-
Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya MmaỤlọ Nche—2002 | Julaị 1
-
-
12 Ọ bụghị nanị ndị ọchụnta ego nọ na-eme njem. Ndị ọzụzụ atụrụ na-enugakwa na Zaịọn. Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ìgwè ewu na atụrụ nile nke Kida ka a ga-achịkọtara gị, ebulu nile nke Nebaiot ga-ejere gị ozi.” (Aịsaịa 60:7a) Agbụrụ ndị na-azụ anụ na-abịa n’obodo nsọ ahụ inye Jehova anụ ndị kasị mma n’ime ìgwè anụ ha. Ọbụna ha na-ewepụta onwe ha ijere Zaịọn ozi! Olee otú Jehova si anabata ndị ala ọzọ a? Chineke n’onwe ya na-aza, sị: “Ha ga-arịgota n’ebe ịchụàjà m dị ka ihe na-atọ ụtọ, M ga-emekwa ụlọ nke ịma mma m ka ọ maa mma.” (Aịsaịa 60:7b) Jehova ji amara anakwere onyinye na ozi nke ndị ala ọzọ a na-eje. Ọnụnọ ha nọ n’ụlọ nsọ ya na-achọ ụlọ nsọ ya mma.
-
-
Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya MmaỤlọ Nche—2002 | Julaị 1
-
-
15. (a) Mmụba dị aṅaa ka okwu ndị dị n’Aịsaịa 60:4-9 buru amụma banyere ya? (b) Mmụọ dị aṅaa ka ezi Ndị Kraịst na-egosipụta?
15 Lee nkọwa doro anya amaokwu 4 ruo 9 na-enye n’ụzọ amụma banyere mmụba zuru ụwa ọnụ nke werewooro ọnọdụ kemgbe 1919! Gịnị mere Jehova ji jiri mmụba dị otú ahụ gọzie Zaịọn? Ọ bụ n’ihi na kemgbe 1919, Izrel nke Chineke ejiriwo nrubeisi nọgide na-egbukepụ ìhè Jehova. Ma, ị̀ chọpụtara na dị ka amaokwu nke 7 si kwuo, ndị ahụ bịara ọhụrụ ‘na-arịgota n’elu ebe ịchụàjà Chineke’? Ebe ịchụàjà bụ ebe a na-achụ àjà, ihe a a kpọtụrụ aha n’amụma ahụ na-echetakwara anyị na ozi Jehova na-agụnye àjà. Pọl onyeozi dere, sị: ‘Ana m arịọsi unu ike ka unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu.’ (Ndị Rom 12:1) N’ikwekọ n’okwu Pọl, ezi Ndị Kraịst adịghị enwe afọ ojuju nanị n’ịga ihe omume okpukpe otu ugboro kwa izu. Ha na-etinye oge ha, ume ha, na ihe onwunwe ha iji kwalite ofufe dị ọcha. Ọ̀ bụ na ọnụnọ nke ndị dị otú ahụ ji obi ha dum na-efe ofufe na-anọ ya adịghị achọ ụlọ Jehova mma? Amụma Aịzaịa kwuru na ọ ga-eme otú ahụ. Anyị pụkwara ijide n’aka na n’aka nke ha, ndị dị otú ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe ofufe, mara mma n’anya Jehova.
-