Jehova Na-agbaghara n’Ụba
“Onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, . . . n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—AỊSAỊA 55:7.
1. Gịnị ka e jiworo gọzie ndị na-anata mgbaghara Jehova ugbu a?
JEHOVA na-agbaghara ndị ajọ omume nwere nchegharị ma na-eme ka ha nwee ike ugbu a inwe udo nke uche n’ime paradaịs ime mmụọ. Nke a dị otú ahụ n’ihi na ha na-emezu ihe ndị a a chọrọ ha n’aka: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta ya, kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso: onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—Aịsaịa 55:6, 7.
2. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịsị ‘chọọnụ Jehova’ na ‘laghachikwutenụ ya,’ dị ka e hotara n’Aịsaịa 55:6, 7? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha gaa Babilọn mkpa ịlaghachikwute Jehova, gịnịkwa mere ụfọdụ n’ime ha?
2 Iji ‘chọọ Jehova’ ma kpọkuo ya n’ụzọ ọ na-anakwere, onye ajọ omume aghaghị ịhapụ ụzọ ọjọọ ya na echiche ọ bụla nke imerụ ndị ọzọ ahụ. Mkpa ọ dị ‘ịlaghachikwute Jehova’ na-egosi na onye ajọ omume ahụ hapụrụ Chineke, bụ́ onye ya na ya nweburu mmekọrịta chiri anya. Nke ahụ bụ ihe mere n’ọnọdụ ndị bi na Juda, bụ́ ndị ekwesịghị ntụkwasị obi ha nye Chineke mesịrị duga ná ndọrọ n’agha gaa Babilọn. Ọ dị mkpa ka ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha laghachikwute Jehova site n’ichegharị n’ihe ọjọọ ha nke kpataworo e ji dọrọ ha n’agha gaa Babilọn nakwa 70 afọ nke ịtọgbọrọ n’efu n’ala ha. N’afọ 537 T.O.A., ihe fọdụrụ ná ndị Juu na-atụ egwu Chineke bighachiri n’ala ahụ, na-abụ ndị a tọhapụrụ site na Babilọn site n’iwu ndị ọchịchị. (Ezra 1:1-8; Daniel 9:1-4) Mmetụta nke mweghachi ahụ dị ukwuu nke na e ji ala Juda tụnyere Paradaịs Iden.—Ezikiel 36:33-36.
3. Olee ụzọ ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ siworo nwee ahụmahụ yiri nke ndị ahụ na-atụ egwu Chineke a dọọrọ n’agha bụ́ ndị laghachiri na Juda?
3 Ndị Israel ime mmụọ enwewo ahụmahụ yiri nke ndị Juu ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị laghachiri na Juda mgbe a dọrọsịịrị ha n’agha gaa Babilọn. (Ndị Galetia 6:16) Ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ mere mgbanwe n’ụzọ ha na n’echiche ha ozugbo Agha Ụwa Mbụ gasịrị. Afọ ahụ bụ́ 1919 kara akara ọgwụgwụ nke ndọrọ n’agha pụọ n’ihu ọma zuru ezu nke Chineke n’ime Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. N’ihi na ha chegharịrị ná mmehie ndị metụtara ịtụ egwu mmadụ na arụghị ọrụ n’ozi Jehova, ọ tọhapụrụ ha site na Babilọn Ukwu ahụ, weghachi ha gaa n’ọnọdụ ime mmụọ ha ziri ezi, maliteghachikwa iji ha eme ihe ọzọ maka ikwusa ozi Alaeze ahụ. Paradaịs ime mmụọ apụtawo ìhè n’etiti ndị Chineke kemgbe ahụ, na-ewetara aha nsọ ya otuto. (Aịsaịa 55:8-13) Mgbe ahụ, n’ihe atụ oge ochie na nke yiri ya n’oge ugbu a, anyị nwere ihe àmà doro anya na ngọzi na-esochi mgbaghara Chineke, na n’ezie Jehova na-agbaghara ndị nwere nchegharị n’ụba.
