Isi nke Iri Abụọ na Atọ
Na-echere Jehova
1, 2. (a) Gịnị dị n’Aịsaịa isi nke 30? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị ga-atụle ugbu a?
N’AỊSAỊA isi nke 30, anyị na-agụ okwu ikpe ndị ọzọ nke Chineke megide ndị ajọ omume. Ka o sina dị, akụkụ a nke amụma Aịsaịa na-eme ka àgwà ụfọdụ na-akpali akpali nke Jehova pụta ìhè. N’ezie, e ji okwu ndị doro nnọọ anya kọwaa àgwà Jehova nke na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị pụrụ ịhụ ọnụnọ ya na-akasi obi, nụ olu nduzi ya, ma nwee mmetụta nke mbitụ aka ya na-edozi ahụ.—Aịsaịa 30:20, 21, 26.
2 N’agbanyeghị nke ahụ, ndị obodo Aịsaịa, bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ bi na Juda, jụrụ ịlaghachikwuru Jehova. Kama nke ahụ, ha tụkwasịrị mmadụ obi. Olee otú nke a dị Jehova? Oleekwa otú akụkụ a nke amụma Aịsaịa si enyere ndị Kraịst taa aka ịdị na-echere Jehova? (Aịsaịa 30:18) Ka anyị lee.
Nzuzu na Ọdachi
3. Olee atụmatụ Jehova kpughere?
3 Ruo oge ụfọdụ, ndị ndú Juda anọwo na-akpa nkata nzuzo ịchọta ụzọ ha ga-esi zere ịba n’okpuru yoke Asiria. Otú ọ dị, Jehova anọwo na-ele ihe na-emenụ. Ugbu a, o kpughere atụmatụ ha, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụmụ na-ewezụga onwe ha, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, ndị na-eme ihe e zubeworo, ma o siteghị n’aka m; ndị ji ihe mkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bụghị nke Mmụọ m, ka ha wee were mmehie tụkwasị ná mmehie: ndị na-eje ịrịda n’Ijipt.”—Aịsaịa 30:1, 2a.
4. Olee otú ndị Chineke na-enupụ isi siworo tinye Ijipt n’ọnọdụ Chineke?
4 Lee ihe ijuanya ọ bụụrụ ndị ndú ahụ na-akpa nkata ịnụ ka e kpughere atụmatụ ha! Ije Ijipt iji soro ya jikọọ aka gafere omume ibu iro megide Asiria; ọ bụ nnupụisi megide Jehova Chineke. N’oge Eze Devid, mba ahụ lekwasịrị Jehova anya dị ka ebe ha e wusiri ike ma gbaba ‘n’okpuru ndo nku ya abụọ.’ (Abụ Ọma 27:1; 36:7) Ugbu a, ha ‘gbagara n’ebe siri ike nke Fero,’ ‘gbabakwa na ndo Ijipt.’ (Aịsaịa 30:2b) Ha etinyewo Ijipt n’ọnọdụ Chineke! Lee ịgba mgba okpuru ọ bụ!—Gụọ Aịsaịa 30:3-5.
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka njikọ aka e so Ijipt nwee ji bụrụ ihie ụzọ na-akpata ọnwụ? (b) Njem dị aṅaa ndị Chineke mere tupu mgbe ahụ na-egosi nzuzu dị na njem a e mere gaa Ijipt?
5 Dị ka ọ̀ bụ iji zaghachi onye ọ bụla ga-ekwu na njem ahụ e mere gaa Ijipt bụ nleta nkịtị, Aịsaịa nyekwuru nkọwa. “Ibu e boro anụmanụ nile nke Negeb. N’ala ahụhụ na mkpa, ebe nne ọdụm na oké ọdụm na ajụala na agwọ yiri ọkụ na-efe efe si abịa, ka ha na-ebu akụ̀ ha nile n’ubu ụmụ ịnyịnya ibu, na ihe ha nile dị oké ọnụ ahịa n’akpụ azụ camel.” (Aịsaịa 30:6a) N’ụzọ doro anya, e leziri anya mee atụmatụ maka njem ahụ. Ndị ozi chịkọbara ìgwè camel na ịnyịnya ibu, bụ́ ndị e bukwasịjuru ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ma si n’ọzara tọgbọrọ chakoo nke ọdụm na-agbọ ụja na agwọ ọjọọ ndị dị ize ndụ jupụtara duru ha gaa Ijipt. N’ikpeazụ, ndị ozi ahụ ruru ebe ha na-aga ma bunye ndị Ijipt akụ̀ ndị ahụ. Ha azụtawo nchebe—ma ọ bụ, ọ bụ ihe ha chere. Otú ọ dị, Jehova kwuru, sị: “Ijekwuru otu ndị na-agaghị abara ha uru. Ma Ijipt, nanị otu nku ume na ihe efu ka inye aka ha bụ: n’ihi nke a ka M kpọworo ala nke a Rehab, ndị ahụ bụ nkwụsị.” (Aịsaịa 30:6b, 7) “Rehab,” bụ́ “anụ mmiri,” bịara nọchite anya Ijipt. (Aịsaịa 51:9, 10) Ọ na-ekwe nkwa ihe nile, ma ọ dịghị nke ọ na-eme. Njikọ aka nke ya na Juda bụ ihie ụzọ na-eweta ọnwụ.
6 Ka Aịsaịa na-akọwa njem ndị ozi ahụ mere, ndị na-ege ya ntị pụrụ icheta njem yiri ya e mere n’oge Mosis. Ndị nna nna ha gafekwara otu ‘ọzara ahụ dị egwu.’ (Deuterọnọmi 8:14–16) Otú ọ dị, n’oge Mosis, ndị Israel na-apụ n’Ijipt, na-apụkwa n’agbụ. Na nke ugbu a, ndị ozi ahụ gara Ijipt aga, baakwa n’ezie n’ịbụ ohu. Lee ihe nzuzu ọ bụ! Ya adịla mgbe anyị ga-eme ajọ mkpebi dị otú ahụ ma jiri nnwere onwe ime mmụọ anyị gbanwere ịbụ ohu!—Tụlee Ndị Galetia 5:1.
Mmegide nke Ozi Onye Amụma Ahụ
7. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka Aịsaịa detuo ịdọ aka ná ntị O nyere Juda edetuo?
7 Jehova gwara Aịsaịa ka o detuo ozi ahụ ọ ka zisịrị ka “o wee dịịrị ụbọchị ọdịnihu ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 30:8) A ghaghị idekọ nkwado Jehova na-akwadoghị ibute njikọ e so ụmụ mmadụ nwee ụzọ karịa ịdabere n’ebe Ọ nọ maka abamuru nke ọgbọ ndị dị n’ihu—gụnyere ọgbọ anyị taa. (2 Pita 3:1–4) Ma e nwere ihe ka mkpa idetu. “Ndị nke na-enupụ isi ka [ha] bụ, ụmụ na-ekwu okwu ụgha, ụmụ na-ekweghị ịnụ iwu Jehova.” (Aịsaịa 30:9) Ndị ahụ ajụwo ndụmọdụ Chineke. N’ihi ya, a ghaghị idetu ya edetu ka ha ghara imesị gọpụ na e nyeghị ha ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị.—Ilu 28:9; Aịsaịa 8:1, 2.
8, 9. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ndú Juda si gbalịa imerụ ndị amụma Jehova? (b) Olee otú Aịsaịa si gosi na a gaghị emenye ya ụjọ?
8 Ugbu a Aịsaịa na-enye ihe atụ nke àgwà nnupụisi nke ndị ahụ. Ha ‘asịwo ndị ọhụ ụzọ, Unu agaghị ahụ ụzọ; [sịkwa] ndị ọhụụ, Unu agaghị ahụrụ anyị ihe ziri ezi n’ọhụụ unu, gwanụ anyị okwu ire ụtọ nile, hụnụ ihe ịkwa emo n’ọhụụ unu.’ (Aịsaịa 30:10) Site n’inye ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi iwu ka ha kwụsị ikwu ihe “ziri ezi,” ma ọ bụ eziokwu, kama ya ka ha kwuo “okwu ire ụtọ” na nke “ịkwa emo,” ma ọ bụ okwu ụgha, ndị ndú Juda na-egosi na ha nwere ntị na-akọ ọkọ. Ha chọrọ ka e too ha, ọ bụghị ka a katọọ ha. N’echiche ha, onye amụma ọ bụla na-adịghị njikere ibu amụma ha nwere mmasị na ya, kwesịrị ‘iwezụga onwe ya n’ụzọ, si n’okporo ụzọ wezụga onwe ya.’ (Aịsaịa 30:11a) O kwesịrị ikwu ihe dị ụtọ ná ntị ma ọ bụ ọ hapụ ime nkwusa ọ bụla!
9 Ndị na-emegide Aịsaịa siri ọnwụ, sị: “Meenụ ka Onye Nsọ nke Israel kwụsị iguzo n’ihu anyị.” (Aịsaịa 30:11b) Ka Aịsaịa kwụsị ikwu okwu n’aha Jehova, bụ́ “Onye Nsọ nke Israel”! Utu aha a na-akpasu ha iwe n’ihi na ụkpụrụ dị elu nke Jehova na-ekpughe ọnọdụ ha na-asọ oyi. Gịnị ka Aịsaịa mere? O kwuru, sị: “N’ihi nke a ka Onye Nsọ nke Israel ji si otú a.” (Aịsaịa 30:12a) N’alaghị azụ, Aịsaịa kwuru kpọmkwem okwu ndị ahụ na-emegide ya na-achọghị ịnụ. A gaghị emenye ya ụjọ. Lee ihe nlereanya ọma ọ bụ nye anyị! Mgbe a bịara n’ịkpọsa ozi Chineke, ọ dịghị mgbe ndị Kraịst ga-ekweta ịkwụsị. (Ọrụ 5:27–29) Dị ka Aịsaịa, ha na-aga n’ihu na-akpọsa, sị: ‘Nke a ka Jehova kwuru’!
Ihe Ndị Si ná Nnupụisi Pụta
10, 11. Gịnị bụ ihe ndị ga-esi ná nnupụisi Juda pụta?
10 Juda ajụwo okwu Chineke, tụkwasị obi n’ụgha, ma dabere ná “nsihie ụzọ.” (Aịsaịa 30:12b) Gịnị ga-esi na ya pụta? Jehova, kama ịhapụ ebe ahụ otú mba ahụ chọrọ, ga-eme ka mba ahụ kwụsị ịdị adị! Nke a ga-eme na mberede na n’ụzọ zuru ezu, dị ka Aịsaịa ji ihe atụ mesie ya ike. Nnupụisi nke mba ahụ yiri “mgbawa na-ada ada, nke na-akwọpụta akwọpụta ná mgbidi dị elu, nke ọ bụ na mberede n’otu ntabi anya ka ntipịa ya na-abịa.” (Aịsaịa 30:13) Dị nnọọ ka nkwọpụta na-ebuwanye ibu ná mgbidi dị elu ga-esi mesịa mee ka mgbidi daa, otú a ka nnupụisi na-arị elu nke ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ ga-esi kpata ọdịda nke mba ahụ.
11 Aịsaịa ji ihe atụ ọzọ gosi izu ezu nke mbibi ahụ na-abịanụ: “Ọ ga-etiwakwa ya dị ka e si etiwa ite ndị ọkpụite na-akpụ, nke e tipịara etipịa, Ọ gaghị enwe ọmịiko: ewee ghara ịchọta n’etiti ntipịa ya otu ejuju iji gụrụ ọkụ n’okpukpo ntụ, ma ọ bụ iji kupụ mmiri n’ọdọ mmiri.” (Aịsaịa 30:14) A ga-ebibi Juda kpam kpam nke na ọ dịghị ihe bara uru ga-afọdụ—ọbụnadị ejuju a pụrụ iji kporo ntụ ọkụ n’ekwu ma ọ bụ iji kupụ mmiri n’ọdọ mmiri. Lee njedebe na-eme ihere ọ bụ! Mbibi na-abịanụ nke ndị na-enupụ isi taa n’ezi ofufe ga-abịakwa na mberede na n’ụzọ zuru ezu.—Ndị Hibru 6:4–8; 2 Pita 2:1.
A Jụ Onyinye Jehova
12. Olee otú ndị Juda pụrụ isi zere mbibi?
12 Otú ọ dị, nye ndị na-ege Aịsaịa ntị, mbibi abụghị ihe a na-apụghị izere ezere. E nwere ụzọ isi gbanarị ya. Onye amụma ahụ na-akọwa, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Onye Nsọ nke Israel, sịrị, N’ime nlata na izu ike ka a ga-azọpụta unu; n’ịnọ jụụ na n’ịtụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị.” (Aịsaịa 30:15a) Jehova dị njikere ịzọpụta ndị ya—ma ọ bụrụ na ha egosi okwukwe site ‘n’izu ike,’ ma ọ bụ ịkwụsị ịgbalị inweta nzọpụta site ná njikọ aka ụmụ mmadụ, nakwa site “n’ịnọ jụụ,” ma ọ bụ inwe obi ike n’ike nchebe Chineke site n’ịghara ịtụ ụjọ. “Ma,” ka Aịsaịa gwara ndị ahụ, “unu ekweghị.”—Aịsaịa 30:15b.
13. Na gịnị ka ndị ndú Juda tụkwasịrị obi, ntụkwasị obi dị otú ahụ ò ziri ezi?
13 Aịsaịa nyeziri nkọwa sara mbara karị, sị: “Kama unu sịrị, Ee e, n’ihi na ịnyịnya ka anyị ga-anọkwasị gbalaga; n’ihi nke a unu ga-agbalaga: unu sịkwara, Anụ dị ngwa ka anyị ga-anọkwasị; n’ihi nke a ka ndị na-achụ unu ga-adị ngwa.” (Aịsaịa 30:16) Ndị Juda chere na ịnyịnya ndị dị ngwa ga-azọpụta ha, kama Jehova ịzọpụta ha. (Deuterọnọmi 17:16; Ilu 21:31) Otú ọ dị, onye amụma ahụ zara nke ahụ, ntụkwasị obi ha ga-abụ n’efu n’ihi na ndị iro ha ga-achụkwudo ha. Ọbụna ịdị ọtụtụ agaghị enyere ha aka. “[Otu puku] ga-esi n’ihu ịba mba nke otu onye gbalaga; n’ihu ịba mba nke mmadụ ise ka unu ga-esi gbalaga.” (Aịsaịa 30:17a) Usuu ndị agha Juda ga-atụ ụjọ ma gbalaga mgbe ndị agha ole na ole tiri mkpu.a N’ikpeazụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ, nọrọ nanị ha, “dị ka otu osisi ọkọlọtọ n’elu ugwu, na dị ka ọkọlọtọ n’elu ugwu nta.” (Aịsaịa 30:17b) N’imezu amụma ahụ, mgbe e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., nanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.—Jeremaịa 25:8–11.
Nkasi Obi n’Agbanyeghị Amamikpe
14, 15. Nkasi obi dị aṅaa ka ihe e kwuru n’Aịsaịa 30:18 na-enye ndị bi na Juda n’oge ochie nakwa ezi ndị Kraịst taa?
14 Ka okwu ndị a na-akpali iche echiche ka na-ada ná ntị ndị na-ege Aịsaịa ntị, ụda ozi ya gbanwere. Nkwa maka ngọzi nọchiri iyi egwu nke ọdachi. “N’ihi nke a ka Jehova ga-echere, imere unu amara, ọ bụkwa n’ihi nke a ka [ọ ga-ebili], inwe obi ebere n’ahụ unu: n’ihi na Chineke nke ikpe ka Jehova bụ; ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị nile ndị na-echere Ya bụ.” (Aịsaịa 30:18) Lee okwu na-agba ume ọ bụ! Jehova bụ Nna nwere ọmịiko, onye na-achọsi ike inyere ụmụ ya aka. Ọ na-enwe obi ụtọ ime ebere.—Abụ Ọma 103:13; Aịsaịa 55:7.
15 Okwu ndị a nke na-emesi obi ike metụtara ihe fọdụrụ ná ndị Juu, bụ́ ndị e ji obi ebere kwere ka ha lanarị mbibi Jerusalem na 607 T.O.A. nakwa mmadụ ole na ole laghachiri n’Ala Nkwa ahụ na 537 T.O.A. Otú ọ dị, ihe onye amụma ahụ kwuru na-akasikwa ndị Kraịst obi taa. A na-echetara anyị na Jehova “ga-ebili” n’ihi anyị, na-eweta ajọ ụwa a ná njedebe. Ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe pụrụ inwe obi ike na Jehova—“Chineke nke ikpe”—agaghị ekwe ka ụwa Setan jiri otu ụbọchị dịfee ihe ikpe ziri ezi chọrọ. Ya mere, “ndị na-echere ya” nwere ihe dị ukwuu mere ha ga-eji nwee obi ụtọ.
Jehova Na-akasi Ndị Ya Obi Site n’Ịza Ekpere
16. Olee otú Jehova si akasi ndị nwere nkụda mmụọ obi?
16 Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ inwe nkụda mmụọ maka na mgbapụta abịaghị ngwa ngwa otú ha tụrụ anya ya. (Ilu 13:12; 2 Pita 3:9) Ka ha nweta nkasi obi site n’ihe Aịsaịa kwuziri, bụ́ nke na-eme ka akụkụ pụrụ iche nke ụdị onye Jehova bụ pụta ìhè. “Otu ndị ga-ebi na Zaịọn n’ime Jerusalem: ị gaghị akwa ákwá ọzọ ma ọlị: Ọ ga-emere gị amara n’ezie n’olu iti mkpu gị; mgbe Ọ nụrụ Ọ ga-aza gị otu mgbe ahụ.” (Aịsaịa 30:19) Aịsaịa gosiri mmetụta ịhụnanya n’okwu ndị a site n’ịgbanwe iji “unu” nke dị n’amaokwu nke 18 eme ihe gaa n’iji “gị” eme ihe n’amaokwu nke 19. Mgbe Jehova na-akasi ndị nọ n’ahụhụ obi, ọ na-emeso onye ọ bụla ihe n’otu n’otu. Dị ka Nna, ọ dịghị ajụ nwatakịrị nwere nkụda mmụọ, sị, ‘Gịnị mere na i nweghị obi ike ka nwanne gị?’ (Ndị Galetia 6:4) Kama nke ahụ, ọ na-ege onye ọ bụla ntị nke ọma. N’ezie, “mgbe Ọ nụrụ Ọ ga-aza [ya] otu mgbe ahụ.” Lee okwu na-emesi obi ike ọ bụ! A pụrụ iwusi ndị nwere nkụda mmụọ ike nke ukwuu ma ha kpegara Jehova ekpere.—Abụ Ọma 65:2.
Nụrụ Olu Nduzi Chineke Site n’Ịgụ Okwu Ya
17, 18. Ọbụna n’oge ihe isi ike, olee otú Jehova si enye nduzi?
17 Ka Aịsaịa na-aga n’ihu n’okwu ya, o chetaara ndị na-ege ya ntị na ahụhụ ga-abịa. Ndị ahụ ga-enweta “nri ahụhụ na mmiri mmegbu.” (Aịsaịa 30:20a) Ahụhụ na mmegbu ha ga-enweta mgbe a nọchibidoro ha ga-abịa mara ha ahụ dị ka nri na mmiri. Ọbụna otú ahụ, Jehova dị njikere ịnapụta ndị obi ha ziri ezi. “[Onye Nkụzi Ukwu] gị agaghị ezobe onwe [ya] ọzọ, kama anya gị abụọ ga na-ahụ [Onye Nkụzi Ukwu] gị: ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.”—Aịsaịa 30:20b, 21.b
18 Ọ bụ Jehova bụ “Onye Nkụzi Ukwu” ahụ. Ọ dịghị onye nkụzi dị ka ya. Otú ọ dị, olee otú ndị mmadụ pụrụ isi ‘hụ’ ya, ‘nụkwa’ ihe ọ na-ekwu? Jehova na-ekpughe onwe ya site n’ọnụ ndị amụma ya, bụ́ ndị e dekọrọ ihe ha kwuru n’ime Bible. (Emọs 3:6, 7) Taa, mgbe ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe gụrụ Bible, ọ na-adị ka ọ bụ olu Chineke, nke bụ́ olu nna, na-agwa ha ụzọ ha ga-eso ma na-agba ha ume ịgbanwe àgwà ha iji gaa ije na ya. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịṅa ntị nke ọma mgbe Jehova na-ekwu okwu site na Bible na site n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta. (Matiu 24:45–47) Ka onye ọ bụla dị uchu n’ịgụ Bible n’ihi na ‘ọ bụ ndụ ya.’—Deuterọnọmi 32:46, 47; Aịsaịa 48:17.
Na-atụgharị Uche ná Ngọzi Ndị Dị n’Ihu
19, 20. Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ndị ṅara ntị n’olu Onye Nkụzi Ukwu ahụ?
19 Ndị na-ege ntị n’olu Onye Nkụzi Ukwu ahụ ga-ebibi arụsi ha nile a pịrị apị, were ha dị ka ihe na-asọ oyi. (Gụọ Aịsaịa 30:22.) Mgbe ahụ, ndị ṅara ntị ga-enweta ngọzi ndị dị ebube. Aịsaịa kọwara ihe ndị a, dị ka e dekọrọ ya n’Aịsaịa 30:23–26, bụ́ amụma mweghachi na-enye ọṅụ nke nwere mmezu mbụ ya mgbe ihe fọdụrụnụ ná ndị Juu si ná ndọrọ n’agha lọta na 537 T.O.A. Taa, amụma a na-enyere anyị aka ịhụ ngọzi ndị dị ebube Mesaịa ahụ na-eweta na paradaịs ime mmụọ ahụ ugbu a nakwa ndị ọ ga-eweta na Paradaịs nkịtị ga-abịanụ.
20 “Ọ ga-enyekwa mmiri ozuzo nke mkpụrụ ọghịgha gị, nke ị ga-agha n’ala ubi gị; na achịcha nke ihe omume nke ala ubi, ọ ga-amakwa abụba, baa ụba: n’ụbọchị ahụ anụ ụlọ gị nile ga-ata nri n’ebe ịta nri sara mbara. Ehi kwa na ụmụ ịnyịnya ibu na-arụ ubi ga-ata nri a gwara agwa nke nnu dị ya, nke e jiworo oseke na ihe ịfụcha ọka fụchaa ya.” (Aịsaịa 30:23, 24) Achịcha ‘mara abụba ma baa ụba’—ihe oriri jupụtara n’ihe ndị na-edozi ahụ—ga-abụ ihe oriri bụ́ isi mmadụ ga na-eri kwa ụbọchị. Ala ahụ ga-eme nri n’ụba nke na ọbụna anụmanụ ga-erite uru. A ga-eji “nri a gwara agwa nke nnu dị ya” zụọ anụ ụlọ—nri dị ụtọ a na-adịghị ewepụta mgbe nile. Ọbụna na a ‘fụchawo’ ihe oriri a afụcha—ihe a na-emekarị nanị n’ọka ọ bụ mmadụ ga-eri. Lee nkọwa na-enye obi ụtọ Aịsaịa na-enyekwu n’ebe a iji gosi ịba ụba nke ngọzi Jehova n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi!
21. Kọwaa izu ezu nke ngọzi ndị ga-abịanụ.
21 “N’elu ugwu ọ bụla dị elu na n’elu ugwu nta ọ bụla dị elu ka iyi na ebe mmiri na-eru ga-adị.” (Aịsaịa 30:25a)c Aịsaịa na-enye nkọwa kwesịrị ekwesị nke na-emesi izu ezu nke ngọzi Jehova ike. A gaghị enwe ụkọ mmiri—ihe dị oké ọnụ ahịa nke ga-eru, ọ bụghị nanị n’ala dị larịị kamakwa n’elu ugwu nile, ọbụna “n’elu ugwu ọ bụla dị elu na n’elu ugwu nta ọ bụla dị elu.” Ee, agụụ agaghị adịkwa. (Abụ Ọma 72:16) Ọzọkwa, onye amụma ahụ cheziri ihu n’ihe ndị dị elu ọbụna karịa ugwu. “Ìhè ọnwa ga-adị ka ìhè anyanwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa, dị ka ìhè ụbọchị asaa, n’ụbọchị Jehova ga-ekechi mkpaji a kpajiri ndị Ya, mgbe Ọ ga-agwọkwa ọnyá e tipụtara n’otiti ya.” (Aịsaịa 30:26) Lee ka o si bụrụ mmezu na-akpali akpali nke amụma a mara mma! Ebube Chineke ga-egbukepụ nke ukwuu. Ngọzi ndị na-echere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke ga-akarị nnọọ—okpukpu asaa—ihe ọ bụla ha nwetụworo.
Ikpe na Ọṅụ
22. N’ụzọ dị iche ná ngọzi ndị ga-abịara ndị kwesịrị ntụkwasị obi, gịnị ka Jehova debeere ndị ajọ omume?
22 Ụda nke ozi Aịsaịa gbanwere ọzọ. Ọ sịrị: “Lee,” dị ka a ga-asị na ọ chọrọ ịdọta uche ndị na-ege ya ntị. “Aha Jehova na-esi n’ebe dị anya bịa, na-ere ọkụ n’iwe Ya, na-ewerekwa oké anwụrụ ọkụ na-akwụgo akwụgo: egbugbere ọnụ Ya jupụtara n’oké iwe, ire Ya dịkwa ọkụ na-erichapụ erichapụ.” (Aịsaịa 30:27) Ruo ugbu a, Jehova emebeghị ihe, na-enye ndị iro nke ndị ya ohere ime ihe masịrị ha. Ugbu a, ọ na-abịaru nso—dị ka oké ifufe nọgidere na-abịaru nso—imezu ihe e kpere n’ikpe. “Iku ume Ya dịkwa ka iyi na-erubiga ókè, ruo olu ka ọ na-ekewa, iji myọ nke ihe efu yọchaa mba nile: bridle nke na-edufu edufu ga-adịkwa n’agbà ndị dị iche iche.” (Aịsaịa 30:28) “Iyi na-erubiga ókè” ga-agba ndị iro nke ndị Chineke gburugburu, jiri “myọ” yọgharịsie ha ike, jirikwa “bridle” kwụsị ha. A ga-ebibi ha.
23. Gịnị na-enye ndị Kraịst “ọṅụ obi” taa?
23 Olu Aịsaịa gbanwekwara ọzọ ka ọ na-akọwa ọnọdụ obi ụtọ nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe, bụ́ ndị ga-alaghachi n’ala ha otu ụbọchị. “Abụ ka unu ga-enwe dị ka n’abalị e doworo ememe nsọ; na ọṅụ obi, dị ka nke onye ji ọjà eje ịba n’ugwu Jehova, ruo Oké Nkume nke Israel.” (Aịsaịa 30:29) Ezi ndị Kraịst taa na-enwe “ọṅụ obi” yiri nke ahụ ka ha na-atụgharị uche n’ikpe a ga-ama ụwa Setan; nchebe Jehova, bụ́ “oké nkume nke nzọpụta,” na-echebe ha; na ngọzi Alaeze ndị ga-abịanụ.—Abụ Ọma 95:1.
24, 25. Olee otú amụma Aịsaịa si emesi ike na ikpe na-abịanụ megide Asiria ga-eme eme?
24 Mgbe o kwusịrị okwu obi ụtọ a, Aịsaịa laghachiri n’okwu ikpe ma mee ka a mara ndị Chineke ga-ewesa iwe ya. “Jehova ga-emekwa ka a nụ ebube nke olu Ya, Ọ ga-emekwa ka a hụ ndakwasị nke ogwe aka Ya, n’ọnụma nke iwe Ya, na ire ọkụ nke ọkụ na-erichapụ erichapụ, na ntụpịa, na oké mmiri ozuzo, na akụ́ mmiri igwe. N’ihi na a ga-esite n’olu Jehova nyajisịa Asiria, Ọ ga-eji ndele tigbuo ya.” (Aịsaịa 30:30, 31) Aịsaịa ji nkọwa a doro anya mesie ike na ikpe Chineke megide Asiria ga-eme eme. Ya bụ, Asiria guzo n’ihu Chineke, na-amakwa jijiji mgbe ọ hụrụ “ndakwasị nke ogwe aka” ya nke ikpe.
25 Onye amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ngabiga ọ bụla nke mkpanaka a kara aka, nke Jehova ga-eme ka ọ dakwasị ya, ga-adịkwa n’egwú otiti na n’ụbọ akwara: ọ bụkwa n’agha dị iche iche nke mfegharị ka Ọ ga-ebuso ha agha. N’ihi na e dowo otu Tofet n’usoro site na mgbe gara aga; ee, nke ahụ ka e doziworo nye eze; O mewo ya ka ọ dị omimi, mee ya ka ọ saa mbara: obo ya bụ ọkụ na ọtụtụ nkụ; nku ume Jehova, dị ka iyi brimstone, na-afụnwu ya.” (Aịsaịa 30:32, 33) E ji Tofet, nke dị na ndagwurugwu Hinọm, mee ihe n’ebe a dị ka ebe ihe atụ nke ọkụ na-ere na ya. Site n’igosi na Asiria ga-aba n’ebe ahụ, Aịsaịa na-emesi ike mbibi mberede, nke zuru ezu, nke ga-abịakwasị mba ahụ.—Tụlee 2 Ndị Eze 23:10.
26. (a) Ihe ndị Jehova kwuru megide Asiria nwere mmezu dị aṅaa n’oge a? (b) Olee otú ndị Kraịst taa si echere Jehova?
26 Ọ bụ ezie na ozi ikpe a bụ megide Asiria, ihe amụma Aịsaịa pụtara gafere ya. (Ndị Rom 15:4) Jehova ga-esi ebe dị anya bịa ọzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iruchapụ ndị nile na-emegbu ndị ya, mee ka ha maa jijiji, ma kwụsị ha. (Ezikiel 38:18–23; 2 Pita 3:7; Mkpughe 19:11–21) Ka ụbọchị ahụ bịa ngwa ngwa! Ka ọ dịgodị, ndị Kraịst na-echesi ụbọchị mgbapụta ike. Ha na-enweta ume site n’ịtụgharị uche n’okwu ndị doro anya e dekọrọ n’Aịsaịa isi nke 30. Okwu ndị a na-agba ndị ohu Chineke ume iji ihe ùgwù nke ikpe ekpere kpọrọ ihe, ịdị uchu n’ịmụ Bible, na ịtụgharị uche ná ngọzi Alaeze ndị ga-abịanụ. (Abụ Ọma 42:1, 2; Ilu 2:1–6; Ndị Rom 12:12) Ya mere, ihe Aịsaịa kwuru na-enyere anyị nile aka ịdị na-echere Jehova.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Rịba ama na a sị na Juda kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụ ihe dị iche gaara eme.—Levitikọs 26:7, 8.
b Ọ bụ nanị n’ebe a ka a kpọrọ Jehova “Onye Nkụzi Ukwu” n’ime Bible.
c Aịsaịa 30:25b na-agụ, sị: “N’ụbọchị nke oké ogbugbu, mgbe ụlọ elu nile ga-ada.” Ná mmezu mbụ ya, nke a pụrụ izo aka n’ọdịda Babilọn, bụ́ nke mepere ụzọ maka Israel inweta ngọzi ndị e buru n’amụma n’Aịsaịa 30:18-26. (Lee paragraf nke 19.) Ọ pụkwara izo aka ná mbibi ga-ewere ọnọdụ n’Amagedọn, bụ́ nke ga-eme ka mmezu kasị ukwuu nke ngọzi ndị a n’ime ụwa ọhụrụ ahụ kwe omume.
[Foto ndị dị na peeji nke 305]
N’oge Mosis, ndị Israel si n’Ijipt pụọ. N’oge Aịsaịa, Juda gara Ijipt maka enyemaka
[Foto dị na peeji nke 311]
“N’elu ugwu nta ọ bụla dị elu ka iyi na ebe mmiri na-eru ga-adị”
[Foto dị na peeji nke 312]
Jehova ga-eji ‘iwe ya na oké anwụrụ ọkụ’ bịa