Dị Nnọọ Ka Ụkpara
Ọ DỊTỤWO mgbe ị gagharịrị n’ala ụmụ ahịhịa juru n’oge okpomọkụ wee hụ ọtụtụ ụkpara ka ha na-amagharị n’ụzọ gị? Ọ na-eyi ka ha nọ ebe nile, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na i cheghị echiche banyere ha nke ukwuu. E kwuwerị, ha yiri ihe na-adịghị emerụ ahụ na ihe na-adịghị mkpa.
Ma, abụghị ihe dị mkpa n’ezie nke ụkpara mere ha ihe atụ kwesịrị ekwesị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị a ma ama pụrụ iwere onwe ha ná ndị dị mkpa nke ukwuu, Onye Okike anyị na-eche ihe dị iche. Onye amụma ya bụ́ Aịsaịa sịrị: “Ọ bụ Onye ahụ nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa, ndị bi n’ime ya ewee dị ka [ụkpara, NW].”—Aịsaịa 40:22.
Ịdị ebube, ịdị ukwuu, na amamihe Jehova Chineke na-ebuli ya elu gabiga ógbè ụmụ mmadụ nkịtị, dị nnọọ ka mmadụ karịrị ụkpara nke ukwuu n’ọgụgụ isi na ike. Otú ọ dị, àgwà bụ́ isi nke Chineke bụ ịhụnanya. Ịhụnanya na-enweghị atụ na-akpalikwa ya ịrịba anyị ama, inyere anyị aka, na ịzọpụta anyị—ma ọ bụrụ na anyị ahụ ya n’anya ma na-erubere ya isi. Jehova na-emeso anyị ihe n’ịhụnanya, ọ bụ ezie na anyị dị ka ụkpara na-adịghị mkpa. Onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị, nke na-eme onwe ya ka ọ dị elu ịnọdụ dị ka eze, nke na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu.”—Abụ Ọma 113:5-7.
Dị ka abụ ọma nke a na-akọwa, Jehova ji ịhụnanya na-ewerutere ndị ogbenye enyemaka. Ee, Ọ na-enyere ndị ji obi umeala ‘na-achọ Chineke ka ha wee chọta ya n’ezie,’ aka. (Ọrụ 17:27) Ndị chọtara Chineke—ma na-ejere ya ozi—ọbụna na-aghọ ndị dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. (Tụlee Aịsaịa 43:4, 10.) Ụkpara ahụ dị ala si otú a na-eje ozi ichetara anyị adịghị mkpa nke onwe anyị na ịhụnanya nke Onye Okike anyị pụrụ ime ihe nile, onye na-enye ụmụ mmadụ nile na-erube isi ịbụenyi na amara ya. Ị̀ na-egosi ekele maka ịhụnanya Chineke?