Ọ̀ Bụ Akara Aka Na-ekpebi Ọdịnihu Gị?
Ọ BỤRỤ na ị lanarị ajọ ihe ọghọm, ị̀ ga-eche na ọ bụ akara aka meere gị ihe ọma? Kama nke ahụ, ị̀ ga-enwe ekele na ọ dabara nnọọ na ị nọ n’ebe kwesịrị ekwesị n’oge kwesịrị ekwesị?
Onye amamihe ahụ bụ Solomọn sịrị: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka iwu ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Eklisiastis 9:11) Ihe a na-atụghị anya ya na-emekarị ọtụtụ mgbe! Onye ọkà egwuregwu onye ọ bụla chere na ọ ga-emeri na-emerụ ahụ, onye a na-amaghị ama wee merie. Ihe ndabara ọjọọ na-eme ka akụ na ụba nke onye na-achụ nta ego nke na-eme ihe n’eziokwu dakpọọ, na-enye ohere ka onye nke ọzọ nke na-adịghị eme ihe n’eziokwu baa ọgaranya. Ma Solomọn ò kwuru na ọ bụ akara aka na-akpata agazighị agazi ndị a? Ọ dịghị ma ọlị. Ndị a bụ nanị mmetụta “mgbe na ihe ndapụta” na-enwe.
Jisọs kwukwara otu okwu yiri nke a. N’izo aka n’ihe omume nke ihe àmà gosiri na ndị na-ege ya ntị maara nke ọma, Jisọs jụrụ, sị: “Ma ọ̀ bụ mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị ụlọ elu dị na Saịloam dakwasịrị ha, wee gbuo ha, ùnu na-eche na ndị ahụ bụ ndị ji ụgwọ karịa mmadụ nile ndị bi na Jerusalem?” (Luk 13:4) Jisọs ekwughị na ọ bụ akara aka a na-apụghị ịghọta aghọta ma ọ bụkwanụ uche Chineke kpatara ọnwụ ndị a, o cheghịkwa na ndị ahụ nwụrụnụ bụ ndị e kwesịrị ịta ụta karịa ndị ọzọ. Ajọ ihe ọghọm ahụ bụ nanị ihe atụ ọzọ nke otú mgbe na ihe ndapụta na-esi arụ ọrụ.
Ọ dịghị ebe ọ bụla Bible na-akwado echiche ahụ nke bụ na Chineke ebuwo ụzọ kaa oge anyị ga-anwụ aka. Ọ bụ eziokwu na Eklisiastis 3:1, 2 na-asị: “Ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe: mgbe ịmụ nwa, na mgbe ịnwụ anwụ; mgbe ịkụ ihe n’ubi, na mgbe ifopụ ihe a kụrụ.” Ma ihe Solomọn na-eme bụ nanị ikwu banyere usoro na-aga n’ihu nke ndụ na ọnwụ nke na-emekpa ụmụ mmadụ na-ezughị okè ahụ. A na-amụ anyị, mgbe oge rukwara, mgbe e ruru ogologo ndụ a tụrụ anya ịdịru—nke na-abụkarị ihe dị ka 70 ma ọ bụ 80 afọ—anyị na-anwụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke adịghị ebu ụzọ kaa kpọmkwem oge mmadụ ga-anwụ dịkwa ka onye ọrụ ubi na-adịghị ebu ụzọ kaa kpọmkwem mgbe ọ ‘ga-akụ ihe’ ma ọ bụ mgbe ọ ‘ga-efopụ ihe a kụworo.’
N’eziokwu, Solomọn mesịrị gosi na mmadụ pụrụ ịnwụchu ọnwụ, na-asị: “Emebibigala iwu ókè, abụkwala onye nzuzu: n’ihi gịnị ka ị ga-anwụchu ọnwụ.” (Eklisiastis 7:17) Echiche dị aṅaa ga-adị na ndụmọdụ nke a ma a sị na e buwo ụzọ kaa mgbe mmadụ ga-anwụ aka n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe? Otú a, Bible na-ajụ echiche nke akara aka. Ndị Israel siri n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị nakweere echiche nke a nke ndị na-ekpere arụsị natara nkatọ siri ike nke Chineke. Aịsaịa 65:11 na-asị: “Ma unu onwe unu ndị na-ahapụ Jehova, ndị na-echezọ ugwu nsọ m, ndị na-edoro Gad [“Chi nke Ihu Ọma,” NW] table n’usoro, ndị na-agbajuru Meni [“Chi nke Ọdịnihu E Bu Ụzọ Kaa Aka,” NW] mmanya gwara ọgwa.”
Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe nzuzu ikwu na ọ bụ akara aka na-akpata ihe ọghọm na ọdachi, ma ọ bụkwanụ, nke ka njọ, ikwu na ọ bụ Chineke n’onwe ya na-akpata ha! “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Bible na-asị, ibo ya ebubo na ọ bụ ya kpatara nhụjuanya nke ụmụ mmadụ na-emegide eziokwu nke a bụ isi kpọmkwem.—1 Jọn 4:8.
Nzube Chineke Maka Ọdịnihu
Ma, gịnị banyere olileanya anyị maka nzọpụta? Eziokwu ahụ nke bụ na ọ bụghị akara aka a na-apụghị izere ezere na-achịkwa ndụ anyị ọ̀ pụtara na anyị aghaghị ịdị na-ebi ndụ n’enweghị nzube? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na Chineke ekpebiwo ihe ga-abụ ọdịnihu ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha. Bible na-ekwu banyere okike nke “ụwa ọhụrụ” nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya.’—2 Pita 3:13.
Iji mezuo nke a, Chineke ga-etinye aka kpọmkwem n’ihe omume ụmụ mmadụ. N’amaghị ama, ma eleghị anya i kpewo ekpere ka nke a mee site n’ikpeghachi ekpere ahụ nke na-asị: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Alaeze nke a bụ ọchịchị dị adị n’ezie nke e guzobere n’eluigwe. Site n’ikpe ekpere ka ọ bịa, ị na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ weghara nchịkwa nke ụwa site n’aka ọchịchị ndị dị adị n’oge a.—Daniel 2:44.
Ime Ka Ọdịnihu nke Gị Bụrụ Ihe E Ji n’Aka
Otú oké ihe omume ndị a ga-esi metụta ọdịnihu gị dabeere, ọ bụghị n’akara aka ma ọ bụ ọbụna na mgbe na ihe ndapụta, kama n’ụzọ nke ị họọrọ ịgbaso. Cheta ihe ọdachi ahụ mere n’ụlọ elu nke Saịloam. Jisọs jiri ihe omume ahụ na-akpata mwute zie ihe dị omimi. Ndị ụlọ elu ahụ dagburu enweghị ike izere ihe dakwasịrị ha. N’aka nke ọzọ, ndị na-ege Jisọs ntị pụrụ izere mbibi ahụ nke bịara site n’iwe Chineke. Jisọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu nile ga-ala n’iyi otú a.” (Luk 13:4, 5) O doro anya na ha pụrụ ịhọrọ ihe ga-abụ ọdịnihu ha.
A na-enye anyị otu ohere ahụ taa—ịrụpụta nzọpụta nke onwe anyị. (Ndị Filipaị 2:12) Chineke chọrọ ka “mmadụ nile . . . bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụkwa eziokwu na ihe e bu pụta ụwa na ụdị ọzụzụ anyị nwere na-emetụtacha anyị nile ruo n’ókè ụfọdụ, Chineke enyewo anyị ohere ime nhọrọ—ikike nke ikpebi ụzọ anyị chọrọ isi jiri ndụ anyị mee ihe. (Matiu 7:13, 14) Anyị pụrụ ime ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi. Anyị pụrụ inweta ọnọdụ dị mma n’ebe Jehova Chineke nọ wee nweta ndụ, ma ọ bụkwanụ, anyị pụrụ ịgbakụta ya azụ wee nwụọ.
Ọtụtụ ndị na-ahọrọ ịdị ndụ n’adabereghị n’ebe Chineke nọ. Ha na-arara ndụ ha nye n’ịchụso ihe onwunwe, ihe ụtọ, ma ọ bụ oké aha. Ma Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anya ukwu ọ bụla: n’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Ya mere, ọ̀ bụ na gịnị ka ndụ anyị dabeere? Na 1 Jọn 2:15-17, Bible na-akọwa, sị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. . . . Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi [“oké ngosi nke ihe mmadụ nwere,” NW], esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Ịhọrọ Ndụ
Olee ụzọ ị pụrụ isi jide n’aka na ị na-eme uche Chineke n’ezie? Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ezi ihe ọmụma sitere na Bible na-enye ihe ndabere maka okwukwe. “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ihe ọmụma ndị dị gị mkpa inweta dị adị. Ndịàmà Jehova enyerewo ọtụtụ nde mmadụ aka inweta ya site n’ịmụ Bible mgbe nile.a
Ka i wee mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ ga-adị gị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ. A pụrụ inwe àgwà ọjọọ ụfọdụ ndị a na-aghaghị imeri ma ọ bụ ọbụna omume rụrụ arụ ndị a na-aghaghị ịkwụsị. Adala mba dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme, bụ́ ime mgbanwe. Echiche ahụ nke bụ na ihe apụghị ịgbanwe bụ nanị ihe ọzọ e nwetara site n’ozizi ụgha ahụ nke ikwere n’akara aka. Site n’enyemaka Jehova, ọ pụrụ ikwe onye ọ bụla omume ‘ime ka uche ya bụrụ ihe ọhụrụ,’ ma yikwasịkwa “mmadụ ọhụrụ” ahụ. (Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 4:22-24) Mgbalị nile ị na-eme ime ihe na-atọ Chineke ụtọ agaghị agafe ghara ịbụ nke ọ hụrụ. Ọ dị njikere ịgọzi ndị ahụ na-eme ihe ọ na-achọ.
N’eziokwu, ịmụ Bible agaghị egbo mkpa gị nile. Ihe ọghọm na ọnọdụ ọjọọ dị iche iche na-adabara ezi ndị ohu Chineke, dịkwa ka ọ na-adabara ndị ọzọ. Otú ọ dị, Chineke pụrụ inye anyị amamihe anyị ga-eji nagide ihe isi ike. (Jemes 1:5) E nwekwara ọṅụ nke mmadụ ịmara na ya na Chineke nwere ezi mmekọrịta. “Onye na-atụkwasị Jehova obi, onye ihe na-agara nke ọma [“onye obi ụtọ,” NW] ka ọ bụ,” ka Ilu 16:20 kwuru.
N’ime Paradaịs ahụ e weghachiri n’okpuru Alaeze Chineke, mgbe na ihe ndapụta agaghị na-eyikwa anyị egwu ọzọ. N’eziokwu, Chineke ga-ewepụchasị ihe nile na-emebi obi ụtọ ụmụ mmadụ n’oge a. “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [anyị]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ,” ka Bible kwere ná nkwa. (Mkpughe 21:4) Ọtụtụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, bụ́ ndị nwụrụ n’ihe ọghọm ga-enweta mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.
Ị̀ ga-eketa ọdịnihu nke a dị ebube? Mgbe ụmụ Israel na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis gwara ha, sị: “Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu ya, na ịrapara n’ahụ ya: n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.”—Deuterọnọmi 30:19, 20.
Ee e, anyị abụghị ndị ohu na-apụghị ime ihe ọ bụla, ndị akara aka nke na-enweghị obi ebere na-achịkwa. Obi ụtọ gị n’ọdịnihu, n’ezie ọdịnihu ebighị ebi gị, dị n’aka gị. Anyị na-agba gị ume ịhọrọ ndụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A pụrụ ime ndokwa maka ọmụmụ ihe dị otú ahụ site n’idegara ndị bipụtara magazin nke a akwụkwọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị nakweere echiche ndị na-ekpere arụsị nke akara aka natara nkatọ siri ike site n’aka Chineke