Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/15 p. 13-18
  • “Ọrụ Mmadụ Nile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọrụ Mmadụ Nile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhụ Maka Nchegbu Ndị Bụ Isi ná Ndụ
  • Ezinụlọ, Iwu Ewu, na Ike
  • Ihe Anyị Na-elekwasị Anya na Ibu Ọrụ Anyị
  • Ndụ Gị—gịnị Bụ Nzube ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gini Na-eme Ka Ndụ Nwee Isi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/15 p. 13-18

“Ọrụ Mmadụ Nile”

“Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—EKLISIASTIS 12:13.

1, 2. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịtụle ibu ọrụ anyị n’ebe Chineke nọ?

“GỊNỊ ka Jehova na-achọ n’aka gị?” Otu onye amụma n’oge ochie jụrụ ajụjụ ahụ. Mgbe ahụ ọ kpọtụrụ aha ihe Jehova na-achọ—ime ihe e kpere n’ikpe, ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke na-eje ije.—Maịka 6:8.

2 N’ụbọchị a nke ichere onwe onye nanị na nnwere onwe, echiche nke na Chineke na-achọ ihe n’aka ha na-akpatara ọtụtụ ahụ erughị ala. Ha achọghị ibu ibu ọrụ ọ bụla. Ma gịnị banyere nkwubi okwu Solomọn ruru n’Eklisiastis? “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chesiere akwụkwọ Eklisiastis echiche ike?

3 N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ na echiche anyị ná ndụ, anyị pụrụ irite uru dị ukwuu ma anyị tụlee ihe dị gburugburu nkwubi okwu ahụ. Eze Solomọn, onye dere akwụkwọ a sitere n’ike mmụọ nsọ, tụlere ụfọdụ n’ime ihe ndị bụ kpọmkwem akụkụ nke ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Ụfọdụ pụrụ ikwubi ọsọ ọsọ na ihe ndị o kwuru bụkarịrị nke na-adịghị mma. O sitekwararịị n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ pụkwara inyere anyị aka ịtụle ihe omume na ihe ndị ka anyị mkpa, na-enwe ọṅụ ka ukwuu dị ka ihe si na ya pụta.

Ịhụ Maka Nchegbu Ndị Bụ Isi ná Ndụ

4. Gịnị ka Solomọn nyochara ma tụlee n’Eklisiastis?

4 N’ụzọ miri emi Solomọn nyochara ‘ihe omume ụmụ mmadụ.’ “M werekwa obi m nye ịchọ na iledo site n’amamihe ihe banyere ihe nile nke e meworo n’okpuru eluigwe.” N’ikwu ‘ihe omume’ Solomọn ebuchaghị ọrụ n’uche, kama ọ̀tụ̀tụ̀ nile nke ihe ndị ikom na ndị inyom tinyere aka na ha ná ndụ ha nile. (Eklisiastis 1:13) Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe nchegbu, ma ọ bụ ihe omume ndị gbara ọkpụrụkpụ, wee jirizie ha tụnyere ihe omume ndị nke onwe anyị na ihe ndị ka anyị mkpa.

5. Gịnị bụ otu n’ime ihe omume ndị bụ isi nke ụmụ mmadụ?

5 N’ezie ego dị mkpa n’ọtụtụ ihe nchegbu na ihe omume mmadụ. Ọ dịghị onye pụrụ ikwu n’izi ezi na Solomọn nwere echiche ọ gbasara m banyere ego nke ụfọdụ ndị ọgaranya nwere. N’ezoghị ọnụ o kwetara mkpa e nwere maka ego ụfọdụ; inwe ego zuru ezu ka ibi ndụ nnapụ ihe ụtọ ma ọ bụ ibi n’ogbenye mma. (Eklisiastis 7:11, 12) Ma ị ghaghị ịhụwo na ego, ya na ihe onwunwe ndị ọ na-azụta, pụrụ ịghọ ihe mgbaru ọsọ bụ isi ná ndụ—nye ndị ogbenye nakwa ndị ọgaranya.

6. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ego site n’otu n’ime ilu Jisọs na site n’ahụmahụ Solomọn n’onwe ya?

