“Dị Ka Ụbọchị Nile nke Osisi Si Dị”
IHE karịrị puku afọ atọ gara aga, Mosis dere: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri asatọ], otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe.”—Abụ Ọma 90:10.
N’agbanyeghị ọganihu nkà ọgwụ na ahụ ike, ogologo ndụ mmadụ ka bụkwa otu ihe ahụ ọ bụ n’ụbọchị Mosis. Ka o sina dị, ụmụ mmadụ agaghị anọ mgbe nile n’okpuru ịdị adị dị otú ahụ na-agabiga ngwa ngwa. N’akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa, Chineke sịrị: “Dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:22.
Otu n’ime osisi ndị na-adịkarịsị ogologo ndụ n’ala Bible bụ osisi olive. Osisi nke e sere n’ebe a bụ otu n’ime ọtụtụ osisi olive nọworo otu puku afọ bụ́ ndị ka na-eme nke ọma na Galili. Olee mgbe ụmụ mmadụ ga na-adịru ogologo ndụ otú ahụ? Otu amụma ahụ na-akọwa na ọ ga-abụ mgbe Chineke kere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”—Aịsaịa 65:17.
Akwụkwọ Mkpughe na-ebukwa amụma nhiwe nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”—gọọmenti ọhụrụ nke eluigwe na òtù ọhụrụ nke ụmụ mmadụ mgbe Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:1, 4.
A ga-emezu nkwa nke a nke Chineke n’isi nso. Mgbe ahụ, ọbụna ụbọchị nile nke osisi olive ga-eyi ka nanị ụbọchị dị 24 hour n’ogologo. Anyị ga-enwekwa oge dị ukwuu iji mata ụtọ zuru ezu nke ihe aka anyị rụtara.