Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 18 p. 262-275
  • Jehova Emee Ka Mmụọ nke Ndị Dị Umeala n’Obi Dị Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Emee Ka Mmụọ nke Ndị Dị Umeala n’Obi Dị Ndụ
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Bịaruonụ Nso Ebe A, Unu Ụmụ Ndị Ikom”
  • Ịwụsara Nkume Àjà Ihe Ọṅụṅụ
  • ‘Ị Nọgidere Na-eziga Ndị Ụkọ Gị’
  • ‘Ndị Ị Chịkọtaworo Agaghị Anapụta Gị’
  • “Onye ahụ nke Na-agbaba n’Ime M Ga-eketa Ala”
  • ‘Udo Dịrị Ndị Nọ n’Ebe Dị Anya, Dịkwara Ndị Nọ Nso’
  • Otu Nna na Ụmụ Ya Na-enupụ Isi
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Aịsaịa Ebuo Amụma Banyere ‘Ihe Omume Na-eju Anya’ nke Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Aka Jehova Adịghị Mkpụmkpụ
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Na-echere Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 18 p. 262-275

Isi nke Iri na Asatọ

Jehova Emee Ka Mmụọ nke Ndị Dị Umeala n’Obi Dị Ndụ

Aịsaịa 57:1-21

1. Mmesi obi ike dị aṅaa ka Jehova nyere, ajụjụ dịgasịkwa aṅaa ka okwu ya kpalitere?

“OTÚ a ka Ọ sịrị, bụ́ Onye dị elu, Nke e mekwara ka Ọ dị elu, Onye na-ebi ebi mgbe nile ebighị ebi, Onye Nsọ ka aha Ya bụkwa: Ọ sị, N’ebe dị elu dịkwa nsọ ka M bi, M binyekwaara onye mmụọ ya bụ ihe a zọpịara azọpịa dịkwa ala, ime ka mmụọ nke ndị dị umeala n’obi dị ndụ, na ime ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.” (Aịsaịa 57:15) Nke ahụ bụ ihe Aịsaịa onye amụma dere na narị afọ nke asatọ T.O.A. Gịnị na-eme na Juda nke mere ka ozi a bụrụ ihe na-enye nnọọ agbamume? Olee otú okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ si enyere ndị Kraịst aka taa? Ntụle nke Aịsaịa isi 57 ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị ahụ.

“Bịaruonụ Nso Ebe A, Unu Ụmụ Ndị Ikom”

2. (a) Olee oge o yiri ka ihe e kwuru n’Aịsaịa isi 57 ò metụtara? (b) Gịnị bụ ọnọdụ ndị ezi omume n’oge Aịsaịa?

2 Akụkụ a nke amụma Aịsaịa yiri ka ọ bụ oge Aịsaịa ka o metụtara. Tụlee otú mmebi iwu siworo gbamie mkpọrọgwụ ugbu a: “Onye ezi omume na-ala n’iyi, ma ọ dịghị onye ọ bụla na-etinye ya n’obi ya; a na-ekpochapụkwa ndị ebere, mgbe ọ na-adịghị onye na-aghọta na e kpochapụworo onye ezi omume n’ihu ihe ọjọọ. Ọ na-aba n’udo; ha na-ezu ike n’elu ihe ndina ha, onye ọ bụla nke na-agazi agazi.” (Aịsaịa 57:1, 2) Ọ bụrụ na onye ezi omume adaa, ọ dịghị onye na-ajụ ase. Ọ dịghị onye na-arịba nnwụchu ọnwụ ya ama. Ịda n’ụra ọnwụ na-ewetara ya udo, ntọhapụ n’ahụhụ nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kpatara, na nnwere onwe pụọ n’ọdachi. Mba Chineke họọrọ adabawo n’ọnọdụ dị nnọọ njọ. Ma lee otú ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi na-aghaghị isi bụrụ ndị a gbara ume ịmata na ọ bụghị nanị na Jehova na-ahụ ihe na-emenụ kama na ọ ga-enyere ha aka!

