Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/1 p. 30
  • Akwụkwọ, Akwụkwọ, Akwụkwọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ, Akwụkwọ, Akwụkwọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/1 p. 30

Akwụkwọ, Akwụkwọ, Akwụkwọ!

“Ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ,” ka Eze Solomọn oge ochie nwere amamihe dere. (Eklisiastis 12:12) Na 1995 e bipụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu akwụkwọ ọhụrụ na Britain maka mmadụ 580 ọ bụla bi n’ime ya, na-eme ka mba ahụ nọrọ n’ọkwa mbụ n’ụwa n’ibipụta aha akwụkwọ ọhụrụ. China, mba kasị nwee ụba mmadụ, gbara ndị nke abụọ na-enwe mbipụta 92,972 ma e jiri ya tụnyere nke Britain bụ́ 95,015. Germany sochiri (aha 67,206), United States esochizie (49,276), France esotewe (41,234). “Ọ bụ asụsụ Bekee kpatara ihe dị ukwuu mere Britain ji nọrọ n’ọkwa nke mbụ,” ka akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Daily Telegraph na-ekwu.

Akụkọ na-egosi na ire akwụkwọ anọwo na-adalata eri ọtụtụ afọ, ugbu a kwa ọ bụ nanị 80 pasent nke ndị toworo ogo mmadụ na Britain na-azụ otu akwụkwọ ma ọ bụ karịa n’otu afọ. Ma ndị mmadụ hà na-agụ akwụkwọ nile ha na-azụ?

Otu akwụkwọ nke nọgideworo na-abụ ma nke a na-ekesa ma nke a na-agụ n’ụzọ sara mbara bụ Bible, bụ́ nke e nwere ugbu a n’akụkụ ma ọ bụ n’ozuzu ya n’ihe karịrị asụsụ 2,120. Ọ bụrụ na i nwebeghị otu nke gị, kpọtụrụ ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dịkarịsịrị gị nso iji nweta otu. Ọ bụrụ na i nwere Bible, wepụta ya ma tụlee izo aka Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’isiokwu ndị dị na magazin a. N’ime nke a, ị ga-achọpụta ihe ọmụma na-enye ndụ nke Bible.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya