Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma
    Ụlọ Nche—2002 | Julaị 1
    • 4, 5. (a) Gịnị ka Jehova nyere otu nwanyị iwu ka o mee, nkwa dịkwa aṅaa ka ọ na-ekwe? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa na-akpali akpali dị n’Aịsaịa isi 60?

      4 Ọ bụ otu nwanyị nke nọ n’ọnọdụ dị nnọọ mwute—n’ọchịchịrị, nke makpu n’ala—ka a gwara okwu mmalite nke Aịsaịa isi 60. Na mberede, ìhè nwubara n’ọchịchịrị ahụ, Jehova wee kpọọkwa òkù, sị: ‘Nwanyị, bilie, nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ́ gị dị ka anyanwụ.’ (Aịsaịa 60:1) Oge eruwo ka nwanyị ahụ bilie ọtọ ma gbukepụ ìhè Chineke, bụ́ ebube Ya. N’ihi gịnị? Anyị na-ahụ azịza ya n’amaokwu na-esonụ: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ́ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube Ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ́ gị.” (Aịsaịa 60:2) Mgbe nwanyị ahụ rubere isi n’iwu Jehova, e mesiri ya obi ike na ihe dị ebube ga-esi na ya pụta. Jehova na-asị: “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.”—Aịsaịa 60:3.

      5 Okwu ndị na-akpali akpali dị n’amaokwu atọ a bụ ma okwu mmalite ma nchịkọta nke ihe dị n’akụkụ ndị ọzọ nke Aịsaịa isi 60. Ọ na-ebu amụma banyere ahụmahụ nke otu nwanyị e kwuru maka ya n’amụma ma na-akọwa otú anyị pụrụ isi nọrọ n’ìhè Jehova n’agbanyeghị ọchịchịrị nke kpuchiworo ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, gịnị ka ihe atụ ndị a dị n’amaokwu atọ mbụ a pụtara?

      6. Ònye bụ nwanyị ahụ e kwuru banyere ya n’Aịsaịa isi 60, oleekwa ndị na-anọchite anya ya n’elu ala?

      6 Nwanyị ahụ e kwuru banyere ya n’Aịsaịa 60:1-3 bụ Zaịọn, bụ́ nzukọ eluigwe Jehova nke ndị mmụọ e kere eke mejupụtara. Taa, ihe fọdụrụ ‘n’Izrel nke Chineke,’ bụ́ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị nwere olileanya nke iso Kraịst chịa n’eluigwe, na-anọchite anya Zaịọn n’elu ala. (Ndị Galeshia 6:16) Mba ime mmụọ a bịara nwee ndị òtù di 144,000, mmezu nke oge a nke Aịsaịa isi 60 hiwekwara isi n’ebe ndị nke dị ndụ n’ụwa “n’ụbọchị ikpeazụ” nọ. (2 Timoti 3:1; Mkpughe 14:1) Amụma ahụ nwekwara ihe dị ukwuu ikwu banyere ndị ibe Ndị Kraịst a e tere mmanụ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ—Mkpughe 7:9; Jọn 10:16.

  • Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma
    Ụlọ Nche—2002 | Julaị 1
    • 8. Mgbanwe dị aṅaa dị ịrịba ama weere ọnọdụ na 1919, gịnị si na ya pụta?

      8 Otú ọ dị, e nwere mgbanwe dị ịrịba ama n’afọ 1919. Jehova mụkwasịrị Zaịọn ìhè! Ndị fọdụrụ ndụ n’ime Izrel nke Chineke biliri ọtọ iji gbukepụ ìhè Chineke, na-amaliteghachi ikwusa ozi ọma ahụ n’atụghị ụjọ. (Mat. 5:14-16) N’ihi ịnụ ọkụ n’obi nke Ndị Kraịst a nwetaghachiri, a dọtara ndị ọzọ n’ìhè Jehova. Ná mmalite, e tere ndị ọhụrụ a mmanụ isonye n’Izrel nke Chineke. A kpọrọ ha ndị eze n’Aịsaịa 60:3, ebe ọ bụ na ha na Kraịst ga-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 20:6) Ka oge na-aga, a dọtara oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ n’ìhè Jehova. Ndị a bụ “mba nile” ahụ e hotara n’amụma ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya