Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kr isi 12 p. 118-131
  • Ndị A Haziri Ijere “Chineke nke Udo” Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị A Haziri Ijere “Chineke nke Udo” Ozi
  • Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “M Ga-eme Ka Udo Bụrụ Onye Nlekọta Gị”
  • Otú Kraịst Si Edu Ọgbakọ Ya
  • “Ghọọrọnụ Ìgwè Atụrụ ahụ Ihe Nlereanya”
  • Otú Ndị Okenye Si Azụ Atụrụ Chineke n’Oge Anyị A
  • Ilekọta Ụmụnna nke Ọma Na-eme Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndị Kraịst
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
kr isi 12 p. 118-131

ISI NKE 12

Ndị A Haziri Ijere “Chineke nke Udo” Ozi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-ahazi ndị ya

1, 2. Olee mgbanwe e mere n’Ụlọ Nche malite na nke January 1895? Oleekwa otú obi dị ụmụnna mgbe ha hụrụ ya?

E NWERE otu Onye Mmụta Baịbụl aha ya bụ John A. Bohnet. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe o nwetara Ụlọ Nche Bekee nke January 1895. Ihe mere obi ji tọọ ya ụtọ bụ ihe ọhụrụ e sere n’ihu Ụlọ Nche a. Ụlọ a e sere toro ogologo, ọkụ na-achakwa n’elu ya. A rụrụ ya na mmiri oké ifufe na-efegharị. Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-eji ọkụ ahụ ọ na-acha na-ama ebe ha nọ n’abalị. Ihe e dere n’Ụlọ Nche ahụ iji gosi na a gbanweela otú ọ na-adị bụ “Otú Ihu Ụlọ Nche Anyị Ga-adịzi.”

2 N’ihi otú ihe a Nwanna Bohnet hụrụ si tọọ ya ụtọ, o degaara Nwanna Russell akwụkwọ. O dere, sị: “Obi dị m ụtọ na Ụlọ Nche anyị amaala ezigbo mma.” Otu Onye Mmụta Baịbụl n’oge ahụ aha ya bụ John H. Brown detakwara akwụkwọ gbasara otú ihu Ụlọ Nche dịzi. O dere, sị: “Ụlọ a e sere n’ihu ya amaka. Ntọala ụlọ a bụ a kwaa akwụrụ. O nweghị ihe ebili mmiri na oké ifufe na-eme ya.” Ihu Ụlọ Nche a a gbanwere bụ ihe mbụ a gbanwere n’afọ 1895. Ma, e nwere ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ a gbanwere ná nzukọ Jehova n’ọnwa Nọvemba afọ ahụ. Ihe mere e ji mee mgbanwe a bụ maka otu nsogbu malitere ịkpa ọgbakọ Ndị Kraịst aka ọjọọ. E nwere ike iji nsogbu a tụnyere ebili mmiri.

3, 4. Olee nsogbu e kwuru okwu ya n’Ụlọ Nche Bekee nke November 15, 1895? Oleekwa ihe e kwuru n’Ụlọ Nche ahụ na a ga-ebido mewe iji dozie nsogbu ahụ?

3 Otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke November 15, 1895, gbara nsogbu a n’anwụ. Nsogbu a mere ka Ndị Mmụta Baịbụl ghara ịdị n’otu. Ụmụnna na-esekarị okwu banyere onye ga-abụ onyeisi n’ọgbakọ. E nwere ihe nzukọ a mere iji nyere ụmụnna aka ka ha kwụsị okwu a ha na-ese. N’isiokwu ahụ gbara n’Ụlọ Nche, ha ji nzukọ a tụnyere ụgbọ mmiri. E kwuru hoo haa na ndị na-edu ndú n’ọgbakọ enyebereghị ụmụnna aka ka ha kwụsie ike n’ọgbakọ mgbe nsogbu yiri oké ifufe bịaara ha. Olee otú e nwere ike isi mee ka ụmụnna kwụsie ike?

4 A kọwakwara n’isiokwu ahụ na onyeisi ụgbọ ma ọrụ ya nke ọma na-ahụ na ya na ndị nwere ike ịgụpụta onye mmiri na-eri so. Ọ na-ahụkwa na ndị a ha na ya so ga-enyere ya aka ịhụ na o nweghị ihe ga-eme ndị ha bu n’ụgbọ mmiri ahụ mgbe oké ifufe fewere. Otú ahụkwa ka ndị na-edu ndú n’ọgbakọ dị iche iche kwesịrị ịna-eme. Ha kwesịrị ịhụ na ha nyeere ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ aka ka ha kwụsie ike n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ nwere ike ịbịara ha. N’ihi ya, Ụlọ Nche ahụ kwuru ihe ọhụrụ a ga-ebido mewe ozugbo n’ọgbakọ. E kwuru na a ga-amalite “họpụtawa ndị okenye n’ọgbakọ ọ bụla ka ha ‘na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.’”​—Ọrụ 20:28.

5. (a) Olee uru ndị okenye a malitere ịhọpụta n’ọgbakọ baara ọgbakọ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

5 Ndị okenye a malitere ịhọpụta n’oge ahụ nyeere ụmụnna aka ịkwụsi ike n’ọgbakọ. Ha mere ka okwukwe ụmụnna bụrụ a kwaa akwụrụ mgbe ọnwụnwa bịaara ha n’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Ihe ndị ọzọ a gbanwere ná nzukọ Jehova ka ọtụtụ afọ gachara nyeere ụmụnna anyị aka ife Jehova nke ọma. Olee amụma dị na Baịbụl kwuru banyere mgbanwe a? Kemgbe ị nọ n’ọgbakọ, olee ihe ndị ị hụrụ a gbanwerela? Olee uru ihe ndị ahụ a gbanwere baara gị?

“M Ga-eme Ka Udo Bụrụ Onye Nlekọta Gị”

6, 7. (a) Gịnị ka ihe e kwuru n’Aịzaya 60:17 pụtara? (b) Gịnị ka Jehova bu n’obi mgbe o kwuru banyere “onye nlekọta gị” na “onye na-ekenye gị ọrụ”?

6 N’isi nke itoolu n’akwụkwọ a, anyị kwuru na Aịzaya buru amụma na Jehova ga-eme ka ndị ya dị ọtụtụ. (Aịza. 60:22) Ma, Jehova kwedịrị nkwa na ya ga-eme ihe karịrị nke ahụ. N’amụma ahụ Aịzaya buru, Jehova kwuru, sị: “M ga-eweta ọlaedo jiri ya dochie ọla kọpa, m ga-ewetakwa ọlaọcha jiri ya dochie ígwè, were ọla kọpa dochie osisi, werekwa ígwè dochie nkume; m ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị, meekwa ka ezi omume bụrụ onye na-ekenye gị ọrụ.” (Aịza. 60:17) Gịnị ka ihe a Jehova kwuru pụtara? Olee otú o si gbasa anyị taa?

Ihe Jehova ga-eme abụghị iji ihe dị mma dochie ihe dị njọ, kama, ọ bụ ime ka ihe dị mma kakwuo mma

7 N’amụma a Aịzaya buru, Jehova kwuru na ya ga-eji otu ihe dochie ibe ya. Ma, ị̀ chọpụtara na ihe Jehova ga-eme abụghị iji ihe dị mma dochie ihe dị njọ, kama, ọ bụ ime ka ihe dị mma kakwuo mma? Dị ka ihe atụ, o kwuru na ya ga-eji ọlaedo dochie ọla kọpa. Ọla kọpa a dị mma, ma ọlaedo ka ya mma. Ọ bụ ya mere e ji jiri ọlaedo dochie ọla kọpa. Jehova ji ihe atụ a gosi na a ga-eji nwayọọ nwayọọ na-eme ka ihe kakwuo mma ná nzukọ ya. N’amụma ahụ Aịzaya buru, olee ihe Jehova bu n’obi ime ka ọ ka mma? Jehova kwuru banyere “onye nlekọta gị” na “onye na-ekenye gị ọrụ.” Ihe Jehova na-ekwu bụ na a ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka otú e si elekọta ndị ya na otú e si ahazi ha ka mma.

8. (a) Ònye mere ka ihe na-aka mma ná nzukọ Jehova? (b) Olee uru ihe ndị ahụ e mere ka ha na-aka mma na-abara anyị? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Ọ Nabatara Ndụmọdụ E Nyere Ya n’Ihi Na Ọ Dị Umeala n’Obi.”)

8 Ònye ga-eme ka ihe ka mma ná nzukọ Jehova? Jehova kwuru, sị: “M ga-eweta ọlaedo,” “m ga-ewetakwa ọlaọcha.” O kwukwara, sị: “M ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị.” O doro anya na ọ bụ Jehova n’onwe ya na-eme ka ihe na-aka mma ná nzukọ ya, ọ bụghị mmadụ nkịtị. Kemgbe e chichara Jizọs Eze, Jehova si n’aka ya na-emezikwu ihe ná nzukọ ya. Olee uru ihe ndị a a gbanwere baara anyị? E kwuru n’amaokwu Baịbụl ahụ na ihe ndị a a gbanwere ga-eme ka e nwee “udo” na “ezi omume.” Udo na-adị n’etiti anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Chineke na-eduzi anyị, anyị ana-agbanwekwa otú anyị si akpa àgwà. Ọ bụrụkwa na anyị na-eme ezi omume, anyị ga na-efe Jehova, onye Pọl onyeozi kpọrọ “Chineke nke udo.”​—Fil. 4:9.

9. Gịnị bụ isi sekpụ ntị na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, ihe niile a na-agakwa otú o kwesịrị? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

9 Pọl dekwara banyere Jehova, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” (1 Kọr. 14:33) Ị̀ chọpụtara na Pọl ekwughị ebe a na Chineke bụ Chineke na-ahazi ihe ahazi, kama ọ kpọrọ ya Chineke nke udo? Gịnị mere o ji ghara ịkpọ ya Chineke na-ahazi ihe ahazi? Otu ihe bụ na ọ bụghị ebe niile a haziri ihe ahazi ka udo na-adị. Dị ka ihe atụ, a na-ahazi ndị agha ahazi mgbe ha na-aga agha. Ha na-akwụ n’ahịrị na-aga. Ma, ihe mere e ji ahazi ha bụ maka agha, ọ bụghị maka udo. N’ihi ya, o nwere ihe anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’obi mgbe niile. Ihe ọ bụla a haziri ahazi nke na-abụghị maka udo ga-emecha ghasasịa. Ma, ihe ọ bụla Chineke haziri iji mee ka udo dịrị emekataghị ghasasịa. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ na ọ bụ “Chineke onye na-enye udo” na-eduzi nzukọ a anyị nọ n’ime ya, na-emekwa ka ọ na-aka mma. (Rom 15:33) Ọ bụ udo Chineke na-enye anyị na-eme ka ihe ndị a na-ahazi ná nzukọ ya na-aga nke ọma, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị dịrị n’otu n’ụwa niile.​—Ọma 29:11.

10. (a) Olee ihe ndị a gbanwerela ná nzukọ Jehova n’oge ndị gara aga? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Otú E Si Mee Ka A Na-elekọta Ọgbakọ nke Ọma.”) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha ugbu a?

10 N’igbe isiokwu ya bụ “Otú E Si Mee Ka A Na-elekọta Ọgbakọ nke Ọma,” e kwuru ihe ndị a gbanwerela ná nzukọ a n’oge ndị gara aga nakwa uru ndị ha baarala anyị. Ma, gịnị na gịnị ka Jehova si n’aka Eze anyị gbanwee ná nso nso a, nke e nwere ike iji tụnyere ‘iji ọlaedo dochie ọla kọpa’? Olee otú ihe ndị a a gbanwerela n’otú e si elekọta ọgbakọ si mee ka udo na-achị ná nzukọ Jehova, anyị adịrịkwa n’otu? Oleekwa otú ihe ndị a si nyere gị aka ịna-efe “Chineke nke udo”?

Otú Kraịst Si Edu Ọgbakọ Ya

11. (a) Olee ihe a gbanwere mgbe òtù na-achị isi lebachara anya na Baịbụl? (b) Olee ihe òtù na-achị isi kpebisiri ike ime?

11 E nwere ihe òtù na-achị isi mere n’agbata afọ 1964 na afọ 1971. Ha sara anya na mmiri mụọ Baịbụl iji chọpụta otú e si hazie ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi.a Ha chọpụtara na n’ọgbakọ dị iche iche n’oge ahụ, e nwere ndị okenye na-elekọta ya, ọ bụghị naanị otu okenye. (Gụọ Ndị Filipaị 1:1; 1 Timoti 4:​14.) Mgbe ha ghọtachara ihe a, ha ghọtakwara na Jizọs bụ́ Eze anyị chọrọ ka ha gbanwee otú e si na-elekọta ọgbakọ ndị Chineke. Ha kpebisikwara ike irubere Eze anyị isi. N’ihi ya, ha bidoro ozugbo ịhọpụta ndị okenye n’ọgbakọ dị iche iche ka ha na-elekọta ọgbakọ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka e si na-eme ya. Ma, olee ihe ụfọdụ a gbanwere n’agbata afọ 1971 na afọ 1975?

Ọ NABATARA NDỤMỌDỤ E NYERE YA N’IHI NA Ọ DỊ UMEALA N’OBI

E NWERE otu akwụkwọ ozi gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke April 1, 1916 e dere n’asụsụ Finish. Ọ bụ Nwanna Russell dere ya. O degaara ya Nwanna Kaarlo Harteva na ụmụnna ole na ole ndị ọzọ nọ na Finland. Nwanna Russell dere, sị: “Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu lọghachi ná nzukọ Jehova, nakwa ka unu malitekwa ịrụ ọrụ Chineke sị anyị na-arụ n’oge a.” Gịnị mere Nwanna Russell ji rịọ ụmụnna a ụdị arịrịọ a?

Nwanna Kaarlo Harteva

Onye a bụ Nwanna Kaarlo Harteva

A mụrụ Nwanna Harteva n’afọ 1882. O so ná Ndị Mmụta Baịbụl mbụ e nwere na Finland. E mere ya baptizim n’ọnwa Eprel afọ 1910. N’afọ 1912, Nwanna Russell nyere ya ikike ka ọ na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Finish. Ọ nọ na-eme ihe a ruo mgbe a malitere ịlụ Agha Ụwa Mbụ. O nwere ihe o dere n’Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1914, gosiri na obi ya adịchaghịzi n’ibipụta Ụlọ Nche. O dere n’Ụlọ Nche ahụ, sị: “N’ihi otú ihe si sie ike n’oge agha a, . . . Ụlọ Nche agaghịzi na-adị peeji ole ọ na-adị. Anyị agaghị na-ebipụtakwa ya kwa ọnwa otú anyị mere n’afọ a.” Ma, n’afọ 1915, Nwanna Harteva na ụmụnna ndị ọzọ malitere òtù a na-akpọ Ararat, ka ha si na ya na-enweta ego. Ha ji ego a ha na-enweta malite ịna-ebipụta magazin nke ha a na-akpọ Ararat.

Ebe ọ bụ na ihe bụ mkpa Nwanna Harteva bụzi ịkwado òtù Ararat a nakwa magazin a ha na-ebipụta, a họpụtara nwanna ọzọ ka ọ na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Finish. Olee ihe ndị na-agba na Magazin Ararat? A na-ede ihe ụfọdụ si na Baịbụl, deekwa otú e nwere ike isi jiri mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ na-agwọ ọrịa. Ihe ọzọ ha na-ede bụ ihe gbasara asụsụ ọhụrụ a na-akpọ Esperanto. Obere oge a malitere ibipụta magazin Ararat, ụmụnna na-agụ ya amachakwaghị nke bụ́ eziokwu nzukọ Jehova na-akụzi. Ọ bụ ihe a mere Nwanna Russell ji rịọ Nwanna Harteva na ndị òtù ya ka ha “lọghachi ná nzukọ Jehova.”

Gịnị ka Nwanna Harteva mere mgbe ọ gụchara akwụkwọ ozi ahụ? O bipụtara akwụkwọ ozi ahụ Nwanna Russell detaara ha na nke yanwa degaara Nwanna Russell na magazin Ararat ahụ. N’akwụkwọ ozi nke Nwanna Harteva dere, ọ rịọrọ Nwanna Russell ka ọ gbaghara ya. O dere, sị: “M ga-agbalịsi ike kwụsị ihe a m na-eme.” Ha mechara kwụsị ibipụta magazin Ararat ahụ. Ná nke ikpeazụ ha bipụtara, ọ rịọrọ ka a gbaghara ya n’ihi otú ya si jiri magazin a megharịa ụmụnna anya. O kwukwara, sị: “Si ugbu a gawa, m ga-akpachara anya ka m ghara iji ihe ọ bụla nzukọ Jehova na-akụzi gwurie egwu.” Nwanna Kaarlo Harteva adịghị ka ụfọdụ ndị okenye n’oge ahụ onwe ha na-ebu isi. Ọ nabatara ndụmọdụ e nyere ya n’ihi na ọ dị umeala n’obi.

E mechara họpụta Nwanna Harteva ọzọ ka ọ na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Finish, nakwa ka ọ na-elekọta alaka ụlọ ọrụ dị na Finland. Ọ rụgidere ọrụ abụọ a ruo n’afọ 1950. O ji obi ya niile fee Jehova ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 1957. O nwere ezigbo ihe anyị na-amụta n’aka nwanna a. Anyị na-amụta na ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi ma na-anabata ndụmọdụ Eze anyị bụ́ Jizọs na-enye anyị, anyị ga na-eme ihe otú Jehova chọrọ, Jehova ga-agọzikwa anyị.

12. (a) Olee mgbanwe e mere gbasara òtù na-achị isi? (b) Kwuo otú e si hazie Òtù Na-achị Isi ugbu a. (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Otú Òtù Na-achị Isi Si Na-elekọta Ihe Niile Gbasara Ndị Chineke n’Ụwa.”)

12 Ihe nke mbụ a gbanwere gbasara òtù na-achị isi. Tupu afọ 1971, ọ bụ ụmụnna asaa e tere mmanụ na-eduzi ụlọ ọrụ anyị bụ́ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Ma, n’afọ 1971, ihe gbanwere. A họpụtakwuru mmadụ anọ ka ha soro n’òtù na-achị isi, ha adịrịzie mmadụ iri n’otu. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka e mere ka a mara ihe dị iche ná ndị na-eduzi ụlọ ọrụ anyị na òtù na-achị isi. Ndị so n’òtù na-achị isi weere na o nweghị onye n’ime ha ka ibe ya. N’ihi ya, ha malitere ịgbanwe onyeisi oche ha kwa afọ. A na-eji usoro mkpụrụ akwụkwọ A, B, CH ahọpụta onye ga-ebu ụzọ abụ onyeisi oche. Dị ka ihe atụ, onye mkpụrụ akwụkwọ aha nna ya malitere na A na-ebu onye nke ya malitere na B ụzọ bụrụ onyeisi oche.

13. (a) Olee otú e si lekọta ọgbakọ n’agbata afọ 1932 na afọ 1972? (b) Gịnị ka Òtù Na-achị Isi mere n’afọ 1972?

13 Ihe nke abụọ a gbanwere gbasara ọgbakọ ọ bụla. Olee otú o si gbasa ọgbakọ ọ bụla? N’agbata afọ 1932 na afọ 1972, ọ bụ naanị otu nwanna nwoke na-ekwu ọtụtụ ihe a na-eme n’ọgbakọ. Ihe a na-akpọ nwanna a ruo n’afọ 1936 bụ onye nduzi ije ozi. E mechakwara kpọwa ya ohu ọgbakọ. Mechazie kpọwa ya onye nlekọta ọgbakọ. Ụmụnna ndị a ji obi ha niile lekọta ọgbakọ Chineke nke ọma. Ọ bụ onye nlekọta ọgbakọ na-ekpebikarị ihe a ga-eme n’ọgbakọ. Ọ naghị ebu ụzọ ajụta ndị okenye ndị ọzọ ha na ya nọ n’ọgbakọ ihe ha chere a ga-eme. Ma, n’afọ 1972, e nwere ihe a na-agaghị echefu echefu Òtù Na-achị Isi gbanwere. Gịnị ka ọ bụ?

14. (a) Olee ihe a malitere ime n’abalị mbụ n’ọnwa iri n’afọ 1972? (b) Olee otú onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ si eme ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:3?

14 Ọ bụ n’afọ ahụ ka a malitere ịhọpụta ụmụnna nwoke ndị ọzọ ka ha na-elekọta ọgbakọ. Ha ga-eru eru otú Akwụkwọ Nsọ kwuru tupu a họpụta ha. Ọ bụghịzi otu nwanna nwoke na-abụ onye nlekọta ọgbakọ. Kama, ndị okenye niile nọ n’otu ọgbakọ ga na-elekọta ọgbakọ ha. A malitere ime ihe a n’abalị mbụ n’ọnwa iri n’afọ 1972. N’ọgbakọ ọ bụla, e nwere onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ. Nwanna a anaghị ewere onwe ya na ya ka ndị okenye ndị ọzọ. Kama, ọ na-ewere onwe ya “ka onye ka nta.” (Luk 9:​48) O doro anya na ụmụnna ndị a na-abara anyị ezigbo uru n’ihi na ha dị umeala n’obi.​—Fil. 2:3.

O doro anya na Eze anyị ma ihe. O meela ka ndị ya nwee ndị okenye na-elekọta ha nke ọma mgbe ọ bụla

15. (a) Olee uru inwe ndị okenye na-elekọta ọgbakọ ọ bụla bara? (b) Olee ihe na-egosi na Eze anyị ma ihe?

15 Otú a e si nwee ndị okenye na-elekọta ọgbakọ ọ bụla baara ndị Chineke ezigbo uru. Lee uru atọ ọ baara anyị. Nke mbụ bụ na o mere ka ndị okenye niile mata na Jizọs bụ onyeisi ọgbakọ. (Efe. 5:​23) Nke abụọ gbasara ihe e kwuru n’Ilu 11:14. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị ndụmọdụ na-eme ka e nwee nzọpụta (ma ọ bụ ka ihe gaa nke ọma).” Mgbe ọ bụla e nwere okwu gbasara otú a ga-esi mee ka ọgbakọ na-efe Chineke nke ọma, ndị okenye na-ezukọ. Ha na-eleba anya n’ihe onye ọ bụla n’ime ha chere a ga-eme ka ihe ka mma. Ihe a ha na-eme na-enyere ha aka ime mkpebi dabara n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (Ilu 27:17) Jehova na-eme ka ihe ndị ahụ ha kpebiri ime gaa nke ọma. Uru nke atọ inwe ọtụtụ ndị okenye bara bụ na ọ na-eme ka ha na-elebara onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ha anya nke ọma. (Aịza. 60:​3-⁠5) Olee otú anyị si mara na e kwesịrị inwe ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ? Ọ bụ n’ihi otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ n’ike n’ike. Dị ka ihe atụ, ọgbakọ e nwere n’ụwa niile n’afọ 1971 karịrị puku iri abụọ na asaa. Ma, n’afọ 2013, ọ dịzi ihe dị ka otu narị puku na puku iri na atọ. O doro anya na Eze anyị ma ihe. O meela ka ndị ya nwee ndị okenye na-elekọta ha nke ọma mgbe ọ bụla.​—Maị. 5:5.

OTÚ E SI MEE KA A NA-ELEKỌTA ỌGBAKỌ NKE ỌMA

  • 1881​—N’afọ a ka Nwanna Russell gwara Ndị Mmụta Baịbụl niile bi n’otu mpaghara ka ha gwa ụlọ ọrụ anyị bụ́ Watch Tower ebe ha na-anọ enwe ọmụmụ ihe. Ha na-eme otú ahụ, ọ ga-eme ka a mara otú ihe si kwụrụ n’ọgbakọ dị iche iche.

  • 1895​—Ọ bụ n’afọ a ka a gwara ọgbakọ niile ka ha si n’ọgbakọ ha họpụta ụmụnna nwoke ga-abụ ndị okenye.

  • 1919​—N’afọ a ka alaka ụlọ ọrụ malitere ịhọpụta onye nduzi ije ozi n’ọgbakọ ọ bụla. Ọ bụ nwanna a ga na-ahazi ozi ọma n’ọgbakọ ya, na-agbakwa ụmụnna ume ka ha na-ejechi ozi ọma anya. Ụfọdụ ndị okenye anaghị akwado onye nduzi ije ozi ọgbakọ ha.

  • 1932​—Ọ bụ n’afọ a ka a kwụsịrị iji ntụli aka ahọpụta ndị okenye n’ọgbakọ kwa afọ. Ndị a na-ejizi ntụli aka ahọpụta bụ ndị ga-eso na kọmitii ije ozi. Ha ga-abụ ndị ji ozi ọma kpọrọ ihe. Ha ga-abụkwa ezigbo Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ụmụnna a ga-abụ onye nduzi ije ozi. Ọ bụ ọgbakọ na-atụ aro onye ọ ga-abụ. Ma, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ga-ahọpụtazi onye ahụ.

  • 1937​—N’afọ a ka e kwuru na ụmụnna nwoke so n’oké ìgwè mmadụ nwere ike iso ndị e tere mmanụ bụrụ kọmitii ije ozi.

  • 1938​—Ọ bụ n’afọ a ka ọgbakọ niile kwetara ka a na-ahọpụta ndị okenye otú Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ọ bụkwa n’afọ a ka a kwụsịrị iji ntụli aka na-ahọpụta ndị okenye n’ọgbakọ.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị mere ná nzukọ Jehova n’oge ndị gara aga, gụọ akwụkwọ anyị a na-akpọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 204 ruo na nke 235.

Ebe ọgbakọ na-eme ntụliaka ha ji ahọpụta ndị okenye n’afọ 1921 gawa. Ha na-eme ya kwa afọ

“A chọọ ịhọpụta mmadụ ka ọ bụrụ okenye, anyị atụlie aka nri anyị elu, otu nwanna anọrọ n’otu akụkụ gụọ ndị tụliiri onye ahụ aka.”—Ihe a ka Rose Swingle kwuru. Ọ bụ onye Chikago, dị na Ilinọị n’Amerịka.

“Ghọọrọnụ Ìgwè Atụrụ ahụ Ihe Nlereanya”

16. (a) Gịnị bụ ọrụ e nyere ndị okenye? (b) Jizọs gwara Pita, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Olee otú Ndị Mmụta Baịbụl si were ihe a Jizọs gwara Pita?

16 Ọ dịla anya ndị okenye ma na ha kwesịrị ịna-enyere ụmụnna ha aka ka ha na-efe Chineke nke ọma. (Gụọ Ndị Galeshia 6:​10.) Dị ka ihe atụ, otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche n’afọ 1908 lebara anya n’otu ihe Jizọs gwara Pita ka o mee. Ọ gwara ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:​15-​17) N’isiokwu ahụ, a gwara ndị okenye, sị: “Anyị kwesịrị iji ọrụ a Nna anyị ukwu nyere anyị kpọrọ ihe, ya bụ, ịzụ atụrụ ya na ilekọta ha nke ọma. Anyị kwesịrị iwere na ọrụ a bụ ùgwù Onyenwe anyị kwanyeere anyị.” Ihe e dere n’Ụlọ Nche n’afọ 1925 mere ka o doo ndị okenye anya na ọrụ a e nyere ha dị ezigbo mkpa. E dere, sị: “Ọ bụ Chineke nwe chọọchị unu na-elekọta, . . . unu ga-aza ya ajụjụ banyere otú unu si lekọta ụmụnna unu.”

17. Olee otú e si nyere ndị okenye aka ịna-elekọta atụrụ Chineke nke ọma?

17 Olee otú nzukọ Jehova si nyere ndị okenye aka ka ha na-azụ atụrụ Jehova nke ọma, nke na e nwere ike ịsị na ọ dị ka iji ‘ọlaọcha dochie ígwè’? Otú ha si mee ya bụ ịkụziri ha ihe. N’afọ 1959, a malitere inwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye. Otu n’ime ihe a kụziiri ha bụ otú ha ga-esi na-elebara ụmụnna ha anya n’otu n’otu. A gwara ndị okenye ka ha hazie otú ha ga-esi na-aga n’ụlọ ụmụnna agba ha ume. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, a gwakwara ha ọtụtụ ụzọ ha ga-esi enyere ụmụnna aka ma ha gaa n’ụlọ ha. N’afọ 1966, e nwere ihe ọhụrụ a malitere ịkụziri ndị okenye n’ụlọ akwụkwọ ha. N’ụlọ akwụkwọ a, e mere ka ha ghọta na ịzụ atụrụ Chineke dị ezigbo mkpa. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ a kụziiri ndị okenye n’ụlọ akwụkwọ a? Ọ bụ na ha kwesịrị ịhụ atụrụ Chineke n’anya ma na-elekọta ha nke ọma. Ihe ọzọ bụ na ha kwesịrị ịna-elekọta ezinụlọ ha nke ọma ma jiri ịga ozi ọma kpọrọ ihe. Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ndị okenye agaala ụlọ akwụkwọ ha ugboro ugboro. Olee uru ụlọ akwụkwọ ndị a nzukọ Jehova ji na-akụziri ndị okenye ihe baarala ndị Chineke? O meela ka e nwee ọtụtụ puku ndị okenye na-azụ atụrụ Chineke nke ọma.

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Filipinz n’afọ 1966

Ihe a bụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Filipinz, n’afọ 1966

18. (a) Olee ọrụ gbara ọkpụrụkpụ e nyere ndị okenye? (b) Gịnị mere Jehova na Jizọs ji hụ ndị okenye na-arụsi ọrụ ike n’anya?

18 Jehova si n’aka Eze anyị bụ́ Jizọs họpụta ndị okenye ka ha na-arụrụ ya otu ọrụ gbara ọkpụrụkpụ. Gịnị bụ ọrụ ahụ? Ọ bụ ka ha na-enyere atụrụ Chineke aka ịbụ a kwaa akwụrụ n’oge anyị a kacha taa akpụ. (Efe. 4:​11, 12; 2 Tim. 3:⁠1) Jehova na Jizọs hụrụ ndị okenye na-arụsi ọrụ ike n’anya, n’ihi na ndị okenye a na-eme otu ihe Akwụkwọ Nsọ gwara ha. A gwara ha, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, . . . jirinụ obi unu na-azụ ha . . . , n’ịnụ ọkụ n’obi . . . , ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.” (1 Pita 5:​2, 3) E nwere ọtụtụ ụzọ ndị okenye si aghọrọ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya nke na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ, na-emekwa ka obi na-atọ ụmụnna ụtọ. Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha.

“IHE A MERENỤ JURU ANYỊ ANYA”

E NWERE otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ n’Eshia. E zigara ha n’otu ọgbakọ ndị mmadụ na-abatabeghị na ya kemgbe ọtụtụ afọ. Mgbe ha kwagara ebe ahụ, ha chọpụtara na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ hụrụ ibe ha n’anya, ma ha anaghị eme ihe otú nzukọ Jehova kwuru ka a na-eme n’ọgbakọ. E nwere ihe di na nwunye a bu ụzọ mee tupu ha amalite inyere ụmụnna ndị ahụ aka. Gịnị ka ọ bụ? Ha mere ka ha na ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ dịrị ná mma. Mgbe ha mechara nke a, ha ejirizie nwayọọ nwayọọ nyewere ụmụnna ndị ahụ aka ka ha na-eme ihe otú nzukọ Jehova kwuru ka ọgbakọ Ndịàmà Jehova niile na-eme. Olee uru ihe a ha mere bara? Uru ọ bara bụ na n’ime afọ abụọ ụmụnna malitere ime ihe otú nzukọ Jehova kwuru, ndị na-abịa ọmụmụ ihe ji okpukpu abụọ mụbaa. Ndị ọhụrụ malitere ije ozi ọma. E mekwara ihe karịrị iri mmadụ abụọ baptizim. Di na nwunye ahụ kwuru, sị: “Ihe a merenụ juru anyị anya. Jehova gọziri nnọọ aka a anyị nyeere ụmụnna anyị. Obi tọrọ ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ ụtọ n’ihi ime ihe otú nzukọ Jehova kwuru.”

Otú Ndị Okenye Si Azụ Atụrụ Chineke n’Oge Anyị A

19. Olee otú obi na-adị anyị ma anyị na ndị okenye rụọ n’ozi ọma?

19 Nke mbụ bụ na ndị okenye na-eso ndị nọ n’ọgbakọ emekọ ihe. E nwere otu ihe Luk dere banyere otú Jizọs si jee ozi ya. O dere, sị: “Ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke. Mmadụ iri na abụọ ahụ sokwa ya.” (Luk 8:⁠1) Ndị okenye ndị ji ọrụ ha kpọrọ ihe na ụmụnna ha na-eso aga ozi ọma, otú ahụ Jizọs na ndịozi ya sokwa gaa ozi ọma. Ndị okenye ma na ime otú a na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Olee otú obi na-adị ụmụnna ma ha na ndị okenye na-eso aga ozi ọma? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jeannine kwuru otú obi na-adị ya. Nwanna nwaanyị a dị ihe dị ka afọ iri asatọ na itoolu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ na onye okenye arụọ n’ozi ọma, ọ na-eme ka mụ na ya kwurịta okwu nke ọma, meekwa ka m matakwuo ya.” Nwanna ọzọ aha ya bụ Steven kwukwara otú obi na-adị ya. Ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ na onye okenye arụọ n’ozi ọma, m na ewere ya na ọ chọrọ inyere m aka. Obi na-atọ m ụtọ ma mụ na ya rụchaa.”

Ebe onye ọzụzụ atụrụ bu mmiri na-ezo n’abalị chọrọ atụrụ ya furu efu gawa n’ebe ọ nọ naanị ya

Ndị okenye na-agbasi mbọ ike ka ha chọta ndị kpafuru akpafu ma nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ, otú ahụ ndị ọzụzụ atụrụ si eme ma atụrụ ha fuo

20, 21. Olee otú ndị okenye nwere ike isi ṅomie onye ọzụzụ atụrụ ahụ Jizọs ji mee ihe atụ? Kwuo otú ndị okenye si mee ihe a onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere. (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Ọgịga Ọ Na-aga na nke Ha Kwa Izu Nyeere Ha Aka.”)

20 Ihe nke abụọ bụ na nzukọ Jehova azụọla ndị okenye ka ihe banyere ndị kpafuru akpafu na-emetụ ha n’obi. (Hib. 12:12) Gịnị mere ndị okenye ga-eji nyere ndị a aka? Oleekwa otú ndị okenye ga-esi nyere ha aka? Ihe atụ Jizọs ji onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ furu efu mee ga-enyere anyị aka n’okwu a. (Gụọ Luk 15:​4-⁠7.) Jizọs kwuru na mgbe onye ọzụzụ atụrụ ahụ chọpụtara na otu atụrụ ya efuola, ọ chọwara ya ka à ga-asị na ọ bụ naanị ya ka o nwere. Olee otú ndị okenye anyị ga-esi eme ihe a onye ọzụzụ atụrụ a mere? Ihe ga-enyere ha aka bụ iwere ndị a kpafuru akpafu otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ si were atụrụ ahụ furu efu. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ weere atụrụ ahụ ka ihe ka dị oké ọnụ ahịa. Ndị okenye kwesịkwara iwere ndị kpafuru akpafu ka ndị ka dị oké ọnụ ahịa. Ndị okenye ekwesịghị iwere na ịga chọwa ha bụ igbu oge. Ihe ọzọkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere bụ na ọ gara ‘chọwa atụrụ ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya.’ Ihe a ka ndị okenye kwesịkwara ime. Ha kwesịrị ịga chọọ ndị ahụ kpafuru akpafu ma nyere ha aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ.

21 Olee ihe onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere mgbe ọ chọtara atụrụ ahụ furu efu? O ji nwayọọ kuru ya, ‘kukwasị ya n’ubu ya,’ ma gawa ebe atụrụ ndị ọzọ nọ. Ihe a ka ndị okenye kwesịkwara ịna-eme. Ọ bụrụ na ha agwa ndị ahụ kpafuru akpafu okwu ga-eru ha n’obi na okwu gosiri na ha hụrụ ha n’anya, o nwere ike ime ka obi ruo ndị a kpafuru akpafu ala, nyekwara ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ. Ụdị ihe a mere otu nwanna onye Afrịka aha ya bụ Victor. O nwere mgbe nwanna a kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe. O kwuru, sị: “A kwụsịrị m ịbịa ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma ruo afọ asatọ. N’oge a niile, ndị okenye nọ na-abịa enyere m aka.” Ị̀ ma ihe kacha ruo nwanna a n’obi? O kwuru, sị: “E nwere otu okenye mụ na ya gakọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. Aha ya bụ John. Otu ụbọchị, ọ bịara n’ụlọ m. Mgbe mụ na ya nọ na-ekwurịta, o gosiri m foto ndị mụ na ya sere n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe m lechara ha, ha chetaara m ọtụtụ ihe ndị m chefuru echefu. O mere ka m chọwa otú m ga-esi nwee ụdị obi ụtọ m na-enwe mgbe m ka na-efe Jehova.” Obere oge Nwanna John bịachara na nke Victor, Victor lọghachiri n’ọgbakọ. Nwanna Victor mechakwara bụrụ onye ọsụ ụzọ ọzọ. O doro anya na ndị okenye ndị na-elekọta anyị otú Jehova chọrọ, na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ.​—⁠2 Kọr. 1:24.b

Ebe ụmụnna abụọ gara ileta nwanna merela agadi na-anaghị ejekwa ozi ka ha nyere ya aka

ỌGỊGA Ọ NA-AGA NA NKE HA KWA IZU NYEERE HA AKA

IHE banyere ndị kpafuru akpafu n’otu ọgbakọ dị n’Amerịka metụrụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ ahụ n’obi, nke na ha chọsiwere ike inyere ha aka ka ha lọghachi. Ha chọpụtara na e nwere ihe dị ka mmadụ iri atọ kwụsịrị ije ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ ka bi n’ókèala ọgbakọ ha. Ọtụtụ n’ime ha akatala ahụ́.

E nwere ihe otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ahụ mere iji nyere ha aka. Aha okenye a bụ Alfredo. O dere aha ndị ahụ niile kpafuru akpafu n’akwụkwọ ma na-aga ná nke ha. O kwuru, sị: “N’ụtụtụ Fraịdee ọ bụla, m na-aga na nke otu n’ime ndị ahụ kpafuru akpafu.” Ọ na-abụ onye ahụ ọ bịara na nke ya nabata ya, ya emeda obi gwa ya okwu otú ọ ga-eru ya n’obi. Ọ na-agwa onye ahụ na ọgbakọ ka na-echeta ọrụ ọma ndị ọ rụrụ iji kwado Alaeze Jehova. Nwanna Alfredo kwuru, sị: “O nwere otu ụbọchị m gara na nke otu nwanna nwoke kpafuru akpafu. Nwanna a e meela agadi. Mgbe m gwara ya awa ole na Ụlọ Nche na Teta! ole o nyere n’ọnwa ikpeazụ o nyere akụkọ ozi ya n’afọ 1976, anya mmiri malitere ịgba ya.” Nwanna Alfredo na-agụkwara ndị a kpafuru akpafu ihe e dere na Luk 15:4-7, 10. Ya gụchaa, ya ajụọ ha sị, “Gịnị na-eme ma onye kpafuru akpafu lọghachi n’ọgbakọ? Ị̀ hụrụ na ebe a sị na ma Jehova, ma Jizọs, ma ndị mmụọ ozi na-aṅụrị ọṅụ?”

Kemgbe afọ abụọ ugbu a, Nwanna Alfredo na-aga na nke ndị a kpafuru akpafu na-enyere ha aka. Ò nwere uru mbọ a niile ọ na-agba bara? Ee. O nyerela ụmụnna abụọ aka ha alọghachi n’ọgbakọ. Ha na-abịachi ọmụmụ ihe Sọnde anya. Nwanna Alfredo kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anya mmiri juru m anya. Ọ bụ eziokwu na mmadụ abụọ a amalitela ịbịa ọmụmụ ihe, m ka na-aga n’ụlọ ha na Fraịdee ọ bụla n’ihi na ha gwara m na ọbịbịa m na-abịa na nke ha na-atọ ha ụtọ. Obi na-atọkwa m ụtọ otú ọ na-atọ ha.”

Ilekọta Ụmụnna nke Ọma Na-eme Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu

22. Olee otú ezi omume na udo si mee ka Ndị Kraịst na-adị n’otu n’ọgbakọ ha? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Ihe A Merenụ Juru Anyị Anya.”)

22 Ná mmalite isiokwu a, anyị kwuru na Jehova sị na ya ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị ya nwee udo ma na-eme ezi omume. (Aịza. 60:17) Ma udo ma ezi omume na-eme ka ọgbakọ dịrị nnọọ n’otu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? A bịa n’ihe gbasara ezi omume, Baịbụl kwuru na “Chineke anyị bụ otu Jehova.” (Diut. 6:⁠4) Iwu ya bụ otu ebe niile. Iwu o nyere otu ọgbakọ, ka ọ na-enyekwa ọgbakọ ọzọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe ọ kpọrọ ihe ọma na ihe ọ kpọrọ ihe ọjọọ. “N’ọgbakọ niile nke ndị nsọ,” ihe ọma bụ ihe ọma, ihe ọjọọ bụkwa ihe ọjọọ. (1 Kọr. 14:33) Ọ bụrụ na ọgbakọ ana-eme ihe Chineke sịrị ka anyị na-eme, ọgbakọ ahụ ga na-eme nke ọma. A bịakwa n’ihe gbasara udo, Eze anyị chọrọ ka udo dịrị n’ọgbakọ anyị, chọọkwa ka anyị “na-eme udo.” (Mat. 5:⁠9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ịna-achụso ihe ndị na-eweta udo.’ Mgbe ọ bụla anyị na ụmụnna anyị sere okwu, anyị kwesịrị ime ka anyị na ha kpezie. (Rom 14:19) Anyị na-eme otú ahụ, anyị so na-eme ka udo na-adị n’ọgbakọ anyị, sorokwa na-eme ka ọgbakọ anyị dịrị n’otu.​—Aịza. 60:18.

23. Olee uru anyị na-erite taa n’ọgbakọ?

23 Ọ bụ n’Ụlọ Nche Bekee nke November 1895 ka e bu ụzọ kwuo gbasara ịna-ahọpụta ndị okenye n’ọgbakọ. Ụmụnna ndị na-ahazi ọrụ anyị n’oge ahụ kwuru ihe bụ mkpa ha. Ị̀ ma ihe ọ bụ? Ha nọ na-arịọ Jehova ka o mee ka otú a e sizi na-ahọpụta ndị okenye ka ha na-elekọta ọgbakọ nyere ndị Chineke aka ozugbo ka ha “dịrị n’otu ná nzukọ Jehova.” Kemgbe ọtụtụ afọ, Jehova ji nwayọọ nwayọọ si n’aka Eze anyị na-eme ka a na-elekọta ọgbakọ ya otú ọ chọrọ. Anyị na-ekele ya n’ihi na ihe a o mere emeela ka anyị dịrịkwuo n’otu. (Ọma 99:⁠4) Ọ bụ ya mere ndị Jehova niile taa ji jiri ọṅụ na-ejegharị “n’otu mmụọ ahụ,” “na-ejegharịghịkwa n’otu nzọụkwụ ahụ,” ‘jirikwa otu obi na-efe’ “Chineke nke udo.”​—2 Kọr. 12:18; gụọ Zefanaya 3:9.

a E bipụtara ihe ndị ahụ ha chọpụtara n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Aid to Bible Understanding.

b Gụọ ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Ndị Okenye Ọgbakọ Bụ ‘Ndị Ọrụ Ibe Anyị Maka Ọṅụ Anyị.’” Ọ dị n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2013.

Ì Kwetasiri Ike na Alaeze Chineke Bụ Ọchịchị Dị Adị?

  • Olee otú Jehova sirila si n’aka Eze Alaeze ya mee ka ihe ka mma ná nzukọ ya?

  • Olee otú ihe ndị a gbanwere n’otú e si elekọta ọgbakọ sirila nyere gị aka ife “Chineke nke udo”?

  • Olee okwu onye okenye gwarala gị, ma ọ bụ ihe o meere gị, nke mere ka obi na-atọ gị ụtọ?

  • Gịnị na gịnị ka i nwere ike ime ka udo na-adị n’ọgbakọ unu, nakwa ka ọgbakọ unu dịrị n’otu?

Ebe Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-enwe nzukọ

OTÚ ÒTÙ NA-ACHỊ ISI SI NA-ELEKỌTA IHE NIILE GBASARA NDỊ CHINEKE N’ỤWA

NDỊ so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ ụmụnna nwoke Jehova Chineke ji mmụọ nsọ ya tee mmanụ. Ọ bụ ha bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ọrụ ha bụ iji Okwu Chineke na-azụ ndị ohu Jehova na iduzi ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ekwusa n’ụwa niile.​—Mat. 24:14, 45-47.

Òtù Na-achị Isi na-enwekarị nzukọ ha n’ụbọchị Wenezdee ọ bụla. Nzukọ a na-enyere ha aka ịrụkọ ọrụ ọnụ. (Ọma 133:1) Ndị so n’Òtù Na-achị Isi nọ na kọmitii dị iche iche. Kọmitii nke ọ bụla nwere ọrụ ọ na-arụ ka e nwee ike lebara ihe ndị gbasara Alaeze Chineke anya nke ọma. Ka anyị leba anya n’ọrụ kọmitii nke ọ bụla na-arụ.

  • Ebe ụmụnna na-ahazi otú a ga-esi gbatara ụmụnna ọsọ enyemaka

    Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ

    Ọ bụ ndị nọ na kọmitii a na-ahụ maka ihe niile gbasara okwu ikpe nzukọ a nwere. Ọ bụrụkwa na e bo anyị ebubo, ọ bụ ha na-agwa ọhaneze nke bụ́ eziokwu n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka inyere ụmụnna anyị aka ma ha nwee ọdachi, ma ọ bụ ma a na-emekpọ ha ọnụ, ma ọ bụkwanụ ma ihe gbata gbata mee.

  • Ebe ndị na-eje ozi na Betel na-arụ ọrụ ha

    Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel

    Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka mkpa ndị ezinụlọ Betel n’ụwa niile. Ọ bụkwa ha na-akpọ ndị ọhụrụ ga-eje ozi na Betel, na-ekpebikwa ihe a ga-eme mgbe ọ bụla onye na-eje ozi na Betel nwere mkpa pụrụ iche.

  • Ebe onye na-eje ozi na Betel na-enye aka ka e bipụta akwụkwa ma bugara ya ụmụnna

    Kọmitii Mbipụta

    Kọmitii a na-ahụ maka ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ụwa niile, na-ahụkwa na e bugara ha n’ebe a chọrọ ha. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka ebe ndị a na-anọ ebi akwụkwọ na ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ. Ha na-ahụkwa maka ụlọ niile nzukọ Jehova na-arụ, ma Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ọ bụkwa ha na-ahazi otú kacha mma a ga-esi emefu ego ndị e nyere n’onyinye maka ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi n’ụwa niile.

  • Ebe nwanna nọ n’ọfis ya na-eme nchọnchọ ma na-ede ihe

    Kọmitii Ije ozi

    Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ozi ọma anyị na-ezi na ihe ọ bụla gbasara ma ọgbakọ, ma ndị nkwusa, ma ndị ọsụ ụzọ, ma ndị okenye, ma ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ndị ozi ala ọzọ. Ọ bụkwa ha na-elekọta Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ, na-edekwa ihe ndị anyị na-amụ n’Ozi Alaeze Anyị. E nwekwara ihe ndị ọzọ ha na-elekọta.

  • Ebe nwanna na-ekwu okwu n’ikpo okwu

    Kọmitii Izi Ihe

    Kọmitii a na-ahụ maka ihe ndị a na-akụziri anyị ná mgbakọ ukwu na nke nta, nakwa n’ọmụmụ ihe. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka Ụlọ Akwụkwọ Gilied, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze, Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nakwa ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ nzukọ a nwe. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka ihe ndị a na-egere egere na vidio ndị nzukọ a na-ewepụta.

  • Akwụkwọ anyị dị n’ụdị dị iche iche, ma ndị nke dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org

    Kọmitii Ide Ihe

    Kọmitii a na-ahụ maka ihe a na-ede n’akwụkwọ anyị dị iche iche nakwa ndị nke na-adị n’Ịntanet. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, na-ahụkwa maka ihe niile nzukọ Jehova na-asụgharị asụgharị. Ọ bụkwa kọmitii a na-ede n’akwụkwọ anyị azịza ajụjụ ọ bụla a jụrụ gbasara ihe amaokwu Baịbụl ụfọdụ pụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya