Isi nke Iri Abụọ na Asatọ
E Weghachi Paradaịs!
1. N’ihi gịnị ka ọtụtụ okpukpe ji na-enye olileanya nke ịdị ndụ n’ime paradaịs?
“AGỤỤ paradaịs bụ otu n’ime agụụ ndị siri ike ndị yiri ka ha na-enye ụmụ mmadụ nsogbu. Ọ pụrụ ịbụ nke kasị sie ike na nke kasị bụrụ nke na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime ha nile. A na-ahụ agụụ ụfọdụ maka paradaịs n’akụkụ nile nke okpukpe.” Nke a bụ ihe The Encyclopedia of Religion kwuru. Agụụ dị otú ahụ bụ ebumpụta ụwa, ebe Bible na-agwa anyị na ndụ mmadụ malitere na Paradaịs—ogige mara mma ebe ọrịa na ọnwụ na-adịghị. (Jenesis 2:8–15) Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ n’ime okpukpe ndị dị n’ụwa na-enye olileanya nke ịdị ndụ n’ọdịnihu n’ime otu ụdị nke paradaịs.
2. Olee ebe anyị pụrụ isi nweta ezi olileanya maka Paradaịs ga-abịa n’ọdịnihu?
2 N’ọtụtụ ebe n’ime Bible, anyị pụrụ ịgụ banyere ezi olileanya maka Paradaịs ga-abịa n’ọdịnihu. (Aịsaịa 51:3) Dị ka ihe atụ, akụkụ amụma Aịsaịa ahụ e dekọrọ n’isi nke 35 na-akọwa mgbanwe a ga-agbanwe ógbè ndị bụ́ ọzara ka ha ghọọ ogige ndị yiri ubi nakwa ubi ndị na-amịpụta mkpụrụ. Ndị ìsì ga-ahụ ụzọ, ndị ogbi ga-enwe ike ikwu okwu, ndị ntị chiri ga-enwekwa ike ịnụ ihe. N’ime Paradaịs a e kwere ná nkwa, iru újú ma ọ bụ ịma ọsụ agaghị adị, nke pụtara na ọbụna ọnwụ agaghị adịkwa. Lee nkwa dị ebube nke ahụ bụ! Olee otú e kwesịrị isi ghọta okwu ndị a? Hà na-enye anyị olileanya taa? Ịtụle isiakwụkwọ a nke Aịsaịa ga-aza ajụjụ ndị a.
Ala Tọgbọrọ n’Efu Aṅụrịa Ọṅụ
3. Dị ka amụma Aịsaịa si kwuo, mgbanwe dị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’ala ahụ?
3 Amụma Aịsaịa nke sitere n’ike mmụọ nsọ banyere Paradaịs e weghachiri eweghachi ji okwu ndị a malite: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwu ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. Ọ ga-agbawa nke ukwuu, tegharịakwa egwú ọṅụ, ee, n’itegharị egwú ọṅụ na n’iti mkpu ọṅụ; nsọpụrụ Lebanọn ka a ga-enye ya, ee, ịma mma nke Kamel na Sherọn: ndị a ga-ahụ ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.”—Aịsaịa 35:1, 2.
4. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ala ndị Juu si ghọọ ọzara?
4 Aịsaịa dere okwu ndị a ihe dị ka n’afọ 732 T.O.A. Ihe dị ka afọ 125 mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Babilọn bibiri Jerusalem, a kpụkwaara ndị Juda gaa biri n’ala ọzọ. Ha hapụrụ ala nna ha n’enweghị onye bi ya, ọ tọgbọrọ n’efu. (2 Ndị Eze 25:8–11, 21–26) N’ụzọ dị otú a, e mezuru ịdọ aka ná ntị Jehova bụ́ na ndị Israel ga-eje biri n’ala ọzọ ma ọ bụrụ na ha aghọọ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. (Deuterọnọmi 28:15, 36, 37; 1 Ndị Eze 9:6–8) Mgbe mba ahụ bụ́ ndị Hibru ghọrọ ndị e ji eji n’ala ọzọ, ha gbahapụrụ ubi ha mmiri na-ede nke ọma n’elekọtaghị ya anya ruo afọ 70, ọ ghọọkwa ọzara.—Aịsaịa 64:10; Jeremaịa 4:23–27; 9:10–12.
5. (a) Olee otú e si weghachi ọnọdụ ndị yiri ndị nke paradaịs n’ala ahụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị mmadụ ‘na-ahụ ebube Jehova’?
5 Otú ọ dị, amụma Aịsaịa kwuru na ala ahụ agaghị atọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi. A ga-eme ka ọ ghọghachi paradaịs n’ezie. A ga-enye ya “nsọpụrụ Lebanọn” na “ịma mma nke Kamel na Sherọn.”a N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe ha si n’ije biri n’ala ọzọ lọta, ndị Juu kọghachikwara ma mee ka mmiri dee ubi ha, ala ha maliteghachiri imepụta ihe n’ụba dị ka ọ na-emebu. Nanị Jehova ka a pụrụ inye ekele maka nke a. Ọ bụ site n’ọchịchọ ya tinyere enyemaka na ngọzi ya ka ndị Juu ji nwee ọnọdụ ndị ahụ yiri ndị nke paradaịs. Ndị ahụ nwere ike ịhụ “ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke [ha]” mgbe ha kwetara na aka Jehova dị ná mgbanwe ahụ na-eju anya a gbanwere ala ha.
6. Mmezu dị aṅaa dị mkpa nke ihe Aịsaịa kwuru ka a hụrụ?
6 Ka o sina dị, n’ala Israel ahụ e weghachiri eweghachi, ihe Aịsaịa kwuru nwere mmezu ka mkpa. N’ụzọ ime mmụọ, Israel anọwo n’ọnọdụ kpọrọ nkụ, nke yiri ọzara ruo ọtụtụ afọ. Mgbe ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ nọ na Babilọn, a kpachigidesiri ofufe dị ọcha ike. Ụlọukwu adịghị, e nweghị ebe ịchụàjà, e nweghịkwa ndị nchụàjà a haziri ahazi. A kwụsịtụrụ àjà a na-achụ kwa ụbọchị. Ugbu a, Aịsaịa na-ebu amụma na ihe ga-agbanwe. N’idu ndú nke ndị ikom dị ka Zerubabel, Ezra, na Nehemaịa, ndị nnọchianya si n’ebo 12 ahụ dum nke Israel laghachiri Jerusalem, wughachi ụlọ nsọ ahụ ma fee Jehova n’enweghị ihe mgbochi. (Ezra 2:1, 2) Nke a bụ paradaịs ime mmụọ n’ezie!
Ịdị Ọkụ na Mmụọ
7, 8. N’ihi gịnị ka inwe nchekwube ji dị ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ mkpa, oleekwa otú ihe Aịsaịa kwuru si enye ha agbamume?
7 Ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa isi nke 35 na-ada ka ihe na-enye ọṅụ. Onye amụma ahụ na-ekwusa ọdịnihu magburu onwe ya maka mba ahụ chegharịrịnụ. N’ezie, o ji nkwenye na nchekwube kwuo okwu. Narị afọ abụọ n’ihu, mgbe ọ fọrọ nnọọ ntakịrị ka e weghachi ha, nkwenye dị otú ahụ dị ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ mkpa. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova gbara ha ume n’ụzọ amụma, sị: “Meenụ aka kụdara akụda ka ha dị ike, gbaakwanụ ikpere na-asụ ngọngọ ume. Sịnụ ndị obi ha na-eme ngwa, Dịnụ ike, unu atụla egwu: lee, Chineke unu! ịbọ ọ́bọ̀ na-abịa, bụ́ nkwụghachi nke Chineke; Ya onwe ya ga-abịa zọpụta unu.”—Aịsaịa 35:3, 4.
8 Njedebe nke ogologo oge nke ije biri n’ala ọzọ bụ oge ịrụ ọrụ. Eze Saịrọs nke Peasia, bụ́ ngwá ọrụ Jehova ji bọọ ọ́bọ̀ n’ahụ Babilọn, akpọsawo na a ga-eweghachi ofufe Jehova na Jerusalem. (2 Ihe E Mere 36:22, 23) Ọ dị mkpa ka a hazie ọtụtụ puku ezinụlọ ndị Hibru iji mee njem ahụ dị ize ndụ si Babilọn gaa Jerusalem. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha ga-ewu ebe obibi ga-ezunụ ma jikere maka oké ọrụ ahụ nke iwughachi ụlọukwu ahụ na obodo ahụ. Nye ndị Juu ụfọdụ nọ na Babilọn, ihe a nile pụrụ iyi ihe sibigara ike ókè. Otú ọ dị, ọ bụghị oge ịkụda aka ma ọ bụ ịtụ ụjọ. Ndị Juu ga-ewusirịta ibe ha ike ma nwee obi ike n’ebe Jehova nọ. O mesiri ha obi ike na ya ga-azọpụta ha.
9. Olee nkwa dị ebube e kwere ndị Juu na-alọtanụ?
9 Ndị ahụ a tọhapụrụ n’ojiji e ji ha na Babilọn ga-enwe ezi ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na ọdịnihu dị ebube na-echere ha mgbe ha laghachiri Jerusalem. Aịsaịa buru amụma, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 35:5, 6a.
10, 11. Nye ndị Juu ahụ na-alọtanụ, n’ihi gịnị ka ihe Aịsaịa kwuru na-aghaghị iji nwee ihe ọ pụtara n’ụzọ ime mmụọ, gịnịkwa ka ha na-egosi?
10 Dị ka ihe àmà na-egosi, Jehova bu ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ya n’uche. E nyewo ha ahụhụ ije biri n’ala ọzọ ruo afọ 70 n’ihi ndapụ ha dapụrụ n’ezi ofufe tupu mgbe ahụ. Ma, n’inye ha ahụhụ, Jehova emeghị ka ndị ya kpuo ìsì, ka ntị chie ha, ka ha daa ngwụrọ, ka ha daakwa ogbi. N’ihi ya, ịgwọ nkwarụ nkịtị adịghị mkpa iji weghachi mba Israel. Jehova weghachiri ihe a tụfuru, nke bụ́, ahụ ike ime mmụọ.
11 A gwọrọ ndị Juu chegharịrịnụ n’echiche bụ́ na ha nwetaghachiri ikike ime mmụọ ha nke ịmata ihe—ọhụhụ ụzọ ime mmụọ ha na ikike ịnụ ihe ha, irube isi, na ikwu okwu Jehova. Ha bịara ghọta mkpa ọ dị ha ịnọrọ Jehova nso. Site n’àgwà ọma ha, ha ‘tiri mkpu’ ọṅụ otuto nye Chineke ha. Onye “ngwụrọ” bịaziri nwee ịnụ ọkụ n’obi na ume n’ofufe ọ na-efe Jehova. N’ụzọ ihe atụ, ọ “ga-amali dị ka ele.”
Jehova Enye Ndị Ya Ume Ọhụrụ
12. Ruo n’ókè ha aṅaa ka Jehova ga-eji mmiri gọzie ala ahụ?
12 O siri ike iche n’echiche paradaịs nke mmiri na-adịghị na ya. Paradaịs mbụ dị n’Iden nwere mmiri n’ụba. (Jenesis 2:10–14) Ala e nyere Israel bụkwa “ala iyi mmiri, na nke isi iyi na ogbu mmiri, na-apụta.” (Deuterọnọmi 8:7) Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa kwupụtara nkwa a na-enye ume ọhụrụ, sị: “N’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara ná mmiri: n’ebe obibi nkịta ọhịa, ebe ha na-amakpu amakpu, ogige nke dịịrị amị na papyrus.” (Aịsaịa 35:6b, 7) Mgbe ndị Israel lekọtawakwara ala ahụ ọzọ, ebe ndị ahụ tọgbọrọ nkịtị, bụ́ ebe nkịta ọhịa na-awagharịbu, ga-ejupụta n’ihe ọkụkụ na-ama pokopoko. A ga-agbanwe ala kpọrọ nkụ nke jupụtara n’uzuzu ka ọ ghọọ “apịtị,” ebe papyrus na ahịhịa mmiri ndị ọzọ pụrụ ito.—Job 8:11.
13. Ụba mmiri ime mmụọ dị aṅaa ka mba ahụ e weghachiri eweghachi ga-enwe?
13 Otú ọ dị, nke ka mkpa bụ mmiri ime mmụọ nke eziokwu, nke ndị Juu laghachiri n’ala ha ga-enwe n’ụba. Jehova ga-enye ihe ọmụma, agbamume, na nkasi obi site n’Okwu ya. Ọzọkwa, ndị okenye obodo na ndị isi kwesịrị ntụkwasị obi ga-adị “ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ndị na-akwalite ofufe dị ọcha, dị ka Ezra, Hagaị, Jeshua, Nehemaịa, Zekaraịa, Zerubabel, ga-abụ ndị akaebe dị ndụ nke mmezu amụma Aịsaịa.—Ezra 5:1, 2; 7:6, 10; Nehemaịa 12:47.
“Ụzọ nke Ịdị Nsọ”
14. Kọwaa otú ime njem site na Babilọn gaa Jerusalem dị.
14 Otú ọ dị, tupu ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ enwee ike inweta ụdị ọnọdụ paradaịs ime mmụọ na nke nkịtị dị otú ahụ, ha ga-eme ogologo njem ahụ dị ize ndụ si Babilọn gaa Jerusalem. Isoro ụzọ gara ya kpọmkwem ga-apụta ịgafe ihe dị ka kilomita 800 nke mbara ala kpọrọ nkụ ma tọgbọrọ chakoo. Ụzọ nke katụ mma ga-apụta ịga kilomita 1,600. Njem nke ọ bụla ga-apụta ịbụ ndị e kpughere ruo ọtụtụ ọnwa nye ihu igwe dị iche iche nakwa ihe ize ndụ nke izute ma anụ ọhịa ma ndị mmadụ yiri anụ ọhịa. Ma, ndị kwenyere n’amụma Aịsaịa adịghị echegbubiga onwe ha ókè. N’ihi gịnị?
15, 16. (a) Nchebe dị aṅaa ka Jehova chebere ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ka ha na-ala? (b) N’echiche ọzọ dị aṅaa ka Jehova meere ndị Juu ahụ ụzọ a tụliri atụli nke na-adịghị ize ndụ?
15 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Ụzọ a tụliri atụli, ọbụna ụzọ, ga-adịkwa n’ebe ahụ, Ụzọ nke ịdị nsọ ka a ga-akpọkwa ya; onye rụrụ arụ agaghị agabiga na ya; ma ụzọ ahụ ga-adịrị ndị ahụ: onye ọ bụla nke na-aga n’ụzọ, ọbụna ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ha, ha agaghị akpafu akpafu. Ọ dịghị ọdụm ga-adị n’ebe ahụ, ọ dịghịkwa anụ ọhịa nke dị irè ga-arịgo n’elu ya, a gaghị ahụ ya n’ebe ahụ; ma ndị [a gbapụtaworo] na-eje ije n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 35:8, 9) Jehova agbapụtawo ndị ya! Ha bụ ndị ya “a gbapụtaworo,” o kwekwara ha nkwa ichebe ha mgbe ha nọ n’ụzọ ụla. È nwere ụzọ nkịtị e doziri edozi, nke a tụliri atụli, nke a gbakwara ogige, nke si Babilọn garuo Jerusalem? Ee e, ma nchebe Jehova ga-echebe ndị ya na njem ha bụ nke e ji n’aka nke na ọ dị ka a ga-asị na ha nọ n’ụzọ dị otú ahụ a tụliri atụli.—Tụlee Abụ Ọma 91:1–16.
16 E chebekwara ndị Juu pụọ n’ihe ize ndụ ime mmụọ. Ụzọ ihe atụ ahụ a tụliri atụli bụ “Ụzọ nke ịdị nsọ.” Ndị na-adịghị akwanyere ihe dị nsọ ùgwù ma ọ bụ ndị na-adịghị ọcha n’ụzọ ime mmụọ erughị eru ịga ije na ya. A chọghị ha n’ala ahụ e weghachiri eweghachi. Ndị e nyere nnwapụta nwere ezi ihe kpaliri ha. Ha adịghị alaghachi Juda na Jerusalem ná mmụọ nke mpako n’ihi mba ha ma ọ bụ iji chọọ ọdịmma onwe ha. Ndị Juu ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ghọtara na isi ihe mere ha ji na-alaghachi bụ iji guzobeghachi ofufe dị ọcha nke Jehova n’ala ahụ.—Ezra 1:1-3.
Ndị Jehova Aṅụrịa Ọṅụ
17. Olee otú amụma Aịsaịa siworo bụrụ ihe nkasi obi nye ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi n’ogologo oge ha nọ n’ala ọzọ?
17 E ji okwu ndị na-enye ọṅụ mechie isi nke 35 nke amụma Aịsaịa: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alọtakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.” (Aịsaịa 35:10) Ndị Juu ahụ e ji eji, bụ́ ndị dabewooro n’amụma a maka nkasi obi na olileanya n’oge ha nọ n’ala ọzọ pụrụ ịnọworịị na-eche otú akụkụ ya dị iche iche ga-esi mezuo. Ma eleghị anya, ha aghọtabeghị ọtụtụ akụkụ nke amụma ahụ. Ma, o dowo nnọọ anya na ha ‘ga-alọta ma bata n’ime Zaịọn.’
18. N’ụzọ dị aṅaa ka iti mkpu ọṅụ na ịṅụrị ọṅụ n’ala ahụ e weghachiri eweghachi si nọchie iru újú na ịma ọsụ na Babilọn?
18 N’ihi ya, n’afọ 537 T.O.A., ihe dị ka mmadụ 50,000 (gụnyere ihe karịrị ndị ohu 7,000) tinyere ndị inyom na ụmụaka, mere njem ahụ were ọnwa anọ laghachi Jerusalem, na-atụkwasị Jehova obi kpam kpam. (Ezra 2:64, 65) Nanị ọnwa ole na ole ka e mesịrị, e wughachiri ebe ịchụàjà Jehova, na-edozi ọnọdụ maka mwughachi nke ụlọukwu ahụ dum. E mezuru amụma Aịsaịa ahụ nke nọruworo afọ 200. Iti mkpu ọṅụ na ịṅụrị ọṅụ n’ala ahụ e weghachiri eweghachi nọchiri iru újú na ịma ọsụ nke mba ahụ mgbe ha nọ na Babilọn. Jehova emezuwo nkwa ya. E weghachiwo Paradaịs—ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ime mmụọ!
Ọmụmụ nke Mba Ọhụrụ
19. N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji kwuo na amụma Aịsaịa nwere nanị mmezu dị nta na narị afọ nke isii T.O.A.?
19 N’ezie, na narị afọ nke isii T.O.A., Aịsaịa isi nke 35 nwere mmezu dị nta. Ọnọdụ paradaịs nke ndị Juu ahụ lọtaranụ nụrụ ụtọ ya adịteghị aka. Ka oge na-aga, ozizi okpukpe ụgha na ịhụ mba n’anya merụrụ ofufe dị ọcha. N’ụzọ ime mmụọ, ndị Juu ahụ malitere iru újú na ịma ọsụ ọzọ. N’ikpeazụ, Jehova jụrụ ha dị ka ndị ya. (Matiu 21:43) N’ihi nnupụisi ha maliteghachiri, ịṅụrị ọṅụ ha adịteghị aka. Ihe a nile na-ezo aka ná mmezu ọzọ, nke ka ukwuu, nke Aịsaịa isi nke 35.
20. Olee Israel ọhụrụ malitere ịdị na narị afọ mbụ O.A.?
20 Mgbe oge nke Jehova ruru, Israel ọzọ, nke ime mmụọ, malitere ịdị. (Ndị Galetia 6:16) Jisọs doziri ọnọdụ maka ọmụmụ nke Israel ọhụrụ a n’oge ije ozi elu ala ya. O weghachiri ofufe dị ọcha, sitekwa n’ihe ndị ọ kụziri, mmiri nke eziokwu malitekwara iru ọzọ. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ma n’ụzọ anụ ahụ ma n’ụzọ ime mmụọ. E tiri mkpu ọṅụ ka a na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. Izu asaa mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube guzobere ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ Israel ime mmụọ nke ihe mejupụtara ya bụ ndị Juu na ndị ọzọ e ji ọbara Jisọs wụsịrị gbata, ndị a mụrụ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke na ụmụnna Jisọs, ndị e jikwa mmụọ nsọ tee mmanụ.—Ọrụ 2:1–4; Ndị Rom 8:16, 17; 1 Pita 1:18, 19.
21. Banyere ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ihe omume dịgasị aṅaa ka a pụrụ ile anya dị ka mmezu nke akụkụ ụfọdụ nke amụma Aịsaịa?
21 Mgbe ọ na-edegara ndị so n’Israel ime mmụọ ahụ akwụkwọ, Pọl onyeozi zoro aka n’okwu ndị dị n’Aịsaịa 35:3 site n’ikwu, sị: “Meenụ aka na-eruda eruda na ikpere nwụworo anwụ ka ha guzozie.” (Ndị Hibru 12:12) Mgbe ahụ, dị ka ihe àmà na-egosi, ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa isi nke 35 mezuru na narị afọ mbụ O.A. N’ụzọ nkịtị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya mere ka ndị ìsì hụ ụzọ, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe n’ụzọ ọrụ ebube. Ha mere ka “ndị ngwụrọ” nwee ike ije ije, ka ndị ogbi kwuokwa okwu. (Matiu 9:32; 11:5; Luk 10:9) Nke ka mkpa, ndị obi ha ziri ezi si n’okpukpe ụgha gbapụ ma malite ịnụ ụtọ paradaịs ime mmụọ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. (Aịsaịa 52:11; 2 Ndị Kọrint 6:17) Dị ka ọ dị n’ihe banyere ndị Juu ahụ si Babilọn na-alọta, ndị a gbara ọsọ chọpụtara na mmụọ enweghị obi abụọ na nke obi ike dị mkpa.—Ndị Rom 12:11.
22. Olee otú ndị Kraịst nwere ezi obi, ndị na-achọ eziokwu n’oge a si ghọọ ndị e ji eji na Babilọn?
22 Gịnị banyere ụbọchị anyị? Amụma Aịsaịa ò nwere mmezu ọzọ, nke zuru ezu karị, nke na-emetụta ọgbakọ ndị Kraịst taa? Ee. Mgbe ndị ozi nwụsịrị, ọnụ ọgụgụ nke ezi ndị Kraịst e tere mmanụ belatara nke ukwuu, ndị Kraịst ụgha kwa, bụ́ “ata,” mụbara n’ụwa. (Matiu 13:36–43; Ọrụ 20:30; 2 Pita 2:1–3) Ọbụna na narị afọ nke 19, mgbe ndị nwere obi eziokwu malitere ikewapụ onwe ha na Krisendọm ma chọọ ofufe dị ọcha, ozizi ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ka mere ka nghọta ha bụrụ ndị e merụrụ emerụ. Na 1914, e mere ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze Mesaịa, ma ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ọnọdụ yiri ihe olileanya na-adịghị na ya nye ndị a ji ezi obi na-achọ eziokwu. Iji mezuo amụma, mba dị iche iche ‘buru agha megide ha, meriekwa ha,’ e gbochikwara mgbalị ndị Kraịst a nwere obi eziokwu mere ikwusa ozi ọma ahụ. Ya bụ, ha ghọrọ ndị e ji eji na Babilọn.—Mkpughe 11:7, 8.
23, 24. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka e siworo mezuo ihe Aịsaịa kwuru n’etiti ndị Chineke kemgbe 1919?
23 Otú ọ dị, na 1919, ihe gbanwere. Jehova napụtara ndị ya n’ojiji e ji ha. Ha malitere ịjụ ozizi ụgha ndị mere ka ofufe ha bụrụ nke e merụrụ emerụ tupu mgbe ahụ. N’ihi ya, a gwọrọ ha. Ha bịara nọrọ na paradaịs ime mmụọ, bụ́ nke nọgidere na-agbasa n’ụwa nile ọbụna taa. N’ụzọ ime mmụọ, ndị ìsì na-amụta ịhụ ụzọ, ndị ntị chiri na-amụtakwa ịnụ ihe—na-aghọ ndị mụ nnọọ anya n’ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke, na-amata mgbe nile mkpa ọ dị ịnọ Jehova nso. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:6; 2 Timoti 4:5) Ebe ha na-abụghịzi ndị ogbi, ọ dị ezi ndị Kraịst ọkụ n’obi ‘iti mkpu,’ na-ekwusara ndị ọzọ eziokwu Bible. (Ndị Rom 1:15) Ndị na-adịghị ike, ma ọ bụ ndị dara “ngwụrọ” n’ụzọ ime mmụọ, na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ ugbu a. N’ụzọ ihe atụ, ha nwere ike ‘ịmali dị ka ele.’
24 Ndị Kraịst a e weghachiri eweghachi na-eje ije ‘n’Ụzọ nke ịdị nsọ.’ “Ụzọ” a, nke si na Babilọn Ukwu ahụ pụta ma banye na paradaịs ime mmụọ, ghere oghe nye ndị nile dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị na-efe ofufe. (1 Pita 1:13–16) Ha pụrụ ịdabere n’ebe Jehova nọ maka nchebe ma nwee obi ike na Setan ga-ada n’ajọ mwakpo ọ na-eme iji kpochapụ ezi ofufe. (1 Pita 5:8) A gaghị ekwe ka ndị nnupụisi na onye ọ bụla na-akpa àgwà ka anụ ọhịa dị irè merụọ ndị nọ n’okporo ụzọ ịdị nsọ nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:11) Na gburugburu ebe a dị nchebe, ndị Jehova gbapụtara—ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ”—na-enweta ọṅụ n’ijere nanị otu ezi Chineke ahụ ozi.—Jọn 10:16.
25. À ga-enwe mmezu nkịtị nke Aịsaịa isi nke 35? Kọwaa.
25 Gịnị banyere ọdịnihu? Ọ̀ dị mgbe a ga-emezu amụma Aịsaịa n’ụzọ nkịtị? Ee. Ọgwụgwọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gwọrọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube na narị afọ mbụ gosiri ọchịchọ na ikike Jehova nwere ịgwọ ọrịa otú ahụ n’ụzọ sara mbara n’ọdịnihu. Abụ Ọma sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu banyere ndụ ebighị ebi n’ọnọdụ dị jụụ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:9, 11, 29) Jisọs kwere nkwa ndụ n’ime Paradaịs. (Luk 23:43) Ruo n’isiakwụkwọ ikpeazụ ya, Bible na-enye olileanya maka paradaịs nkịtị. Mgbe ahụ, a ga-agwọ ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị ngwụrọ, na ndị ogbi n’ụzọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi. Iru újú na ịma ọsụ agaghị adịkwa. Ịṅụrị ọṅụ ga-adị n’ezie ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 7:9, 16, 17; 21:3, 4.
26. Olee otú ihe Aịsaịa kwuru si ewusi ndị Kraịst ike taa?
26 Ka ezi ndị Kraịst nọ na-echere mweghachi nke Paradaịs nkịtị n’elu ala, ọbụna ugbu a ha na-enweta ngọzi nke paradaịs ime mmụọ. Ha na-eji nchekwube na-edi ọnwụnwa na mkpagbu. Site n’inwe ezi obi ike n’ebe Jehova nọ, ha na-agbarịta ibe ha ume, na-aṅa ntị na ndụmọdụ bụ́: “Meenụ aka kụdara akụda ka ha dị ike, gbaakwanụ ikpere na-asụ ngọngọ ume. Sịnụ ndị obi ha na-eme ngwa, Dịnụ ike, unu atụla egwu.” Ha nwere ntụkwasị obi zuru ezu ná mmesi obi ike ahụ e buru n’amụma, sị: “Lee, Chineke unu! ịbọ ọ́bọ̀ na-abịa, bụ́ nkwụghachi nke Chineke; Ya onwe ya ga-abịa zọpụta unu.”—Aịsaịa 35:3, 4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ Nsọ na-akọwa Lebanọn oge ochie dị ka ala na-amị mkpụrụ, nke nwere oké ọhịa na osisi cedar ndị buru ibu, nke a pụrụ iji tụnyere Ogige Iden. (Abụ Ọma 29:5; 72:16; Ezikiel 28:11–13) A ma Sherọn ama n’ihi mmiri iyi na ọhịa osisi oak ya; a ma Kamel ama n’ihi ubi vine, ubi mkpụrụ osisi ya, na mkpọda ugwu ya jupụtara n’okooko osisi.
[Foto dị na peeji nke 370]
[Foto ndị dị na peeji nke 375]
Ebe ndị bụ́ ọzara aghọọ ebe mmiri na-ede nke ọma, ebe amị na papyrus na-eto
[Foto dị na peeji nke 378]
Jisọs gwọrọ ndị ọrịa ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