3. Gịnị ka Jehova gwara ajọ ọgbọ nke Juda, n’ihi gịnịkwa?

3 Jehova kpọrọ ajọ ọgbọ nke Juda òkù, sị: “Unu onwe unu, bịaruonụ nso ebe a, unu ụmụ ndị ikom nke nwanyị ji igwe ojii atụ isi ọma na isi ọjọọ, unu mkpụrụ nke nwoke na-akwa iko na nwanyị na-akwa iko.” (Aịsaịa 57:3) Nkọwa dị otú ahụ na-emenye ihere a kọwara ha dị ka ụmụ ndị ikom nke onye na-eji igwe ojii atụ isi ọma na isi ọjọọ na ụmụ nke nwoke na-akwa iko na nwanyị akwụna kwesịrị ha nnọọ. Ofufe ụgha nke ha chigharịworo gaa na ya na-agụnye omume ikpere arụsị na mgbaasị ndị na-asọ oyi, nakwa mmekọahụ rụrụ arụ. N’ihi ya, Jehova na-ajụ ndị mmehie a, sị: “Ònye ka ọ na-atọ unu ụtọ imegide? ònye ka unu na-asaghepụ ọnụ mbara, rịpụtasịakwa ire, imegide? unu onwe unu ábụghị ụmụ njehie, mkpụrụ okwu ụgha, unu ndị na-eme onwe unu ka unu dị ọkụ n’etiti osisi terebinth, n’okpuru osisi ndụ ọ bụla; ndị na-egbu ụmụ unu na ndagwurugwu nile n’okpuru mgbawa nke nkume nile dị elu?”—Aịsaịa 57:4, 5.

4. Ikpe gịnị mara ndị ajọ omume nke Juda?

4 Ndị na-eme ajọ omume na Juda na-ekpere arụsị ha bụ́ ofufe na-awụ akpata oyi n’ahụ n’ihu ọha, ‘ọ na-atọkwa ha ụtọ.’ Ha ji ịkwa emo na-eme ndị amụma Chineke akaje, bụ́ ndị e zitere ịgbazi ha, na-arịpụtasị ire ha n’ụzọ enweghị ihere na nkwanye ùgwù. Ọ bụ ezie na ha bụ ụmụ Abraham, omume nnupụisi ha na-eme ka ha bụrụ ụmụ nke njehie na mkpụrụ nke okwu ụgha. (Aịsaịa 1:4; 30:9; Jọn 8:39, 44) Ha na-anọ n’etiti oké osisi ndị dị ná mpụga obodo akpali ịnụ ọkụ n’obi okpukpe n’ofufe ikpere arụsị ha. Leekwa ofufe obi ọjọọ nke ahụ bụ! Leenụ, ha na-egbu ọbụna ụmụ ha, dị ka mba ndị ọzọ, ndị ụzọ ha rụrụ arụ mere ka Jehova chụpụ ha n’ala ahụ!—1 Ndị Eze 14:23; 2 Ndị Eze 16:3, 4; Aịsaịa 1:29.

Ịwụsara Nkume Àjà Ihe Ọṅụṅụ

5, 6. (a) Gịnị ka ndị bi na Juda họrọwooro ime kama ife Jehova ofufe? (b) Ruo n’ókè ha aṅaa ka ofufe arụsị nke Juda pụtaworo ìhè ma gbasaa ebe nile?

5 Lee otú ndị bi na Juda mikpuruworo nnọọ n’ikpere arụsị: “N’etiti nkume kwọrọ mụrụmụrụ nke mmiri iyi ka òkè gị dị; ha onwe ha, ha onwe ha bụ ihe ruuru gị n’ife nzà: ọ bụkwa ha ka ị wụsịworo àjà ihe ọṅụṅụ nye, sureekwa àjà nsure ọkụ, bụ́ onyinye ịnata ihu ọma. À ga-akasi m obi banyere ihe ndị a?” (Aịsaịa 57:6) Ndị Juu bụ ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, ma kama ife ya ofufe, ha na-atụtụta nkume n’ala ala mmiri ma jiri ha mere chi. Devid kwupụtara na Jehova bụ òkè ya, ma ndị mmehie a ahọrọwo arụsị na-adịghị ndụ ndị e ji nkume mee ka ha bụrụ òkè ha ma na-awụsara ha àjà ihe ọṅụṅụ. (Abụ Ọma 16:5; Habakuk 2:19) Olee nkasi obi Jehova pụrụ inweta n’ofufe dị otú ahụ rụrụ arụ nke ndị a kpọkwasịrị aha ya na-efe?

6 Juda nọ ebe nile na-ekpere arụsị—n’okpuru nnukwu osisi, na ndagwurugwu, n’elu ugwu, n’obodo ha dị iche iche. Ma Jehova na-ahụzu ya, sitekwa n’ọnụ Aịsaịa, O kpughere ịrụ arụ ya: “N’elu ugwu dị elu, nke e mekwara ka ọ dị elu, ka i doworo ihe ndina gị: ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ị rịgooro ịchụ àjà. Ọ bụkwa n’azụ ọnụ ụzọ gị na akụkụ ọnụ ụzọ gị ka i doworo ihe ncheta gị.” (Aịsaịa 57:7-8a) Juda na-emezi ihe ndina ya nke adịghị ọcha ime mmụọ n’ebe ndị dị elu, ọ na-anọkwa n’ebe ahụ achụrụ chi dị iche iche nke ala ọzọ àjà.a Arụsị dịcha ọbụna n’azụ ọnụ ụzọ na n’akụkụ ọnụ ụzọ nke ụlọ ndị mmadụ.

7. Mmụọ dị aṅaa ka Juda ji na-ekere òkè n’ofufe rụrụ arụ?

7 Ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche ihe mere Juda ji tinyemie aka otú a n’ofufe na-adịghị ọcha. Ọ̀ dị ike ka ukwuu nke manyeworo ya ịgbahapụ Jehova? Azịza ya bụ ee e. O ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ya, site n’ọchịchọ obi ya. Jehova na-ekwu, sị: “Mgbe M na-anọghị ka i kpupụrụ ihe ndina gị, wee rịgoo: i mere ka ihe ndina gị saa mbara, wee soro ha gbaara onwe gị ndụ; ị hụrụ ihe ndina ha n’anya; [akụkụ ahụ ha ji bụrụ nwoke, NW] ka ị hụrụ.” (Aịsaịa 57:8b) Juda esorowo chi ụgha ya dị iche iche gbaa ndụ, o nwekwara mmasị ná mmekọrịta rụrụ arụ nke ya na ha. O nwere mmasị karịsịa ná mmekọahụ rụrụ arụ—ma eleghị anya na-agụnye iji ihe oyiyi nke akụkụ ahụ nwoke ji enwe mmekọahụ na-eme ihe—nke e ji mara ofufe nke chi ndị a!

8. Mgbe eze dị aṅaa kpọmkwem na-achị ka ikpere arụsị nwere ihe ịga nke ọma na Juda?

8 Otú e si kọwaa ofufe obi ọjọọ, nke rụrụ nnọọ arụ nke ikpere arụsị kwekọrọ n’ihe anyị maara banyere ọtụtụ ndị eze ọjọọ nke Juda. Dị ka ihe atụ, Manase wuru ebe ndị dị elu, wuoro Beal ebe ịchụàjà dị iche iche, ma wuo ebe ịchụàjà nke okpukpe ụgha n’ime ogige abụọ ndị dị n’ụlọukwu ahụ. O mere ka ụmụ ya ndị ikom gabiga n’ime ọkụ, jiri igwe ojii tụọ isi ọma na isi ọjọọ, jụọ ndị mmụọ ase, kwadookwa mgbaasị. Eze Manase tinyekwara ihe oyiyi a kpụrụ akpụ nke Ashera ahụ o mere n’ụlọukwu Jehova.b Ọ rabanyere Juda n’ime “ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ.” (2 Ndị Eze 21:2-9) Ụfọdụ ndị kwenyere na ọ bụ Manase mere ka e gbuo Aịsaịa, ọ bụ ezie na aha Manase apụtaghị n’Aịsaịa 1:1.

‘Ị Nọgidere Na-eziga Ndị Ụkọ Gị’

9. N’ihi gịnị ka Juda ji zipụ ndị ụkọ gaa “n’ebe dị anya”?

9 Njehie nke Juda abụghị nanị ife chi ụgha. N’iji Aịsaịa eme ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya, Jehova na-ekwu, sị: “I wee were mmanụ jegharịkwuru [Melek, NW], i mekwara mmanụ otite gị na-esi ísì ụtọ ka ha baa ụba, i zikwara ndị ụkọ gị n’ebe dị anya, i wee mee onwe gị ka ị dị ala ruo [Sheol, NW].” (Aịsaịa 57:9) Alaeze Juda nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi jekwuuru “Melek,” bụ́ “eze” n’asụsụ Hibru—ikekwe eze na-achị ala ọzọ—na-enye ya onyinye ndị dị oké ọnụ ma na-adọrọ adọrọ, bụ́ ndị mmanụ na ihe otite na-esi ísì ụtọ nọchitere anya ha. Juda zipụrụ ndị ozi gaa n’ebe ndị dị anya. N’ihi gịnị? Iji rụgide mba ndị Jentaịl iso ya banye ná njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ebe ọ gbakụtaworo Jehova azụ, ọ na-atụkwasị obi ya n’ebe ndị eze ala ọzọ nọ.

10. (a) Olee otú Eze Ehaz si chọọ ka ya na eze Asiria jikọọ aka? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Juda si ‘wetuo onwe ya ala ruo Sheol’?

10 Otu ihe atụ banyere nke a bụ n’oge Eze Ehaz. N’ịbụ onye na-atụ ụjọ n’ihi njikọ aka nke Israel na Siria, eze ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke Juda zipụrụ ndị ozi gakwuru Tiglat-pilesa nke Atọ nke Asiria, sị: “Ohu gị na nwa gị ka m bụ: rịgota, zọpụta m n’aka eze Siria na n’aka eze Israel, ndị na-ebili imegide m.” Ehaz zigaara eze Asiria ọlaọcha na ọlaedo dị ka ihe iri ngo, eze ahụ zakwara, na-awakpo Siria mwakpo dị oké njọ. (2 Ndị Eze 16:7-9) Ná mmekọrịta nke ya na mba ndị Jentaịl, Juda weturu onwe ya ala ruo “ala ala nke Sheol.” (An American Translation) N’ihi mmekọrịta ndị ahụ, ọ ga-anwụ, ma ọ bụ kwụsị ịdị adị dị ka mba kwụụrụ onwe ya, nke nwere eze.

11. Echiche ụgha dị aṅaa nke ịnọ ná nchebe ka Juda na-egosipụta?

11 Jehova gara n’ihu ịgwa Juda okwu, sị: “N’ịba ụba nke ụzọ gị ka ike gwụsịrị gị; ị sịghị, Ntụkwasị obi adịghị: ndụ aka gị ka ị chọtara; n’ihi ya ị rịaghị ọrịa.” (Aịsaịa 57:10) Ee, mba ahụ adọgbuwo onwe ya n’ọrụ nke ukwuu ná ndapụ n’ezi ofufe ya, ọ hụghịkwa enweghị olileanya nke mgbali ya. Kama nke ahụ, ọ na-aghọ onwe ya aghụghọ ikweta na ya na-enwe ihe ịga nke ọma site n’ike nke aka ya. Ọ dị ya ka o nwere ume na ahụ ike. Lee ihe nzuzu ọ bụ!

12. Ọnọdụ dịgasị aṅaa dị na Krisendọm yiri ndị dị na Juda?

12 Taa, e nwere nzukọ nke àgwà ya na-echetara anyị àgwà Juda n’oge Aịsaịa. Krisendọm na-eji aha Jisọs eme ihe, ma ọ na-achọ iso mba dị iche iche jikọọ aka, ọ kwajuwokwa arụsị n’ebe ndị a na-efe ofufe na ya. Ọbụna ndị òtù ya na-edebe ihe oyiyi ndị e ji ekpere arụsị n’ebe obibi ha dị iche iche. Krisendọm ejiriwo ndị ntorobịa ya chụọ àjà n’agha nke mba dị iche iche. Lee otú ihe a nile na-aghaghị isi na-ewute ezi Chineke ahụ, bụ́ onye nyere ndị Kraịst iwu, sị: “Gbanahụnụ ikpere arụsị”! (1 Ndị Kọrint 10:14) Site n’imikpu onwe ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Krisendọm esorowo ‘ndị eze nke ụwa kwaa iko.’ (Mkpughe 17:1, 2) N’ezie, ọ bụ onye nkwado bụ́ isi nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Gịnị ga-abịakwasị akwụna okpukpe a? Gịnị ka Jehova gwara onye ọ na-eṅomi, bụ́ Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi, karịsịa nke isi obodo ya bụ́ Jerusalem na-anọchite anya ya?

‘Ndị Ị Chịkọtaworo Agaghị Anapụta Gị’

13. Olee “ụgha” Juda malitere ịgha, oleekwa otú o si emeghachi omume na ndidi Jehova?

13 “Ònye ka i chegbuworo onwe gị banyere ya, wee tụọ egwu ya, na ị na-ekwu okwu ụgha?” ka Jehova na-ajụ. Ọ bụ ajụjụ kwesịrị ekwesị! N’ezie, Juda adịghị atụ Jehova egwu ziri ezi. A sị na ha na-atụ ya ụdị egwu ahụ, ọ garaghị aghọ mba nke jupụtara ná ndị ụgha, ndị na-efe chi ụgha ofufe. Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “Wee ghara icheta m, gharakwa itinye ya n’obi gị? Mụ onwe m ádịghị agba nkịtị ọbụna site na mgbe ebighị ebi gara aga, i wee ghara ịtụ egwu m?” (Aịsaịa 57:11) Jehova agbachiwo nkịtị, ghara inye Juda ntaramahụhụ ozugbo. Juda ò nwere ekele maka nke a? Ee e, kama nke ahụ, ọ na-ewere ndidi Chineke dị ka ọ̀ bụ na o nweghị mmasị. Ọ dịghịzi atụ Ya egwu ma ọlị.

14, 15. Gịnị ka Jehova na-ekwu banyere ọrụ dị iche iche nke Juda na ‘ndị ọ chịkọtaworo’?

14 Otú ọ dị, oge inwe ogologo ntachi obi nke Chineke ga-abịa ná njedebe. N’ilepụ anya gaa n’oge ahụ, Jehova na-ekwu, sị: “Mụ onwe m ga-egosi ezi omume gị; ma ọrụ gị nile, ha agaghị abara gị uru. Mgbe ị na-eti mkpu, ka ndị ị chịkọtaworo napụta gị; ma ha nile ka ifufe ga-efepụ, otu nku ume ga-ekupụ ha.” (Aịsaịa 57:12, 13a) Jehova ga-ekpughe ezi omume ihu abụọ nke Juda. Ọrụ ihu abụọ ndị ọ na-arụ agaghị aba uru ọ bụla. ‘Ndị ọ chịkọtaworo,’ bụ́ arụsị ndị ọ kwakọbara, agaghị anapụta ya. Mgbe ọdachi dara, nanị otu nku ume ga-ekupụ chi dị iche iche ọ tụkwasịrị obi.

15 E mezuru ihe Jehova kwuru na 607 T.O.A. Ọ bụ mgbe ahụ ka Eze Nebukadneza nke Babilọn bibiri Jerusalem, gbaa ụlọukwu ya ọkụ, ma dọrọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ahụ n’agha. “E wee mee ka Juda si n’ala ya jee biri n’ala ọzọ.”—2 Ndị Eze 25:1-21.

16. Gịnị na-echere Krisendọm na ihe nile fọdụrụ na “Babilọn Ukwu ahụ”?

16 N’otu aka ahụ, ụbara arụsị nke Krisendọm kwakọbara agaghị anapụta ya n’ụbọchị iwe Jehova. (Aịsaịa 2:19-22; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10) A ga-ebibi Krisendọm nakwa ihe nile fọdụrụ na “Babilọn Ukwu ahụ”—alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-acha uhie uhie na mpi iri ya “ga-emekwa [Babilọn Ukwu ahụ] ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:3, 16, 17) Lee ka obi si dị anyị ụtọ na anyị rubere isi n’iwu bụ́: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile”! (Mkpughe 18:4, 5) Ka anyị ghara ịlaghachi n’ime ya ma ọ bụ n’ụzọ ya nile ma ọlị.

“Onye ahụ nke Na-agbaba n’Ime M Ga-eketa Ala”

17. Nkwa dị aṅaa ka e kwere ‘onye na-agbaba n’ime Jehova,’ oleekwa mgbe e mezuru nke a?

17 Otú ọ dị, gịnị banyere ihe ndị e kwuziri n’amụma Aịsaịa? “Onye ahụ nke na-agbaba n’ime m ga-eketa ala, nwetakwa ugwu nsọ m.” (Aịsaịa 57:13b) Ònye ka Jehova na-agwa okwu ugbu a? Ọ na-ele anya gabiga ọdachi ahụ na-abịanụ ma na-ebu amụma ntọhapụ nke ndị ya na Babilọn na mweghachi nke ofufe dị ọcha n’ugwu nsọ ya, bụ́ Jerusalem. (Aịsaịa 66:20; Daniel 9:16) Lee agbamume nke a na-aghaghị ịbụrụ onye Juu ọ bụla nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi! Ọzọ, Jehova na-ekwu, sị: “Ọ ga-asịkwa, Tụlienụ, tụlienụ, dozienụ ụzọ, bupụnụ ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ndị m.” (Aịsaịa 57:14) Mgbe oge ruru ka Chineke napụta ndị ya, a ga-edozi ụzọ, wepụsịa ihe ịsụ ngọngọ nile.—2 Ihe E Mere 36:22, 23.

18. Olee otú e si kọwaa ịdị elu nke Jehova, ma, nchegbu ịhụnanya dị aṅaa ka ọ na-egosipụta?

18 Ọ bụ ebe a ka Aịsaịa onye amụma nọ kwuo ihe ndị ahụ e kwuru n’elu, sị: “Otú a ka Ọ sịrị, bụ́ Onye dị elu, Nke e mekwara ka Ọ dị elu, Onye na-ebi ebi mgbe nile ebighị ebi, Onye Nsọ ka aha Ya bụkwa: Ọ sị, N’ebe dị elu dịkwa nsọ ka M bi, M binyekwaara onye mmụọ ya bụ ihe a zọpịara azọpịa dịkwa ala, ime ka mmụọ nke ndị dị umeala n’obi dị ndụ, na ime ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.” (Aịsaịa 57:15) Ocheeze Jehova dị n’eluigwe kasị elu. Ọ dịghị ebe dị elu karịa ya. Lee ka o si enye nkasi obi ịmara na o si n’ebe ahụ na-ahụ ihe nile—ọ bụghị nanị mmehie nke ndị ajọ omume kamakwa ezi omume nke ndị na-agbalị ijere ya ozi! (Abụ Ọma 102:19; 103:6) Ọzọkwa, ọ na-anụ ịsụ ude nke ndị a na-emegbu emegbu ma na-eme ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ. Okwu ndị a aghaghị imetụwo ndị Juu nwere nchegharị n’oge ochie n’obi. N’ezie, ha na-emetụ anyị n’obi taa.

19. Olee mgbe iwe Jehova na-akwụsị?

19 Ihe Jehova kwuziri, na-enyekwa nkasi obi: “Ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka M ga na-alụ ọgụ, ọ bụghịkwa ruo mgbe nile ka M ga na-ewe iwe: n’ihi na mmụọ ga-ada mbà n’ihu m, ya na mkpụrụ obi nile Mụ onwe m meworo.” (Aịsaịa 57:16) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị Chineke kere nke pụrụ ịdịgide ndụ ma a sị na iwe Jehova na-adịru ebighị ebi, n’enweghị njedebe. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, iwe Chineke na-adịru nanị nwa oge. Ọ na-akwụsị mgbe o mezuru nzube ya. Nghọta a sitere n’ike mmụọ nsọ na-enyere anyị aka inwe ekele miri emi maka ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ihe o kere eke nọ.

20. (a) Olee otú Jehova si emeso onye mmehie nke na-enweghị nchegharị? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si akasi onye nwere nchegharị obi?

20 Anyị na-aghọtakwu ya ka Jehova na-aga n’ihu. O bu ụzọ kwuo, sị: “N’ihi ajọ omume nke uru ya ka M were iwe, wee tie ya ihe, na-ezobe ihu m na-ewekwa iwe: o wee na-aga na-echigharị azụ n’ụzọ nke obi ya.” (Aịsaịa 57:17) Ajọ omume ndị e mere n’ihi anyaukwu na-akpata iwe Chineke n’ezie. Ọ bụrụhaala na mmadụ anọgide na-echigharị azụ n’obi ya, Jehova ga-anọgide na-ewe iwe. Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ na-echigharị azụ aṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị? Mgbe ahụ, Jehova gosiri otú ịhụnanya na ọmịiko ya si akpali ya ime ihe: “Ụzọ ya nile ka M hụworo, M ga-emekwa ka ahụ dị ya ike: M ga-edukwa ya, nyeghachi ya nkasi obi nile, nyeghachikwa ndị ya na-eru újú.” (Aịsaịa 57:18) Mgbe Jehova nyesịrị ahụhụ, ọ na-eme ka ahụ dị onye nwere nchegharị ike ma na-akasi ya na ndị so ya na-eru újú obi. Ọ bụ ya mere ndị Juu ji nwee ike ịlaghachi n’ala ha na 537 T.O.A. N’eziokwu, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ Juda ghọrọ alaeze kwụụrụ onwe ya, nke eze sitere n’eriri Devid na-achị. N’agbanyeghị nke ahụ, e wughachiri ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem, e weghachikwara ezi ofufe.

21. (a) Olee otú Jehova si mee ka mmụọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ dị ndụ na 1919? (b) Àgwà dị aṅaa ka anyị nile n’otu n’otu ga-eme nke ọma ịzụlite?

21 “Onye dị elu, Nke e mekwara ka Ọ dị elu,” bụ́ Jehova, gosikwara nchegbu o nwere maka ọdịmma nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na 1919. N’ihi mmụọ inwe nchegharị na nke ịdị umeala n’obi ha, Chineke ukwu ahụ, bụ́ Jehova, ji obiọma hụ mkpagbu ha ma napụta ha ná ndọrọ n’agha nke Babilọn. O wepụrụ ihe ịsụ ngọngọ nile ma duru ha gaa ná nnwere onwe ka ha wee nwee ike ife ya ofufe dị ọcha. N’ụzọ dị otú a, e mezuru n’oge ahụ ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa. E nwekwara ụkpụrụ ndị na-adị irè mgbe nile, bụ́ ndị na-emetụta onye ọ bụla n’ime anyị, ndị dị n’okwu ndị ahụ. Jehova na-anakwere nanị ofufe sitere n’aka ndị dị umeala n’obi. Ọ bụrụkwa na otu onye n’ime ndị ohu Chineke emehie, o kwesịrị ikweta mmehie ya ngwa ngwa, nara ịdọ aka ná ntị, ma mezie ụzọ ya. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na Jehova na-eme ka ahụ dị ndị dị umeala n’obi ike, na-akasikwa ha obi ma ‘na-emegide ndị mpako.’—Jemes 4:6.

‘Udo Dịrị Ndị Nọ n’Ebe Dị Anya, Dịkwara Ndị Nọ Nso’

22. Ọdịnihu dị aṅaa ka Jehova na-ebu n’amụma maka (a) ndị nwere nchegharị? (b) ndị na-emebi iwu?

22 N’igosi ọdịiche dị n’etiti ọdịnihu nke ndị chegharịrịnụ na nke ndị nọgidere n’ụzọ ọjọọ ha, Jehova na-ekwu, sị: “Ana m eke mkpụrụ egbugbere ọnụ abụọ: Udo, udo, dịrị onye nọ n’ebe dị anya, dịkwara onye nọ nso, . . . M ga-emekwa ka ahụ dị ya ike. Ma ndị na-emebi iwu dị ka oké osimiri nke na-amagharị amagharị: n’ihi na ọ pụghị ịdị jụụ, mmiri ya na-amapụtakwa ụrọ na apịtị. Ọ dịghị udo ndị na-emebi iwu nwere.”—Aịsaịa 57:19-21.

23. Gịnị bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka Jehova si “eke” mkpụrụ a?

23 Mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ àjà otuto a na-achụrụ Chineke—nkwupụta ihu ọha nye aha ya. (Ndị Hibru 13:15) Olee otu Jehova si “eke” nkwupụta ihu ọha ahụ? Iji chụọ àjà otuto, mmadụ aghaghị ibu ụzọ mụta banyere Chineke mgbe ahụ nwee okwukwe na ya. Okwukwe—mkpụrụ nke mmụọ Chineke—na-akwali onye ahụ ịgwa ndị ọzọ ihe ọ nụrụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ na-eme nkwupụta n’ihu ọha. (Ndị Rom 10:13-15; Ndị Galetia 5:22) E kwesịkwara icheta na ọ bụ Jehova kpọmkwem nyere ndị ohu ya ọrụ ịkpọsa otuto ya. Ọ bụkwa Jehova bụ onye na-atọhapụ ndị ya, na-eme ka o kwe ha omume ịchụ àjà otuto dị otú ahụ. (1 Pita 2:9) N’ihi ya, a pụrụ nnọọ ikwu na Jehova na-eke mkpụrụ egbugbere ọnụ a.

24. (a) Olee ndị bịara nwee udo nke Chineke, gịnịkwa ka ọ rụpụtara? (b) Olee ndị na-enweghị udo, gịnịkwa ka ọ rụpụtaara ha?

24 Lee mkpụrụ egbugbere ọnụ na-enye obi ụtọ ndị Juu na-aghaghị ịdị na-achụ n’àjà mgbe ha laghachiri n’ala nna ha, na-abụ abụ otuto nye Jehova! Ha aghaghị ịdị na-aṅụrị ọṅụ inweta udo nke Chineke, ma ha nọ “n’ebe dị anya”—ebe dị anya site na Juda, ka nọrọ na-echere ịlaghachi—ma hà “nọ nso”—nọrọ anọrọ n’ala nna ha. Ná ntụnyere, lee otú ọnọdụ si dị iche nye ndị na-emebi iwu! Ndị ọ bụla na-aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova, ndị na-emebi iwu, ndị ọ sọkwara ha bụrụ, ebe ọ sọkwara ha nọrọ, enweghị udo. N’inugharị dị ka oké osimiri na-amagharị amagharị, ha nọgidere na-amịpụta, ọ bụghị mkpụrụ egbugbere ọnụ, kama “ụrọ na apịtị,” ihe ọ bụla na-adịghị ọcha.

25. Olee otú ọtụtụ ndị nọ n’ebe nile si enweta udo?

25 Taakwa, ndị na-efe Jehova ofufe, ndị nọ n’ebe ọ bụla, na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ndị Kraịst nọ n’ebe nile n’ihe karịrị ala 230 na-achụ àjà nke mkpụrụ egbugbere ọnụ ha, na-akpọsa otuto nke nanị otu ezi Chineke ahụ. A na-anụ abụ otuto ha na-abụ “ná nsọtụ ụwa.” (Aịsaịa 42:10-12) Ndị na-anụ ihe ha na-ekwu ma zaghachi na-anakwere eziokwu nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ndị dị otú ahụ na-abịa nwee udo, bụ́ nke na-abịa site n’ijere “Chineke nke udo” ozi.—Ndị Rom 16:20.

26. (a) Gịnị na-echere ndị ajọ omume? (b) Nkwa dị aṅaa dị ebube ka e kwere ndị dị umeala n’obi, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike?

26 N’eziokwu, ndị ajọ omume adịghị aṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, a gaghị ekwe ka ha mebie udo nke ndị ezi omume. Jehova na-ekwe nkwa na “ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa.” Ndị na-agbaba n’ime Jehova ga-enweta ala n’ụzọ magburu onwe ya. “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11, 29) Lee ebe mara mma ụwa anyị ga-abụ mgbe ahụ! Ka anyị nile kpebisie ike ịghara ikwe ka udo Chineke funahụ anyị mgbe ọ bụla, ka anyị wee nwee ike ịbụ abụ otuto Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ma eleghị anya okwu bụ́ “ihe ndina” na-ezo aka n’ebe ịchụàjà ma ọ bụ n’ebe a na-anọ ekpere arụsị. Ịkpọ ya ihe ndina na-echetara mmadụ na ofufe dị otú ahụ bụ ịgba akwụna ime mmụọ.

b Ashera pụrụ ịnọchiteworị anya akụkụ ahụ nwanyị, ogidi nile pụkwara ịbụworị ihe oyiyi nke akụkụ ahụ nwoke ji enwe mmekọahụ. Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi bi na Juda jicha ha abụọ mee ihe.—2 Ndị Eze 18:4; 23:14.

[Foto dị na peeji nke 263]

Juda na-efe ofufe rụrụ arụ n’okpuru osisi ndụ ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 267]

Juda na-ewu ebe ịchụàjà n’ebe nile n’ala ahụ

[Foto dị na peeji nke 275]

“Ana m eke mkpụrụ egbugbere ọnụ abụọ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya