Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka A Pụrụ Ịdabere N’amụma Bible?
AKWỤKWỌ akụkọ ihe mere eme jupụtara n’oge a. Ihe ndekọ ndị a banyere ihe werewooro ọnọdụ n’oge gara aga bụ ihe na-akpali akpali ọtụtụ mgbe n’ezie. Ka anyị na-agụ ha, anyị pụrụ ịhụ onwe anyị n’ọgbọ oge ochie. Echiche anyị na-adị elu ka ndị mmadụ, ebe dị iche iche, na ihe omume na-apụta ìhè site n’ibe akwụkwọ ndị na-adịghị ekwu okwu.
Bible bụ akwụkwọ dị otú ahụ—nke jupụtara n’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme na-akpali akpali. Site na peji ya nile, anyị pụrụ ịmara ndị ikom na ndị inyom dị ka Abraham, nwunye ya bụ́ Sera, Eze Devid, Eze Nwanyị Esta, na Onye Ozizi Ukwuu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Anyị pụrụ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, iso ha jee ije, ịnụ ihe ha kwuru, na ịhụ ihe ha hụrụ. Ma ọtụtụ ndị na-ele Bible anya dị ka ihe karịrị akwụkwọ akụkọ ihe mere eme. Ha kwere na o nwere ihe a kpọworo akụkọ ihe mere eme e dere tupu o mee. N’ihi gịnị? N’ihi na Bible jupụtara n’ọtụtụ amụma.
Ma, ruo ókè hà aṅaa ka a pụrụ ịdabere n’amụma Bible? Ọ bụrụ na amụma Bible mezuru n’ihe ndị mere n’oge gara aga, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na amụma ndị dị otú ahụ banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ga-emezu? Ugbu a ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ iji hụ ma à pụrụ ịdabere n’amụma Bible.
Israel na Asiria Apụta n’Ọgbọ Ụwa
Onye amụma Chineke bụ́ Aịsaịa, onye malitere ibu amụma n’ihe dị ka 778 T.O.A., buru amụma, sị: “N’okpuru ụkwụ ka a ga-azọda okpueze mpako nke ndị Efraim [Israel] na-aṅụbiga mmanya ókè: okooko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ nke ịma mma ya mara mma, nke dị n’isi nke ndagwurugwu dị uru, ga-adịkwa ka mkpụrụ fig buru ụzọ chaa tupu mgbe okpomọkụ eruo; nke mgbe onye ọ bụla nke na-ahụ ya anya na-ahụ, mgbe ọ na-adị n’ọbụ aka ya o loo ya.” (Aịsaịa 28:3, 4) Dị ka e si buo n’amụma, mgbe ọ na-eru etiti narị afọ asatọ T.O.A., isi obodo Israel, bụ́ Sameria, adịwo ka mkpụrụ fig chara acha nke usuu ndị agha Asiria pụrụ ịghọrọ ma loo. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe mere mgbe ndị Asiria meriri Sameria n’afọ 740 T.O.A.—2 Ndị Eze 17:6, 13, 18.
Mgbe oge na-aga, oge ruru ka Asiria ghọọkwa alaeze ukwu a na-akọ n’akụkọ. Isi obodo ya bụ Nineve, nke a maara nke ọma maka mmeso obi ọjọọ ọ na-emeso ndị o jidere nke na a kpọrọ ya “obodo ọbara.” (Nehum 3:1) Jehova Chineke n’onwe ya enyewo iwu maka mbibi nke Nineve. Dị ka ihe atụ, site n’ọnụ onye amụma bụ́ Nehum, Chineke sịrị: “Lee, mụ na-emegide gị . . . m ga-akpọkwa gị ihe nzuzu, doo gị ka ihe ile anya. Ọ ga-erukwa, na ndị nile ndị na-ahụ gị ga-agbanarị gị, sị, E bibiwo Nineve.” (Nehum 3:5-7) Zefanaịa bukwara amụma banyere mbibi nke Asiria na ime ka Nineve tọgbọrọ n’efu. (Zefanaịa 2:13-15) E mezuru amụma ndị a n’afọ 632 T.O.A., mgbe, n’ụzọ na-eju anya, òtù ndị agha jikọrọ ọnụ nke eze ndị Babilọn bụ́ Nabopolassar na Cyaxares onye Midia tikpọrọ ma zọdaa Nineve—n’ụzọ ruru ala nke na ọbụna ebe obodo ahụ dị ghọrọ nke a na-amaghị ruo ihe karịrị 2,000 afọ. Alaeze Ukwu Babilọn bụ nke sochiri ya n’ọgbọ ụwa.
E Buru Mbibi Babilọn n’Amụma
Bible buru amụma na Alaeze Ukwu Babilọn gaje ịbụ nke a kwaturu, o bukwara amụma otú isi obodo ya, bụ̀ Babilọn, ga-esi daa. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ tupu o mee, Aịsaịa onye amụma dọrọ aka ná ntị na a ga-amịkọ Osimiri Yufretis. Ọ na-asọfe na Babilọn, ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụzọ osimiri ahụ bụ akụkụ dị mkpa nke nchebe obodo ahụ. Amụma ahụ kpọrọ aha Saịrọs dị ka onye mmeri ahụ ma rịba ama na a gaghị emechi ‘ọnụ ụzọ ebe ihu abụọ’ nke Babilọn nye ndị mwakpo ahụ. (Aịsaịa 44:27–45:7) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Chineke hụrụ na ọnụ ụzọ ebe ihu abụọ nke Babilọn ndị dị n’ụsọ Yufretis mepere emepe n’oge a na-eme otu ememe n’abalị ahụ mgbe ndị agha Saịrọs Onye Ukwu bịara mwakpo ha. Ya mere, n’enweghị ihe isi ike ọ bụla, ha banyere n’obodo ahụ site n’ụzọ ebe osimiri ahụ si agafe wee merie Babilọn.
Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus dere, sị: “Saịrọs . . . kpọsara ụfọdụ n’ime ndị agha ya ná nsọtụ ebe osimiri Yufretis si asọbata n’ime [Babilọn], hapụkwa ụfọdụ ndị agha ya n’akụkụ nke ọzọ ebe o si asọpụ, na-enyekwa òtù abụọ ahụ iwu ka ha banye n’ime ala osimiri ahụ n’atụghị egwu ozugbo ha hụrụ na mmiri ahụ atalatawo otú dị mma. . . . Site n’otu ọwa mmiri e gwuru egwu, o mepeere osimiri ahụ ụzọ gaa n’ọdọ mmiri (nke bụ n’oge ahụ ala mmiri dere), sitekwa n’ime nke a o belatara nke ukwuu ịdị omimi nke mmiri dị n’ebe osimiri ahụ si agafe nke na ọ ghọrọ nke a pụrụ iji ụkwụ gafere, ndị agha Peasia kwa, bụ́ ndị a hapụworo na Babilọn maka nzube ahụ, banyere n’osimiri ahụ, nke ịdị omimi ya ugbu a dị mma nke na ọ na-eru n’ihe dị ka etiti apata ụkwụ mmadụ, sitekwa n’isi na ya gafere, ha banyere n’obodo ahụ. . . . E nwere ememe na-ewere ọnọdụ, ọbụna ka obodo ahụ na-adakpọ ha nọgidere na-agba egwú ma na-eme onwe ha obi ụtọ, ruo mgbe ha ghọtara ihe na-emenụ n’ezie.”—Herodotus—The Histories, nke Aubrey de Selincourt sụgharịrị.
N’otu abalị ahụ, onye amụma Chineke bụ́ Daniel dọrọ onye ọchịchị Babilọn aka ná ntị banyere ọdachi nke na-abịanụ. (Daniel, isi nke 5) Babilọn nke na-adịchaghị ike nọgidere na-adị ruo narị afọ ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ site n’ebe ahụ ka Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi mbụ ya sitere n’ike mmụọ nsọ na narị afọ mbụ O.A. (1 Pita 5:13) Ma amụma nke Aịsaịa ekwuwo, sị: “Babilọn . . . ga-adị ka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ.” Chineke kwukwara, sị: “M ga-ebipụkwa na Babilọn aha na ndị fọdụrụ, na ụmụ na ụmụ ụmụ.” (Aịsaịa 13:19-22; 14:22) Dị ka e buru n’amụma, Babilọn mesịrị ghọọ mkpọmkpọ ebe e bibiri ebibi. Mwughachi ọ bụla a pụrụ iwughachi obodo ochie ahụ pụrụ ịdọrọ mmasị ndị na-eme njem ma ọ ga-emekwa ka ọ ghara inwe “ụmụ na ụmụ ụmụ.”
Daniel—bụ́ onye amụma Jehova nọ na Babilọn mgbe ọ dara—hụrụ otu ọhụụ nke metụtara ndị Midia na Peasia ahụ na-enwe mmeri. Ọ hụrụ otu ebulu nwere mpi abụọ na otu mkpi nke nwere mpi ukwu n’agbata anya ya abụọ. Mkpi ahụ lụsoro ebulu ahụ ọgụ ma sutuo ya n’ala, na-agbaji mpi ya abụọ. Mgbe ahụ a gbajiri mpi ukwu nke mkpi ahụ, mpi anọ wee pute n’ọnọdụ ya. (Daniel 8:1-8) Dị ka Bible buru n’amụma na dị ka akụkọ ihe mere eme kwadokwara, ebulu ahụ nwere mpi abụọ nọchiri anya Midia na Peasia. Mkpi ahụ nọchiri anya Gris. Gịnịkwa banyere “mpi ukwu” ya? Nke a ghọrọ Aleksanda Onye Ukwu. Mgbe a gbajiri mpi ukwu ihe atụ ahụ, mpi ihe atụ anọ (ma ọ bụ, alaeze) anọ nọchiri ya. N’imezu amụma ahụ, mgbe Aleksanda nwụrụ, anọ n’ime ndị ọchịagha ya guzobere onwe ha n’ọkwá—Ptolemy Lagus n’ime Ijipt na Palestine; Seleucus Nicator n’ime Mesọpọtemia na Siria; Cassander n’ime Masedọnia na Gris; na Lysimachus n’ime Thrace na Asia Minor.—Daniel 8:20-22.
Amụma Ndị Metụtara Ọdịnihu nke Dị Mma
Amụma Bible ndị metụtara ihe omume ndị dị ka ime ka Babilọn tọgbọrọ n’efu na ịkwatu Midia na Peasia bụ nanị ihe atụ nke ọtụtụ amụma Akwụkwọ Nsọ ndị mezuworo n’oge gara aga. Bible nwekwara amụma ndị metụtara ọdịnihu nke dị mma bụ́ ndị ga-emezu n’ihi Mesaịa ahụ, bụ́ Onye E Tere Mmanụ nke Chineke.
Ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ji amụma ụfọdụ metụtara Mesaịa bụ́ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mee ihe banyere Jisọs Kraịst. Dị ka ihe atụ, ndị so dee Oziọma rụtụrụ aka na a mụrụ Jisọs na Betlehem, dị ka e buru n’amụma site n’ọnụ Maịka onye amụma. (Maịka 5:2; Luk 2:4-11; Jọn 7:42) Ná mmezu nke amụma Jeremaịa, e gburu ụmụ ọhụrụ mgbe a mụsịrị Jisọs. (Jeremaịa 31:15; Matiu 2:16-18) Okwu nke Zekaraịa (9:9) nwere mmezu mgbe Kraịst banyere na Jerusalem n’elu ịnyịnya ibu. (Jọn 12:12-15) Mgbe ndị agha malitekwara ikeri uwe Jisọs mgbe a kpọgbusịrị ya, nke a mezuru okwu onye ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Ha na-ekere onwe ha uwe m, n’elu ihe m na-eyi n’ahụ ka ha na-efekwa nzà.”—Abụ Ọma 22:18.
Amụma ndị ọzọ metụtara Mesaịa na-arụtụ aka gaa n’oge obi ụtọ maka agbụrụ mmadụ. N’ọhụụ, Daniel hụrụ “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ka ọ na-anata “ọchịchị, na ebube, na alaeze” n’aka Jehova, bụ́ “Onye Ochie ahụ.” (Daniel 7:13, 14) Banyere ọchịchị Mesaịa nke Eze eluigwe ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, Aịsaịa kwupụtara, sị: “A ga-akpọkwa aha ya Onye Ebube, Onye Ndụmọdụ, Chineke nke Bụ Dike, Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ibu onyeisi ya na udo ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.”—Aịsaịa 9:6, 7.
Tupu ọchịchị ezi omume nke Mesaịa ahụ amalite ịchị, otu ihe dị oké mkpa aghaghị iwere ọnọdụ. E bukwara nke a n’amụma na Bible. Banyere Eze ahụ bụ Mesaịa, onye ọbụ abụ ahụ bụrụ abụ, sị: “Kee mma agha gị n’úkwù gị, gị dike . . . N’ịma mma gị nọkwasị n’elu ịnyịnya gaa nke ọma, n’ihi eziokwu na umeala n’obi na ezi omume.” (Abụ Ọma 45:3, 4) N’izo aka n’oge anyị, Akwụkwọ Nsọ bukwara amụma, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Abụ Ọma 72 na-enye ìhè n’ihe banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’okpuru ọchịchị Mesaịa. Dị ka ihe atụ, “onye ezi omume ga-amà akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.” (Amaokwu nke 7) Mgbe ahụ a gaghị enwe mmegbu ma ọ bụ ihe ike. (Amaokwu nke 14) Ọ dịghị onye ga-anọ n’agụụ, n’ihi na “ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanon.” (Amaokwu nke 16) Cheedị nnọọ echiche! Ị pụrụ inweta ngọzi ndị a na ndị ọzọ n’elu ala bụ́ paradaịs mgbe e ji ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere na nkwa dochie usoro ihe dị ugbu a.—Luk 23:43; 2 Pita 3:11-13; Mkpughe 21:1-5.
N’ezie, ebe ọ dị otú ahụ, amụma Bible kwesịrị ka i lebara ya anya. Ya mere, gịnị ma ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha nyekwuo gị ihe ọmụma? Nnyocha nke amụma Bible pụrụ inyere gị aka ịhụ ebe anyị nọ ná ngabiga nke oge. Ọ pụkwara ịkpali n’ime obi gị ekele miri emi maka Jehova Chineke na ndokwa ya dị ebube maka ngọzi ebighị ebi nke ndị nile hụrụ ya n’anya ma na-erubere ya isi.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ị̀ maara ihe ọhụụ Daniel nke metụtara otu mkpi na ebulu pụtara?
[Foto dị na peeji nke 7]
Ị̀ ga-anọ ebe ahụ inweta ọṅụ ná mmezu nke amụma Bible banyere ndụ obi ụtọ n’elu ala bụ́ paradaịs?