-
Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’ỤbaỤlọ Nche—1996 | Jenụwarị 1
-
-
“M ga-agwọtakwa ha; M ga-ekpughekwara ha mbabiga ókè nke udo na eziokwu.”—JEREMAỊA 33:6.
-
-
Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’ỤbaỤlọ Nche—1996 | Jenụwarị 1
-
-
3. Ná mmezu nke ihe ndị Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaịa, ihe ndị dị aṅaa mere n’akụkọ ihe mere eme kụziiri Israel ihe mmụta nke abụọ dị mkpa banyere udo?
3 Otú ọ dị, tupu ọdịda nke Jerusalem, Jehova ekpugheworị na ya, ọ bụghị Ijipt, ga-ewetara Israel ezi udo. Site n’ọnụ Jeremaịa o kwere nkwa, sị: “M ga-agwọtakwa ha; M ga-ekpughekwara ha mbabiga ókè nke udo na eziokwu. M ga-emekwa ka ndị Juda a dọtara n’agha na ndị Israel a dọtara n’agha lata, M ga-ewukwa ha dị ka ụlọ, dị ka na mbụ.” (Jeremaịa 33:6, 7) Nkwa Jehova malitere imezu na 539 T.O.A., mgbe e meriri Babilọn ma nye ndị Israel ahụ a dọtara n’agha nnwere onwe. (2 Ihe Emere 36:22, 23) Ka ọ na-erule n’akụkụ ikpeazụ nke 537 T.O.A., otu ìgwè ndị Israel mere Ememe Ụlọ Ntu n’ala Israel nke mbụ ya n’ime 70 afọ! Mgbe ha mesịrị ememe ahụ, ha malitere iwughachi ụlọ nsọ Jehova. Olee otú nke a dị ha? Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “[Ha] wee tie oké mkpu, mgbe ha toro Jehova, n’ihi na a tọrọ ntọala ụlọ Jehova.”—Ezra 3:11.
-