Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 26 p. 342-355
  • “Onye Obibi Ya Agaghị Asị, Ana M Arịa Ọrịa”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onye Obibi Ya Agaghị Asị, Ana M Arịa Ọrịa”
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịpụnara Onye Na-apụnara Mmadụ Ihe, Ihe
  • Asiria nke Oge A
  • Ịdọ Aka ná Ntị Nye Ndị Na-enweghị Okwukwe
  • ‘Ijegharị n’Ezi Omume Nile’
  • Ịhụ Eze Ha
  • Ọgwụgwọ
  • Na-echere Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Aịsaịa Ebuo Amụma Banyere ‘Ihe Omume Na-eju Anya’ nke Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 26 p. 342-355

Isi nke Iri Abụọ na Isii

“Onye Obibi Ya Agaghị Asị, Ana M Arịa Ọrịa”

Aịsaịa 33:1–24

1. N’ihi gịnị ka ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 33:24 ji enye nkasi obi?

“IHE e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” Nke a bụ ihe Pọl onyeozi kwuru. (Ndị Rom 8:22) N’agbanyeghị ọganihu ndị e nwere na nkà mmụta sayensị ọgwụ na ahụ ike, ọrịa na ọnwụ nọgidere na-eti agbụrụ mmadụ ihe otiti. Mgbe ahụ, lee ka nkwa e ji mechie akụkụ a nke amụma Aịsaịa si magbuo onwe ya! Cheedị echiche mgbe ‘onye obibi ya na-agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.’ (Aịsaịa 33:24) Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka a ga-esi mezuo nkwa a?

2, 3. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka mba Israel si nọrọ n’ọrịa? (b) Olee otú Asiria si jee ozi dị ka “mkpanaka” Chineke maka inye ahụhụ?

2 Aịsaịa dere akwụkwọ ya mgbe ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ nọ n’ọrịa ime mmụọ. (Aịsaịa 1:5, 6) Ha abamiela n’omume rụrụ arụ ma si n’ezi ofufe dapụ kpam kpam nke na ịdọ aka ná ntị siri ike sitere n’aka Jehova Chineke dị ha mkpa. Asiria jere ozi dị ka “mkpanaka” Jehova ji nye ha ahụhụ ahụ. (Aịsaịa 7:17; 10:5, 15) Nke mbụ, ndị Asiria meriri alaeze ebo iri nke Israel, nke dị n’ebe ugwu n’afọ 740 T.O.A. (2 Ndị Eze 17:1–18; 18:9–11) Afọ ole na ole ka e mesịrị, Eze Senakerib nke Asiria busoro alaeze ebe ndịda nke Juda agha n’eleghị anya n’azụ. (2 Ndị Eze 18:13; Aịsaịa 36:1) Mgbe usuu ndị agha Asiria ahụ wakwasịrị ala ahụ, o yiri ka ikpochapụ Juda kpam kpam ọ̀ bụ ihe a na-apụghị izere ezere.

3 Ma Asiria, n’ịgabiga ọrụ e nyere ya nke bụ́ inye ndị Chineke ahụhụ, chọwaziri imezu ọchịchọ anyaukwu ya nke bụ́ imeri ụwa. (Aịsaịa 10:7–11) Jehova ọ̀ ga-ahapụ ịta ha ahụhụ maka mmeso obi ọjọọ ha mesoro ndị ya? À ga-agwọta ọrịa ime mmụọ nke mba ahụ? N’Aịsaịa isi nke 33, anyị na-agụ azịza Jehova nye ajụjụ ndị a.

Ịpụnara Onye Na-apụnara Mmadụ Ihe, Ihe

4, 5. (a) Olee otú ihe ga-esi gbanweere Asiria? (b) Ekpere dị aṅaa ka Aịsaịa kpere maka ndị Jehova?

4 Amụma ahụ malitere, sị: “Ahụhụ ga-adịrị gị onye na-apụnara mmadụ ihe, ma gị onwe gị bụ onye a na-apụnaraghị ihe; onye na-aghọgbukwa aghọgbu, ma ha aghọgbughị gị! mgbe ị napụbiri mmadụ ihe, a ga-apụnara gị ihe; mgbe ị ghọgbubiri, ha ga-aghọgbu gị.” (Aịsaịa 33:1) Aịsaịa na-agwa onye ahụ na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ Asiria, okwu kpọmkwem. N’oge ọ dị ike karịsịa, mba ahụ nwere obi ọjọọ, yiri nke a na-apụghị imeri emeri. Ọ ‘pụnarawo mmadụ ihe ma a pụnaraghị ya ihe,’ bibie obodo dị iche iche nke Juda, ọbụna kwakọrọ akụ̀ na ụba dị n’ụlọ Jehova—n’ụzọ yiri ka ọ gaghị enweta ntaramahụhu! (2 Ndị Eze 18:14–16; 2 Ihe E Mere 28:21) Otú ọ dị, ugbu a, ihe ga-atụgharị. “A ga-apụnara gị ihe,” ka Aịsaịa ji anyaike kwuo. Lee ka amụma a si bụrụ ihe nkasi obi nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi!

5 N’oge ahụ dị egwu, ọ ga-adị ndị ji iguzosi ike n’ihe na-efe Jehova ofufe mkpa ịgakwuru ya maka enyemaka. Aịsaịa kpere ekpere otú a, sị: “Jehova, meere anyị amara; Gị ka anyị leworo anya: bụrụ ogwe aka [anyị nke ike na nkwado] kwa ụtụtụ, bụrụkwa nzọpụta anyị na mgbe ahụhụ. Site n’olu ụ̀zụ̀ ka ndị dị iche iche gbalagaworo; site ná [mbili] Gị ka mba nile gbasaworo.” (Aịsaịa 33:2, 3) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa na-ekpe ekpere ka Jehova gbapụta ndị Ya dị ka O meworo ọtụtụ ugboro n’oge ndị gara aga. (Abụ Ọma 44:3; 68:1) Ngwa ngwa Aịsaịa kpesịrị ekpere a, o buru amụma ihe bụ́ azịza Jehova!

6. Gịnị ga-eme Asiria, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị ekwesị?

6 “A ga-achịkọtakwa ihe unu [ndị Asiria] a kwatara n’agha dị ka nchịkọta nke ọbụbụ: dị ka mgbagharị nke igurube, otú a ka ọ na-agbagharị n’elu ya.” (Aịsaịa 33:4) Juda maara nke ọma banyere mwakpo nke ụmụ ahụhụ na-emebi ihe. Otú ọ dị, na nke ugbu a, ọ bụ ndị iro Juda ka a ga-ebibi. A ga-emeri Asiria n’ụzọ na-eme ihere, a ga-amanyekwa ndị agha ya ịgba ọsọ, na-ahapụrụ ndị bi na Juda ihe nkwata dị ukwuu ka ha kwara! O kwesịrị nnọọ ekwesị na a ga-apụnara Asiria a ma ama maka obi ọjọọ ya ihe.—Aịsaịa 37:36.

Asiria nke Oge A

7. (a) Ònye taa ka a pụrụ iji tụnyere mba Israel nọ n’ọrịa ime mmụọ? (b) Ònye ga-abụ “mkpanaka” Jehova ga-eji bibie Krisendọm?

7 Olee otú amụma Aịsaịa si emetụta oge anyị? A pụrụ iji mba Israel nọ n’ọrịa ime mmụọ tụnyere Krisendọm na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Dị nnọọ ka Jehova si jiri Asiria mee ihe dị ka “mkpanaka” iji nye Israel ntaramahụhụ, otú a ka ọ ga-esi jiri “mkpanaka” nye Krisendọm ntaramahụhụ—tinyere ndị ọzọ so n’alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ “Babilọn ukwu ahụ.” (Aịsaịa 10:5; Mkpughe 18:2–8) “Mkpanaka” ahụ ga-abụ mba ndị so n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu—òtù nke e sere onyinyo ya ná Mkpughe dị ka anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri.—Mkpughe 17:3, 15–17.

8. (a) Ònye taa ka a pụrụ iji tụnyere Senakerib? (b) Ònye ka Senakerib nke oge a ga-enwe anyaike ịwakpo, gịnịkwa ga-esi n’ime ya pụta?

8 Mgbe Asiria nke oge a wakwasịrị ógbè okpukpe ụgha nile, ọ ga-eyi ka a pụghị igbochi ya. N’inwe omume yiri nke Senakerib, Setan bụ́ Ekwensu ga-enwe anyaike ibibi—ọ bụghị nanị òtù dị iche iche si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị kwesịrị ịnata ntaramahụhụ, kamakwa ezi ndị Kraịst. Ọtụtụ nde mmadụ ndị siworo n’ụwa Setan pụta, nke gụnyere Babilọn Ukwu ahụ, ga-esonyere ihe fọdụrụ n’ụmụ ime mmụọ Jehova e tere mmanụ wee kwadoo Alaeze Jehova. N’ịbụ onye iwe ji n’ihi ọjụjụ ezi ndị Kraịst jụrụ ịkpọrọ ya isiala, “chi nke oge a,” bụ́ Setan, ga-ebuso ha agha n’eleghị anya n’azụ. (2 Ndị Kọrint 4:4; Ezikiel 38:10–16) N’agbanyeghị otú mwakpo a ga-adịru ná njọ, ọ gaghị adị mkpa ka ndị Jehova maa jijiji n’ụjọ. (Aịsaịa 10:24, 25) Chineke na-emesi ha obi ike na ya ga-abụrụ ha ‘nzọpụta na mgbe ahụhụ.’ Ọ ga-eme ihe, bibie Setan na ìgwè ndị so ya. (Ezikiel 38:18–23) Dị ka ọ dị n’oge ochie, a ga-apụnara ndị na-anwa ịpụnara ndị Chineke ihe, ihe! (Tụlee Ilu 13:22b.) A ga-edo aha Jehova nsọ, a ga-enyekwa ndị lanarịrịnụ ụgwọ ọrụ n’ihi ịchọ “amamihe na ihe ọmụma [na] egwu Jehova.”—Gụọ Aịsaịa 33:5, 6.

Ịdọ Aka ná Ntị Nye Ndị Na-enweghị Okwukwe

9. (a) Gịnị ka ndị “dimkpa” na “ndị ozi udo” nke Juda ga-eme? (b) Olee otú Asiria ga-esi meghachi omume banyere ịchọ udo nke Juda?

9 Otú ọ dị, gịnị ga-eme ndị na-enweghị okwukwe nọ na Juda? Aịsaịa nyere nkọwa olileanya na-adịghị na ya banyere ọdachi ga-abịakwasị ha site n’aka Asiria. (Gụọ Aịsaịa 33:7.) Ndị agha Juda bụ́ ndị “dimkpa” ji ụjọ na-eti mkpu n’ihi mwakpo ndị Asiria. “Ndị ozi udo,” bụ́ ndị nnọchianya e zipụrụ ka ha soro ndị Asiria ahụ nwere omume ịlụ agha mee udo, bụ ndị e mere akaje, menyekwa ihere. Ha ga-akwasi ákwá ike n’ihi enweghị ihe ịga nke ọma ha. (Tụlee Jeremaịa 8:15.) Asiria nwere obi ọjọọ agaghị emere ha ebere. (Gụọ Aịsaịa 33:8, 9.) Ọ ga-eji obi ịta mmiri lelịa ọgbụgba ndụ nke ya na ndị bi na Juda gbara. (2 Ndị Eze 18:14–16) Asiria ‘ga-ajụ obodo nile’ nke Juda, na-ele ha anya nlelị na nke ịkwa emo, n’enweghị mmetụta ọ bụla maka ndụ ndị mmadụ. Ọnọdụ ga-adị nnọọ njọ nke na ala ahụ n’onwe ya ga-eru újú, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Lebanọn, Sherọn, Beshan, na Kamel ga-erukwa újú n’ihi mbibi ahụ.

10. (a) Olee otú ndị “dimkpa” nke Krisendọm ga-esi bụrụ ndị na-adịghị ike? (b) Ònye ga-echebe ezi ndị Kraịst n’ụbọchị ahụhụ Krisendọm?

10 Obi abụọ adịghị ya na ọnọdụ yiri nke ahụ ga-ebilite n’ọdịnihu dị nso mgbe mba dị iche iche malitere mwakpo ha megide okpukpe. Dị ka ọ dị n’ụbọchị Hezekaịa, iguzogide usuu ndị agha a na-ebibi ihe n’ụzọ nkịtị agaghị enwe isi. Ndị “dimkpa” nke Krisendọm—ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, ndị oji ego achụ ego, na ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu—apụghị inyere ya aka. A ga-ebibi ‘ọgbụgba ndụ,’ ma ọ bụ nkwekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ego, ndị e mere iji chebe Krisendọm. (Aịsaịa 28:15–18) Oké mgbalị ndị e mere iji gbochie mbibi ya site n’inwe nkwurịta okwu ga-akụ afọ n’ala. Azụmahịa ga-akwụsị, n’ihi na a ga-ejichi ma ọ bụ bibie ngwongwo na atụmatụ achụmnta ego dị iche iche nke Krisendọm. Ọ dịghị ihe onye ọ bụla ka nwere omume enyi n’ebe Krisendọm nọ ga-eme ma ọ́ bụghị nanị ịnọ n’ebe dị anya na-eru újú maka mbibi ya. (Mkpughe 18:9–19) À ga-ebibikọta ezi Iso Ụzọ Kraịst na nke ụgha? Ee e, n’ihi na Jehova n’onwe ya na-enye mmesi obi ike a, sị: “Ugbu a ka M ga-ebili, ka Jehova na-asị; ugbu a ka M ga-eme onwe m ka M dị elu; ugbu a ka a ga-ebuli m.” (Aịsaịa 33:10) N’ikpeazụ, Jehova ga-eme ihe n’ihi ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Hezekaịa ma kwụsị mwakpo nke Asiria.—Abụ Ọma 12:5.

11, 12. (a) Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ihe e kwuru n’Aịsaịa 33:11–14 si mezuo? (b) Ihe Jehova kwuru na-enye ịdọ aka ná ntị dị aṅaa maka taa?

11 Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi apụghị ịdabere ná nchebe dị otú ahụ. Jehova na-ekwu, sị: “Unu ga-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu ga-amụ ahịhịa ọka: nku ume unu bụ ọkụ nke ga-erichapụ unu. Ndị dị iche iche ga-adịkwa ka lime a kpọrọ ọkụ: dị ka ogwu e gbuturu egbutu, nke a na-esure n’ọkụ. Unu ndị nọ n’ebe dị anya, nụrụnụ ihe M meworo; unu kwa ndị nọ nso, maranụ ịdị ike m. Ndị mmehie na-atụ oké egwu n’ime Zaịọn; ọma jijiji ejidewo ndị e merụrụ emerụ. Ònye n’etiti anyị ga-anọ dị ka ọbịa n’ebe ọkụ na-erichapụ erichapụ dị? ònye n’etiti anyị ga-anọ dị ka ọbịa n’ebe ọkụ na-ere ere ebighị ebi dị?” (Aịsaịa 33:11–14) Dị ka ihe àmà na-egosi, okwu ndị a na-emetụta oge Juda chere onye iro ọhụrụ, bụ́ Babilọn, ihu. Mgbe Hezekaịa nwụsịrị, Juda laghachiri n’ụzọ ọjọọ ya. Ruo iri afọ ole na ole sochirinụ, ọnọdụ dị na Juda kara njọ ruo n’ókè nke na ọkụ nke iwe Chineke aghaghị irepịa mba ahụ dum.—Deuterọnọmi 32:22.

12 Atụmatụ ọjọọ ndị nnupụisi mere na nkata ha kpara iji zere ikpe Chineke enweghị isi. N’ezie, mmụọ mpako na nke nnupụisi nke mba ahụ ga-akpasu kpọmkwem ihe omume ndị ga-eduje ná mbibi ya. (Jeremaịa 52:3–11) Ndị ajọ omume ‘ga-adị ka lime a kpọrọ ọkụ’—ndị e bibiri kpam kpam! Ka ha nọ na-atụgharị uche n’ọdachi a na-abịanụ, ndị bi na Juda, bụ́ ndị na-enupụ isi, nọ n’oké ụjọ. Ihe Jehova gwara Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-enye ihe atụ nke ọnọdụ ndị nọ na Krisendọm taa nọ na ya. Ma ha aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke, ọdịnihu dị njọ na-echere ha.

‘Ijegharị n’Ezi Omume Nile’

13. Olee nkwa e kwere onye “na-ejegharị n’ezi omume nile,” oleekwa otú e si mezuo ya n’ihe banyere Jeremaịa?

13 N’iji gosi ọdịiche, Jehova kwuziri, sị: “Ọ bụ onye na-ejegharị n’ezi omume nile, nke na-ekwukwa okwu nile ziri ezi; nke na-ajụ uru mmegbu nile, nke na-etichapụ ọbụ aka ya abụọ n’ijide ihe iri ngo, nke na-akwụchi ntị ya abụọ ka ọ ghara ịnụ okwu banyere ịwụsị ọbara, nke na-atachikwa anya ya abụọ ka ọ ghara ilekwasị ihe ọjọọ anya; onye ahụ ga-ebi n’ebe dị elu: ebe e wusiri ike nke nkume dị elu ka ụlọ elu ya ga-abụ: a na-enye ya nri ya; mmiri ya kwesịrị ntụkwasị obi.” (Aịsaịa 33:15, 16) Dị ka Pita onyeozi si mesịa kwuo ya, “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.” (2 Pita 2:9) Jeremaịa nwetara mgbapụta dị otú ahụ. N’oge nnọchibido nke Babilọn, ndị mmadụ ‘riri achịcha n’ọ̀tụ̀tụ̀ na n’ime nchegbu.’ (Ezikiel 4:16) Ụmụ nwanyị ụfọdụ riri ọbụna anụ ahụ ụmụ ha. (Abụ Ákwá 2:20) Ma, Jehova hụrụ na e chebere Jeremaịa.

14. Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi nọgide “na-ejegharị n’eziokwu nile”?

14 N’otu aka ahụ, ndị Kraịst taa aghaghị ịdị “na-ejegharị n’ezi omume nile,” na-edebe ụkpụrụ Jehova kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 15:1–5) Ha aghaghị ‘ikwu ihe ziri ezi’ ma jụ okwu ụgha nile. (Ilu 3:32) Igwu wayo na inye aka azụ pụrụ ịbụ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ala, ma ha bụ ihe na-asọ oyi nye onye “na-ejegharị n’ezi omume nile.” Ndị Kraịst aghaghịkwa ịnọgịde na-enwe “akọ na uche ọma” n’achụmnta ego, jiri nlezianya na-ezere atụmatụ wayo ma ọ bụ ndị a na-enyo enyo. (Ndị Hibru 13:18; 1 Timoti 6:9, 10) Onye ‘kwụchiworo ntị ya ka ọ ghara ịnụ okwu banyere ịwụsị ọbara, tachiekwa anya ya ka ọ ghara ilekwasị ihe ọjọọ anya’ ga na-eme nhọrọ n’egwú na ná ntụrụndụ na-amasị ya. (Abụ Ọma 119:37) N’ụbọchị ikpe ya, Jehova ga-echebe ma kwadoo ndị na-efe ya, ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị otú ahụ.—Zefanaịa 2:3.

Ịhụ Eze Ha

15. Nkwa dị aṅaa ga-akwagide ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi bi ná mba ọzọ?

15 Aịsaịa nyeziri ntakịrị nkọwa a na-akpali akpali banyere ọdịnihu: “Eze n’ịma mma ya ka anya gị abụọ ga-ahụ: ha ga-ahụ ala nke ebe nile ọ sọtụrụ dị anya. Obi gị ga-eche echiche oké ụjọ ahụ: olee ebe onye na-agụ ọnụ nọ? olee ebe onye na-atụ ego ụtụ nọ? olee ebe onye na-agụ ụlọ elu ọnụ nọ? Ndị ahụ nke nwere anyaike, ị gaghị ahụ ya, bụ́ ndị asụsụ ya miri emi karị ọnụnụ; nke ire ya na-asụ nsụ na-adịghị aghọta.” (Aịsaịa 33:17–19) Nkwa maka Eze Mesaịa ga-abịa n’ọdịnihu na Alaeze ya ga-akwagide ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ọtụtụ iri afọ ahụ nke ije biri na Babilọn, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịhụ Alaeze ahụ nanị site n’ebe dị anya. (Ndị Hibru 11:13) Mgbe ọchịchị Mesaịa ahụ ga-emesị bịa, a ga-echefu obi ọjọọ nke Babilọn. Ndị lanarịrị mwakpo nke Asiria ga-eji obi ụtọ jụọ, sị: “Olee ebe ndị isi nke onye ọchịchị aka ike ahụ nọ, bụ́ ndị na-ana anyị ụtụ isi, ndị na-ebo anyị ebubo, na ndị naara anyị ụtụ?”—Aịsaịa 33:18, Moffatt.

16. Kemgbe ole mgbe ka ndị Chineke nweworo ike ‘ịhụ’ Eze Mesaịa ahụ, gịnịkwa si n’ime ya pụta?

16 Ọ bụ ezie na ihe ndị Aịsaịa kwuru na-eme ka e jide n’aka na a ga-eweghachi ha site n’ịbụ ndị Babilọn ji eji, ndị Juu bi n’ala ọzọ aghaghị ichere, n’otu n’otu, mbilite n’ọnwụ iji nụ ụtọ mmezu zuru ezu nke akụkụ a nke amụma ahụ. Olee banyere ndị ohu Chineke taa? Kemgbe 1914, ndị Jehova enwewo ike ‘ịhụ,’ ma ọ bụ ịmata, Eze Mesaịa ahụ bụ́ Jisọs Kraịst, n’ịma mma ime mmụọ ya nile. (Abụ Ọma 45:2; 118:22–26) N’ihi ya, a gbapụtawo ha ná mmegbu na nchịkwa nke ajọ usoro ihe Setan. N’okpuru Zaịọn, bụ́ isi ọnọdụ nke Alaeze Chineke, ha nọ n’ezi nchebe ime mmụọ.

17. (a) Nkwa dịgasị aṅaa ka e kwere banyere Zaịọn? (b) Olee otú e si mezuo nkwa Jehova kwere banyere Zaịọn n’ebe Alaeze Mesaịa dị na n’ebe ndị na-akwado ya n’elu ala nọ?

17 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Lekwasị Zaịọn anya, bụ́ obodo nke mgbe nile anyị a kara aka: anya gị abụọ ga-ahụ Jerusalem na ọ bụ ụlọ obibi dị jụụ, ụlọikwuu nke a na-agaghị ebupụ ebupụ, nke a na-agaghị efopụ ntu ya ọ bụla ruo mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghị adọbikwa ụdọ ya ọ bụla. Kama n’ebe ahụ ka Onye dị ebube, bụ́ Jehova, ga-anọdụrụ anyị, dị ka ebe ọtụtụ osimiri na ụzọ dị iche iche mmiri si eru nke sara mbara n’aka abụọ; ụgbọ ụmara agaghị aga n’ime ya, ụgbọ dị ebube agaghị agabigakwa n’elu ya.” (Aịsaịa 33:20, 21) Aịsaịa na-emesi anyị obi ike na a pụghị ifopụ ma ọ bụ bibie Alaeze Mesaịa nke Chineke. Ọzọkwa, n’ụzọ doro anya nchebe dị otú ahụ ga-erute ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado Alaeze ahụ n’elu ala taa. Ọ bụrụgodị na e tinye ọtụtụ mmadụ n’ule ndị siri ike, a na-emesi ndị Alaeze Chineke ga-achị obi ike na ọ dịghị mgbalị ọ bụla e mere ibibi ha dị ka ọgbakọ nke pụrụ ịga nke ọma. (Aịsaịa 54:17) Jehova ga-echebe ndị ya otú ekpe mmiri juru na ya ma ọ bụ ọwa mmiri si echebe obodo. A ga-ebibi onye iro ọ bụla na-abịa imegide ha—ọbụna onye siri ike dị ka “ụgbọ ụmara” ma ọ bụ “ụgbọ dị ebube”!

18. Ibu ọrụ dị aṅaa ka Jehova nakweere?

18 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ndị hụrụ Alaeze Chineke n’anya pụrụ iji nwee nnọọ obi ike banyere nchebe Chineke? Aịsaịa na-akọwa, sị: “Jehova bụ onyeikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị; Ya onwe ya ga-azọpụta anyị.” (Aịsaịa 33:22) Jehova nakweere ibu ọrụ nke ichebe na iduzi ndị ya, bụ́ ndị matara ọkwá ya dị ka Eze Kasị Elu. Ndị a ji obi ha na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi ya site n’aka Eze Mesaịa ya, na-amata na Jehova nwere ikike, ọ bụghị nanị iji tie iwu kamakwa iji hụ na e debere ya. Otú ọ dị, n’ihi na Jehova bụ onye hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya, ịchịisi ya site n’aka Ọkpara ya abụghịrị ndị na-efe ya ibu arọ. Kama nke ahụ, ha ‘na-abara onwe ha uru’ site n’ido onwe ha n’okpuru ọchịchị ya. (Aịsaịa 48:17) Ọ dịghị mgbe ọ ga-ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya.—Abụ Ọma 37:28.

19. Olee otú Aịsaịa si kọwaa adịghị ike nke ndị iro nke ndị Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi?

19 Aịsaịa na-agwa ndị iro nke ndị Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “A tọsawo ụdọ gị nile; ha adịghị ejisi úkwù akpụ ha ike, ha agbasaghị ọkọlọtọ ha: mgbe ahụ e kesara ihe a lụtara n’agha, bụ́ ihe a kwatara n’ụba; ndị ngwụrọ lụtara ihe nlụta n’agha.” (Aịsaịa 33:23) Onye iro ọ bụla na-akpụdewe agaghị adị ike ma bụrụ onye na-enweghị onye enyemaka imegide Jehova dị nnọọ ka ụgbọ mmiri agha nke ụdọ ya tọsara atọsa, nke úkwù akpụ ya na-esighị ike, nke na-enweghịkwa ákwà ifufe. Mbibi a ga-ebibi ndị iro Chineke ga-eme ka e nwee ọtụtụ ihe nkwata nke na ọbụna ndị nwere nkwarụ ga-eso kwata ihe. N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ike na site n’aka Eze bụ́ Jisọs Kraịst, Jehova ga-emeri ndị iro ya “n’oké mkpagbu” ahụ na-abịanụ.—Mkpughe 7:14.

Ọgwụgwọ

20. Ndị Chineke ga-enweta ụdị ọgwụgwọ dị aṅaa, olee mgbekwa?

20 Akụkụ a nke amụma Aịsaịa ji nkwa na-enye obi ụtọ mechie: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa: a ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.” (Aịsaịa 33:24) Ọrịa Aịsaịa na-ekwu okwu ya bụ n’ụzọ bụ́ isi, ọrịa ime mmụọ, n’ihi na e jikọtara ya na mmehie, ma ọ bụ “ajọ omume.” Mgbe mbụ e ji okwu ndị a mee ihe, Jehova kwere nkwa na mgbe a tọhapụsịrị ha n’ojiji ndị Babilọn ji ha, a ga-agwọ mba ahụ n’ụzọ ime mmụọ. (Aịsaịa 35:5, 6; Jeremaịa 33:6; Tụlee Abụ Ọma 103:1–5.) Ebe a gbagharawooro ha mmehie mbụ ha, ndị Juu ahụ na-alọtanụ ga-eguzobeghachi ofufe dị ọcha na Jerusalem.

21. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị na-efe Jehova taa si enweta ọgwụgwọ ime mmụọ?

21 Otú ọ dị, amụma Aịsaịa nwere mmezu nke oge a. Ndị Jehova taa enwetawokwa ọgwụgwọ ime mmụọ. A tọhapụwo ha n’ozizi ụgha ndị dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, Atọ n’Ime Otu, na ọkụ ala mmụọ. A na-enye ha nduzi banyere omume, na-eme ka ha nwere onwe ha pụọ n’omume rụrụ arụ ma na-enyere ha aka ime mkpebi ndị ziri ezi. N’ihi àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ha bụ ndị dị ọcha n’ihu Chineke ma nwee akọ na uche dị ọcha. (Ndị Kọlọsi 1:13, 14; 1 Pita 2:24; 1 Jọn 4:10) Ọgwụgwọ ime mmụọ a bara uru n’ụzọ nkịtị. Dị ka ihe atụ, izere mmekọahụ rụrụ arụ na iji ihe ndị e ji ụtaba mee eme ihe na-echebe ndị Kraịst pụọ n’ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ nakwa ụdị ọrịa cancer ụfọdụ.—1 Ndị Kọrint 6:18; 2 Ndị Kọrint 7:1.

22, 23. (a) Mmezu dị aṅaa dị ebube ka Aịsaịa 33:24 ga-enwe n’ọdịnihu? (b) Gịnị bụ mkpebi nke ndị na-efe ezi ofufe taa?

22 Ọzọkwa, a ga-enwe mmezu ka ukwuu nke ihe ndị ahụ e kwuru n’Aịsaịa 33:24 mgbe Amagedọn gasịrị, n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. N’oge ọchịchị Alaeze Mesaịa ahụ, ụmụ mmadụ ga-enweta ọgwụgwọ nkịtị nakwa ọgwụgwọ ime mmụọ dị ukwuu. (Mkpughe 21:3, 4) Ntakịrị oge mgbe e bibisịrị ajọ usoro ihe Setan, ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’ụwa nile a ga-enwe ọrụ ebube yiri ndị ahụ Jisọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Ndị ìsì ga-ahụ ụzọ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe, ndị ngwụrọ ga-eje ije! (Aịsaịa 35:5, 6) Nke a ga-eme ka ndị nile lanarịrị oké mkpagbu ahụ nwee ike ikere òkè n’ọrụ ahụ dị ebube nke ime ka ụwa ghọọ paradaịs.

23 Mgbe e mesịrị, mgbe mbilite n’ọnwụ malitere, obi abụọ adịghị ya na ndị na-ebilite n’ọnwụ ga-eji ezi ahụ ike wee na-ebilite. Ma ka a na-eji uru nke àjà mgbapụta ahụ eme ihe n’ụzọ buru ibu karị, a ga-enwe uru nkịtị ndị ọzọ, ruo mgbe a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ ruo izu okè. Mgbe ahụ, ndị ezi omume ‘ga-adị ndụ’ n’echiche kasị zuo ezuo. (Mkpughe 20:5, 6) N’oge ahụ, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ nkịtị, “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Lee nkwa na-akpali akpali ọ bụ! Ka ndị nile na-efe ezi ofufe taa kpebie iso ná ndị ga-ahụ mmezu ya!

[Foto dị na peeji nke 344]

Aịsaịa ji obi ike kpegara Jehova ekpere

[Foto ndị dị na peeji nke 353]

N’ihi àjà mgbapụta ahụ, ndị Jehova dị ọcha n’ihu ya

[Foto dị na peeji nke 354]

N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-enwe ọgwụgwọ nkịtị n’ụzọ dị ukwuu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya