Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Onye Obibi Ya Agaghị Asị, Ana M Arịa Ọrịa”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
    • 5 N’oge ahụ dị egwu, ọ ga-adị ndị ji iguzosi ike n’ihe na-efe Jehova ofufe mkpa ịgakwuru ya maka enyemaka. Aịsaịa kpere ekpere otú a, sị: “Jehova, meere anyị amara; Gị ka anyị leworo anya: bụrụ ogwe aka [anyị nke ike na nkwado] kwa ụtụtụ, bụrụkwa nzọpụta anyị na mgbe ahụhụ. Site n’olu ụ̀zụ̀ ka ndị dị iche iche gbalagaworo; site ná [mbili] Gị ka mba nile gbasaworo.” (Aịsaịa 33:2, 3) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa na-ekpe ekpere ka Jehova gbapụta ndị Ya dị ka O meworo ọtụtụ ugboro n’oge ndị gara aga. (Abụ Ọma 44:3; 68:1) Ngwa ngwa Aịsaịa kpesịrị ekpere a, o buru amụma ihe bụ́ azịza Jehova!

  • “Onye Obibi Ya Agaghị Asị, Ana M Arịa Ọrịa”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
    • Asiria nke Oge A

      7. (a) Ònye taa ka a pụrụ iji tụnyere mba Israel nọ n’ọrịa ime mmụọ? (b) Ònye ga-abụ “mkpanaka” Jehova ga-eji bibie Krisendọm?

      7 Olee otú amụma Aịsaịa si emetụta oge anyị? A pụrụ iji mba Israel nọ n’ọrịa ime mmụọ tụnyere Krisendọm na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Dị nnọọ ka Jehova si jiri Asiria mee ihe dị ka “mkpanaka” iji nye Israel ntaramahụhụ, otú a ka ọ ga-esi jiri “mkpanaka” nye Krisendọm ntaramahụhụ—tinyere ndị ọzọ so n’alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ “Babilọn ukwu ahụ.” (Aịsaịa 10:5; Mkpughe 18:2–8) “Mkpanaka” ahụ ga-abụ mba ndị so n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu—òtù nke e sere onyinyo ya ná Mkpughe dị ka anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri.—Mkpughe 17:3, 15–17.

      8. (a) Ònye taa ka a pụrụ iji tụnyere Senakerib? (b) Ònye ka Senakerib nke oge a ga-enwe anyaike ịwakpo, gịnịkwa ga-esi n’ime ya pụta?

      8 Mgbe Asiria nke oge a wakwasịrị ógbè okpukpe ụgha nile, ọ ga-eyi ka a pụghị igbochi ya. N’inwe omume yiri nke Senakerib, Setan bụ́ Ekwensu ga-enwe anyaike ibibi—ọ bụghị nanị òtù dị iche iche si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị kwesịrị ịnata ntaramahụhụ, kamakwa ezi ndị Kraịst. Ọtụtụ nde mmadụ ndị siworo n’ụwa Setan pụta, nke gụnyere Babilọn Ukwu ahụ, ga-esonyere ihe fọdụrụ n’ụmụ ime mmụọ Jehova e tere mmanụ wee kwadoo Alaeze Jehova. N’ịbụ onye iwe ji n’ihi ọjụjụ ezi ndị Kraịst jụrụ ịkpọrọ ya isiala, “chi nke oge a,” bụ́ Setan, ga-ebuso ha agha n’eleghị anya n’azụ. (2 Ndị Kọrint 4:4; Ezikiel 38:10–16) N’agbanyeghị otú mwakpo a ga-adịru ná njọ, ọ gaghị adị mkpa ka ndị Jehova maa jijiji n’ụjọ. (Aịsaịa 10:24, 25) Chineke na-emesi ha obi ike na ya ga-abụrụ ha ‘nzọpụta na mgbe ahụhụ.’ Ọ ga-eme ihe, bibie Setan na ìgwè ndị so ya. (Ezikiel 38:18–23) Dị ka ọ dị n’oge ochie, a ga-apụnara ndị na-anwa ịpụnara ndị Chineke ihe, ihe! (Tụlee Ilu 13:22b.) A ga-edo aha Jehova nsọ, a ga-enyekwa ndị lanarịrịnụ ụgwọ ọrụ n’ihi ịchọ “amamihe na ihe ọmụma [na] egwu Jehova.”—Gụọ Aịsaịa 33:5, 6.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya