Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/15 p. 13-18
  • Cheta Onye Okike Ukwu Gị!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Cheta Onye Okike Ukwu Gị!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ihe Nlereanya Ndị Sitere n’Oge Gara Aga
  • Cheta Jehova Ugbu A!
  • Mmetụta nke Ịka Nká
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Na-echeta?
  • Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ị̀ Na-arụzu Ibu Ọrụ Gị Nile N’ebe Chineke Nọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Cheta Onye Okike Ukwu Gị n’Oge Ị Bụ Okorobịa”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/15 p. 13-18

Cheta Onye Okike Ukwu Gị!

“Chetakwa [Onye Okike Ukwu, NW] gị . . . mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị.”—EKLISIASTIS 12:1.

1. Olee otú ndị na-eto eto raara onwe ha nye Chineke kwesịrị isi jiri oge ntorobịa na ume ha mee ihe?

JEHOVA na-enye ndị ohu ya ume ime uche ya. (Aịsaịa 40:28-31) Nke a bụ eziokwu n’agbanyeghị afọ ndụ ha. Ma ndị na-eto eto raara onwe ha nye Chineke kwesịrị ịchọ iji oge ntorobịa na ume ha mee ihe n’ụzọ amamihe karịsịa. Ya mere, ha na-eburu ndụmọdụ nke “Onye mkpọkọta” ahụ, bụ́ Eze Solomọn nke Israel oge ochie n’uche. Ọ gbara ume, sị: “Chetakwa [Onye Okike Ukwu, NW] gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.”—Eklisiastis 1:1; 12:1.

2. Gịnị ka ụmụ nke ndị Kraịst raara onwe ha nye kwesịrị ime?

2 Ọ bụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ Israel ka e bu n’uche na mbụ nye ndụmọdụ Solomọn banyere icheta Onye Okike Ukwu n’oge ntorobịa. A mụnyere ha ná mba a raara nye Jehova. Gịnị banyere ụmụ nke ndị Kraịst raara onwe ha nye taa? N’ezie, ha kwesịrị iburu Onye Okike Ukwu ha n’uche. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ha ga-asọpụrụ ya, ha ga-abakwara onwe ha uru.—Aịsaịa 48:17, 18.

Ezi Ihe Nlereanya Ndị Sitere n’Oge Gara Aga

3. Ihe nlereanya ndị dị aṅaa ka Josef, Samuel, na Devid setịpụrụ?

3 Ọtụtụ ndị na-eto eto e dekọrọ na Bible setịpụrụ ezi ihe nlereanya dị ka ndị chetara Onye Okike Ukwu ha. Site n’oge ọ bụ nwata gaa n’ihu, nwa Jekọb bụ́ Josef chetara Onye Okike ya. Mgbe nwunye Pọtịfa nwara Josef isoro ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ, ọ jụwapụrụ isi ma kwuo, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” (Jenesis 39:9) Onye Livaị bụ́ Samuel chetara Onye Okike ya, ọ bụghị nanị n’oge ọ bụ nwata kama ná ndụ ya nile. (1 Samuel 1:22-28; 2:18; 3:1-5) Nwa okoro bụ́ Devid onye Betlehem bu Onye Okike ya n’uche n’ezie. Ntụkwasị obi o nwere n’ebe Chineke nọ pụtara ìhè mgbe o chere dike ndị Filistia bụ́ Golaịat ihu ma kwuo, sị: “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m: ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Israel, Onye ị taworo ụta. Ụbọchị taa ka Jehova ga-emechibido gị nye n’aka m; m ga-etigbukwa gị, wezụga isi gị n’ahụ gị; . . . ka ụwa nile wee mara na Chineke dịịrị Israel: ya na ka mkpọkọta nke a nile wee mara na ọ bụghị mma agha na ube ka Jehova ji azọpụta: n’ihi na Jehova nwe agha nke a, Ọ ga-enyekwa unu n’aka anyị.” N’oge na-adịghị anya, Gọlaịat nwụrụ, ndị Filistia rikwara mbọ mbọ.—1 Samuel 17:45-51.

4. (a) Gịnị na-egosi na obere nwata nwanyị Israel a dọọrọ n’agha nọ na Siria nakwa Eze Josaịa na-eto eto chetara Onye Okike Ukwu anyị? (b) Olee otú Jisọs dị afọ 12 si gosi na o chetara Onye Okike ya?

4 Onye ntorobịa ọzọ nke chetara Onye Okike Ukwu ya bụ otu nwata nwanyị Israel a dọọrọ n’agha. Ọ gbaara nnọọ nwunye onyeisi usuu ndị agha Siria bụ́ Neaman ezi àmà nke na Neaman gakwuuru onye amụma Chineke, e wee gwọọ ya ọrịa ekpenta ya, ọ ghọọkwa onye na-efe Jehova. (2 Ndị Eze 5:1-19) Eze Josaịa na-eto eto ji obi ike kwalite ofufe dị ọcha nke Jehova. (2 Ndị Eze 22:1–23:25) Ma ihe nlereanya kasị mma banyere onye chetara Onye Okike Ukwu ya mgbe ọ ka dị obere bụ Jisọs onye Nazaret. Tụlee ihe mere mgbe ọ dị afọ 12. Ndị mụrụ ya kpọọrọ ya gaa Jerusalem maka Ememe Ngabiga. Na njem ụla ha, ha chọpụtara na Jisọs esoghị ha; ya mere ha laghachiri azụ ije chọọ ya. N’ụbọchị nke atọ, ha hụrụ ya ka o so ndị ozizi nọ n’ụlọ nsọ ahụ na-ekwurịta banyere ajụjụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. N’ịzaghachi ajụjụ nke nne ya ji nchegbu jụọ, Jisọs jụrụ, sị: “Gịnị mere unu na-achọ m? ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?” (Luk 2:49) Ọ baara Jisọs uru inweta ihe ọmụma ndị bara uru n’ụzọ ime mmụọ n’ụlọ nsọ ahụ, bụ́ ‘ihe nke Nna ya.’ Taa, Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova bụ ebe magburu onwe ya inweta ezi ihe ọmụma banyere Onye Okike Ukwu anyị.

Cheta Jehova Ugbu A!

5. N’okwu nke aka gị, olee otú ị ga-esi kwupụta ihe onye mkpọkọta ahụ kwuru dị ka e si dekọọ ya n’Eklisiastis 12:1?

5 Onye na-efe Jehova site n’obi ya dum na-enwe ọchịchọ ịmalite ijere Ya ozi ngwa ngwa o kwere mee nakwa ijere Chineke ozi n’oge ndụ ya fọdụrụnụ. Otú ọ dị, gịnị bụ atụmanya nke onye ji oge ntorobịa ya mee ihe efu n’ihi echetaghị Onye Okike ya? N’ike mmụọ nsọ Chineke, onye mkpọkọta ahụ na-ekwu, sị: “Chetakwa [Onye Okike Ukwu, NW] gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.”—Eklisiastis 12:1.

6. Olee ihe àmà e nwere na Simeon na Ana bụ́ ndị agadi chetara Onye Okike Ukwu ha?

6 Ọ dịghị onye “ụbọchị ihe ọjọọ” nke nká na-atọ ụtọ. Ma ndị agadi bụ́ ndị bu Chineke n’uche na-enwe ọṅụ. Dị ka ihe atụ, Simeon bụ́ onye merela agadi kuuru nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs n’aka ya n’ụlọ nsọ ma jiri ọṅụ kwupụta, sị: “Onyenwe m, ugbu a ka Ị na-ahapụ ohu Gị ka ọ laa n’udo, dị ka Okwu Gị si dị; n’ihi na anya m ahụwo nzọpụta Gị, nke I doziri n’ihu ndị nile; ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ, na ebube ndị Gị, bụ́ Israel.” (Luk 2:25-32) Ana nke dị afọ 84 chetakwara Onye Okike ya. Ọ na-anọ n’ụlọ nsọ ahụ mgbe nile, ọ nọkwa ya mgbe e ku nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs gaa ebe ahụ. “O wee bịaruo ebe ahụ n’otu oge awa ahụ, wee kelee Chineke, gwakwa ndị nile na-eche mgbapụta nke Jerusalem okwu banyere Ya.”—Luk 2:36-38.

7. Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị meworo agadi n’ozi Chineke?

7 Ndịàmà Jehova nke oge a bụ́ ndị kaworo nká n’ozi Chineke pụrụ inwe ahụ mgbu na erughị eru ndị ịka nká na-eweta. Ma, lee obi ụtọ ha na-enwe, leekwa ekele anyị na-enwe banyere ozi ikwesị ntụkwasị obi ha! Ha nwere “ọṅụ Jehova,” n’ihi na ha maara na o wegharawo ike ya bụ́ ọkaaka n’ebe ụwa a dị, o chiwokwa Jisọs Kraịst echichi dị ka Eze eluigwe dị ike. (Nehemaịa 8:10) Ugbu a bụ oge mgbe ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ga-aṅa ntị na ndụmọdụ ahụ bụ́: “Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị: ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya: ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.”—Abụ Ọma 148:12, 13.

8, 9. (a) Ole ndị ka “ụbọchị ihe ọjọọ” na-adịghị ewetara afọ ojuju, gịnịkwa mere o ji dị otú ahụ? (b) Olee otú ị ga-esi kọwaa Eklisiastis 12:2?

8 “Ụbọchị ihe ọjọọ” nke nká bụ nke na-adịghị eweta afọ ojuju—ikekwe na-egbu oké mgbu—nye ndị ahụ na-adịghị echebara Onye Okike Ukwu ha echiche, ndị na-enweghịkwa nghọta banyere nzube ya ndị dị ebube. Ha enweghị nghọta ime mmụọ bụ́ nke pụrụ iguzogide ule nile nke nká na ahụhụ nke bịakwasịworo ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe a chụpụrụ Setan n’eluigwe. (Mkpughe 12:7-12) N’ihi ya, onye mkpọkọta ahụ na-agba anyị ume icheta Onye Okike anyị “mgbe anyanwụ na ìhè na ọnwa na kpakpando nile aka-agbachighị, igwe ojii wee lata mgbe oké mmiri zosịrị.” (Eklisiastis 12:2) Gịnị ka okwu ndị a pụtara?

9 Solomọn ji oge ntorobịa tụnyere oge okpomọkụ nke Palestine bụ́ mgbe anyanwụ, ọnwa, na kpakpando na-esite na mbara igwe na-acha gbaa na-enye ìhè ha. Mgbe ahụ, a na-ahụ ụzọ nke ọma. Otú ọ dị, n’oge nká, ụbọchị mmadụ na-adị ka udu mmiri nke oge oyi, na-enwe oké mmiri ozuzo nke nsogbu kwuru nsogbu. (Job 14:1) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe dị mwute ịma banyere Onye Okike ma hapụ ijere ya ozi n’oge okpomọkụ nke ndụ! N’oge oyi nke ndụ bụ́ nká, ihe na-agba ọchịchịrị, karịsịa nye ndị hapụworo iji ohere ndị ha nwere jeere Jehova ozi n’oge ntorobịa ha n’ihi itinye onwe ha n’ịchụso ihe efu. Otú ọ dị, n’agbanyeghị afọ ndụ anyị, ka anyị ‘sozuo Jehova n’azụ,’ dị ka Keleb kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ enyi na-eguzosi ike n’ihe nke onye amụma bụ́ Mosis, mere.—Joshua 14:6-9.

Mmetụta nke Ịka Nká

10. Gịnị ka ihe ndị a na-anọchi anya ha (a) “ndị na-edebe ụlọ”? (b) “ndị bụ́ dimkpa”?

10 Solomọn rụtụziri aka n’ihe isi ike “n’ụbọchị ahụ mgbe ndị na-edebe ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị bụ́ dimkpa ga-ehulata onwe ha, mgbe ndị inyom nke na-egwe nri ga-akwụsị n’ihi na ha dị ole na ole, mgbe a ga-eme ka anya gbachie ndị inyom na-esi na windo elepụ anya.” (Eklisiastis 12:3) “Ụlọ” ahụ na-anọchi anya ahụ mmadụ. (Matiu 12:43-45; 2 Ndị Kọrint 5:1-8) “Ndị na-edebe” ya bụ ogwe aka na aka, bụ́ ndị na-echebe ahụ mmadụ ma na-enye ihe ndị dị ya mkpa. N’oge nká, ha na-amakarị jijiji n’ihi esighị ike, ahụ erughị ala, na ọrịa ahụ ịma jijiji. “Ndị bụ́ dimkpa”—ụkwụ—abụghịzi ogidi kwụ chịm kama ha esikwaghị ike ma rọọ arọọ nke na nanị ihe ọbọ ụkwụ na-eme bụ ichiri n’ala na-aga. Ma, ị́ dịghị enwe obi ụtọ ịhụ ndị agadi kwere ekwe ibe gị ná nzukọ ndị Kraịst?

11. N’ụzọ ihe atụ, olee ndị bụ “ndị inyom nke na-egwe nri” na “ndị inyom na-esi na windo elepụ anya”?

11 “Ndị inyom nke na-egwe nri ga-akwụsị n’ihi na ha dị ole na ole”—ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ezé pụrụ iretọwo ma ọ bụ dapụsịa, na-afọdụ nanị ole na ole ma ọ bụrụdị na e nwere nke fọdụrụ. Ịtari nri siri ike na-ara ahụ ma ọ bụ gharadị ikwe mee ma ọlị. “Ndị inyom na-esi na windo elepụ anya”—anya na ikike uche anyị ji ahụ ụzọ—na-ahụzi inyoghi inyoghi, ma ọ bụrụ na ọ gbachichaghị.

12. (a) Olee otú o si bụrụ na “a ga-emechi ụzọ n’ámá”? (b) Gịnị ka ị na-eche banyere ndị agadi bụ́ ndị nkwusa Alaeze?

12 “Mgbe,” ka onye mkpọkọta ahụ gara n’ihu ikwu, “a ga-emechi ụzọ n’ámá; mgbe olu ogwugwe nri ga-ala ala, mgbe mmadụ ga-ebili n’ụra n’olu nnụnụ, mgbe ndị inyom nile nke na-abụ abụ ga-adị ala ala.” (Eklisiastis 12:4) Ọnụ ụzọ abụọ nke ọnụ—egbugbere ọnụ—adịghịzi emepe nke ọma ma ọ bụ ghara imepe emepe ma ọlị iji kwupụta ihe dị “n’ụlọ,” ma ọ bụ ahụ, nke ndị meworo agadi bụ́ ndị na-adịghị ejere Chineke ozi. Ọ dịghị ihe a na-eziga “n’ámá” nke ndụ ọha na eze. Ma, gịnị banyere ndị nkwusa Alaeze meworo agadi bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi? (Job 41:14) Ha pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ụfọdụ pụkwara inwe ihe isi ike n’ikwu okwu, ma n’ezie ha na-eto Ja!—Abụ Ọma 113:1.

13. Olee otú onye mkpọkọta ahụ si kọwaa nsogbu ndị ọzọ ndị agadi na-enwe, ma gịnị bụ eziokwu banyere ndị agadi bụ́ ndị Kraịst?

13 Olu ogwugwe nri ga-ala ala ka e ji agbụ̀ ezé na-adịkwaghị na ya na-ata nri. Onye meworo agadi adịghị arahụ ụra nke ọma n’ihe ndina ya. Ọbụna ube nnụnụ na-emete ya. Ọ bụ abụ ole na ole ka ọ na-abụ, ọ na-ejikwa olu na-esighị ike na-abụ abụ olu ụtọ ọ bụla. “Ndị inyom nile nke na-abụ abụ”—ụda olu ụtọ dị iche iche—“ga-adị ala ala.” Onye agadi adịghị anụchazi egwú na abụ ndị ọzọ na-agụ ma ọ bụ na-abụ. Otú ọ dị, ndị agadi e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ ndị ụfọdụ ha katatụwokwara ahụ, na-anọgide na-eweli olu ha n’abụ otuto nye Chineke ná nzukọ ndị Kraịst. Lee obi ụtọ anyị nwere inwe ha n’akụkụ anyị, ka ha na-eto Jehova n’ọgbakọ!—Abụ Ọma 149:1.

14. Olee egwu ndị na-emekpa ndị agadi ahụ?

14 Lee ọnọdụ dị mwute ndị agadi nọ na ya, karịsịa ndị leghawooro Onye Okike anya! Onye mkpọkọta ahụ na-ekwu, sị: “Ọzọ, ha ga-atụ egwu ihe di elu, ihe ụjọ dị iche iche ga-adịkwa n’ụzọ; osisi almond ga-agbawakwa okooko ya, ụkpala ga-aghọkwa ibu, [mkpụrụ osisi caper agbapuokwa, NW]: n’ihi na mmadụ na-ala n’ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-eti aka n’obi ewee jegharịa n’ámá gburugburu.” (Eklisiastis 12:5) Ọtụtụ n’ime ndị agadi na-atụ ụjọ na ha ga-ada ma ha nọrọ n’elu steepụ dị elu. Ọbụna ile ihe dị elu anya pụrụ ibu ha ajụ. Mgbe ha na-aghaghị ịpụ n’ámá ebe ndị mmadụ juru, ụjọ na-ejide ha ma ha cheta na ha pụrụ imerụ ahụ ma ọ bụ bụrụ ndị ndị ohi wakporo.

15. Olee otú o si bụrụ na “osisi almond ga-agbawakwa okooko ya,” oleekwa otú ụkpala si ‘aghọ ibu’?

15 Banyere onye meworo agadi, “osisi almond ga-agbawakwa okooko ya,” ikekwe na-egosi na agịrị isi ya ga-achatụ awọ, mesịzie chachaa awọ. Agịrị isi awọ ndị ahụ adapụsịwa dị ka okooko osisi almond. Ka onwe ya ‘na-aghọrọ ya ibu,’ ikekwe ka o hulatara ehulata, wụdaa aka ya awụda ma ọ bụ bikwasị ya n’úkwù, mpi aka ya ahịọlie elu, ọ na-eyi ụkpala. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị adịtụ otú ahụ, ka ndị ọzọ rịba ama na anyị so n’usuu igurube Jehova ahụ dị ike, bụ́ ndị na-aga ngwa ngwa!—Lee Ụlọ Nche, May 1, 1998, peji nke 8-13.

16. (a) Gịnị ka ‘mgbapu nke mkpụrụ osisi caper’ na-enye echiche ya? (b) Gịnị bụ ‘ụlọ ebighị ebi’ mmadụ, ihe àmà dị aṅaa nke ọnwụ na-abịa nso na-apụtakwa ìhè?

16 Onye agadi adịghịzi enwecha agụụ iri ihe, ọ bụrụgodị na nri dị ya n’ihu na-atọ ụtọ ka mkpụrụ osisi caper. E jiwo mkpụrụ osisi ndị a mee ihe eri oge iji kpalie agụụ iri ihe. ‘Mgbapu nke mkpụrụ osisi caper’ na-enye echiche na mgbe onye agadi na-enwechaghị agụụ iri ihe, ọbụna mkpụrụ osisi a adịghị akpalighachi agụụ ya maka nri. Ihe ndị dị otú ahụ na-egosi na ọ na-eru ‘ụlọ ebighị ebi ya,’ bụ́ ili, nso. Ọ ga-abụ ụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na o bughị Onye Okike ya n’uche ma bụrụ onye gbasoro ụzọ ndụ ọjọọ nke na Chineke echetaghị ya ná mbilite n’ọnwụ. Ihe àmà nke ọnwụ na-eru nso na-apụta ìhè n’olu iru újú na ịsụ udè nke mkpesa bụ́ nke na-esi n’ọnụ ụzọ nke ọnụ onye agadi ahụ apụta.

17. Olee otú e si atọpụ “ụdọ ọlaọcha,” gịnịkwa ka “ọkwa ọlaedo” pụrụ ịnọchi anya ya?

17 A na-agba anyị ume icheta Onye Okike anyị “mgbe a ka-atọpụghị ụdọ ọlaọcha, mgbe a ka-etiwaghịkwa ọkwa ọlaedo, mgbe ite aka-adawaghịkwa n’isi iyi, mgbe a ka-etiwaghịkwa wheel n’olulu mmiri.” (Eklisiastis 12:6) “Ụdọ ọlaọcha” pụrụ ịbụ akwara ọkpụkpụ azụ. Ọnwụ ga-abịarịrị ma ọ bụrụ na e bibie okporo ụzọ a dị ebube nke ozi akwara na-esi aga n’ụbụrụ, n’ụzọ na-enweghị mmekwata. “Ọkwa ọlaedo” pụrụ ịnọchi anya ụbụrụ, bụ́ nke dị n’ime okpokoro isi nke dị ka ọkwa, bụ́ nke e jikọtara ya na akwara ọkpụkpụ azụ. N’ịbụ nke e ji tụnyere ọlaedo n’ihi ịdị oké ọnụ ahịa ya, ọ bụrụ na ụbụrụ akwụsị ịrụ ọrụ, ọ na-akpata ọnwụ.

18. Gịnị bụ ‘ite ihe atụ ahụ dị n’isi iyi,’ gịnịkwa ga-eme ma e tiwaa ya?

18 ‘Ite dị n’isi iyi’ bụ obi, bụ́ nke na-enweta nsọbata nke ọbara ma nupụkwa ya ọzọ maka ịgagharị n’ahụ nile. N’ọnwụ, obi na-adị ka ite kụwara akụwa, nke a kụpịasịrị n’isi iyi n’ihi na o nweghịzi ike ịnabata, ijigide, na inupụ ọbara bụ́ nke dị mkpa maka ịzụ anụ ahụ na ime ka o nwee ume ọhụrụ. ‘Wheel olulu mmiri ahụ e tiwara etiwa’ na-akwụsị ịgbagharị agbagharị, na-akwụsi nrugharị nke ọbara na-akwagide ndụ. Jehova si otú ahụ kpugheere Solomọn nrugharị ọbara ogologo oge tupu dibịa bekee nke narị afọ nke 17 bụ́ William Harvey egosipụta na ọ na-erugharị erugharị.

19. Olee otú okwu ndị dị n’Eklisiastis 12:7 si emezu mgbe mmadụ nwụrụ?

19 Onye mkpọkọta ahụ gbakwụnyere, sị: “Ájá ewee laghachi n’ala dị ka o si dịrị, mmụọ alaghachikwurukwa Chineke Onye nyere ya.” (Eklisiastis 12:7) Ebe ọ bụ na e tiwaala “wheel n’olulu mmiri,” ahụ mmadụ, bụ́ nke e jiri ájá sitere n’ala mee na mbụ, na-alaghachi n’ájá. (Jenesis 2:7; 3:19) Mkpụrụ obi na-anwụ n’ihi na mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ, nke Chineke nyere na-alaghachikwuru ma dịrị n’aka Onye Okike anyị.—Ezikiel 18:4, 20; Jemes 2:26.

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Na-echeta?

20. Gịnị ka Mosis nọ na-arịọ mgbe o kpere ekpere ahụ e dekọrọ n’Abụ Ọma 90:12?

20 Solomọn gosipụtara n’ụzọ dị irè otú o si dị mkpa icheta Onye Okike Ukwu anyị. N’ezie, ndụ dị nnọọ mkpirikpi na nke nsogbu jupụtara abụghị nanị ihe ndị bu Jehova n’uche ma jiri obi dum na-eme uche ya, nwere. Ma hà na-eto eto ma ha emeela agadi, ha nwere otu àgwà ahụ Mosis nwere, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Si otú a mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.” Onye amụma Chineke dị umeala n’obi chọsiri ike ka Jehova gosi, ma ọ bụ kụziere ya na ụmụ Israel igosipụta amamihe n’iji ‘ụbọchị afọ nile ha’ kpọrọ ihe na iji ha mee ihe n’ụzọ Chineke nabatara.—Abụ Ọma 90:10, 12.

21. Ọ bụrụ na anyị ga-agụta ụbọchị anyị iji nye Jehova otuto, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

21 Karịsịa, ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ikpebisi ike ịṅa ntị na ndụmọdụ onye mkpọkọta ahụ bụ́ ibu Onye Okike n’uche. Lee ohere magburu onwe ha ha nwere iji jeere Chineke ozi dị nsọ! Otú ọ dị, n’agbanyeghị afọ ndụ anyị, ọ bụrụ na anyị amụta ịgụta ụbọchị anyị iji nye Jehova otuto na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” anyị pụrụ inwe ike ịnọgide na-agụ ha ruo mgbe ebighị ebi. (Daniel 12:4; Jọn 17:3) Iji mee otú ahụ, n’ezie, anyị aghaghị icheta Onye Okike Ukwu anyị. Anyị aghaghịkwa ịrụzu ibu ọrụ anyị nile n’ebe Chineke nọ.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka e ji agba ndị na-eto eto ume icheta Onye Okike ha?

◻ Olee ihe atụ ụfọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị chetara Onye Okike Ukwu ha?

◻ Olee mmetụta ụfọdụ nke ịka nká na-enwe dị ka Solomọn si kọwaa ya?

◻ Ọdịnihu dị aṅaa dịịrị ndị bu Jehova n’uche?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Devid, nwata nwanyị Israel ahụ a dọọrọ n’agha, Ana, na Simeon chetara Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ndị agadi bụ́ Ndịàmà Jehova na-eji ọṅụ na-ejere Onye Okike Ukwu anyị ozi dị nsọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya