Isi nke 21
Ihe Otiti Ndị Jehova Ga-eti Krisendọm
Ọhụụ 5—Mkpughe 8:1–9:21
Isiokwu: Ọfụfụ nke isii n’ime opi asaa ndị ahụ
Oge mmezu ya: Malite n’oge Kraịst Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze na 1914 ruo n’oge oké mkpagbu ahụ
1. Gịnị mere mgbe Nwa Atụrụ ahụ meghere akara nke asaa ahụ?
E JIGIDEWO “ifufe anọ” ahụ ruo mgbe a kasịrị 144,000 ndị ahụ so n’Israel ime mmụọ akara, nwapụtakwa oké ìgwè mmadụ ahụ maka nlanarị. (Mkpughe 7:1-4, 9) Otú ọ dị, tupu oké ifufe ahụ etikwasị elu ala, a ghaghị imekwa ka a mara ikpe ọmụma Jehova megide ụwa nke Setan! Ka Nwa Atụrụ ahụ gara n’ihu imeghe akara nke asaa ahụ nke bụkwa nke ikpeazụ, Jọn aghaghị ịnọworịị na-elegide anya iji hụ ihe ga-apụta. Ugbu a, ọ na-akọrọ anyị ihe ọ hụrụ: “Mgbe ọ [Nwa Atụrụ ahụ] saghekwara akara nke asaa, e wee dere jii n’eluigwe oge hà ka nkera nke otu hour. M wee hụ ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị na-eguzo n’ihu Chineke; e wee nye ha opi asaa.”—Mkpughe 8:1, 2.
Oge Ikpesi Ekpere Ike
2. Gịnị mere n’ime ọkara hour ihe atụ ahụ nke idere duu n’eluigwe?
2 Nke a bụ nnọọ idere duu dị oké mkpa! Ọkara otu hour pụrụ iyi nnọọ oge dị ogologo mgbe ị na-eche ka otu ihe mee. Ugbu a, a dịghị anụkwa ọbụna abụ otuto ahụ n’eluigwe. (Mkpughe 4:8) N’ihi gịnị? Jọn hụrụ ihe kpatara ya n’ọhụụ: “Mmụọ ozi ọzọ wee bịa guzo n’elu ebe ịchụàjà ahụ, na-enwe ihe nke ọlaedo e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ; e wee nye ya ọtụtụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ka o wee tụkwasị ha n’ekpere ndị nsọ nile nke dị n’elu ebe ịchụàjà ahụ nke ọlaedo nke dị n’ihu ocheeze ahụ. Anwụrụ ọkụ nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ahụ sooro ekpere ndị nsọ site n’aka mmụọ ozi ahụ rịgoo n’ihu Chineke.”—Mkpughe 8:3, 4.
3. (a) Gịnị ka isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-echetara anyị? (b) Ná nzube dị aṅaa ka e ji nwee ọkara hour nke idere duu n’eluigwe?
3 Nke a na-echetara anyị na n’usoro ihe ndị Juu, a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ kwa ụbọchị n’ụlọ ikwuu ahụ, n’afọ ndị ikpeazụkwa, n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. (Ọpụpụ 30:1-8) N’oge a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ndị ahụ, ndị Israel na-abụghị ndị nchụàjà na-echere n’èzí ebe nsọ ahụ, na-ekpe ekpere—nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ n’ime obi ha n’ekwupụtaghị ya ekwupụta—nye Onye ahụ ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ na-arịgokwuru. (Luk 1:10) Ugbu a, Jọn hụrụ ihe yiri nke ahụ ka ọ na-eme n’eluigwe. E jikọtara ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ nke mmụọ ozi ahụ na-esure na “ekpere ndị nsọ.” N’eziokwu, n’otu ọhụụ bu nke a ụzọ, e kwuru na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nọchiri anya ekpere ndị dị otú ahụ. (Mkpughe 5:8; Abụ Ọma 141:1, 2) N’ihi ya, ihe àmà gosiri na idere duu ihe atụ ahụ nke mere n’eluigwe bụ iji nye ohere ka a nụrụ ekpere ndị nsọ nọ n’elu ala.
4, 5. Ihe ndị dị aṅaa mere n’akụkọ ihe mere eme na-enyere anyị aka ịchọpụta oge kwekọrọ n’ọkara hour ihe atụ ahụ nke idere duu?
4 Ànyị pụrụ ịchọpụta mgbe ihe nke a mere? Ee, anyị pụrụ, site n’inyocha amaokwu ndị dị gburugburu ya, tinyere ihe ndị meworo ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị. (Mkpughe 1:10) N’ime afọ 1918 na 1919, ihe ndị mere n’elu ala kwekọrọ n’ụzọ pụtara ìhè n’ihe ahụ a kọrọ ná Mkpughe 8:1-4. Ruo 40 afọ tupu 1914, Ndị Mmụta Bible—dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ—ejiriwo nkwuwa okwu na-akpọsa na oge ndị Jentaịl ga-agwụsị n’afọ ahụ. Ihe omume ndị ahụ kpatara ihe isi ike, bụ́ ndị mere na 1914 nwapụtara na ihe ha kwuru bụ eziokwu. (Luk 21:24, King James Version; Matiu 24:3, 7, 8) Ma ọtụtụ n’ime ha kwenyekwara na n’afọ 1914, a gaje ịkpọpụ ha n’elu ala nke a ha wee jee n’ihe nketa ha nke eluigwe. Nke ahụ emezughị. Kama nke ahụ, n’oge agha ụwa mbụ ahụ, ha jiri ntachi obi gabiga oge ajọ mkpagbu. N’October 31, 1916, onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, bụ́ Charles T. Russell, nwụrụ. E mesịa, na July 4, 1918, e buuru onyeisi oche ọhụrụ ahụ bụ Joseph F. Rutherford na ndị nnọchianya asaa ndị ọzọ nke Society jee n’ụlọ mkpọrọ dị n’Atlanta, Georgia, ebe a tụrụ ha mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi ịnọ ọtụtụ afọ.
5 Nke a gbagwojuru ndị Kraịst nwere obi eziokwu nọ n’òtù Jọn ahụ anya. Gịnị ọzọ ka Chineke chọrọ ka ha mee? Olee mgbe a ga-akpọrọ ha laa n’eluigwe? Otu ihe odide nke isiokwu ya bụ “Owuwe Ihe Ubi Agwụsịwo—Gịnị Ọzọ Ga-eme?” pụtara ná mbipụta May 1, 1919, nke Ụlọ Nche (Bekee). O gosipụtara ọnọdụ nke a nke amaghị ihe a ga-eme, gbaakwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi ume ịnọgide na-enwe ntachi obi, na-ekwukwa, sị: “Anyị kwenyere na ọ bụrụwo eziokwu ugbu a na owuwe ihe ubi nke òtù alaeze ahụ abụrụwo ihe e mezuru, na a kawo ndị ahụ nile akara, mechiekwa ụzọ.” N’oge ihe isi ike nke a, ekpere nke òtù Jọn ahụ na-arịgo elu, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’anwụrụ ọkụ nke ọtụtụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. A na-anụkwa ekpere ha!
Ịtụba Ọkụ n’Ime Ụwa
6. Gịnị mere mgbe oge idere duu ahụ gafesịrị n’eluigwe, ọ̀ bụkwa ná nzaghachi nye gịnị?
6 Jọn gwara anyị, sị: “Mmụọ ozi ahụ wee were ihe ahụ e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ; o wee kpojuo ya n’ọkụ nke sitere n’ọkụ ebe ịchụaja ahụ, wee tụba ya n’ụwa: égbè eluigwe, na olu, na àmụ̀mà, na ala ọma jijiji wee soo.” (Mkpughe 8:5) Mgbe oge ịnọ duu ahụ gasịrị, oké ihe omume malitere na mberede! Ihe àmà gosiri na nke a bụ ná nzaghachi nye ekpere ndị nsọ, ebe ihe kpaliri ya bụ ọkụ nke a gụtara site n’ebe ịchụaja nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Laa azụ na 1513 T.O.A., n’Ugwu Saịnaị, égbè eluigwe na àmụ̀mà, oké mkpọtụ, ọkụ, na ịma jijiji nke ugwu ahụ nyere ihe àmà nke gosiri na Jehova elekwasịwo ndị ya anya. (Ọpụpụ 19:16-20) Ihe ngosi yiri nke ahụ ndị Jọn kọrọ akụkọ ha na-egosikwa na Jehova elekwasịwo ndị ohu ya nọ n’elu ala anya. Ma ihe ndị Jọn hụrụ bụ ihe ndị e gosiri dị ka ihe àmà. (Mkpughe 1:1) N’ihi ya, olee ụzọ e si akọwa ọkụ, égbè eluigwe, olu, àmụ̀mà, na ala ọma jijiji ihe atụ ndị a taa?
7. (a) Ọkụ ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs sunyere n’elu ala n’oge ije ozi ya? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ụmụnna ime mmụọ Jisọs si sunye ọkụ n’ime Krisendọm?
7 N’otu oge, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Abịara m ịtụsa ọkụ n’elu ụwa.” (Luk 12:49) N’eziokwu, ọ mụnyere ọkụ n’ezie. Site ná nkwusa o ji ịnụ ọkụ n’obi mee, Jisọs mere ka Alaeze Chineke bụrụ isi ihe chere ndị Juu n’ihu, nke a kpalikwara oké nrụrịta ụka gburugburu mba ahụ. (Matiu 4:17, 25; 10:5-7, 17, 18) Na 1919, ụmụnna ime mmụọ Jisọs nọ n’elu ala, bụ́ òtù nta ahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ ndị gabigaworo oge ọnwụnwa nke Agha Ụwa Mbụ, mụnyere ọkụ yiri nke ahụ n’ime Krisendọm. Na September nke afọ ahụ, a hụtara mmụọ Jehova n’ụzọ pụrụ iche mgbe Ndịàmà ya kwesịrị ntụkwasị obi zukọtara site n’ebe dị iche iche na Cedar Point, Ohio, U.S.A. Joseph F. Rutherford, onye ọ na-adịbeghị anya a tọhapụrụ ya n’ụlọ mkpọrọ, onye a gajekwa ịkachapụ ebubo nile e boro ya n’oge na-adịghị anya, ji nkwuwa okwu gwa mgbakọ ahụ okwu, na-asị: “N’irube isi n’iwu Onyenwe anyị, n’ịghọtakwa ihe ùgwù na ọrụ dịịrị anyị ibuso ebe nile e wusiri ike nke ozizi ụgha agha, bụ́ nke nọworo ogologo oge na-ejide ndị mmadụ n’ịbụ ohu, ọrụ dịịrị anyị bụ, ọ kabụkwa ịkpọsa ọbịbịa nke alaeze Mesaịa ahụ dị ebube.” Nke ahụ bụ isi ihe—Alaeze Chineke!
8, 9. (a) Olee otú J. F. Rutherford si kọwaa àgwà na ọchịchọ nke ndị Chineke n’oge ihe isi ike nke afọ ndị ahụ a na-alụ agha? (b) Ò si aṅaa bụrụ na a tụbara ọkụ n’ime ụwa? (ch) Olee ụzọ égbè eluigwe, olu, àmụ̀mà, na ala ọma jijiji siworo mee?
8 N’izo aka n’ahụmahụ siri ike ndị Chineke nwere n’oge na-adịbeghị anya mgbe ahụ, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Mbuso agha nke onye iro ahụ siri ike nke ukwuu nke na e tighasịrị ọtụtụ n’ime atụrụ Onyenwe anyị uche, ha wee guzoro ná mgbagwoju anya, na-ekpe ekpere, na-echerekwa ka Onyenwe anyị gosipụta ihe bụ uche ya. . . . Ma n’agbanyeghị nkụda aka ahụ dịrị nwa oge, e nwere ọchịchọ na-ekpo ọkụ ịkpọsa ozi alaeze ahụ.”—Lee mbipụta September 15, 1919, nke Ụlọ Nche (Bekee), peji nke 280.
9 Na 1919, e mezuru ọchịchọ ahụ. A tụnyere ọkụ n’etiti ìgwè nta nke a nke ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike, ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, ịmalite ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:19.) A tụbara ọkụ n’ime ụwa n’ihi na Alaeze Chineke ghọrọ isiokwu na-ekpo ọkụ, ọ nọgidewokwa na-adị otú ahụ! Olu ndị dị ike nọchiri anya idere duu, na-akpọsa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ doro anya. Ịdọ aka ná ntị ndị yiri égbè eluigwe site na Bible dapụtara. Dị ka ìhè nke àmụ̀mà, ìhè na-egbukepụ egbukepụ nke eziokwu sitere n’Okwu amụma Jehova pụta, okpukpe nile makwara jijiji ruo ntọala ha dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’oké ala ọma jijiji. Òtù Jọn ahụ hụrụ na e nwere ọrụ a gaje ịrụ. Ruokwa taa, ọrụ ahụ nọgidere na-agbasa n’ụzọ dị ebube n’elu ala dum mmadụ bi!—Ndị Rom 10:18.
Ịkwadebe Maka Ụda Opi Ike Ndị Ahụ
10. Gịnị ka ndị mmụọ ozi asaa ahụ kwadebere ime, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
10 Jọn gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị nwere opi asaa ahụ doziri onwe ha ịfụ opi.” (Mkpughe 8:6) Gịnị ka ịfụ opi ndị ahụ pụtara? N’oge Israel, a na-eji ịfụ opi eme ihe ịka akara ụbọchị ndị dị mkpa ma ọ bụ ihe omume ndị kwesịrị ịrịba ama. (Levitikọs 23:24; 2 Ndị Eze 11:14) N’otu aka ahụ, ụda opi ndị ahụ Jọn gaje ịnụ ga-adọrọ uche gaa n’okwu ndị metụtara ndụ na ọnwụ.
11. Ọrụ nkwadebe dị aṅaa ka òtù Jọn ahụ nọ na-arụsi ike n’elu ala malite na 1919 ruo 1922?
11 Ka ndị mmụọ ozi ahụ na-adị njikere ịfụ opi ndị ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha nọkwa na-eduzi otu ọrụ nkwadebe n’elu ala. Malite na 1919 ruo 1922, òtù Jọn ahụ e nyeghachiworo ike nọ n’ọrụ n’ịhazighachi ozi ihu ọha ahụ na iguzobe ihe dị iche iche e ji ebipụta akwụkwọ. Na 1919, magazin ahụ bụ The Golden Age, nke a maara taa dị ka Teta!, abụrụwo nke a mụpụtara dị ka “Akwụkwọ nke Eziokwu, Olileanya, na Obi Ike”—ihe dị ka opi nke ga-arụ ọrụ dị mkpa n’ikpughe aka okpukpe ụgha na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
12. Gịnị ka ụda opi nke ọ bụla na-akọwapụta, na-echetara anyị gịnị banyere oge Mosis?
12 Dị ka anyị gaje ịhụ ugbu a, nke ọ bụla n’ime ụda opi ndị ahụ na-egosipụta ọnọdụ oké ihe omume ebe ihe otiti ndị jọgburu onwe ha na-emetụta akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ụfọdụ n’ime ndị a na-echetara anyị ihe otiti ndị ahụ Jehova zijere iji nye ndị Ijipt ahụhụ n’oge Mosis. (Ọpụpụ 7:19–12:32) Ndị a bụ ngosipụta nke ikpe Jehova megide mba ahụ, ha meghekwaara ndị Chineke ụzọ mgbapụ pụọ n’ịbụ ohu. Ihe otiti ndị ahụ Jọn hụrụ mezukwara ihe yiri nke ahụ. Otú ọ dị, ha abụghị ihe otiti efu. Ha bụ ihe àmà ndị sere onyinyo ikpe ezi omume nke Jehova.—Mkpughe 1:1.
Ịmata Ihe Bụ “Otu Ụzọ n’Ụzọ Atọ” Ahụ
13. Gịnị mere mgbe a fụrụ opi anọ ndị mbụ ahụ, ajụjụ dịkwa aṅaa ka nke a na-ewelite?
13 Dị ka anyị gaje ịhụ, mgbe a fụrụ opi anọ mbụ, ihe otiti bịakwasịrị “otu ụzọ n’ụzọ atọ” nke ụwa, nke oké osimiri, nke osimiri na isi iyi dị iche iche, nakwa nke ebe nile elu ala si enweta ìhè. (Mkpughe 8:7-12) Otu ụzọ n’ụzọ atọ bụ akụkụ buru ibu nke otu ihe ma ọ bụghị ihe ahụ dum. (Tụlee Aịsaịa 19:24; Ezikiel 5:2; Zekaraịa 13:8, 9.) Ya mere, olee “otu ụzọ n’ụzọ atọ” nke kasị kwesị ekwesị ịnata ihe otiti ndị a? Setan na mkpụrụ ya emewo ka ihe ka ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ kpuo ìsì, bụrụkwa ndị e merụrụ emerụ. (Jenesis 3:15; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ọnọdụ ahụ dị otú Devid si kọwaa ya, sị: “Ha nile ewezụgawo onwe ha; ha agbarụwo n’otu dị ka mmiri; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe, ọ dịghị ọbụna otu onye.” (Abụ Ọma 14:3) Ee, ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ n’ihe ize ndụ nke ịnata ajọ ikpe ọmụma. Ma ọ dị otu akụkụ nke ikpe mara karịsịa. Otu akụkụ—“otu ụzọ n’ụzọ atọ”—kwesịrị imeworị ihe dị iche! Gịnị bụ “otu ụzọ n’ụzọ atọ” ahụ?
14. Gịnị bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ ihe atụ ahụ nke ga-anata ozi ndị na-eweta ihe otiti site n’aka Jehova?
14 Ọ bụ Krisendọm! N’afọ ndị 1920, ebe ọ na-achị jikọtara ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Okpukpe ya bụ nke sitere n’oké ndapụ ahụ e nwere n’ezi Iso Ụzọ Kraịst—ndapụ ahụ nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya buru amụma ya. (Matiu 13:24-30; Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3; 2 Pita 2:1-3) Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-azọrọ na ha nọ n’ụlọ nsọ Chineke, na-egosipụtakwa onwe ha dị ka ndị ozizi nke Iso Ụzọ Kraịst. Ma ozizi ha nile ekwekọghị ma ọlị n’eziokwu Bible, ha nọgidekwara na-ewetara aha Chineke ịta ụta. N’ịbụ ndị e sere onyinyo ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’otu ụzọ n’ụzọ atọ ihe atụ ahụ, Krisendọm na-anata ozi ihe otiti kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka Jehova. Otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe a kpọrọ mmadụ ahụ ekwesịghị ịnata ihu ọma Chineke ma ọlị!
15. (a) Ụda nke ọ bụla n’ime opi ndị ahụ ò metụtara nanị otu afọ kpọmkwem? Kọwaa. (b) Olu ole ndị ka e jikọtaworo ha na nke òtù Jọn ahụ n’ịkpọsa ihe Jehova kpere n’ikpe?
15 N’ikwekọ n’onwunwe e nwere ọtụtụ ụda opi ike, e wepụtara mkpebi ndị pụrụ iche ná mgbakọ asaa e nwere site na 1922 ruo 1928. Ma a kpabereghị ịfụ opi ndị ahụ ókè nye nanị afọ ndị ahụ. Oké mkpughe nke ụzọ ọjọọ nile nke Krisendọm anọgidewo na-aga n’ihu n’ihu ka ụbọchị Onyenwe anyị na-agamikwu. A ghaghị ịkpọsazu ihe Jehova kpere n’ikpe n’ebe nile, nye mba nile, n’agbanyeghị ịkpọasị na mkpagbu nke mba nile na-eweta. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ọgwụgwụ nke usoro ihe nke Setan ga-abịa. (Mak 13:10, 13) Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na oké ìgwè mmadụ ahụ etinyekọtawo olu ha ugbu a na nke òtù Jọn ahụ n’ime mkpọsa ndị ahụ yiri égbè eluigwe, ndị dị mkpa nye ụwa dum.
A Gbara Otu Ụzọ n’Ụzọ Atọ nke Ụwa Ọkụ
16. Gịnị sochiri mgbe mmụọ ozi nke mbụ ahụ fụrụ opi ya?
16 N’ịkọ banyere ndị mmụọ ozi ahụ, Jọn dere, sị: “Onye mbụ wee fụọ opi, akụ mmiri igwe na ọkụ wee soo, nke a gwararịị ọbara, e wee tụba ha n’ụwa: ọkụ wee gbachasịa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa, ọkụ gbachasịkwara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke osisi, ọkụ gbachasịkwara ahịhịa ndụ nile.” (Mkpughe 8:7) Nke a yiri ihe otiti nke asaa e tiri Ijipt, ma gịnị ka ọ pụtara nye oge anyị?—Ọpụpụ 9:24.
17. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ “ụwa” sere onyinyo ya ná Mkpughe 8:7? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e si gbachasịa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa Krisendọm ọkụ?
17 N’ime Bible, okwu ahụ bụ “ụwa” na-ezokarị aka n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ dị. (Jenesis 11:1; Abụ Ọma 96:1) Ebe ihe otiti nke abụọ bịakwasịrị oké osimiri, bụkwa nke e jikọtara ya na ihe a kpọrọ mmadụ, “ụwa” aghaghị izo aka n’akụkụ ahụ kwụsiri ike karị nke òtù ụmụ mmadụ nke Setan wuliteworo, nke a gajekwa ibibi. (2 Pita 3:7; Mkpughe 21:1) Ọnọdụ ihe otiti ahụ na-ekpughe na e ji oké okpomọkụ nke enweghị nkwado Jehova rechapụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa, bụ́ Krisendọm. Ndị ya a maara aha ha—ndị na-eguzo dị ka osisi n’etiti ya—ka ọkụ gbachasịkwara site ná mkpọsa nke ajọ ikpe ọmụma Jehova. Ọtụtụ narị nde ndị chọọchị ya nile, ma ọ bụrụ na ha anọgide na-akwado okpukpe Krisendọm, ga-eyi ahịhịa rere ọkụ, bụ́ ndị fịkpọsịrị afịkpọ n’ụzọ ime mmụọ n’anya Chineke.—Tụlee Abụ Ọma 37:1, 2.a
18. Olee ụzọ e si kpọsaa ozi amamikpe nke Jehova ná mgbakọ Cedar Point ahụ e mere na 1922?
18 Olee otú e si ezisa ozi amamikpe nke a? N’ụzọ bụ isi, ọ bụghị site n’ụzọ mgbasa ozi nke ụwa, nke bụ akụkụ nke ụwa, na-ewetakarịkwa nkọcha n’ebe “ohu” Chineke nọ. (Matiu 24:45) A kpọsara ya n’ụzọ pụtara ìhè n’oké mgbakọ nke abụọ nke ndị Chineke mere na Cedar Point, Ohio, na September 10, 1922. Ndị a jikọrọ aka were oké ịnụ ọkụ n’obi nakwere otu nkwupụta okwu nke isiokwu ya bụ “Ihe Ịma Aka Nye Ndị Ndú Ụwa.” Ná nkwupụta okwu pụtara ìhè, ọ gbaara ụwa àmà n’ụzọ dị otú a: “N’ihi nke a, anyị na-akpọku mba nile nke ụwa, ndị ọchịchị ha na ndị ndú ha, na-akpọkukwa ndị ụkọchukwu nile nke òtù chọọchị dị iche iche dị n’elu ụwa, ndị na-eso ha na ndị enyi ha, ndị eze ahịa na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ukwu, iwepụta ihe àmà na-akwado nzọrọ ha na-azọrọ na ha pụrụ iguzobe udo na ihe ịga nke ọma n’elu ala, wetakwara ndị mmadụ obi ụtọ; ọ bụrụkwa na ha apụghị ime nke a, anyị na-akpọku ha ka ha gee ntị n’àmà anyị na-agba dị ka ndịàmà nke Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ka ha kwuo ma àmà anyị na-agba ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị.”
19. Àmà dị aṅaa ka ndị Chineke gbaara Krisendọm banyere Alaeze Chineke?
19 Àmà dị aṅaa ka ndị Kraịst ndị a gbara? Ọ bụ nke a: “Anyị kwere, na-ekwupụtakwa na alaeze Mesaịa bụ ngwọta zuru ezu nye nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, na ọ ga-ewetakwa udo n’elu ala nakwa ihe ịga nke ọma nye ụmụ mmadụ, bụ́ ọchịchọ nke mba nile; na a ga-eji udo na-adịgide adịgide, ndụ, inwere onwe na obi ụtọ ebighị ebi gọzie ndị nile ji ọchịchọ onwe ha doo onwe ha n’okpuru ọchịchị ezi omume ya nke maliteworo ugbu a.” N’oge ndị a rụrụ arụ, mgbe ọchịchị ụmụ mmadụ, karịsịa ndị dị na Krisendọm, na-akụ afọ n’ala ná mgbalị ha inweta azịza nye ihe ịma aka nile na-eche ha ihu kwa ụbọchị, ihe ịma aka ahụ yiri ụda opi ike na-adapụta nnọọ n’ụzọ dị ike ọbụna karị otú o mere na 1922. Lee nnọọ ka o si bụrụ eziokwu na Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst ya na-enwe mmeri bụ nanị otu olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere!
20. (a) Site n’ụzọ dị aṅaa ka ọgbakọ ahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ siworo kpọsaa ozi amamikpe na 1922 nakwa mgbe nke ahụ gasịrị? (b) Gịnị ka nke ahụ pụtara n’ime Krisendọm malite n’ụda opi nke mbụ ahụ?
20 Site ná nkwupụta okwu, traktị, akwụkwọ nta, akwụkwọ ukwu, magazin, na okwu ihu ọha dị iche iche, a kpọsara nkwupụta nke a na ndị e mere mgbe nke a gasịrị site n’aka ọgbakọ ahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ. Opi nke mbụ rụpụtara ihe otiti e tiri Krisendọm dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’oké akụ mmiri igwe. E kpughewo ikpe ọbara nke mara ya, n’ihi òkè o keere n’agha nile nke narị afọ nke 20, e gosipụtawokwa na o kwesịrị ịnata ngosipụta kpụ ọkụ n’ọnụ nke oké iwe Jehova. Òtù Jọn ahụ, sitekwa ná nkwado ha mesịrị nweta n’aka oké ìgwè mmadụ ahụ, anọgidewo na-ekwupụtaghachi ụda opi nke mbụ ahụ, na-adọrọ uche gaa n’ụzọ Jehova si ele Krisendọm anya, dị ka ihe kwesịrị mbibi.—Mkpughe 7:9, 15.
Dị Ka Oké Ugwu Na-ere Ọkụ
21. Gịnị mere mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụrụ opi ya?
21 “Mmụọ ozi nke abụọ wee fụọ opi, e wee tụba ihe dị ka oké ugwu nke na-ere ọkụ n’ime oké osimiri: otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oké osimiri wee ghọọ ọbara; otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe nile e kere eke nke dị n’oké osimiri wee nwụọ, bụ́ ihe nwere ndụ; e mebikwara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụgbọ nile.” (Mkpughe 8:8, 9) Gịnị ka ọnọdụ nke a na-eyi egwu sere onyinyo ya?
22, 23. (a) Nkwupụta okwu dị aṅaa ka ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ihe sitere n’ọfụfụ nke opi nke abụọ ahụ? (b) Gịnị ka “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oké osimiri” nọchiri anya ya?
22 Anyị pụrụ ịghọta ya n’ụzọ kasị mma site n’iburu n’uche mgbakọ ahụ ndị Jehova nwere na Los Angeles, California, U.S.A., n’August 18-26, 1923. Okwu bụ́ isi nke J. F. Rutherford kwuru n’ehihie Saturday bụ n’isiokwu bụ́ “Atụrụ na Ewu.” A kọwara “atụrụ” ahụ n’ụzọ doro anya dị ka ndị ahụ nwere obi ezi omume ndị ga-eketa ala nke ga-adị n’okpuru Alaeze Chineke. Otu nkwupụta okwu nke sochiri ya dọọrọ uche gaa n’ihu abụọ nke “ndị ụkọchukwu si n’ezi ofufe dapụ na ‘ndị isi n’etiti ìgwè atụrụ ha,’ bụ́ ndị ụwa nwere ego dị ukwuu na ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” Ọ kpọkuru “oké ìgwè mmadụ ndị hụrụ udo na ihe ịga n’usoro n’anya, bụ́ ndị nọ n’òtù chọọchị dị iche iche . . . ikewapụ onwe ha site n’usoro ịrọ òtù ajọ omume dị iche iche ndị Onyenwe anyị kpọrọ ‘Babilọn’” wee kwadebe onwe ha “ịnata ngọzi nile nke alaeze Chineke.”
23 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nkwupụta okwu ahụ bịara dị ka ihe si n’ọfụfụ nke opi nke abụọ ahụ pụta. Ndị ga-emesịa zaa òkù ahụ ga-ekewapụ onwe ha n’ebe ndị ahụ Aịsaịa kọwara n’okwu ndị a nọ: “Ma ndị na-emebi iwu dị ka oké osimiri nke na-amagharị amagharị: n’ihi na ọ pụghị ịdị jụụ, mmiri ya na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.” (Aịsaịa 57:20; 17:12, 13) Otú a, “oké osimiri” ahụ sere nnọọ onyinyo òtù ụmụ mmadụ ndị na-enweghị ozuzu ike, ndị ahụ na-erughị ala na ndị na-enupụ isi, bụ́ ndị na-akpalikwa nsogbu na ọgba aghara. (Tụlee Mkpughe 13:1.) Oge ga-abịa mgbe “oké osimiri” ahụ na-agaghị adịkwa ọzọ. (Mkpughe 21:1) Ka ọ dị ugbu a, mgbe a fụrụ opi nke abụọ ahụ, Jehova kwupụtara ikpe ọmụma ya megide otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ya—akụkụ ahụ nọ n’ọgba aghara nke nọ n’okpuru ọchịchị Krisendọm n’onwe ya.
24. Gịnị ka ihe ahụ yiri oké ugwu nke na-ere ọkụ nke a tụbara n’ime oké osimiri sere onyinyo ya?
24 A tụbara otu ihe yiri oké ugwu na-ere ọkụ n’ime “oké osimiri” nke a. N’ime Bible, a na-ejikarị ugwu eme ihe nnọchianya nke ọchịchị dị iche iche. Dị ka ihe atụ, e sere onyinyo Alaeze Chineke dị ka otu oké ugwu. (Daniel 2:35, 44) Babilọn na-emebi iwu ghọrọ “ugwu e surere esure.” (Jeremaịa 51:25) Ma ihe ahụ yiri oké ugwu nke Jọn hụrụ ka na-ere ọkụ. Ntụba a tụbara ya n’ime oké osimiri ahụ ga-abụ ihe nnọchianya nke otú okwu banyere ọchịchị si ghọọ isiokwu na-ere ọkụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ n’oge agha ụwa mbụ na mgbe ọ gasịrị, karịsịa n’etiti mba ndị nke Krisendọm. N’Itali, Mussolini webatara ọchịchị aka ike nke Fascism. Germany nabatara ọchịchị ndị Nazi nke Hitler, ebe mba ndị ọzọ nwalere ụdị dị iche iche nke ọchịchị ndị socialist. E nwere oké mgbanwe na Russia, mgbe mgbanwe ọchịchị ndị Bolshevik rụpụtara mba ndị Kọmunist nke mbụ, nke ihe si na ya pụta bụ na ndị ndú okpukpe Krisendọm enwekwaghị ike na mmetụta ọ bụla n’ebe ha nweburu ọnọdụ siri ike.
25. N’ụzọ dị aṅaa ka ọchịchị si nọgide bụrụ ihe na-ese okwu mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị?
25 Nnwale ọchịchị ndị Fascist na nke ndị Nazi danyụrụ mgbe agha ụwa nke abụọ tiwapụrụ, ma ọchịchị nọgidere na-abụ isiokwu na-ere ọkụ, oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ nọgidekwara na-amagharị, na-atụpụtakwa ụdị ọchịchị ọhụrụ dị iche iche. N’iri afọ ndị sochiri afọ 1945, e guzobewo ndị a n’ọtụtụ ebe, dị ka China, Vietnam, Cuba, na Nicaragua. Na Gris, nnwale e mere n’ọchịchị aka ike nke ndị agha dakpọrọ adakpọ. Na Kampuchea (Cambodia), nnwale a nwalere ọchịchị ndị Kọmunist nke metụtara akụkụ ndụ nile rụpụtara ọnwụ nke ihe karịrị nde mmadụ abụọ.
26. N’ụzọ dị aṅaa ka ‘oké ugwu ahụ na-ere ọkụ’ siworo nọgide na-agbarụ oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ?
26 ‘Oké ugwu ahụ nke na-ere ọkụ’ nọgidere na-agbarụ oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ. A kọwo akụkọ banyere ndọrọ ndọrọ ndị a na-enwe banyere ọchịchị n’Africa, kọntinent ndị dị n’America, Esia, na agwaetiti nile nke Pacific. Ọtụtụ n’ime ndọrọ ndọrọ ndị a ewerewo ọnọdụ n’ala ndị Krisendọm ma ọ bụ ebe ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm tinyeworo aka na ndọrọ ndọrọ ndị ahụ. Ọbụna ndị ụkọchukwu Roman Katọlik sonyeere òtù ndị agha nzuzo ndị Kọmunist dị iche iche, sorokwa ha lụọ ọgụ dị ka ndị òtù ha. N’otu mgbe ahụ, òtù okwuchukwu dị iche iche nke ndị Protestant rụkwara ọrụ na Central America iji megide ihe ha kpọrọ ‘oké ọchịchọ obi ọjọọ ndị Kọmunist nwere iji nwetakwuo ike.’ Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime nnugharị ndị a nile na-eme n’oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ wetaworo udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.—Tụlee Aịsaịa 25:10-12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.
27. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oké osimiri” siworo ghọọ ọbara? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ‘otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe e kere eke dị n’ime oké osimiri’ ahụ si nwụọ, gịnị ga-emekwa “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụgbọ nile”?
27 Ụda opi nke abụọ ahụ na-ekpughe na ikpe ọbara mara mmadụ ndị ahụ tinyere aka ná mburịta agha nke ịgbanwe ọchịchị n’ike kama ido onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke. Karịsịa, “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oké osimiri” nke Krisendọm na-elekọta aghọwo ọbara. Ihe nile dị ndụ n’ime ya nwụrụ anwụ n’anya Chineke. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime òtù ndị ahụ isi na-anụ ọkụ, bụ́ ndị na-esegharị n’elu otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ nke oké osimiri pụrụ izere mbibi nke na-aghaghị ịbịa. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na ọtụtụ nde mmadụ ndị yiri atụrụ azawo òkù ahụ yiri ụda opi ike ikewapụ onwe ha site ná ndị ahụ ka na-asọgharị ìsì n’enweghị olileanya, ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ maka mba ha dị iche iche, na ikpe ọmụma ọbara nke oké osimiri ahụ!
Kpakpando Wee Site n’Eluigwe Daa
28. Gịnị mere mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ya?
28 “Mmụọ ozi nke atọ wee fụọ opi, oké kpakpando wee site n’eluigwe daa, nke na-ere ọkụ dị ka ọwa, o wee daa n’elu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke osimiri nile, daakwa n’elu isi iyi mmiri nile; aha a na-akpọkwa kpakpando ahụ bụ Wormwood: otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmiri nile wee ghọọ wormwood; ọtụtụ mmadụ wee site n’ịṅụ mmiri ahụ nwụọ, n’ihi na e mere ka ha na-elu ilu.” (Mkpughe 8:10, 11) Ọzọkwa, akụkụ ndị ọzọ nke Bible na-enyere anyị aka ịhụta nkọwa nke akụkụ akwụkwọ nsọ nke a n’ime ụbọchị Onyenwe anyị.
29. Gịnị mezuru ihe atụ nke ‘oké kpakpando nke na-ere ọkụ dị ka ọwa,’ ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
29 Anyị ahụworị ihe nnọchianya nke kpakpando n’ozi ndị ahụ Jisọs zijeere ọgbakọ asaa ndị ahụ, n’ebe kpakpando asaa ahụ sere onyinyo ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị ahụ.b (Mkpughe 1:20) “Kpakpando” ndị e tere mmanụ, ha na ndị ọzọ nile so ná ndị e tere mmanụ, na-ebi n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ụzọ ime mmụọ malite n’oge e ji mmụọ nsọ kaa ha akara dị ka ihe àmà nke ihe nketa eluigwe ha. (Ndị Efesọs 2:6, 7) Otú ọ dị, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na a ga-esite n’etiti ndị ahụ yiri kpakpando nwee ndị dapụrụ n’ezi ofufe, ndị na-arọ òtù, ndị ga-eduhie ìgwè atụrụ ahụ. (Ọrụ 20:29, 30) Ekwesịghị ntụkwasị obi dị otú ahụ ga-arụpụta oké ndapụ n’ezi ofufe, ndị okenye ndị a dapụworonụ ga-emejupụtakwa onye ahụ na-emebi iwu nke ọtụtụ ndị mejupụtara, onye ga-ebuli onwe ya elu gaa n’ọnọdụ yiri nke Chineke n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 4) E mezuru ịdọ aka ná ntị Pọl mgbe ndị ụkọchukwu Krisendọm pụtara n’ebe a ga-ahụ ha anya n’ime ụwa. E sere onyinyo nke ìgwè ndị a n’ụzọ ziri ezi dị ka ‘oké kpakpando nke na-ere ọkụ dị ka ọwa.’
30. (a) Gịnị ka e bu n’uche mgbe a gwara eze Babilọn okwu dị ka onye siworo n’eluigwe daa? (b) Na gịnị ka isi n’eluigwe daa pụrụ izo aka?
30 Jọn hụrụ kpakpando nke a ka ọ na-ada site n’eluigwe. N’ụzọ dị aṅaa? Ahụmahụ ndị otu eze oge ochie nwere na-enyere anyị aka ịghọta ya. Mgbe ọ na-agwa eze Babilọn okwu, Aịsaịa kwuru, sị: “Lee, otú i siworo n’eluigwe daa, gị Lusifa, nwa chi ọbụbọ! Lee, otú e gbutuworo gị n’ala, gị onye na-eme ka ike gwụ mba nile!” (Aịsaịa 14:12) E mezuru amụma nke a mgbe usuu ndị agha nke Saịrọs kwaturu Babilọn, eze ya wee rịdatakwa n’ike site n’ọnọdụ nke ịchị ụwa dum gaa ná mmeri na-eweta ihere. Otú a, ọdịda site n’eluigwe pụrụ izo aka n’ọnọdụ dị oké elu ifunarị mmadụ o wee daba n’ọnọdụ ihere.
31. (a) Olee mgbe ndị ndú okpukpe Krisendọm sitere n’ọnọdụ “dị n’eluigwe” daa? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka mmiri ndị ndú okpukpe na-enye ụmụ mmadụ siworo ghọọ “wormwood,” gịnịkwa ka nke a pụtawooro ọtụtụ ndị?
31 Mgbe ndị ụkọchukwu Krisendọm dapụrụ site n’ezi Iso Ụzọ Kraịst, ha dara site n’ebe ahụ “dị n’eluigwe” nke Pọl kọwara ná Ndị Efesọs 2:6, 7. Kama inye mmiri nke eziokwu na-enye ume ndụ, ihe ha nyere bụ “wormwood,” okwu ụgha ndị dị ilu dị ka ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, Atọ n’Ime Otu, na ọdịnihu a kara aka; ọzọkwa, ha dubara mba dị iche iche n’agha, wee ghara iwulite ha elu dị ka ndị ohu Chineke nwere ezi àgwà. Gịnị si na nke a pụta? Ime ndị kwenyere n’okwu ụgha ndị ahụ nsí n’ụzọ ime mmụọ. Ọnọdụ ha yiri nke ndị Israel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’oge Jeremaịa, ndị Jehova gwara, sị: “Lee, m gaje ime ka ha rie wormwood, m ga-emekwa ka ha ṅụọ mmiri nsí; n’ihi na site ná ndị amụma nke Jerusalem ka mmerụ pụworo jeruo ala nke a nile.”—Jeremaịa 9:15; 23:15.
32. Olee mgbe ọdịda Krisendọm dara site n’eluigwe nke ime mmụọ pụtara ìhè, oleekwa ụzọ e si mee ka ọ pụtakwuo ìhè?
32 Ọdịda nke a site n’eluigwe ime mmụọ pụtara ìhè n’afọ 1919 mgbe ọ bụ ihe nta ahụ fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ, kama ịbụ ndị ụkọchukwu Krisendọm, ka e nyere ọrụ ilekọta ọdịmma nile nke Alaeze. (Matiu 24:45-47) Sitekwa na 1922, ọdịda ahụ pụtakwuru ìhè mgbe ìgwè ndị Kraịst ndị a maliteghachiri mkpọsa ha nke ikpughe njehie nile nke ndị ụkọchukwu Krisendọm n’atụghị egwu.
33. Mkpughe dị aṅaa ka e kpughere ndị ndú okpukpe Krisendọm ná mgbakọ ahụ e mere na 1924 na Columbus, Ohio, U.S.A.?
33 Otu nke pụtakarịsịrị ìhè bụ mkpọsa ahụ e mere n’ihe magazin bụ The Golden Age kọwara dị ka “mgbakọ kachasị ukwuu Ndị Mmụta Bible nweworo n’ọgbọ nile.” E mere mgbakọ nke a na Columbus, Ohio, na July 20-27, 1924. N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na ọ bụ ná nduzi nke mmụọ ozi ahụ onye fụrụ opi nke atọ ahụ, a nọ n’ebe ahụ nabata otu nkwupụta okwu, mesịakwa kesaa 50 nde dị ka traktị. E bipụtara ya n’okpuru isiokwu bụ Ecclesiastics Indicted. Otu isiokwu nta wepụtara ihe iseokwu bụ: “Mkpụrụ nke Nkwa ahụ Megide Mkpụrụ nke Agwọ Ahụ.” Okwu Ebubo ahụ n’onwe ya kpughere ndị ụkọchukwu Krisendọm kpam kpam n’okwu ndị dị ka nnara ha na-anara oké ùtú aha okpukpe, omume ha na-eme ndị eze ahịa na ndị ọrụ ha bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị bụ isi n’etiti ìgwè atụrụ ha, ọchịchọ ha nwere ịbụ ndị na-egbu mara mara n’ihu mmadụ, na ọjụjụ ha jụrụ ikwusara ndị mmadụ ozi nke Alaeze Mesaịa. O mesiri ya ike na Chineke nyere onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye iwu ịkpọsa “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere; ịkasi ndị nile na-eru újú obi.”—Aịsaịa 61:2.
34, 35. (a) Gịnị meworo ikike na mmetụta ndị ndú okpukpe nwere kemgbe mmụọ ozi nke atọ ahụ malitere ịfụ opi ya? (b) Gịnị ka ọdịnihu ga-abụrụ ndị ndú okpukpe Krisendọm?
34 Kemgbe mmụọ ozi nke atọ ahụ malitere ịfụ opi ya, ọnọdụ dị elu nke ndị ụkọchukwu nwere n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ anọgidewo na-adakpọ ruo, n’oge na n’ọgbọ nke a, ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha ka nwere ike nke ndị yiri chi ndị ha nwere na narị afọ ndị gara aga. N’ihi nkwusa nke Ndịàmà Jehova, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu aghọtawo na ọtụtụ ozizi ndị ụkọchukwu na-ezi bụ nsí ime mmụọ—“wormwood.” Ọzọ, n’ebe ugwu nke Europe, ọ fọrọ ntakịrị ka ike ndị ụkọchukwu gwụsịa kpam kpam, n’ụfọdụ mba ndị ọzọ, ndị ọchịchị na-ebelatakwa ike ha n’ụzọ dị ukwuu. Ná mba ndị Katọlik dị na Europe nakwa na kọntinent ndị dị n’America, omume mmekpu ndị ụkọchukwu n’ihe banyere ego, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na akparamagwa emechuwo ha ihu. Site ugbu a gaa n’ihu, ọnọdụ ha ga-anọgide na-adịwanye nanị njọ, ebe ọ bụ na n’oge na-adịghị anya otu ihe ahụ dabaara ndị okpukpe ụgha nile ọzọ gaje ịdabara ha.—Mkpughe 18:21; 19:2.
35 Ihe otiti Jehova gaje iti Krisendọm agwụchabeghị. Tụlee ihe merenụ mgbe a fụrụ opi nke anọ ahụ.
Ọchịchịrị!
36. Gịnị mere mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ya?
36 “Mmụọ ozi nke anọ wee fụọ opi, e wee tie otu ụzọ n’ụzọ atọ nke anyanwụ ihe, ya na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ọnwa, na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nile; ka otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha wee gbaa ọchịchịrị, ka ehihie wee gharakwa ịpụta ìhè n’otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ya, ka ọchịchịrị wee meekwa otú a.” (Mkpughe 8:12) Ihe otiti nke itoolu bịakwasịrị ndị Ijipt bụ ihe otiti nke ọchịchịrị efu. (Ọpụpụ 10:21-29) Ma gịnị bụ ọchịchịrị ihe atụ nke a nke ga-abịa iti ụmụ mmadụ ihe otiti?
37. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ozi bụ Pita na Pọl si kọwaa ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ahụ na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst?
37 Pita onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya na ha nọbu n’ọchịchịrị, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, tupu ha aghọọ ndị Kraịst. (1 Pita 2:9) Pọl jikwara okwu ahụ bụ “ọchịchịrị” mee ihe n’ịkọwa ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ahụ na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 5:8; 6:12; Ndị Kọlọsi 1:13; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:4, 5) Ma gịnị banyere ndị ahụ nọ na Krisendọm, ndị na-azọrọ na ha kwere na Chineke, na-asịkwa na ha nakweere Jisọs dị ka Onye Nzọpụta ha?
38. Eziokwu dị aṅaa ka mmụọ ozi nke anọ ahụ na-etiwapụta ná mkpu banyere “ìhè” nke Krisendọm?
38 Jisọs kwuru na a ga-amara ezi ndị Kraịst site ná mkpụrụ ha, na ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya ga-abụkwa “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:15-23) Ọ dịghị onye ọ bụla lekwasịrị mkpụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ ụwa nke Krisendọm anya nke pụrụ ịgọpụ na ọ na-asọgharị ìsì n’ime oké ọchịchịrị ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ kasị kwesị ekwesị ịnata ịta ụta, n’ihi na ọ na-azọrọ na ya bụ òtù ndị Kraịst. N’ihi nke a, ọ bụ ihe ziri ezi na mmụọ ozi nke anọ ahụ ga-etiwapụta eziokwu ahụ bụ na “ìhè” nke Krisendọm bụ, n’eziokwu, ọchịchịrị, ihe ya ndị na-enyekwa “ìhè” bụkwa nke ndị Babilọn—nke na-abụghị nke ndị Kraịst.—Mak 13:22, 23; 2 Timoti 4:3, 4.
39. (a) Olee ụzọ nkwupụta okwu ahụ a nabatara ná mgbakọ e mere na 1925 si kọwaa ìhè na-abụghị ezie nke Krisendọm na-egosi? (b) Mkpughe ọzọ dị aṅaa ka e mere na 1955?
39 N’ikwekọ ná mkpọsa ahụ e mere n’eluigwe, oké ìgwè ndị Chineke zukọrọ ná mgbakọ e nwere n’Indianapolis, Indiana, U.S.A., n’August 29, 1925, wee nakwere mbipụta nke nkwupụta okwu ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nke isiokwu ya bụ “Ozi nke Olileanya.” Ọzọkwa, e kesara ihe dị ka 50 nde mkpụrụ n’asụsụ dị iche iche. Ọ kọwara ìhè ụgha nke njikọ ndị na-achọ oké uru n’azụmahịa, ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị ndú okpukpe na-egosi, bụ́ nke mere ka “ndị mmadụ daba n’ime ọchịchịrị.” O zokwara aka n’Alaeze Chineke dị ka ezi olileanya maka ịnata “ngọzi nile nke udo, ihe ịga nke ọma, ahụ ike, ndụ, inwere onwe na obi ụtọ ebighị ebi.” Ọ chọrọ obi ike n’aka ìgwè nta ahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ iji kpọsaa ozi ndị dị otú ahụ megide nnukwute nzukọ nke Krisendọm. Ma n’esepụghị aka, site ná mmalite nke afọ ndị 1920 ruo ugbu a, ha anọgidewo na-eme otú ahụ. N’oge ndị na-adịbeghị anya hie nne, na 1955, e mere mkpughe ọzọ nke òtù ndị ndú okpukpe site ná nkesa zuru ụwa ọnụ n’ọtụtụ asụsụ nke akwụkwọ nta ahụ isiokwu ya bụ Christendom or Christianity—Which One Is “the Light of the World”? Taa, ihu abụọ nke Krisendọm apụtawo ìhè nke na ọtụtụ ndị n’ime ụwa pụrụ ịhụ ya n’onwe ha. Ma ndị Jehova akwụsịbeghị ịgbaba ya ọtọ iji gosi ihe ọ bụ n’ezie: alaeze nke ọchịchịrị.
Ugo Na-efe Efe
40. Gịnị ka ụda opi anọ ahụ gosiri na Krisendọm bụ?
40 N’ezie, ụda opi anọ mbụ ndị a kpughere ọnọdụ ịtọgbọrọ n’efu na-akpata ọnwụ nke Krisendọm nọ na ya. E kpughere akụkụ ya nke “ụwa” dị ka nke kwesịrị ịnata amamikpe Jehova. E gosipụtara na ọchịchị ọgbara ọhụrụ ndị na-ebilitesị n’ala dị iche iche ebe ọ na-achị nakwa n’ebe ndị ọzọ na-emegide ndụ ime mmụọ. A gbabara ọnọdụ dara ada nke ndị ndú ya ọtọ, e kpughekwara oké ọchịchịrị dị n’ọnọdụ ime mmụọ ya ka mmadụ nile wee hụ. Krisendọm bụ n’ezie akụkụ usoro ihe Setan nke kasị kwesị ịnata ịta ụta.
41. Mgbe e nwere nkwụsị nwa oge n’usoro ọfụfụ opi ndị ahụ, gịnị ka Jọn hụrụ, nụkwa?
41 Gịnị ọzọ ka a gaje ikpughe? Tupu anyị achọta azịza nye ajụjụ nke a, e nwere obere nkwụsị n’usoro ọfụfụ opi ndị ahụ. Jọn kọwara ihe ọzọ ọ hụrụ, sị: “M wee hụ, nụkwa otu ugo, ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, werekwa oké olu sị, Ahụhụ, ahụhụ, ahụhụ, ka ha ga-ahụ, bụ́ ndị bi n’elu ụwa, site n’olu fọdụrụ nke opi ndị mmụọ ozi atọ ahụ, ndị gaje ịfụ opi.”—Mkpughe 8:13.
42. Gịnị ka ugo ahụ na-efe efe pụrụ ise onyinyo ya, ozi dịkwa aṅaa ka ọ na-akpọsa?
42 Ugo na-efe n’ebe dị elu n’ime mbara igwe, ka ndị nọ n’ebe dị anya nwee ike ịhụ ya. O nwere ike ịhụ ụzọ pụrụ iche, ọ pụkwara ịhụ ihe dị n’ebe dị anya n’ihu ya. (Job 39:29) Ugo na-efe efe sere onyinyo otu n’ime ihe anọ ahụ dị ndụ ndị yiri cherub, ndị dị gburugburu ocheeze Chineke. (Mkpughe 4:6, 7) Ma ọ̀ bụ cherub nke a ma ọ bụ onye ozi ọzọ nke Chineke nke nwere ike ịhụ ihe dị anya, ọ na-akpọsa ozi dị ike: “Ahụhụ, ahụhụ, ahụhụ”! Ka ndị nile bi n’elu ala rịba ama, ka a na-anụ ụda nke opi atọ ndị ahụ fọdụrụnụ, e jikọtara nke ọ bụla n’ime ha na otu n’ime ahụhụ ndị a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ụzọ megidere nke a, Mkpughe 7:16 gosiri na oké ìgwè mmadụ ahụ adịghị enweta oké okpomọkụ nke enweghị nkwado Jehova.
b Ọ bụ ezie na kpakpando asaa ahụ ndị dị n’aka nri Jisọs sere onyinyo ndị nlekọta e tere mmanụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ndị okenye nọ n’ihe ka ọtụtụ n’ihe karịrị 100,000 ọgbakọ dị n’ụwa taa so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. (Mkpughe 1:16; 7:9) Gịnị bụ ọnọdụ ha? Ebe ha na-enweta nhọpụta ha site ná mmụọ nsọ site n’aka òtù ohu ahụ e tere mmanụ nke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nweekwa uche, a pụrụ ikwu na ndị a nọ n’okpuru aka nri nduzi nke Jisọs, n’ihi na ha bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru. (Aịsaịa 61:5, 6; Ọrụ 20:28) Ha na-akwado “kpakpando asaa” ahụ n’ihi na ha na-eje ozi n’ebe ụmụnna e tere mmanụ ndị ruru eru na-anọghị ya.
[Chaatị dị na peeji nke 139]
E Kpughere na Mmiri Nile nke Krisendọm Bụ Wormwood
Nkwenkwe na Àgwà Krisendọm Ihe Bible Kwuru n’Ezie
Ezigbo aha Chineke adịghị Jisọs kpere ekpere ka e doo
mkpa: “Iji aha onwe onye ọ aha Chineke nsọ. Pita sịrị:
bụla mee ihe banyere onye ahụ “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha
nanị ya bụ Chineke . . . [Jehova, NW], a ga-azọpụta ya.”
ekwesịghị ekwesị ma ọlị maka (Ọrụ 2:21; Joel 2:32; Matiu 6:9;
okwukwe zuru ụwa ọnụ nke Ọpụpụ 6:3; Mkpughe 4:11;15:3;19:6)
Chọọchị ndị Kraịst.”
(Okwu nkọwa dị na Revised
Standard Version)
Chineke bụ Atọ n’Ime Otu: Bible kwuru na Jehova ka Jisọs
“Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ukwuu, bụrụkwa Chineke na isi nke
ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụ Kraịst. (Jọn 14:28; 20:17; 1 Ndị
Chineke, ma e nweghị Chineke Kọrint 11:3) Mmụọ nsọ bụ ike ịrụ
atọ, kama nanị otu Chineke.” ọrụ nke Chineke. (Matiu 3:11;
(The Catholic Encyclopedia, Luk 1:41; Ọrụ 2:4)
mbipụta nke 1912)
Mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ Mmadụ bụ mkpụrụ obi. Mgbe mmadụ
anwụ: “Mgbe mmadụ nwụrụ, a nwụrụ, mkpụrụ obi ahụ na-akwụsị
na-ekewa mkpụrụ obi na anụ iche echiche ma ọ bụ inwe mmetụta
ahụ ya. Anụ ahụ ya . . . wee laghachi n’ájá, bụ́ ebe e si
na-ere ure . . . Otú ọ dị, mee ya. (Jenesis 2:7; 3:19;
mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ Abụ Ọma 146:3, 4;
anwụ.” (What Happens After Eklisiastis 3:19, 20; 9:5, 10;
Death, akwụkwọ ndị Roman Ezikiel 18:4, 20)
Katọlik na-ebipụta)
A na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,
mgbe ha nwụsịrị na hell: “Dị ọ bụghị
ka nkwenkwe ọdịnala ndị ịdị ndụ n’ahụhụ. (Ndị Rom 6:23)
Kristian si dị, hell bụ ebe a Hell (Hedis, Sheol) bụ ebe ndị
na-enweta ahụhụ na ihe mgbu nwụrụ anwụ na-ezuru ike n’amaghị
na-adịghị agwụ agwụ.” ihe ọ bụla, na-echere mbilite
(The World Book Encyclopedia, n’ọnwụ. (Abụ Ọma 89:48;
mbipụta nke 1987) Jọn 5:28, 29; 11:24, 25;
“E ji ùtú aha ahụ bụ́ Onye Nanị onye ogbugbo e nwere n’etiti
Ogbugbo Nwanyị mee ihe banyere Chineke na mmadụ bụ Jisọs.
Nne Anyị Ukwu.” (Jọn 14:6; 1 Timoti 2:5;
(New Catholic Encyclopedia, Ndị Hibru 9:15; 12:24)
mbipụta nke 1967)
E kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ Baptism bụ maka ndị e meworo ka ha
baptism: “Maliterị na mbụ, bụrụ ndị na-eso ụzọ, ndị e
Chọọchị anọgidewo na-enye ziwokwara irubere ihe nile Jisọs
ụmụaka Sakrament nke Baptism. nyere n’iwu isi. Iji ruo eru ime
Ọ bụghị nanị na e lere omume baptism, mmadụ aghaghị ịghọta Okwu
a anya dị ka ihe ziri ezi Chineke ma gosipụta okwukwe ya.
n’iwu, kama e chekwara na ọ (Matiu 28:19, 20; Luk 3:21-23;
dị nnọọ mkpa maka nzọpụta.” Ọrụ 8:35, 36)
(New Catholic Encyclopedia,
mbipụta nke 1967)
E kewara ọtụtụ chọọchị gaa Ndị Kraịst nile nke narị afọ mbụ
n’òtù ndị nkịtị na nke ndị bụ ndị na-eje ozi, na-ekerekwa òkè
ụkọchukwu, bụ́ ndị na-ezi ndị n’ikwusa ozi ọma ahụ.
nkịtị ihe. A na-akwụkarị ndị (Ọrụ 2:17, 18; Ndị
ụkọchukwu ụgwọ ọnwa n’ihi ozi Rom 10:10-13; 16:1) Onye Kraịst
ha na-eje, na-ebulikwa ha elu kwesịrị ‘inye n’efu,’ ọ bụghị inye
gabiga ndị nkịtị site n’ùtú ka e wee kwụọ ya ụgwọ ọnwa.
aha ndị dị ka “Reverend,” (Matiu 10:7, 8) Jisọs kwusiri okwu
“Fada,” ma ọ bụ ike megide iji ùtú aha okpukpe eme
“His Eminence.” ihe. (Matiu 6:2 23:2-12;
A na-eji ihe oyiyi, ihe Ndị Kraịst aghaghị izere ụdị ọ
ọkpụkpụ, na obe na-eme ihe bụla nke ikpere arụsị, gụnyere ihe
n’ife ofufe: “Ihe oyiyi . . . ahụ a na-akpọ ofufe ruuru ha.
nke Kraịst, nke Nne Chineke bụ (Ọpụpụ 20:4, 5;
Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke, 1 Ndị Kọrint 10:14; 1 Jọn 5:21)
na nke ndị senti ndị ọzọ, ka a Ha na-efe Chineke ọ bụghị site
. . . ga-edebe n’ụlọ chọọchị n’ihe a na-ahụ anya kama n’ime
dị iche iche, na-enyekwa ha mmụọ na eziokwu. (Jọn 4:23, 24;
ùgwù na nsọpụrụ ruru eru.” 2 Ndị Kọrint 5:7)
(Nkwupụta Okwu nke Nzukọ
Council nke Trent [1545-1563])
A na-akụziri ndị chọọchị na Jisọs kwusara Alaeze Chineke, ọ
a ga-esite na ndọrọ ndọrọ bụghị usoro ndọrọ ndọrọ ọ bụla, dị
ọchịchị mezuo nzube Chineke. ka olileanya dịịrị ọchịchị ihe a
Cardinal Spellman, bụ́ onye kpọrọ mmadụ. (Matiu 4:23;6:9, 10)
nwụworo anwụ kwuru, sị: Ọ jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ
“E nwere nanị otu ụzọ na-eduga ọchịchị. (Jọn 6:14, 15) Alaeze ya
n’udo . . . , bụ́ okporo ụzọ esiteghị n’ụwa nke a; n’ihi nke a,
nke ọchịchị onye kwuo uche ya.” ndị na-eso ụzọ ya agaghị abụkwa
A na-anụ akụkọ dị iche iche akụkụ nke ụwa. (Jọn18:36; 17:16)
banyere ntinye aka okpukpe Jemes dọrọ aka ná ntị megide ịbụ
na-etinye na ndọrọ ndọrọ enyi nke ụwa. (Jemes 4:4)
ọchịchị (ọbụna ná mbilite
mgbanwe ọchịchị) na nkwado ya
nye òtù UN dị ka “olileanya
ikpeazụ dị maka nkwekọrịta
na udo.”
[Foto dị na peeji nke 132]
Mmepe nke akara asaa ahụ dujere n’ịfụ opi asaa
[Foto dị na peeji nke 140]
“Ihe Ịma Aka nye Ndị Ndú Ụwa” (1922)
Nkwupụta okwu nke a nyere aka ịkpọsa ihe otiti Jehova na-eti “ụwa”
[Foto dị na peeji nke 140]
“Ịdọ Aka ná Ntị nye Ndị Kraịst Nile” (1923)
Nkwupụta okwu nke a kpọsazuru ebe nile ikpe ọmụma Jehova megide “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke oké osimiri”
[Foto dị na peeji nke 141]
“E Kwuwo na Ikpe Mara Ndị Ndú Okpukpe” (1924)
Nkesa e kesara traktị nke a n’ebe nile nyere aka ime ka ndị mmadụ mara na “kpakpando” nke ndị ndú Krisendọm adawo
[Foto dị na peeji nke 141]
“Ozi Olileanya” (1925)
E ji nkwupụta okwu nke a kpụ ọkụ n’ọnụ mee ihe ikpughe ihe ndị ahụ e chere na ha bụ isi iyi nke ìhè na Krisendọm ịbụ n’ezie isi iyi nke ọchịchịrị