Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè
    Ụlọ Nche—2001 | Mach 1
    • 2 N’iburu nke ahụ n’uche, anyị pụrụ ịghọta ịdị mkpa nke otu ọnọdụ Aịsaịa onye amụma kọwara. O kwuru, sị: “Lee! ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) Otú ọ dị, nke a adịghị ezo aka n’ọchịchịrị n’ụzọ nkịtị. Ihe Aịsaịa bu n’uche abụghị na otu ụbọchị, anyanwụ, ọnwa, na kpakpando ga-akwụsị inye ìhè. (Abụ Ọma 89:36, 37; 136:7-9) Kama nke ahụ, ọ nọ na-ekwu banyere ọchịchịrị ime mmụọ. Ma, ọchịchịrị ime mmụọ na-akpata ọnwụ. N’ikpeazụ, anyị apụghị ịdị ndụ ma ìhè ime mmụọ adịghị, dị nnọọ ka anyị na-apụghị ịdị ndụ ma ìhè nkịtị adịghị.—Luk 1:79.

      3. N’iburu okwu Aịsaịa n’uche, gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị ime?

      3 N’ihi nke a, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịbasi ama ike na, n’agbanyeghị na okwu Aịsaịa mezuru n’ahụ Juda oge ochie, ha na-enwe mmezu ka ukwuu taa. Ee, n’oge anyị, ọchịchịrị ime mmụọ ekpuchiwo ụwa. N’ọnọdụ dị otú ahụ dị ize ndụ, ìhè ime mmụọ kasị dị mkpa. Ọ bụ ya mere ndị Kraịst ji eme nke ọma n’ịṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs, bụ́: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ.” (Matiu 5:16) Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ime ka ìhè nwuoro ndị dị umeala n’obi, si otú a na-enye ha ohere inweta ndụ.—Jọn 8:12.

  • Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè
    Ụlọ Nche—2001 | Mach 1
    • 4. Olee oge mbụ e mezuru okwu amụma Aịsaịa, ma ọnọdụ dị aṅaa ka e nwererịị n’oge Aịsaịa?

      4 Oge mbụ e mezuru okwu Aịsaịa banyere ọchịchịrị ikpuchi ụwa bụ mgbe Juda tọgbọọrọ n’efu, e meekwa ka ndị ya jee biri na Babilọn. Otú ọ dị, ọbụna tupu mgbe ahụ, n’oge Aịsaịa n’onwe ya, ọchịchịrị ime mmụọ ekpuchiworị ihe ka ọtụtụ ná mba ahụ, nke bụ́ ihe kpaliri ya ịgba ụmụ amaala ibe ya ume, sị: “Ụlọ Jekọb, bịanụ, ka anyị jegharịa n’ìhè Jehova”!—Aịsaịa 2:5; 5:20.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya