Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/15 p. 18-23
  • Ịmịpụta ‘Ịdị Mma Nile’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmịpụta ‘Ịdị Mma Nile’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-eme Ezi Ihe”
  • Ichebara Ndị Ọzọ Echiche
  • ‘Na-enwenụ Obi Ebere’
  • Mmesapụ Aka na Ile Ndị Ọbịa Anya nke Ọma
  • Ikwu Eziokwu
  • Zụlite Ịdị Mma
  • Nọgide Na-egosipụta Ịdị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Lee Ka Ịdị Mma Ya Si Dị Ukwuu!”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ịdị Mma Bara Ụba nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịdị Mma—Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mụta Ya?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/15 p. 18-23

Ịmịpụta ‘Ịdị Mma Nile’

“Mkpụrụ nke ìhè ahụ dị n’ịdị mma . . . nile.”—NDỊ EFESỌS 5:9.

1, 2. Òtù abụọ dị aṅaa dịworo eri oge ochie, oleekwa otú ọnọdụ ha si dịrịta iche taa?

MGBE e nwesịrị nnupụisi ahụ n’Iden, n’ihe dị ka puku afọ isii gara aga, ọzọkwa mgbe Iju Mmiri nke oge Noa gasịrị, ihe a kpọrọ mmadụ kewara gaa n’òtù ma ọ bụ nzụkọ abụọ, ihe mejupụtara otu bụ ndị gbalịsiri ike ijere Jehova ozi, nke ọzọkwa bụ ndị gbasoro Setan. Nzukọ ndị a hà ka dị adị? N’ezie ha dị adị! Aịsaịa onye amụma hotara òtù abụọ ndị a, buokwa amụma ihe ga-abụ ọnọdụ ha n’oge anyị a, sị: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.”—Aịsaịa 60:1, 2.

2 Ee, ọdịiche dị n’etiti nzukọ abụọ ndị a dị ukwuu dị ka nke dị n’etiti ọchịchịrị na ìhè. Dịkwa ka mgbukepụ nke ìhè ga-adọta mmadụ nke fuworo ụzọ n’ime ọchịchịrị, otú ahụ ka ìhè sitere n’ebe Jehova nọ, nke na-enwu n’ime ụwa nke a nke gbara ọchịchịrị dọtaworo ọtụtụ ndị nwere obi ziri ezi bịa n’ebe nzukọ Chineke dị. Dị ka Aịsaịa gara n’ihu ikwu: “Mba nile [atụrụ ọzọ] ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze [ndị e tere mmanụ bụ ndị nketa Alaeze] ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.”—Aịsaịa 60:3.

3. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst na-esi egosipụta ịdị ebube nke Jehova?

3 Olee ụzọ ndị Jehova na-esi egosipụta ịdị ebube nke Jehova? Otu ihe bụ na ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze eluigwe Chineke nke e guzobeworo. (Mak 13:10) Ma karịa nke ahụ, ha na-eṅomi Jehova, bụ́ ihe nlereanya kasị mma nke ịdị mma, wee si otú a site n’akparamagwa ha na-adọrọ ndị dị umeala n’obi bịa n’ebe ìhè ahụ dị. (Ndị Efesọs 5:1) Pọl sịrị: “Unu bụrịị ọchịchịrị n’oge gara aga, ma unu bụ ìhè ugbu a n’ime Onyenwe anyị: na-ejegharịnụ dị ka ụmụ nke ìhè.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mkpụrụ nke ìhè ahụ dị n’ịdị mma na ezi omume na eziokwu nile, na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị ezi mma; unu esola ọrụ nke ọchịchịrị nke na-amịghị mkpụrụ na-enwekọ ihe.” (Ndị Efesọs 5:8-11) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị ‘ịdị mma nile’?

4. Gịnị bụ ịdị mma, oleekwa ụzọ a na-esi ahụ ya n’ime onye Kraịst?

4 Dị ka isiokwu anyị bu nke a ụzọ gosiworo, ịdị mma bụ àgwà ma ọ bụ ọnọdụ nke omume ọma na-enweghị atụ, ezi akparamagwa. Jisọs sịrị na ọ bụ nanị Jehova bụ onye dị mma n’echiche zuru ezu. (Mak 10:18) N’agbanyeghị nke ahụ, onye Kraịst pụrụ iṅomi Jehova site n’ịzụlite àgwà nke ịdị mma, nke bụ mkpụrụ nke mmụọ ahụ. (Ndị Galetia 5:22) N’ikwu okwu banyere a·ga·thosʹ, bụ́ okwu Grik dịịrị “dị mma,” akwụkwọ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-asị, “[Ọ] na-akọwa ihe ahụ nke na-arụpụta ihe bara uru n’ihi na ọ dị mma n’ọdịdị ma ọ bụ n’ihe mejupụtara ya.” N’ihi ya, onye Kraịst nke na-azụlite àgwà nke ịdị mma ga-abụ ezi mmadụ, na-emekwa ezi ihe. (Tụlee Deuterọnọmi 12:28.) Ọ ga-ezerekwa ihe ndị na-emegide ịdị mma, bụ́ “ọrụ nke ọchịchịrị nke na-amịghị mkpụrụ.” Ụzọ dị iche iche onye Kraịst pụrụ isi gosipụta ịdị mma n’akparamagwa ya bụ ‘ịdị mma nile’ nke Pọl hotara. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a?

“Na-eme Ezi Ihe”

5. Gịnị bụ otu ụdị nke ịdị mma, n’ihi gịnịkwa ka onye Kraịst kwesịrị iji zụlite ya?

5 Pọl zoro aka n’otu n’ime ndị a n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom. N’ikwu okwu banyere ido onwe onye n’okpuru “ndị na-achị isi,” ọ sịrị: “Ma ị́ chọghị ka ị tụọ egwu onye ahụ na-achị isi? Na-eme ezi ihe, ị ga-enwekwa otuto site n’aka ya.” “Ezi ihe” nke a na-ezo aka na ya n’ebe a bụ irubere iwu na ndokwa nile nke ndị na-achị achị isi. N’ihi gịnị ka onye Kraịst kwesịrị iji doo onwe ya n’okpuru ndị a? Ọ bụ ka o wee zere esemokwu na-enweghị isi n’etiti ya na ndị na-achị achị, wee si otú a na-abanye n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e nyere ahụhụ nakwa—nke ka mkpa—ka o wee jigide akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke. (Ndị Rom 13:1-7) Ọ bụ ezie na ọ na-edebe nrubeisi mbụ ya nye Jehova, onye Kraịst ‘na-asọpụrụ eze,’ na-aghara inupụ isi megide ọchịchị ndị Jehova Chineke kweworo ka ha dịrị. (1 Pita 2:13-17) N’ụzọ dị otú a, ndị Kraịst bụ ezi ndị agbata obi, ezi ụmụ amaala, na ndị bụ ezi ihe nlereanya.

Ichebara Ndị Ọzọ Echiche

6. (a) Gịnị bụ akụkụ ọzọ nke ịdị mma? (b) Òle ndị ka e hotara na Bible dị ka ndị kwesịrị anyị ichebara ha echiche?

6 A na-egosipụta ịdị mma Jehova n’onyinye ọ na-enye ndị nile bi n’elu ala “mmiri ozuzo na oge mkpụrụ.” Nke a na-arụpụta ‘ozuzu nke ihe oriri na ọṅụ,’ na-egosikwa na ọ bụ Chineke nke na-echebara ndị mmadụ echiche n’ezie. (Ọrụ 14:17) Anyị pụrụ iṅomi ya n’akụkụ nke a site n’ichebara ndị ọzọ echiche n’ụzọ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Ọ̀ bụ banyere òle ndị kpọmkwem? Pọl zoro aka kpọmkwem n’ebe ndị okenye nọ, bụ́ “ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’etiti unu, ndị bụkwa ndị isi [“ndị na-elekọta,” NW] unu n’ime Onyenwe anyị, ndị na-adụkwa unu ọdụ.” Ọ gbara ndị Kraịst ume ka ha “werekwa ịhụnanya sọpụrụ ha gabiga ókè nke ukwuu hie nne n’ihi ọrụ ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13) Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a? Site n’ikwenyezuru ha—dị ka ihe atụ, site n’ikere òkè n’ọrụ ndị dị mkpa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ezie na anyị ga-enwere onwe anyị ijekwuru ndị okenye maka enyemaka mgbe ọ bụla ọ dị mkpa, anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-achọkarị ihe n’aka ha n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya. Kama nke ahụ, n’ụzọ ọ bụla anyị nwere ike, anyị ga na-agbalị ime ka ibu nke ndị ọzụzụ atụrụ ndị a na-arụsi ọrụ ike dịtụ mfe, ndị ọtụtụ n’ime ha nwere ibu ọrụ ezinụlọ tụkwasị n’ọrụ ndị ha na-arụ n’ọgbakọ.

7. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi ndị agadi nchebara echiche?

7 Ndị meworo agadi n’anụ ahụ kwesịkwara ka anyị chebara ha echiche. Otu iwu pụtara ìhè n’Iwu Mosis bụ: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye, tụọkwa egwu Chineke gị: mụ onwe m bụ Jehova.” (Levitikọs 19:32) Olee ụzọ a pụrụ isi gosi nchebara echiche nke a? Ọ ga-adị nnọọ mma ma ndị na-eto eto wepụta onwe ha inye aka ịzụtara ha ihe ma ọ bụ ịrụrụ ha ọrụ nta ndị ọzọ dị n’ụlọ. Ndị okenye pụrụ iji ezi mmetụta jee lee ma ọ̀ dị onye agadi ọ bụla chọrọ enyemaka iji bịa nzukọ dị iche iche. Ná mgbakọ dị iche iche, ndị na-eto eto bụ ndị nwere ume ga-ezere inugharị ndị agadi ndị na-adịghị agasicha ike mgbe ha na-anwa ịgafere ngwa ngwa n’ihi enweghị ndidi, ha pụkwara iji ndidi chere ma ọ bụrụ na onye meworo agadi emechaghị ngwa ngwa n’ịnọdụ ala ma ọ bụ n’iwere nri.

8. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi ìgwè ndị ọzọ e gosipụtara iche n’ime Bible nchebara echiche?

8 Onye ọbụ abụ ahụ hotara ìgwè ndị ọzọ kwesịrị ka e cheebara ha echiche: “Onye ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” NW] ka ọ bụ, bụ́ onye nwere uche n’imeso onye na-enweghị ike.” (Abụ Ọma 41:1) Ọ pụrụ ịdị mfe ichebara ndị a maara aha ha ma ọ bụ ndị bara ọgaranya echiche, ma gịnị banyere onye dị ala ma ọ bụ onye dara ogbenye? Onye so dee Bible, bụ́ Jemes gosiri na igosi nchebara echiche hà nhata n’ebe ndị a nọ bụ ule nke ezi omume na ịhụnanya ndị Kraịst anyị. Ya bụrụkwa na anyị ga-agafe ule nke a site n’ichebara ndị nile echiche n’agbanyeghị ọnọdụ ha.—Ndị Filipaị 2:3, 4; Jemes 2:2-4, 8, 9.

‘Na-enwenụ Obi Ebere’

9, 10. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji bụrụ ndị na-eme ebere, oleekwa ụzọ a pụrụ isi gosi ụdị ịdị mma nke a?

9 A na-ahụta ụdị ọzọ nke ịdị mma n’ụfọdụ n’ime ilu Jisọs ndị ahụ. N’otu n’ime ndị a, Jisọs kọrọ banyere otu onye Sameria onye zutere otu nwoke onye e zuworo ohi, tie ya ihe nke ukwuu, hapụkwa ya ka ọ tọgbọrọ n’akụkụ ụzọ. Otu onye Livaị na otu onye nchụaja agafewo nwoke ahụ e merụrụ ahụ, na-ajụ inyere ya aka. Ma onye Sameria ahụ kwụsịrị ma nyere ya aka, na-eme ihe karịrị ihe a pụrụ iji ezi uche tụọ anya ya n’aka ya. A na-akpọkarị akụkọ ahụ ilu nke Ezi Onye Sameria ahụ. Ụdị ịdị mma ndị aṅaa ka onye Sameria ahụ gosipụtara? Obi ebere. Mgbe Jisọs jụrụ ndị na-ege ya ntị ka ha kọọ onye nke gosiri onwe ya ịbụ onye agbata obi nye nwoke ahụ e merụrụ ahụ, azịza nke ziri ezi e nyere bụ: “Onye ahụ nke meere ya ebere.”—Luk 10:37.

10 Ndị Kraịst na-eme ebere na-eṅomi Jehova, bụ́ onye Mosis gwara ndị Israel banyere ya, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, bụ Chineke nwere obi ebere; ọ gaghị aha gị aka, ọ gaghị ebibikwa gị, ọ gaghị echezọkwa ọgbụgba ndụ nke nna gị hà, nke ọ ṅụụrụ ha iyi banyere ya.” (Deuterọnọmi 4:31) Jisọs gosiri ụzọ obi ebere Chineke kwesịrị isi metụta anyị: “Nweenụ obi ebere, dị ka Nna unu nwere obi ebere.” (Luk 6:36) Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi obi ebere? Dị ka ilu Jisọs ahụ gosiri, otu ụzọ bụ site n’ịdị njikere inyere mmadụ ibe anyị aka, ọbụna ma a sị na nke a metụtara itinye onwe anyị n’ihe ize ndụ ma ọ bụ ịnapụtụ onwe anyị ntụsara ahụ. Onye bụ ezi mmadụ agaghị elefuru ịta ahụhụ nke nwanna ya anya ma ọ bụrụ na ọ nọ n’ọnọdụ ime ihe ọ bụla banyere ya.—Jemes 2:15, 16.

11, 12. Dị ka ilu Jisọs banyere ndị ohu ahụ gosiri, gịnị ka ime ebere gụnyere, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta nke a taa?

11 Otu ilu ọzọ nke Jisọs gosiri na ịdị mma nke obi ebere gụnyere ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ. Ọ kọrọ banyere otu ohu onye ji nna ya ukwu ụgwọ puku talenti iri. N’enweghị ike ịkwụ ụgwọ ahụ, ohu ahụ rịọrọ ka e meere ya ebere, nna ya ukwu jikwa obi ọma gbaghara ya nnukwute ụgwọ ahụ nke ruru 60,000,000 denarii. Ma ohu ahụ pụrụ wee jekwuru otu ohu ọzọ onye ji ya ụgwọ nanị otu narị denarii. Ohu ahụ nke a gbagharaworo jiri enweghị obi ebere tụba onye ahụ ji ya ụgwọ n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụ ya ụgwọ ahụ. O doro anya na ohu ahụ nke na-enweghị ebere abụghị ezi mmadụ, mgbe nna ya ukwu nụkwara ihe meworonụ, o jidere ka ọ kwụọ ụgwọ o ji.—Matiu 18:23-35.

12 Anyị nọ n’ọnọdụ yiri nke ohu ahụ a gbaghaara. N’ihe ndabere nke àjà Jisọs, Jehova agbagharawo nnukwute ụgwọ mmehie nke dị n’isi anyị. Ya mere, o doro anya na anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ. Jisọs kwuru na anyị kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ‘ruo iri ugbo asaa na asaa,’ ya bụ, ruo n’ebe a na-akparaghị ókè. (Matiu 5:7; 6:12, 14, 15; 18:21, 22) N’ihi ya, onye Kraịst nke nwere obi ebere agaghị ebu mmejọ n’obi. Ọ gaghị ebu iwe n’obi ma ọ bụ jụ ikwunyere onye Kraịst ibe ya okwu n’ihi mmetụta ọjọọ ọ ka na-enwe. Enweghị ebere dị otú ahụ abụghị akara nke ịdị mma ndị Kraịst.

Mmesapụ Aka na Ile Ndị Ọbịa Anya nke Ọma

13. Gịnị ọzọ ka ịdị mma gụnyere?

13 A na-egosipụtakwa ịdị mma site n’imesapụ aka na ile ndị ọbịa anya nke ọma. N’otu oge, otu nwa okorobịa bịakwutere Jisọs maka ndụmọdụ. Ọ sịrị: “Onye ozizi, ọ̀ bụ ezi ihe gịnị ka m ga-eme, ka m wee nwee ndụ ebighị ebi?” Jisọs gwara ya na o kwesịrị ịnọgide na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu. Ee, irube isi n’ihe Jehova nyere n’iwu bụ otu akụkụ nke ịdị mma. Nwa okorobịa ahụ chere na ya anọworị na-eme nke a ruo ókè o nwere ike. O doro anya na nye ndị agbata obi ya. o yirirịị ezi mmadụ, ma o chere na ọ dị ihe fọdụụrụ ya ime. Ya mere Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na ị na-achọ ka i zuo okè, laba, ree ihe nile i nwere, nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ n’eluigwe: bịakwa, soo m.” (Matiu 19:16-22) Nwa okorobịa ahụ lara ná mwute. Ọ bụ onye bara ọgaranya nke ukwuu. Ọ bụrụ na ọ gbasoo ndụmọdụ Jisọs, ọ gaara egosiworị na ya abụghị onye hụrụ ihe onwunwe n’anya. Ọ gaara arụworị ezi ọrụ nke ịbụ onye na-emesapụ aka n’ezie n’achọghị ọdịmma nke onwe ya.

14. Ezi ndụmọdụ dị aṅaa ka ma Jehova ma Jisọs nyere n’ihe banyere imesapụ aka?

14 Jehova gbara ụmụ Israel ume ịbụ ndị na-emesapụ aka. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ, sị: “Ị ghaghị inye [onye agbata obi gị nke daworo ogbenye], ọ gaghị ajọkwara obi gị njọ mgbe ị na-enye ya: n’ihi na ọ bụ n’ihi ihe a ka Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-agọzi gị n’omume gị nile, na n’ime nsetị aka gị nile.” (Deuterọnọmi 15:10; Ilu 11:25) Jisọs Kraịst n’onwe ya gbara ume imesapụ aka: “Na-enyenụ, a ga-enyekwa unu; ọ̀tụ̀tụ̀ ọma, nke a bịadaworo ala, yọkọta, nke na-ejubigakwa ókè, ka ha ga-enye n’obi unu.” (Luk 6:38) Ọzọkwa, Jisọs bụ onye na-emesapụ aka n’onwe ya. N’otu oge, o wepụtara oge iji zurutụ ike. Ìgwè mmadụ hụtara ebe ọ nọ wee bịakwute ya. Jisọs ji mmesapụ aka chefuo ihe banyere izuru ike wee tinye onwe ya n’ọrụ n’ihi ìgwè mmadụ ahụ. Mgbe nke a gasịrị, o gosiri ile ndị ọbịa anya nke ọma nke pụrụ iche site n’inye ìgwè mmadụ ahụ nri.—Mak 6:30-44.

15. Olee ụzọ ndị na-eso ụzọ Jisọs si gosi ezi ihe nlereanya n’igosipụta mmesapụ aka?

15 N’ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye ndụmọdụ nke Jehova na nke Jisọs, ọtụtụ ndị n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị a ma ama dị ka ndị na-emesapụ aka na ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma. N’ụbọchị ndị mbụ nke ọgbakọ ndị Kraịst, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị bịaworo ime ememe Pentikọst n’afọ 33 O.A. nụrụ nkwusa nke ndị ozi ahụ wee ghọọ ndị kwere ekwe. N’ịnọgide mgbe ememe ahụ gasịrị iji wee mụtakwuo ihe, ihe oriri na ihe ndị ọzọ ha ji belatara. N’ihi ya, ndị kwere ekwe bụ ndị ebe ahụ rere ihe onwunwe ha wee nye ego ha retara dị ka onyinye iji kwadoo ụmụnna ọhụrụ ha ndị a ka ndị a nwee ike iguzosi ike karị n’okwukwe ahụ. Lee nnọọ omume mmesapụ aka nke a bụ!—Ọrụ 4:32-35; leekwa Ọrụ Ndị Ozi 16:15; Ndị Rom 15:26.

16. Hota ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi lee ndị ọbịa anya nke ọma, gosikwa mmesapụ aka taa.

16 Taa, a na-ahụta omume mmesapụ aka yiri nke Kraịst mgbe ndị Kraịst na-atụnyere ọgbakọ nke ha oge na ego, na-enyekwa ihe iji kwadoo ọrụ nkwusa zuru ụwa dum. A na-ahụ ihe àmà nke a mgbe ha na-agbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka, bụ́ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ọdachi dị iche iche ma ọ bụ agha. Ọ na-apụta ìhè mgbe a na-elekọta onye nlekọta sekit n’oge ọbịbịa ọ na-abịa mgbe dum. Ma ọ bụ mgbe a na-eji mmesapụ aka kpọọ “ụmụ mgbei” òkù ka ha soro ezinụlọ ndị Kraịst ndị ọzọ kere òkè ná ntụrụ ndụ na n’ọmụmụ Bible ezinụlọ, nke a bụkwa ile ndị ọbịa anya nke ọma, bụ́ ngosipụta nke ịdị mma ndị Kraịst.—Abụ Ọma 68:5.

Ikwu Eziokwu

17. N’ihi gịnị ka ikwu eziokwu ji bụrụ ihe ịma aka taa?

17 Mgbe Pọl kọwara mkpụrụ nke ìhè, o jikọtara ịdị mma na ezi omume na eziokwu, ọ ga-abụkwa ihe ziri ezi ikwu na ikwu eziokwu bụ ụdị ọzọ nke ịdị mma. Ndị dị mma adịghị ekwu okwu ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, ikwu eziokwu bụ ihe ịma aka pụrụ iche taa mgbe ikwu okwu ụgha jupụtara ebe dum. Ọtụtụ ndị na-ekwu okwu ụgha mgbe ha na-edejupụta akwụkwọ ha ji akwụ ụtụ isi. Ndị e were n’ọrụ na-ekwu okwu ụgha banyere ọrụ ha na-arụ. Ụmụ akwụkwọ na-eji okwu ụgha na-aghọ aghụghọ n’ihe ọmụmụ na n’ule ụlọ akwụkwọ ha. Ndị na-azụ ahịa na-ekwu okwu ụgha mgbe ha na-eme ndokwa dị iche iche nke azụmahịa. Ụmụntakịrị na-ekwu okwu ụgha iji zere ịbụ ndị e nyere ahụhụ. Ndị na-agba àsị̀rị̀ obi ọjọọ na-eji okwu ụgha na-emebi aha ndị ọzọ.

18. Olee ụzọ Jehova si ele ndị na-ekwu okwu ụgha anya?

18 Ikwu okwu ụgha bụ ihe arụ n’anya Jehova. “Ire okwu ụgha” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” so ‘n’ihe asaa’ ndị ọ kpọrọ asị. (Ilu 6:16-19) A gụnyere “ndị ụgha nile” n’etiti ndị na-atụ ụjọ, ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, ndị na-agaghị enwe ọnọdụ ọ bụla n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpughe 21:8) N’ịga n’ihu, ilu na-agwa anyị, sị: “Onye na-eje ije n’izi ezi ya na-atụ egwu Jehova: ma onye na-esihie n’ụzọ ya nile na-eleda Ya anya.” (Ilu 14:2) Onye na-ekwu okwu ụgha gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya nile. N’ihi ya, onye na-ekwu okwu ụgha na-enye ihe àmà nke ileda Jehova anya. Lee nnọọ echiche jọgburu onwe ya nke ahụ bụ! Ka anyị na-ekwu eziokwu mgbe nile, ọbụna ma a sị na ọ ga-eduje n’anyị ịbụ ndị e nyere ahụhụ ma ọ bụ inweta mfu nke ego. (Ilu 16:6; Ndị Efesọs 4:25) Ndị na-ekwu eziokwu na-eṅomi Jehova, bụ́ “Chineke nke eziokwu.”—Abụ Ọma 31:5.

Zụlite Ịdị Mma

19. Gịnị ka a na-ahụ n’ime ụwa mgbe ụfọdụ, na-egosipụta ezi ihe n’ebe Onye Okike ahụ dị?

19 Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ‘ụdị dị iche iche’ nke ịdị mma ndị onye Kraịst kwesịrị ịzụlite. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ ndị bi n’ụwa na-egosipụta ịdị mma ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, ndị ọzọ na-emekwara ndị mmadụ ebere. N’ezie, ihe mere ka ilu nke Ezi Onye Sameria ahụ bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama bụ na Jisọs kwuru banyere onye na-abụghị onye Juu nke gosiri ebere mgbe ndị bụ ndị okenye ná mkpọkọta ndị Juu na-egosighị. Ọ bụ n’ezie ihe otuto nye Onye Kere mmadụ na àgwà ndị dị otú ahụ ka na-apụtara onwe ha n’ime ụmụ mmadụ ụfọdụ ọbụna mgbe puku afọ isii nke ezughị okè gasịworo.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka ịdị mma ndị Kraịst ji dị iche site n’ịdị mma ọ bụla anyị pụrụ ịhụ n’etiti ndị ụwa? (b) Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi zụlite ịdị mma, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tinye uchu ime nke ahụ?

20 Otú o sina dị, nye ndị Kraịst, ịdị mma bụ ihe karịrị nanị àgwà nke a pụrụ inwe ma ọ bụkwanụ ghara inwe. Ọ bụ àgwà nke ha na-aghaghị ịzụlite n’akụkụ ya nile, ebe ha na-aghaghị ịbụ ndị na-eṅomi Chineke. Olee ụzọ nke a pụrụ isi kwe omume? Bible na-agwa anyị na anyị pụrụ ịmụta ịdị mma. “Zi m ịdị mma,” ka onye ọbụ abụ ahụ kpekuru Chineke n’ekpere. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi na ọ bụ n’ihe nile i nyere n’iwu ka m kwereworo.” O kwukwara, sị: “Onye dị mma ka ị bụ, na onye na-eme mma; zi m ụkpụrụ gị nile.”—Abụ Ọma 119:66, 68.

21 Ee, ọ bụrụ na anyị amụta ihe nile Jehova nyere n’iwu, na-erubekwara ha isi, anyị ga-azụlite ịdị mma. Na-echeta mgbe nile na ịdị mma bụ mkpụrụ nke mmụọ ahụ. Ọ bụrụ na anyị achọọ mmụọ Jehova site n’ekpere, iso ụmụnna anyị bụ ndị Kraịst na-akpakọrịta, na ọmụmụ Bible, mgbe ahụ, anyị ga-abụ ndị e nyeere aka ịzụlite àgwà nke a. Ọzọkwa, ịdị mma bụ ihe siri ike. Ọ pụrụ ọbụna imeri ajọ ihe. (Ndị Rom 12:21) N’ihi ya, lee ka o si dị oké mkpa ka anyị na-emere ndị nile ezi ihe, karịsịa ụmụnna ndị Kraịst anyị. (Ndị Galetia 6:10) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-eso ná ndị ahụ ga-enweta “otuto na nsọpụrụ na udo” nke e kwere nkwa nye “onye ọ bụla nke na-arụ ezi ọrụ.”—Ndị Rom 2:6-11.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi nọgide na-eme ezi ihe n’ihe banyere ndị na-achị isi?

◻ Òle ndị, gụnyere ndị ọzọ, kwesịrị ka anyị chebara ha echiche?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka obi ebere si egosipụta onwe ya?

◻ Ihe omume dịgasị aṅaa nke mmesapụ aka na ile ndị ọbịa anya nke ọma na-aka ndị Kraịst akara taa?

◻ Olee ụzọ a pụrụ isi zụlite ịdị mma?

[Foto dị na peeji nke 20]

Ichebara ndị ọzọ echiche bụ otu akụkụ nke ịdị mma

[Foto dị na peeji nke 23]

Dị ka Onye Ozizi Ukwu ahụ,Jisọs ji afọ ofufo meere ndị ọzọ ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya