-
Anyị Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Tie Mkpu ỌṅụỤlọ Nche—1996 | Febụwarị 15
-
-
“Obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”—AỊSAỊA 35:10.
-
-
Anyị Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Tie Mkpu ỌṅụỤlọ Nche—1996 | Febụwarị 15
-
-
3. Okwu ndị dị aṅaa nwere ihe ha pụtara kwesịrị ka anyị leba ha anya, n’ihi gịnịkwa?
3 Cheta okwu Jisọs: “Ihe ndị a ka M gwaworo unu, ka ọṅụ m wee dị n’ime unu, ka ọṅụ unu wee zuokwa.” (Jọn 15:11) “Ka ọṅụ unu wee zuokwa.” Lee aha nkọwa nke a bụ! Ịmụ ụzọ ibi ndụ nke ndị Kraịst n’ụzọ dị omimi ga-ekpughe ọtụtụ ihe ndị mere ọṅụ anyị ga-eji zuokwa. Ma ka ọ dị ugbu a, rịba ama okwu ndị nwere ihe ha pụtara n’Aịsaịa 35:10. Ndị a nwere ihe ha pụtara n’ihi na ha gbasara anyị n’ụzọ dị ukwuu taa. Anyị na-agụ, sị: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alatakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”
4. Ụdị ọṅụ dị aṅaa ka e hotara n’Aịsaịa 35:10, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji lebara nke a anya?
4 “Ọṅụ ebighị ebi.” Okwu ahụ bụ́ “ebighị ebi” bụ nsụgharị ziri ezi nke ihe Aịsaịa dere n’asụsụ Hibru. Ma, dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ gosiri, isi ihe dị n’amaokwu a bụ “mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 45:6; 90:2; Aịsaịa 40:28) Ya mere ọṅụ ahụ agaghị agwụ agwụ, n’ọnọdụ ndị ga-ekwe ka ọṅụ ebighị ebi dịrị—ee, nye ezi ihe mere a ga-eji nwee ya. Nke ahụ ọ́ dịghị ada ka ihe obi ụtọ? Otú ọ dị, ma eleghị anya amaokwu ahụ dara gị ná ntị ka okwu nke ọnọdụ a na-akọ nanị n’ọnụ, na-eme ka ị na-eche, sị: ‘Nke ahụ emetụtaghị m n’ezie ruo n’ókè nke nsogbu na nchegbu ndị m na-enwe kwa ụbọchị na-eme.’ Ma eziokwu ndị e nwere na-egosi ihe dị iche. Nkwa amụma ahụ dị n’Aịsaịa 35:10 nwere ihe ọ pụtaara gị taa. Iji chọpụta otú o si dị otú a, ka anyị nyochaa isiakwụkwọ a mara mma, Aịsaịa 35, na-arịba ama akụkụ ọ bụla dabere n’ihe ndị gbara ya gburugburu. Jide n’aka na ihe anyị ga-achọpụta ga-atọ gị ụtọ.
-