Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 7/15 p. 32
  • Dị Ka Nduru Ndị Na-efega n’Ebe Obibi Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dị Ka Nduru Ndị Na-efega n’Ebe Obibi Ha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 7/15 p. 32

Dị Ka Nduru Ndị Na-efega n’Ebe Obibi Ha

ELEGHI anya, nduru so n’otu n’ime nnụnụ mbụ mmadụ ji mere anụ ụlọ. Ọtụtụ puku afọ gara aga, ndị Ijipt—n’ime atụmatụ inwe nri mgbe nile n’ime afọ—wuru ebe obibi nduru n’akụkụ ebe obibi ha. Anụ nnụnụ ndị ahụ masịrị ha, a na-ejikwa nsị ha na-eme ihe e ji azụ ihe ọkụkụ. N’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ebe obibi nduru bụ ihe onwunwe a na-achọsị ike inwe nke na n’ụfọdụ mba nanị ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị ndú okpukpe ka a na-enye ohere inwe ha.

Ọ bụ ezie na ugbu a ọkụkọ anọchiwo nduru dị ka ebe e si enweta anụ n’ihe ka ná nri ndị a na-esi, a ka pụkwara izute ụfọdụ ebe obibi nduru oge gboo. Ebe obibi nduru e gosiri n’ebe a bụ nke a na-ahụ n’Ijipt.

Ịlọghachi n’ìgwè n’anyasị, ọtụtụ ìgwè nke nnụnụ na-efeda n’ebe obibi nduru ahụ. Onye amụma Hibru ahụ bụ Aịsaịa zoro aka na nke a mgbe ọ jụrụ, sị: “Olee ndị bụ ndị a na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si efe ruo window ha?” Dị ka nsụgharị ọzọ si tinye ya: “Olee ndị bụ ndị a na-efefe dị ka igwe ojii, ndị na-efe dị ka nduru na-efega n’ebe obibi ha?”—Aịsaịa 60:8; The New English Bible.

A na-ahụ azịza ya taa n’ọtụtụ narị puku nke ndị na-atụ egwu Chineke na-enubata ná nzukọ Jehova. N’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ha na-amụ inwe olileanya na Chineke. (Aịsaịa 60:9) N’etiti ndị Chineke, ha na-achọpụta na uru nile nke ime mmụọ, okwukwe dị ndụ, na ịbụ enyi na-ewuli elu na-etinye echiche nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke yiri nke ahụ nduru na-enweta n’ebe obibi ya.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya