga-adị n’ime ya?—Mkpughe 3:5; 17:8; 2 Timoti 2:19.

14. Olee otú ịgbaso ụkpụrụ nile nke Chineke pụrụ isi meziwanye ndụ gị?

14 Ụkpụrụ nile nke Chineke na-arụ ọrụ nke ọma. Ime ihe n’ụzọ nke ya na-ewepụsị ihe isi ike—omume rụrụ arụ, ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ, mmanya iri mmadụ ahụ, ịtụrụ ime ọkwa, ọrịa mmekọahụ, ime ihe ike, igbu ọchụ, na ọtụtụ ajọ ihe ndị ọzọ. Ịgbaso ụzọ ya nile na-enyerekwara gị aka inweta ezi ndị enyi nakwa ibi ndụ nke nwere obi ụtọ karị. Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ka e mee ya? (1 Ndị Kọrint 6: 9-11) Ọbụna onye na-eto eto nke kpebisiworo ike ime ihe n’ụzọ nke Chineke pụrụ inwetakwu ikike iji mee ihe kwesịrị ekwesị. Bible na-asị: “N’ebe onye na-eguzosi ike n’ihe nọ, [Jehova] ga-egosi onwe [ya] onye na-eguzosi ike.” Ọ na-emesikwa anyị obi ike na ọ gaghị “ahapụ ndị ya na-eguzosi ike,” ọ gaghị ‘ahakwa ndị ya aka.’—Abụ Ọma 18:25, NW; 37:28, NW; 94:14; Aịsaịa 40:29-31.

Na-aga n’Ihu n’Ijere Chineke Ozi

15. Ndụmọdụ dị aṅaa nke nsọpụrụ Chineke ka Solomọn nyere ndị na-eto eto?

15 Ihe mgbaru ọsọ gị hà gbanyere mkpọrọgwụ n’ime ụwa ochie nke a nke na-anwụ anwụ ka ọ bụ n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ahụ? Ị̀ na-ege Chineke ntị ka ị na-ege ndị nwere amamihe ụwa ntị, bụ́ ndị na-ekwu ihe megidere ya? Ịtụrụ ndụ, mmụta akwụkwọ dị elu, ma ọ bụ ọrụ ego nke na-ewe oge dị ukwuu ọ̀ nọ n’ọkwá dị elu karịa Chineke na ijere ya ozi? Eze onye amamihe bụ Solomọn dere ihe dum dị n’akwụkwọ Bible bụ Eklisiastis iji gosi ihe kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị. O mechiri okwu ya site n’ịsị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ akabịaghị, na mgbe afọ akabịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ; Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile o nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.—Eklisiastis 12:1, 13.

16. Olee ụzọ ndị na-eto eto pụrụ isi mee ihe iji ruo eru maka ihe ùgwù ndị ọzọ?

16 Ụmụnna ndị Kraịst nile meworo okenye ndị ị maara—ndị okenye ọgbakọ, ndị ọsụ ụzọ, na onye nlekọta sekit na nke distrikti unu—dịcha mgbe ha bụ ụmụntakịrị. Ọ̀ bụ gịnị dujere ná ngọzi ndị ha na-enweta taa? Ha hụrụ Chineke n’anya, chọọkwa ijere ya ozi. Ọtụtụ n’ime ha, mgbe ha na-eto eto, jiri oge mapụtaara ha mee ihe iji nweta ihe ọmụma na ahụmahụ. Ha mụrụ ihe, kerekwa òkè ná nzukọ dị iche iche. Ha keere òkè n’izi ihe, ha gbalịkwara iru eru maka ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ—ọrụ ọsụ ụzọ, ije ozi Betel, ma ọ bụ ọrụ ndị ọzọ ndị na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. Ha abụghị ‘ndị na-eto eto ndị pụrụ iche’; kama ha nwekwara ihe ndị na-amasị onye ọ bụla nakwa ihe ndị na-akpatara ha nchegbu dị ka i nwere. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha tinyere onwe ha n’ọrụ n’ikwekọ na ndụmọdụ ahụ bụ: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka ùnu na-arụrụ [Jehova, NW] ọrụ ọ bụghịkwa mmadụ.”—Ndị Kọlọsi 3:23; tụlee Luk 10:27; 2 Timoti 2:15.

17. Gịnị pụrụ inyere ndị na-eto eto aka inwe ọganihu n’ijere Chineke ozi?

17 Gịnị banyere gị? Ị̀ na-enwe mmasị n’ezie n’ihe ndị metụtara Chineke? Ị̀ na-ahọrọ ndị enyi site n’etiti ndị na-edebe ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ? Ị̀ na-agba ndị ọzọ ume iso gị kere òkè n’ọrụ ndị Kraịst? Ị̀ na-eso ndị metụworo okenye karị, ndị nwekwara ahụmahụ karị na-ejekọ ozi ndị Kraịst iji wee mụta ihe n’ọnụ ha, detụ ọṅụ ha na-enwe ire, nwetakwa agbamume site n’ọrụ ọma ha nile? Otu Onyeàmà na-echeta ụbọchị ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 20 afọ gara aga, mgbe onye metụworo okenye karị ya kpọrọ ya òkù nke mbụ iso jee ozi ubi. Ọ sịrị na nke a kpatara oké mgbanwe ná ndụ ya: “Na nke mbụ ya, ana m eje n’ihi na achọrọ m ije, ọ bụghị nanị n’ihi na ndị mụrụ m kpọ m na-eje.”

18. Gịnị bụ ihe ndị e kwesịrị ichebara echiche tupu mmadụ ewepụta onwe ya maka baptism?

18 Ọ bụrụ na ị na-enwe ọganihu n’ime ihe n’ụzọ nke Chineke, n’oge na-adịghị anya ị pụrụ ịmalite iche echiche banyere ime baptism. Ọ dị mkpa icheta na ime baptism abụghị ememe ntopụta e ji amalite ịghọ onye toworo eto. Ọ dịghị egosi na ị na-eto eto, ọ bụghịkwa ihe ị ga-eme nanị n’ihi na ndị enyi gị emewo otú ahụ. Tupu i kwuo ka e mee gị baptism, i kwesịrị inwe ihe ọmụma bụ isi nke eziokwu ahụ, na-ebikwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke. I kwesịrị inwe ahụmahụ hitụworo nne n’iso ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma ahụ, ghọtakwa na nke a bụ akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe. (Matiu 24:14; 28:19, 20) I kwesịkwara ịmata na mgbe i weresịrị nzọụkwụ ndị Kraịst nke a dị mkpa, na a ga-atụ anya ka i bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nile dị na Bible.b N’ime obi gị, i kwesịrị ịraraworị ndụ gị nye Nna gị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya.—Tụlee Abụ Ọma 40:8, 9.

19. Olee mgbe e kwesịrị ime mmadụ baptism?

19 Baptism bụ ihe ị na-eme mgbe i kpebisiworo ike na n’agbanyeghị ihe merenụ, n’ihe fọdụrụ ná ndụ gị nile, na ị ga na-ejere Chineke ozi. Ọ bụ ngosipụta ihu ọha na ị rarawo onwe gị kpam kpam nye Jehova site na Jisọs Kraịst ime uche Chineke. Otu onye Kraịst bụ okenye ọgbakọ chetara ụbọchị ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ ise gara aga, mgbe ọ ghọtara, sị: “Aghaghị m ime ihe banyere ya!” Michelle, bụ́ Onyeàmà na-eto eto nke mere baptism na Newcastle, England, n’afọ ole na ole gara aga, sịrị: “Mgbe m dị 13 afọ, aghọtara m na ekwesịrị m ịrara ndụ m nye, meekwa baptism; ọ dịghị ihe ọzọ ọ ga-amasị m ime karịa ijere Chineke ozi.”

20. (a) Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka ọtụtụ iri puku ndị na-eto eto setịpụworo? (b) Olee ụzọ e kwesịrị isi lee nzọụkwụ nke a anya?

20 E mewo ọtụtụ iri puku ndị na-eto eto baptism n’oge ndị na-adịbeghị anya. Ha amụwo Okwu Chineke, mụtakwa ụzọ ya nile, mgbe ahụ, site na baptism ime mmiri, ha nwere obi ụtọ isonyere ọtụtụ ndị toworo eto n’ime ngosipụta ihu ọha nke nrara ha raara onwe ha nye Chineke. Ha maara na baptism abụghị njedebe, kama na ọ bụ nanị mmalite nke ụzọ ndụ nke nrara onwe onye nye, bụ́ ndụ nke ha kpebisiri ike ịgbaso n’ozi Jehova ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee isokwu ahụ bụ “Ụmụ Okoro na Agbọghọ Ndị Jere Ozi n’Oge Bible” nke dị na peji 4.

b Nke a apụtaghị na ịsị ‘Emebeghị m baptism’ bụ ihe ngọpụ iji na-eme ihe ọjọọ. Ozugbo anyị matara ihe Chineke chọrọ anyị n’aka, o doro anya na anyị nwere ibu ọrụ nke irubere ya isi.—Jemes 4:17.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka ihe ọmụma nke Okwu Chineke ji dị oké mkpa?

◻ Olee ụzọ ị pụrụ isi rite uru karị site ná nzukọ ndị Kraịst?

◻ Ngọzi dịgasị aṅaa sitere n’aka Chineke kwesịrị ịkpali anyị irubere ya isi?

◻ Olee ụzọ ị pụrụ isi nwee ọganihu n’ije ozi Chineke?

◻ Olee mgbe e kwesịrị ime mmadụ baptism?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya