Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/15 p. 8-13
  • Anyị Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Tie Mkpu Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Tie Mkpu Ọṅụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ọ Dị Mkpa Ịṅụrị Ọṅụ
  • Inwe Ọṅụ n’Ihi Ọnọdụ Gbanwere Agbanwe
  • Ime Ka Ala ahụ Yie Paradaịs
  • E Weghachi Paradaịs!
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Inwe Ọṅụ Ugbu A na Mgbe Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Paradaịs—Ọ̀ Bụ Maka Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Oké Ìgwè Mmadụ” ahụ Nọ Ugbu A ‘n’Ụzọ ahụ A Tụliri Atụli’ iru Nzukọ Chineke
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/15 p. 8-13

Anyị Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Tie Mkpu Ọṅụ

“Obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”—AỊSAỊA 35:10.

1. Olee ndị taa nwere ihe pụrụ iche mere ha ga-eji enwe ọṅụ?

MA ELEGHỊ anya ị chọpụtawo na ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe ezigbo ọṅụ n’ụbọchị ndị a. Ma, dị ka ezi ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova na-enwe ọṅụ. Olileanya nke inwetakwa ụdị ọṅụ ahụ ga-eru ọtụtụ nde ndị ọzọ ndị ka bụ ndị a na-emebeghị baptism aka, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, bụ́ ndị na-esonyere Ndịàmà. Eziokwu bụ na ị na-agụ okwu ndị a n’ime magazin a ugbu a na-egosi na ọṅụ a abụrụworị nke gị ma ọ bụ dị ebe ị pụrụ inweta ya.

2. Olee otú ọṅụ onye Kraịst si dị iche n’ọnọdụ ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-enwekarị?

2 Ihe ka ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọta na ọ dị ihe na-akọ ná ndụ ha. Gịnị banyere gị? N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na i nwezughị ihe onwunwe ọ bụla ị pụrụ iji mee ihe, n’ezie ọ bụghị ihe nile ndị ọgaranya na ndị dị ike taa nwere. Ị pụkwara inwe mmasị inwekwu ahụ ike dị mma na ume. Ka o sina dị, a pụrụ ikwu n’atụghị egwu na a bịa n’ihe banyere ọṅụ, ị bara ọgaranya ma nwee ahụ ike karịa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ijeri ndị bi n’elu ala. N’ụzọ dị aṅaa?

3. Okwu ndị dị aṅaa nwere ihe ha pụtara kwesịrị ka anyị leba ha anya, n’ihi gịnịkwa?

3 Cheta okwu Jisọs: “Ihe ndị a ka M gwaworo unu, ka ọṅụ m wee dị n’ime unu, ka ọṅụ unu wee zuokwa.” (Jọn 15:11) “Ka ọṅụ unu wee zuokwa.” Lee aha nkọwa nke a bụ! Ịmụ ụzọ ibi ndụ nke ndị Kraịst n’ụzọ dị omimi ga-ekpughe ọtụtụ ihe ndị mere ọṅụ anyị ga-eji zuokwa. Ma ka ọ dị ugbu a, rịba ama okwu ndị nwere ihe ha pụtara n’Aịsaịa 35:10. Ndị a nwere ihe ha pụtara n’ihi na ha gbasara anyị n’ụzọ dị ukwuu taa. Anyị na-agụ, sị: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alatakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”

4. Ụdị ọṅụ dị aṅaa ka e hotara n’Aịsaịa 35:10, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji lebara nke a anya?

4 “Ọṅụ ebighị ebi.” Okwu ahụ bụ́ “ebighị ebi” bụ nsụgharị ziri ezi nke ihe Aịsaịa dere n’asụsụ Hibru. Ma, dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ gosiri, isi ihe dị n’amaokwu a bụ “mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 45:6; 90:2; Aịsaịa 40:28) Ya mere ọṅụ ahụ agaghị agwụ agwụ, n’ọnọdụ ndị ga-ekwe ka ọṅụ ebighị ebi dịrị—ee, nye ezi ihe mere a ga-eji nwee ya. Nke ahụ ọ́ dịghị ada ka ihe obi ụtọ? Otú ọ dị, ma eleghị anya amaokwu ahụ dara gị ná ntị ka okwu nke ọnọdụ a na-akọ nanị n’ọnụ, na-eme ka ị na-eche, sị: ‘Nke ahụ emetụtaghị m n’ezie ruo n’ókè nke nsogbu na nchegbu ndị m na-enwe kwa ụbọchị na-eme.’ Ma eziokwu ndị e nwere na-egosi ihe dị iche. Nkwa amụma ahụ dị n’Aịsaịa 35:10 nwere ihe ọ pụtaara gị taa. Iji chọpụta otú o si dị otú a, ka anyị nyochaa isiakwụkwọ a mara mma, Aịsaịa 35, na-arịba ama akụkụ ọ bụla dabere n’ihe ndị gbara ya gburugburu. Jide n’aka na ihe anyị ga-achọpụta ga-atọ gị ụtọ.

Ndị Ọ Dị Mkpa Ịṅụrị Ọṅụ

5. N’ọnọdụ amụma dị aṅaa ka a hụrụ amụma ahụ dị na Aịsaịa isi nke 35?

5 Dị ka ihe inye aka, ka anyị leba anya n’ihe gbara amụma nke a na-akpali akpali gburugburu, ọnọdụ akụkọ ihe mere eme a nọ dee ya. Aịsaịa onye amụma bụ́ onye Hibru dere ya n’ihe dị ka 732 T.O.A. Nke ahụ bụ ọtụtụ iri afọ tupu ndị agha Babilọn ebibie Jerusalem. Dị ka Aịsaịa 34:1, 2 na-egosi, Chineke ebuwo amụma na ya gaje ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ mba nile, dị ka Edọm, nke e hotara n’Aịsaịa 34:6. Ihe àmà na-egosi na o jiri ndị Babilọn oge ochie mee nke ahụ. N’otu aka ahụ, Chineke mere ka ndị Babilọn bibie Juda n’ihi na ndị Juu ekwesịghị ntụkwasị obi. Gịnị si na ya pụta? A dọọrọ ndị Chineke n’agha, ala nna ha tọgbọkwara n’efu ruo 70 afọ.—2 Ihe Emere 36:15-21.

6. Ọdịiche ndị dị aṅaa dị n’ihe ga-abịakwasị ndị Edọm na ihe ga-abịakwasị ndị Juu?

6 Otú ọ dị, e nwere ọdịiche dị ịrịba ama dị n’etiti ndị Edọm na ndị Juu. Ọ́bọ̀ Chineke bọrọ n’ahụ ndị Edọm agwụghị agwụ; mgbe oge na-aga, ha adịkwaghị dị ka otu ndị. Ee, ị ka pụrụ ije leta mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ chakoo n’ógbè ebe ndị Edọm biburu, dị ka ebe ahụ fọrọ afọ a ma ama n’ụwa bụ́ Petra. Ma taa, ọ dịghị mba ma ọ bụ ndị a pụrụ ịmata dị ka ‘ndị Edọm.’ N’aka nke ọzọ, mbibi nke Juda n’aka ndị Babilọn ọ̀ gaje ịdịru mgbe ebighị ebi, na-ahapụ ala ahụ n’ọnọdụ enweghị ọṅụ ruo ebighị ebi?

7. Olee otú ndị Juu e ji eji na Babilọn pụrụ isiworị zaghachi n’Aịsaịa isi nke 35?

7 N’ebe a amụma ahụ dị ebube n’Aịsaịa isi nke 35 nwere ihe na-akpali akpali ọ pụtara. A pụrụ ịkpọ ya amụma mweghachi, n’ihi na o nwere mmezu mbụ ya mgbe ndị Juu laghachiri n’ala nna ha na 537 T.O.A. E nyere ndị Israel nọworo ná ndọrọ n’agha na Babilọn nnwere onwe ịlaghachi ala nna ha. (Ezra 1:1-11) Ma, tupu nke ahụ emee, ndị Juu e ji eji na Babilọn bụ́ ndị tụlere amụma a nke Chineke pụrụ icheworị ụdị ọnọdụ ndị ha ga-achọta n’ala nna ha, bụ́ Juda. Oleekwa ọnọdụ ha onwe ha ga-anọ na ya? Azịza ha metụtara kpọmkwem ihe mere anyị ji nwee n’ezie ihe mere anyị ga-eji nwee ọṅụ. Ka anyị lee.

8. Ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ndị Juu ga-achọta mgbe ha si na Babilọn laghachi? (Tụlee Ezikiel 19:3-6; Hosea 13:8.)

8 Ọnọdụ ahụ n’ezie agaghị eyi nke ga-adị mma nye ndị Juu ahụ ọbụna mgbe ha nụrụ na ha pụrụ ịlaghachi ala nna ha. Ala ha atọgbọrọwo n’efu ruo iri afọ asaa, ogologo afọ ndụ dum. Gịnị meworo ala ahụ? Ubi, ubi vine, ma ọ bụ ubi mkpụrụ osisi ọ bụla a kọworo ihe na ya ga-aghọworị ọzara. Ubi ma ọ bụ ibe ala ọ bụla a wabuuru ọwa mmiri ga-aghọworị mkpọmkpọ ala kpọrọ nkụ ma ọ bụ ọzara. (Aịsaịa 24:1, 4; 33:9; Ezikiel 6:14) Cheekwa echiche maka anụ ọhịa ndị ga-ejupụtanụ. Ndị a ga-agụnye ndị na-eri anụ, dị ka ọdụm na agụ owuru. (1 Ndị Eze 13:24-28; 2 Ndị Eze 17:25, 26; Abụ nke Abụ 4:8) Ha apụghịkwa ileghara anụ ọhịa bear anya, bụ́ ndị nwere ikike igbu nwoke, nwanyị, ma ọ bụ nwatakịrị. (1 Samuel 17:34-37; 2 Ndị Eze 2:24; Ilu 17:12) Ọ dịtụghịkwa anyị mkpa ịkpọtụ aha ajụala na agwọ ndị ọzọ nwere nsí, ma ọ bụ akpị. (Jenesis 49:17; Deuterọnọmi 32:33; Job 20:16; Abụ Ọma 58:4; 140:3; Luk 10:19) A sị na i sooro ndị Juu si na Babilọn na-alọghachi na 537 T.O.A., eleghị anya ị ga-echere ya echiche ugboro abụọ ịgagharị n’ebe dị otú ahụ. Ọ bụghị paradaịs mgbe ha bịarutere.

9. N’ihi gịnị ka ndị ahụ na-alaghachinụ ji nwee ihe ndabere maka olileanya na obi ike?

9 Ma, Jehova n’onwe ya edulawo ndị na-efe ya, o nwekwara ikike ịgbanwe ọnọdụ ịtọgbọrọ n’efu. Ọ̀ bụ na i kwenyeghị na Onye Okike pụrụ ime nke ahụ? (Job 42:2; Jeremaịa 32:17, 21, 27, 37, 41) Ya mere gịnị ka ọ ga-emere—gịnị ka o meere—ndị Juu ahụ na-alatanụ na ala ha? Olee ihe nke a nwere ime n’ebe ndị Chineke nke oge ndị a nọ nakwa n’ọnọdụ gị—ugbu a na n’ọdịnihu? Na mbụ ka anyị lee ihe weere ọnọdụ laa azụ n’oge ahụ.

Inwe Ọṅụ n’Ihi Ọnọdụ Gbanwere Agbanwe

10. Mgbanwe dị aṅaa ka Aịsaịa 35:1, 2 buru amụma ya?

10 Gịnị ga-eme mgbe Saịrọs kwere ka ndị Juu laghachi n’ala ahụ na-adịghị enye olileanya? Gụọ amụma ahụ na-akpali akpali dị n’Aịsaịa 35:1, 2: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. Ọ ga-agbawa nke ukwuu, tegharịakwa egwú ọṅụ, ee, n’itegharị egwú ọṅụ na n’iti mkpu ọṅụ; nsọpụrụ Lebanọn ka a ga-enye ya, ee, ịma mma nke Kamel na Sherọn: ndị a ga-ahụ ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.”

11. N’ihe ọmụma dị aṅaa nke ala ahụ ka Aịsaịa ji mee ihe n’amụma ya?

11 N’oge Bible, Lebanọn, Kamel, na Sherọn bụ ebe ndị a rịbara ama maka ahịhịa ha mara mma. (1 Ihe Emere 5:16; 27:29; 2 Ihe Emere 26:10; Abụ nke Abụ 2:1; 4:15; Hosea 14:5-7) Aịsaịa ji ihe atụ ndị ahụ mee ihe iji kọwaa ihe ala ahụ a gbanwere agbanwe ga-adị ka ya, site n’enyemaka Chineke. Ma nke a ọ̀ ga-emetụta nanị ájá? Ọ dịghị ma ọlị!

12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Aịsaịa isi nke 35 lekwasịrị anya ná ndị mmadụ?

12 Aịsaịa 35:2 na-ekwu banyere ala ahụ ‘itegharị egwú ọṅụ na iti mkpu ọṅụ.’ Anyị maara na ájá na ihe ọkụkụ ‘etegharịghị egwú ọṅụ’ n’ụzọ nkịtị. Ma, mgbanwe ha ịghọ nke ga-emepụta nri pụrụ ime ka ndị mmadụ na-eche otú ahụ. (Levitikọs 23:37-40; Deuterọnọmi 16:15; Abụ Ọma 126:5, 6; Aịsaịa 16:10; Jeremaịa 25:30; 48:33) Mgbanwe nkịtị e nwere n’ala ahụ n’onwe ya ga-ekwekọ ná mgbanwe e nwere ná ndị mmadụ, n’ihi na n’ebe ndị mmadụ nọ ka amụma nke a na-elekwasị anya. Ya mere, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji aghọta okwu Aịsaịa dị ka ihe na-elekwasị anya n’ụzọ bụ isi ná mgbanwe ndị ndị Juu na-alata nwere, karịsịa inwe ọṅụ ha.

13, 14. Mgbanwe dị aṅaa ná ndị mmadụ ka Aịsaịa 35:3, 4 buru amụma ya?

13 N’ikwekọ na nke ahụ, ka anyị nyochakwuo amụma a na-akpali akpali iji hụ otú o si mezuo mgbe ntọhapụ ndị Juu na nlata ha site na Babilọn gasịrị. N’amaokwu nke 3 na 4, Aịsaịa na-ekwu banyere mgbanwe ndị ọzọ e nwere ná ndị ahụ na-alata: “Meenụ aka kụdara akụda ka ha dị ike, gbaakwanụ ikpere na-asụ ngọngọ ume. Sịnụ ndị obi ha na-eme ngwa, Dịnụ ike, unu atụla egwu: lee, Chineke unu! ịbọ ọ́bọ̀ na-abịa, bụ́ nkwụghachi nke Chineke; Ya onwe ya ga-abịa zọpụta unu.”

14 Ọ́ bụghị ihe na-enye ume iche na Chineke anyị, onye pụrụ ichigharị ọnọdụ ntọgbọrọ n’efu nke ala, nwere mmasị nke ukwuu n’ahụ ndị na-efe ya ofufe? Ọ chọghị ka ndị Juu a dọọrọ n’agha nwee nkụda aka, nkụda obi, ma ọ bụ nchekasị banyere ọdịnihu. (Ndị Hibru 12:12) Chee echiche banyere ọnọdụ nke ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha. E wezụga olileanya ha pụrụ inweta site n’amụma nile nke Chineke banyere ọdịnihu ha, ọ gaara esiri ha ike inwe olileanya. Ọ dị ka ha nọ n’ụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị n’okpuru ala, ghara inwere onwe ha ịgagharị agagharị na ịrụsi ọrụ ike n’ijere Jehova ozi. O nwere ike iyiworị ha ka olileanya ọ bụla adịghị n’ihu.—Tụlee Deuterọnọmi 28:29; Aịsaịa 59:10.

15, 16. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ikwubi na Jehova meere ndị ahụ na-alaghachinụ? (b) N’ihi gịnị ka ndị ahụ na-alaghachinụ na-agaghị eji tụọ anya ọgwụgwọ nkịtị n’ụzọ ọrụ ebube, ma gịnị ka Chineke mere n’ikwekọ n’Aịsaịa 35:5, 6?

15 Ma, lee ka nke ahụ si gbanwee mgbe Jehova mere ka Saịrọs tọhapụ ha ịlaghachi n’ala ha! E nweghị ihe àmà Bible ọ bụla na n’ebe ahụ Chineke ji ọrụ ebube meghee anya ọ bụla kpuru ìsì nke ndị Juu na-alaghachinụ, meghee ntị nke onye ọ bụla ntị chiri, ma ọ bụ gwọọ ndị ngwụrọ ma ọ bụ ndị na-enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ. Otú ọ dị, o mere n’ezie ihe ka nke ahụ ebube. O weghachiri ha n’ìhè na nnwere onwe nke ala ha ha hụrụ n’anya.

16 E nweghị ihe àmà ọ bụla na ndị ahụ na-alọghachinụ tụrụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ọgwụgwọ nkịtị ndị dị otú ahụ n’ụzọ ọrụ ebube. Ọ ghaghị ịbụ na ha aghọtawo na Chineke emebeghị otú ahụ n’ebe Aịsak, Samson, ma ọ bụ Ịlaị nọ. (Jenesis 27:1; Ndị Ikpe 16:21, 26-30; 1 Samuel 3:2-8; 4:15) Ma ọ bụrụ na ha tụrụ anya Chineke ịgbanwe ọnọdụ ha n’ụzọ ihe atụ, e mechughị ha ihu. N’ezie n’ụzọ ihe atụ, amaokwu nke 5 na 6 nwere ezi mmezu. Aịsaịa buru amụma n’izi ezi, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”

Ime Ka Ala ahụ Yie Paradaịs

17. Mgbanwe nkịtị dị aṅaa ka ihe àmà na-egosi na Jehova wetara?

17 Ndị ahụ na-alaghachinụ ga-enweworị n’ezie ihe mere ha ga-eji tie mkpu ọṅụ n’ihi ọnọdụ ndị dị ka nke Aịsaịa gara n’ihu na-akọwa: “N’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara ná mmiri: n’ebe obibi nkịta ọhịa, ebe ha na-amakpu amakpu, ogige nke dịịrị amị na papyrus.” (Aịsaịa 35:6b, 7) Ọ bụ ezie na o nwere ike anyị agaghị ahụ ya n’ógbè ahụ nile taa, ihe àmà na-egosi na ebe ahụ bụ́ Juda bụbu “paradaịs anụ na-ata nri.”a

18. Olee otú ndị Juu na-alaghachi ga-esiworị zaghachi ná ngọzi Chineke?

18 Banyere ihe ndị kpatara ọṅụ, cheedị banyere ihe na-aghaghị ịbụ echiche ihe ahụ fọdụrụ ná ndị Juu mgbe e zighachiri ha n’Ala Nkwa ahụ! Ha nwere ohere iweghara ala ahụ tọgbọrọ n’efu, nke nkịta ọhịa na anụ ọhịa ndị ọzọ dị otú ahụ bi, ma gbanwee ya. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọtaworị ọṅụ n’ịrụ ụdị ọrụ mweghachi ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ị marawo na Chineke na-agọzi mgbalị gị?

19. N’echiche dị aṅaa ka nlata site ná ndọrọ n’agha Babilọn si dabere n’imezu ihe ụfọdụ?

19 Otú ọ dị, ọ bụghị nnọọ na ndị Juu nile a dọọrọ n’agha gaa Babilọn nwere ike ịlaghachi ma ọ bụ laghachiri iji kere òkè ná mgbanwe ahụ na-enye ọṅụ. Chineke setịpụrụ ihe a chọrọ. Ọ dịghị onye e ji ihe omume nke okpukpe ndị Babilọn nke ikpere arụsị tetọọ nke ruru eru ịlaghachi. (Daniel 5:1, 4, 22, 23; Aịsaịa 52:11) Onye ọ bụlakwa ji nzuzu tinye aka n’ihe amamihe na-adịghị na ya apụghịkwa. A jụrụ ndị nile dị otú ahụ. N’aka nke ọzọ, ndị ruru ọ̀tụ̀tụ̀ Chineke, ndị o lere anya dị ka ndị dị nsọ ruo n’ókè ụfọdụ, pụrụ ịlaghachi Juda. Ha pụrụ ime njem dị ka a ga-asị na ọ bụ n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ. Aịsaịa mere ka nke ahụ doo anya n’amaokwu nke 8: “Ụzọ a tụliri atụli, ọbụna ụzọ, ga-adịkwa n’ebe ahụ, Ụzọ nke ịdị nsọ ka a ga-akpọkwa ya; onye rụrụ arụ agaghị agabiga na ya; ma ụzọ ahụ ga-adịrị ndị ahụ: onye ọ bụla nke na-aga n’ụzọ, ọbụna ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ha, ha agaghị [ejegharị na ya, NW].”

20. Gịnị ka ọ na-adịghị ndị Juu mkpa ịtụ egwu ya ka ha na-alata, na-akpata gịnị?

20 Ọ dịghị ndị Juu ahụ na-alaghachi mkpa ịtụ egwu mwakpo nke ụmụ mmadụ yiri anụ ọhịa ma ọ bụ ìgwè ndị na-eme ihe ike. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova agaghị ekwe ka ụdị ihe ahụ soro ndị ya a zụtaghachiri nọrọ n’Ụzọ ahụ. Ya mere ha pụrụ ime njem n’atụmanya na-enye ọṅụ na n’olileanya obi ụtọ. Rịba ama otú Aịsaịa si kọwaa nke ahụ n’imechi amụma a: “Ọ dịghị ọdụm ga-adị n’ebe ahụ, ọ dịghịkwa anụ ọhịa nke dị irè ga-arịgo n’elu ya, a gaghị ahụ ya n’ebe ahụ; ma ndị e meworo ka ha nwere onwe ha na-eje ije n’ebe ahụ: ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alatakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”—Aịsaịa 35:9, 10.

21. Olee otú anyị taa kwesịrị isi lee mmezu nke Aịsaịa isi nke 35 nke mezuwororị anya?

21 Lee aha onyinyo amụma anyị nwere n’ebe a! Ma, anyị ekwesịghị iwere nke a nanị dị ka akụkọ ihe mere eme gara aga, dị ka ọ̀ bụ akụkọ mara mma nke na-emetụtachaghị ọnọdụ anyị ma ọ bụ ọdịnihu anyị. Eziokwu dị na ya bụ na amụma a na-emezu n’ụzọ dị ịtụnanya taa n’etiti ndị Chineke, ya mere ọ na-emetụta onye ọ bụla n’ime anyị n’ezie. Ọ na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji tie mkpu ọṅụ. A tụlere akụkụ ndị a na-emetụta ndụ gị ugbu a na n’ọdịnihu n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Site n’ihe ọmụmụ ya nke ógbè ahụ, onye ọkà n’ihe banyere ọrụ ugbo bụ́ Walter C. Lowdermilk (nke na-anọchite anya Òtù Nri na Ọrụ Ugbo nke U.N.) kwubiri, sị: “Ala a bụbu paradaịs anụ na-ata nri.” O gosikwara na ihu igwe ebe ahụ agbanwebeghị nke ukwuu “eri oge ndị Rom,” nakwa na “‘ọzara’ ahụ weghaara ala ahụ na-emebu ihe nke ọma bụ ọrụ aka mmadụ, ọ bụghị nke okike.”

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee mgbe Aịsaịa isi nke 35 nwere mmezu mbụ ya?

◻ Mmetụta dị aṅaa ka mmezu mbụ nke amụma ahụ ga-arụpụta?

◻ Olee otú Jehova si mezuo Aịsaịa 35:5, 6?

◻ Mgbanwe ndị dị aṅaa n’ala na n’ọnọdụ ha ka ndị Juu na-alaghachinụ nwetara?

[Foto dị na peeji nke 9]

Mkpọmkpọ ebe nke Petra, ógbè ebe bụbu ebe obibi ndị Edọm

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Mgbe ndị Juu nọ n’ala ọzọ, akụkụ dị ukwuu nke Judia yiri ọzara, na-ejupụta n’anụ ọjọọ dị iche iche dị ka bear na ọdụm

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Garo Nalbandian

Bear na Ọdụm: Safari-Zoo of Ramat-Gan, Tel Aviv

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya