Ihe Bible Ji Bụrụ Onyinye Chineke Nyere Site ná Mmụọ Nsọ
BIBLE na-asị na “Chineke bụ ịhụnanya” ma na-asị na o nwere amamihe na ike. (1 Jọn 4:8; Job 12:13; Aịsaịa 40:26) Ọ na-agwa anyị na “ụzọ ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Deuterọnọmi 32:4) Dị ka Bible na-ekwu, Chineke na-egosipụtakwa àgwà ndị dị ka ebere na ọmịiko.—Ọpụpụ 34:6; Ndị Rom 9:15.
N’ihi na Bible na-ekwu na Jehova Chineke nwere àgwà ndị dị otú a, ọ na-adọtara onwe ya ụmụ mmadụ na-achọgharị ya. Akwụkwọ a na-ekwu banyere okike, mmalite nke mmehie na ọnwụ, na ụzọ isi soro Chineke dịghachi n’otu. Ọ na-enye olileanya magburu onwe ya nke Paradaịs e weghachiri n’ụwa. Ma ihe a dum bara uru nanị ma ọ bụrụ na e nwere ike ịnwapụta na Bible bụ onyinye Chineke nke sitere na mmụọ nsọ.
Bible na Sayensị
Mgbe nile Bible emeriwo nkatọ. Dị ka ihe atụ, mgbe e ji uche ghere oghe gụọ ya, a na-achọpụta na o kwekọrọ n’ezi nkà mmụta sayensị. Otú ọ dị, a kwadebere Bible dị ka ihe nduzi ime mmụọ, ọ bụghị dị ka akwụkwọ sayensị. Ma ka anyị lee ma Bible ọ̀ na-ekwekọ n’eziokwu nkà mmụta sayensị.
Nnyocha Ahụ Mmadụ: Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi na ‘akụkụ nile’ nke nwa mmadụ e bu n’afọ dị “n’akwụkwọ.” (Abụ Ọma 139:13-16) Ụbụrụ isi, obi, akpa ume, anya—ihe ndị a na akụkụ nile ọzọ nke ahụ bụ nke ‘e dekọrọ’ n’ihe ndekọ nke àgwà e ketara eketa nke àkwá ahụ ya na mkpụrụ ndụ ọbara ọcha jikọtaworo nke dị n’afọ onye bụ nne. Ihe ndị e nwere n’ihe ndekọ nke a bụ usoro ọgụgụ oge ndị dị n’ime ahụ maka mpụta ìhè nke akụkụ ọ bụla ndị a n’usoro kwesịrị ekwesị. Ma chetụdị nnọọ! E dekọrọ eziokwu nke a banyere ntolite nke ahụ mmadụ n’ime Bible n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 3,000 afọ tupu ndị ọkà mmụta sayensị achọpụta ihe ndekọ nke àgwà e ketara eketa.
Ndụ anụmanụ: Dị ka Bible na-ekwu, “hare . . . ihe na-atagharị ọnụ ka ọ bụ.” (Levitikọs 11:6) François Bourlière (The Natural History of Mammals, 1964, peji 41) na-asị: “Àgwà nke ‘ịtaghachi,’ ma ọ bụ ime ka nri gabiga n’eriri afọ ugboro abụọ kama ịbụ nanị otu ugbo, yiri ihe a na-ahụkarị n’ebe oke bekee na anụ hare dị. Oke bekee ndị a na-azụ n’ụlọ na-erikarị ma na-eloda nsị ha nyụrụ n’abalị n’ataghị ya ata, bụ́ nke na-aghọ ọkara nke ihe nile dị ha n’afọ n’ụtụtụ. N’ebe oke bekee ndị na-ebi n’ọhịa dị, ntaghachi nri na-ewere ọnọdụ ugbo abụọ kwa ụbọchị, a na-akọkwa otu ụdị àgwà nke a banyere anụ hare nke ndị Europe.” Banyere nke a, akwụkwọ bụ́ Mammals of the World (nke E. P. Walker dere, 1964, Mpịakọta nke Abụọ, peji nke 647) na-ekwu, sị: “Nke a pụrụ iyi otu ụdị ihe ahụ dị ka ‘ịtagharị ọnụ’ n’anụ ndị na-enye nwa ha ara bụ́ ndị na-ataghachi nri ha.”
Nkà Mmụta Ihe Ochie E Gwutere n’Ala: Ndị eze a kọrọ akụkọ ha na Bible, obodo, na mba dị iche iche apụtawo ìhè site ná nchọpụta nke mbadamba nkume, ihe ndị a kpụrụ akpụ, ndepụta dị iche iche, na ihe ndị yiri ha. Dị ka ihe atụ, ndị dị ka ndị Het a kpọtụrụ aha n’Akwụkwọ nsọ dịrị adị n’ezie. (Ọpụpụ 3:8) N’akwụkwọ ya bụ́ The Bible Comes Alive, Sir Charles Marston sịrị: “Ndị kwaworo okwukwe ọha mmadụ nwere na Bible aka, wedaakwa ikike ya ala, bụ ndị a na-eweda n’ala n’onwe ha site n’ihe àmà ndị e meworo ka ha pụta ìhè, e bibiwokwa ikike ha. Ihe ndị e gwupụtara n’ala na-achụpụ nkatọ na-ebibi ihe site n’ịbụ ihe ndị mere eme a na-arụ ụka gaa n’ịbụ akụkọ ifo doro anya.”
Nkà mmụta ihe ochie e gwutere n’ala akwadowo Bible n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ihe ndị a chọtara egosipụtawo ebe na aha dị iche iche a na-ahụta na Jenesis isi nke 10. Ndị na-egwu ala ekpughewo obodo Kaldea bụ́ Ua, obodo azụmahịa na ebe bụ isi a na-efe ofufe bụ́ ebe a mụrụ Abraham. (Jenesis 11:27-31) N’akụkụ isi iyi mmiri Gaịhọn n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Jerusalem, ndị ọkà mmụta ihe ochie e gwutere n’ala achọtawo obodo Jebus nke Eze Devid dọọrọ n’agha. (2 Samuel 5:4-10) A chọpụtara n’afọ 1880 Ndepụta Saịlom nke a tụrụ ihe ọtụtụ ya n’otu nsọtụ nke ọwa mmiri Eze Hezekaịa. (2 Ndị Eze 20:20) A kọrọ akụkọ ọdịda Babilọn n’aka Saịrọs Onye Ukwu na 539 T.O.A. n’Ihe Ndekọ nke Nabonidus, nke e gwupụtara na narị afọ nke 19 O.A. E gosiwo izi ezi nke nkọwa ndị e nyere n’akwụkwọ Esta site ná ndepụta ndị sitere Persepolis na nchọpụta nke obí Eze Xerxes (Ahasuerọs) na Shushan, ma ọ bụ Susa, n’agbata 1880 na 1890 O.A. Ihe odide ahụ a achọtara na 1961 bụ́ nke e dekwasịrị n’elu mkpọ mkpọ ebe nke ebe ihe nkiri ndị Rom na Sizaria anwapụtawo ịdị adị nke gọvanọ Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet, onye nyefere Jisọs ka a kpọgbuo ya.—Matiu 27:11-26.
Nkà Mmụta Inyocha Mbara Igwe: Ihe dị ka 2,700 afọ gara aga—ogologo oge tupu ụmụ mmadụ n’ozuzu ha amata na ụwa dị gburugburu—onye amụma Aịsaịa dere, sị: “Onye ahụ nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa.” (Aịsaịa 40:22) A pụkwara ịsụgharị okwu Hibru bụ chugh “okirikiri,” bụ́ nke a sụgharịrị ebe a ịbụ “gburugburu.” (A Concordance of the Hebrew and Chaldee Scriptures, nke B. Davidson dere) Mgbe ahụ kwa, a na-ahụ n’ụzọ doro anya “ịdị gburugburu” nke mbara ụwa site ná mbara igwe na mgbe ụfọdụ mgbe e ji ụgbọ elu felie elu nke ukwuu. Dị ka ihe ndabara, Job 26:7 na-asị na Chineke “na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” Nke a bụ eziokwu, n’ihi na ndị na-enyocha mbara igwe maara na ụwa enweghị ihe ọ bụla a na-ahụ anya ji ya.
Nkà Mmụta Ihe Ọkụkụ: Ụfọdụ na-ekwubi n’ụzọ hiere ụzọ na Bible ezighị ezi n’ihi na Jisọs Kraịst kwuru banyere “mkpụrụ mustard” ịbụ nke “dị nta karịa mkpụrụ nile.” (Mak 4:30-32) Ma eleghị anya, Jisọs bu mkpụrụ osisi mustard nke ojii (Brassica nigra ma ọ bụ Sinapis nigra) n’uche, nke dị nanị ihe dị ka 1 ruo 1.6 milimita n’obosara. Ọ bụ ezie na e nwere mkpụrụ ndị dị nta karịa ya, dị ka mkpụrụ dị ka ntụ nke osisi orchid, Jisọs adịghị agwa ndị na-akụ orchid okwu. Ndị Juu ahụ bụ́ ndị Galili maara na n’etiti ụdị mkpụrụ dị iche iche ndị ọrụ ugbo obodo ahụ na-akụ, mkpụrụ osisi mustard bụ nke kasị nta. Jisọs na-ekwu banyere Alaeze ahụ, ọ dịghị akụzi ihe ná nkà mmụta ihe ọkụkụ.
Nkà Mmụta Ihe Banyere Ala: Banyere ihe ndekọ Bible nke okike, onye ọkà mmụta ihe banyere ala bụ́ Wallace Pratt sịrị: “Ọ bụrụ na a gwa m dị ka onye ọkà mmụta ihe banyere ala, ka m kọwaa ná mkpirikpi echiche ọgbara ọhụrụ ndị anyị nwere banyere mmalite ụwa na mmalite ndụ na ya nye ndị nkịtị na-azụ atụrụ, dị ka agbụrụ ndị e degaara Akwụkwọ Jenesis, ọ ga-esiri m ike ime ihe ka mma karịa ịgbasochi okwu ndị e ji dee isi mbụ nke Jenesis anya.” Pratt rịbara ama na usoro nke otú ihe si mee na Jenesis—mmalite oké osimiri, mpụta nke ala, na e mesịa mpụta nke anụ ndị na-ebi ná mmiri, nnụnụ, na anụ ndị na-enye ụmụ ha ara—bụ n’ụzọ bụ isi usoro nke nkebi ndị bụ isi n’ọgụgụ oge nkà mmụta ihe banyere ala.
Ọgwụ: N’akwụkwọ ya bụ́ The Physician Examines the Bible, C. Raimer Smith dere, sị: “Ọ na-eju m nnọọ anya na Bible ziri ezi nke ukwuu n’ihe banyere mmụta ọgwụ. . . . N’ebe e kwuru okwu ịgwọ ọrịa, dị ka maka etuto, ọnyá, na ndị ọzọ, o ziri ezi ọbụna site n’usoro ndị ọgbara ọhụrụ. . . . Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ ka na-ekwere ọtụtụ nkwenkwe dị iche iche na-enweghị isi, dị ka na mkpụrụ osisi buckeye e tinyere n’akpa uwe ga-egbochi ágbá; na ịnwụ awọ n’aka ga-afụ mmadụ akpụ; ike ákwà owu na-acha ọbara ọbara n’olu ga-agwọ akpịrị mgbaka; iyiri akpa nta gọm osisi asafetida dị n’ime ya ga-egbochi ọrịa; na mgbe ọ bụla nwatakịrị na-arịa ọrịa, o nwere okpo; na ihe ndị ọzọ, ma ọ dịghị okwu ndị dị otú ahụ a na-achọta n’ime Bible. Nke a n’onwe ya dị ịrịba ama, ọ bụkwaara m ihe ọzọ na-egosi na o sitere n’aka Chineke.”
O Kwesịrị Ndabere ná Nkọwa Zuru Ezu nke Akụkọ Ihe Mere Eme
N’akwụkwọ ya bụ́ A Lawyer Examines the Bible, ọkà iwu Irwin H. Linton kwuru, sị: “Ebe akwụkwọ akụkọ ụtọ dị iche iche, akụkọ ifo na na akaebe ụgha na-elezi anya ikwu ihe ndị merenụ n’ebe dị nnọọ anya na n’oge a na-ejighị n’aka, si otú ahụ na-emebi ụkpụrụ iwu ndị mbụ anyị bụ́ ndị ọkà iwu mụtara isi na-akwuchite ọnụ nke ọma, na ‘nkwupụta aghaghị ikwu oge na ebe,’ akụkọ Bible na-enye anyị ụbọchị na ebe ihe ndị ahụ mere n’ụzọ ziri ezi karịsịa.”
Iji nwapụta isi ihe nke a, Linton zoro aka na Luk 3:1, 2. Onye ahụ dere Oziọma kpọtụrụ ndị ọchịchị asaa aha iji guzobe oge Jisọs Kraịst malitere ozi Ya. Rịba nkọwa ndị Luk nyere n’okwu ndị a ama: “Ma n’afọ nke iri na ise n’ụbọchị nke Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ onye na-achị Judia, mgbe Herọd bụkwa tetrarch nke Galili, mgbe nwanne ya Filip bụkwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaịtis, mgbe Lisanias bụkwa tetrarch nke Abilini, mgbe Anas na Kaịafas bụ ndị isi nchụàjà, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zakaraịas n’ọhịa.”
Bible jupụtara ná nkọwa ndị dị otú ahụ. Ọzọkwa, e dere akụkụ ya ndị dị ka Oziọma ndị ahụ n’oge ọdịnala ndị Juu, Grik, na ndị Rom nweworo oké ọganihu. Ọ bụ oge nke ndị ọkà iwu, ndị na-ede akwụkwọ, ndị na-achị isi, na ndị yiri ha. Ya mere, mgbe ahụ, ọ bụrụ na nkọwa ndị a hụrụ n’Oziọma ndị ahụ na n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible abụghị eziokwu, a gaara ekpughewo ha dị ka ihe aghụghọ. Ma ndị ụwa na-akọ akụkọ ihe mere eme gosiri ịbụ eziokwu nke isi ihe ndị dị otú ahụ dị ka ịdị adị Jisọs Kraịst. Dị ka ihe atụ, banyere Jisọs na ndị na-eso ụzọ Ya, onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ Tacitus dere, sị: “Christus, bụ́ onye e si n’aha ya nweta aha ahụ bụ [ndị Kraịst], tara ahụhụ kasị ukwuu n’oge ọchịchị nke Taịbiriọs n’aka otu n’ime ndị nnọchianya ọchịchị anyị, bụ́ Pọntiọs Paịlet.” (Annals, Akwụkwọ nke Iri na Ise, 44) Izi ezi nke akụkọ ihe mere eme nke Bible na-enyere anyị aka ịnwapụta na ọ bụ onyinye Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ.
Ihe Àmà Kasịnụ
Ọ bụ ezie na nkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala, nkà mmụta inyocha mbara igwe, akụkọ ihe mere eme, na akụkụ mmụta ndị ọzọ na-akwado Bible, inwe okwukwe na ya adịghị adabere n’ihe nnwapụta ndị dị otú ahụ. N’ọtụtụ ihe nnwapụta nke na Bible bụ onyinye Chineke nyere anyị site n’ike mmụọ nsọ, ọ dịghị ihe àmà ka ukwuu a pụrụ inye karịa mmezu nke amụma ya nile.
Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ezi amụma. Site n’onye amụma ya bụ Aịsaịa, ọ sịrị: “Ihe mbụ, lee, ha abịawo, ọ bụkwa ihe ọhụrụ dị iche iche ka Mụ onwe m na-egosi: tutu ha epuo ana m eme ka unu nụrụ ha.” (Aịsaịa 42:9) Ọzọkwa, Bible na-asị na Chineke nyere ndị dere ya ike site ná mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ ya. Dị ka ihe atụ, onyeozi ndị Kraịst bụ Pọl dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Pita onyeozi dere, sị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe mmụọ nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:20, 21) Ya mere ka anyị lee anya n’amụma Bible.
Ndị ahụ metụtara isi obodo Asiria, bụ́ Nineve, “obodo ọbara” nke bụ ihe ụjọ n’ókèala nile nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ ruo ihe karịrị narị afọ 15, bụ otu n’ime ọtụtụ narị amụma ndị dị na Bible. (Nehum 3:1) Ma, n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ike Nineve, Bible buru amụma, sị: “[Chineke] ga-emekwa ka Nineve ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, ala kpọrọ nkụ dị ka ọzara. Ìgwè anụmanụ dị iche iche ga-amakpu n’etiti ya, anụ ọhịa nile nke mba nile: ma okwolo ma ebinta ga-anọ ọnọdụ abalị n’isi ogidi ya nile: gee ntị olu ha na-abụ abụ n’ime window; ime mkpọmkpọ ga-adị ná mbata ụzọ: n’ihi na ebe e ji osisi cedar wuo ka ọ gbabaworo ọtọ.” (Zefanaịa 2:13, 14) Taa, ndị nleta na-ahụ na ọ bụ nanị mkputamkpu ájá na-aka akara ebe tọgbọrọ n’efu nke Nineve oge ochie. Ọzọkwa, ìgwè atụrụ na-ata nri n’ebe ahụ, dị ka e buru n’amụma.
N’ọhụụ, onye amụma Chineke bụ́ Daniel hụrụ otu ebule nwere mpi abụọ na otu mkpị nwere oké mpi n’etiti anya ya abụọ. Mkpị ahụ tigburu ebule ahụ, na-agbaji mpi ya abụọ. E mesịa, a gbajiri oké mpi mkpị ahụ, mpi anọ putekwara n’ọnọdụ ya. (Daniel 8:1-8) Mmụọ ozi Gebriel kọwara sị: “Ebulu ahụ nke ị hụrụ, nke nwere mpi abụọ, ha bụ eze nke Midia na Peasia. Mkpi ahụ nke nwere ajị hie nne bụ eze Jevan: ma mpi ukwu ahụ nke dị n’etiti anya ya abụọ nke ahụ bụ eze mbụ. Ma mpi ahụ, nke gbajiri agbaji, nke mpi anọ guzoro n’ọnọdụ ya, alaeze anọ ga-esi ná mba ahụ guzoo, ma ọ bụghị n’ike ya.” (Daniel 8:20-22) Dị ka akụkọ ihe mere eme nwapụtaworo, “eze Jevan [“Gris,” NW]” meriri ebule ahụ nwere mpi abụọ—Alaeze Ukwu Midia na Peasia. Mkpị ihe atụ ahụ nwere “oké mpi” nke bụ Aleksanda Onye Ukwu. Mgbe ọ nwụsịrị, ndị ọchịagha anọ ya nọchiri “oké mpi” ahụ site n’iguzobe onwe ha n’ike n’ime “alaeze anọ.”
E mezuwo ọtụtụ amụma ndị dị n’Akwụkwọ nsọ Hibru (“Agba Ochie”] n’ebe Jisọs Kraịst nọ. Ndị ji ike mmụọ Chineke dee Akwụkwọ nsọ Grik nke ndị Kraịst (“Agba Ọhụrụ”) jiri ụfọdụ n’ime ndị a mee ihe banyere ya. Dị ka ihe atụ, onye dere Oziọma bụ́ Matiu zoro aka ná mmezu nke amụma ndị e buru n’Akwụkwọ nsọ n’ọmụmụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụrụ Jisọs, na Ya inwe onye mbute ụzọ, na mbanye Ọ banyere Jerusalem na-anọkwasị n’elu nwa ịnyịnya ibu. (Jiri Matiu 1:18-23; 3:1-3; 21:1-9 tụlee Aịsaịa 7:14; 40:3; Zekaraịa 9:9.) Amụma ndị dị otú ahụ e mezuru na-enye aka ịnwapụta na Bible bụ n’ezie onyinye mmụọ nsọ nke Chineke nyere.
Mmezu a na-enwe ugbu a nke amụma Bible na-anwapụta na anyị na-ebi “na mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Agha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji ndị ọ na-enweghị ihe yiri ha bụ akụkụ nke “ihe ịrịba ama” nke “ọnụnọ” Jisọs n’ike Alaeze. Ihe ịrịba ama ahụ gụnyekwara ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova anọ, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ e guzobeworo. (Matiu 24:3-14; Luk 21:10, 11) Amụma Bible nke na-emezu ugbu a na-emesikwa anyị obi ike na n’isi nso, ọchịchị eluigwe Chineke n’okpuru Jisọs Kraịst ga-eweta ụwa ọhụrụ nke obi ụtọ na-adịru ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-5.
Chaatị na-esonụ nke isiokwu ya bụ “Amụma Bible Ndị Mezuworo” na-enye nanị ole na ole n’ọtụtụ narị amụma Bible ndị a pụrụ idepụta. E depụtara mmezu ụfọdụ n’ime ndị a n’ime Akwụkwọ nsọ n’onwe ya, ma ihe kwesịkarịrị ekwesị ịrịba ama bụ amụma ndị na-emezu taa.
Ị pụrụ ịhụ ihe ụfọdụ na-eme gburugburu ụwa bụ́ ndị e buru amụma ha na Bible. Ma gịnị mere ị gaghị emekwu nnyocha? Ndịàmà Jehova ga-eji obi ụtọ nyekwuo gị nkọwa ma ị rịọ ha. Ka ọchịchọ i jikwa ezi obi na-achọ ihe ọmụma nke Onye ahụ Kasị Elu na nzube ya nile mesie gị obi ike na Bible bụ n’ezie onyinye Chineke nyere site ná mmụọ nsọ.
[Chaatị dị na peeji nke 7]
AMỤMA BIBLE NDỊ MEZUWORO
AMỤMA MMEZU
Jenesis 49:10 Juda ghọrọ ebo ndị eze nke Israel
Zefanaịa 2:13, 14 E mere ka Nineve tọgbọrọ n’efu
n’ihe dị ka 632 T.O.A.
Jeremaịa 25:1-11; Aịsaịa 39:6 Mmeri e meriri Jerusalem amalite
70 afọ nke ntọgbọrọ n’efu (2 Ihe
Emere 36:17-21; Jeremaịa 39:1-9)
Aịsaịa 13:1, 17-22; Saịrọs emerie Babilọn; ndị Juu
44:24-28; 45:1, 2 alaghachi ala nna ha (2 Ihe Emere
36:20-23; Ezra 2:1-6)
Aịsaịa 9:1, 2 Ozi Jisọs nke na-enye ìhè amalite
na Galili (Matiu 4:12-23)
Aịsaịa 53:4, 5, 12 Ọnwụ Kraịst dị ka àjà mgbapụta
Abụ Ọma 22:18 Ife nza maka uwe Jisọs (Jọn
19:23, 24)
Luk 19:41-44; 21:20-24 Mbibi Jerusalem n’aka ndị Rom
(70 O.A.)
Luk 21:10, 11; Matiu 24: Obubu agha n’enweghị atụ, ụnwụ nri,
3-13; 2 Timoti 3:1-5 ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe,
mmebi iwu, na ihe ndị ọzọ,
na-egosi “mgbe ikpeazụ”
Matiu 24:14; Aịsaịa 43:10; Mkpọsa zuru ụwa ọnụ Ndịàmà Jehova
Abụ Ọma 2:1-9 na-akpọsa na e guzobewo Alaeze
Chineke nakwa na ọ ga-emesi ndị
nile na-emegide ya n’isi nso
Matiu 24:21-34; Ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà
Mkpughe 7:9-17 Jehova na-efe Chineke ofufe
na-akwadebekwa maka ịlanarị “oké
mkpagbu ahụ”
[Foto dị na peeji nke 8]
Agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji na-akpata oké nsogbu taa, ma ụwa ọhụrụ nke udo na obi ụtọ na-eru nso