Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Kasienụ Ndị M Obi”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
    • 28, 29. (a) Olee otú Jehova si chetara ndị ya na ya ga-enyere ndị dara mbà aka? (b) Olee ihe atụ e ji gosi otú Jehova si enye ndị ohu ya ike?

      28 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova gara n’ihu n’agbamume ya nye ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị nwere nkụda mmụọ: “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. Ọbụna ụmụ okoro na-ada mbà, ike na-agwụkwa ha, ọbụna ụmụ okorobịa na-asụ ngọngọ daa: ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nku dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.”—Aịsaịa 40:29-31.

      29 Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere mkpa ọ dị inye onye dara mbà ike, Jehova pụrụ ibuworị n’uche njem siri ike ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ga-eme iji laghachi. Jehova chetaara ndị ya na ọ bụ omume ya inyere ndị dara mbà aka bụ́ ndị dabeere n’ebe ya nọ maka enyemaka. Ọbụna ụmụ mmadụ kasị gbasie ike—“ụmụ okoro” na “ụmụ okorobịa”—pụrụ inwe ike ọgwụgwụ ma daa n’ihi enwekwaghị ume. Ma, Jehova kwere nkwa inye ndị tụkwasịrị ya obi ike—ike na-adịghị agwụ agwụ iji gbaa ọsọ ma gaa ije. E ji ufe yiri ka ọ bụ na a dịghị etinyere ya mgbalị nke ugo, bụ́ nnụnụ dị ike nke pụrụ ịdị na-efegharị ruo ọtụtụ awa n’akwụsịtụghị akwụsị, mee ihe atụ nke otú Jehova si enye ndị ya ike.e N’atụmanya maka enyemaka dị otú ahụ nke Chineke, ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ enweghị ihe mere ha ga-eji nwee obi nkoropụ.

  • “Kasienụ Ndị M Obi”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
    • 30. Olee otú ezi ndị Kraịst taa pụrụ isi nweta nkasi obi site n’amaokwu ndị ikpeazụ nke Aịsaịa isi nke 40?

      30 Amaokwu ikpeazụ ndị a nke Aịsaịa isi nke 40 nwere okwu nkasi obi nye ezi ndị Kraịst na-ebi na mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. Ebe e nwere ọtụtụ ihe nrụgide na nsogbu ndị yiri ka ha na-akụda mmụọ, ọ bụ ihe na-emesi obi ike ịmata na Chineke anyị na-ahụ ihe isi ike ndị anyị na-edi na omume ikpe na-ezighị a na-emeso anyị. Anyị pụrụ ijide n’aka na Onye Okike nke ihe nile, Onye “nghọta Ya [na-enweghị] ọnụ ọgụgụ,” ga-edozi ikpe na-ezighị ezi nile n’oge ya na n’ụzọ nke ya. (Abụ Ọma 147:5, 6) Ka ọ dịgodị, ọ dịghị mkpa anyị ịtachi obi n’ike aka anyị. Jehova, bụ́ onye ihe o nwere na-adịghị agwụ agwụ, pụrụ inye ndị ohu ya ike—ọbụna “ọkịka nke ike”—n’oge ule.—2 Ndị Kọrint 4:7.

  • “Kasienụ Ndị M Obi”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
    • e Ugo na-eji ike dịkarịsịrị nta erugharị n’elu. Ọ na-eme otú ahụ site n’iji ikuku ọkụ na-arị elu eme ihe n’ụzọ nkà.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya