Ònye Ga-eweta Ime Ihe Ike ná Njedebe?
NA September 1999, Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù UN bụ́ Kofi Annan nabatara ndị bịara nzukọ kwa afọ nke 54 nke Nzukọ Ezumezu. Dị ka a kọrọ na magazin bụ́ The Toronto Star, ọ mara ndị ndú ụwa aka, na-asị: “E nwere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị chọrọ ihe karịrị nanị okwu ọmịiko n’aka ndị mba ụwa. Ihe dị ha mkpa bụ nkwekọrịta bụ́ ezie na nke na-adịgide adịgide iji nye aka ịkwụsị ihe ike dị iche iche a na-emeso ha, ma mee ka ha nwee ọganihu n’enweghị ihe ize ndụ.”
Òtù UN na mba ndị so na ya hà pụrụ inwe “nkwekọrịta bụ́ ezie na nke na-adịgide adịgide” bụ́ nke dị mkpa iji kwụsị ime ihe ike? E hotara n’otu akụkọ magazin ahụ bụ́ Star na President Bill Clinton nke United States kwuru, sị: “Mgbe a kwafusịworo ọbara nile a kwafuru na narị afọ a, anyị maara na ọ dị mfe ịsị ‘ọ gaghị emekwa ọzọ,’ ma o siri ike karị ime ka ọ dị otú ahụ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ikwe nnọọ oké nkwa pụrụ ịbụ ihe jọgburu onwe ya dị ka ọ dị inwe nnọọ obere nchegbu banyere ndị ọzọ.”
Ihe karịrị afọ 2,500 gara aga, Jeremaịa onye amụma kwuru banyere mgbalị ụmụ mmadụ, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Mgbe ahụ, olileanya dị aṅaa ka e nwere na a ga-akwụsị ime ihe ike?
Dị ka anyị na-agụ n’Aịsaịa 60:18, Chineke na-emesi obi ike, sị: “A gaghị anụkwa ihe ike ọzọ n’ala gị, a gaghị anụ mbibi na ntipịa n’ókèala gị nile.” Amụma ahụ nwere mmezu mbụ ya mgbe Chineke mere ka ndị ya a dọọrọ n’agha laghachi n’ala nna ha. O nwekwara mmezu ka ukwuu nke anyị pụrụ ịnụ ụtọ ya. Jehova Chineke adịghị ‘ekwe nnọọ oké nkwa.’ Dị ka Onye Kasị Ihe Nile Elu na Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ nọ n’ọnọdụ kasị mma ịkwụsị “ihe ike dị iche iche.” N’okpuru Alaeze Chineke, udo ga-ejupụta ebe nile. Ime ihe ike agaghị adịkwa ọzọ ruo mgbe ebighị ebi!—Daniel 2:44.