Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 25 p. 360-371
  • Ekpere Nchegharị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekpere Nchegharị
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nna nke Nwere Ọmịiko
  • Nanị Jehova Pụrụ Ịzọpụta
  • “Ige Ntị Dị Mma Karịa Ịchụ Àjà”
  • Jehova, “Onye Na-anụ Ekpere”
  • Jehova Na-ezi Anyị Ihe Maka Ọdịmma Anyị
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • E Weghachi Paradaịs!
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Na-echere Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 25 p. 360-371

Isi nke Iri Abụọ na Ise

Ekpere Nchegharị

Aịsaịa 63:15–64:12

1, 2. (a) Gịnị bụ nzube nke ịdọ aka ná ntị Chineke? (b) Olee mkpebi ndị Juu ga-eme mgbe ha nwetasịrị ịdọ aka ná ntị Jehova?

MBIBI e bibiri Jerusalem na ụlọukwu ya na 607 T.O.A. bụ ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova, ngosipụta nke oké iwe ya. Mba Juda nke na-enupụ isi kwesịrị inweta ntaramahụhụ ahụ siri ike. Ma, Jehova ezubeghị ka e kpochapụ ndị Juu. Pọl onyeozi zoro aka ná nzube nke ịdọ aka ná ntị Jehova mgbe o kwuru, sị: “Ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.”—Ndị Hibru 12:11.

2 Olee otú ndị Juu ga-esi meghachi omume n’ahụmahụ ahụ siri ike? Hà ga-akpọ ịdọ aka ná ntị Jehova asị? (Abụ Ọma 50:16, 17) Ka hà ga-anakwere ya dị ka ọzụzụ? Hà ga-echegharị ma bụrụ ndị e mere ka ahụ dị ha ike? (Aịsaịa 57:18; Ezikiel 18:23) Amụma Aịsaịa na-egosi na ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ndị bibu na Juda ga-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ. Malite n’amaokwu ndị ikpeazụ nke isi 63 ruo n’isi 64, a kọwara mba Juda dị ka ndị nwere nchegharị, ndị ji arịrịọ sitere n’obi na-abịakwute Jehova. Aịsaịa onye amụma kpere ekpere nchegharị maka ụmụ amaala ibe ya ndị ga-eje biri n’ala ọzọ n’ọdịnihu. Ka ọ nọ na-ekpe ya, o kwuru banyere ihe ndị ga-emenụ dị ka a ga-asị na ha nọ na-eme n’ihu ya.

Nna nke Nwere Ọmịiko

3. (a) Olee otú ekpere amụma Aịsaịa si bulie Jehova elu? (b) Olee otú ekpere Daniel si gosi na ekpere amụma ahụ nke Aịsaịa kpere bụ echiche nke ndị Juu nwere nchegharị nọ na Babilọn? (Lee igbe dị na peeji nke 362.)

3 Aịsaịa kpegaara Jehova ekpere, sị: “Si n’eluigwe legide anya, sikwa n’ebe obibi nke ịdị nsọ Gị na nke ịma mma Gị lee.” Onye amụma ahụ na-ekwu banyere eluigwe ime mmụọ, ebe Jehova na ndị mmụọ o kere eke a na-adịghị ahụ anya bi. N’ikwupụta echiche nke ndị Juu bi n’ala ọzọ, Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Olee ebe ekworo Gị na ịdị ike Gị nile dị? ịda ụda nke ngịrị afọ Gị na obi ebere Gị nile n’ebe m nọ jisiri onwe ha ike.” (Aịsaịa 63:15) Jehova egbochiwo ike ya ma chịkwaa mmetụta ya miri emi—“ịda ụda nke ngịrị afọ [ya], na obi ebere [ya] nile”—n’ebe ndị ya nọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova bụ “Nna” nke mba ndị Juu. Abraham na Israel (Jekọb) bụ ndị nna nna ha n’anụ ahụ, ma ọ bụrụ na a kpọghachite ha ná ndụ, ha pụrụ ịjụ ụmụ ha si n’ezi ofufe dapụ. Jehova nwere ọmịiko ka ukwuu. (Abụ Ọma 27:10) Aịsaịa ji obi ekele kwuo, sị: “Gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị; Onye mgbapụta anyị site na mgbe ebighị ebi gara aga ka aha Gị bụ.”—Aịsaịa 63:16.

4, 5. (a) N’echiche dị aṅaa ka Jehova na-eme ka ndị ya si n’ụzọ ya kpafuo? (b) Ụdị ofufe dị aṅaa ka Jehova chọrọ?

4 Aịsaịa gara n’ihu site n’ikwu okwu sitere n’obi, sị: “Jehova, n’ihi gịnị ka Ị na-eme ka anyị si n’ụzọ Gị nile kpafuo? n’ihi gịnị ka Ị na-eme ka obi anyị si n’egwu Gị sie ike? Lata n’ihi ndị ohu Gị, bụ́ ebo nile nke ihe nketa Gị.” (Aịsaịa 63:17) Ee, Aịsaịa na-ekpe ekpere ka Jehova chee ihu ya ọzọ n’ebe ndị ohu ya nọ. Otú ọ dị, n’echiche dị aṅaa ka Jehova mere ka ndị Juu si n’ụzọ ya kpafuo? Ọ̀ bụ Jehova mere ka obi ha sie ike nke mere ka ha ghara ịdị na-atụ ya egwu? Ee e, kama o kwere ka o mee, n’obi nkoropụ ha kwa, ndị Juu ahụ na-akwa arịrị na Jehova nyere ha nnwere onwe dị otú ahụ. (Ọpụpụ 4:21; Nehemaịa 9:16) Ọ dị ha ka ya bụrụ na Jehova mere ihe iji gbochie ha ime ihe ọjọọ.

5 N’ezie, Chineke adịghị emeso ụmụ mmadụ otú ahụ. Anyị bụ ndị nweere onwe anyị ime nhọrọ, Jehova na-enyekwa anyị ohere ikpebi n’onwe anyị ma ànyị ga-erubere ya isi ma ọ bụ na anyị agaghị erubere ya isi. (Deuterọnọmi 30:15-19) Jehova chọrọ ofufe si n’obi na n’uche nke ọ bụ ezigbo ịhụnanya na-akpali. N’ihi ya, o kwere ka ndị Juu jiri nnwere onwe ha ime nhọrọ mee ihe, ọ bụ ezie na nke a enyewo ha ohere inupụrụ ya isi. Ọ bụ n’ụzọ dị otú a ka o si mee ka obi ha sie ike.—2 Ihe E Mere 36:14-21.

6, 7. (a) Gịnị si ná nhapụ ndị Juu hapụrụ ụzọ Jehova pụta? (b) Ọchịchọ dị aṅaa na-enweghị isi ka ha na-ekwupụta, ma gịnị ka ndị Juu ahụ na-enweghị ihe mere ha ga-eji tụọ anya ya?

6 Gịnị si n’ime ya pụta? Aịsaịa na-ekwu n’ụzọ amụma, sị: “Ọ bụ nanị mgbe nta ka ndị nsọ Gị nwetara ya: ndị na-akpagbu anyị azọdawo ebe nsọ Gị. Anyị aghọwo ndị Ị na-achịghị site na mgbe ebighị ebi gara aga, ndị a na-akpọkwasịghị ha aha Gị.” (Aịsaịa 63:18, 19) Ndị Jehova nwetara ebe nsọ ya ruo nwa mgbe nta. Jehova kweziri ka e bibie ya, ka e meekwa ka mba ya jee biri n’ala ọzọ. Mgbe nke ahụ mere, o yiri ka a ga-asị na ọ dịghị ọgbụgba ndụ dị n’etiti ya na ụmụ Abraham nakwa na a kpọkwasịghị ha aha ya. Ugbu a ha nọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn, ndị Juu na-eti mkpu n’ihi enweghị olileanya ha, na-asị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na Ị ga-adọwa eluigwe, rịdata, ma a sị na ugwu nile ga-esi n’ihu Gị rudaa dị ka mmiri; dị ka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, dị ka mgbe ọkụ na-eme ka mmịrị gbọọ: ime ka ndị na-emegide Gị mara aha Gị, ka mba dị iche iche wee si n’ihu Gị maa jijiji.” (Aịsaịa 64:1, 2) N’ezie, Jehova nwere ike iji zọpụta. N’ezie ọ pụrụ ịrịdataworị lụọrọ ndị ya ọgụ, na-adọwa usoro ọchịchị ndị yiri eluigwe, na-etidakwa alaeze ukwu ndị yiri ugwu. Jehova pụrụ imeworị ka a mara aha ya site n’igosi ịnụ ọkụ n’obi ya yiri ọkụ n’ihi ndị ya.

7 Jehova mere ụdị ihe ndị a n’oge gara aga. Aịsaịa na-akọ, sị: “Mgbe I mere ihe dị egwu nke anyị na-eleghị anya ha, Ị rịdatara, ugwu nile siri n’ihu Gị rudaa dị ka mmiri.” (Aịsaịa 64:3) Oké ọrụ ndị dị otú ahụ gosipụtara ike Jehova na ịbụ Chineke ya. Otú ọ dị, ndị Juu na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’oge Aịsaịa enweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji tụọ anya ka Jehova mee ihe dị otú ahụ maka abamuru ha.

Nanị Jehova Pụrụ Ịzọpụta

8. (a) Gịnị bụ otu ụzọ Jehova si dị iche na chi ụgha dị iche iche nke mba dị iche iche? (b) N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị mee ihe iji zọpụta ndị ya n’agbanyeghị na ọ pụrụ ime otú ahụ? (ch) Olee otú Pọl si hota ma jiri ihe e kwuru n’Aịsaịa 64:4 mee ihe? (Lee igbe dị na peeji nke 366.)

8 Chi ụgha dị iche iche adịghị arụrụ ndị na-efe ha ofufe oké ọrụ nke nzọpụta. Aịsaịa dere, sị: “Site na mgbe ebighị ebi gara aga mmadụ anụghị, ha anụtaghịkwa ná ntị, anya ahụghịkwa otu Chineke, ma e wezụga nanị Gị, Nke na-arụrụ onye na-echere Ya ọrụ. I zutewo onye na-ewere obi ụtọ arụ ezi omume, bụ́ ndị na-echeta Gị n’ụzọ Gị nile.” (Aịsaịa 64:4, 5a) Nanị Jehova bụ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọ na-eme ihe iji chebe ndị na-eme ezi omume na ndị na-echeta ya. (Aịsaịa 30:18) Ndị Juu hà emewo omume otú a? Ee e. Aịsaịa na-agwa Jehova, sị: “Lee, Gị onwe gị were iwe, anyị wee mehie: n’ime ha ka anyị nọworo mgbe ebighị ebi, à ga-azọpụtakwa anyị?” (Aịsaịa 64:5b) N’ihi na ndị Chineke enwewo ihe ndekọ nke ịnọgide na-eme mmehie ruo ogologo oge, ọ dịghị ihe ọ bụla mere Jehova ga-eji jide iwe ya ma mee ihe iji zọpụta ha.

9. Gịnị ka ndị Juu nwere nchegharị pụrụ ịtụ anya ya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

9 Ndị Juu apụghị imegharị ihe ndị e meworo eme, ma, ọ bụrụ na ha echegharịa ma laghachi n’ofufe dị ọcha, ha pụrụ ịtụ anya inweta mgbaghara na ngọzi n’ọdịnihu. Jehova ga-enye ndị nwere nchegharị ụgwọ ọrụ n’oge nke ya site n’ịtọhapụ ha ná ndọrọ n’agha Babilọn. Ma, ọ dị ha mkpa inwe ndidi. N’agbanyeghị nchegharị ha, Jehova agaghị agbanwe usoro oge ime ihe ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha amụrụ anya ma na-eme uche Jehova, ha ji n’aka na a ga-emesịa tọhapụ ha. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst taa ji ndidi na-atụ anya Jehova. (2 Pita 3:11, 12) Anyị na-eburu ihe Pọl onyeozi kwuru n’obi, bụ́ onye kwuru, sị: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—Ndị Galetia 6:9.

10. Enweghị ike dị aṅaa ka e kwupụtara n’ezoghị ọnụ n’ekpere Aịsaịa?

10 Ekpere amụma nke Aịsaịa abụghị nanị nkwupụta mmehie iji mejuo iwu. Ọ na-egosipụta nkweta o ji obi eziokwu kweta na mba ahụ apụghị ịzọpụta onwe ya. Onye amụma ahụ na-ekwu, sị: “Anyị wee dị ka onye rụrụ arụ, anyị nile; na dị ka uwe e merụrụ emerụ, otú a ka ezi omume nile anyị dị: anyị wee kpọnwụọ dị ka akwụkwọ osisi, anyị nile; ajọ omume anyị na-efepụkwa anyị, dị ka ifufe.” (Aịsaịa 64:6) Ka ọ na-erule ná njedebe nke oge ije biri n’ala ọzọ ahụ, ndị Juu nwere nchegharị nwere ike ha agakwaghị abụ ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ha pụrụ ichigharịkwuruwo Jehova site n’ịrụ ọrụ ezi omume. Ma ha ka bụ ndị na-ezughị okè. Ọrụ ọma ha, ọ bụ ezie na ha kwesịrị ịja mma, bụ nanị uwe ruru unyi ma a bịa n’ikpuchi mmehie. Mgbaghara Jehova bụ onyinye na-erughịrị mmadụ nke sitere n’ebere ya. Ọ bụghị ihe a pụrụ ịrụta n’ọrụ.—Ndị Rom 3:23, 24.

11. (a) Olee ọnọdụ ime mmụọ dị njọ dị n’etiti ihe ka ukwuu ná ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, gịnịkwa mere ọ pụrụ iji dị otú a? (b) Olee ndị bụ ihe nlereanya magburu onwe ha nke okwukwe n’oge ije biri n’ala ọzọ ahụ?

11 Ka Aịsaịa lepụrụ anya n’ihu, gịnị ka ọ hụrụ? Onye amụma ahụ kpere ekpere, sị: “Ọ dịghịkwa onye na-akpọku aha Gị, nke na-akpọte onwe ya ijide Gị: n’ihi na I zonahụwo anyị ihu Gị, wee mee ka anyị gbazee site n’aka ajọ omume nile nke anyị.” (Aịsaịa 64:7) Ọnọdụ ime mmụọ nke mba ahụ dị njọ nke ukwuu. Ndị ahụ adịghị akpọku aha Chineke n’ekpere. Ọ bụ ezie na ha adịkwaghị eme mmehie dị oké njọ nke bụ́ ikpere arụsị, ihe àmà na-egosi na ha na-eleghara ofufe ha anya, ọ dịghịkwa onye “na-akpọte onwe ya ijide” Jehova. O doro anya na ha na Onye Okike enweghị mmekọrịta dị mma. Ikekwe ụfọdụ na-eche na ha erughị eru ịgwa Jehova okwu n’ekpere. Ndị ọzọ pụrụ ịdị na-emere onwe ha ihe dịịrị ha kwa ụbọchị n’ajụghị ase ma ọ nọ. N’ezie, n’ime ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ e nwere ndị dị ka Daniel, Hananaịa, Mishael, Azaraịa, na Ezikiel, ndị a bụkwa ezi ihe nlereanya nke okwukwe. (Ndị Hibru 11:33, 34) Ka afọ 70 ahụ nke ndọrọ n’agha na-abịaru ọgwụgwụ ya, ndị ikom dị ka Hagaị, Zekaraịa, Zerubabel, na Onyeisi Nchụàjà bụ́ Joshua dị njikere ibute ụzọ n’ụzọ magburu onwe ya n’ịkpọku aha Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ekpere amụma Aịsaịa yiri ka ọ na-akọwa ọnọdụ nke ihe ka ukwuu ná ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ.

“Ige Ntị Dị Mma Karịa Ịchụ Àjà”

12. Olee otú Aịsaịa si kwupụta njikere ndị Juu nwere nchegharị dị ịgbanwe omume ha?

12 Ndị Juu nwere nchegharị dị njikere ịgbanwe. N’ịnọchite anya ha, Aịsaịa kpegaara Jehova ekpere, sị: “Ugbu a, Jehova, Nna anyị ka Ị bụ: anyị onwe anyị bụ ụrọ, Gị onwe gị bụ onye na-akpụ anyị; ọrụ aka Gị ka anyị nile bụ.” (Aịsaịa 64:8) Ọzọkwa, okwu ndị a na-egosipụta ikike Jehova nwere dị ka Nna, ma ọ bụ Onye Na-enye Ndụ. (Job 10:9) E ji ndị Juu chegharịrịnụ tụnyere ụrọ dị nro. N’ụzọ ihe atụ, a pụrụ ịkpụgharị ndị gere ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Ma, a pụrụ imezu nke a nanị ma ọ bụrụ na Jehova, bụ́ Ọkpụite ahụ, agbaghara ha. Ya mere, Aịsaịa rịọrọ ya ugboro abụọ ka o cheta na ndị Juu bụ ndị ya: “Jehova, ewela iwe nke ukwuu, echetakwala ajọ omume ruo mgbe ebighị ebi: lee, biko, legide anya, ndị Gị ka anyị nile bụ.”—Aịsaịa 64:9.

13. Gịnị bụ ọnọdụ ala Israel n’oge ndị Chineke nọ n’ala ọzọ?

13 N’oge ije biri n’ala ọzọ ahụ, ndị Juu diri ihe karịrị nanị ndọrọ n’agha n’ala na-ekpere arụsị. Ntọgbọrọ n’efu nke Jerusalem na ụlọukwu ya wetaara ha na Chineke ha nkọcha. Ekpere nchegharị nke Aịsaịa na-akọ ụfọdụ n’ime ihe kpatara nkọcha a: “Obodo nsọ Gị nile aghọwo ọzara, Zaịọn aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọgbọrọ n’efu. Ụlọ anyị nke dị nsọ nke makwara mma, ebe nna anyị hà toro Gị, aghọwo ihe nsure ọkụ: ihe nile anyị a na-achọsi ike aghọwokwa mkpọmkpọ ihe.”—Aịsaịa 64:10, 11.

14. (a) Olee otú Jehova si nye ịdọ aka ná ntị banyere ọnọdụ dị ugbu a? (b) Ọ bụ ezie na obi dị Jehova ụtọ banyere ụlọukwu ya na àjà ndị a na-achụ n’ebe ahụ, olee ihe ka mkpa?

14 N’ezie, Jehova maara nke ọma otú ihe dị n’ala nna nna ndị Juu. Ihe dị ka afọ 420 tupu e bibie Jerusalem, ọ dọrọ ndị ya aka ná ntị na ọ bụrụ na ha ahapụ ihe ndị o nyere n’iwu ma fee chi ndị ọzọ, ọ “ga-ebipụkwa [ha] n’elu ala,” ụlọukwu ahụ mara mma ga-aghọkwa “mkpọmkpọ ihe.” (1 Ndị Eze 9:6-9, NW) N’eziokwu, obi dị Jehova ụtọ banyere ala ahụ o nyere ndị ya, ụlọukwu ahụ dị ebube e wuru n’aha ya, na àjà ndị a na-achụrụ ya. Ma iguzosi ike n’ihe na nrubeisi dị mkpa karịa ihe onwunwe, ọbụna àjà. Samuel onye amụma gwara Eze Sọl n’ụzọ dabara adaba, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu.”—1 Samuel 15:22.

15. (a) Arịrịọ dị aṅaa ka Aịsaịa rịọrọ Jehova n’ụzọ amụma, oleekwa otú e si zaa ya? (b) Olee ihe ndị dugara n’ọjụjụ Jehova jụrụ Israel n’ikpeazụ dị ka otu mba?

15 Ka o sina dị, Chineke nke Israel ọ̀ pụrụ ilekwasị anya n’ọdachi nke dakwasịrị ndị ya nwere nchegharị ma ghara ịbụ onye a kpaliri imere ha ebere? Ajụjụ dị otú ahụ ka Aịsaịa ji mechie ekpere amụma ya. N’ihi ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ọ rịọrọ, sị: “Mgbe a na-eme ihe ndị a, Ị̀ ga-ejisi Onwe gị ike, Jehova? Ị̀ ga-agba nkịtị, wee wedaa anyị n’ala nke ukwuu?” (Aịsaịa 64:12) N’ikpeazụ, Jehova gbaghaara ndị ya n’ezie, na 537 T.O.A. kwa, ọ kpọghachiri ha n’ala ha ka ha nwee ike ịmaliteghachi ofufe dị ọcha n’ebe ahụ. (Joel 2:13) Otú ọ dị, ọtụtụ narị afọ n’ihu, e bibiri Jerusalem na ụlọukwu ya ọzọ, Chineke mesịkwara jụ mba ya na ya nọ n’ọgbụgba ndụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị Jehova esiwo n’ihe ndị o nyere n’iwu kpafuo, ha ajụwokwa Mesaịa ahụ. (Jọn 1:11; 3:19, 20) Mgbe nke ahụ mere, Jehova jiri mba ọhụrụ, bụ́ mba ime mmụọ, nke bụ́ “Israel nke Chineke” dochie anya Israel.—Ndị Galetia 6:16; 1 Pita 2:9.

Jehova, “Onye Na-anụ Ekpere”

16. Gịnị ka Bible na-akụzi banyere mgbaghara Jehova?

16 A pụrụ ịmụta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ site n’ihe mere Israel. Anyị na-ahụ na Jehova “dị mma, [ọ] bụkwa onye na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Dị ka ndị e kere eke na-ezughị okè, anyị na-adabere n’ebere na mgbaghara ya iji nweta nzọpụta. Ọ dịghị ọrụ anyị nke pụrụ ime ka anyị bụrụ ndi ruru eru inweta ngọzi ndị a. Otú ọ dị, Jehova adịghị agbaghara mmehie aghara aghara. Ọ bụ nanị ndị chegharịrị ná mmehie ha ma chigharịa bụ ndị Chineke pụrụ ịgbaghara mmehie ha.—Ọrụ 3:19.

17, 18. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova nwere ezi mmasị n’echiche na ná mmetụta anyị? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji enwe ndidi n’ebe ụmụ mmadụ na-eme mmehie nọ?

17 Anyị na-amụtakwa na Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’echiche na ná mmetụta anyị mgbe anyị na-ekwupụta ha n’ekpere gwa ya. Ọ bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2, 3) Pita onyeozi na-emesi anyị obi ike, sị: “Anya abụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ dịkwa n’ebe arịrịọ ha dị.” (1 Pita 3:12) Ọzọkwa, anyị na-amụta na ekpere nchegharị aghaghị ịgụnye nkwupụta mmehie. (Ilu 28:13) Otú ọ dị, nke a apụtaghị anyị iji n’ihi ebere Chineke mewe otú masịrị anyị. Bible na-adọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha “ghara ịnara amara Chineke n’efu.”—2 Ndị Kọrint 6:1.

18 N’ikpeazụ, anyị na-amụta nzube nke ndidi Chineke na-enwe n’ebe ndị ya mere mmehie nọ. Pita onyeozi kọwara na Jehova na-enwe ndidi “n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ka o sina dị, n’ikpeazụ, a ga-enye ndị nọgidere na-eji ndidi Chineke eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ntaramahụhụ. Banyere nke a anyị na-agụ, sị: “[Jehova] ga-enyeghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya nile si dị: ndị site ná ntachi obi n’ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na apụghị imebi [emebi] ka Ọ ga-enye ndụ ebighị ebi: ma ndị dị n’akụkụ nke ịkpa iche iche, ndị na-ekwenyeghịkwa eziokwu, kama ha na-ekwenye ajọ omume, iwe na ọnụma.”—Ndị Rom 2:6-8.

19. Àgwà dịgasị aṅaa na-adịghị agbanwe agbanwe ka Jehova ga na-egosi mgbe nile?

19 Ọ bụ otú a ka Chineke si mesoo Israel oge ochie. Otu ụkpụrụ ahụ na-achịkwa mmekọrịta anyị na Jehova taa n’ihi na ọ dịghị agbanwe agbanwe. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ala azụ n’inye ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị, ọ ga-anọgide na-abụ “Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [otu puku] ọtụtụ ugboro ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.”—Ọpụpụ 34:6, 7.

Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 362]

Ekpere Nchegharị nke Daniel

Daniel onye amụma bi na Babilọn ruo afọ 70 ahụ dum nke ndọrọ n’agha nke ndị Juu. N’otu oge n’afọ nke 68 nke ije biri n’ala ọzọ ahụ, Daniel ghọtara site n’amụma Jeremaịa na obibi Israel bi n’ala ọzọ na-abịaru ọgwụgwụ ya. (Jeremaịa 25:11; 29:10; Daniel 9:1, 2) Daniel chigharịkwuuru Jehova n’ekpere—ekpere nchegharị n’ihi mba ndị Juu dum. Daniel na-akọ, sị: “M wee chee Onyenwe anyị Chineke ihu m, ịchọ Ya n’ekpere na arịrịọ amara dị iche iche, n’obubu ọnụ na ákwà mkpe na ntụ. M wee kpeere Jehova, bụ́ Chineke m, kwupụta.”—Daniel 9:3, 4.

Daniel kpere ekpere ya ihe dị ka narị afọ abụọ mgbe Aịsaịa dekọsịrị ekpere amụma ahụ dị n’isi 63 na 64 nke akwụkwọ ya. N’ụzọ doro anya, ọtụtụ n’ime ndị Juu nwere obi eziokwu kpegaara Jehova ekpere n’oge ndị ahụ siri ike nke ije biri n’ala ọzọ. Otú ọ dị, Bible na-eme ka ekpere Daniel pụta ìhè, bụ́ nke ihe àmà na-egosi, gosipụtara mmetụta nke ọtụtụ ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi. Ya mere, ekpere ya na-egosi na mmetụta ndị e gosipụtara n’ekpere amụma Aịsaịa bụ n’ezie mmetụta nke ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Babilọn.

Rịba ama ụzọ ụfọdụ ekpere Daniel na nke Aịsaịa si yie.

Aịsaịa 63:16 Daniel 9:15

Aịsaịa 63:18 Daniel 9:17

Aịsaịa 64:1-3 Daniel 9:15

Aịsaịa 64:4-7 Daniel 9:4-7

Aịsaịa 64:6 Daniel 9:9, 10

Aịsaịa 64:10, 11 Daniel 9:16-18

Igbe dị na peeji nke 366]

“Anya Ahụbeghị”

N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint, Pọl onyeozi hotara ihe e kwuru n’akwụkwọ Aịsaịa mgbe o dere, sị: “Dị nnọọ ka e dere, sị: ‘Anya ahụbeghị, ntị anụbeghịkwa, obi mmadụ echebeghịkwa ihe Chineke kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya.’” (1 Ndị Kọrint 2:9, NW)a Ma ihe Pọl kwuru ma ihe Aịsaịa kwuru enweghị nke na-ezo aka n’ihe Jehova kwadebewooro ndị ya n’ihe nketa eluigwe ma ọ bụ na paradaịs elu ala n’ọdịnihu. Pọl ji ihe Aịsaịa kwuru mee ihe banyere ngọzi ndị Kraịst narị afọ mbụ malitelara inweta, dị ka ịghọta ihe ndị dị omimi karị nke Chineke na inweta nghọta ime mmụọ site n’aka Jehova.

Anyị pụrụ ịghọta ihe ime mmụọ ndị dị omimi nanị mgbe oge nke Jehova iji kpughee ha ruru—ọbụnakwa mgbe ahụ, nanị ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ndị ha na Jehova nwere mmekọrịta chiri anya. Okwu Pọl na-emetụta ndị na-ejichaghị ma ọ bụ ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Anya ha apụghị ịhụ, ma ọ bụ mata, eziokwu ime mmụọ, ntị ha apụghịkwa ịnụ, ma ọ bụ ghọta, ihe ndị dị otú ahụ. Ihe ọmụma banyere ihe Chineke kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya adịghịdị aba n’obi ndị dị otú ahụ. Ma Chineke ekpughewo ihe ndị a site na mmụọ ya nye ndị raara onwe ha nye Chineke, dị ka Pọl raara onwe ya nye.—1 Ndị Kọrint 2:1-16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ihe Pọl kwuru adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru kpọmkwem otú ahụ o si hota ha. O yiri ka ọ na-ejikọta echiche dị n’Aịsaịa 52:15; 64:4; na Aịsa. 65:17.

[Foto dị na peeji nke 367]

Ndị Chineke nwetara Jerusalem na ụlọukwu ya ruo nwa “mgbe nta”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya