Isi nke Iri na Isii
Ozi Na-enye Olileanya Maka Ndị A Dọọrọ n’Agha Dara Mbà n’Obi
1. Kọwaa ọnọdụ ndị Juu e mere ka ha jee biri na Babilọn nọ na ya.
Ọ BỤ oge ọjọọ n’akụkọ ihe mere eme nke Juda. A kpụrụwo ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ n’ike site n’ala ha, ha na-ahụsikwa anya ugbu a ná ndọrọ n’agha na Babilọn. N’ezie, e mere ka ha nweretụ onwe ha ime ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị. (Jeremaịa 29:4-7) Ụfọdụ mụtara nkà dị iche iche ma ọ bụ banye n’achụmnta ego.a (Nehemaịa 3:8, 31, 32) Ka o sina dị, ndụ adịghịrị ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha mfe. Ha nọ n’agbụ, ma n’ụzọ anụ ahụ ma n’ụzọ ime mmụọ. Ka anyị lee otú o si bụrụ otú ahụ.
2, 3. Olee otú ije biri n’ala ọzọ ahụ si metụta ofufe ndị Juu na-efe Jehova?
2 Mgbe ndị agha Babilọn bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., ọ bụghị nanị na ha bibiri otu mba; ha kpakwara ezi ofufe aka ọjọọ. Ha kwakọọrọ ihe nile dị n’ụlọukwu Jehova ma bibie ya, kpaghasịa ndokwa nke inwe ndị nchụàjà site n’ịdọrọ ụfọdụ n’ime ndị si n’ebo Livaị n’agha na igbu ndị ọzọ egbu. Ebe a na-enweghị ụlọ a ga-anọ na-efe ofufe, ebe ịchụàjà, na òtù ndị nchụàjà a haziri ahazi, ọ bụ ihe na-apụghị ikwe omume ndị Juu ịchụrụ ezi Chineke ahụ àjà dị ka Iwu ahụ kwuru.
3 Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ka pụrụ ichebe okpukpe e ji mara ha site n’ibi úgwù na ịgbaso Iwu ahụ ruo n’ókè o kwere mee. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ idebe Ụbọchị Izu Ike ma zere ihe oriri ndị a machibidoro iwu. Ma n’ime otú a, ha nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ndị dọọrọ ha n’agha ga-akwa emo, n’ihi na ndị Babilọn na-ele ememe okpukpe ndị Juu anya dị ka ihe nzuzu. A pụrụ ịhụ nkụda mmụọ nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ nwere site n’ihe ọbụ abụ ahụ kwuru: “N’akụkụ osimiri nile nke Babilọn, n’ebe ahụ ka anyị nọdụrụ ala, ee, anyị kwara ákwá, mgbe anyị chetara Zaịọn. N’osisi willow dị n’etiti ya ka anyị na-ekokwasị ụbọ akwara nile anyị. N’ihi na n’ebe ahụ ka ndị na-adọta anyị n’agha rịọrọ n’aka anyị okwu abụ, ndị lụtara ihe anyị n’agha rịọkwara anyị ka anyị ṅụrịa ọṅụ, sị, Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ Zaịọn.”—Abụ Ọma 137:1-3.
4. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ ihe efu ndị Juu ịdabere n’ebe mba ndị ọzọ nọ maka mgbapụta, ma, ònye ka ha pụrụ ichigharịkwuru maka enyemaka?
4 Ònyezi ka ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha pụrụ ichigharịkwuru maka nkasi obi? Olee ebe nzọpụta ha ga-esi bịa? N’ezie, ọ bụghị site n’aka nke ọ bụla n’ime mba ndị gbara ha gburugburu! Ha nile enweghị nke dị ike imegide ndị agha Babilọn, ọtụtụ n’ime ha na-emegidekwa ndị Juu. Ma ọnọdụ ahụ abụghị nke olileanya na-adịghị na ya. Jehova, bụ́ onye ha nupụụrụ isi mgbe ha bụ ndị nweere onwe ha, ji amara kpọọ ha òkù na-enye obi ike, n’agbanyeghị na ha nọ n’ala ọzọ.
“Bịanụ ná Mmiri”
5. Gịnị ka okwu bụ́ “bịanụ ná mmiri,” pụtara?
5 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-agwa ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha nọ na Babilọn okwu n’ụzọ amụma, sị: “Gee ntị, onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ ná mmiri, onye ahụkwa nke na-enweghị ego; bịanụ, zụrụ ọka, rie; ee, bịanụ, zụrụkwa mmanya vine na mmiri ara ehi n’ejighị ego n’ahụghị ọnụ ahịa.” (Aịsaịa 55:1) Ihe ndị a e kwuru jupụtara n’okwu ihe atụ. Dị ka ihe atụ, tụlee òkù bụ́: “Bịanụ ná mmiri.” Ma mmiri adịghị, ọ gaghị ekwe omume ịdị ndụ. Ma mmiri ahụ dị oké mkpa adịghị, anyị bụ́ mmadụ pụrụ ịdị ndụ ruo nanị ihe dị ka otu izu. N’ihi ya, ọ dabara nnọọ adaba na Jehova ji mmiri mee ihe atụ nke mmetụta okwu ya pụrụ inwe n’ahụ ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha. Ozi ya ga-enye ha ume ọhụrụ, dị ka ihe ọṅụṅụ jụrụ oyi n’ụbọchị anwụ na-achasi ike. Ọ ga-eme ka nkụda mmụọ ha kwụsị, mejuo akpịrị ịkpọ nkụ ha maka eziokwu na ezi omume. Ọ ga-emekwa ka ha nwee olileanya nke nnwere onwe pụọ ná ndọrọ n’agha. Ma, iji rite uru, ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ aghaghị ịnụ ozi Chineke, ṅaa ntị na ya, ma mee ihe o kwuru.
6. Olee uru ndị Juu ga-erite ma ọ bụrụ na ha ‘azụrụ mmanya vine na mmiri ara ehi’?
6 Jehova na-ekwekwa nkwa inye “mmanya vine na mmiri ara ehi.” Mmiri ara ehi na-eme ka ahụ ndị na-eto eto sie ike ma na-enyere ụmụaka aka ito eto. N’otu aka ahụ, okwu Jehova ga-ewusi ndị ya ike n’ụzọ ime mmụọ ma mee ka ha nwee ike iwusi mmekọrịta ha na ya ike. Otú ọ dị, olee banyere mmanya vine? A na-ejikarị mmanya vine eme ihe n’oge ememe. Na Bible, a na-ejikọta ya na ọganihu na ịṅụrị ọṅụ. (Abụ Ọma 104:15) Site n’ịgwa ndị ya ka ha ‘zụrụ mmanya vine,’ Jehova na-emesi ha obi ike na iji obi ha dum laghachi n’ezi ofufe ga-eme ka ha “na-aṅụrị nanị ọṅụ.”—Deuterọnọmi 16:15; Abụ Ọma 19:8; Ilu 10:22.
7. N’ihi gịnị ka ọmịiko Jehova nwere n’ahụ ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ji dị ịrịba ama, gịnịkwa ka ọ na-akụziri anyị banyere ya?
7 Lee ka Jehova si dị ebere inye ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ume ọhụrụ dị otú ahụ n’ụzọ ime mmụọ! Ọmịiko ya dị ịrịba ama ọbụna karị ma ọ bụrụ na anyị echeta akụkọ ime isi ike na nke nnupụisi nke ndị Juu. Ọ bụghị na ha kwesịrị inweta ihu ọma Jehova. Otú ọ dị, ọbụ abụ bụ́ Devid dere ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, sị: “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. Ọ bụghị ruo mgbe nile ka Ọ ga na-ese okwu; Ọ bụghịkwa ruo mgbe ebighị ebi ka Ọ ga na-edebe iwe.” (Abụ Ọma 103:8, 9) Kama igbubi mmekọrịta nke ya na ndị ya, Jehova butere ụzọ n’ime ka ya na ha dịghachi ná mma. N’ezie, ọ bụ Chineke nke “ebere na-atọ ụtọ.”—Maịka 7:18.
Ịtụkwasị Obi n’Ebe Na-ekwesịghị Ekwesị
8. N’ebee ka ọtụtụ ndị Juu tụkwasịworo obi, n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị dị aṅaa?
8 Ruo ugbu a, ọtụtụ ndị Juu atụkwasịbeghị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu maka nzọpụta. Dị ka ihe atụ, tupu ọdịda Jerusalem, ndị ọchịchị ya tụkwasịrị obi n’ebe mba ndị dị ike dị maka enyemaka, soro ma Ijipt ma Babilọn na-akwa iko, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Ezikiel 16:26-29; 23:14) N’inwe ezi ihe kpatara ya, Jeremaịa dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ obi, wee mee ka anụ ahụ, bụ́ mmadụ, bụrụ ogwe aka ya, onye obi ya na-esikwa n’ebe Jehova nọ wezụga onwe ya.” (Jeremaịa 17:5) Ma, nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ndị Chineke mere!
9. Olee otú ọtụtụ ndị Juu pụrụ isi “na-atụ ego inye n’ọnọdụ ihe na-abụghị nri”?
9 Ugbu a, ha bụ ohu nye otu n’ime mba ndị ahụ ha tụkwasịrị obi. Hà amụtawo ihe? Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ n’ime ha amụtabeghị, n’ihi na Jehova na-ajụ, sị: “N’ihi gịnị ka unu na-atụ ego inye n’ọnọdụ ihe na-abụghị nri? na ihe pụtara ná ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ n’ọnọdụ ihe nke na-adịghị eju afọ?” (Aịsaịa 55:2a) Ọ bụrụ na ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha na-atụkwasị onye ọ bụla ọzọ na-abụghị Jehova obi, ha “na-atụ ego inye n’ọnọdụ ihe na-abụghị nri.” N’ezie, Babilọn agaghị atọhapụ ha, ebe o nwere ụkpụrụ nke ekweghị ka ndị ọ dọtara n’agha laa. N’eziokwu, Babilọn, ya na atụmatụ ya nke ịchị mba ndị ọzọ, azụmahịa ya, na okpukpe ụgha ya, enweghị ihe ọ ga-emere ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ.
10. (a) Olee otú Jehova ga-esi nyeghachi ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ụgwọ ọrụ ma ha gee ya ntị? (b) Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova na Devid gbara?
10 Jehova na-arịọ ndị ya, sị: “Geenụ m ntị nke ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abụba tọọkwa mkpụrụ obi unu ụtọ. Tọọnụ ntị unu n’ala, bịakwute m; nụrụnụ, mkpụrụ obi unu ewee dị ndụ: Mụ na unu ga-agbakwa ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ́ ebere nile kwesịrị ntụkwasị obi nke e meere Devid.” (Aịsaịa 55:2b, 3) Nanị olileanya nke ndị a na-adịghị eri nri na-edozi ahụ n’ụzọ ime mmụọ nwere bụ n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye na-agwa ha okwu ugbu a n’ụzọ amụma site n’ọnụ Aịsaịa. Ndụ ha kpọmkwem dabeere na ha ige ntị n’ozi Chineke, n’ihi na o kwuru na site n’ime otú ahụ, ‘mkpụrụ obi ha ga-adị ndụ.’ Otú ọ dị, gịnị bụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi” ahụ nke Jehova ga-eso ndị na-ege ya ntị gbaa? Ọgbụgba ndụ ahụ bụ banyere “ebere nile kwesịrị ntụkwasị obi nke e meere Devid.” Ihe karịrị otu narị afọ tupu mgbe ahụ, Jehova kwere Devid nkwa na ocheeze ya ‘ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’ (2 Samuel 7:16) N’ihi ya, “ọgbụgba ndụ ebighị ebi” ahụ e hotara n’ebe a metụtara ịchịisi.
Onye Nketa Na-adịgide Adịgide nke Alaeze Ebighị Ebi
11. N’ihi gịnị ka mmezu nke nkwa Chineke kwere Devid pụrụ iji yie ihe na-agaghị eme eme nye ndị ahụ e mere ka ha jee biri na Babilọn?
11 N’eziokwu, okwu banyere ịchịisi n’eriri Devid pụrụ iyi ihe na-agaghị eme eme nye ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ. A narawo ha ala ha na ọbụna mba ha! Ma nke ahụ bụ nanị ruo nwa oge. Jehova echefubeghị ọgbụgba ndụ ya na Devid. N’agbanyeghị otú o yiruru ihe na-agaghị eme eme dị ka mmadụ si ele ihe anya, nzube Chineke banyere Alaeze ebighị ebi n’eriri Devid ga-aga nke ọma. Ma, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa, olee mgbekwa? Na 537 T.O.A., Jehova tọhapụrụ ndị ya ná ndọrọ n’agha nke Babilọn ma weghachi ha n’ala nna ha. Nke a ò mere ka e guzobe alaeze ebighị ebi? Ee e, ha gara n’ihu ịnọ n’okpuru alaeze ukwu ọzọ na-ekpere arụsị, bụ́ Medo-Peasia. “Oge a kara aka” mgbe ndị mba ọzọ ga-achị isi ha agwụbeghị. (Luk 21:24, NW) Ebe a na-enweghị eze n’Israel, nkwa ahụ Jehova kwere Devid ga-anọgide bụrụ nke a na-emezughị ruo ọtụtụ narị afọ ga-abịa.
12. Olee ihe Jehova mere iji mezuo ọgbụgba ndụ Alaeze ya na Devid gbara?
12 Ihe karịrị afọ 500 mgbe a tọhapụsịrị Israel ná ndọrọ n’agha nke Babilọn, Jehova mere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ iji mezuo ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ mgbe o bufere ndụ nke Ọkpara ya, bụ́ mmalite nke ọrụ okike ya, site n’ebube nke eluigwe gaa n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu, bụ́ Meri. (Ndị Kọlọsi 1:15-17) Mgbe ọ na-ama ọkwa ihe ahụ ga-emenụ, mmụọ ozi Jehova gwara Meri, sị: “Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: Ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.” (Luk 1:32, 33) Ya mere, a mụnyere Jisọs n’usoro ndị eze si n’eriri Devid, o ketakwara ikike nke ịbụ eze. Ozugbo e chiri ya eze, Jisọs ga-achị “ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 9:7; Daniel 7:14) E si otú a dozie ụzọ ugbu a maka mmezu nke nkwa ahụ nọruworo ọtụtụ narị afọ Jehova kwere inye Devid onye nketa na-adịgide adịgide.
“Onye Iwu Nye Ndị Nile Dị Iche Iche”
13. Olee otú Jisọs si bụrụ “onye àmà nye ndị nile dị iche iche” ma n’oge ọ na-eje ozi ya ma mgbe ọ rịgosịrị n’eluigwe?
13 Gịnị ka onye a ga-abụ eze n’ọdịnihu ga-eme? Jehova na-ekwu, sị: “Lee, enyewo m ya ka ọ bụrụ onye àmà nye ndị nile dị iche iche, ka ọ bụrụ onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 55:4) Mgbe Jisọs tolitere, ọ bụ onye nnọchiteanya Jehova n’elu ala, onye àmà nke Chineke nye mba dị iche iche. N’oge ọ dị ndụ dị ka mmadụ, ọ bụ “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel” ka o jeere ozi. Otú ọ dị, ntakịrị oge tupu ya arịgoro n’eluigwe, Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m . . . lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 10:5, 6; 15:24; 28:19, 20) N’ihi ya, ka oge na-aga, e jiri ozi Alaeze ahụ jekwuru ndị na-abụghị ndị Juu, ụfọdụ n’ime ha kerekwaara òkè ná mmezu nke ọgbụgba ndụ ahụ e so Devid gbaa. (Ọrụ 13:46) N’ụzọ dị otú a, ọbụna mgbe ọnwụ, mbilite n’ọnwụ, na nrịgo ya n’eluigwe gasịrị, Jisọs nọgidere na-abụ ‘onye àmà Jehova nye ndị nile dị iche iche.’
14, 15. (a) Olee otú Jisọs si gosipụta na ya bụ “onye ndú na onye iwu”? (b) Atụmanya dị aṅaa ka ụmụazụ Jisọs na narị afọ mbụ nwere?
14 Jisọs gajekwa ịbụ “onye ndú na onye iwu.” N’ikwekọ ná nkọwa amụma a, mgbe Jisọs nọ n’ụwa ọ nakweere n’ụzọ zuru ezu ibu ọrụ nile nke ịbụisi ya ma bute ụzọ n’akụkụ nile, na-adọta ìgwè mmadụ buru ibu, kụziere ha okwu nke eziokwu, na-egosikwa uru ndị na-abịara ndị na-agbaso idu ndú ya. (Matiu 4:24; 7:28, 29; 11:5) Ọ zụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ dị irè, na-akwadebe ha maka ọrụ ime nkwusa ahụ nke dị n’ihu. (Luk 10:1-12; Ọrụ 1:8; Ndị Kọlọsi 1:23) N’ime afọ atọ na ọkara nanị, Jisọs tọrọ ntọala maka ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, nke dị n’otu, nke nwere ọtụtụ puku ndị òtù ndị si n’ọtụtụ agbụrụ! Ọ bụ nanị ezi “onye ndú na onye iwu” pụrụ ịrụzuworị oké ọrụ dị otú ahụ.b
15 E ji mmụọ nsọ Chineke tee ndị ahụ a chịkọtara n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ mmanụ, ha nwekwara atụmanya nke ịghọ ndị ha na Jisọs ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe ya. (Mkpughe 14:1) Otú ọ dị, amụma Aịsaịa na-ele anya gabiga oge nke Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ. Ihe àmà na-egosi na Jisọs Kraịst amaliteghị ịchị dị ka Eze nke Alaeze Chineke tupu 1914. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, otu ọnọdụ bilitere n’etiti ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa bụ́ nke yiri n’ọtụtụ ụzọ ọnọdụ nke ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na narị afọ nke isii T.O.A. N’eziokwu, ihe mere ndị Kraịst ahụ ghọrọ mmezu ka ukwuu nke amụma Aịsaịa.
Ndọrọ n’Agha nke Oge A na Ntọhapụ
16. Olee nsogbu sochiri ochichi e chiri Jisọs eze na 1914?
16 Nsogbu ụwa nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kara ochichi e chiri Jisọs Eze na 1914 akara. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe ọ ghọrọ Eze, Jisọs chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ndị nke ọzọ e kere eke n’eluigwe. Ozugbo e gbochiri Setan ịhapụ ụwa, ọ malitere ibuso ndị nsọ fọdụrụnụ agha, bụ́ ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ. (Mkpughe 12:7-12, 17) O ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na 1918 mgbe ọrụ nkwusa a na-arụ maka ọha fọrọ nke nta ka ọ kwụsị, a tụọkwa ndị ọrụ bụ́ isi nke Watch Tower Society mkpọrọ n’ihi ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru. N’ụzọ dị otú a, a dọọrọ ndị Jehova nke oge a n’agha n’ụzọ ime mmụọ, na-echetara anyị ndọrọ n’agha nkịtị nke ndị Juu oge ochie. Ha nwetara nkọcha dị ukwuu.
17. Olee otú ọnọdụ nke ndị e tere mmanụ si gbanwee na 1919, oleekwa otú e si wusie ha ike mgbe ahụ?
17 Otú ọ dị, ọnọdụ ndọrọ n’agha nke ndị ohu Chineke e tere mmanụ adịteghị aka. Na March 26, 1919, a tọhapụrụ ndị ọrụ ahụ a tụrụ mkpọrọ, ka e mesịkwara a kagburu ebubo nile e boro ha. Jehova wụkwasịrị ndị ya a tọhapụrụ atọhapụ mmụọ nsọ ya, na-enye ha ume maka ọrụ dị n’ihu. Ha ji ọṅụ zaghachi n’òkù ‘ịnara mmiri nke ndụ n’efu.’ (Mkpughe 22:17) Ha ‘zụụrụ mmanya vine na mmiri ara ehi n’ejighị ego, n’ahụghịkwa ọnụ ahịa’ ma bụrụ ndị e wusiri ike n’ụzọ ime mmụọ maka mmụba dị ebube gaje iwere ọnọdụ, nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na-ahụbughị.
Oké Ìgwè Mmadụ Agbakwuru Ndị E Tere Mmanụ nke Chineke
18. Ìgwè abụọ dị aṅaa ka a na-ahụ n’etiti ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, gịnịkwa ka ha na-emejupụta taa?
18 Ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere otu n’ime olileanya abụọ. Nke mbụ, a chịkọtawo “ìgwè atụrụ nta,” ndị ọnụ ọgụgụ ha dị 144,000—ndị Kraịst e tere mmanụ ndị sitere ma n’etiti ndị Juu ma n’etiti ndị Jentaịl, ndị bụ́ “Israel nke Chineke” ma nwee olileanya nke iso Jisọs chịa n’Alaeze eluigwe ya. (Luk 12:32; Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 14:1) Nke abụọ, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ egosipụtawo onwe ha na mgbe ikpeazụ. Ndị a nwere olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs. Tupu oké mkpagbu ahụ etiwapụ, ìgwè mmadụ a—ndị a na-ebughị ụzọ kpebie ọnụ ọgụgụ ha—so ìgwè atụrụ nta ahụ na-ejekọ ozi, ìgwè abụọ ahụ mejupụtakwara “otu ìgwè atụrụ” nke nọ n’okpuru “otu Onye ọzụzụ atụrụ.”—Mkpughe 7:9, 10; Jọn 10:16.
19. Olee otú “mba” nke Israel nke Chineke na-amabughị si zaghachi n’òkù mba ime mmụọ ahụ na-akpọ?
19 A pụrụ ịghọta ihe banyere nchịkọbata nke oké ìgwè mmadụ a site n’ihe ndị na-esonụ e kwuru n’amụma Aịsaịa: “Lee, mba nke ị na-amaghị ka ị ga-akpọ, mba nke na-amaghị gị ga-agbakwutekwa gị, n’ihi Jehova, bụ́ Chineke gị, ọbụna n’ihi Onye Nsọ nke Israel; n’ihi na O mewo ka ị maa mma.” (Aịsaịa 55:5) N’afọ ndị sochirinụ mgbe a tọhapụsịrị ha ná ndọrọ n’agha ime mmụọ, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ aghọtaghị ná mmalite na tupu Amagedọn abịa, a ga-eji ha mee ihe n’ịkpọ “mba” buru ibu bịa n’ofufe Jehova. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu, bụ́ ndị na-enweghị olileanya eluigwe, malitere isonyere ndị ahụ e tere mmanụ ma jiri otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ yiri nke ndị e tere mmanụ na-ejere Jehova ozi. Ndị ọhụrụ a hụrụ ọnọdụ a chọrọ mma nke ndị Chineke wee mata na Jehova nọnyeere ha. (Zekaraịa 8:23) N’afọ ndị 1930, ndị e tere mmanụ bịara ghọta ndị ìgwè a bụ n’ezie, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha nọ na-amụba n’etiti ha. Ha bịara ghọta na ọrụ nchịkọbata dị ukwuu ka dị n’ihu. Oké ìgwè mmadụ ahụ ji ọsọ na-esonyere ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, na-enwekwa ezi ihe kpatara ya.
20. (a) N’oge anyị, n’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ‘ịchọ Jehova,’ oleekwa otú e si eme nke a? (b) Olee otú Jehova ga-esi emeghachi omume nye ndị na-achọ ya?
20 N’oge Aịsaịa, a kpọrọ òkù, sị: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso.” (Aịsaịa 55:6) N’oge anyị, okwu ndị a kwesịrị ekwesị nye ma ndị mejupụtara Israel nke Chineke ma oké ìgwè mmadụ ahụ na-amụba amụba. Ngọzi Jehova na-adabere n’ihe ụfọdụ, ọ gaghịkwa anọgide na-akpọ òkù ya ruo mgbe ebighị ebi. Ugbu a bụ oge ịchọ ihu ọma Chineke. Mgbe oge a kara aka ruru maka ikpe Jehova, oge ga-agafeworị ime ihe. N’ihi ya, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, Ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na Ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—Aịsaịa 55:7.
21. Olee otú mba Israel siworo ghara ikwesị ntụkwasị obi n’ihe ndị nna ha ochie kwupụtara?
21 Nkebi ahịrịokwu bụ́ “ya laghachikwutekwa Jehova,” na-egosi na ndị nchegharị dị mkpa nweburu mgbe ha na Chineke na-emekọrịta ihe. Okwu ahụ na-echetara anyị na ọtụtụ akụkụ nke akụkụ a nke amụma Aịsaịa nwere mmezu mbụ ha n’ebe ndị Juu a dọọrọ n’agha na Babilọn nọ. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, ndị nna nna nke ndị a a dọọrọ n’agha kwupụtara mkpebi ha irubere Jehova isi mgbe ha sịrị: “Ya bụrụ anyị ihe arụ ịhapụ Jehova, ife chi ọzọ ofufe.” (Joshua 24:16) Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ihe ahụ bụ́ “ihe arụ” mere—ugboro ugboro! Enweghị okwukwe nke ndị Chineke bụ ihe mere ha ji jee biri na Babilọn.
22. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwuo na echiche ya na ụzọ ya dị elu karịa nke ụmụ mmadụ?
22 Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha echegharịa? Jehova na-ekwe nkwa site n’ọnụ Aịsaịa na ya ‘ga-agbaghara ha mmehie ha n’ụba.’ Ọ na-ekwukwa, sị: “N’ihi na echiche nke m, ha abụghị echiche unu, ụzọ unu kwa, ha abụghị ụzọ m; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta. N’ihi na dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú a ka ụzọ m nile dị elu karịa ụzọ nile unu, ọ bụkwa otú a ka echiche m nile dị elu karịa echiche nile unu.” (Aịsaịa 55:8, 9) Jehova zuru okè, echiche ya na ụzọ ya nile dịkwa elu nke ukwuu. Ọbụna ebere ya nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-apụghị ịtụ anya iru ma ọlị. Cheedị echiche: Mgbe anyị gbaghaara mmadụ ibe anyị, ọ bụ nanị onye mmehie ịgbaghara onye mmehie ihe. Anyị na-amata na n’oge na-adịghị anya ọ ga-adị anyị mkpa ka onye ọzọ bụ́ mmadụ ibe anyị gbaghara anyị. (Matiu 6:12) Ma Jehova, ọ bụ ezie na o nweghị mgbe ọ na-adị mkpa ka a gbaghara ya, na-agbaghara “n’ụba”! N’ezie, ọ bụ Chineke nke nwere oké obiọma ịhụnanya. N’ihi ebere ya kwa, Jehova na-emeghe windo nile nke eluigwe, na-awụkwasị ndị ji obi ha nile laghachikwute ya ngọzi.—Malakaị 3:10.
Ngọzi Maka Ndị Na-alaghachikwuru Jehova
23. Olee otú Jehova si mee ihe atụ nke ojiji e ji mmezu nke ihe o kwuru n’aka?
23 Jehova na-ekwe ndị ya nkwa, sị: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.” (Aịsaịa 55:10, 11) Ihe nile Jehova kwuru aghaghị imezu. Dị nnọọ ka mmiri na snow ndị na-esite n’igwe ezo si emezu nzube ha nke bụ́ ide ala na ime ka mkpụrụ mịa, otú a ka okwu Jehova nke na-esi n’ọnụ ya apụta si bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu. Ọ ga-emezu ihe o kwere ná nkwa—n’ụzọ e ji nnọọ n’aka.—Ọnụ Ọgụgụ 23:19.
24, 25. Ngọzi ndị dị aṅaa na-echere ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị ṅara ntị n’ozi Jehova ziri site n’ọnụ Aịsaịa?
24 N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị Juu aṅaa ntị n’okwu ndị ahụ a gwara ha n’ụzọ amụma site n’ọnụ Aịsaịa, ha aghaghị inweta nzọpụta ahụ Jehova kwere ná nkwa. N’ihi ya, ha ga-enweta ọṅụ dị ukwuu. Jehova na-ekwu, sị: “Ọṅụ ka unu ga-eji pụta, udo ka a ga-ejikwa duru unu: ugwu nile na ugwu nta nile ga-etiwa mkpu ọṅụ n’ihu unu, osisi nile nke ọhịa ga-akụkwa aka ha. N’ọnọdụ ogwu osisi fir ga-etolite, ọ bụkwa n’ọnọdụ uke ka osisi myrtle ga-etolite: o wee ghọọrọ Jehova aha, ghọọkwara Ya ihe ịrịba ama ebighị ebi nke a na-agaghị ebipụ ya.”—Aịsaịa 55:12, 13.
25 Na 537 T.O.A., ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ jiri ọṅụ si na Babilọn pụọ n’ezie. (Abụ Ọma 126:1, 2) Mgbe ha rutere Jerusalem, ha hụrụ ala nke jupụtara n’ọhịa ogwu na uke—cheta, ala ahụ atọgbọrọwo chakoo ruo ọtụtụ iri afọ. Ma ndị Chineke bụ́ ndị si mba ọzọ lọta pụrụ inye aka ugbu a ime ka e nwee mgbanwe mara mma! Osisi ndị toro oké ogologo, dị ka fir na myrtle, nọchiri ogwu na uke. Ngọzi Jehova pụtara ìhè ngwa ngwa ka ndị ya ji iti “mkpu ọṅụ” na-ejere ya ozi. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na ala ahụ n’onwe ya na-aṅụrị ọṅụ.
26. Ọnọdụ dị aṅaa a gọziri agọzi ka ndị Chineke nọ n’ime ya taa?
26 Na 1919, a tọhapụrụ ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ site ná ndọrọ n’agha ime mmụọ ha. (Aịsaịa 66:8) Ha na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ ji ịṅụrị ọṅụ na-ejere Chineke ozi ugbu a na paradaịs ime mmụọ. N’ịbụ ndị na-enweghị mmetụta ọ bụla nke Babilọn, ha nwere ọnọdụ ihu ọma, nke ghọwooro Jehova “aha.” Ọganihu ime mmụọ ha na-enye aha ya otuto ma na-ebuli ya elu dị ka Chineke nke ezi amụma. Ihe Jehova rụzuwooro ha na-egosi ịbụ Chineke ya, bụrụkwa ihe àmà nke ikwesị ntụkwasị obi ya n’ebe okwu ya dị na ebere ya n’ebe ndị chegharịrị echegharị nọ. Ka ndị nile nọgidere ‘na-azụrụ mmanya vine na mmiri ara ehi n’ejighị ego, n’ahụghịkwa ọnụ ahịa,’ na-aṅụrị ọṅụ n’ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A hụwo ọtụtụ aha ndị Juu n’ihe ndekọ achụmnta ego oge ochie nke ndị Babilọn.
b Jisọs ka na-elekọta ọrụ ahụ nke ime ndị na-eso ụzọ. (Mkpughe 14:14-16) Taa, ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst na-ele Jisọs anya dị ka Isi nke ọgbakọ ahụ. (1 Ndị Kọrint 11:3) Mgbe oge nke Chineke rukwara, Jisọs ga-eme ihe dị ka “onye ndú na onye iwu” n’ụzọ ọzọ, mgbe ọ ga-eduzi ọgụ ahụ ga-ekpebi ihe nile megide ndị iro Chineke n’agha Amagedọn.—Mkpughe 19:19-21.
[Foto dị na peeji nke 234]
A kpọrọ ndị Juu akpịrị na-akpọ nkụ n’ụzọ ime mmụọ ka ha ‘bịa ná mmiri’ ahụ nakwa ka ha ‘zụrụ mmanya vine na mmiri ara ehi’
[Foto dị na peeji nke 239]
Jisọs gosiri na ya bụ “onye ndú na onye iwu” nye mba dị iche iche
[Foto ndị dị na peeji nke 245]
“Onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya”