Isi 16
“Oké Ìgwè Mmadụ” ahụ Nọ Ugbu A ‘n’Ụzọ ahụ A Tụliri Atụli’ iru Nzukọ Chineke
1, 2. Olee mgbe Aịsaịa isi 35 nwere mmezu nke ime mmụọ, nkọwa dịkwa aṅaa ka amaokwu abụọ ndị mbụ na-enye?
N’OGE Ọchịchị Narị Afọ Iri nke “Onyeisi Udo” ahụ, ọtụtụ akụkụ nke Aịsaịa isi 35, nke na-emezu ugbu a tupu mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ, ga-enwe mmetụta n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ụzọ nkịtị. N’ihi na ihe a ga-emezuworị n’ụzọ ime mmụọ ga-emezu n’ezie n’ụzọ a na-ahụ anya. Mmezu ka ukwuu n’ụzọ ime mmụọ nke amụma nke a na-ewere ọnọdụ ugbu a, site ná mweghachi e weghachiri ndị ohu Chineke pụọ n’ịbụ ndị mkpọrọ nke Babilọn Ukwu ahụ. Aịsaịa onye amụma kọwara ya n’okwu ọma ndị a a haziri nke ọma:
2 “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. Ọ ga-agbawa nke ukwuu, tegharịakwa egwu ọṅụ, ee, n’itegharị egwu ọṅụ na n’iti mkpu ọṅụ; nsọpụrụ Lebanọn ka a ga-enye ya, ee, ịma mma nke Kamel na Sherọn: ndị a ga-ahụ ebube Jehova.”—Aịsaịa 35:1, 2.
3. Laa azụ na narị afọ nke isii T.O.A., olee ebe ala ahụ tọgbọrọ n’efu dị, oleekwa otú ọ pụrụ isi tie mkpu ọṅụ?
3 Olee ebe ọzara na ala kpọrọ nkụ na ala ihe na-adịghị dị? Na narị afọ nke isii T.O.A., ha dị n’ókèala nke alaeze Juda. Rule 537 T.O.A., ala ahụ atọgbọrọwo n’efu, o nweghịkwa ndị bi na ya ruo 70 afọ. Ma olee otú ọzara pụrụ isi tie mkpu ọṅụ? Ọ ga-adị mkpa ka e mee ka ndị bibu n’ime ya lọghachi. A gaje ibuli ya elu site n’ọnọdụ ya e wedara n’ala wee nye ya ùgwù nke oké ugwu dị elu nke Lebanọn nke dị ebube n’ile anya.
Ịkụ Ubi Iden nke Ihe Atụ
4, 5. (a) Olee mgbe n’oge anyị a, ka mgbanwe yiri nke ahụ nke ala dị otú ahụ a jụrụ ajụ weere ọnọdụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ka ọrụ mwughachi ihe nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ rụpụtara? (ch) Olee otú Aịsaịa 35:5-7 si kọwaa ọnọdụ ime mmụọ ha e mere ka ọ dị ọhụrụ ọzọ?
4 N’echiche nke ime mmụọ, ihe kwekọrọ ná mgbanwe nke a nke ala n’oge a site n’ọdịdị nke ọnọdụ Chineke jụrụ ajụ gaa n’ọnọdụ na-enye ihe àmà ya nke ihu ọma Jehova e nwekwara ọzọ malitere iwere ọnọdụ na 1919. Ndị Jehova e weghachiri n’ọnọdụ ha kpebisiri ike iji oge udo ahụ e meghepụụrụ ha mgbe ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, kenyere ihe fọdụrụ ahụ nke ndị Israel ime mmụọ ahụ e mere ka ha nwere onwe ha ọrụ dị ukwuu nke kwekọrọ ná mwughachi nke ụlọ nsọ Jehova site n’aka ihe fọdụrụ ahụ nke Israel oge ochie, bụ́ ndị e mere ka ha laghachi n’ala ha, mgbe 537 T.O.A. gasịrị. Ọrụ mwughachi ihe ndị ahụ mgbe 1919 gasịrị rụpụtara ọkụkụ nke ubi Iden nke ihe atụ.
5 E buwo nke a n’amụma n’okwu ndị a nke Aịsaịa nke 35: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ: n’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara ná mmiri: n’ebe obibi nkịta ọhịa, ebe ha na-amakpu amakpu, ogige nke dịịrị amị̀ na papyrus.”—Aịsaịa 35:5-7.
6. Gịnị ka ndịgide gara n’ihu nke ihe dị n’oge a yiri Edọm na-egbochighị, oleekwa ndị taa na-eti mkpu ọṅụ, ha na ihe fọdụrụ ahụ e weghachiri n’ọnọdụ ha?
6 Ịdị adị nke ihe dị taa nke yiri Edọm egbochibeghị mweghachi nke Israel ime mmụọ gaa n’ọnọdụ nke paradaịs ná mmezu nke Aịsaịa isi 35. Ya mere ndị Edọm nke oge a enweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ dị ka ihe fọdụrụ nke Israel ime mmụọ ahụ na-eme, tinyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-aba ụba. “Oké ìgwè mmadụ” ahụ nwere òkè dị ukwuu n’ilekọta paradaịs ime mmụọ ahụ nke Ndịàmà Jehova nke oge a.
7. Gịnị ka anya nghọta nke ihe fọdụrụ ahụ na-ahụghị ma ọlị tupu 1914, ma è meghere anya ha ‘kpuru ìsì’?
7 Tupu ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl, ọ dịghị mgbe ọ bụla e meghere anya nghọta nke ndị Israel ime mmụọ ahụ ịhụ na nsogbu ụwa nke gaje itiwapụ na 1914 ga-agwụ ma a ka nweekwa ihe fọdụrụ n’etiti ha n’elu ala ebe a. Ha ahụghịkwa na ha na “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ ga-abụ ndị e nyere ihu ọma nke inwe ihe ùgwù nke ịgba àmà zuru ụwa ọnụ nye nguzobe nke Alaeze Mesaịa nke Chineke. Ya mere ihe mere na 1919 bụ na e meghere anya ndị ahụ kpuru ìsì n’ime mmụọ nke ihe fọdụrụ ahụ, leekwa ọhụụ nke ihe ga-eme n’ọdịhihu dị nso nke anya ndị ahụ mepere emepe hụrụ!
8. Mmetụta dị aṅaa ka mgbakọ ukwu abụọ e mere na Cedar Point, Ohio, nwere ná ntị na ire ime mmụọ nke ihe fọdụrụ ahụ e weghachiri n’ọnọdụ ha?
8 Ná mgbakọ ukwu ndị ha nwere na Cedar Point, Ohio, na 1919 na 1922, a gwara ha ihe ụfọdụ banyere ọrụ ahụ dị n’ihu. Ha bagidere ọrụ ahụ dị ha n’ihu. E meghere ntị ime mmụọ ha ịnụ ozi na-akpali akpali nke Alaeze Chineke na mkpa ọ dị ịkpọsa ya. Dị ka ele, ha maliri nnọọ ije ozi dị ka ndị na-agba àmà n’ihi Alaeze ahụ e kpeworo ekpere maka ya ruo ogologo oge. Ire ha, bụ́ nke ogbi daworo n’oge gara aga, tiri mkpu ọṅụ banyere Alaeze Mesaịa ahụ nke dị n’ike ọchịchị n’eluigwe.—Mkpughe 14:1-6.
9. N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, olee otú o si bụrụ na mmiri gbawapụtara n’ọzara?
9 Ee, ọ dị nnọọ ka à ga-asị na mmiri gbawapụtara n’ala ime mmụọ nke kpọworo nkụ ná mbụ ma tọgbọrọ n’efu, nke na ugbu a ihe nile na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na-enwe ume ọhụrụ n’ụba—dịrị njikere imepụta ihe n’ụzọ kasịnụ. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị Jehova e weghachiri n’ọnọdụ ha ṅụrịrị ọṅụ n’ụzọ dị ukwuu ma nwee mmetụta nke ndị nwere ume ọhụrụ dị ka ele nke na-eji ike ike arịgo n’ebe ndị dị elu! N’ezie, mmiri nke eziokwu banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke e guzobere n’aka Jisọs Kraịst na 1914, jiri ike na-aba ụba na-asọpụta, na-arụpụta ime ka e nwee ume ọhụrụ n’ụzọ dị ukwuu.—Aịsaịa 44:1-4.
“Ụzọ A Tụliri Atụli” nke Ịdị Nsọ
10, 11. (a) Gịnị ka mgbanwe nke a na-enye ume ọhụrụ na-egosi? (b) Site n’okporo ụzọ dị aṅaa ka ihe fọdụrụ ahụ ruru paradaịs ime mmụọ ha, oleekwa otú Aịsaịa 35:8, 9 si akọwa ya?
10 Gịnị ka ihe ndị e kwuworo na-egosi? Ọ bụ nke a: Nke mbụ, ihe fọdụrụ ahụ na mgbe e mesịrị “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” esiwo na Babilọn Ukwu ahụ pụta, e mewokwa ha ndịàmà nke Alaeze Chineke. Ma olee ụzọ nke ha ga-esoro iji bataghachi n’ihu ọma nke Chineke ma bụrụ ndị e webatara na paradaịs ime mmụọ nke a? Ọ gaje ịbụ dị ka à ga-asị na ọ bụ ụzọ dị obosara, nke dị mbara ka e megheere ha iji nye ohere maka ahịrị nke dị ogologo nke ndị Israel nwere mmụọ nke ịsụ ụzọ iji ịdị n’otu zọkọọ ije iru ala nke aka ha nke Chineke nyere. Amụma Aịsaịa nke na-akpali akpali na-egosi nke a:
11 “Ụzọ a tụliri atụli, ọbụna ụzọ, ga-adịkwa n’ebe ahụ, Ụzọ nke Ịdị Nsọ ka a ga-akpọkwa ya; onye rụrụ arụ agaghị agabiga na ya; ma ụzọ ahụ ga-adịrị ndị ahụ: onye ọ bụla nke na-aga n’ụzọ, ọbụna ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ha, ha agaghị akpafu akpafu. Ọ dịghị ọdụm ga-adị n’ebe ahụ, ọ dịghịkwa anụ ọhịa nke dị irè ga-arịgo n’elu ya.”—Aịsaịa 35:8, 9.
12. Ọgwụgwụ nke Agha Ụwa Mbụ ò mepere ‘ụzọ ahụ a tụliri atụli’ ozugbo ahụ maka ihe fọdụrụ ahụ, gịnịkwa weere ọnọdụ n’abalị nke anọ nke afọ ahụ bụ 1919?
12 Ọgwụgwụ nke Agha Ụwa Mbụ emepeghị “ụzọ a tụliri atụli” nke oge a ozugbo ahụ. Mmadụ asatọ nke ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society ka nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọrụ nkwusa ahụ na-agakwa nke nta nke nta n’ụzọ dị nnọọ njọ. Na January 4, 1919, na nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Society na Pittsburgh, Pennsylvania, e ji ntụli aka họpụtaghachi J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Society, n’ọkwá ije ozi n’agbanyeghị mkpọrọ a tụrụ ya, n’ihe ido anya nke na ọ bụ ohu nke Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu, ọ na-adịghị ihe o mere.
13, 14. Ihe omume ndị dị aṅaa na 1919 gosiri na ụzọ a tụliri atụli nke ihe atụ emepewo maka ihe fọdụrụ ahụ, oleekwa ndị jere ije ‘n’ụzọ ahụ a tụliri atụli’?
13 Na March 25, 1919, a tọhapụrụ ya na ndị mkpọrọ asaa ibe ya, e mesịakwa kachapụ ebubo nile e boro ha kpam kpam. Ụlọ Nche (Bekee) nke September 15, 1919, peji nke 283, nwere akụkọ ahụ na-agba ume na n’October 1, 1919, a ga-eburu ụlọ ọrụ dị iche iche nke Society dị na Pittsburgh gaghachi na Betel dị na Brooklyn na 124 Columbia Heights. Mgbe ahụ, ná mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1919, a mara ọkwá na a malitekwala ọzọ ibipụta akwụkwọ nke a a na-ebi ugbo abụọ n’ọnwa na Brooklyn, New York.
14 Otú a ka o si bụrụ na na 1919 e megheere ndị ohu Chineke na-aṅụrị ọṅụ ụzọ ihe atụ nke a tụliri atụli. Ndị chọrọ ịdị nsọ n’anya Jehova bụ ndị jere ije ‘n’ụzọ ahụ a tụliri atụli,’ “Ụzọ nke Ịdị Nsọ.” Onye ọ bụla nke na-enweghị nzube ziri ezi, echiche dị ọcha, agbasoghị “Ụzọ nke Ịdị Nsọ” nke ihe atụ ahụ wee nwetaghachi ihu ọma nke Chineke.
15. Olee ihe ndị na-enye ihe àmà a na-ahụ anya nke na “oké ìgwè mmadụ” ahụ abanyewo n’ụzọ ahụ a tụliri atụli nke ihe atụ?
15 Na June 1, 1935, ná mgbakọ ukwu e nwere na Washington, D.C., e mere 840 nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ baptism n’ime mmiri, na-enye ihe àmà a na-ahụ anya na ha amalitewo ịbanye ‘n’ụzọ ahụ a tụliri atụli.’ Ugbu a ọtụtụ nde n’ime ha abanyewo n’ụzọ ahụ a tụliri atụli, na-esonyere ọnụ ọgụgụ na-ebelata ebelata nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ. N’udo na ná mkpakọrịta dị ụtọ, ha na-ejekọ ije ugbu a ‘n’ụzọ a tụliri atụli,’ na-ekpebisi ike na site n’enyemaka nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye nọ n’eluigwe, ọ dịghị ihe ga-egbubi ịdị n’otu ha.
16. N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, olee otú o si bụrụ na ọ dịghị ọdụm ma ọ bụ anụ ọhịa nke dị irè dị n’ụzọ nke a a tụliri atụli?
16 N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, ọ dịghị ọdụm ọ bụla ma ọ bụ anụ ọhịa ọ bụla nke dị irè a ga-ahụ n’ụzọ nke a a tụliri atụli. Nke ahụ bụ na ọ dịghị ihe ga-arụ ọrụ dị ka ihe mgbochi ma ọ bụ ime ka egwu tụọ ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ. Ha jiri obi ike nupụ ije n’ụzọ ahụ nke Onye Nnapụta ha, bụ́ Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, mepeere ha ugbu a, na-enwe Zaịọn dị ka ebe ha na-eje.
17. (a) Ọ bụ ezie na anyị abamiwo n’ime ime nke “ọgwụgwụ oge a,” ‘ụzọ ahụ a tụliri atụli’ ọ̀ ka ghere oghe? (b) Olee ndị na-abanye ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ ahụ,’ oleekwa otú ha siworo mee otú a?
17 Taa, n’ime ime “ọgwụgwụ oge a,” “ụzọ a tụliri atụli” ahụ nke Chineke nyere ka ghere oghe. Ìgwè mmadụ ndị nwere ekele ji ihe ọmụma, nke bụ na Babilọn Ukwu ahụ adawo eme ihe tupu mwakwasị nke Saịrọs ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst. Ha sikwa na ya na-agbapụ, na-abanye n’ụzọ nke paradaịs ime mmụọ ahụ, bụ́ “Ụzọ nke Ịdị Nsọ.”—Jeremaịa 50:8.
18. Olee otú amaokwu ikpeazụ nke Aịsaịa nke 35 si kọwaa ọnọdụ dị ugbu a nke ndị àmà na-ekwesi ntụkwasị obi nke Jehova, ònye kwa ka ekele kwesịrị ịgara maka mmezu nke amụma nke a?
18 Ha na-abịarute n’ọṅụ na obi ụtọ a na-apụghị ịkọwa akọwa, dị ka amaokwu e ji mechie Aịsaịa isi 35 si kwuo ya: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alatakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újù na ize ume e wee gbalaga.” Iru újú na ize ume ha n’ihi ịbụ ndị pụworo ná nkwekọ nke ha na Jehova Chineke ná mbụ akwụsịworị kemgbe 1919. Iru újú na ize ume alọghachitebeghịkwa n’ebe ndị àmà na-enwe ọṅụ, ndị na-ekwesi ntụkwasị obi nke Jehova nọ. Ekele dịrị Jehova, Chineke ahụ na-ekwu eziokwu, onye mezuworo amụma ahụ na-egbuke egbuke nke Aịsaịa isi 35 n’ụzọ kwesịrị inye otuto!