-
Ihe Ọ Bụla Nwere OgeỤlọ Nche—2009 | Mach 1
-
-
Ihe onye ahụ si n’ike mmụọ nsọ dee ihe ahụ na Baịbụl na-ekwu abụghị banyere akara aka mmadụ ma ọ bụ ihe ga-emecha mee mmadụ n’ọdịnihu, kama ọ na-ekwu banyere nzube Chineke na otú ọ ga-esi emetụta ụmụ mmadụ. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ ya bụ isi ihe amaokwu ya ndị ọzọ na-ekwu. Mgbe Sọlọmọn kwuchara ọtụtụ ihe ndị a ga-asị na ha nwere “oge a kara aka,” o dere, sị: “Ahụwo m ọrụ Chineke nyeworo ụmụ mmadụ nke ha ga na-arụ. O mewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya.”—Ekliziastis 3:10, 11.
Chineke nyere ụmụ mmadụ ọtụtụ ọrụ ha ga-arụ, ma ọ bụ ọtụtụ ihe ha ga-eme, Sọlọmọn kpọkwara ọtụtụ n’ime ha aha. Chineke nyekwara anyị ohere ikpebi ihe anyị chọrọ ime. Otú ọ dị, ọrụ ọ bụla nwere oge ọ ga-abụ a rụọ ya, ya arụpụta ihe kacha mma. Dị ka ihe atụ, legodị ihe Sọlọmọn kwuru n’Ekliziastis 3:2, ya bụ, na e nwere “oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ.” Ndị ọrụ ubi ma na mkpụrụ ọ bụla nwere oge kwesịrị ekwesị e ji akụ ya. Ọ bụrụkwanụ na onye ọrụ ubi ahapụ ịkụ ihe n’oge a na-akụ ya, kụọ ya n’oge na-abụghị oge a na-akụ ya? Ọ bụrụ na ihe ahụ ọ kụrụ emeghị nke ọma n’agbanyeghị mgbalị ya niile, ọ̀ ga-asị na ọ bụ akara aka mere ya? Mbanụ! Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ kụghị mkpụrụ ahụ n’oge o kwesịrị ịkụ ya. Ihe gaara agaziri onye ọrụ ubi ahụ ma a sị na o sooro otú Onye Okike anyị si hazie ihe.
N’ihi ya, ihe Chineke kpebiri abụghị akara aka mmadụ na ihe niile ga-emecha mee ná ndụ mmadụ, kama, ọ bụ ụkpụrụ ụfọdụ dabara ná nzube ya bụ́ ndị ga na-eduzi ihe ụmụ mmadụ na-eme ná ndụ. Ka ihe nwee ike ịgara ụmụ mmadụ nke ọma n’ihe niile ha na-eme, ha ga-achọpụtarịrị ihe bụ́ nzube Chineke na oge ọ ga-emezu ya, meekwa ka ihe ha na-eme daba ná nzube ya na oge ya. Ihe Chineke karala aka, nke na-agaghịkwa agbanwe agbanwe, abụghị ndụ ụmụ mmadụ, kama ọ bụ ihe ndị Chineke zubere ime. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: ‘Okwu m nke si n’ọnụ m pụta agaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.’—Aịzaya 55:11.
-
-
Ihe Ọ Bụla Nwere OgeỤlọ Nche—2009 | Mach 1
-
-
Ịghọta Oge Chineke
Sọlọmọn kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Mgbe o kwuchara na ‘Chineke emewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya,’ o kwuziri, sị, “O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha, ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.”—Ekliziastis 3:11.
Ndị mmadụ edeela ọtụtụ ihe banyere amaokwu a. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị na-enwetụbeghị mgbe ọ nọ na-eche ihe mere o ji dịrị ndụ na ebe ndụ a du ya aga. Kemgbe ụwa, ọ na-esiri ụmụ mmadụ ike ikweta na naanị ihe dị ná ndụ bụ mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ, e mechaa ya anwụọ. Anyị, bụ́ ụmụ mmadụ, pụrụ iche n’ihe niile dị ndụ e kere eke n’ihi na anyị na-eche maka ndụ anyị ugbu a nakwa maka ọdịnihu anyị. Ọ na-adịdị anyị ka anyị anwụla anwụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka ihe ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru nke bụ́ na Chineke ‘tinyere mgbe ebighị ebi n’obi ụmụ mmadụ.’
N’ihi ọchịchọ a ụmụ mmadụ nwere, ha na-echekarị ma hà ga-adịrị ndụ gawa ma ha nwụọ. Ụfọdụ chere na e nwere ihe dị n’ime anyị ka na-adị ndụ ma anyị nwụọ. Ndị ọzọ kweere na anyị ga na-alọ ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ọzọkwa chere na ọ bụ akara aka mmadụ na-edu ya ma ọ bụkwanụ na ọ bụ Chineke na-ekpebi ihe niile na-eme ná ndụ mmadụ, nakwa na anyị agaghị agbanweli ya. Ọ dị mwute na o nweghị nke ọ bụla n’ime nkọwa ndị a nke merela ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ihe kpatara ya bụ na Baịbụl kwuru na mmadụ agaghị ejili aka ya ‘achọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.’
Ọ dịla anya ihe a ụmụ mmadụ chọwara ịmata, nke na-ekwebeghị ha mmata, chuwere ndị ọkà ihe ọmụma ụra. Otú ọ dị, ebe ọ bụ Chineke tinyere ọchịchọ ahụ n’obi anyị, ó kwesịghị ka ọ bụrụ ya ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme iji nweta ihe ahụ na-agụ anyị? A sị ka e kwuwe, Baịbụl kwuru banyere Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka gị, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.” (Abụ Ọma 145:16) Ọ bụrụ na anyị amụwa Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, anyị ga-ahụ otu o si kọwaa ihe bụ́ ndụ na ihe bụ́ ọnwụ nke ọma, anyị ga-aghọtakwa ihe bụ́ nzube ebighị ebi Chineke maka ụwa a na ụmụ mmadụ.—Ndị Efesọs 3:11.
-
-
Ugbu A Bụ Oge Ịhọrọ Otú Ọdịnihu Gị Ga-adịỤlọ Nche—2009 | Mach 1
-
-
“Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.”—Jenesis 1:27.
OKWU ndị ahụ a ma ama ndị dị ná mbido Baịbụl gosiri otu n’ime ihe ndị kacha ebube Chineke ‘mere ka ọ maa mma n’oge ya,’ ya bụ, di na nwunye mbụ zuru okè O kere, bụ́ Adam na Iv. (Ekliziastis 3:11) Jehova Chineke, bụ́ Onye kere ha, gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”—Jenesis 1:28.
-