Inye Òtù Na-achị Isi Nkwado n’Oge A
“Ọ ga-eme ya onye isi ihe nile o nwere.”—LUK 12:44.
1. Ọ̀ bụ n’alaeze dị aṅaa ka Kraịst malitere ịchị achị na 33 O.A., ọ̀ bụkwa site na gịnị?
NA PENTIKỌST 33 O.A., Jisọs Kraịst, bụ́ Isi nke nzukọ ahụ, malitere ịchị achị n’ụzọ pụtara ìhè n’alaeze nke ndị ohu ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ike mmụọ nsọ, ndị mmụọ ozi, na òtù na-achị isi a na-ahụ anya. Dị ka Pọl onye ozi hotara, Chineke ‘napụtara ndị e tere mmanụ n’ike nke ọchịchịri, wee webiga ha gaa n’alaeze nke Ọkpara ahụ nke ịhụnanya ya.’—Ndị Kọlọsi 1:13-18; Ọrụ 2:33, 42; 15:2; Ndị Galetia 2:1, 2; Mkpughe 22:16.
2. N’Alaeze dị aṅaa, nke buru ibu karị ka Kraịst malitere ịchị achị na 1914?
2 Ná ngwụsị nke ‘oge a kara aka nke ndị mba ọzọ,’ Jehova mụbara ike ịbụeze nke Kraist, na-eme ka ọ saa mbara gabiga ọgbakọ ndị Kraịst. (Luk 21:24) Ee, n’afọ Ì914, Chineke nyere Ọkpara ya ike ịbụ eze n’ebe “mba nile,” “alaeze nke ụwa,” bụ́ ihe nile a kpọrọ mmadụ, dị.—Abụ Ọma 2:6-8; Mkpughe 11:15.
A Họpụtara Ya Ịbụ “Onyeisi Ihe Nile O Nwere”
3, 4. (a) N’ilu Jisọs nke ego maịna ndị ahụ, ònye ka nwoke ahụ a mazuru aha ya nọchiri anya ya? (b) Ihe omume ndị dị aṅaa banyere Alaeze ahụ weere ọnọdụ na 1918 na 1919?
3 Ihe kwesịrị ịrịba ama ebe a bụ ilu Jisọs nke otu nwoke nke a mazuru aha ya. (Luk 19:11-27) Tupu ọ gaa njem n’ebe dị anya ije nata ike ọchịchị, nwoke ahụ nyere ndị ohu ya ego (maịna) nke ha ga-eji rụọ ọrụ. Mgbe ọ lọtara, nwoke nke a, bụ́ onye nọchiri anya Kraist, kpọrọ n’ihu ya ‘ndị o nyererị ego ahụ, ka o wee mara ihe ha zụtararị n’ahịa.’ (Luk 19:15) Olee otú nke a si kwe omume mgbe Jisọs natasịrị ike ọchịchị?
4 Na 1918 Kraịst ahụ onye nọkwasiwọro n’ocheeze hụrụ otu òtù dị nta nke ndị Kraist ndị hapụworo chọọchi dị iche iche nke Krisendọm ma na-etinye onwe ha n’ọrụ ilekọta ọdịmma elu ala nke Onyenwe ha mgbe ọ nụchaworo ha dị ka e ji ọkụ, Jisọs nyere ohu ya ndị ahụ ikike dị ukwuu karị na 1919. (Malakaịa 3:1-4; Luk 19:16-19) Ọ họpụtara ha ibụ ‘ndị isi ihe nile o nwere.’—Luk 12: 42-44.
‘Òkè Nri n’Oge Ya’
5, 6. (a) Olee ọrụ buwanyere ibu nke onye ahụ na-achị ezinụlọ Kraist natara? (b) Amụma ndị dị aṅaa ka oge ha ruru imezu mgbe 1914 gasịrị, olee kwa otú òtù onye ahụ na-achị ezinụlọ gaje isi kere ókè n’ụzọ pụtara ìhè ná mmezu ha?
5 Eze ahụ na-achị achị bụ Jisọs Kraist kenyere onye na-achị ezinụlọ, ma ọ bụ onye na-elekọta ụlọ ya, ọrụ e mere ka o buo ibu n’elu ala. Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-abụ “ndị nnọchianya, [NW]” ndị na-eje ozi n’ọnọdụ eze ahụ e kpukwasịrị okpueze, bụ́ onye e nyere ike ịchị ndị nile nọ n’elu ala. (2 Ndị Kọrint 5:20; Daniel 7:14) lbu ọrụ ha jikọtara aka nwee abụghịkwa nani nke inye òtù ndị ozi nke Kraist e tere mmanụ “òkè nri ha n’oge ya.” (Luk 12:42) Ha ga-ekere òkè pụtara ìhè ugbu a ná mmezu nke amụma ndị ahụ na-echere mmezu mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ na 1914.
6 Gịni ka nke a pụtara n’ihe omume n’ezie? Ọ pụtara ịgbasa nkwusa nke ‘ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum madụ bi.’ (Matiu 24:14) Ọzọkwa, ọ pụtara ikwusa ozi ndị dị ike nke ikpe ọmụma megide ajọ usoro ihe nke Se-tan na ndị na-akwado ya. Nke a nwere mmetụta nke ‘ime ka mba nile mee mkpatụ.’ Otú a, “ihe a na-achọsi ike,” bụ́ “atụrụ ọzọ” nke Kraịst malitere ịbata. (Hagai 2:7; Jọn 10:16) Malite na 1935 gaa n’ihu, “óké ìgwè mmadụ” ahụ malitere inubata n’ime nzukọ Jehova nke zuru ụwa ọnụ. (Mkpughe 7:9, 10) Nke a mere ka ọ dị mkpa ịnọgide na-enwe ọganihu n’ime nhazi. N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, a ga-eji ígwè dochie anya nkume, jiri ọla dochie anya osisi, jiri ọlaọcha dochie anya ígwè, jirikwa ọlaedo dochie anya ọla. (Aisaia 60:17) Ihe ndị a nile e werewo ọnọdụ kemgbe 1919, n’okpuru nduzi chiri anya nke Kraịst, bụ́ onye wereworo ọdịmma Alaeze ya nile dị n’elu ala, ma ọ bụ “ihe nile o nwere,” nye n’aka òtù ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi ya.
7. Gịnị ka ibu ọrụ dị iche iche e mere ka ha buwanye ibu nke onye ahụ na-achị ezinụlọ gụnyere?
7 Anyị pụrụ ịghọta na ibu ọrụ nke a e mere ka o buwanye ibu, nke e nyefere ohu nke onyenwenụ ahụ, onye ahụ na-achị ezinụlọ, ma ọ bụ onye na-elekọta ụlọ gụnyere ọrụ ndị metụtara oké ihe odide na ime mbipụta. Aghaghi inọgịde na-ebipụta mgbe nile nri ime mmụọ nke na-abịa n’oge kwesịri ekwesi n’ime Ụlọ Nche. Na 1919, a malitere ibipụta The Golden Age (bụ́ magazin ọzọ nke mesịrị ghọọ Consolation, na Teta! ugbu a) iji kpalie mmasị nke ndị mmadụ n’ọha, tinyere iji wulite “ezinụlọ” ahụ. (Matiu 24:45) E bipụtawokwa ọtụtụ akwụkwọ dị iche iche, akwụkwọ nta, na trakti dị iche iche eri ọtụtụ afọ.
Myọcha Na-aga n’Ihu
8. Olee ihe mbụ e ji mata ndị òtù nke Òtù Na-achị Isi ahụ, gịnị kwa ka Ụlọ Nche kwuru na 1944?
8 Ileghachị anya na “mgbe ọgwụgwụ” nke a, ọ bụghịrị anyị ihe ijuanya na e jikọtara Òtù Na-achị Isi na ndị na-ahazi mbipụta akwụkwọ nke Watch Tower Society. (Daniel 12:4) Isiokwu ahụ bụ “Ijikọ Aka n’Usoro Ọchịchị Chineke n’Oge A” nke e bipụtara n’Ụlọ Nche (Bekee) nke November 1, 1944, kwuru, sị: “N’ụzọ ziri ezi, e lere ndị ahụ e nyere ọrụ nke ibipụta eziokwu Bible ndị e kpughere ekpughe anya dị ka òtù na-achị isi nke Onyenwe anyị a họpụtara iduzi ndị ahụ na-achọ ife Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu na ịdị n’otu n’ijere ya ozi na ịgbasa eziokwu ndị e kpughere nye ndị ọzọ ọ na-agụ agụụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ n’ihi ya.”
9. Gịnị ka e mesịrị jiri mata Òtù Na-achị Isi ahụ n’ụzọ chiri anya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
9 E nwere ihe ndị iwu chọrọ ka e mee bụ́ ndị metụtara ibipụta magazin na akwụkwọ ndị ọzọ na-enye aka ịmụ Bible. Ya mere, e guzobere Watch Tower Bible and Tract Society ma debanye aha ya na steti nke Pennsylvania, U.S.A. Ruo ọtụtụ afọ, e jikọtara Òtù Na-achị Isi ahụ a na-ahụ anya na òtù ndị nlekọta nke ụlọ ọrụ nke a nke mmadụ asaa mejupụtara, nke e guzobere iji bipụta akwụkwọ dị mkpa ndị na-enye aka n’ịmụ Bible bụ́ nke ndị ozi nke Onyenwe anyị ji eme ihe gbaa ụwa gburugburu.
10, 11. Myọcha dị aṅaa weere ọnọdụ na 1944, okwu dịkwa aṅaa ka e kwuru banyere nke a n’Ụlọ Nche?
10 Ndị nlekọta asaa ahụ nke Society bụ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi. Ma ọrụ ha n’ụlọ ọrụ nke e guzobere n’iwu pụrụ ime ka e chee na ha nwetara ọnọdụ ha n’Òtù Na-achị Isi ahụ n’ihi ịbụ ndị a họpụtara site n’aka ndị òtù Watch Tower Society bụ ndị iwu kwadoro. Ọzọkwa, n’iwu, ọ bụ nanị mmadụ ụfọdụ ndị tụnyeere Society ụtụ ka e nyeburu ike ịbụ ndị òtù dị otú a na ihe ùgwù ya nke ịtụ vootu. Ọ dị mkpa ịgbanwe ndokwa nke a. E mere nke a ná nzukọ kwa afọ nke ụlọ ọrụ Pennsylvania nke Watch Tower Society nke e mere na October 2, 1944. E megharịrị iwu Society ka e wee ghara ịdị na-anabata ndị òtù n’ihi ego ha tụnyere. A ga-ahọpụta ndị òtù site n’etiti ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasi obi, ndị a mesikwara gunye ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge nile na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ nke dị na Brooklyn, New York, nakwa n’alaka ụlọ ọrụ ya dị iche iche gburugburu ụwa.
11 N’ịkọ banyere ọganihu nke a, Ụlọ Nche (Bekee) nke November 1, 1944, kwuru, sị: “Ego, dị ka ọ dị n’ego a na-atụta, ekwesighi Ịbụ ya ga-ekpebi ihe, n’ezie o kwesighị inwe ihe jikọrọ ya na imejupụta òtù na-achị isi nke ndịàmà Jehova nọ n’elu ala. . . . Mmụọ nsọ, ike irụ ọrụ nke Jehova Chineke na-enye site n’aka Kraist Jisọs, bụ nke kwesịrị ikpebi ma na-eduzi n’okwu ahụ.”
Ọ Dị Iche n’Ebe Ndị Nlekọta nke Ụlọ Ọrụ Dị
12. Gịnị na-egosi na Jehova gọziri ndozigharị ihe e mere n’okpuru nduzi nke Òtù Na-achị Isi ahụ?
12 Ọganihu e nwere n’ọrụ ahụ n’ọtụtụ iri afọ ndị gaworo aga na-egosi na Jehova gọziri mgbanwe ndị e mere ná nghọta nke Òtù Na-achị Isi ahụ. (Ilu 10:22) Leenụ, ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze gburugburu ụwa si n’ihe na-erughi 130,000 na 1944 gbagoo ruo 1,483,430 na 1970! Ma ọganihu ndị ọhụrụ ka na-abia.
13. (a) Ruokwa 1971, gịnị bụ ọnọdụ nke Òtù Na-achị Isi? (b) Gịnị mere ná nzuko kwa afo nke Society na 1971?
13 Ruokwa na 1971, Òtù Na-achị Isi ahụ ka nọgidekwara bụrụ ndị òtù asaa nke òtù ndị nlekọta nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. N’oge ahụ, ọ bụ ibu ọrụ dị n’ubu onyeisi oche nke Society ime mkpebi dị iche iche na-emetụta ịrụ ọrụ nke alaka dị iche iche nke Society gburugburu ụwa. Ma e kwuru okwu ndị kwesịrị ncheta ná nzukọ kwa afọ nke e mere n’October 1, 1971. Onyeisi oche Society kwuru okwu n’isiokwu bụ “Iweta Ebe Nsọ Ahụ n’Ọnọdụ Ziri Ezi,” osote onyeisi oche kwukwara okwu n’isiokwu ahụ bụ “Òtù Na-achị Isi nke Dị Iche Pụọ n’Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro.” Gini bụ ọdịiche dị n’etiti Òtù Na-achi Isi na ụlọ ọrụ ahụ iwu kwadoro?
14. Ọdịiche dịgasị aṅaa ka e nwere n’etiti ụlọ ọrụ e guzobere n’iwu na Òtù Na-achị Isi ahụ?
14 Dị ka e kwuworo, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania nwere òtù ndị nlekọta ọnụ ọgụgụ ha kwụsịrị ná ndị òtù asaa. A na-ahọpụta ndị Kraịst ndị a raraworo onwe ha nye ruo afọ atọ site n’aka ndị òtù ụlọ ọrụ ahụ ọnụ ọgụgụ ha na-akarịghị 500, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-abụghi ndị Kraịst e tere mmanụ. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na e guzobere ụlọ ọrụ ahụ kwọmkwem n’ihi okwu iwu, na-enwekwa isi ụlọ ọrụ ndị e guzobere kpọkwem n’otu ebe, ọ pụrụ ịbụ nke e mechiri site n’aka Sisa, ya bụ, ndị Ọchịchị. (Mak 12:17) Otú ọ dị, Òtù Na-achị Isi abụghị òtù nke dabeere n’iwu obodo. A dịghị ahọpụta ndị òtù ya site n’ime ntụli aka. A na-ahọpụta ha site n’ike mmụọ nsọ n’okpuru nduzi nke Jehova Chineke na Kraịst. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 20:28.) Ọzọkwa, ndị ahụ mejupụtara Òtù Na-achị Isi bụ ndị ikom e ji mmụọ nsọ họpụta, ndị na-enweghị ebe ọ bụla kpọmkwem ọ bụ iwu na ha aghaghị ịnọ ma ọ bụ na ha aghaghi inwe isi ụlọ ọrụ.
15. Okwu dị aṅaa banyere nzukọ ka e kwuru n’Ụlọ Nche (Bekee) nke December l5, 1971 (Bekee), gịnị kwa ka a pụrụ ikwu banyere Òtù Na-achị Isi nke oge a?
15 Banyere mgbanwe ndị dị otú ahụ e mere ná nghọta, Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1971, kwuru, sị: “Ọ bụ ihe ekele na ndị Kraịst bụ ndịàmà Jehova maara ma na-ekwu na nzukọ okpukpe nke a a bụghi nke otu onye, kama na o nwere òtù na-achị isi nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.” Òtù Na-achị Isi nke òtù ohu ahụ e tere mmanụ na nke ọtụtụ nde ndị enyi ha, ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ abụwo ndị e jiri nwayọọ nwayọọ kwadoo iwere ọrụ ya nke inye nlekọta.
16. Olee otú ihe Kraịst nwere n’elu ala siworo baa ụba kemgbe 1971, gịnị kwa bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị a nke o nyeworo ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche nke Òtù Na-achị Isi ya na-anọchi anya ya n’aka ilekọta?
16 Ihe onwunwe nile dị n’elu ala nke Eze ahụ bụ Jisọs Kraist anọgidewo na-amụba. Kemgbe 1971 ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà esiwo n’ihe na-erughi 1,600,000 gbagoo ruo n’ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị 3,700,000 na 1989. Lee nnọọ ihe na-egosi ngọzi Chineke nke a bụ! (Aisaia 60:22) Ịba ụba nke a emewo ka ọ dị mkpa iwusawanye isi ụlọ ọrụ Society na alaka ya dị iche iche, tinyere iji usoro ọgbara ọhụrụ na-ebipụta ma na-ekesa akwukwọ. O mewo ka a rụọ ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ dị iche iche gburugburu ụwa. N’ogologo oge ndị a nile, Òtù Na-achị Isi ahụ anọgidewokwa na-ebu ibu ọrụ nke ilekọta ọrụ nkwusa ahụ, na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, na-ahọpụtakwa ndị nlekọta n’alaka ụlọ ọrụ nile, distrikt nile, sekit nile, na n’ọgbakọ nile. Nke a bụ ọdịmma Alaeze ahụ nke Kraịst nyere ohu ahụ kwesịrị ka atụkwasị ya obi, nke nwekwara uche nke Òtù Na-achị Isi ya na-anọchite anya ya, n’aka ka o lekọta.
17. (a) Ọganihu ndị ozọ dị aṅaa ná nlekọta ka e mere na l971, 1974, na 1976?
17 E mere ka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ buwanye ibu, na-agụnye ihe karịrị ndị ozi Jisọs. E nwere ihe àmà na òtù ahụ gụnyere ‘ndị ozi na ndị okenye na Jerusalem’ mgbe e mere mkpebi banyere okwu ibi ugwu. (Ọrụ 15:1, 2) N’ụzọ yiri nke ahụ, e mere ka Òtù Na-achị Isi buwanye ibu na 1971 nakwa na 1974, Iji nyere ha aka n’ọrụ nlekọta ha, Òtù Na-achị Isi ahụ mere ndokwa ka enwee òtù kọmitii ise ndị malitere ọrụ na January 1, 1976. Kọmitii nke ọ bụla nwere malite na ndị òtù mmadụ atọ ruo isii, nke onye ọ bụla n’ime ha nwere ohere ha nhata ikwu ihe bụ uche ya n’okwu ọ bụla a na-atule. Onyeisi oche nke kọmitii nke ọ bula na-eje ozi ruo otu afọ, ndị òtù nke Òtù Na-achi Isi n’otu n’otu na-ejekwa ozi n’otu kọmitii ndị a ma ọ bụ karị. Nke ọ bụla n’ime kọmitii ise ndị a na-eleba anya kpọmkwem n’otu akụkụ nke ihe ndị Kraịst nwere n’elu ala. Kọmitii nke isii—bụ́ Kọmitii Onyeisi Oche, bụ nke a na-agbanwe ndị na-anọ na ya kwa afọ, na-ahụ maka nsogbu ndị chọrọ nlebara anya ngwa ngwa.
Inye Òtù Na-achị Isi Nkwado Siri Ike
18. Olee otú Òtù Na-achị Isi si arụ ọrụ, oleekwa otu ụzọ anyị ga-esi na-egosipụta nkwado anyị na-akwado ya?
18 Kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi ahụ na-enwe nzukọ kwa izu ịtụleghachị okwu ndị dị mkpa, jiri ekpere na-eme mkpebi dị iche iche ma na-eme atụmatụ maka ọrụ ọchịchị Chineke n’ọdịnihu. Dị ka e hotara na mbụ, Ọrụ Ndị Ozi isi 15 na-egosi na e zigaara òtù na-achị isi ajụjụ ndị chọrọ mkpebi ka ha leba anya na ha. N’otu aka ahụ taa, a na-ezigara Òtù Na-achị Isi n’ozuzu ha ajụjụ ndị dị mkpa, bụ́ ndị na-ezukọ kwa izu ma ọ bụ mgbe mgbe karị, mgbe ọ dị mkpa ime otú ahụ. Ndị òtù nke Òtù Na-achị Isi, ndị dị iri na abụọ n’ọnụ ọgụgụ ugbu a, na-achọ nduzi Jehova site n’Akwụkwọ nsọ, sitekwa n’ekpere. Otu ụzọ anyị si na-egosipụta na anyị na-enye Òtù Na-achị Isi nkwado bụ site n’icheta ndị a a họpụtara n’ụzọ pụrụ iche n’ekpere anyị kwa ụbọchị.—Ndị Rom 12:12.
19. Olee otú ntụziaka sitere n’aka Òtù Na-achị Isi si erute ọgbakọ dị iche iche?
19 Olee otú ndụmọdụ na mkpebi nke Òtù Na-achị Isi na-eme si erute ọgbakọ dị iche iche aka? Mgbe ndị òtù nke òtù na-achi isi nke narị afọ mbụ mesịrị mkpebi ha site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ha zigaara ọgbakọ nile akwụkwọ ozi. (Ọrụ 15:22-29) Otú ọ dị, otu ụzọ bụ isi e si eme ya taa bụ site n’akwụkwọ dị iche iche ndị Kraịst na-ebipụta.
20. (a) Nhazigharị nzukọ dị aṅaa ka e mere 1976? (b) Olee otú Kọmitii dị iche iche nke Alaka si akwado Òtù Na-achị Isi?
20 Kemgbe February 1, 1976, alaka ụlọ ọrụ ọ bụla nke Watch Tower Society nwere Kọmitii Alaka nke ihe mejupụtara ya bụ ndị ikom ruru eru Òtù Na-achị Isi họpụtara. Dị ka ndị nnọchịanya nke Òtù Na-achị Isi maka mba ma ọ bụ mba ndị nọ n’okpuru nduzi nke alaka ụlọ ọrụ ha, ụmụnna ndị a aghaghị ịbụ ndị ikom na-ekwesị ntụkwasị obi. Nke a na-echetara anyị ndị ikom ahụ ruru eru, na-atụ egwu Chineke, kwesịrị ka a tụkwasị ha obi ndị nyeere Moses aka ikpe ndị mmadụ ikpe n’Israel oge ochie. (Ọpụpụ 18:17-26) Ndị òtù nke òtù Kọmitii Alaka na-etinye n’ọrụ ndụmọdụ ndị a natara site n’igụ akwụkwọ na magazin nke Society nakwa Ozi Alaeze Anyị, tinyere ndị sitere n’akwụkwọ ozi ndị pụrụ iche na akwụkwọ ozi ndị ọzọ na-enye aziza maka nsogbu ndị a na-enwe n’ebe ha na-ele-kọta. Kọmitii Alaka dị iche iche na-eme ka Òtù Na-achị Isi mara otụ́ ọrụ si na-aga n’ime ala ọ bụla nakwa nsogbu ndị pụrụ ibilite. Akụkọ ndị dị otú ahụ a na-anata site na gburugburu ụwa na-enyere Òtù Na-achị Isi aka n’ikpebi isiokwu ndị e kwesịrị ịtụle n’akwụkwọ dị iche iche nke Society.
21. Olee otú e si a họpụta ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, gịnị kwa ka ọrụ ha gụnyere?
21 N’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ, Kọmitii Alaka dị iche iche na-atụ aro ka a họpụta ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ije ozi dị ka ndị nlekọta Sekit na Distrikt. Mgbe a họpụtasịrị ha site n’aka Òtù Na-achị Isi, ha na-eje ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ụmụnna ndị a na-eleta Sekit na Ọgbakọ dị iche iche iji wee wulite ha elu n’ụzọ ime mmụọ ma nyere ha aka itinye ndụmọdụ ndị a na-anata sịte n’aka Òtù Na-achị Isi n’ọrụ. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 16:4; Ndị Rom 1:11, 12.) Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ezijere alaka ụlọ ọrụ ha akụkọ ozi. Site n’ike mmụọ nsọ, ha na-esoro ndị okenye ọgbakọ na-ekere òkè n’ịtụ aro ka a họpụta ụmụnna ndị ruru eru site n’aka Òtù Na-achị Isi ma ọ bụ site n’aka ndị nnọchianya ya, dị ka ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye.—Ndị Filipaị 1:1; Taitọs 1:5; tụlee 1 Timoti 3:1-13; 4:14.
22. (a) Olee otú ndị okenye dị iche iche nke ọgbakọ si akwado Òtù Na-achị Isi? (b) Gịnị na-egosi na Jehova na-agọzi ndokwa nke a nke ọchịchị Chineke?
22 N’akụkụ nke ha, ndị ahụ mejupụtara òtù dị iche iche nke ndị okenye ‘na-elezi onwe ha na ìgwè atụrụ nile anya, bụ́ ndị mmụọ nsọ họpụtara ha dị ka ndị nlekọta n’etiti ha. (Ọrụ 20:28) Ndị nlekọta ndị a na-eji ikwesị ntụkwasi obi na-achọ itinye ndụmọdụ n’ọrụ, bụ́ ndị a natara n’aka Jehova Chineke na Jisọs Kraịst site n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche na Òtù Na-achị Isi ya. Jehova na-agọzị ndokwa ọchịchị Chineke nke a, ‘ọgbakọ dị iche iche wee nọgide bụrụ ndị a na-eme ka okwukwe ha siwanye ike, bụrụkwa ndị na-amụba n’ọnụ ọgụgụ kwa ụbọchi.’—Ọrụ 16:5.
23. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi banyere Òtù Na-achị Isi ahụ?
23 Lee ihe mara mma ọ bụ na site n’aka Òtù Na-achị Isi, Jehova Chineke na Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst na-egosipụta nkwado ha na-enye ndị Chineke! (Abụ Ọma 94:14) Dị ka akụkụ nke nzukọ Jehova, anyị n’otu n’otu na-erite uru site ná nkwado dị otu ahụ. (Abụ Ọma 145:14) Nke a kwesịrị ime ka mkpebi anyị mere ịnọgide na-enye ndokwa Chineke mere taa nkwado siwanye ike. N’ezie, ka a chọta anyị mgbe nile dị ka ndị na-enye Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nkwado ka anyị na-abiarute n’oge ahụ mgbe “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Isaiah 11:9.
Isi Ihe Ndị A Ga-echeta
◻ Ibu ọrụ dị aṅaa e mere ka ọ saa mbara ka òtù nke onye ahụ na-achị ezinụlo natara na 1919?
◻ Ruo ọtụtụ afọ, gịnị ka e jiri mara Òtù Na-achị Isi nke a na-ahụ anya?
◻ Nhazigharị ihe dị aṅaa ndị na-aga n’ihu ka e mere ná nhọpụta nke ndị òtù nke Òtù Na-achị Isi?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị Kraịst nwere n’elu ala nke o nyeworo òtù ohu ahụ na Òtù Na-achị Isi ya?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi kwadoo Òtù Na-achị Isi?
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Site n’isi ulọ ọrụ ya dị na Brooklyn, New York, Òtù Na-achị Isi ahụ na-elekọta ọrụ mbipụta akwụkwọ na nkwusa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova na 93 alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society
Germany
Japan
South Africa
Brazil