Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 154
  • Baịbụl Ò Kwuru na Ụwa Dị Mbadamba?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Ò Kwuru na Ụwa Dị Mbadamba?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị ka “nsọtụ anọ nke ụwa” e kwuru na Baịbụl pụtara?
  • Oleekwanụ maka mgbe ahụ Ekwensu nwara Jizọs?
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ịmụta Ihe Site n’Ọnwụnwa Ndị Jisọs Zutere
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya Ọnwụnwa
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 154
Ụwa e sere ka efere dị mbadamba

Baịbụl Ò Kwuru na Ụwa Dị Mbadamba?

Ihe Baịbụl kwuru

Mba, Baịbụl ekwughị na ụwa dị mbadamba.a Baịbụl abụghị akwụkwọ na-akọ banyere sayensị. Ma nke a apụtaghị na Baịbụl na-ekwu ihe dị iche n’ihe ndị sayensị na-ekwu. Ihe ndị e kwuru na Baịbụl “na-akwụsi ike ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 111:8.

  • Gịnị ka “nsọtụ anọ nke ụwa” e kwuru na Baịbụl pụtara?

  • Oleekwanụ maka mgbe ahụ Ekwensu nwara Jizọs?

Gịnị ka “nsọtụ anọ nke ụwa” e kwuru na Baịbụl pụtara?

Mgbe a na-ekwu okwu ụwa na Baịbụl, e nwere ebe ndị e kwuru “nsọtụ anọ nke ụwa” na “n’ebe niile ụwa sọtụrụ.” Ma mmadụ ekwesịghị ịghọta ya n’ụzọ nkịtị, ka à ga-asị na ụwa nwere ngwụsị ma ọ bụ ebe ọ kwụsịrị. (Aịzaya 11:12; Job 37:⁠3) Kama nke ahụ, o doro anya na ihe e ji okwu ndị ahụ na-akọwa bụ ebe niile n’ụwa. Baịbụl kwudịrị okwu isi “n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa, sikwa n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda.”​​—⁠Luk 13:⁠29.

Okwu Hibru a sụgharịrị “nsọtụ” ma ọ bụ “sọtụrụ” yiri ka ọ bụ ilu e ji akọwa “nku nnụnụ.” Otu akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ International Standard Bible Encyclopedia, kwuru na “ebe ọ bụ na nku nnụnụ bụ ihe nnụnụ na-eji ekpuchi ụmụ ya, [okwu Hibru a] nwekwara ike ịpụta ngwụcha ngwụcha ihe ọ bụla a gbasapụrụ agbasapụ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na n’akwụkwọ Job 37:3 nakwa n’Aịzaya 11:​12, “okwu ahụ pụtara n’isi isi, n’ókè, ma ọ bụ ná ngwụcha ngwụcha ala.”b

Oleekwanụ maka mgbe ahụ Ekwensu nwara Jizọs?

Baịbụl kwuru banyere mgbe Ekwensu nwara Jizọs, sị: “Ekwensu kpọọrọ ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.” (Matiu 4:⁠8) Ụfọdụ na-ekwu na ihe a Baịbụl kwuru ebe a na-egosi na e nwere ike ịnọ n’otu ebe hụ ihe niile dị n’ụwa n’ihi na ụwa dị mbadamba. Ma ‘ugwu dị oké elu’ e kwuru okwu ya ebe a yiri ka ọ bụghị ebe nkịtị. Ka anyị legodị ihe mere na e kwesịghị ichewa ya otú ahụ.

  • O nweghị ugwu nkịtị dị n’ụwa mmadụ ga-anọ na ya hụ alaeze niile nke ụwa.

  • Ọ bụghị naanị alaeze niile nke ụwa ka Ekwensu gosiri Jizọs kamakwa “ebube ha.” E nweghịkwanụ otú mmadụ ga-esi anọ otu ebe dị anya hụ ihe niile ahụ. N’ihi ya, o yiri ka Ekwensu o ji ihe dị ka ọhụụ gosi Jizọs ihe ndị ahụ. Nke a nwere ike ịdị ka ebe mmadụ ji ihe e ji ele sinima na-egosi onye ọzọ foto ebe dị iche iche n’ụwa.

  • Ebe a kọrọ gbasara ọnwụnwa Jizọs n’akwụkwọ Luk 4:5 kwuru na Ekwensu gosiri Jizọs “alaeze niile nke elu ụwa mmadụ bi n’otu ntabi anya,” ọ gaghị ekwe omume na mmadụ ga-eji anya nkịtị hụ ihe niile ahụ. Nke a na-egosi na Ekwensu si n’ụzọ ọzọ, na-abụghị iji anya nkịtị hụ ihe, gosi Jizọs ihe ndị ahụ.

a Baịbụl kpọrọ Chineke “Onye bi n’ebe dị elu karịa ụwa nke dị gburugburu.” (Aịzaya 40:22) E nwere akwụkwọ ụfọdụ ndị kwuru na “gburugburu” e kwuru okwu ya ebe a nwere ike ịbụ ihe dị okirikiri, ma ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwetaghị nke a. Nke ọ bụla ọ bụ, Baịbụl akwadoghị na ụwa dị mbadamba.

b Nke e dezigharịrị, Mpịakọta nke 2, peeji nke 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya