Akwụkwọ A Ọ̀ Na-ekwekọ na Sayensị?
Okpukpe elebeghị sayensị anya mgbe nile dị ka enyi ya. N’ọtụtụ narị afọ ndị gara aga ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe guzogidere nchọpụta sayensị mgbe ọ dị ha ka ndị a hà na-etinye nkọwa ha na-enye Bible n’ọnọdụ ọjọọ. Ma sayensị ọ̀ bụ n’ezie onye iro Bible?
A SỊ na ndị dere Bible kwadoro echiche sayensị ndị a kasị na-anakwere n’oge ha, ihe ọ ga-arụpụta ga-abụ akwụkwọ na-ezitụghị ezi na nkà mmụta sayensị. Ma ndị dere ya akwaliteghị nghọtahie dịgasị otú ahụ na-ekwekọghị na sayensị. N’ụzọ megidere ya, ha deturu ọtụtụ okwu ọ na-abụghị nanị na ha ziri ezi ná nkà mmụta sayensị kamakwa ha megidere kpọmkwem echiche ndị a nakweere n’oge ahụ.
Gịnị Bụ Ọdịdị nke Ụwa?
Ajụjụ ahụ akpaliwo mmasị ụmụ mmadụ ruo ọtụtụ puku afọ. Echiche ọha mmadụ n’oge ochie bụ na ụwa dị mbadamba. Ndị Babilọn, dị ka ihe atụ, kwere na eluigwe na ala bụ igbe ma ọ bụ ọnụ ụlọ nke nwere ụwa dị ka ala ya. Ndị nchụàjà Veda nke India chere na ụwa dị mbadamba nakwa nanị otu akụkụ ya ka mmadụ bi. Otu ebo oge ochie n’Esia lere ụwa anya dị ka agadaga efere tii.
Eri oge n’ihe dị ka na narị afọ nke isii T.O.A., ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Gris bụ́ Pythagoras chepụtara na ebe ọnwa na anyanwụ dị okirikiri, ụwa aghaghị ịdịkwa okirikiri. Aristotle (narị afọ nke anọ T.O.A.) mesịrị kwenye, na-akọwa na anyanwụ ikpuchi ìhè ọnwa na-anwapụta ịdị okirikiri nke ụwa. Onyinyo ụwa n’elu ọnwa na-agba ngọ.
Otú ọ dị, echiche nke ụwa dị mbadamba (na-enwe nanị ebe elu ya dị ka ebe mmadụ bi) apụghị n’anya kpam kpam. Ụfọdụ apụghị ịnakwere ihe o doro anya na ụwa dị gburugburu ga-apụta—nchepụta antipode.a Lactantius, onye Kraịst bụ́ onye nkwado okwukwe nke narị afọ nke anọ O.A., kwara echiche ahụ kpọmkwem emo. Ọ tụgharịrị uche, sị: “Ọ̀ dị onye na-enweghị uche ruo n’ókè nke ikwere na e nwere ndị ikom nzọli ụkwụ ha ka isi ha elu? . . . na ihe ọkụkụ na osisi na-etola ala? na mmiri ozuzo, na snow, na akụ̀ mmiri igwe na-ezola elu?”2
Nchepụta nke antipode gbara ndị ọkà mmụta okpukpe ole na ole gharịị. Nchepụta ụfọdụ kwuru na ọ bụrụ na e nwere ndị bi n’antipode, ha apụghị inwe njikọ ọ bụla pụrụ ikwe omume n’ebe ndị a maara dị ka mmadụ nọ n’ihi na oké osimiri sara mbara nke na a gaghị agafeli ya ma ọ bụ n’ihi na ógbè oké anwụ a na-apụghị ịgafeli agafe gbara ebe ụwa kewara abụọ gburugburu. Mgbe ahụ olee ebe ndị bi n’antipode si bịa? N’ijuanya, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe họọrọ ikwere na a pụghị inwe ndị ọ bụla bi n’antipode, ma ọ bụ ọbụna, dị ka Lactantius rụrụ ụka, na ụwa apụghịdị ịdị okirikiri!
Ka o sina dị, nchepụta nke ụwa dị gburugburu dịgidere, e mesịakwa nakweere ya ebe nile. Otú ọ dị, ọ bụ nanị mgbe ọgbọ mbara igwe malitere na narị afọ nke 20 ka o kweworo ụmụ mmadụ omume ịgatetụ aka ná mbara igwe iji nwapụta site n’iji anya ha kirie na ụwa dị gburugburu.b
Ebeekwa ka Bible guzo n’okwu a? Na narị afọ nke asatọ T.O.A., mgbe echiche na-ewunụ bụ na ụwa dị mbadamba, ọtụtụ narị afọ tupu ndị ọkà ihe ọmụma Gris echepụta na o nwere ike ịbụ na ụwa dị okirikiri, na ọtụtụ puku afọ tupu ụmụ mmadụ ahụ ụwa dị ka ihe dị okirikiri site na mbara igwe, onye amụma Hibru bụ́ Aịsaịa ji ụzọ dị mfe dị ịrịba ama kwuo, sị: “Ọ bụ Onye ahụ Nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa.” (Aịsaịa 40:22, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) A pụkwara ịsụgharị okwu Hibru ahụ bụ́ chugh, nke a sụgharịrị “gburugburu” n’ebe a, “okirikiri.”3 Nsụgharị Bible ndị ọzọ na-agụ sị, “okirikiri ụwa” (Douay Version) na “ụwa dị gburugburu.”—Moffatt.c
Aịsaịa so dee Bible zeere akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme ndị na-ewu ewu banyere ụwa. Kama ha, o deturu okwu nke ọganihu nile nke nchọpụta sayensị na-amaghị aka.
Gịnị Na-ejigide Ụwa?
N’oge ochie, ajụjụ ndị ọzọ banyere ụwa juru ụmụ mmadụ anya: Gịnị ka ụwa nọkwasịrị n’elu ya? Gịnị na-ejigide anyanwụ, ọnwa, na kpakpando? Ha amaghị ihe ọ bụla banyere iwu ike ndọda metụtara ihe nile, nke Isaac Newton chepụtara ma bipụta na 1687. Echiche nke na ihe ndị dị n’igwe ko, n’ezie, ná mbara tọgbọ chakoo n’enweghị ebe ha kokwasị bụ nke ha na-amaghị. N’ihi ya, nkọwa ha na-atụkarị aro na e nwerịrị ihe ndị jigidere ụwa na ihe ndị ọzọ n’igwe n’elu.
Dị ka ihe atụ, otu nchepụta oge ochie, ikekwe nke ndị biri n’otu àgwàetiti malitere, bụ na mmiri gbara ụwa gburugburu, na ọ na-esekwa n’elu mmiri ndị a. Ndị Hindu chepụtara na ụwa nwere ọtụtụ ntọala, otu n’elu ibe ya. O guzo n’elu enyi anọ, enyi ndị ahụ guzo n’elu agadaga mbe, mbe ahụ guzo n’elu agwọ gbara agba, agwọ ahụ kekọrọ ekekọ na-esekwa n’elu mmiri ahụ dị ebe nile. Empedocles, onye Gris bụ ọkà ihe ọmụma na narị afọ nke ise T.O.A., kwere na ụwa guzo n’elu ajọ ifufe nakwa na ọ bụ ajọ ifufe a na-akpata ngagharị nke ihe ndị dị n’igwe.
Echiche ndị nke Aristotle so ná ndị kasị na-ewu ewu. Ọ bụ ezie na o chepụtara na ụwa dị gburugburu, ọ jụrụ na ọ pụrụ iko na mbara igwe tọgbọ chakoo. N’arụmụka ya bụ́ On the Heavens, mgbe ọ na-agbagha echiche nke na ụwa na-eguzo n’elu mmiri, ọ sịrị: “Ọ bụghị ọdịdị mmiri, nke ọ na-abụ nke ụwa, ịnọ n’etiti mbara: ọ ghaghị inwe ihe o guzoro n’elu ya.”4 Mgbe ahụ, gịnị ka ụwa “guzoro n’elu ya”? Aristotle kụziri na a kwụnyere anyanwụ, ọnwa, na kpakpando n’ihu ihe gburugburu ndị siri ike, ndị na-ahụ ụzọ. Ihe gburugburu kwụnyere n’ime ihe gburugburu, na-enwe ụwa—nke kwụ otu ebe—n’etiti. Ka ihe gburugburu ndị ahụ na-agbagharị n’ime ibe ha, ihe ndị dị n’ime ha—anyanwụ, ọnwa, na mbara ụwa dị iche iche—na-agagharị n’ihu igwe.
Nkọwa Aristotle yiri nke ezi uche. Ọ bụrụ na a kwụnyesighị ihe ndị dị n’igwe ike n’ihe, oleezi otú ha pụrụ isi na-ese n’elu? A nakweere echiche ndị nke Aristotle ahụ a na-asọpụrụ ruo ihe dị ka afọ 2,000. Dị ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, na narị afọ nke 16 na nke 17 nkụzi ya “arịgowo n’ọkwá ozizi nkwenkwe okpukpe” n’anya chọọchị.5
Site ná nchepụta nke ígwè e ji ahụ ihe dị anya, ndị nnyocha mbara igwe malitere ịgbagha nchepụta Aristotle. Ma, azịza ya erughị ha aka ruo mgbe Sir Isaac Newton kọwara na e kowere ụwa mbara igwe nile ná mbara igwe tọgbọ chakoo, na-ejigide ha n’ụzọ okirikiri ha site n’ikike a na-adịghị ahụ anya—ike ndọda. O yiri ihe a na-apụghị ikwere, o sikwaara ụfọdụ n’ime ndị ibe Newton ike ikweta na mbara igwe pụrụ ịbụ ihe dị nkịtị, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ghara inwe ha dị na ya.d6
Gịnị ka Bible nwere ikwu n’okwu a? Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,500 gara aga, Bible ji ido anya dị ịrịba ama kwuo na ụwa ‘na-ekokwasịkwa n’elu ihe na-abụghị ihe.’ (Job 26:7) Na Hibru mbụ, okwu e nwere maka “ihe na-abụghị ihe” (beli-mahʹ) e jiri mee ihe n’ebe a pụtara n’ụzọ nkịtị “n’enweghị ihe ọ bụla.”7 Contemporary English Version jiri okwu ahụ bụ́ “n’elu mbara tọgbọ chakoo” mee ihe.
Mbara ụwa kokwasịrị “n’elu mbara tọgbọ chakoo” abụtụghị ụzọ ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ n’ụbọchị ndị ahụ si lee ụwa anya. Ma, n’ikwu ihe a na-amatatụghị n’oge ya, onye ahụ so dee Bible dekọrọ okwu bụ eziokwu n’ụzọ sayensị si ele ihe anya.
Bible na Sayensị Ọgwụ na Ahụ Ike—Hà Na-ekwekọ?
Sayensị ọgwụ na ahụ ike nke ọgbara ọhụrụ akụziworo anyị ihe dị ukwuu banyere mgbasa na mgbochi ọrịa. Ọganihu mmụta ọgwụ na narị afọ nke 19 dubara n’iwebata mgbochi nje ná nkà mmụta ọgwụ—ịdị ọcha iji belata mbute ọrịa. Ihe ọ rụpụtara dị egwu. E nwere mbelata dị ịrịba ama ná mbute ọrịa na ọnwụ nnwụchu.
Otú ọ dị, ndị dibịa oge ochie aghọtachaghị ụzọ ọrịa si agbasa, nke ha na-amata ịdị mkpa nke ịdị ọcha n’igbochi ọrịa. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ n’ime ụzọ ha si agwọ ọrịa ga-eji yie nke ndị ime ọhịa ma e jiri ya tụnyere nke ọgbara ọhụrụ.
Otu n’ime akwụkwọ ọgwụ na ahụ ike kasị ochie bụ Ebers Papyrus, nchịkọta nke ihe ọmụma ọgwụ na ahụ ike ndị Ijipt, dị kemgbe 1550 T.O.A. Akwụkwọ a nwere ihe dị ka ọgwụ 700 maka ihe otiti dị iche iche “na-amalite n’arụ agụ iyi ruo n’ihe mgbu nke mbọ ụkwụ.”8 Akwụkwọ The International Standard Bible Encyclopaedia na-ekwu, sị: “Ihe ọmụma ọgwụ na ahụ ike nke ndị dibịa a dabeere nanị n’ihe anya na-ahụ, bụrụ nke majik karịsịa na nke na-ekwekọghị ma ọlị na sayensị.”9 Ihe ka ukwuu n’usoro ọgwụgwọ ha adịghị irè ma ọlị, ma ụfọdụ n’ime ha dị oké ize ndụ. Maka ịgwọ ọnyá, otu n’ime usoro ọgwụgwọ ndị e nwere na-atụ aro ka e tee ya ngwakọta e ji nsị mmadụ na ihe ndị ọzọ mee.”10
E dere ihe odide a nke ọgwụ ndị Ijipt n’ihe dị ka n’otu oge ahụ e dere akwụkwọ ndị mbụ nke Bible, nke gụnyere Iwu Mosis. Mosis, onye a mụrụ na 1593 T.O.A., tolitere n’Ijipt. (Ọpụpụ 2:1-10) Dị ka onye so n’ezinụlọ Fero, ‘e ziri ya ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt.’ (Ọrụ 7:22) Ọ maara “ndị dibịa” Ijipt. (Jenesis 50:1-3) Ihe omume ọgwụ na ahụ ike ha na-adịghị irè ma ọ bụ dị ize ndụ hà metụtara ihe ndị o dere?
Mba. Kama nke ahụ, Iwu Mosis gụnyere iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị a na-amatatụghị n’oge ha. Dị ka ihe atụ, otu iwu banyere ọmụma ụlọikwuu ndị agha chọrọ ka a na-eli nsị n’ala ná mpụga ụlọikwuu ahụ. (Deuterọnọmi 23:13) Nke ahụ bụ usoro mgbochi magburu onwe ya. O nyere aka ịhụ na e metọghị mmiri ma nye nchebe pụọ n’ọrịa ọnyụnyụ ọbara ijiji na-ekesa na ọrịa afọ ọsịsa ndị ọzọ ka na-ata isi ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ n’ala ebe ọnọdụ ịdị ọcha jọgburu onwe ya.
Iwu Mosis ahụ nwere iwu nchịkwa ịdị ọcha ndị ọzọ chebere Israel megide mgbasa nke ọrịa ndị na-efe efe. A na-ekewapụ onye bu ma ọ bụ onye a na-enyo enyo na o bu ọrịa na-efe efe iche. (Levitikọs 13:1-5) A ga-asa ákwà ma ọ bụ arịa ndị metụrụ anụ nwụụrụ onwe ya (ikekwe site n’ọrịa) tupu iji ya mee ihe ọzọ ma ọ bụ e bibie ya. (Levitikọs 11:27, 28, 32, 33) A na-ewere onye ọ bụla metụrụ ozu aka n’onye na-adịghị ọcha, ọ ga-agbasokwa usoro ime ka a dị ọcha nke gụnyere ịsa ákwà na ahụ ya. N’ime oge ụbọchị asaa ahụ nke adịghị ọcha, ọ gaje izere imetụ ndị ọzọ ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 19:1-13.
Ụkpụrụ ịdị ọcha a na-ekpughe amamihe ndị dibịa nke mba ndị gbara ha gburugburu na-enweghị n’oge ahụ. Ọtụtụ puku afọ tupu sayensị ọgwụ na ahụ ike amụta banyere ụzọ dị iche iche ọrịa si agbasa, Bible nyere usoro mgbochi ndị ezi uche dị na ha dị ka ihe nchebe megide ọrịa. Ọ bụghị ihe ijuanya na Mosis pụrụ ikwu banyere ndị Israel n’ozuzu ha n’oge ya dị ka ndị na-adị ndụ afọ 70 ma ọ bụ 80.e—Abụ Ọma 90:10.
Ị pụrụ ikweta na okwu Bible ndị dị n’elu ziri ezi n’ụzọ sayensị si ele ihe anya. Ma e nwere okwu ndị ọzọ na Bible a na-apụghị ịnwapụta na sayensị. Nke ahụ ò mere ka Bible na sayensị ghara ikwekọ?
Ịnakwere Ihe A Na-apụghị Ịnwapụta
Na a pụghị ịnwapụtali okwu apụtachaghị na ọ bụ ụgha. Ikike mmadụ ịchọpụta ihe àmà zuru ezu na ịkọwa ihe a chọpụtara nke ọma na-akpara ihe nnwapụta sayensị ókè. Ma a pụghị ịnwapụta eziokwu ụfọdụ n’ihi na e chekwaghị ihe àmà ọ bụla, ihe àmà ya edoghị anya ma ọ bụ a chọpụtabeghị ya, ma ọ bụ na ikike na nkà sayensị ezughị ezu iji ruo ná nkwubi okwu a na-apụghị ịgbagha agbagha. Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ ihe mere n’ọnọdụ nke okwu Bible ụfọdụ bụ́ ndị na-enweghị ihe àmà a na-ahụ anya kwụụrụ onwe ha?
Dị ka ihe atụ, a pụghị iji sayensị nwapụta—ma ọ bụ gbaghaa—aka Bible na-ezo n’ógbè a na-adịghị ahụ anya nke ndị bụ́ mmụọ bi. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ihe omume ọrụ ebube ndị e kwuru na Bible. Ihe àmà ọdịdị ala doro anya zuru ezu banyere Iju Mmiri ụbọchị Noa nke zuru ụwa ọnụ adịghị iji mee ka afọ ju ụfọdụ ndị. (Jenesis, isi nke 7) Ànyị ga-ekwubirịrị na o meghị? Oge na mgbanwe pụrụ ikpuchi ihe mere eme n’ezie. Ya mere ọ̀ bụ na o kweghị omume na ihe omume ọdịdị ala nke ọtụtụ puku afọ gara aga ehichawo ihe àmà dị ukwuu maka Iju Mmiri ahụ?
Anyị kwere na Bible nwere okwu ndị a na-apụghị ịnwapụta ma ọ bụ gbaghaa site n’ihe àmà ndị a na-ahụ anya. Ma nke ahụ ò kwesịrị iju anyị anya? Bible abụghị akwụkwọ ọgụgụ sayensị. Otú ọ dị, ọ bụ akwụkwọ eziokwu. Anyị atụleworị ihe àmà siri ike na ndị dere ya bụ ndị ikom na-eguzosi ike n’ezi ihe ma na-akwụwa aka ọtọ. Mgbe ha tinyekwara ọnụ n’okwu metụtara sayensị, okwu ha na-ezi ezi ma ghara inwe nchepụta “sayensị” agba ochie ma ọlị bụ́ ndị mesịrị ghọọ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. Otú a sayensị abụghị onye iro nke Bible ma ọlị. E nwere ihe zuru ezu mere a ga-eji tụlee ihe Bible nwere ikwu site n’uche ghe oghe.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Antipode . . . bụ ebe abụọ chere ihu kpọmkwem n’okirikiri ụwa. Ahịrị kwụ ọtọ n’etiti ha ga-agabiga n’etiti ụwa. Okwu bụ́ antipode pụtara ụkwụ ruo n’ụkwụ na Grik. Mmadụ abụọ guzo n’ụzọ antipode ga-anọkarịsịrị onwe ha nso n’ọbọ ụkwụ ha.”1—The World Book Encyclopedia.
b N’ịkpọ okwu aha, ụwa bụ ihe dị okirikiri nke dị mbadamba n’isi abụọ; e metụrụ ka ọ dị mbadamba ná njedebe abụọ.
c Ọzọkwa, nanị ihe dị gburugburu na-adị okirikiri site n’akụkụ ọ bụla e si lee ya anya. Efere dị mbadamba ga-adịkarị ka àkwá n’ile anya, ọ bụghị okirikiri.
d Echiche pụtakarịsịrị ìhè n’ụbọchị Newton bụ na eluigwe na ala juru n’ihe dị mmiri mmiri—“ofe” mbara igwe—nakwa na ụṅara n’ihe ahụ dị mmiri mmiri na-eme ka mbara ụwa na-agagharị.
e Na 1900, ogologo afọ ndụ a na-atụ anya ya n’ọtụtụ mba Europe na na United States erughị 50. Eri mgbe ahụ, ọ rịwo elu nke ukwuu ọ bụghị nanị n’ihi ọganihu ọgwụ na ahụ ike n’ịchịkwa ọrịa kamakwa n’ihi ịdị ọcha na ọnọdụ ibi ndụ ka mma.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]
Na a pụghị ịnwapụtali okwu apụtachaghị na ọ bụ ụgha
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọtụtụ puku afọ tupu ụmụ mmadụ ahụ ụwa dị ka ihe dị okirikiri site na mbara igwe, Bible zoro aka na “gburugburu ụwa”
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Sir Isaac Newton kọwara na ike ndọda na-ejigide mbara ụwa nile n’ụzọ ngagharị ha