Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/1 p. 8-17
  • Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’Ụba
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-emezu Nkwa Ya Nile
  • “Ekwoworo M Zaịọn Oké Ekworo”
  • “Obodo Eziokwu”
  • Udo Maka Ndị Jehova
  • Ò Sibigaara Jehova Ike Ókè?
  • “Mụ Onwe M Ga-abụkwara Ha Chineke”
  • “Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/1 p. 8-17

Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’Ụba

“M ga-agwọtakwa ha; M ga-ekpughekwara ha mbabiga ókè nke udo na eziokwu.”—JEREMAỊA 33:6.

1, 2. (a) N’ihe banyere udo, gịnị bụ ihe ndekọ nke mba nile nwere? (b) Na 607 T.O.A., ihe mmụta dị aṅaa ka Jehova kụziiri Israel banyere udo?

UDO! Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe a na-achọsi ike, ma lee ka o siworo dị ụkọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ! Narị afọ nke 20, karịsịa, abụbeghị narị afọ nke udo. Kama nke ahụ, ọ hụwo agha abụọ kasị bibie ihe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, e guzobere Njikọ Mba Nile iji hụ na a nọgidere na-enwe udo ụwa. Òtù ahụ dara ada. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, e guzobere òtù Mba Ndị Dị n’Otu n’ihi otu nzube ahụ. Nanị ihe dị anyị mkpa bụ ịgụ akwụkwọ akụkọ iji hụ otú o sikwa na-adaru ala.

2 Ò kwesịrị iju anyị anya na òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ apụghị iweta udo? Ọ dịghị ma ọlị. Ihe karịrị 2,500 afọ gara aga, a kụziiri ndị Chineke họpụtara, bụ́ Israel, ihe n’akụkụ nke a. Na narị afọ nke asaa T.O.A., ike ụwa nke na-achị, bụ́ Babilọn, yiri udo nke Israel egwu. Israel legaara Ijipt anya maka udo. Ijipt dara ada. (Jeremaịa 37:5-8; Ezikiel 17:11-15) Na 607 T.O.A., ndị agha Babilọn kwadara mgbidi Jerusalem ma suo ụlọ nsọ Jehova ọkụ. Israel si otú a mụta n’ụzọ siri ike ihe nzuzu ọ bụ ịdabere n’òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ. Kama inwe udo, a dọọrọ mba ahụ n’agha gaa Babilọn.—2 Ihe Emere 36:17-21.

3. Ná mmezu nke ihe ndị Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaịa, ihe ndị dị aṅaa mere n’akụkọ ihe mere eme kụziiri Israel ihe mmụta nke abụọ dị mkpa banyere udo?

3 Otú ọ dị, tupu ọdịda nke Jerusalem, Jehova ekpugheworị na ya, ọ bụghị Ijipt, ga-ewetara Israel ezi udo. Site n’ọnụ Jeremaịa o kwere nkwa, sị: “M ga-agwọtakwa ha; M ga-ekpughekwara ha mbabiga ókè nke udo na eziokwu. M ga-emekwa ka ndị Juda a dọtara n’agha na ndị Israel a dọtara n’agha lata, M ga-ewukwa ha dị ka ụlọ, dị ka na mbụ.” (Jeremaịa 33:6, 7) Nkwa Jehova malitere imezu na 539 T.O.A., mgbe e meriri Babilọn ma nye ndị Israel ahụ a dọtara n’agha nnwere onwe. (2 Ihe Emere 36:22, 23) Ka ọ na-erule n’akụkụ ikpeazụ nke 537 T.O.A., otu ìgwè ndị Israel mere Ememe Ụlọ Ntu n’ala Israel nke mbụ ya n’ime 70 afọ! Mgbe ha mesịrị ememe ahụ, ha malitere iwughachi ụlọ nsọ Jehova. Olee otú nke a dị ha? Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “[Ha] wee tie oké mkpu, mgbe ha toro Jehova, n’ihi na a tọrọ ntọala ụlọ Jehova.”—Ezra 3:11.

4. Olee otú Jehova si kpalie ndị Israel ịrụ ọrụ nke iwu ụlọ nsọ, nkwa dịkwa aṅaa ka o kwere banyere udo?

4 Otú ọ dị, ka mmalite ahụ na-enye obi ụtọ gasịrị, ndị mmegide kụdara ndị Israel aka, ha kwụsịkwa ọrụ nke iwu ụlọ nsọ ahụ. Afọ ole na ole n’ihu, Jehova mere ka ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa bilie iji kpalie ndị Israel ịrụtọpụ ọrụ mwughachi ahụ. Lee ka ọ na-aghaghị isiworị bụụrụ ha ihe na-akpali akpali ịnụ ka Hagaị kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ a gaje iwu, sị: “Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: ọ bụkwa n’ebe a ka M ga-enye udo”!—Hagaị 2:9.

Jehova Na-emezu Nkwa Ya Nile

5. Olee ihe dị ịrịba ama banyere Zekaraịa isi nke asatọ?

5 N’akwụkwọ Bible bụ Zekaraịa, anyị na-agụ banyere ọtụtụ ọhụụ na amụma ndị sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị wusiri ndị Chineke ike laa azụ na narị afọ nke isii T.O.A. Otu amụma ndị a nọgidere na-emesi anyị obi ike banyere nkwado Jehova. Ha na-enye anyị ihe nile mere anyị ga-eji kwere na Jehova ga-enyekwa ndị ya udo n’oge anyị. Dị ka ihe atụ, n’isi nke asatọ nke akwụkwọ ahụ bu aha ya, Zekaraịa onye amụma kwupụtara ugboro iri okwu bụ́: ‘Otú a ka Jehova sịrị.’ N’oge nke ọ bụla, okwu ahụ na-eduje ná nkwupụta okwu Chineke nke e jikọtara ya na udo nke ndị Chineke. Ụfọdụ n’ime nkwa ndị a mezuru laa azụ n’ụbọchị Zekaraịa. Ha nile emezuwo ma ọ bụ na-emezu taa.

“Ekwoworo M Zaịọn Oké Ekworo”

6, 7. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si ‘jiri oké ọnụma kwooro Zaịọn ekworo’?

6 Okwu ahụ pụtara nke mbụ ya na Zekaraịa 8:2, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ekwoworo m Zaịọn oké ekworo, ejiwokwa m oké ọnụma kwooro ya ekworo.” Nkwa Jehova ikworo ndị ya ekworo, inwe oké ịnụ ọkụ n’obi maka ha, pụtara na ọ ga-amụrụ anya n’iweghachi udo ha. Mweghachi nke Israel n’ala ya na mwughachi nke ụlọ nsọ ahụ bụ ihe àmà nke ịnụ ọkụ n’obi ahụ.

7 Ma, gịnị banyere ndị megideworo ndị Jehova? Ịnụ ọkụ n’obi ya maka ndị ya na “oké ọnụma” ya n’ahụ ndị iro ndị a ga-aha nhata. Mgbe ndị Juu na-ekwesị ntụkwasị obi fere ofufe n’ụlọ nsọ ahụ e wughachiri, ha ga-enwe ike ịtụgharị uche n’ihe ọjọọ dakwasịrị Babilọn ahụ dị ike, nke daworo ugbu a. Ha ga-enwekwa ike iche echiche banyere oké ọdịda nke ndị iro ahụ gbalịrị igbochi mwughachi nke ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 4:1-6; 6:3) Ha ga-enwekwa ike ikele Jehova na o mezuwo nkwa ya. Ịnụ ọkụ n’obi ya wetaara ha mmeri!

“Obodo Eziokwu”

8. N’ụbọchị Zekaraịa, olee otú Jerusalem ga-esi ghọọ obodo nke eziokwu n’ụzọ dị iche n’oge mbụ?

8 Nke ugboro abụọ Zekaraịa na-ede, sị: “Otú a ka Jehova sịrị.” Olee ihe ndị Jehova kwuru n’oge a? “Alaghachiwo m na Zaịọn, M ga-ebikwa n’etiti Jerusalem: a ga-akpọkwa Jerusalem Obodo eziokwu; a ga-akpọkwa ugwu nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha Ugwu nsọ.” (Zekaraịa 8:3) Tupu 607 T.O.A., ọ dịghị ụzọ ọ bụla Jerusalem si bụrụ obodo eziokwu. Ndị nchụàjà ya na ndị amụma ya rụrụ arụ, ndị ya adịghịkwa ekwesị ntụkwasị obi. (Jeremaịa 6:13; 7:29-34; 13:23-27) Ugbu a ndị Chineke na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ, na-egosi nrara ha raara onwe ha nye n’ofufe dị ọcha. Jehova birighachiiri n’ime mmụọ na Jerusalem. E kwughachikwara eziokwu nile nke ofufe dị ọcha n’ime ya, ya mere a pụrụ ịkpọ Jerusalem “Obodo eziokwu.” A pụrụ ịkpọ ọnụnọ ọ nọ n’ebe dị elu “ugwu nke Jehova.”

9. Mgbanwe ọnọdụ dị aṅaa nke dị ịrịba ama ka “Israel nke Chineke” nwere na 1919?

9 Ọ bụ ezie na nkwupụta okwu abụọ a nwere ihe ndị ha pụtara nye Israel oge ochie, ha nwekwara ihe dị ukwuu ha pụtara nye anyị ka narị afọ nke 20 na-abịa ná ngwụsị. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 afọ gara aga, n’oge Agha Ụwa Mbụ, puku mmadụ ole na ole ahụ e tere mmanụ ndị nọchitere anya “Israel nke Chineke” n’oge ahụ banyere ná ndọta n’agha ime mmụọ dị nnọọ ka Israel oge ochie banyere ná ndọta n’agha na Babilọn. (Ndị Galetia 6:16) N’ụzọ amụma, a kọwara ha dị ka ozu ndị tọgbọ n’okporo ámá. Ma, ha nwere ọchịchọ sitere n’obi eziokwu ife Jehova “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Ya mere, na 1919, Jehova tọpụrụ ha ná ndọta n’agha, na-akpọlite ha n’ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ ha. (Mkpughe 11:7-13) Jehova si otú a zaa Ee na-ada ụda nye ajụjụ amụma nke Aịsaịa: “Ìme ala ga-eme ya n’otu ụbọchị? à ga-amụ mba n’otu mgbe?” (Aịsaịa 66:8) Na 1919, ndị Jehova dịghachikwara ọzọ dị ka otu mba ime mmụọ ‘n’ala’ nke aka ha, ma ọ bụ ógbè ime mmụọ dị n’elu ala.

10. Malite na 1919, ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmadụ nọworo na-enweta ‘n’ala’ ha?

10 N’ịnọ ná nchebe n’ala ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ jere ozi n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova. A kpọrọ ha “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-anakwere ibu ọrụ nke ilekọta ihe onwunwe Jisọs n’elu ala, bụ́ ihe ùgwù nke ha ka nwere ka narị afọ nke 20 na-abịa ná njedebe ya. (Matiu 24:45-47) Ha mụtara nke ọma na Jehova bụ “Chineke nke udo.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:23.

11. Olee otú ndị ndú okpukpe nke Krisendọm siworo gosipụta onwe ha ịbụ ndị iro nke ndị Chineke?

11 Ma, gịnị banyere ndị iro Israel nke Chineke? Ịnụ ọkụ n’obi Jehova maka ndị ya na ọnụma ya megide ndị mmegide ahụ hà nhata. N’oge Agha Ụwa Mbụ, ndị ndú okpukpe nke Krisendọm wetara oké nrụgide ka ha gbalịrị—ma daa—n’ikpochapụ ntakịrị ìgwè a nke ndị Kraịst na-ekwu eziokwu. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị ozi nke Krisendọm dị n’otu nanị n’otu ihe: N’akụkụ abụọ ahụ na-alụ agha, ha gbara gọọmenti dị iche iche ume ịbịanyụ Ndịàmà Jehova. Ọbụna taa, n’ọtụtụ ala ndị ndú okpukpe na-akpali gọọmenti dị iche iche igbochi ma ọ bụ ịmachibido ọrụ ime nkwusa ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova iwu.

12, 13. Olee otú e si gosipụta iwe Jehova megide Krisendọm?

12 Jehova ahụla nke a. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, Krisendọm, tinyere ihe fọdụrụ na Babilọn Ukwu ahụ, dara ada. (Mkpughe 14:8) Ịbụ ezie nke ọdịda Krisendọm ghọrọ ihe a mazuuru n’ọha mgbe, malite na 1922, a wụpụrụ usoro ihe otiti ihe atụ, na-ekpughe ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ ya ma na-adọ ya aka ná ntị n’ihu ọha banyere mbibi ya na-abịanụ. (Mkpughe 8:7–9:21) Dị ka ihe àmà na mwụpụ nke ihe otiti ndị a na-aga n’ihu, e kwuru okwu bụ́ “Ọgwụgwụ Okpukpe Ụgha Dị Nso” n’ụwa nile n’April 23, 1995, bụ́ nke nkesa nke ọtụtụ narị nde nke mbipụta pụrụ iche nke Akụkọ Alaeze sochiri.

13 Taa, Krisendọm nọ n’ọnọdụ dị imere ebere. N’ime narị afọ nke 20 nile, ndị òtù ya egburịtawo ibe ha n’ọtụtụ agha ọjọọ ndị ụkọchukwu na ndị ozi ya gọziri. N’ala ụfọdụ ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha enweghị mmetụta ọ bụla. A kara ya akara maka mbibi ya na ihe fọdụrụ na Babilọn Ukwu ahụ.—Mkpughe 18:21.

Udo Maka Ndị Jehova

14. Olee onyoonyo amụma e ji okwu see banyere ndị nọ n’udo?

14 N’aka nke ọzọ, n’afọ a bụ́ 1996, ndị Jehova na-enwe udo dị ukwuu n’ala ha e weghachiri eweghachi, dị ka a kọwara ná nkwupụta okwu nke atọ nke Jehova: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ [n’ámá] nile nke Jerusalem, onye ọ bụla o jide mkpanaka ya n’aka ya site n’ịba ụba nke ụbọchị ndụ ya. Ámá nile nke obodo ahụ ga-ejupụtakwa n’ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom na-egwuri egwú n’ámá ya nile.”—Zekaraịa 8:4, 5.

15. N’agbanyeghị agha nke mba nile, olee udo nke ndị ohu Jehova nweworo?

15 Onyoonyo a na-enye obi ụtọ nke e ji okwu see na-egosi ihe dị ịrịba ama n’ụwa nke a agha bibisịworo—ndị nọ n’udo. Kemgbe 1919, e mezuwo okwu amụma ndị nke Aịsaịa: “Udo, udo, dịịrị onye nọ n’ebe dị anya, dịkwaara onye nọ nso, ka Jehova sịrị; M ga-emekwa ka ahụ dị ya ike. Ma . . . ọ dịghị udo ndị na-emebi iwu nwere, ka Chineke m sịrị.” (Aịsaịa 57:19-21) N’ezie, ndị Jehova, ọ bụ ezie na ha abụghị akụkụ nke ụwa, ha apụghị izere ịbụ ndị ọgba aghara nke mba dị iche iche metụtara. (Jọn 17:15, 16) N’ala ụfọdụ, ha na-atachi obi n’ihe isi ike ndị tara akpụ nke ukwuu, e gbuwokwa ọbụna ole na ole n’ime ha. Ma, ezi ndị Kraịst nwere udo n’ụzọ abụọ bụ isi. Nke mbụ, ha “na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenwe [ha] Jisọs Kraịst.” (Ndị Rom 5:1) Nke abụọ, ha nwere udo n’etiti onwe ha. Ha na-azụlite “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” bụ́ nke “buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo.” (Jemes 3:17; Ndị Galetia 5:22-24) Ọzọkwa, ha na-elepụ anya n’ihu inwe udo n’echiche kasị zuo ezu mgbe “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.

16, 17. (a) Olee otú “agadi ndị ikom na agadi ndị inyom” tinyere ‘ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom’ siworo wusie nzukọ Jehova ike? (b) Olee ihe na-egosipụta udo nke ndị Jehova?

16 A ka nwere “agadi ndị ikom na agadi ndị inyom” n’etiti ndị Jehova, ndị e tere mmanụ bụ́ ndị na-echeta mmeri ndị mbụ nke nzukọ Jehova. E nwere mmasị dị ukwuu n’ikwesị ntụkwasị obi na ntachi obi ha. Ndị e tere mmanụ na-akatabeghị ahụ butere ụzọ n’ụbọchị ndị ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nke afọ ndị 1930 na Agha Ụwa nke Abụọ, nakwa n’afọ uto ndị na-enye obi ụtọ ndị sochiri. Ọzọkwa, karịsịa kemgbe 1935, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ egosipụtawo onwe ya. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ebe ndị Kraịst e tere mmanụ meworo okenye karị, dịkwa ole na ole karị, atụrụ ọzọ ahụ ewerewo ọrụ ime nkwusa, ha agbasawokwa ya n’ụwa nile. N’afọ ndị na-adịbeghị anya atụrụ ọzọ anọwo na-enuba n’ala nke ndị Chineke. Leenụ, n’afọ gara aga nanị, e mere 338,491 n’ime ha baptism ná ngosipụta nke nrara ha nye Jehova! Ndị ọhụrụ dị otú ahụ bụ n’ezie ndị na-eto eto, n’ụzọ ime mmụọ. E ji ịdị ọhụrụ ha na ịnụ ọkụ n’obi ha kpọrọ oké ihe ka ha na-amụba ọnụ ọgụgụ nke ndị na-abụrụ “Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, [nakwa] Nwa atụrụ ahụ” abụ otuto nke obi ekele.—Mkpughe 7:10.

17 Taa, ‘ámá nile jupụtara n’ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom,’ Ndịàmà nwere ike yiri ike ụmụ okorobịa. N’afọ ije ozi 1995, e nwetara akụkọ site na 232 ala na àgwàetiti nke oké osimiri. Ma e nweghị ịma aka mba na mba, e nweghị mkpọrịta asị nke ebo, e nweghị ekworo na-ekwesịghị ekwesị, n’etiti ndị e tere mmadụ na atụrụ ọzọ ahụ. Ha nile na-etokọ n’ụzọ ime mmụọ, bụrụ ndị dị n’otu n’ịhụnanya. Òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova pụrụ iche n’ezie n’ime ụwa.—Ndị Kọlọsi 3:14; 1 Pita 2:17.

Ò Sibigaara Jehova Ike Ókè?

18, 19. N’afọ ndị gafeworonụ eri 1919, olee otú Jehova siworo mezuo ihe pụrụ iyiworị ihe sibigara ike ókè n’otú mmadụ si ele ihe anya?

18 Laa azụ na 1918 mgbe ihe mejupụtara ihe fọdụrụ e tere mmanụ bụ nanị puku mkpụrụ obi ole na ole nwere nkụda mmụọ ndị nọ ná ndọta n’agha ime mmụọ, ọ dịghị onye nwere ike ibuworị ụzọ hụ otú ihe ga-esi gaa. Ka o sina dị, Jehova maara—dị ka nkwupụta okwu amụma nke anọ ya mere ka ọ pụta ìhè: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: A sị na ọ dịkarịa ike ime n’anya ndị nke a fọdụrụ n’ụbọchị ahụ, ọ̀ bụkwa n’anya m ka ọ ga-adịkarị ike ime? (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta).”—Zekaraịa 8:6.

19 Na 1919, mmụọ Jehova tụtere ndị ya maka ọrụ dị n’ihu. Ma, ọ ka chọrọ okwukwe iji rapagidesie ike ná ntakịrị nzukọ ahụ nke ndị na-efe Jehova ofufe. Ha dị nnọọ ole na ole, ọtụtụ ihe edoghịkwa anya. Otú ọ dị, nke nta nke nta Jehova wusiri ha ike dị ka otu nzukọ ma kwadebe ha ịrụ ọrụ ndị Kraịst nke ikwusa ozi ọma ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Aịsaịa 60:17, 19; Matiu 24:14; 28:19, 20) Nwayọọ nwayọọ, o nyeere ha aka ịghọta ihe ndị ahụ dị mkpa dị ka nnọpụiche na ọbụbụeze eluigwe na ala. Ò sibigaara Jehova ike ókè iji ìgwè nta ahụ nke Ndịàmà mezuo uche ya? Azịza ya kpọmkwem bụ ee e! E mere ka nke a pụta ìhè na peji nke 12 ruo nke 15 nke magazin a, bụ́ nke depụtara chaatị nke ọrụ Ndịàmà Jehova maka afọ ije ozi 1995.

“Mụ Onwe M Ga-abụkwara Ha Chineke”

20. Ruo n’ókè ha aṅaa ka e buru amụma na nchịkọta nke ndị Chineke ga-eru?

20 Nkwupụta okwu nke ise gara n’ihu gosi ọnọdụ obi ụtọ nke Ndịàmà Jehova taa: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Lee, M gaje ịzọpụta ndị m n’ala Ọwụwa anyanwụ, na n’ala Ọdịda anyanwụ: M ga-emekwa ka ha bịa, ha ga-ebikwa n’etiti Jerusalem: ha ga-abụkwara m otu ndị, Mụ onwe m ga-abụkwara ha Chineke, n’eziokwu na n’ezi omume.”—Zekaraịa 8:7, 8.

21. N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo jigide ma gbasapụ udo bara ụba nke ndị Jehova?

21 Na 1996, anyị pụrụ ikwu n’eleghị anya n’azụ na e kwusawo ozi ọma ahụ n’ụwa nile, site “n’ala Ọwụwa anyanwụ” ruo “n’ala Ọdịda anyanwụ.” E mewo ndị na-eso ụzọ site ná ndị nke mba nile, ha ahụwokwa mmezu nke nkwa Jehova bụ́: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13) Anyị nwere udo n’ihi na Jehova na-ezi anyị ihe. N’iburu nke a n’uche, e bipụtawo akwụkwọ ọgụgụ n’ihe karịrị 300 asụsụ. N’afọ gara aga nanị, a tụkwasịrị 21 asụsụ ndị ọzọ. A na-ebipụtakọ magazin Ụlọ Nche ọnụ ugbu na 111 asụsụ, nakwa Teta! na 54. Mgbakọ dị iche iche nke mba na nke mba nile bụ ngosipụta nke udo nke ndị Chineke n’ihu ọha. Nzukọ kwa izu na-eme ka anyị dị n’otu ma na-enye anyị agbamume iji nọgidesie ike. (Ndị Hibru 10:23-25) Ee, Jehova na-ezi ndị ya ihe “n’eziokwu na n’ezi omume.” Ọ na-enye ndị ya udo. Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi ikere òkè n’udo ahụ bara ụba!

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’oge a, olee otú Jehova siworo ‘jiri oké ọnụma kwooro ndị ya ekworo’?

◻ Olee otú ndị Jehova si enwe udo, ọbụna n’ala ndị agha bibisịrị?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ‘ámá nile si jupụta n’ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom’?

◻ Ndokwa ndị dị aṅaa ka e meworo ka ndị Jehova wee nwee ike ịbụ ndị ọ kụziiri ihe?

[Chaatị dị na peeji nke 12-15]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1995 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Na narị afọ nke isii T.O.A., ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị wughachiri ụlọ nsọ ahụ mụtara na ọ bụ Jehova bụ nanị isi iyi udo nke a pụrụ ịdabere na ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya