Isi nke Iri Abụọ na Itoolu
E Nye Ụgwọ Ọrụ Maka Okwukwe nke Otu Eze
1, 2. Olee otú Hezekaịa si gosi na ya bụ ezigbo eze karịa Ehaz?
HEZEKAỊA dị afọ 25 mgbe ọ ghọrọ eze Juda. Ụdị onye ọchịchị dị aṅaa ka ọ ga-abụ? Ọ̀ ga-agbaso nzọụkwụ nna ya, bụ́ Eze Ehaz, ma mee ka ndị ọ na-achị jesoo chi ụgha? Ka ọ̀ ga-edu ndị ahụ n’ofufe Jehova, dị ka nna nna ya, bụ́ Eze Devid, mere?—2 Ndị Eze 16:2.
2 Ngwa ngwa Hezekaịa ghọsịrị eze, ọ bịara doo anya na o bu n’obi ‘ime ihe ziri ezi n’anya Jehova.’ (2 Ndị Eze 18:2, 3) N’ime afọ mbụ ya, o nyere iwu ka e dozie ụlọukwu Jehova, ka a maliteghachikwa ozi ụlọ nsọ. (2 Ihe E Mere 29:3, 7, 11) O meziri ndokwa ka e mee nnukwute Ememe Ngabiga bụ́ nke a kpọrọ mba ahụ dum òkù ịbịa—gụnyere ebo iri dị n’ebe ugwu nke Israel. Lee ememe a na-agaghị echefu echefu ọ bụ! Ọ dịbeghị nke dị ka ya eri oge Eze Solomọn.—2 Ihe E Mere 30:1, 25, 26.
3. (a) Gịnị ka ndị bi n’Israel na Juda bụ́ ndị bịara Ememe Ngabiga ahụ Hezekaịa mere ndokwa ya mere? (b) Gịnị ka ndị Kraịst taa na-amụta site n’ihe pụtara ìhè ndị bịara Ememe Ngabiga ahụ mere?
3 Mgbe e mesịrị Ememe Ngabiga ahụ, a kpaliri ndị bịaranụ igbutu Asherim nile, ititu ogidi nile, ịkwatu ebe nile dị elu na ebe ịchụàjà nke chi ụgha ha dị iche iche, ha wee laghachi n’obodo ha ka e mesịrị, kpebisie ike ijere ezi Chineke ahụ ozi. (2 Ihe E Mere 31:1) Lee ka nke ahụ si dị iche n’àgwà okpukpe ha na mbụ! Ezi ndị Kraịst taa pụrụ ịmụta site na nke a mkpa ọ dị ‘ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe ha.’ Nzukọ ndị dị otú ahụ, ma hà bụ n’ọgbakọ ma hà bụ n’ụzọ buru ibu karị ná mgbakọ dị iche iche, na-arụ ọrụ dị mkpa na ha inweta agbamume na ịbụ ndị òtù ụmụnna nakwa mmụọ Chineke kpaliri “ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.”—Ndị Hibru 10:23–25.
A Nwalee Okwukwe
4, 5. (a) Olee otú Hezekaịa si gosipụta na ya adabereghị n’Asiria? (b) Ihe omume agha dị aṅaa ka Senakerib meworo megide Juda, gịnịkwa ka Hezekaịa mere ka a ghara ịwakpo Jerusalem ozugbo? (ch) Olee otú Hezekaịa si kwadebe ichebe Jerusalem pụọ n’aka ndị Asiria?
4 Ule siri ike na-echere Jerusalem. Hezekaịa emebiwo njikọ aka nke nna ya na-enweghị okwukwe, bụ́ Ehaz, so ndị Asiria nwee. O meriwo ọbụna ndị Filistia, ndị ha na Asiria jikọrọ aka. (2 Ndị Eze 18:7, 8) Nke a akpasuwo eze Asiria iwe. N’ihi ya, anyị na-agụ, sị: “O ruo, n’afọ nke iri na anọ nke eze, bụ́ Hezekaịa, na Senakerib, bụ́ eze Asiria, rịgoro imegide obodo nile e wusiri ike nke Juda, were ha.” (Aịsaịa 36:1) Hezekaịa kwetara ịtụ ụtụ buru ibu, bụ́ talent ọlaọcha 300 na talent ọlaedo 30, nye Senakerib, ikekwe na-enwe olileanya ichebe Jerusalem ka ndị agha Asiria ike na-adịghị agwụ agwụ ghara ịwakpo Jerusalem ozugbo.a—2 Ndị Eze 18:14.
5 Ebe ọ bụ na ọlaedo na ọlaọcha dị n’ebe ndebe akụ̀ eze ezughị iji tụọ ụtụ ahụ, Hezekaịa weere ọla ọ bụla dị oké ọnụ ahịa ọ hụrụ n’ụlọukwu ahụ. Ọ kwatukwara ibo ụzọ nke ụlọukwu ahụ, bụ́ ndị e ji ọlaedo machite, ma zigara ha Senakerib. Nke a mere ka obi dajụọ onye Asiria ahụ, ma ọ bụ nanị ruo nwa oge. (2 Ndị Eze 18:15, 16) Dị ka ihe àmà gosiri, Hezekaịa ghọtara na ndị Asiria agaghị ahapụ Jerusalem aka ruo ogologo oge. N’ihi ya, a ghaghị ime nkwadebe. Ndị ahụ gbochiri ebe ndị Asiria na-eme mwakpo pụrụ isi nweta mmiri. Hezekaịa wusikwara ihe nchebe Jerusalem ike, kwakọbakwa ngwá agha, gụnyere “ihe agha na ọta n’ụba.”—2 Ihe E Mere 32:4, 5.
6. N’ònye ka Hezekaịa tụkwasịrị obi?
6 Otú ọ dị, Hezekaịa atụkwasịghị obi n’atụmatụ agha e ji akọ mee ma ọ bụ n’ihe nchebe, kama n’ebe Jehova nke usuu nile nke ndị agha nọ. Ọ dụrụ ndị ọchịagha ya ọdụ, sị: “Dịnụ ike nweekwa ume, unu atụla egwu atụkwala ụjọ n’ihi eze Asiria, ma ọ bụ n’ihi ìgwè ahụ nile nke nọnyeere ya: n’ihi na nke nọnyeere anyị dị ọtụtụ karịa nke nọnyeere ya: nke nọnyeere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ; ma Nke nọnyeere anyị bụ Jehova, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha nile anyị.” Ná nzaghachi, ndị ahụ malitere ‘ịdabere n’elu okwu nile nke Hezekaịa, bụ́ eze Juda.’ (2 Ihe E Mere 32:7, 8) Jiri anya nke uche lee ihe omume na-akpali akpali sochirinụ ka a na-atụle isi nke 36 ruo nke 39 nke amụma Aịsaịa.
Rabshake Ezie Ozi Ya
7. Ònye bụ Rabshake, n’ihi gịnịkwa ka e ji ziga ya Jerusalem?
7 Senakerib zipụrụ Rabshake (utu aha agha, ọ bụghị aha aka) tinyere mmadụ abụọ ọzọ selitere isi n’ọkwá ịga Jerusalem gwa obodo ahụ ka ọ chịlie aka elu. (2 Ndị Eze 18:17) Ndị nnọchianya atọ nke Hezekaịa, bụ́ Elaịakim, onyeisi ụlọ Hezekaịa, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye ncheta, gakwuuru ha ná mpụga mgbidi obodo ahụ.—Aịsaịa 36:2, 3.
8. Olee otú Rabshake si gbalịa imebi nguzogide nke Jerusalem?
8 Nzube Rabshake doro anya—mee ka Jerusalem kweta ịchịli aka elu n’alụghị agha ọ bụla. N’asụsụ Hibru, o bu ụzọ tie mkpu, sị: “Gịnị bụ ntụkwasị obi a nke i ji tụkwasị obi? . . . Ònye ka ị tụkwasịworo obi, na i nupụwo isi n’okpuru m?” (Aịsaịa 36:4, 5) Mgbe ahụ Rabshake kwara ndị Juu ahụ ụjọ ji emo, na-echetara ha na ha nọ nnọọ nanị ha. Ònye ka ha pụrụ ịgakwuru maka enyemaka? Ọ̀ bụ “mkpanaka amị [ahụ] a pịara apịa,” bụ́ Ijipt? (Aịsaịa 36:6) N’oge a, Ijipt yiri nnọọ mkpanaka amị a pịara apịa; n’ezie, Etiopia emeriwo mba a bụbu ike ọchịchị ụwa ruo nwa oge, Fero nke nọkwa na-achị Ijipt n’oge a, bụ́ Eze Tiahaka, abụghị onye Ijipt kama onye Etiopia. Asiria na-agakwa imeri ya. (2 Ndị Eze 19:8, 9) Ebe Ijipt na-apụghị ịzọpụta onwe ya, ọ gaghị enyechara Juda aka.
9. Dị ka ihe àmà gosiri, gịnị mere ka Rabshake kwubie na Jehova ga-agbahapụ ndị Ya, ma olee nke bụ́ eziokwu?
9 Ugbu a, Rabshake rụrụ ụka na Jehova agaghị alụrụ ndị Ya ọgụ n’ihi na obi adịghị Ya ụtọ n’ebe ha nọ. Rabshake kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị sị m, Ọ bụ Jehova, bụ́ Chineke anyị, ka anyị tụkwasịworo obi: ọ́ bụghị Onye ahụ bụ Onye Hezekaịa wezụgara ebe Ya nile dị elu na ebe ịchụàjà Ya nile?” (Aịsaịa 36:7) N’ezie, kama ịbụ ndị jụrụ nnọọ Jehova site n’ịkwatu ebe ndị dị elu na ebe ịchụàjà ndị dị n’ala ahụ, n’ezie ndị Juu alaghachikwutewo Jehova.
10. N’ihi gịnị ka ọ na-enweghị ihe o mere ma ndị nchebe Juda hà dị ọtụtụ ma hà dị ole na ole?
10 Rabshake chetaziiri ndị Juu na a ka ha nnọọ ike ma a bịa n’agha. O kwuru okwu ịma aka mpako a, sị: “Ka m nyekwa gị [puku ịnyịnya abụọ], ọ bụrụ na ị pụrụ inyere onwe gị ndị ga-anọkwasị ha.” (Aịsaịa 36:8) Otú ọ dị, n’eziokwu, ọ̀ dị ihe o mere ma ndị ịnyịnya a zụrụ azụ nke Juda hà dị ọtụtụ ma hà dị ole na ole? Ee e, n’ihi na nzọpụta Juda adabereghị n’inwe ike ka ukwuu n’agha. Ilu 21:31 si otú a kọwaa ọnọdụ ahụ: “Ịnyịnya bụ ihe a na-edoziri ụbọchị agha: ma Jehova nwe nzọpụta.” Rabshake kwuziri na ọ bụ ndị Asiria ka ngọzi Jehova dịkwasịrị, ọ bụghị ndị Juu. Ma ọ bụghị ya, ka ọ rụrụ n’ụka, ndị Asiria agaraghị abanyeru ebe ha banyeruru n’ókèala Juda.—Aịsaịa 36:9, 10.
11, 12. (a) N’ihi gịnị ka Rabshake ji sie ọnwụ ikwu okwu “n’asụsụ ndị Juu,” oleekwa otú o si gbalịa ịnwa ndị Juu na-ege ntị ọnwụnwa? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ihe Rabshake kwuru pụrụ inwe n’ahụ ndị Juu?
11 Ihe na-echegbu ndị nnọchianya Hezekaịa bụ mmetụta arụmụka Rabshake ga-enwe n’ahụ ndị ikom pụrụ ịnụ ihe ọ na-ekwu site n’elu mgbidi obodo ahụ. Ndị isi a nke ndị Juu rịọrọ ya, sị: “Biko, gwa ndị ohu gị okwu n’asụsụ Siria; n’ihi na anyị onwe anyị na-anụ ya: agwakwala anyị okwu n’asụsụ ndị Juu, ná ntị ndị nọ n’elu mgbidi.” (Aịsaịa 36:11) Ma Rabshake ezubeghị ikwu okwu n’asụsụ Siria. Ọ chọrọ ịkụnye obi abụọ na ụjọ n’ime ndị Juu ka ha wee chịlie aka elu nakwa ka e wee nwee ike imeri Jerusalem n’alụghị agha! (Aịsaịa 36:12) N’ihi ya, onye Asiria ahụ kwughachiri okwu “n’asụsụ ndị Juu.” Ọ dọrọ ndị bi na Jerusalem aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka Hezekaịa rafuo unu: n’ihi na ọ pụghị ịnapụta unu.” Mgbe o kwusịrị nke a, ọ gbalịrị ịnwa ndị na-ege ntị ọnwụnwa site n’ịkọwa otú ndụ pụrụ ịdịrị ndị Juu n’okpuru ọchịchị Asiria: “Meerenụ m ihe ngọzi, pụkwutekwa m; riekwanụ, nwoke ọ bụla mkpụrụ vine ya, na nwoke ọ bụla mkpụrụ osisi fig ya, ṅụọkwanụ, nwoke ọ bụla mmiri olulu mmiri ya: ruo mgbe m bịara chịrị unu jee n’ala dị ka ala unu, bụ́ ala ọka na mmanya vine ọhụrụ, ala achịcha na ubi vine.”—Aịsaịa 36:13–17.
12 Ndị Juu agaghị ewe ihe ubi n’afọ a—mwakpo ndị Asiria gbochiri ha ịkọ ihe. Atụmanya nke iri mkpụrụ vine dị mma na ịṅụ mmiri jụrụ oyi aghaghị ịdọrọ nnọọ mmasị nke ndị ikom nọ n’elu mgbidi na-ege ntị. Ma Rabshake akwụsịbeghị ịgbalị ime ka ike gwụ ndị Juu.
13, 14. N’agbanyeghị arụmụka Rabshake, n’ihi gịnị ka ihe mere Sameria na-ejighị daba n’ọnọdụ Juda?
13 N’arụmụka ya, Rabshake kwuru okwu ịkwa emo ọzọ. Ọ dọrọ ndị Juu aka ná ntị ka ha ghara ikwenyere Hezekaịa ma ọ bụrụ na ọ sị: “Jehova ga-anapụta anyị.” Rabshake chetaara ndị Juu na chi dị iche iche nke Sameria egbochilighị ebo iri ahụ ịbụ ndị ndị Asiria bibiri. Oleekwa banyere chi nile nke mba ndị ọzọ Asiria meriworo? “Olee ebe chi nile nke Hemat na Apad dị?” ka ọ jụrụ. “Olee ebe chi nile nke Sefavaim dị? hà anapụtawokwa Sameria n’aka m?”—Aịsaịa 36:18–20.
14 N’ezie, Rabshake, bụ́ onye na-efe chi ụgha, aghọtaghị na e nwere nnukwute ọdịiche dị n’etiti ndị Sameria si n’ezi ofufe dapụ na Jerusalem nọ n’okpuru ọchịchị Hezekaịa. Ike adịghị chi ụgha dị iche iche nke Sameria ịzọpụta alaeze ebo iri ahụ. (2 Ndị Eze 17:7, 17, 18) N’aka nke ọzọ, Jerusalem nke nọ n’okpuru ọchịchị Hezekaịa, agbakụtawo chi ụgha dị iche iche azụ ma laghachi n’ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, ndị nnọchianya atọ ahụ nke Juda agbalịwaghị ịkọwara Rabshake nke a. “Ha gbara nkịtị, ha azaghịkwa ya okwu: n’ihi na ihe eze nyere n’iwu bụ nke a, sị, Unu azala ya.” (Aịsaịa 36:21) Elaịakim, Shebna, na Joa laghachikwuuru Hezekaịa ma kọọrọ ya ihe Rabshake kwuru.—Aịsaịa 36:22.
Hezekaịa Emee Mkpebi
15. (a) Mkpebi dị aṅaa na-eche Hezekaịa ihu ugbu a? (b) Mmesighachi obi ike dị aṅaa ka Jehova nyere ndị ya?
15 Ugbu a Eze Hezekaịa nwere mkpebi ọ ga-eme. Jerusalem ọ̀ ga-achịliri ndị Asiria aka elu? soro ndị Ijipt jikọọ aka? ka ọ̀ ga-akwụrụ buo agha? Hezekaịa nọ n’oké nrụgide. Ọ gara n’ụlọukwu Jehova, ka ọ na-ezipụ Elaịakim na Shebna, tinyere ndị okenye ndị nchụàjà, ịga jụọ Jehova ase site n’ọnụ onye amụma, bụ́ Aịsaịa. (Aịsaịa 37:1, 2) Ka ha yi ákwà mkpe, ndị ozi ahụ eze zipụrụ gakwuuru Aịsaịa, na-asị: “Ụbọchị ahụhụ na ịba mba na nlelị anya ka ụbọchị taa bụ . . . Eleghị anya Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-anụ okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bụ́ onyenwe ya, ziteworo ịta Chineke dị ndụ ụta, eleghị anya Ọ ga-abara okwu nile nke Jehova, bụ́ Chineke gị, nụworo mba.” (Aịsaịa 37:3–5) Ee, ndị Asiria na-ama Chineke dị ndụ aka! Jehova ọ̀ ga-aṅa ntị n’ịkwa emo ha? Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova mesighachiri ndị Juu obi ike, sị: “Atụla egwu n’ihi okwu nile nke ị nụworo, nke ndị na-ejere eze Asiria ozi jiri kwuluo m. Lee, M na-etinye otu mmụọ n’ime ya, ọ ga-anụkwa akụkọ, laghachi n’ala ya; m ga-emekwa ka ọ daa site ná mma agha n’ala ya.”—Aịsaịa 37:6, 7.
16. Akwụkwọ ozi dị aṅaa ka Senakerib zigara?
16 Ka ọ dịgodị, a kpọrọ Rabshake òkù ịnọ n’akụkụ Senakerib mgbe eze ahụ na-ebu agha na Libna. Senakerib ga-eme ihe banyere Jerusalem ma e mesịa. (Aịsaịa 37:8) Ma, ọpụpụ Rabshake emeghị ka nrụgide Hezekaịa belata. Senakerib zigara akwụkwọ ozi iyi egwu, na-akọwa ihe ndị bi na Jerusalem pụrụ ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na ha ajụ ịchịli aka elu: “Gị onwe gị anụwo ihe ndị eze Asiria meworo ala nile, n’iwezụga ha ka e bibie ha: à ga-anapụtakwa gị onwe gị? chi nile nke mba nile ọzọ, hà anapụtawo ha, bụ́ ndị nna m hà bibiworo? . . . Olee ebe eze Hemat dị, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?” (Aịsaịa 37:9–13) N’ezie, onye Asiria ahụ na-ekwu na ọ baghị uru isi ọnwụ—isi ọnwụ ga-akpatakwu nanị nsogbu!
17, 18. (a) Gịnị bụ ebumnobi Hezekaịa n’ịrịọ Jehova nchebe? (b) Gịnị ka Jehova zara onye Asiria ahụ site n’ọnụ Aịsaịa?
17 N’ịnọ n’oké nchegbu banyere ihe ndị ga-esi ná mkpebi ọ na-aghaghị ime pụta, Hezekaịa gbasara akwụkwọ ozi Senakerib n’ihu Jehova n’ụlọukwu ahụ. (Aịsaịa 37:14) N’ekpere si ya n’ala ala obi, ọ rịọrọ Jehova ka o gee ntị n’iyi egwu onye Asiria ahụ, ma mechie ekpere ya site n’ikwu, sị: “Ma ugbu a, Jehova, bụ́ Chineke anyị, zọpụta anyị n’aka ya, ka alaeze nile nke ụwa wee mara na Gị onwe gị bụ Jehova, nanị Gị.” (Aịsaịa 37:15–20) Site na nke a, o doro anya na isi ihe na-echegbu Hezekaịa abụghị mgbapụta nke ya, kama nkọcha a ga-akọcha aha Jehova ma ọ bụrụ na Asiria emerie Jerusalem.
18 Azịza Jehova nye ekpere Hezekaịa bịara site n’ọnụ Aịsaịa. Jerusalem agaghị achịliri Asiria aka elu; ọ ghaghị ịkwụsi ike. N’ikwu okwu dị ka ọ na-agwa Senakerib, Aịsaịa ji anyaike zie ozi Jehova ziri onye Asiria ahụ, sị: “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, bụ́ ada Zaịọn elelịwo gị anya, chịnye gị ihere n’ihu; ada Jerusalem efufewo isi n’azụ gị [n’ịkwa emo].” (Aịsaịa 37:21, 22) Jehova kwukwasịziri, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Ị̀ bụ onye, ị ga-eji kwaa Onye Nsọ nke Israel emo? Amaara m ọrụ gị. I nwere oké ọchịchọ; ị na-etu ọnụ nke ukwuu. Ị tụkwasịwo obi n’ike agha gị, i meriwokwa ọtụtụ ala. Ma ọ pụtaghị na a pụghị imeri gị emeri. M ga-emebi atụmatụ gị. M ga-emeri gị. Mgbe ahụ, m ga-eme gị ihe i meworo ndị ọzọ. M ga-etinye nkò n’imi gị ma duru gị laghachi Asiria!’—Aịsaịa 37:23–29.
“Nke A Ga-abụrụ Gị Ihe Ịrịba Ama”
19. Ihe ịrịba ama dị aṅaa ka Jehova nyere Hezekaịa, gịnịkwa ka ọ pụtara?
19 Mmesi obi ike dị aṅaa ka Hezekaịa nwere na amụma Aịsaịa ga-emezu? Jehova na-aza, sị: “Nke a ga-abụrụ gị ihe ịrịba ama: unu ga-eri n’afọ a ihe na-epu n’onwe ya, na n’afọ nke abụọ ihe si na nke ahụ puo; ma n’afọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ, weekwa ihe ubi, kụọkwa vine n’ubi vine, riekwa mkpụrụ ha.” (Aịsaịa 37:30) Jehova ga-enye ndị Juu ahụ a nọchibidoro ihe oriri. Ọ bụ ezie na ha enweghị ike ịkụ mkpụrụ n’ihi nnọchibido nke ndị Asiria, ha ga-enwe ike iri ihe ndị ha chịkọtara site n’ihe ndị fọdụrụ n’owuwe ihe ubi nke afọ gara aga. N’afọ na-eso ya, bụ́ afọ izu ike, ha aghaghị ịhapụ ala ha ka ọ nọrọ n’akọghị ya akọ, n’agbanyeghị ajọ ọnọdụ ha nọ na ya. (Ọpụpụ 23:11) Jehova kwere nkwa na ọ bụrụ na ndị ahụ egee ntị n’olu ya, ọka ga-ezunụ ga-epupụta n’ubi iji kwado ha. N’afọ na-esozi ya, ndị mmadụ ga-akụ mkpụrụ dị ka ha na-emebu ma rie mkpụrụ sitere ná ndọlị ha.
20. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị lanarịrị mwakpo ndị Asiria ga-esi ‘gbagide mkpọrọgwụ n’ala n’okpuru ọzọ, mịakwa mkpụrụ n’elu’?
20 Jehova jizi ndị ya tụnyere ihe ọkụkụ nke a na-apụghị ifopụ n’ụzọ dị mfe: “Ndị gbapụrụ agbapụ nke ụlọ Juda . . . ga-agbagidekwa mkpọrọgwụ n’ala n’okpuru ọzọ, mịakwa mkpụrụ n’elu.” (Aịsaịa 37:31, 32) Ee, ndị tụkwasịrị Jehova obi enweghị ihe ha ga na-atụ egwu ya. Ha na ụmụ ha ga-anọgidesi ike n’ala ahụ.
21, 22. (a) Gịnị ka e buru n’amụma banyere Senakerib? (b) Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si mezuo ihe Jehova kwuru banyere Senakerib?
21 Gịnị banyere iyi egwu ndị Asiria yiri Jerusalem? Jehova na-aza, sị: “Ọ gaghị aba n’obodo a, ọ gaghị agba otu akụ́ n’ebe ahụ, ọ gaghị ewerekwa ọta bịa n’ihu ya, ọ gaghị awụkọtakwa ihe ntụkọba imegide ya. N’ụzọ o siri bịa, n’ụzọ ahụ ka ọ ga-alaghachi, ọ gaghị abakwa n’obodo a.” (Aịsaịa 37:33, 34) E kwuwerị, Asiria na Jerusalem agaghị alụ agha. N’ụzọ na-eju anya, ọ bụ ndị Asiria, ọ bụghị ndị Juu, ka a ga-emeri n’alụghị agha.
22 Dị ka o kwuru, Jehova zipụrụ otu mmụọ ozi nke tigburu ndị agha kasị mma nke Senakerib—ndị ikom 185,000. O yiri ka nke a o mere na Libna, Senakerib n’onwe ya tetakwara wee hụ na ndị ndú, ndị isi, na ndị dike nke usuu ndị agha ya anwụọla. N’ihu ihere, ọ laghachiri Nineve, ma n’agbanyeghị oké mmeri e meriri ya, ọ gbara isi akwara nọgide na-efe chi ụgha ya bụ́ Nisrok. Afọ ole na ole n’ihu, mgbe Senakerib nọ na-efe ofufe n’ụlọ nsọ Nisrok, ụmụ ya ndị ikom abụọ gburu ya. Ọzọkwa, ike adịghị Nisrok na-adịghị ndụ inye nzọpụta.—Aịsaịa 37:35–38.
E Wusikwuo Okwukwe Hezekaịa Ike
23. Nsogbu dị aṅaa ka Hezekaịa chere ihu mgbe mbụ Senakerib wakporo Juda, gịnịkwa ga-esi ná nsogbu a pụta?
23 N’ihe dị ka n’oge mbụ Senakerib wakporo Juda, Hezekaịa dara oké ọrịa. Aịsaịa gwara ya na ọ gaje ịnwụ. (Aịsaịa 38:1) O wutere eze ahụ dị afọ 39 nke ukwuu. Nchegbu ya abụghị nanị maka ọdịmma nke ya kamakwa maka ọdịnihu nke ndị ahụ. Jerusalem na Juda nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị Asiria wakporo. Ọ bụrụ na Hezekaịa anwụọ, ònye ga-eduzi agha ahụ? N’oge ahụ, Hezekaịa enweghị nwa nwoke ọ bụla ga-eweghara ịchịisi. N’ekpere sitere n’ala ala obi, Hezekaịa rịọrọ Jehova ka o meere ya ebere.—Aịsaịa 38:2, 3.
24, 25. (a) Olee otú Jehova si zaa ekpere Hezekaịa n’obi ebere? (b) Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jehova rụrụ, dị ka a kọwara n’Aịsaịa 38:7, 8?
24 Aịsaịa esibeghị n’obí ahụ pụọ mgbe Jehova ziri ya ozi ọzọ ọ ga-agaghachi zie eze ahụ dina n’àkwà ọrịa: “Anụwo m ekpere gị, ahụwo m anya mmiri gị: lee, M na-atụkwasị afọ iri na ise n’ụbọchị gị. M ga-anapụtakwa gị na obodo a n’ọbụ aka eze Asiria, gbochiekwa obodo a.” (Aịsaịa 38:4–6; 2 Ndị Eze 20:4, 5) Jehova ga-eji ihe àmà a na-adịghị ahụkebe nwapụta nkwa ya: “Lee, M na-eme ka onyinyo nke dị n’ebe nrịgo, nke rịdaworo n’ebe nrịgo Ehaz site n’anyanwụ, ka ọ laa azụ nzọụkwụ ebe nrịgo iri.”—Aịsaịa 38:7, 8a.
25 Dị ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, e nwere ebe e si arịgo ụlọ elu nke dị n’ime obí eze, ma eleghị anya nwee ogidi dị ya nso. Mgbe ìhè anyanwụ chakwasịrị n’ogidi ahụ, a na-ahụ onyinyo ya n’ihe nrịgo ahụ. Mmadụ pụrụ ịmata ihe na-akụ site n’ile ebe onyinyo ahụ nọ n’ihe nrịgo ahụ. Ugbu a Jehova ga-arụ ọrụ ebube. Mgbe onyinyo ahụ gbadasịrị n’ihe nrịgo ahụ dị ka ọ na-eme, ọ ga-eji nzọụkwụ iri laghachi azụ. Ònye nụtụworo ihe dị otú ahụ? Bible na-ekwu, sị: “Anyanwụ wee laa azụ nzọụkwụ ebe nrịgo iri n’ebe nrịgo ahụ nke ọ rịdaworo n’elu ya.” (Aịsaịa 38:8b) Ntakịrị oge mgbe nke ahụ mesịrị, Hezekaịa gbakere n’ọrịa ya. Akụkọ banyere nke a gbasaruru Babilọn. Mgbe eze Babilọn nụrụ ya, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa Jerusalem iji mata ihe bụ eziokwu.
26. Gịnị bụ otu ihe si n’ịgbatịkwu afọ ndụ Hezekaịa pụta?
26 Ihe dị ka afọ atọ mgbe Hezekaịa gbakesịrị n’ụzọ ọrụ ebube, ọ mụrụ nwa ya nwoke mbụ, bụ́ Manase. Mgbe Manase tolitere, o gosighị ekele maka ọmịiko Chineke, nke ọ bụ ma e wezụga ya, a garaghị amụ ya! Kama nke ahụ, n’ihe ka ukwuu n’oge ndụ ya, Manase mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova hie nne.—2 Ihe E Mere 32:24; 33:1–6.
Ihie Ụzọ
27. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Hezekaịa si gosi ekele nye Jehova?
27 Dị ka nna nna ya bụ́ Devid, Hezekaịa bụ nwoke nwere okwukwe. O ji Okwu Chineke kpọrọ ihe. Dị ka Ilu 25:1 si kwuo, o mere ndokwa maka nchịkọta nke ihe dị n’ihe bụ ugbu a Ilu isi nke 25 ruo 29. Ụfọdụ kwenyere na ọ bụkwa ya dere Abụ Ọma nke 119. Abụ ekele ahụ na-akpali akpali nke Hezekaịa dere mgbe ọ gbakesịrị n’ọrịa ya na-egosi na ọ bụ nwoke nwere ekele dị ukwuu. O kwubiri na ihe kasị mkpa ná ndụ bụ inwe ike ito Jehova n’ụlọukwu Ya “ụbọchị nile nke ndụ anyị.” (Aịsaịa 38:9–20) Ka anyị nile nwee echiche dị otú ahụ banyere ofufe dị ọcha!
28. Mmehie ihe dị aṅaa ka Hezekaịa mehiere n’otu oge mgbe a gwọsịrị ya n’ụzọ ọrụ ebube?
28 Ọ bụ ezie na o kwesịrị ntụkwasị obi, Hezekaịa ezughị okè. N’otu oge mgbe Jehova gwọsịrị ya, o mehiere nnọọ ihe. Aịsaịa na-akọwa, sị: “Na mgbe ahụ Merodak-baladan nwa Baladan, bụ́ eze Babilọn, zigaara Hezekaịa akwụkwọ na onyinye ịnata ihu ọma: ọ nụkwara na Hezekaịa rịararịị ọrịa, wee nwee ahụ ike. Hezekaịa wee ṅụrịa ọṅụ banyere ha, mee ka ha hụ ụlọ nke ihe ya dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ọlaọcha ya, na ọlaedo ya, na ụda ya dị iche iche, na ezi mmanụ ya, na ụlọ nile nke ihe agha ya nile, na ihe nile nke a chọtara n’akụ̀ ya nile: ọ dịghị ihe dị n’ụlọ ya, ma ọ bụ n’ala nile ọ na-achị, nke Hezekaịa na-emeghị ka ha hụ.”—Aịsaịa 39:1, 2.b
29. (a) Gịnị pụrụ ịbụ ebumnobi Hezekaịa mgbe o gosiri ndị nnọchianya ahụ si Babilọn bịa akụ̀ na ụba ya? (b) Gịnị ga-esi n’ihie ụzọ Hezekaịa pụta?
29 Ọbụna mgbe mmụọ ozi Jehova merisịrị ya oké mmeri, Asiria nọgidere na-eyi ọtụtụ mba egwu, gụnyere Babilọn. Ọ pụrụ ịbụ na Hezekaịa chọrọ ịdọrọ mmasị eze Babilọn dị ka onye ya na ya pụrụ ijikọ aka n’ọdịnihu. Otú ọ dị, Jehova achọghị ka ndị bi na Juda soro ndị iro ha jikọọ aka; ọ chọrọ ka ha tụkwasị ya obi! Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, Jehova kpugheere Hezekaịa ihe ga-eme n’ọdịnihu, sị: “Ụbọchị na-abịa, na ihe nile dị n’ụlọ gị, na nke nna gị hà debeworo n’ụlọ akụ̀ ruo taa, a ga-eburu ha jee Babilọn: ọ dịghị ihe ga-afọdụ . . . Ụfọdụkwa n’ime ụmụ gị ndị ikom, ndị ga-esi n’ahụ gị pụta, ndị ị ga-amụta, ha ga-achịrị ha; ha ga-abụkwa ndị ọnaozi n’ụlọukwu eze Babilọn.” (Aịsaịa 39:3–7) Ee, mba ahụ Hezekaịa chọrọ ịdọrọ mmasị ya ga-emesịa kwakọrọ akụ̀ nile nke Jerusalem, meekwa ka ụmụ amaala ya bụrụ ohu. Nanị ihe ngosi Hezekaịa gosiri ndị Babilọn akụ̀ ya rụpụtara bụ ịkpalikwu ọchịchọ anyaukwu ha.
30. Olee otú Hezekaịa si gosi ezi àgwà?
30 N’ụzọ doro anya, n’izo aka n’oge ahụ Hezekaịa gosiri ndị Babilọn akụ̀ ya, 2 Ihe E Mere 32:26 kwuru, sị: “Hezekaịa wee huru ala n’ihi ịdị elu nke obi ya, ya onwe ya na ndị bi na Jerusalem, iwe Jehova abịakwasịghịkwa ha n’ụbọchị Hezekaịa.”
31. Olee otú ihe si gaara Hezekaịa, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?
31 N’agbanyeghị ezughị okè ya, Hezekaịa bụ nwoke nwere okwukwe. Ọ maara na Chineke ya, bụ́ Jehova, bụ onye dị adị n’ezie nke na-enwe mmetụta. Mgbe ọ nọ ná nrụgide, Hezekaịa kpegaara Jehova ekpere site n’ala ala obi ya, Jehova zakwara ya. Jehova Chineke mere ka o nwee udo n’ihe fọdụrụ ná ndụ ya nile, Hezekaịa nwekwara ekele maka nke ahụ. (Aịsaịa 39:8) Jehova kwesịkwara ịbụ onye dị adị n’ezie nye anyị taa. Mgbe nsogbu bilitere, ka anyị, dị ka Hezekaịa, dabere n’ebe Jehova nọ maka amamihe na ụzọ isi pụọ na ya, n’ihi na ‘ọ na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta.’ (Jemes 1:5) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi ma nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-aghọ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ,” ma ugbu a ma n’ọdịnihu.—Ndị Hibru 11:6.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke karịrị nde $9.5 (U.S.) n’ọnụ ahịa ya ugbu a.
b Mgbe e merisịrị Senakerib, mba ndị gbara ha gburugburu wetaara Hezekaịa onyinye ọlaedo, ọlaọcha, na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa. Na 2 Ihe E Mere 32:22, 23, 27, anyị na-agụ na “Hezekaịa wee nwee akụ̀ na nsọpụrụ hiri nne nke ukwuu,” “e wee bulie ya elu n’anya mba nile.” Ọ pụrụ ịbụ na onyinye ndị a mere ka o nwee ike ịkwajughachi ụlọ akụ̀ ya, nke o wepụsịrị ihe ndị dị n’ime ya mgbe ọ na-atụ ụtụ nye ndị Asiria.
[Foto dị na peeji nke 383]
Eze Hezekaịa tụkwasịrị Jehova obi mgbe ike ndị Asiria chere ya ihu
[Foto dị na peeji nke 384]
[Foto dị na peeji nke 389]
Eze ahụ zipụrụ ndị ozi ka ha gakwuru Aịsaịa iji nụ ndụmọdụ Jehova
[Foto dị na peeji nke 390]
Hezekaịa kpere ekpere ka e bulie aha Jehova elu site ná mmeri a ga-emeri ndị Asiria
[Foto dị na peeji nke 393]
Mmụọ ozi Jehova gburu ndị Asiria 185,000