6 Cheta ihe atụ Jisọs nke ọgaranya ahụ onye, n’adịghị mgbe afọ na-eju ya, rụrụ ọrụ iji nwetakwuo ihe. Chineke hụrụ ya dị ka onye na-enweghị uche. N’ihi gịnị? N’ihi na ‘ọ bụghị n’ihe anyị nwebigara ókè ka ndụ anyị dị.’ (Luk 12:15-21) Ahụmahụ Solomọn—ikekwe kara nke anyị saa mbara—na-akwado okwu Jisọs. Gụọ nkọwa ahụ dị n’Eklisiastis 2:4-9. Ruo nwa oge Solomọn tinyere onwe ya n’inweta akụ̀. O guzobere ụlọ na ubi ndị mara oké mma. Ọ pụrụ inweta ndị iko nwanyị mara mma, o nwetakwara ha. Akụ̀ na ihe o nyere ya ike ime ò wetaara ya afọ ojuju dị omimi, mmetụta nke ezi ihe a rụzuru, na nzube ná ndụ ya? Ọ zara n’ezoghị ọnụ, sị: “Mụ onwe m wee chee ọrụ m nile nke aka m abụọ rụrụ ihu, echekwara m ndọgbu nke m dọgburu onwe m n’ọrụ ime ihu: ma, lee, ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe, ọ dịghịkwa ihe fọdụụrụ mmadụ n’okpuru anyanwụ.”—Eklisiastis 2:11; 4:8.

7. (a) Ahụmahụ na-anwapụta gịnị banyere uru nke ego? (b) Gịnị ka ị hụworo n’onwe gị nke na-anwapụta nkwubi okwu Solomọn?

7 Nke ahụ bụ ihe mere eme, eziokwu a gbaara akaebe ná ndụ ọtụtụ ndị. Anyị aghaghị ikweta na inwekwu ego adịghị nnọọ agwọta nsogbu nile. Ọ pụrụ ịgwọta ụfọdụ, dị ka ime ka inweta nri na uwe ka mfe. Ma mmadụ pụrụ iyi nanị otu uwe otu oge ma nụ ụtọ nanị otu ọ̀tụ̀tụ̀ nri na ihe ọṅụṅụ. Ị gụwokwa banyere ndị ọgaranya bụ́ ndị ịgba alụkwaghịm, iji mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na obubuiro ọkpụtọrọkpụ ndị ikwu na-eti ndụ ha ihe otiti. Ọgụ ego ná nde kwụrụ nde bụ́ J. P. Getty kwuru, sị: “Ego enweghị njikọ ọ bụla n’ebe obi ụtọ dị. Ma eleghị anya o nwere njikọ n’ebe enweghị obi ụtọ dị.” Ezi ihe mere Solomọn ji were ịhụ ọlaọcha n’anya dị ka ihe efu. Jiri eziokwu ahụ tụnyere nchọpụta Solomọn: “Ihe ụtọ ka ụra nke onye [na-arụ] ọrụ ubi bụ, ma ọ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.”—Eklisiastis 5:10-12.

8. Olee ihe e nwere mere a na-agaghị eji debe ịdị mkpa ego n’ọnọdụ gabigara ókè?

8 Ego na ihe onwunwe adịghịkwa eweta mmetụta nke afọ ojuju banyere ọdịnihu. Ọ bụrụ na i nwere ego na ihe onwunwe ka ukwuu, o yikarịrị ka ị ga-enwe nchekasị ka ukwuu banyere ichedo ha, ị gakwaghịrị ama ihe echi ga-eweta. Ha nile, tinyere ndụ gị, hà pụrụ ifunahụ gị? (Eklisiastis 5:13-17; 9:11, 12) Ebe ọ dị otú ahụ, o kwesịghị isi ike ịhụ ihe mere ndụ, ma ọ bụ ihe omume anyị, kwesịrị iji nwee nzube ka elu, nke na-adịte anya karịa ego na ihe onwunwe.

Ezinụlọ, Iwu Ewu, na Ike

9. N’ihi gịnị ka ndụ ezinụlọ ji bilite n’ụzọ ziri ezi ná nnyocha Solomọn?

9 Ntụle Solomọn banyere ndụ gụnyere okwu metụtara itinye uche dum n’ezinụlọ. Bible kwuru ọtụtụ ihe banyere ndụ ezinụlọ, gụnyere ọṅụ nke inwe na ịzụlite ụmụ. (Jenesis 2:22-24; Abụ Ọma 127:3-5; Ilu 5:15, 18-20; 6:20; Mak 10:6-9; Ndị Efesọs 5:22-33) Ma, nke ahụ ọ̀ bụ akụkụ kasị mkpa ná ndụ? O yiri ka ọtụtụ na-eche otú ahụ, ma e buru n’uche oké okwu a na-ekwu n’ọtụtụ ọdịbendị banyere alụmdi na nwunye, ụmụ, na nkekọ ezinụlọ. Ma Eklisiastis 6:3 na-egosi na ọbụna inwe otu narị ụmụ abụghị ihe bụ isi na-eweta afọ ojuju ná ndụ. Chee banyere nne na nna ole chụworo àjà maka ụmụ ha iji nye ha mmalite dị mma ma mee ka ndụ ha ka mfe. N’agbanyeghị otú nke ahụ pụrụ isi magbuo onwe ya, n’ezie Onye Okike anyị ebughị n’uche na isi ihe dị n’ịdị adị anyị bụ nanị ibufere ọgbọ na-esonụ ndụ, dị ka ụmụ anụ na-eme n’echeghị ya eche iji nọgide na-enwe ụdị ha.

10. N’ihi gịnị ka nlekwasị anya na-ekwesịghị ekwesị n’ezinụlọ pụrụ iji bụrụ ihe efu?

10 Solomọn ji nghọta welite ihe ụfọdụ bụ eziokwu banyere ndụ ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, nwoke pụrụ ịtụkwasị uche n’ime ndokwa maka ụmụ na ụmụ ụmụ ya. Ma hà ga-aghọ ndị maara ihe? Ka hà ga-adị nzuzu n’ebe ihe ọ gbalịsiri ike ịkpakọbara ha dị? Ọ bụrụ na nke ikpeazụ emee, lee aha “ihe efu na ihe ọjọọ nke hiri nne” ọ ga-abụ!—Eklisiastis 2:18-21; 1 Ndị Eze 12:8; 2 Ihe Emere 12:1-4, 9.

11, 12. (a) Ná nchụso dịgasị aṅaa ná ndụ ka ụfọdụ tụkwasịworo uche? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịchọ iwu ewu bụ “ịchọ ijide ifufe”?

11 N’akụkụ nke ọzọ gabigara ókè, ọtụtụ ewerewo mkpebisi ike ha iji wuo ewu ma ọ bụ nweta ike n’ahụ ndị ọzọ dị ka ihe dị mkpa karịa ndụ ezinụlọ dị otú o kwesịrị. Nke a pụrụ ịbụ mmehie ihe a na-ahụkarị n’ebe ndị ikom nọ. Ị̀ hụwo nke a n’ebe ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị, ma ọ bụ ndị agbata obi gị nọ? Ọtụtụ na-agbalị ọnwụ ọnwụ ka a hụchata ha, ka a na-anụ aha ha, ma ọ bụ ka ha na-enwe ike n’ahụ ndị ọzọ. Ma ruo ókè hà aṅaa ka nke a nwere nzube n’ezie?

12 Chee banyere otú ụfọdụ siri gbaa mgba iji wuo ewu, ma ọ̀ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta ma ọ bụ nke dị ukwuu. Anyị na-ahụ ya n’ụlọ akwụkwọ, n’agbata obi anyị, na n’ìgwè ọha na eze dị iche iche. Ọ bụkwa ike mkpali n’ebe ndị na-achọ ịbụ ndị a ma ama na nkà, ntụrụndụ, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ. Ma, ọ́ bụkarịghị mgbalị efu? Solomọn kpọrọ ya n’ụzọ ziri ezi “ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:4) Ọbụna ma onye ntorobịa ghọọ onye a ma ama n’otu òtù, n’òtù egwuregwu, ma ọ bụ n’òtù egwú—ma ọ bụ na otu nwoke ma ọ bụ nwanyị abụrụ onye a na-anụ aha ya n’otu ụlọ ọrụ ma ọ bụ ógbè—mmadụ ole n’ezie maara banyere ya? Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ n’akụkụ nke ọzọ nke ụwa (ma ọ bụ ọbụna n’otu mba ahụ) hà maara na onye ahụ dị adị? Ka hà na-aga nnọọ n’ihu ná ndụ n’amaghị banyere ntakịrị iwu ewu ọ bụla o nwere? A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ike ma ọ bụ ịbụisi ọ bụla mmadụ nwetara n’ọrụ, n’obodo, ma ọ bụ n’etiti otu ìgwè.

13. (a) Olee otú Eklisiastis 9:4, 5 si enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ịchụso iwu ewu ma ọ bụ ike? (b) Eziokwu dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị iche ihu ma ọ bụrụ na ndụ a bụ nanị nke dịnụ? (Lee nkọwa ala ala peji.)

13 Gịnị ka iwu ewu ma ọ bụ ịbụisi dị otú ahụ na-apụta ka oge na-aga? Ka otu ọgbọ na-aga ọzọ ana-abịa, ndị na-ewu ewu ma ọ bụ ndị nwere ike na-anwụ, e chezọọkwa ha. Nke ahụ bụ eziokwu banyere ndị na-ewu ihe owuwu, ndị egwú na ndị nkà ọzọ, ndị mgbanwe ọha mmadụ, na ndị ọzọ, dị nnọọ ka ọ bụ eziokwu banyere ihe ka ukwuu ná ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ndú ndị agha. Banyere ihe omume ndị ahụ, mmadụ ole n’otu n’otu kpọmkwem ka ị maara biri ndụ n’etiti afọ 1700 na 1800? Solomọn tụlere okwu n’ụzọ ziri ezi, na-asị: “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ. N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . e chezọwo ncheta ha.” (Eklisiastis 9:4, 5) Ọ bụrụkwa na ndụ a agwụla ndụ dịnụ, mgbe ahụ ịchụso iwu ewu ma ọ bụ ike bụ ihe efu n’ezie.a

Ihe Anyị Na-elekwasị Anya na Ibu Ọrụ Anyị

14. N’ihi gịnị ka akwụkwọ Eklisiastis ji kwesị inyere anyị aka n’onwe anyị?

14 Solomọn ekwughị banyere ọtụtụ ihe omume, ihe mgbaru ọsọ, na ihe ụtọ ụmụ mmadụ na-elekwasị anya ná ndụ ha. Otú ọ dị, ihe o dere zuru ezu. Ọ dịghị mkpa ka ntụle anyị tụlere akwụkwọ ahụ yie ihe gbara ọchịchịrị ma ọ bụ ihe dị njọ, n’ihi na anyị atụleghachiwo n’ụzọ ezi uche dị na ya akwụkwọ Bible ahụ nke Jehova Chineke leziri anya nye mmụọ nsọ ka e dee ya maka abamuru anyị. Ọ pụrụ inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ime ka ụzọ anyị si ele ndụ anya na ihe anyị na-elekwasị anya guzozie. (Eklisiastis 7:2; 2 Timoti 3:16, 17) Otú ahụ ka ọ dịkarịrị n’ihi nkwubi okwu ndị Jehova nyeere Solomọn aka iru.

15, 16. (a) Gịnị bụ echiche Solomọn banyere ikpori ndụ? (b) Iru eru dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka Solomọn setịpụrụ maka ikpori ndụ?

15 Otu isi ihe Solomọn welitere ugboro ugboro bụ na ndị ohu ezi Chineke ahụ kwesịrị inweta ọṅụ n’ihe ndị ha na-eme n’ihu Ya. “Amawo m na ọ dịghị ezi ihe dịịrị ha, ma ọ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, meekwa ezi ihe n’ogologo ndụ ya. Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.” (Eklisiastis 2:24; 3:12, 13; 5:18; 8:15) Rịba ama na Solomọn adịghị agba oriri oké mkpọtụ ume; ọ kwadokwaghịnụ àgwà nke ‘Ka anyị rie, ṅụọ, ṅụrịakwa, n’ihi na echi anyị ga-anwụ.’ (1 Ndị Kọrint 15:14, 32-34) O bu n’uche na anyị kwesịrị inweta ọṅụ n’ihe ụtọ ndị kwesịrị ekwesị, dị ka iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ka anyị ‘na-eme ezi ihe n’ogologo ndụ anyị.’ N’ụzọ ajụjụ na-adịghị ya, nke ahụ na-eche ndụ anyị ihu n’uche Onye Okike ahụ, onye na-ekpebi ihe bụ ihe ọma n’ezie.—Abụ Ọma 25:8; Eklisiastis 9:1; Mak 10:17, 18; Ndị Rom 12:2.

16 Solomọn dere, sị: “Jee, were ọṅụ rie nri gị, werekwa obi dị mma ṅụọ mmanya vine gị; n’ihi na ọrụ gị nile atọwo Chineke ụtọ na mgbe dị anya gara aga.” (Eklisiastis 9:7-9) Ee, nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere n’ezie uju ndụ na nke na-eju afọ na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ ndị na-atọ Jehova ụtọ. Nke ahụ na-achọ ka anyị na-echebara ya echiche mgbe nile. Lee ka echiche nke a si dị nnọọ iche n’ebe nke ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ dị, bụ́ ndị na-eji nchepụta ụmụ mmadụ ebi ndụ!

17, 18. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si emeghachi omume n’ebe ihe ndị na-eme eme ná ndụ dị? (b) Ihe dị aṅaa ga-esi na ya pụta ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe nile?

17 Ọ bụ ezie na okpukpe ụfọdụ na-ezi banyere ndụ mgbe a nwụsịrị, ọtụtụ ndị kwenyere na ndụ a agwụla nke ha pụrụ iji n’aka n’ezie. Ị pụrụ ịhụwo ka ha meghachiri omume dị ka Solomọn kọwara: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.” (Eklisiastis 8:11) Ọbụna ndị na-emikpughị emikpu n’ihe ndị rụrụ arụ na-egosi na n’ụzọ bụ isi ha tinyere uche ha n’ọnọdụ dị ugbu a. Ọ bụ otu ihe mere ego, ihe onwunwe, ùgwù, ikike n’ahụ ndị ọzọ, ezinụlọ, ma ọ bụ ihe mmasị ndị ọzọ dị otú ahụ na-adị ha mkpa gabiga ókè. Ma, Solomọn ahapụghị okwu ahụ n’ebe ahụ. O kwukwasịrị: “A sị na onye mmehie emee ihe ọjọọ [narị ugboro], meekwa ka ụbọchị ya dị ogologo, ma mụ onwe m maara n’ezie na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma, bụ́ ndị na-atụ egwu n’ihu Ya: ma ọ gaghị adịrị onye na-emebi iwu mma, ọ gaghị emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo, bụ́ nke dị ka onyinyo; n’ihi na ọ dịghị atụ egwu n’ihu Chineke.” (Eklisiastis 8:12, 13) N’ụzọ doro anya, obi siri  Solomọn ike na ọ ga-adịrị anyị mma ma anyị ‘na-atụ egwu n’ihu ezi Chineke ahụ.’ Dịrị anyị mma ruo ókè hà aṅaa? Anyị pụrụ ịhụ azịza ya ná ntụnyere o mere. Jehova pụrụ ‘ime ka ụbọchị anyị dị ogologo.’

18 Ndị ka bụ nwata kwesịkarịrị ịtụgharị uche n’eziokwu ahụ a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam nke bụ na ọ ga-adịrị ha mma ma ha tụọ egwu Chineke. Dị ka ị pụrụ ịhụwo n’onwe gị, onye kasị agba ọsọ pụrụ ịzọhie ụkwụ ma ghara imeri n’ọsọ. A pụrụ imeri usuu ndị agha dị ike. Ọchụ nta ego dị nkọ pụrụ ịchọta onwe ya n’ogbenye. Ihe ndị ọzọ a na-ejighị n’aka na-emekwa ka ndụ bụrụ ihe a na-apụghị ịka aka. Ma ị pụrụ ijide nke a n’aka kpam kpam: Ụzọ kasị bụrụ nke amamihe na nke a kasị jide n’aka bụ ịnụ ụtọ ndụ ka ị na-eme ezi ihe n’ime iwu omume nile nke Chineke na n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. (Eklisiastis 9:11) Nke a na-agụnye ịmụta site na Bible ihe bụ uche Chineke, na-arara ndụ onwe onye nye ya, ma na-aghọ onye Kraịst e mere baptism.—Matiu 28:19, 20.

19. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi jiri ndụ ha mee ihe, ma gịnị bụ ụzọ nke amamihe?

19 Onye Okike anyị agaghị amanye ndị ntorobịa ma ọ bụ ndị ọzọ ịgbaso nduzi ya. Ha pụrụ imikpu onwe ha n’agụmakwụkwọ, ikekwe ọbụna na-aghọ ụmụ akwụkwọ ná ndụ ha dum nye akwụkwọ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke mmụta mmadụ. Nke ahụ ga-emesịa bụrụ ihe ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ. Ma ọ bụ ha pụrụ ijegharị n’ụzọ nile nke obi mmadụ ha na-ezughị okè ma ọ bụ gbasoo ihe na-agụ anya agụụ. Nke ahụ aghaghị iweta mkpasu iwe, ndụ e sikwa otú a mefusịa ga-emesịa ghọọ nanị ihe efu. (Eklisiastis 11:9–12:12; 1 Jọn 2:15-17) Ya mere Solomọn kpọrọ ndị ntorobịa òkù—òkù nke anyị kwesịrị ichebasiri echiche ike, n’agbanyeghị ihe bụ afọ ndụ anyị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.”—Eklisiastis 12:1.

20. Gịnị bụ echiche ziri ezi nke ozi dị n’Eklisiastis?

20 Gịnịzi ka anyị ga-ekwubi? Ọ dị mma, gịnị banyere nkwubi okwu Solomọn ruru na ya? Ọ hụrụ, ma ọ bụ nyochaa, “ọrụ nile nke a rụworo n’okpuru anyanwụ; ma, lee, ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 1:14) Anyị adịghị ahụ n’akwụkwọ Eklisiastis okwu nke nwoke na-atụchakarị ihe ma ọ bụ nke ike ụwa gwụrụ. Ha bụ akụkụ nke Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ ma kwesị ka anyị lebara ha anya.

21, 22. (a) Akụkụ dịgasị aṅaa ná ndụ ka Solomọn chebaara echiche? (b) Nkwubi okwu dị aṅaa nke amamihe ka o ruru? (ch) Olee otú nnyocha nke ihe dị n’Eklisiastis siworo metụta gị?

21 Solomọn nyochara ndọlị, mgba, na nchụso nile nke mmadụ. Ọ tụgharịrị uche n’otú ihe si emekarị, ihe ndapụta tọgbọ chakoo nke na-eweta obi nkoropụ nke ọtụtụ mmadụ na-enwe. Ọ tụlere ịbụ eziokwu nke ezughị okè mmadụ na ọnwụ na-esi na ya apụta. O chebakwaara ihe ọmụma Chineke nyere banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na atụmanya nke ndụ ọ bụla n’ọdịnihu echiche. Nwoke nke nwere amamihe Chineke mere ka ọ ka elu, ee, otu n’ime ụmụ mmadụ kasị nwee amamihe dịtụworo ndụ, tụlere ihe a dum. Mgbe ahụ e tinyere nkwubi okwu o ruru na ya n’Akwụkwọ Nsọ maka abamuru mmadụ nile chọrọ ndụ nwere nzube n’ezie. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikwenye?

22 “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile. N’ihi na ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 12:13, 14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’otu oge Ụlọ Nche (Bekee) kwuru okwu a jupụtara ná nghọta: “Anyị ekwesịghị imefụsị ndụ anyị n’ihe efu . . . Ọ bụrụ na ndụ a agwụla nke dịnụ, ọ dịghị ihe dị mkpa. Ndụ a dị ka bọl a tụliri n’ikuku nke na-ada ngwa ngwa n’ala. Ọ bụ onyinyo na-ala ọsọ ọsọ, okooko osisi na-achanwụ achanwụ, akwụkwọ ahịhịa a ga-egbutu ọ kpọnwụọkwa ngwa ngwa. . . . N’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ebighị ebi oge ndụ anyị bụ mpekere ihe na-erughị ihe ọ bụla. Na mmiri nke oge ọ bụghịdị ntapụ a ga-eji mee ihe ọ bụla. N’ezie [Solomọn] ziri ezi mgbe ọ tụleghachiri ọtụtụ nchegbu na ihe omume ụmụ mmadụ ma kpọọ ha ihe efu. Anyị na-ala ngwa ngwa nke na ọ baghịdị uru na anyị bịara, otu n’ime ọtụtụ ijeri ndị bịara ma laa, nke nanị ole na ole nnọọ na-amara na anyị nọrọ ebe a ma ọlị. Echiche a abụghị nke ịkpata enweghị olileanya ma ọ bụ mgbarụ ihu ma ọ bụ nke obi ilu ma ọ bụ nke na-akụnwụ ahụ. Ọ bụ eziokwu, eziokwu a ga-eche ihu, echiche a na-ahụ anya, ma ọ bụrụ na ndụ a agwụla nke dịnụ.”—August 1, 1957, peji nke 472.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị bụ ntụle amamihe dị na ya nke ọnọdụ ihe onwunwe ná ndụ gị?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịtụkwasị uche n’ezinụlọ, n’iwu ewu, ma ọ bụ n’ịbụisi nye ndị ọzọ otú na-ekwesịghị?

◻ Àgwà Chineke dị aṅaa banyere mkpori ndụ ka Solomọn gbara ume ya?

◻ Olee otú i siworo rite uru site n’ịtụle akwụkwọ Eklisiastis?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ego na ihe onwunwe adịghị eme ka e jide afọ ojuju n’aka

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị na-eto eto pụrụ ijide n’aka na ọ ga-adịrị ha mma ma ha tụọ egwu Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya