Isi nke Iri Abụọ na Anọ
Jehova Emeere Onwe Ya Aha Mara Mma
1, 2. (a) Mmasị dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere n’onwe ha ‘n’ụbọchị Jehova’ nke na-abịanụ? (b) Olee okwu ka mkpa ọbịbịa nke ụbọchị Jehova metụtara?
RUO ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ, ndị Kraịst anọwo “na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.” (2 Pita 3:12, NW; Taịtọs 2:13) O kwere nghọta na ha na-atụsi anya ụbọchị ahụ ike. E kwuwerị, ọ ga-abụ mmalite nke nnwere onwe ha pụọ n’ihe ọjọọ nile ezughị okè kpatara. (Ndị Rom 8:22) Ọ ga-apụtakwa njedebe nke nrụgide ndị ha na-enwe ‘n’oge ndị a dị oké egwu.’—2 Timoti 3:1.
2 Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ụbọchị Jehova ga-ewetara ndị ezi omume ahụ efe, ọ ga-apụtakwa mbibi nye “ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8) Nke a bụ ihe a ga-echebasiri echiche ike. Chineke ọ̀ ga-ebibi ndị ajọ omume n’ezie nanị iji napụta ndị ya n’ahụhụ? Isi 63 nke Aịsaịa na-egosi na e nwere okwu ka nnọọ mkpa o metụtara, ya bụ, ido aha Chineke nsọ.
Ịzọ Njem nke Dike ahụ nke Na-enwe Mmeri
3, 4. (a) Gịnị bụ ọnọdụ gbara amụma ahụ dị n’Aịsaịa isi 63 gburugburu? (b) Ònye ka Aịsaịa hụrụ ka ọ zọ ije na-aga Jerusalem, ònyekwa ka ndị ọkà mmụta ụfọdụ sịrị na onye ahụ bụ?
3 N’Aịsaịa isi 62, anyị na-agụ banyere ntọhapụ nke ndị Juu ná ndọrọ n’agha na Babilọn na mweghachi e weghachiri ha n’ala nna ha. Dị ka o kwesịrị ịdị, ajụjụ na-ebilite bụ: Ọ̀ dị mkpa na ndị Juu ahụ fọdụrụnụ e weghachiri eweghachi ga na-atụ egwu mbibi ọzọ site n’aka mba ndị ọzọ bụ́ ndị iro ha? Ọhụụ Aịsaịa mere ka ụjọ ha belata nke ukwuu. Amụma ahụ malitere, na-asị: “Ònye bụ nke a na-esi n’Edọm bịa, yiri uwe na-acha ọbara ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara mma n’uwe oyiyi Ya, na-azọ ije n’ịba ụba nke ike Ya?”—Aịsaịa 63:1a.
4 Aịsaịa hụrụ otu dike, nke nwere ume ma na-enwe mmeri, ka ọ zọ ije na-aga Jerusalem. Uwe ya nke mara mma na-egosi na o nwere ọkwá kasị elu. O si n’akụkụ ebe obodo a kasị mara amara n’Edọm, bụ́ Bọzra, dị na-abịa, na-egosi na o meriwo ala ahụ bụ́ ndị iro oké mmeri. Ònye ka dike a pụrụ ịbụ? Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Jisọs Kraịst. Ndị ọzọ kwetara na ọ bụ ọchịagha ndị Juu bụ́ Judas Maccabaeus. Otú ọ dị, dike ahụ ji ọnụ ya kwuo onye ọ bụ mgbe ọ zara ajụjụ ahụ dị n’elu site n’ikwu, sị: “Ọ bụ Mụ onwe m nke na-ekwu okwu n’ezi omume, dị ike ịzọpụta.”—Aịsaịa 63:1b.
5. Ònye bụ dike ahụ Aịsaịa hụrụ, gịnị mekwara i ji zaa otú ahụ?
5 Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya bụ dike a. N’ebe ọzọ, a kọwara ya dị ka onye nwere “ụba nke ike” nakwa dị ka onye “na-ekwu ezi omume.” (Aịsaịa 40:26; 45:19, 23) Uwe mara mma nke dike ahụ yi na-echetara anyị ihe ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Jehova, Chineke m, Ị dị ukwuu nke ukwuu; ebube na ịma mma ka I yiriworo dị ka uwe.” (Abụ Ọma 104:1) Ọ bụ ezie na Jehova bụ Chineke ịhụnanya, Bible na-egosi na ọ na-aghọ dike mgbe ọ dị mkpa.—Aịsaịa 34:2; 1 Jọn 4:16.
6. N’ihi gịnị ka Jehova ji si n’ịlụ agha n’Edọm na-alọta?
6 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Jehova ji si n’ịlụ agha n’Edọm na-alọta? Ndị Edọm, bụ́ ndị jigidere ibu iro nke nna nna ha, bụ́ Isọ malitere, anọwo eri ogologo oge na-abụ ndị iro nke ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ. (Jenesis 25:24-34; Ọnụ Ọgụgụ 20:14-21) Ịdị omimi nke asị Edọm kpọrọ Juda pụtara ìhè karịsịa n’oge e bibiri Jerusalem, mgbe ndị Edọm tiri mkpu iji jaa ndị agha Babilọn. (Abụ Ọma 137:7) Jehova weere ibu iro dị otú ahụ dị ka imejọ ya onwe ya. Ka a sịkwa ihe mere o ji kpebie ịmịpụta mma agha ya nke ịbọ ọ́bọ̀ megide Edọm!—Aịsaịa 34:5-15; Jeremaịa 49:7-22.
7. (a) Olee otú amụma ahụ e buru megide Edọm si mezuo na mbụ? (b) Gịnị ka Edọm bụ ihe atụ ya?
7 N’ihi ya, ọhụụ Aịsaịa bụ oké ihe agbamume nye ndị Juu ahụ na-alọta Jerusalem. Ọ na-emesi ha obi ike na ha ga-ebi n’udo n’ebe obibi ọhụrụ ha. N’ezie, ka ọ na-erule n’oge Malakaị onye amụma, Chineke mere ka ‘ugwu nile nke Edọm ghọọ ebe ndị tọgbọrọ n’efu, were ihe nketa ya nye nkịta ọhịa nile nke ọzara.’ (Malakaị 1:3) Nke ahụ ọ̀ pụtaziri na amụma Aịsaịa mezuchara ka ọ na-erule n’oge Malakaị? Ee e, n’ihi na n’agbanyeghị mbibi e bibiri ya, Edọm kpebisiri ike iwughachi mkpọmkpọ ebe ya nile, Malakaị nọgidekwara na-akpọ Edọm “Ókèala mmebi iwu” na “Ndị ahụ nke Jehova wesaworo oké iwe ruo mgbe ebighị ebi.”a (Malakaị 1:4, 5) Otú ọ dị, n’ụzọ amụma, Edọm na-agụnye ihe karịrị ụmụ Isọ. Ọ bụ ihe atụ nke mba nile ndị gosipụtara na ha bụ ndị iro nke ndị na-efe Jehova. Mba dị iche iche nke Krisendọm abụrụwo ndị kasị pụta ìhè na nke a. Gịnị ga-eme Edọm a nke oge a?
Ebe Nzọcha Mkpụrụ Vine
8, 9. (a) Ọrụ dị aṅaa ka dike ahụ Aịsaịa hụrụ rụworo? (b) Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka a ga-azọcha ebe nzọcha mkpụrụ vine ihe atụ ahụ?
8 Aịsaịa na-ajụ dike ahụ na-alọtanụ, sị: “Gịnị mere ọ na-acha uhie uhie n’uwe oyiyi Gị? gịnị mere uwe Gị ji dị ka onye na-azọ ụkwụ n’ebe ịnara mmanya vine?” Jehova zara, sị: “Ebe nzọcha mkpụrụ vine ka M zọchara, nanị m; ma n’ime ndị nile dị iche iche ọ dịghị onye ọ bụla Mụ na ya nọ: M wee zọchaa ha n’iwe m, zọda ha n’ọnụma m; ọbara ndụ ha wee fesa n’uwe m nile, ọ bụkwa uwe oyiyi m nile ka M merụrụ emerụ.”—Aịsaịa 63:2, 3.
9 Okwu ndị a doro anya na-akọwa mgbuchapụ. Leenụ, ihe tụsasịrị ọbụna n’uwe ọma Chineke, dị ka uwe nke onye na-azọcha ebe nzọcha mkpụrụ vine! Ebe nzọcha mkpụrụ vine bụ ihe atụ dabara adaba nke ọnọdụ enweghị ụzọ mgbapụ nke ndị iro Jehova Chineke nọ na ya mgbe ọ gara ibibi ha. Olee mgbe a ga-azọcha ebe nzọcha mkpụrụ vine ihe atụ a? Amụma Joel na nke Jọn onyeozi na-ekwukwa banyere ebe nzọcha mkpụrụ vine ihe atụ. A ga-azọcha ebe nzọcha mkpụrụ vine ndị dị n’amụma ndị ahụ mgbe Jehova ga-azọda ndị iro ya ibibi ha n’Amagedọn. (Joel 3:13; Mkpughe 14:18-20; 16:16) Ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ nke amụma Aịsaịa na-atụ aka n’ihu n’otu oge ahụ.
10. Gịnị mere Jehova ji kwuo na ya zọchara ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ nanị ya?
10 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Jehova ji kwuo na ya zọchara ebe nzọcha mkpụrụ vine a nanị ya, mgbe ọ na-adịghị onye si n’etiti ndị dị iche iche ya na ya nọ? Ọ̀ bụ na Jisọs Kraịst, dị ka onye nnọchiteanya nke Chineke, agaghị ebute ụzọ n’ịzọcha ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ? (Mkpughe 19:11-16) Ee, ma Jehova na-ekwu banyere ụmụ mmadụ, ọ bụghị ndị mmụọ e kere eke. Ọ na-ekwu na ọ dịghị mmadụ pụrụ ikpochapụ ụmụazụ Setan n’ụwa. (Aịsaịa 59:15, 16) Ọ dị n’aka Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ịnọgide na-azọda ha n’iwe ya, ruo mgbe ọ zọpịasịrị ha kpam kpam.
11. (a) Gịnị mere Jehova ji na-eweta “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀”? (b) Olee ndị bụ ndị ‘a gbapụtara’ n’oge ochie, oleekwa ndị ha bụ taa?
11 Jehova gara n’ihu ịkọwa ihe mere o ji rụọ ọrụ a n’onwe ya, na-asị: “Ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ dị n’obi m, afọ nke ndị M gbapụtaworo abịawokwa.” (Aịsaịa 63:4)b Ọ bụ nanị Jehova nwere ikike ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-emerụ ndị ya ahụ. (Deuterọnọmi 32:35) N’oge ochie, ‘ndị a gbapụtaworo’ bụ ndị Juu ahụ tara ahụhụ n’aka ndị Babilọn. (Aịsaịa 35:10; 43:1; 48:20) N’oge a, ha bụ ihe fọdụrụ e tere mmanụ. (Mkpughe 12:17) Dị ka ndị ogbo ha n’oge ochie, a gbapụtawo ha ná ndọrọ n’agha okpukpe. Dịkwa ka ndị Juu ahụ, ndị e tere mmanụ na ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ enwetawo mkpagbu na mmegide. (Jọn 10:16) Amụma Aịsaịa si otú a na-emesi ndị Kraịst obi ike taa na n’oge nke Chineke, Ọ ga-eme ihe n’ihi ha.
12, 13. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova na-enweghị onye inyeaka? (b) Olee otú ogwe aka Jehova si eweta nzọpụta, oleekwa otú ọnụma ya si akwado ya?
12 Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “M wee legide anya, ma ọ dịghị onye na-enye aka; ibobo wee nwụọ m n’ahụ na ọ dịghị onye na-akwagide: ogwe aka m wee wetara m nzọpụta; ọnụma m kwa, ya kwagidere m. M wee zọda ndị dị iche iche n’iwe m, mee ka ha ṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ọnụma m, M wee mee ka ọbara ndụ ha ruda n’ala.”—Aịsaịa 63:5, 6.
13 Ọ dịghị onye inyeaka bụ́ mmadụ nke pụrụ ikwu na ọ bụ ya ka otuto ga-adịrị maka oké ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova. Enyemaka nke mmadụ ọ bụla adịghịkwa Jehova mkpa iji mezuo uche ya.c Ogwe aka ya nke ume, nke dị ike nke ukwuu ezuola iji rụọ ọrụ ahụ. (Abụ Ọma 44:3; 98:1; Jeremaịa 27:5) Ọzọkwa, ọnụma ya na-akwado ya. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na ọnụma Chineke abụghị mmetụta uche a na-adịghị achịkwa achịkwa, kama ọ bụ iwe ezi omume. Ebe Jehova na-eme ihe mgbe nile dabere n’ụkpụrụ ezi omume, ọnụma ya na-akwado ma na-akwali ya ime ka “ọbara ndụ” nke ndị iro ya “ruda n’ala,” na-emeri ma na-emenye ha ihere.—Abụ Ọma 75:8; Aịsaịa 25:10; 26:5.
Ebere Chineke
14. Ihe ncheta ndị dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka Aịsaịa na-enye ugbu a?
14 N’oge gara aga, n’egbughị oge, ndị Juu kwụsịrị inwe ekele maka ihe ndị Jehova mere n’ihi ha. Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa chetaara ha ihe mere Jehova ji mee ihe ndị ahụ. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ebere nile nke Jehova ka M ga-ehota, ha na otuto nile nke Jehova, dị ka ihe nile si dị nke Jehova mesoworo anyị; na ịba ụba nke ezi ihe e meere ụlọ Israel, nke O mesoworo ha dị ka obi ebere Ya nile si dị, na dị ka ịba ụba nke ebere Ya si dị. O wee sị, N’ezie, ndị m ka ha bụ, ụmụ ndị na-adịghị ekwu okwu ụgha: O wee ghọọrọ ha onye nzọpụta. Ná mkpagbu nile ha Ya ka a na-akpagbu, ọ bụkwa mmụọ ozi nke ihu Ya zọpụtara ha: n’ịhụnanya Ya na n’ọmịiko Ya Ya onwe ya gbapụtara ha; O wee palie ha, kuru ha n’ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.”—Aịsaịa 63:7-9.
15. N’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka Jehova ji meere ụmụ Abraham ebere n’Ijipt?
15 Lee ihe nlereanya dị ịrịba ama Jehova setịpụrụ n’igosipụta ebere, ma ọ bụ ezi ịhụnanya! (Abụ Ọma 36:7; 62:12) Jehova mere ka ya na Abraham nwee mmekọrịta ịhụnanya chiri anya. (Maịka 7:20) O kwere nna ochie ahụ nkwa na mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha site ná mkpụrụ, ma ọ bụ nwa, ya. (Jenesis 22:17, 18) Jehova rapagidesiri ike ná nkwa ahụ, na-egosi ụlọ Israel ịba ụba nke ezi ihe. Nke kasị pụta ìhè n’omume iguzosi ike n’ihe ya bụ nnapụta ọ napụtara ụmụ Abraham n’ịbụ ohu n’Ijipt.—Ọpụpụ 14:30.
16. (a) Echiche dị aṅaa ka Jehova nwere mgbe o so Israel gbaa ndụ? (b) Olee otú Chineke si emeso ndị ya?
16 Mgbe Ọpụpụ ahụ gasịrị, Jehova kpọọrọ Israel bịa n’Ugwu Saịnaị ma kwee nkwa a, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m . . . unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Jehova ọ̀ na-aghọ ha aghụghọ site n’ikwe nkwa a? Ee e, n’ihi na Aịsaịa na-ekpughe na Jehova gwara onwe ya, sị: “N’ezie, ndị m ka ha bụ, ụmụ ndị na-adịghị ekwu okwu ụgha.” Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “‘N’ezie’ ahụ abụghị iwu eze nyere ma ọ bụ ịmata ihe ga-emenụ tupu o mee: ọ bụ olileanya na obi ike sitere n’ịhụnanya.” Ee, Jehova ji obi eziokwu soro ha gbaa ndụ, chọọ n’eziokwu ka ndị ya nwee ihe ịga nke ọma. N’agbanyeghị adịghị ike ha ndị doro anya, o nwere obi ike n’ebe ha nọ. Lee ka o si magbuo onwe ya ife Chineke nke nwere ntụkwasị obi dị otú ahụ n’ebe ndị na-efe ya ofufe nọ! Ndị okenye taa na-eme ihe dị ukwuu iji wusie ndị e nyere ha ilekọta ike mgbe ha gosipụtara obi ike yiri ya n’ịdị mma nke ndị Chineke.—2 Ndị Tesalọnaịka 3:4; Ndị Hibru 6:9, 10.
17. (a) Olee ihe àmà Jehova nyere banyere ịhụnanya ya n’ebe ụmụ Israel nọ? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe taa?
17 Otú o sina dị, ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere ndị Israel, sị: “Ha chezọrọ Chineke, bụ́ Onye nzọpụta ha, Onye na-emerị ihe ukwuu dị iche iche n’Ijipt.” (Abụ Ọma 106:21) Omume nnupụisi na ikwesi olu ike ha dugara na ha ịnọ n’ọnọdụ ndị dị oké njọ ọtụtụ mgbe. (Deuterọnọmi 9:6) Jehova ọ̀ kwụsịrị imere ha ebere? Kama nke ahụ, Aịsaịa na-akọ na “ná mkpagbu nile ha Ya ka a na-akpagbu.” Lee mmetụta ọmịiko Jehova nwere! Dị ka ọ na-adị nna ọ bụla na-ahụ n’anya, ọ na-ewute Chineke ịhụ ka ụmụ ya na-ata ahụhụ, ọbụna mgbe ahụhụ ahụ bụ n’ihi nzuzu ha. Dị ka e buru n’amụma nakwa dị ka ihe àmà nke ịhụnanya ya, o zigara “mmụọ ozi nke ihu ya,” ma eleghị anya Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ, iduru ha banye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọpụpụ 23:20) Ya mere, Jehova paliri mba ahụ ma kuru ya, “dị ka nwoke si eku nwa ya.” (Deuterọnọmi 1:31; Abụ Ọma 106:10) Taa, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova makwaara ahụhụ anyị na-ata nakwa na ọ na-emere anyị ebere mgbe anyị nọ n’ọnọdụ ndị dị oké njọ. Anyị pụrụ iji obi ike ‘tụkwasị Ya nchegbu nile anyị na-echegbu onwe anyị, n’ihi na ihe nile banyere anyị na-emetụ Ya n’obi.’—1 Pita 5:7.
Chineke Aghọọ Onye Iro
18. Gịnị mere Jehova ji ghọọ onye iro nke ndị ya?
18 Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị iji obiọma Chineke kpọrọ ihe efu. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị ahụ nupụrụ isi, mee ka o wute Mmụọ Nsọ Ya: O wee chigharịa ghọọrọ ha onye iro, Ya onwe ya busoro ha agha.” (Aịsaịa 63:10) Jehova dọrọ aka ná ntị na, ọ bụ ezie na ya bụ Chineke dị ebere ma na-eme amara, “ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Ndị Israel mere ka ha bụrụ ndị gaje inweta ntaramahụhụ n’ihi omume nnupụisi. “Echezọla, ihe nke i ji kpasuo Jehova, bụ́ Chineke gị, iwe n’ọzara,” ka Mosis chetaara ha. “Site n’ụbọchị mgbe i si n’ala Ijipt pụta, ruo mgbe unu bịaruru ebe a, ndị na-enupụ isi ka unu bụworo n’ebe Jehova nọ.” (Deuterọnọmi 9:7) Site n’iguzogide mmetụta dị mma nke mmụọ Chineke, ha mere ihe wutere ya ma ọ bụ kpasuo ya iwe. (Ndị Efesọs 4:30) Ha amanyewo Jehova ịghọ onye iro ha.—Levitikọs 26:17; Deuterọnọmi 28:63.
19, 20. Olee ihe ndị Juu chetara, n’ihi gịnịkwa?
19 Mgbe ha nọ na-ata ahụhụ, a kpaliri ndị Juu ụfọdụ ịtụgharị uche n’ihe ndị mere n’oge gara aga. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ndị Ya wee cheta ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga nke Mosis, sị, Olee ebe Onye ahụ nọ nke mere ka ha si n’oké osimiri rịgopụta n’aka onye na-azụ ìgwè ewu na atụrụ Ya? olee ebe Onye ahụ nọ nke tinyere Mmụọ Nsọ Ya n’etiti ha? Nke na-eme ka ogwe aka Ya mara mma jee ije n’aka nri Mosis? Nke na-ekewa mmiri n’ihu ha, imere Onwe ya aha ebighị ebi? Nke na-eme ka ha jee ije n’ogbu mmiri dị ka ịnyịnya n’ọzara, ha wee ghara ịsụ ngọngọ? Dị ka anụ ụlọ nke na-arịda na ndagwurugwu, otú a ka Mmụọ nke Jehova na-eme ka ha zuru ike.”—Aịsaịa 63:11-14a.d
20 Ee, n’inweta ihe ndị si ná nnupụisi pụta, agụụ oge ndị ahụ Jehova bụ Onye Nnapụta ha kama ịbụ onye iro ha gụsiri ndị Juu ike. Ha chetara otú ‘ndị na-azụ ha dị ka ìgwè ewu na atụrụ,’ bụ́ Mosis na Erọn, si duru ha gabiga Oké Osimiri Uhie ahụ n’udo. (Abụ Ọma 77:20; Aịsaịa 51:10) Ha chetara mgbe, kama ịbụ ndị kpasuru mmụọ Chineke iwe, ha bụ ndị ọ na-edu site ná nduzi nke Mosis na ndị okenye ndị ọzọ mmụọ nsọ họpụtara na-enye. (Ọnụ Ọgụgụ 11:16, 17) Ha chetakwara na ha hụrụ ka e ji ‘ogwe aka mara mma’ nke ike Jehova mee ihe maka ha site n’aka Mosis! Ka oge na-aga, Chineke si n’ọzara ukwu ahụ dị egwu kpọpụta ha ma duru ha banye n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya—ebe izu ike. (Deuterọnọmi 1:19; Joshua 5:6; 22:4) Otú ọ dị, ugbu a, ndị Israel na-ata ahụhụ n’ihi na ha na Chineke enwekwaghị mmekọrịta dị mma!
‘Aha Mara Mma Maka Onwe Ya’
21. (a) Oké ihe ùgwù dị aṅaa ka ndị Israel gaara enwe n’ihe banyere aha Chineke? (b) Gịnị bụ nzube bụ́ isi mere Chineke ji tọhapụ ụmụ Abraham site n’Ijipt?
21 N’agbanyeghị nke ahụ, ihe onwunwe funahụrụ ndị Israel enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ihe ùgwù nke ha tụfuru, ya bụ, nke iso na-eto aha Chineke. Mosis kwere ndị Israel nkwa, sị: “Jehova ga-eme ka i guzosiere Ya ike ịbụ ndị nsọ, dị ka Ọ ṅụụrụ gị iyi; mgbe ị ga-edebe ihe nile Jehova, bụ́ Chineke gị, nyere n’iwu, mgbe ị ga-ejekwa ije n’ụzọ Ya nile. Ndị nile nke ụwa ga-ahụkwa na ọ bụ aha Jehova ka a na-akpọkwasị gị; ha ga-atụkwa egwu gị.” (Deuterọnọmi 28:9, 10) Mgbe Jehova mere ihe iji chebe ụmụ Abraham, na-anapụta ha n’ịbụ ohu n’Ijipt, o meghị ya nanị iji mee ka ihe dịrị ha mfe ma ọ bụ dịrị ha mma karị. O mere ya n’ihi ihe dị nnọọ mkpa karị—aha ya. Ee, ọ chọrọ ijide n’aka na ‘a kọrọ akụkọ aha ya n’ụwa nile.’ (Ọpụpụ 9:15, 16) Mgbe Chineke mekwara ebere mgbe ndị Israel nupụsịrị isi n’ọzara, ihe mere o ji mee otú ahụ abụghị nanị n’ihi mmetụta o nwere. Jehova n’onwe ya kwuru, sị: “Arụrụ m ọrụ n’ihi aha m, ka e wee ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ n’anya mba nile.”—Ezikiel 20:8-10.
22. (a) N’ọdịnihu, n’ihi gịnị ka Chineke ga-eji lụọ agha ọzọ n’ihi ndị ya? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe aha Chineke nọ si emetụta omume anyị?
22 Lezie ụzọ dị ike Aịsaịa si mechie amụma a! O kwuru, sị: “Otú a ka I duru ndị Gị, imere Onwe gị aha mara mma.” (Aịsaịa 63:14b) Ugbu a, a pụrụ ịhụ n’ụzọ doro anya ihe mere Jehova ji lụọ ọgụ n’ụzọ dị ike maka ndị ya. Ọ bụ iji meere onwe ya aha mara mma. Ya mere amụma Aịsaịa bụ ihe ncheta dị ike na ịza aha Jehova bụ ma ihe ùgwù dị ebube ma nnukwute ibu ọrụ. Ezi ndị Kraịst taa hụrụ aha Jehova n’anya karịa ndụ ha. (Aịsaịa 56:6; Ndị Hibru 6:10) Ha adịghị achọ ime ihe ọ bụla pụrụ iwetara aha nsọ ahụ nkọcha. Ha na-emeghachi omume n’ezi ịhụnanya Chineke site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ya. N’ihi na ha hụkwara aha Jehova nke mara mma n’anya, ọ na-agụsi ha agụụ ike ịhụ oge ahụ mgbe ọ ga-azọda ndị iro ya n’ebe nzọcha nke mkpụrụ vine nke iwe ya—ọ bụghị nanị n’ihi na ọ ga-abara ha uru, kama n’ihi na ọ ga-eduje n’ito aha Chineke ahụ ha hụrụ n’anya.—Matiu 6:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị Herọd nke narị afọ mbụ O.A. bụ ndị Edọm.
b Okwu bụ́ “afọ nke ndị M gbapụtaworo” na okwu bụ́ “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀” pụrụ ịdị na-ezo aka n’otu oge ahụ. Rịba ama otú e si jirikọta okwu ndị yiri ha mee ihe n’Aịsaịa 34:8.
c Jehova kwupụtara ijuanya o nwere na ọ dịghị onye bịara nyere ya aka. A pụrụ n’ezie iwere ya dị ka ihe ijuanya na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 kemgbe Jisọs nwụsịrị, ndị dị ike n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ ka na-emegide uche Chineke.—Abụ Ọma 2:2-12; Aịsaịa 59:16.
d Amaokwu a pụkwara isi otú a malite: “Ọ malitere icheta.” (Aịsaịa 63:11, ihe odide ala ala peeji NW) Otú ọ dị, nke a apụtaghị kpọmkwem na ọ bụ Jehova na-echeta. Okwu ndị sochirinụ na-egosipụta mmetụta nke ndị Chineke nwere ọ bụghị nke Jehova n’onwe ya nwere. Akwụkwọ bụ́ Soncino Books of the Bible si otú a sụgharịa okwu ndị a: “Mgbe ahụ ndị Ya chetara oge ndị gara aga.”
[Foto dị na peeji nke 359]
Jehova nwere olileanya dị ukwuu n’ebe ndị ya nọ