Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/15 p. 8-13
  • Ndụ Gị—gịnị Bụ Nzube ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Gị—gịnị Bụ Nzube ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Iyi Bụ Isi nke Nghọta
  • Nzube n’Ihi Usoro Ndụ
  • Oge Ime Ezi Aha
  • “Ọrụ Mmadụ Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Sọlọmọn Bụ Eze Maara Ihe
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/15 p. 8-13

Ndụ Gị—gịnị Bụ Nzube ya?

“Obi m na-edu m n’amamihe . . . ruo mgbe m ga-ahụ ihe ezi ihe ahụ bụ nke dịịrị ụmụ mmadụ . . . ọnụ ọgụgụ ụbọchị ndụ ha.”—EKLISIASTIS 2:3.

1, 2. N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị ajọ ihe inwe mmasị ezi uche dị na ya n’onwe onye?

I NWERE mmasị n’onwe gị, ọ̀ bụ na i nweghị? Nke ahụ kwesịrị ekwesị. N’ihi ya anyị na-eri nri kwa ụbọchị, anyị na-ehi ụra mgbe ike gwụrụ anyị, ọ na-amasịkwa anyị iso ndị enyi na ndị a hụrụ n’anya nọkọọ. Mgbe ụfọdụ anyị na-egwuri egwu, gwuo mmiri, ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ na-atọ anyị ụtọ, na-egosipụta mmasị kwesịrị ekwesị n’onwe anyị.

2 Mmasị n’onwe onye dị otú ahụ kwekọrọ n’ihe Chineke kwaliri Solomọn ide: “Ọ dịghị ezi ihe dị n’ime mmadụ nke na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.” Na-adabere n’ahụmahụ, Solomọn gbakwụnyere, sị: “Nke a ka mụ onwe m hụkwara, na ọ bụ n’aka Chineke ka o sitere. N’ihi na ònye na-eri ihe, ma ọ bụ ònye na-eme ngwa iri ihe karịa m?”—Eklisiastis 2:24, 25.

3. Ajụjụ dịgasị aṅaa na-agbagwoju anya ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-apụghị ịza?

3 Ma ị maara na ndụ karịrị iri nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ihi ụra, na ime ihe ọma ụfọdụ. Anyị na-enwe ihe mgbu, mmechuihu, na nchekasị. Ọ na-eyikwa ka anyị ji ọrụ n’aka karị ịtụgharị uche ná nzube nke ndụ anyị. Nke ahụ ọ́ bụghị otú ọ dị gị? Vermont Royster, onye bụbu editọ The Wall Street Journal, mgbe ọ rịbasịrị ihe ọmụma na nkà anyị gbasawanyere agbasa ama, dere, sị: “Nke a bụ ihe siri ike nghọta. N’ịtụle mmadụ n’onwe ya, ọnọdụ ya nke amaghị ihe a ga-eme, ọnọdụ ya n’eluigwe na ala, anyị amaghị ihe dị ukwuu karịa mgbe anyị malitere. Anyị na ajụjụ banyere ndị anyị bụ na ihe mere anyị ji dịrị na ebe anyị na-aga ka nọ.”

4. N’ihi gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji chọọ inwe ike ịza ajụjụ ndị metụtara anyị?

4 Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ndị a: Ole ndị ka anyị bụ? Gịnị mere anyị ji nọrọ ebe a? Oleekwa ebe anyị na-aga? Na July gara aga, Maazị Royster nwụrụ. Ì chere na ka ọ na-erule mgbe ahụ ọ chọtawo azịza ndị na-eju afọ? Ịkpọtụkwu okwu aha, È nwere ụzọ ị pụrụ isi mee otú ahụ? Oleekwa otú nke a pụrụ isi nyere gị aka ịnụ ụtọ ndụ obi ụtọ kanụ, nke ka nwee nzube? Ka anyị lee.

Isi Iyi Bụ Isi nke Nghọta

5. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji legara Chineke anya mgbe anyị na-achọ nghọta banyere ajụjụ ndị metụtara nzube nke ndụ?

5 Ọ bụrụ na a hapụrụ nanị anyị ịchọta nzube nke ndụ anyị, anyị nwere ike nwee ihe ịga nke ọma dị nta ma ọ bụ ghara inwe ma ọlị, dị ka ọ bụworo eziokwu n’ebe ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị ikom na ndị inyom nọ, ọbụna ndị nwere mmụta na ahụmahụ dị ukwuu. Ma a hapụghị nanị anyị. Onye Okike anyị enyewo aka. Mgbe i chere banyere ya, ọ́ bụghị ya bụ Isi Iyi kasịnụ nke nghọta na amamihe, na-adị “mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi” ma na-enwe ozuzu ihe ọmụma nke eluigwe na ala na akụkọ ihe mere eme? (Abụ Ọma 90:1, 2) O kere ụmụ mmadụ, o kiriwokwa ahụmahụ dum nke mmadụ, ya mere ọ bụ ya bụ Onye anyị kwesịrị ilegara anya maka nghọta, ọ bụghị ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ha na ihe ọmụma na echiche ha a kpaara ókè.—Abụ Ọma 14:1-3; Ndị Rom 3:10-12.

6. (a) Olee otú Onye Okike anyị siworo nye nghọta dị mkpa? (b) Olee otú o si metụta Solomọn?

6 Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịtụ Onye Okike ahụ anya ịtakwụnye ná ntị anyị mkpughe banyere nzube nke ndụ, o nyewo isi iyi nke nghọta—Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ. (Abụ Ọma 32:8; 111:10) Akwụkwọ Eklisiastis bara uru kpọmkwem n’akụkụ nke a. Chineke nyere onye dere ya mmụọ nsọ, nke na ‘amamihe Solomọn bara ụba karịa amamihe ụmụ Ihu anyanwụ nile.’ (1 Ndị Eze 3:6-12; 4:30-34) “Amamihe Solomọn” masịrị otu onyeeze bịara nleta nke ukwuu nke na o kwuru na a kọbeghị ọkara ya nakwa na ndị na-anụrụ amamihe ya ga-enwe obi ụtọ n’ezie.a (1 Ndị Eze 10:4-8) Anyị onwe anyị kwa pụrụ inweta nghọta na obi ụtọ site n’amamihe Chineke nke Onye Okike anyị nyeworo site n’ọnụ Solomọn.

7. (a) Gịnị ka Solomọn kwubiri banyere ihe ka ukwuu n’ihe ndị a na-eme n’okpuru eluigwe? (b) Gịnị na-eme ihe atụ ntụle ezi uche dị na ya ndị Solomọn mere?

7 Eklisiastis na-egosipụta amamihe Chineke nyere, nke metụtara obi na ụbụrụ Solomọn. N’inwe oge, ihe onwunwe, na nghọta ime otú ahụ, Solomọn nyochara “ihe nile nke e meworo n’okpuru eluigwe.” Ọ hụrụ na ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime ya “bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe,” nke bụ ntụle sitere n’ike mmụọ nsọ nke anyị kwesịrị ibu n’uche mgbe anyị na-eche banyere nzube anyị ná ndụ. (Eklisiastis 1:13, 14, 16) Solomọn na-ekwu okwu n’ezoghị ọnụ, n’ezi uche. Dị ka ihe atụ, tụgharịa uche n’okwu ya ndị a na-ahụ n’Eklisiastis 1:15, 18. Ị maara na n’ime ọtụtụ narị afọ ndị na-agafenụ ụmụ mmadụ anwalewo ụdị ọchịchị dị iche iche, mgbe ụfọdụ na-eji ezi obi na-anwa ịgwọta nsogbu na ime ka ọnọdụ ndị mmadụ ka mma. Ma, ọ̀ dịwo nke doziri n’ezie ihe nile “gbagọrọ agbagọ” n’usoro ihe a na-ezughị okè? Ị pụrụ ịhụwokwa na ka ihe ọmụma mmadụ na-ehiwanye nne, otú ahụ ka ọ na-aghọtakwu nke ọma na n’ime oge ndụ dị mkpirikpi, o kweghị omume idozicha ihe nile. Mmata ihe dị otú ahụ na-ewetara ọtụtụ ndị obi nkoropụ, ma ọ bụghị iwu na ọ ga-ewetara anyị.

8. Usoro dịgasị aṅaa dịworo ogologo oge?

8 Isi ihe ọzọ a ga-atụle bụ usoro ihe ndị na-eme mgbe mgbe na-emetụta anyị, dị ka ọwụwa na ọdịda anyanwụ ma ọ bụ nrugharị nke ikuku na mmiri. Ha dịrị n’ụbọchị Mosis, Solomọn, Napoléon, na ndị nna nna anyị ochie. Ha ka na-adịkwa. N’otu aka ahụ, “otu ọgbọ alaa, ọgbọ ọzọ abịa.” (Eklisiastis 1:4-7) Site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọ dịghị oké ihe gbanwerenụ. Ndị mmadụ n’oge ochie na n’oge a enwewo ihe omume, olileanya, ọchịchọ, na nrụzu ihe a pụru iji tụnyere ibe ha. Ọ bụrụgodị na n’ụzọ mmadụ, mmadụ ụfọdụ mere aha dị ịrịba ama ma ọ bụ pụọ iche n’ịma mma ma ọ bụ ikike, olee ebe onye ahụ nọ ugbu a? Ọ lawo, eleghịkwa anya e chezọwo ya. Nke ahụ abụghị inwe nkụnwụ ahụ. Ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ apụghịdị ikwu aha nna nna ha ochie ma ọ bụ kwuo ebe a mụrụ ha na ebe e liri ha. Ị pụrụ ịhụ ihe mere Solomọn ji site n’ezi uche hụ ihe efu n’ihe omume na mgbalị ụmụ mmadụ.—Eklisiastis 1:9-11.

9. Olee otú inweta nghọta ezi uche dị na ya banyere ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi nyere anyị aka?

9 Kama ime ka obi koropụ anyị, nghọta Chineke nke a e nwere n’ọnọdụ bụ isi nke ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inwe mmetụta dị mma, na-akwali anyị izere iji ihe mgbaru ọsọ ma ọ bụ nchụso ndị ga-apụ n’anya, e chezọọkwa ha n’isi nso kpọrọ mkpa n’ụzọ na-ekwesịghị. O kwesịrị inyere anyị aka ịtụ ihe anyị na-enweta ná ndụ na ihe anyị na-anwa ịrụzu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Iji maa atụ, kama ịbụ ndị na-anapụ onwe ha ihe, anyị pụrụ inweta ọṅụ n’iri ihe na ịṅụ ihe n’ụzọ na-agafeghị ókè. (Eklisiastis 2:24) Ọzọ, dị ka anyị ga-ahụ, Solomọn ruru nkwubi okwu dị nnọọ mma ma na-enye olileanya. Ná mkpirikpi, ọ bụ na anyị kwesịrị inwe ekele miri emi maka mmekọrịta anyị na Onye Okike anyị, bụ́ onye pụrụ inyere anyị aka inwe ọdịnihu obi ụtọ ebighị ebi, nke nwere nzube. Solomọn kwusiri ike, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

Nzube n’Ihi Usoro Ndụ

10. N’ụzọ dị aṅaa ka Solomọn si jiri anụmanụ tụnyere mmadụ?

10 Amamihe Chineke e gosipụtara n’Eklisiastis pụrụ inyekwuru anyị aka n’ịtụle nzube anyị ná ndụ. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na Solomọn ji ezi uche lekwasị anya n’eziokwu ndị ọzọ ọ pụrụ ịbụ na anyị adịghị echekebe echiche banyere ha. Otu metụtara myirịta ndị dị n’etiti mmadụ na anụmanụ. Jisọs ji ụmụazụ ya tụnyere atụrụ, ma ndị mmadụ n’ozuzu ha adịghị achọ ka e jiri ha tụnyere ụmụ anụ. (Jọn 10:11-16) Ma Solomọn welitere eziokwu ụfọdụ a na-apụghị ịgbagha agbagha: “Chineke wee mee ka [ụmụ mmadụ] pụta ìhè, ka ha wee hụkwa, na ha onwe ha bụ anụmanụ, ha n’onwe ha. N’ihi na ihe na-adabara ụmụ mmadụ, ihe na-adabakwara anụmanụ; ọbụna otu ihe ahụ na-adabara ha: dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị; . . . ọ dịghịkwa ọkaaka mmadụ nwere karịa anụmanụ: n’ihi na ha nile bụ ihe efu. . . . Ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”—Eklisiastis 3:18-20.

11. (a) Olee otú a pụrụ isi kọwaa usoro ndụ otu anụmanụ? (b) Olee otú nkọwa dị otú ahụ si dị gị n’obi?

11 Chee banyere anụmanụ ị na-enwe mmasị ikiri, eleghị anya anụ rock badger ma ọ bụ ewi. (Deuterọnọmi 14:7; Abụ Ọma 104:18; Ilu 30:26) Ma ọ bụ ị pụrụ iche banyere ọsa; e nwere ihe karịrị ụdị 300 ya gburugburu ụwa. Gịnị bụ usoro ndụ ya? Mgbe a mụsịrị ya, nne ya na-azụ ya ruo izu ole na ole. Ngwa ngwa ọ na-enwe ajị ma nwee ike ịzọpụ ụkwụ èzí. Ị pụrụ ịhụ ka ọ na-agbagharị na-amụ ịchọ nri. Ma ọtụtụ mgbe ọ na-eyi nanị ka ọ na-egwuri egwu, na-anụ ụtọ oge ịdị obere ya. Mgbe o tosịrị ihe dị ka otu afọ, ọ na-achọta ibe ya. Mgbe ahụ ọ ghaghị iwu akwụ́ ma ọ bụ ọgba ma lekọta ụmụ. Ọ bụrụ na ọ chọta akwụ̀, akị, na mkpụrụ osisi zuru ezu, ezinụlọ ọsa ahụ pụrụ ịma abụba ma nwee oge ịgbasawanye ebe obibi ha. Ma n’ime nanị afọ ole na ole, anụmanụ ahụ na-aka nká ma nọrọkwuo n’ihe ize ndụ ihe ọghọm na ọrịa. N’ihe dị ka n’afọ iri ọ na-anwụ. N’inwe ntakịrị ọdịiche n’etiti ụdị ọsa dị iche iche, nke ahụ bụ usoro ndụ ya.

12. (a) N’ụzọ ezi uche dị na ya, n’ihi gịnị ka usoro ndụ ọtụtụ mmadụ ji dị ka nke anụmanụ nkịtị? (b) Gịnị ka anyị pụrụ iche banyere ya n’oge ọzọ anyị hụrụ anụmanụ nke anyị bu n’uche?

12 Ihe ka n’ụmụ mmadụ agaghị agbagha usoro ahụ maka anụmanụ, ọ ga-esikwa ike ha ịtụ anya ka ọsa nwee nzube e cheere echiche ná ndụ. Otú ọ dị, ndụ ọtụtụ mmadụ adịkebeghị iche na nke ahụ, ọ̀ dị? A na-amụ ma lekọta ha dị ka ụmụ ọhụrụ. Ha na-eri nri, na-eto, ma na-egwuri egwu dị ka ndị ntorobịa. N’oge na-adịghị anya ha na-abụ ndị tozuru okè, chọta ibe ha, ma chọrọ ebe obibi na ụzọ isi na-enweta nri. Ọ bụrụ na ọ gaara ha, ha pụrụ ibu ibu ma gbasawanye ebe obibi (akwụ́) ha ebe ha ga-anọ zụlite ụmụ. Ma ọtụtụ iri afọ ndị ahụ na-agafe ngwa ngwa, ha ewee kaa nká. Ma ọ bụghị tupu ya, ha pụrụ ịnwụ mgbe afọ 70 ma ọ bụ 80 jupụtara ‘n’ịdọgbu n’ọrụ na ajọ ihe’ gasịrị. (Abụ Ọma 90:9, 10, 12) Ị pụrụ iche banyere eziokwu ndị a na-akpali echiche mgbe ọzọ ị hụrụ ọsa (ma ọ bụ anụ ọzọ i bu n’uche).

13. Ihe ndabara dị aṅaa bụ eziokwu nye ma anụmanụ ma mmadụ?

13 Ị pụrụ ịhụ ihe mere Solomọn ji jiri ndụ ụmụ mmadụ tụnyere anụmanụ. O dere, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge . . . mgbe ịmụ nwa na mgbe ịnwụ anwụ.” Ihe ndabara nke ikpeazụ ahụ, ọnwụ, bụ otu ihe ahụ maka mmadụ na anụmanụ, “dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị.” O kwukwasịrị: “Ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”—Eklisiastis 3:1, 2, 19, 20.

14. Olee otú mmadụ ụfọdụ si anwa ịgbanwe usoro nkịtị nke ndụ, ma olee ihe ọ na-arụpụta?

14 Ọ dịghị mkpa na anyị ga-ewere ntụle a ezi uche dị na ya ịbụ echiche na-adịghị mma. Ee, ụfọdụ na-agbalị ịgbanwe ọnọdụ ahụ, dị ka site n’ịrụkwu ọrụ iji welite ọnọdụ ihe onwunwe ha karịa nke ndị mụrụ ha nwere. Ha pụrụ ịchụso ọtụtụ afọ karị nke agụmakwụkwọ iji nweta ọnọdụ ndụ ka elu, ka ha na-anwa ịgbasawanye nghọta ha ghọtara ndụ. Ma ọ bụ ha pụrụ ịtụkwasị uche ná mmega ahụ ma ọ bụ ụkpụrụ ihe oriri iji nweta ahụ ike ka mma na oge ndụ katụ ogologo. Mgbalị ndị a pụkwara iweta abamuru ụfọdụ. Ma ònye pụrụ ijide n’aka na mgbalị dịgasị otú ahụ ga-aga nke ọma? Ọ bụrụgodị na ha agaa nke ọma, ruo ole mgbe?

15. Ntụle ezoghị ọnụ dị aṅaa nke ndụ ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ bụ eziokwu?

15 Solomọn jụrụ, sị: “Ebe ọtụtụ okwu dị nke na-eme ka ihe efu baa ụba, gịnị ka mmadụ nwebigara ókè? N’ihi na ònye maara ihe dịịrị mmadụ mma ná ndụ ya, ọnụ ọgụgụ ụbọchị ndụ efu ya nke ọ na-eme dị ka onyinyo? n’ihi na ònye na-egosi mmadụ ihe ga-adị n’okpuru anyanwụ mgbe ọ gasịrị?” (Eklisiastis 6:11, 12) Ebe ọnwụ na-eweta mgbalị mmadụ ná njedebe ngwa ngwa, è nwere n’ezie uru dị n’ịgba mgba iji nwetakwuo ihe onwunwe ma ọ bụ n’ịchụso ọtụtụ ogologo afọ nke agụmakwụkwọ nanị iji nwetakwuo ihe? Ebe ndụ dịkwa nnọọ mkpụmkpụ, na-agabiga dị ka onyinyo, ọtụtụ na-aghọta na e nweghị oge iji chigharịa mgbalị ihu gaa n’ihe mgbaru ọsọ ọzọ nke mmadụ mgbe ha hụrụ ọdịda; mmadụ apụghịkwa ijide n’aka ihe ga-eme ụmụ ya “mgbe ọ gasịrị.”

Oge Ime Ezi Aha

16. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ime nke ụmụ anụmanụ na-apụghị ime? (b) Eziokwu ọzọ dị aṅaa kwesịrị imetụta echiche anyị?

16 N’adịghị ka anụmanụ, anyị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ikike ịtụgharị uche sị, ‘Gịnị bụ nzube nke ịdị adị m? Ọ̀ bụ nanị ịgba gburugburu a kara aka, na-enwe oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ?’ Banyere nke ahụ, cheta eziokwu dị n’okwu Solomọn banyere mmadụ na anụmanụ: “Ha nile na-alaghachikwa n’ájá.” Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọnwụ na-ewetacha ịdị adị mmadụ ná njedebe? Bible na-egosi na mmadụ enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-anọgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụrụ. Ụmụ mmadụ bụ mkpụrụ obi, mkpụrụ obi mehiere na-anwụkwa. (Ezikiel 18:4, 20) Solomọn mere ka okwu saa mbara: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha. Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 10.

17. Gịnị ka Eklisiastis 7:1, 2 kwesịrị ime ka anyị tụgharịa n’uche?

17 N’ihi eziokwu ahụ a na-apụghị izere ezere, tụlee okwu a: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya. Ọ dị mma ije n’ụlọ oruru újú, karịa ije n’ụlọ ọṅụṅụ mmanya vine: n’ihi na nke ahụ bụ nsọtụ mmadụ nile; onye dị ndụ ga-etinyekwa ya n’obi ya.” (Eklisiastis 7:1, 2) Anyị aghaghị ikwenye na ọnwụ abụwo “nsọtụ mmadụ nile.” Ọ dịghị mmadụ nweworo ike ịṅụ ọgwụ ọgwọ nnụ ọrịa ọ bụla, iri ngwakọta ọgwụ vitamin ọ bụla, ịgbaso ụkpụrụ iri nri ọ bụla, ma ọ bụ itinye aka ná mmega ahụ ọ bụla na-arụpụta ndụ agwụghị agwụ. Dị ka ọ na-adịkarịkwa “e chezọwo ncheta ha” n’oge na-adịghị anya ka ha nwụsịrị. Ya mere n’ihi gịnị ka ‘ezi aha ji dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ka ụbọchị ọnwụ mmadụ ji dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya’?

18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Solomọn kwenyere ná mbilite n’ọnwụ?

18 Dị ka a rịbara ama, Solomọn na-ekwu site n’ezi uche. Ọ maara banyere ndị nna nna ya Abraham, Aịsak, na Jekọb, ndị o doro anya na ha mere ezi aha n’ebe Onye Okike anyị nọ. N’ịma Abraham nke ọma, Jehova Chineke kwere nkwa ịgọzi ya na mkpụrụ ya. (Jenesis 18:18, 19; 22:17) Ee, Abraham nwere ezi aha n’ebe Chineke nọ, na-aghọ enyi ya. (2 Ihe Emere 20:7; Aịsaịa 41:8; Jemes 2:23) Abraham maara na ndụ ya na ndụ ọkpara ya abụghị nanị akụkụ nke usoro na-enweghị ọgwụgwụ nke ọmụmụ na ọnwụ. A ghaghị inwe ihe karịrị nke ahụ. Ha nwere atụmanya e ji n’aka nke ịdị ndụ ọzọ, ọ bụghị n’ihi na ha nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, kama n’ihi na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Obi siri Abraham ike na “Chineke pụrụ ime ka [Aịsak] si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Ndị Hibru 11:17-19.

19. Nghọta dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ọnụ Job banyere ihe Eklisiastis 7:1 pụtara?

19 Nke ahụ bụ ụzọ isi ghọta otú “ezi aha [si] dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” Dị ka Job biri ndụ tupu ya, obi siri Solomọn ike na Onye kere ndụ mmadụ pụrụ iweghachi ya. Ọ pụrụ iweghachi ụmụ mmadụ nwụworonụ ná ndụ. (Job 14:7-14) Job kwesịrị ntụkwasị obi sịrị: “Ị [Jehova] ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.” (Job 14:15) Chee banyere nke ahụ! Maka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nwụworonụ, Onye Okike anyị nwere “agụụ.” (“Ị ga-achọ ịhụ ọrụ aka gị ọzọkwa.”—The Jerusalem Bible.) Itinye àjà mgbapụta Jisọs Kraịst n’ọrụ, Onye Okike anyị pụrụ ịkpọlite ụmụ mmadụ. (Jọn 3:16; Ọrụ 24:15) N’ụzọ doro anya, ụmụ mmadụ pụrụ ịdị iche n’ebe ụmụ anụ nkịtị nwụrụ anwụ dị.

20. (a) Olee mgbe ụbọchị ọnwụ na-aka ụbọchị ọmụmụ mma? (b) Olee otú mkpọlite n’ọnwụ Lazarọs na-aghaghị isiwo metụta ọtụtụ ndị?

20 Nke a pụtara na ụbọchị ọnwụ pụrụ ịka ụbọchị ọmụmụ mmadụ mma, ma ọ bụrụ na mmadụ ewulitewo ezi aha mgbe ahụ n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye pụrụ ịkpọlite ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Solomọn Ka Ukwu, bụ́ Jisọs Kraịst, nwapụtara nke ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ kpọlitere nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Lazarọs bịaghachi ná ndụ. (Luk 11:31; Jọn 11:1-44) Dị ka ị pụrụ iche, ọtụtụ n’ime ndị kiriri Lazarọs ịlọghachi ná ndụ nwere mmetụta dị omimi, na-enwe okwukwe n’Ọkpara Chineke. (Jọn 11:45) Ì chere na ọ dịrị ha ka ha enweghị nzube ná ndụ, n’enweghị echiche ọ bụla banyere ndị ha bụ na ebe ha na-eje? N’ụzọ megidere nke ahụ, ha pụrụ ịhụ na ọ bụghị iwu na ha ga-abụ ụmụ anụ nkịtị a na-amụ, bie ndụ nwa oge, wee nwụzie. Nzube ha ná ndụ bụ nke e jikọtara kpọmkwem na n’ụzọ a na-apụghị ikewapụ ekewapụ ya na ịmara Nna Jisọs na ime uche Ya. Gịnị banyere gị? Ntụle nke a ò nyeworo gị aka ịhụ, ma ọ bụ ịhụ nke ọma karị, ụzọ ndụ gị pụrụ ma kwesị inwe ezi nzube?

21. Akụkụ dị aṅaa nke ịchọta nzube ná ndụ anyị ka anyị ka chọrọ inyocha?

21 Ma, inwe ezigbo nzube na nke bara uru n’ịdị ndụ pụtara ihe karịrị nke ukwuu iche banyere ọnwụ na ịdị ndụ ọzọ mgbe e mesịrị. Ọ na-agụnye ihe anyị ji ndụ anyị na-eme kwa ụbọchị. Solomọn mekwara ka nke ahụ doo anya n’Eklisiastis, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “Akụkọ banyere Eze Nwanyị Sheba na-emesi amamihe Solomọn ike, ọtụtụ mgbe a kpọwokwa akụkọ ahụ akụkọ mgbe ochie (1 K. 10:1-13). Ma ihe ndị dị ya gburugburu na-egosi na e jikọrọ nleta o letara Solomọn n’ezie na azụmahịa, n’ihi ya kwa bụrụ ihe a pụrụ ịghọta; ịbụ ihe mere eme ya ekwesịghị mgbagha.”—The International Standard Bible Encyclopedia (1988), Mpịakọta nke Anọ, peji nke 567.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ iji anụmanụ tụnyere mmadụ?

◻ N’ihi gịnị ka ọnwụ ji emesi ike na ihe dị ukwuu ná mgbalị na ihe omume mmadụ bụ ihe efu?

◻ Olee otú ụbọchị ọnwụ pụrụ isi ka ụbọchị ọmụmụ mma?

◻ Anyị inwe nzube bara uru ná ndụ dabeere ná mmekọrịta dị aṅaa?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Olee otú ndụ gị si dị iche n’ụzọ dị ịrịba ama site na nke ụmụ anụmanụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya