-
Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta MbibiIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
19. Olee ihe atụ Bible ndị na-egosi na ọ bụghị mmehie ezinụlọ ime ihe ọchị?
19 Bible ọ̀ na-ekwugide ime ihe ọchị? Ọ dịghị ma ọlị! Bible na-asị na e nwere “mgbe ịchị ọchị . . . na mgbe ite egwú.”b (Eklisiastis 3:4) Ndị Chineke n’Israel oge ochie nụrụ ụtọ egwú na ịgba egwú, ngwuri egwu, na gwam gwam gwam. Jisọs Kraịst gara otu nnukwute agbamakwụkwọ na “nri ukwu” nke Matiu Livaị siere ya. (Luk 5:29; John 2:1, 2) O doro anya na Jisọs abụghị ogbu ọṅụ. Ka a ghara ile ịchị ọchị na ime ihe ọchị anya mgbe ọ bụla n’ezinụlọ gị dị ka mmehie!
-
-
Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta MbibiIsi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
-
-
b A pụrụ ịsụgharị okwu Hibru a sụgharịrị “ịchị ọchị” n’ebe a, n’ụdị ndị ọzọ, “igwuri egwu,” “inye ụdị ihe ntụrụndụ ụfọdụ,” “ime ememe,” ma ọ bụ ọbụna “ikpori ndụ.”
-