4. Egwu dị aṅaa ka ụfọdụ ndị ohu Jehova na-atụ?
4 Ya mere, ndị ohu Jehova n’oge ugbu a pụrụ ịtụkwasị obi ná mgbaghara ya. Ma, ụfọdụ n’ime ha na-ada mbà n’obi banyere ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga, mmetụta nke ikpe ọmụma na-erikpu ha. Ha adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị ruru eru ibi na paradaịs ime mmụọ ahụ. N’ezie, ụfọdụ na-atụ egwu na ha emewo mmehie na-enweghị mgbaghara, na ọ dịghị mgbe ọ bụla ha ga-anata mgbaghara Jehova. Nke ahụ ọ̀ pụrụ ime eme?
Mmehie Ụfọdụ Enweghị Mgbaghara
5. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na mmehie ụfọdụ enweghị mgbaghara?
5 Mmehie ụfọdụ enweghị mgbaghara. Jisọs Kraịst kwuru, sị: “A ga-agbaghara mmadụ mmehie na nkwulu ọ bụla; ma a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.” (Matiu 12:31) Ya mere, mgbe ahụ, a gaghị agbaghara nkwulu megide mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya. Pọl onyeozi zoro aka n’ebe mmehie dị otú ahụ dị mgbe o dere, sị: “Ọ ga-abụ ihe na-agaghị ekwe omume n’ihe banyere ndị ahụ e meworo ka ha nwee ìhè na mbụ, . . . ma bụrụ ndị dapụworo, ịtụteghachi ha ọzọ ruo nchegharị, n’ihi na ha kpọgburu Ọkpara Chineke ọzọ nye onwe ha ma kpughe ya nye ihere n’ihu ọha.”—Ndị Hibru 6:4-6, NW.
6. Gịnị na-ekpebi ma mmehie ò nwere mgbaghara ma ọ bụ na ò nweghị?
6 Ọ bụ nanị Chineke maara ma mmadụ ò mewo mmehie na-enweghị mgbaghara. Otú ọ dị, Pọl nyere ìhè n’isiokwu nke a mgbe o dere, sị: “A sị na anyị were ọchịchọ obi na-anọ ná mmehie mgbe anyị nataworo mmazu nke eziokwu, àjà a ga-achụ banyere mmehie dị iche iche afọdụghị ọzọ, kama nke fọdụrụ bụ oké olileanya dị egwu nke ikpe.” (Ndị Hibru 10:26, 27) Onye ji ọchịchọ obi ya na-eme ihe na-elezi anya eme omume, ma ọ bụ “na-agba isi akwara ma na-emekarị omume rụrụ arụ site n’ọchịchọ onwe ya.” (Webster’s New Collegiate Dictionary) A dịghị agbaghara onye ọ bụla ji nlezianya na ịgba isi akwara na-anọgide na-eme mmehie mgbe ọ matara eziokwu ahụ. Ya mere, ọ bụchaghị mmehie ahụ n’onwe ya, kama ọ bụ ọnọdụ obi, ókè e leziruru anya wee mee ya, na-emetụta ma mmehie ọ̀ bụ nke nwere mgbaghara ma ọ bụ na ọ bụghị. N’aka nke ọzọ, gịnị ka o yikarịrị ka ọ̀ na-eme mgbe mmehie onye Kraịst mere na-enye ya nsogbu miri emi n’obi? Ma eleghị anya oké nchegbu ya na-egosi n’ezie, na o mebeghị mmehie na-enweghị mgbaghara.
Mmehie Ha Enweghị Mgbaghara
7. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ụfọdụ ndị okpukpe na-emegide Jisọs mere mmehie na-enweghị mgbaghara?
7 Ụfọdụ ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ́ ndị megidere Jisọs leziri anya mee mmehie, wee si otú a na-eme mmehie na-enweghị mgbaghara. Ọ bụ ezie na ha hụrụ mmụọ nsọ Chineke ka ọ na-arụ ọrụ site n’aka Jisọs mgbe ọ na-eme ezi ihe ma na-arụ ọrụ ebube, ndị ndú okpukpe ahụ kwuru na ike ya sitere n’aka Beelzebul, ma ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ha mere mmehie mgbe o doro ha anya nke ọma na mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ụzọ a na-apụghị ịgọpụ ịgọpụ. Otú a, ha mere mmehie na-enweghị mgbaghara, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya, ọ bụghị n’oge a, ọ bụghịkwa n’oge nke gaje ịbịa.”—Matiu 12:22-32.
8. N’ihi gịnị ka mmehie nke Judas Iskariọt ji bụrụ nke na-enweghị mgbaghara?
8 Mmehie nke Judas Iskariọt enweghịkwa mgbaghara. Nrara ọ raara Jisọs nye bụ omume ikpeazụ nke ilezi anya na ịkpacha anya na-ebi ụzọ ndụ nke ihu abụọ na emeghị ihe n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, mgbe Judas hụrụ ka Meri tere Jisọs mmanụ dị oké ọnụ ahịa, ọ jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka a na-ereghị mmanụ otite a [narị denarii atọ], were ya nye ndị ogbenye?” Jọn onyeozi kwukwara, sị: “Nke a ka [Judas] kwuru, ọ bụghị n’ihi na ọ kpọrọ ndị ogbenye ihe; kama n’ihi na ọ bụ onye ohi, na ebe o ji akpa ego, ọ na-ewepụ ihe a na-etinye n’ime ya.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Judas raara Jisọs nye maka ego ọlaọcha iri atọ. (Jọn 12:1-6; Matiu 26:6-16) N’ikwu eziokwu, Judas kwara ụta wee gbuo onwe ya. (Matiu 27:1-5) Ma a gbagharaghị ya, ebe ọ bụ na ụzọ ndụ ịchọ ọdịmma onwe ya nanị, nke o leziri anya nọgide na-ebi nakwa omume aghụghọ ya, gosipụtara mmehie ya megide mmụọ nsọ. Lee ka o si kwesị ekwesị na Jisọs kpọrọ Judas “nwa nke ịla n’iyi”!—Jọn 17:12; Mak 3:29; 14:21.
A Gbaghaara Ha Mmehie Ha
9. N’ihi gịnị ka Chineke ji gbaghara Devid mmehie ya n’ihe banyere Bat-sheba?
9 Mmehie e leziri anya mee na-adị iche kpọmkwem pụọ ná mmejọ nke ndị Chineke gbaghaara. Were Eze Devid nke Israel dị ka ihe atụ. Ọ kwasoro Bat-sheba iko, bụ́ nwunye Uraịa, ma mesịa mee ka Joab kpaa nkata ọnwụ Uraịa n’agha. (2 Samuel 11:1-27) N’ihi gịnị ka Chineke ji meere Devid ebere? N’ụzọ bụ isi, ọ bụ n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ nakwa n’ihi obi ebere nke Devid na ezi nchegharị ya.—1 Samuel 24:4-7; 2 Samuel 7:12; 12:13.
10. Ọ bụ ezie na Pita mere mmehie dị oké njọ, n’ihi gịnị ka Chineke ji gbaghara ya?
10 Tụleekwa ihe banyere Pita onyeozi. O mere ajọ mmehie site n’ịgọnarị Jisọs ugboro ugboro. N’ihi gịnị ka Chineke ji gbaghara Pita? N’adịghị ka Judas Iskariọt, Pita anọwo na-eme ihe n’eziokwu n’ozi Chineke na Kraịst. Mmehie nke onyeozi a bụ n’ihi adịghị ike anụ ahụ, o chegharịkwara n’ezie ma “kwaa ákwá nke ukwuu.”—Matiu 26:69-75.
11. Olee ụzọ ị pụrụ isi kọwaa “nchegharị,” gịnịkwa ka mmadụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o nwere nchegharị n’ezie?
11 Ihe atụ ndị a tụleworo na-egosi na ọbụna onye mere mmehie dị oké njọ pụrụ inweta mgbaghara Jehova Chineke. Ma àgwà dị aṅaa dị mkpa iji bụrụ onye a gbaghaara? Ezi nchegharị dị mkpa ma ọ bụrụ na onye Kraịst mere mmehie ga-abụ onye Chineke gbaghaara. Inwe nchegharị pụtara “ịhapụ mmehie site n’ịkwa ụta maka ajọ omume ndị e mere n’oge gara aga” ma ọ bụ “inwe mwute ma ọ bụ ịkwa arịrị maka ihe mmadụ meworo ma ọ bụ ihe ọ hapụrụ ime.” (Webster’s Third New International Dictionary) Onye nwere nchegharị n’ezie ga-egosipụta mwute miri emi maka nkọcha, iru újú, ma ọ bụ nsogbu ọ bụla mmehie ya wetaara aha na nzukọ Jehova. Onye ajọ omume ahụ nwere nchegharị ga-amịpụtakwa mkpụrụ kwekọrọ na nke ahụ, na-arụ ọrụ kwesịrị nchegharị. (Matiu 3:8; Ọrụ 26:20) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ ghọgbuwo mmadụ, ọ ga-eme ihe ndị ziri ezi iji kwụghachi ụgwọ maka ihe ahụ a tụfuru. (Luk 19:8) Onye Kraịst dị otú ahụ nwere nchegharị nwere ezi ihe dabeere n’Akwụkwọ nsọ ọ ga-eji nwee obi ike na Jehova ga-agbaghara ya n’ụba. Gịnị ka ihe ndị a bụ?
Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Obi Ike ná Mgbaghara Chineke
12. N’ihe ndabere dị aṅaa ka Abụ Ọma 25:11 na-egosi na onye nwere nchegharị pụrụ ikpe ekpere maka mgbaghara?
12 Onye ajọ omume nwere nchegharị pụrụ iji obi ike kpee ekpere maka mgbaghara n’ihe ndabere nke aha Jehova. Devid rịọrọ, sị: “N’ihi aha gị, Jehova, gbaghara ajọ omume m, n’ihi na o hiri nne.” (Abụ Ọma 25:11) Ekpere dị otú ahụ, ya na nchegharị maka nkọcha ọ bụla onye ajọ omume ahụ wetawooro aha Chineke, kwesịkwara ịbụ ihe mgbochi maka ime ajọ mmehie n’ọdịnihu.
13. Òkè dị aṅaa ka ekpere na-ekere ná mgbaghara Chineke?
13 Jehova Chineke na-aza ekpere sitere n’ala ala obi nke ndị ohu ya mere mmehie ma chegharịa na-ekpe. Dị ka ihe atụ, Jehova emeghị ka à ga-asị na ọ nụghị ekpere Devid, bụ́ onye kpere ekpere site n’obi ya mgbe ọ matara ịdị ukwu nke mmehie ya n’ihe banyere Bat-sheba. N’ezie, okwu Devid kwuru n’Abụ Ọma 51 na-egosipụta mmetụta nke ọtụtụ ndị na-arịọ arịrịọ. Ọ rịọrọ, sị: “Meere m amara, Chineke, dị ka ebere gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere gị nile si dị hichapụ njehie m nile. Sụcha m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, ị dịghị eleda ya anya.”—Abụ Ọma 51:1, 2, 17.
14. Olee ụzọ Akwụkwọ nsọ si emesi obi ike na Chineke na-agbaghara ndị na-enwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs?
14 Chineke na-agbaghara ndị na-enwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs. Pọl dere, sị: “Onye anyị sitere n’ọbara ya nwee mgbapụta anyị n’ime ya, bụ́ mgbaghara nke ndahie nile anyị.” (Ndị Efesọs 1:7) N’ịbụ nke pụtara otu ihe ahụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Ụmụntakịrị m, ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ onye ezi omume: ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma ọ bụghị ihe ịjụrụ ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.”—1 Jọn 2:1, 2.
15. Iji nọgide na-enweta obi ebere Chineke, gịnị ka onye mmehie nwere nchegharị na-aghaghị ime?
15 Obi ebere Jehova na-enye onye ajọ omume nwere nchegharị ihe ndabere maka inwe obi ike na a pụrụ ịgbaghara ya. Nehemaịa kwuru, sị: “Gị onwe gị bụ Chineke nke mgbaghara mmehie, onye na-eme amara nweekwa obi ebere, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere.” (Nehemaịa 9:17; tụlee Ọpụpụ 34:6, 7.) Otú ọ dị, iji nọgide na-enweta obi ebere Chineke, onye mmehie ahụ aghaghị ịgbalịsi ike idebe iwu Chineke. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ si kwuo, “ka obi ebere gị nile bịakwute m, ka m wee dị ndụ; n’ihi na iwu gị bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu. Obi ebere gị nile bara ụba, Jehova: dị ka ikpe gị nile si dị, mee ka m dị ndụ.”—Abụ Ọma 119:77, 156.
16. Nkasi obi dị aṅaa ka anyị nwere n’eziokwu ahụ bụ na Jehova na-echeba echiche n’ọnọdụ mmehie anyị?
16 Eziokwu ahụ bụ na Jehova na-echebara anyị echiche n’ihi ọnọdụ mmehie anyị na-enyekwa onye ajọ omume nwere nchegharị nkasi obi, meekwa ka o nwee ihe mere ọ ga-eji kpee ekpere na-enwe obi ike na Chineke ga-agbaghara ya. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid na-emesi anyị obi ike n’ụzọ na-akasi obi mgbe o kwupụtara, sị: “Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka o [Jehova Chineke] meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka o mesoworo anyị. N’ihi na dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere ya dị ike n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. Dị ka ihu anyanwụ si dị anya n’ọdịda anyanwụ, otú a ka o meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. N’ihi na ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:10-14) Ee, Nna anyị nke eluigwe na-enwe obi ebere na ọmịiko ọbụna karịa onye bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ mmadụ.
17. Gịnị ka ihe ndekọ oge gara aga nke ikwesị ntụkwasị obi mmadụ n’ozi Chineke nwere ime ná mgbaghara?
17 Onye mmehie nwere nchegharị pụrụ ikpe ekpere site n’inwe obi ike na Jehova agaghị eleghara ihe ndekọ ya gara aga nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi anya. Nehemaịa adịghị arịọ arịrịọ maka mgbaghara nke mmehie ya, ma o kwuru, sị: “Chineke m, cheta m, imere m ezi ihe.” (Nehemaịa 13:31) Onye Kraịst nwere nchegharị pụrụ inwe nkasi obi n’okwu ndị ahụ bụ́: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha ya dị.”—Ndị Hibru 6:10.
Enyemaka Sitere n’Aka Ndị Okenye
18. Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmehie nke onye Kraịst emewo ka ọ na-arịa ọrịa n’ime mmụọ?
18 Gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst echee na ya erughị eru ịnọgide na paradaịs ime mmụọ ma ọ bụ enweghị ike ikpe ekpere n’ihi na mmehie ya emewo ka ọ na-arịa ọrịa n’ime mmụọ? “Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW],” ka onye ahụ na-eso ụzọ bụ́ Jemes dere. “Ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] ga-emekwa ka o bilie; ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.” Ee, ndị okenye ọgbakọ pụrụ n’ụzọ dị irè isoro onye kwere ekwe ibe ha nwere nchegharị kpee ekpere, na-ekpekwara ya ekpere n’olileanya nke iweghachi ya n’ezi ahụ ike ime mmụọ.—Jemes 5:14-16.
19. Ọ bụrụ na a chụpụwo mmadụ n’ọgbakọ, gịnị ka ọ na-aghaghị ime iji bụrụ onye a gbaghaara na onye a kpọbataghachiri?
19 Ọbụna ma ọ bụrụ na kọmitii ikpe achụpụ onye mmehie na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ, ọ pụtaghị na o mewo mmehie na-enweghị mgbaghara. Otú ọ dị, iji bụrụ onye a gbaghaara na onye a kpọbataghachiri, ọ ghaghị iji ịdị umeala n’obi na-erube isi n’iwu nile nke Chineke, na-amịpụta mkpụrụ kwesịrị nchegharị, ma dee akwụkwọ ka ndị okenye kpọbataghachi ya. Mgbe a chụpụsịrị otu onye kwara iko n’ọgbakọ na Kọrint oge ochie, Pọl dere, sị: “O zuworo mmadụ dị otú a, bụ́ mba nke a nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime unu baara ya; ya mere, kama ịbara ya mba ọzọ ana m achọ ka unu were amara gbaghara ya kasiekwa ya obi, ka a ghara iji ihe mwute nke na-ewutebiga ya ókè loda mmadụ dị otú a n’ụzọ ọ bụla. N’ihi nke a arịọ m unu ka unu mee ka ịhụnanya unu hụrụ ya bụrụ ihe dị ịtụkwasị obi.”—2 Ndị Kọrint 2:6-8; 1 Ndị Kọrint 5:1-13.
Chineke Na-enye Ume
20, 21. Gịnị pụrụ inyere onye na-enwe nchekasị banyere ịbụ onye pụrụ imewo mmehie na-enweghị mgbaghara aka?
20 Ọ bụrụ na ihe ndị dị ka ahụ esighị ike ma ọ bụ ihe isi ike na-akpata nchekasị banyere ime mmehie na-enweghị mgbaghara, izu ike na ihi ụra nke ọma pụrụ inye aka. Otú ọ dị, i kwesịrị icheta okwu Pita karịsịa, nke bụ: “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.” Ekwela ka Setan kụdaa mmụọ gị mgbe ọ bụla, n’ihi na Pita kwukwara, sị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ Ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi: ma na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa. Ma Chineke nke amara nile . . . mgbe unu hụworo ahụhụ nwa oge, ya onwe ya ga-eme ka unu zuo okè, meekwa ka unu guzosie ike, meekwa ka unu dị ike.”—1 Pita 5:6-10.
21 Ya mere, ọ bụrụ na ị na-akwa arịrị ma ị nọwo na-atụ egwu na ikpe nke mmehie na-enweghị mgbaghara amawo gị, cheta na ụzọ Chineke nile bụ amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya. Ya mere, kpegara ya ekpere n’okwukwe. Nọgide na-eri nri ime mmụọ nke ọ na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Soro ndị kwere ekwe ibe gị na-akpakọrịta, na-ekerekwa òkè n’ozi ndị Kraịst n’ụzọ chiri anya. Nke a ga-agba okwukwe gị ume, meekwa ka i nwere onwe gị pụọ n’ụjọ ọ bụla nke na ọ pụrụ ịbụ na Chineke agbagharabeghị mmehie gị.
22. Gịnị ọzọ ka anyị ga-atụle?
22 Ndị bi na paradaịs ime mmụọ pụrụ inweta nkasi obi n’ịmata na Jehova na-agbaghara n’ụba. Ma, ndụ ha abụghị nke ọnwụnwa na-adịghị na ya n’oge a. Ma eleghị anya ha nwere ịda mbà n’obi n’ihi na onye ha hụrụ n’anya anwụwo ma ọ bụ onye ha hụrụ n’anya na-arịa oké ọrịa. Dị ka anyị ga-ahụ, n’ọnọdụ ndị a na ndị ọzọ, Jehova na-enyere ndị ya aka ma na-edu ha site ná mmụọ nsọ ya.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Jehova ‘na-agbaghara n’ụba’?
◻ Maka mmehie dị aṅaa ka a na-enweghị mgbaghara?
◻ N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka a na-agbaghara mmadụ mmehie ya?
◻ N’ihi gịnị ka ndị ajọ omume nwere nchegharị pụrụ iji nwee obi ike ná mgbaghara Chineke?
◻ Enyemaka dị aṅaa dịịrị ndị ajọ omume nwere nchegharị?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ị̀ maara ihe mere e ji gbaghara Pita na Devid ma a gbagharaghị Judas Iskariọt?
[Foto dị na peeji nke 12]
Enyemaka sitere n’aka ndị okenye ọgbakọ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji nyere onye Kraịst aka n’ụzọ ime mmụọ