Okwu Chineke Na-adịru Ebighị Ebi
“Okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—AỊSAỊA 40:8.
1. (a) Gịnị ka “okwu Chineke anyị” pụtara n’ebe a? (b) Olee otú nkwa ụmụ mmadụ dị ma e jiri ha tụnyere okwu Chineke?
ỤMỤ mmadụ na-atụkwasịkarị obi ha ná nkwa nke ndị ikom na ndị inyom a ma ama. Ma n’agbanyeghị otú nkwa ndị a si yie ihe dị ụtọ ná ntị ndị ọ na-agụsi agụụ ike imeziwanye ọnọdụ ha ná ndụ, ha yiri okooko osisi na-achanwụ achanwụ ma e jiri ha tụnyere okwu Chineke anyị. (Abụ Ọma 146:3, 4) Ihe karịrị afọ 2,700 gara aga, Jehova Chineke kpaliri Aịsaịa onye amụma ide, sị: “Anụ ahụ nile bụ ahịhịa, ịma mma ya nile dịkwa ka okooko ọhịa. Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa [achanwụwo]: ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 40:6, 8) Gịnị bụ “okwu” ahụ na-adịgide adịgide? Ọ bụ okwu Chineke banyere nzube ya. Taa anyị nwere “okwu” ahụ n’ụdị e dere ede n’ime Bible.—1 Pita 1:24, 25.
2. N’agbanyeghị àgwà na omume ndị dị aṅaa ka Jehova mezuru okwu ya banyere mba Israel na Juda oge ochie?
2 Ndị bi n’ụbọchị Israel oge ochie hụrụ ịbụ eziokwu nke ihe Aịsaịa dekọrọ. Site n’ọnụ ndị amụma ya Jehova buru amụma na, n’ihi ajọ ekwesịghị ntụkwasị obi nye ya, a ga-ebu ụzọ dọrọ alaeze ebo iri nke Israel, e mesịakwa alaeze ebo abụọ nke Juda, laa n’agha. (Jeremaịa 20:4; Emọs 5:2, 27) Ọ bụ ezie na ha kpagburu, ọbụna gbuo, ndị amụma Jehova, kpọọ akwụkwọ mpịakọta nke ozi ịdọ aka ná ntị Chineke dị na ya ọkụ, rịọkwa Ijipt maka enyemaka agha iji gbochie mmezu ya, okwu Jehova adaghị. (Jeremaịa 36:1, 2, 21-24; 37:5-10; Luk 13:34) Ọzọkwa, nkwa Chineke iweghachi ihe fọdụrụ ná ndị Juu chegharịrị n’ala ha mezuru n’ụzọ dị ịrịba ama.—Aịsaịa, isi nke 35.
3. (a) Nkwa ndị dị aṅaa Aịsaịa dekọrọ ka anyị nwere mmasị pụrụ iche na ha? (b) N’ihi gịnị ka i ji nwee obi ike na ihe ndị a ga-emezu n’ezie?
3 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova bukwara amụma ịchịisi ezi omume n’elu ihe a kpọrọ mmadụ site n’aka Mesaịa ahụ, mgbapụta pụọ ná mmehie na ọnwụ, na ịgbanwe ụwa ịghọ paradaịs. (Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-9; 25:6-8; 35:5-7; 65:17-25) Ihe ndị a kwa hà ga-eme? Obi abụọ adịghị ya ma ọlị! ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ O mere ka e dekọọ okwu amụma ya maka abamuru anyị, o jidewokwa n’aka na e chekwawo ya.—Taịtọs 1:2; Ndị Rom 15:4.
4. Ọ bụ ezie na e chekwaghị ihe odide Bible ndị mbụ, olee otú o si bụrụ eziokwu na okwu Chineke dị “ndụ”?
4 Jehova echekwaghị ihe odide ndị mbụ bụ́ ebe ndị odeakwụkwọ ya n’oge ochie dere amụma ndị ahụ. Ma “okwu” ya, nzube ya e kwupụtara ekwupụta, abụrụwo okwu dị ndụ. Nzube ahụ anọgidewo na-aga n’ihu, ka ọ na-emekwa otú ahụ, echiche na mkpali ndị zoro ezo nke ndị o metụtaworo ndụ ha na-apụta ìhè. (Ndị Hibru 4:12) Ọzọkwa, ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme na-egosi na nchekwa na nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ n’onwe ha esitewo ná nduzi Chineke.
Mgbe Mgbalị Izochi Ya Chere Ya Ihu
5. (a) Mgbalị dị aṅaa ka otu eze Siria mere ibibi Akwụkwọ Nsọ Hibru sitere n’ike mmụọ nsọ? (b) N’ihi gịnị ka o ji daa?
5 N’ihe karịrị otu oge, ndị ọchịchị agbalịwo ibibi ihe odide ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ. Na 168 T.O.A., Eze Antiochus Epiphanes nke Siria (e sepụtara na peji nke 10) wuuru Zeus ebe ịchụàjà n’ime ụlọ nsọ a raara nye Jehova. Ọ chọtasịkwara ‘akwụkwọ nke Iwu ahụ,’ kpọọ ha ọkụ, ma kpọsaa na a ga-egbu onye ọ bụla nwere Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú ahụ. N’agbanyeghị mkpụrụ ole ọ kpọrọ ọkụ na Jerusalem na Judia, o nweghị ike izochi Akwụkwọ Nsọ kpam kpam. N’oge ahụ ógbè ndị Juu dịsasịrị n’ọtụtụ ala, ụlọ nzukọ nke ọ bụla nwekwara ọbá akwụkwọ mpịakọta nke ya.—Tụlee Ọrụ 13:14, 15.
6. (a) Olee mgbalị siri ike e mere iji bibie Akwụkwọ Nsọ nke ndị Kraịst oge mbụ jiri mee ihe? (b) Gịnị si na ya pụta?
6 Na 303 O.A., Eze Ukwu Diocletian nke Rom nyere iwu n’otu aka ahụ ka e tikpọsịa ebe dị iche iche ndị Kraịst na-ezukọ, nakwa ka ‘a gbaa Akwụkwọ Nsọ ha ọkụ.’ Mbibi dị otú ahụ gara n’ihu ruo afọ iri. Ọ bụ ezie na mkpagbu ahụ dị oké njọ, Diocletian enweghị ike ikpochapụ Iso Ụzọ Kraịst, Chineke ekweghịkwa ka ndị ozi nke eze ukwu ahụ bibie ihe odide nile nke ọbụna otu akụkụ nke Okwu Ya sitere n’ike mmụọ nsọ. Ma site ná mmeghachi omume ha ná nkesa na nkwusa nke Okwu Chineke, ndị mmegide ahụ gosipụtara ihe dị n’obi ha. Ha gosipụtara onwe ha dị ka ndị Setan mere ka ha kpuo ìsì, ndị na-emekwa uche ya.—Jọn 8:44; 1 Jọn 3:10-12.
7. (a) Mgbalị ndị dị aṅaa ka e mere iji gbochie mgbasa nke ihe ọmụma Bible n’ebe ọdịda anyanwụ Europe? (b) Gịnị ka a rụzuru ná nsụgharị na mbipụta nke Bible?
7 Mgbalị iji gbochie mgbasa nke ihe ọmụma Bible wekwaara ụdị ndị ọzọ. Mgbe Latin na-abụkwaghị asụsụ a na-asụ kwa ụbọchị, ọ bụghị ndị ọchịchị na-ekpere arụsị kama ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst—Popu Gregory nke Asaa (1073-1085) na Popu Innocent nke Atọ (1198-1216)—bụ ndị megidere n’ụzọ dị ukwuu nsụgharị nke Bible gaa n’asụsụ ndị nkịtị ji eme ihe. Ná mgbalị imebi echiche dị iche pụọ na nke ndị isi chọọchị, Kansụl Roman Katọlik nke Toulouse, France, na 1229, nyere iwu na onye nkịtị enweghị ike inwe akwụkwọ dị iche iche nke Bible n’asụsụ ndị nkịtị. E ji Njụta Okwukwe mee ihe n’ụzọ dị ike itinye iwu ahụ n’ọrụ. Ma, mgbe afọ 400 nke Njụta Okwukwe ahụ gasịrị, ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya asụgharịwo Bible dum, na-ekesakwa nsụgharị ndị e biri ebi n’ihe dị ka asụsụ 20, tinyere ire okwu ndị ọzọ, nakwa akụkụ ndị ka ọtụtụ n’ime ya n’asụsụ 16 ndị ọzọ.
8. Na narị afọ nke 19, gịnị nọ na-eme n’ihe banyere nsụgharị na nkesa Bible na Russia?
8 Ọ bụghị nanị Chọọchị Roman Katọlik gbalịrị igbochi ndị nkịtị inweta Bible. Ná mmalite narị afọ nke 19, Pavsky, bụ́ prọfesọ n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Okpukpe nke St. Petersburg, sụgharịrị Oziọma Matiu site na Grik gaa na Russian. A sụgharịkwara akwụkwọ ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gaa na Russian, Pavsky jekwara ozi dị ka editọ. E kesara ndị a n’ụzọ sara mbara ruo mgbe, site na nkata ndị chọọchị kpara, a rụgidere eze ukwu na 1826 ka o tinye Òtù Bible Russia n’okpuru nlekọta nke “Nzukọ Ndị Isi Chọọchị Dị Nsọ” nke Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, bụ́ nke gbochiri ọrụ ya. E mesịa, Pavsky sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru site na Hibru gaa na Russian. N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, Makarios, bụ́ osote bishọp nke Chọọchị Ọtọdọks, sụgharịkwara Akwụkwọ Nsọ Hibru site na Hibru gaa na Russian. E nyere ha abụọ ahụhụ maka mgbalị ha, e tinyekwara nsụgharị ha n’ebe ndebe ihe mgbe ochie nke chọọchị. Chọọchị ahụ kpebisiri ike ime ka Bible dịgide n’asụsụ Slavonic ochie, bụ́ nke ndị nkịtị na-adịghị agụ ma ọ bụ na-adịghị aghọta n’oge ahụ. Ọ bụ nanị mgbe a na-apụkwaghị igbochi mgbalị ndị mmadụ na-eme inweta ihe ọmụma Bible ka “Nzukọ Ndị Isi Chọọchị Dị Nsọ,” na 1856, malitere nsụgharị nke ndị isi chọọchị ya kwadoro, na-eme nke ahụ site n’ụkpụrụ nduzi ndị e ji nlezianya tọọ iji jide n’aka na okwu ndị e ji mee ihe kwekọrọ n’echiche chọọchị. N’ihi ya, n’ihe banyere mgbasa nke Okwu Chineke, a na-eme ka e nwee ọdịiche n’agbata ngosipụta a na-ahụ anya nke ndị ndú okpukpe na ihe ha bu n’obi, dị ka okwu na omume ha na-ekpughe.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 4.
Ichebe Okwu ahụ Pụọ ná Mmerụ
9. Olee otú ụfọdụ ndị nsụgharị Bible si gosi ịhụnanya ha maka Okwu Chineke?
9 Ndị so sụgharịa ma depụtaghachi Akwụkwọ Nsọ bụ ndị ikom na ndị inyom hụrụ Okwu Chineke n’anya n’ezie, ndị tinyesikwara mgbalị ike iji mee ka mmadụ nile nweta ya. E gburu William Tyndale (na 1536) n’ihi ihe o mere iji mee ka e nwee Bible na Bekee. Njụta Okwukwe Katọlik tụrụ Francisco de Enzinas mkpọrọ (mgbe 1544 gasịrị) maka ịsụgharị na ibipụta Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na Spanish. N’itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ, Robert Morrison (malite na 1807 ruo 1818) sụgharịrị Bible gaa na Chinese.
10. Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na e nwere ndị nsụgharị ndị mmetụta ndị ọzọ na-abụghị ịhụnanya maka Okwu Chineke kpaliri?
10 Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ihe ọzọ na-abụghị ịhụnanya maka Okwu Chineke nwere mmetụta n’ọrụ ndị ndepụtaghachi na ndị nsụgharị. Tụlee ihe atụ anọ: (1) Ndị Sameria wuru ụlọ nsọ n’Ugwu Geraịzim iji maa ụlọ nsọ dị na Jerusalem aka. N’ịkwado nke ahụ, a gbanwere ihe dị n’Ọpụpụ 20:17 na Pentateuch ndị Sameria. A gbakwụnyere iwu ahụ nke iwu ebe ịchụàjà nkume n’Ugwu Geraịzim na ịchụ àjà n’ebe ahụ, dị ka a ga-asị na ọ bụ akụkụ nke Iwu Iri ahụ. (2) Onye mbụ sụgharịrị akwụkwọ Daniel maka Septuagint Grik mere ihe masịrị ya n’ihe ndị ọ sụgharịrị. O denyere okwu ndị o chere ga-akọwa ma ọ bụ meziwanye ihe dị n’ihe odide Hibru. O tinyeghị ụmụ irighiri ihe ndị o chere na ndị na-agụ ya agaghị anakwere. Mgbe ọ sụgharịrị amụma banyere oge Mesaịa ga-apụta, nke dị na Daniel 9:24-27, o degharịrị oge e kwuru ma tinye, gbanwee, ma sụgharịa okwu isi, eleghị anya na-eburu n’uche ime ka amụma ahụ yie ka ọ na-akwado mmegide ndị Maccabees. (3) Na narị afọ nke anọ O.A., n’otu ihe ndekọ Latin, ọ pụtara ìhè na otu onye nkwado na-anụbigara ozizi Atọ n’Ime Otu ọkụ n’obi ókè denyere okwu ndị bụ “n’eluigwe, Nna, Okwu ahụ, na mmụọ nsọ; ndị atọ a bụkwa otu” dị ka a ga-asị na ndị a bụ nhota okwu sitere na 1 Jọn 5:7. Ka e mesịrị e denyere akụkụ ihe odide ahụ kpọmkwem n’ime otu ihe odide Bible Latin. (4) Louis nke Iri na Atọ (1610-1643), na France, nyere Jacques Corbin ikike ịsụgharị Bible gaa na French ka e wee kpaghasịa mgbalị ndị Protestant. N’ihi nzube ahụ, Corbin tinyere ihe ụfọdụ e degharịrị edegharị, gụnyere aka e zoro ‘n’àjà dị nsọ nke Mas’ n’Ọrụ 13:2.
11. (a) Olee otú Okwu Chineke siri dịgide n’agbanyeghị emeghị ihe n’eziokwu nke ụfọdụ ndị nsụgharị? (b) Ihe àmà ihe odide oge ochie hà aṅaa ka e nwere iji nwapụta ihe Bible kwuru na mbụ? (Lee igbe.)
11 Jehova egbochighị ndegharị dị otú ahụ e degharịrị Okwu ya, ndegharị ahụ agbanweghịkwa nzube ya. Mmetụta dị aṅaa ka o nwere? Ịgbakwụnye ihe ndị na-ezo aka n’ebe Ugwu Geraịzim dị emeghị ka okpukpe ndị Sameria ghọọ ngwá ọrụ Chineke maka ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ. Kama nke ahụ, ọ gbara àmà na, ọ bụ ezie na okpukpe ndị Sameria zọọrọ na ha kwere na Pentateuch, a pụghị ịdabere na ya maka ịkụzi eziokwu ahụ. (Jọn 4:20-24) Mgbanwe nke ihe e dere na Septuagint ahụ egbochighị Mesaịa ahụ ịbịa n’oge e buru n’amụma site n’ọnụ Daniel onye amụma. Ọzọkwa, n’agbanyeghị na e ji Septuagint na-eme ihe na narị afọ mbụ, o doro anya na ọ maara ndị Juu ahụ ịnụ ka a na-agụpụta Akwụkwọ Nsọ na Hibru n’ụlọ nzukọ ha. N’ihi ya, ‘ndị ahụ nọ na-ele anya’ mgbe oge maka mmezu amụma ahụ ruru nso. (Luk 3:15) N’ihe banyere ndegharị ihe ahụ dị na 1 Jọn 5:7 iji kwadoo Atọ n’Ime Otu na n’Ọrụ 13:2 iji kwadoo Mas, ndị a agbanweghị ihe bụ eziokwu. Ka oge na-agakwa e kpughezuru wayo ndị ahụ. Nnukwu ihe fọrọ n’ime ihe odide Bible n’asụsụ mbụ na-enye ihe a ga-eji na-enyocha izi ezi nke nsụgharị ọ bụla.
12. (a) Mgbanwe ndị dị aṅaa gbara ọkpụrụkpụ ka ụfọdụ ndị nsụgharị Bible mere? (b) Olee ókè ndị a ruru?
12 Mgbalị ndị ọzọ e mere ịgbanwe Akwụkwọ Nsọ metụtara ihe karịrị idegharị amaokwu ole na ole. Ndị a bụ agha e busoro onye ezi Chineke ahụ n’onwe ya bụ. Ọdịdị na ọ̀tụ̀tụ̀ mgbanwe ndị ahụ nyere ihe àmà doro anya nke mmetụta sitere n’ebe dị ike karịa mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọ bụla—ee, mmetụta sitere n’ebe onye iro ukwu Jehova nọ, bụ́ Setan Ekwensu. N’ịdaba ná mmetụta ahụ, ndị nsụgharị na ndị ndepụtaghachi—ụfọdụ n’ịnụ ọkụ n’obi, ndị ọzọ n’abụchaghị ọchịchọ ha—malitere iwepụ aha aka Chineke, bụ́ Jehova, n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ n’ọtụtụ puku ebe ọ pụtagasịrị. Tupu mgbe ahụ, ụfọdụ nsụgharị e mere site na Hibru gaa na Grik, Latin, German, Bekee, Italian, na Dutch, na ndị ọzọ, hapụrụ itinye aha Chineke kpam kpam ma ọ bụ hapụ ka ọ dị nanị n’ebe ole na ole. E wepụkwara ya n’ihe odide Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
13. N’ihi gịnị ka mgbalị sara mbara e mere ịgbanwe Bible ji ghara ime ka e hichapụ aha Chineke n’ikike ncheta mmadụ?
13 Ma, e hichapụghị aha ahụ dị ebube n’ikike ncheta mmadụ. Nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Spanish, Portuguese, German, Bekee, French, na ọtụtụ ndị ọzọ, ji ezi obi denye aha aka Chineke. Ka ọ na-erule narị afọ nke 16, aha aka Chineke malitere ịpụta ọzọ ná nsụgharị Hibru dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst; ka ọ na-erule narị afọ nke 18, na German; ka ọ na-erule narị afọ nke 19, na Croatian na Bekee. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ pụrụ ịgbalị iwezụga aha Chineke n’ụsọ, mgbe ‘ụbọchị Jehova’ bịara, mgbe ahụ, dị ka Chineke na-ekwupụta, ‘mba nile aghaghị ịmara na mụ onwe m bụ Jehova.’ Nzube Chineke ahụ e kwupụtara agaghị ada.—2 Pita 3:10; Ezikiel 38:23; Aịsaịa 11:9; 55:11.
Ozi Eruo Gburugburu Ụwa
14. (a) Ka ọ na-erule narị afọ nke 20, n’ime asụsụ ole nke Europe ka e biworo Bible, gịnị sikwa na ya pụta? (b) Ka ọ na-erule ná ngwụsị 1914, n’asụsụ Africa ole ka e nwere Bible?
14 Ka ọ na-erule ná mmalite narị afọ nke 20, a nọworị na-ebi Bible n’asụsụ 94 nke Europe. O mere ka ndị mmụta Bible n’akụkụ ahụ nke ụwa mata eziokwu ahụ bụ na ihe omume ndị ga-eme ka ụwa mee mkpatụ ga-abịa ná ngwụsị nke Oge Ndị Jentaịl na 1914, n’eziekwa ha bịara! (Luk 21:24) Tupu afọ ihe omume ahụ ga-eme ihe akụkọ bụ 1914 agwụsịa, e bipụtara Bible, n’ozuzu ma ọ bụ akwụkwọ ụfọdụ n’ime ya, n’asụsụ 157 nke Africa, tụkwasị ná ndị a kasị jiri eme ihe bụ́ asụsụ Bekee, French, na Portuguese. E si otú ahụ tọọ ntọala maka ịkụziri ndị dị obi umeala nke ọtụtụ agbụrụ na ìgwè mba ndị bi n’ebe ahụ eziokwu Bible na-atọhapụ atọhapụ n’ụzọ ime mmụọ.
15. Ka mgbe ikpeazụ malitere, ruo n’ókè hà aṅaa ka e nwere Bible n’asụsụ ndị mmadụ na kọntinent ndị dị n’America?
15 Ka ụwa banyere na mgbe ikpeazụ ahụ e buru n’amụma, e nwewo Bible n’ọtụtụ ebe na kọntinent ndị dị n’America. Ndị si Europe kwabata ejiriwo ya bịa n’asụsụ dịgasị iche iche ha na-asụ. Usoro mmụta Bible sara mbara nọ na-aga n’ihu, site n’okwu ihu ọha na nkesa dị ukwuu nke akwụkwọ e ji amụ Bible nke Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka a maara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, na-ebipụta. Tụkwasị na nke ahụ, òtù Bible dị iche iche anọwo na-ebipụta Bible n’asụsụ 57 ndị ọzọ iji gboo mkpa ụmụ afọ Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa bi n’ebe ahụ.
16, 17. (a) Ruo n’ókè hà aṅaa ka e nweworo Bible mgbe oge maka nkwusa zuru ụwa ọnụ ruru? (b) Olee otú Bible siworo bụrụ nnọọ akwụkwọ na-adịgide adịgide na nke na-akpa ike?
16 Mgbe oge ruru maka ime nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma ahụ tupu ‘ọgwụgwụ abịa,’ Bible abịaghị ọhụrụ n’Esia na n’àgwàetiti ndị dị na Pacific. (Matiu 24:14) A nọworị na-ebipụta ya n’asụsụ 232 a na-asụ n’akụkụ ahụ nke ụwa. Ụfọdụ bụ Bible dum; ọtụtụ bụ nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst; ndị ọzọ bụ otu akwụkwọ nke Akwụkwọ Nsọ.
17 O doro anya na Bible adịgideghị dị ka nanị ihe dị n’ebe ngosi ihe mgbe ochie. N’ime akwụkwọ nile dịnụ, ọ bụ akwụkwọ a kasị sụgharịa na nke a kasị kesaa. N’ikwekọ n’ihe àmà ahụ nke ihu ọma Chineke, ihe e dekọrọ n’akwụkwọ ahụ nọ na-emezu. Nkụzi ya na mmụọ duziri ya na-enwekwa mmetụta na-adịgide adịgide ná ndụ ndị mmadụ n’ọtụtụ ala. (1 Pita 1:24, 25) Ma ihe ka ukwuu gaje ime—ihe ka nnọọ ukwuu.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị bụ “okwu Chineke anyị” nke na-adịru ebighị ebi?
◻ Mgbalị ndị dị aṅaa ka e meworo iji zochie Bible, gịnị sikwa na ya pụta?
◻ Olee otú e siworo chebe ikwesị ntụkwasị obi nke Bible?
◻ Olee otú okwu nzube nke Chineke siworo bụrụ okwu dị ndụ?
[Igbe dị na peeji nke 12]
Ànyị Maara n’Ezie Ihe Bible Kwuru na Mbụ?
Ihe dị ka ihe odide Hibru 6,000 e ji aka dee na-akwado ihe dị n’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ole na ole n’ime ndị a dị laa azụ tupu oge ndị Kraịst. Ọ dịkarịa ala ihe odide 19 dị adị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru dum dị eri oge ahụ tupu mmepụta nke iji mkpụrụ akwụkwọ a na-edogharị edogharị na-ebi akwụkwọ. Ọzọkwa, malite n’otu oge ahụ, e nwere nsụgharị ndị e mere gaa n’asụsụ 28 ndị ọzọ.
N’ihe banyere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e depụtawo ihe dị ka ihe odide 5,000 dị na Grik. E kwuwo na otu n’ime ndị a dị tupu 125 O.A., wee si otú ahụ bụrụ nanị afọ ole na ole mgbe oge e dere nke mbụ gasịrị. A na-echekwa na ụfọdụ iberibe adịwo n’oge butụ ụzọ. Maka akwụkwọ 22 n’ime 27 ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, e nwere ihe nọ n’agbata ihe odide aka akwụkwọ uncial 10 ruo 19 zuru ezu. Ọnụ ọgụgụ dịkarịsịrị nta nke ihe odide uncial zuru ezu maka nke ọ bụla n’akwụkwọ ndị dị n’akụkụ a nke Bible bụ atọ—maka Mkpughe. Otu ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dum dị laa azụ na narị afọ nke anọ O.A.
E nweghị akwụkwọ ochie ọzọ nwere ụba ihe àmà ochie e dere ede otú ahụ.