ISI NKE IRI NA ABỤỌ
“Ọ́ Bụghị Nke Ahụ Bụ Ịmara M?”
1, 2. Gịnị mere na Jehoyakim ekwesịghị ịrụ ụlọ ahụ ọ rụrụ?
EZE JEHOYAKIM nọ na-ewu ụlọ nke ga-ebu ezigbo ibu. O bu n’obi na ụlọ ahụ ga-abụ ụlọ elu nwere okpukpu abụọ ma ọ́ dịkarịa ala, na ọnụ ụlọ ndị ga-asa mbara. Ụlọ ahụ ga-enwe windo ndị ga-ebu ibu ka ìhè na ikuku ndụ nwee ike ịna-abata n’ime ya nke ọma, nke ga-eme ka ahụ́ ruo eze na ezinụlọ ya ala. A ga-eji osisi sida na-esi ísì ọma nke si Lebanọn chọọ ahụ́ ụlọ ahụ mma. A ga-eji ágbá na-acha uhie uhie a tụbatara atụbata tee ime ụlọ ahụ ka ọ na-egbuke egbuke. Ọ bụ ndị ukwu ná mba ọzọ na-ete ụdị ágbá ahụ n’ụlọ ha.—Jere. 22:13, 14.
2 Ego ole a ga-eji rụọ ụlọ ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ma, ego kọrọ ná mba ahụ n’oge ahụ n’ihi ego ha na-emefu n’ichebe obodo ahụ nakwa n’ihi ụtụ ndị Ijipt manyere ha ịkwụ. (2 Eze 23:33-35) Ma Jehoyakim chọpụtara otú ọ ga-esi arụ ụlọ ọhụrụ ya ahụ. O kweghị akwụ ndị na-arụrụ ya ụlọ ahụ ụgwọ! Jehoyakim ji ha mere ndị ohu. O bu n’obi na ọrụ ha na-arụrụ ya bụ onyinye ha ji akwado ọchịchị ya.
3. Olee ihe dị iche n’àgwà Jehoyakim na nke nna ya, n’ihi gịnịkwa?
3 Chineke si n’ọnụ Jeremaya katọọ Jehoyakim na ọ na-achọ naanị ọdịmma onwe ya.a O chetaara eze ahụ na nna ya bụ́ Eze Josaya gosiri ndị ọrụ na ndị ogbenye obiọma na-enweghị atụ, mesapụkwara ha aka. Josaya kpechitekwara ọnụ ha n’ụlọikpe. Jehova chetaara Jehoyakim otú Josaya si gosi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha obiọma, ma jụọ, sị: “Ọ́ bụghị nke ahụ bụ ịmara m?”—Gụọ Jeremaya 22:15, 16.
4. Gịnị mere ịmara Jehova kwesịrị iji dị gị mkpa?
4 Ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa Setan, ọ dị anyị mkpa ka Jehova na-enyere anyị aka ma na-echebe anyị otú ọ na-emere ndị maara ya nke ọma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịbịarukwu Chineke nso. Anyị kwesịkwara iṅomi àgwà ọma ya ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma. Ma, i nwere ike iche, sị: ‘Olee otú Onye Kraịst ga-esi mara Jehova nke ọma otú ahụ Eze Josaya maara ya?’
IHE ỊMARA CHINEKE PỤTARA
5, 6. (a) Olee ihe ezigbo nna nwere ike ime ka ụmụ ya mụta? (b) Ebe ọ bụ na anyị ma ụzọ Jehova, gịnị ka anyị kwesịrị ime, nke dị iche n’ihe Jehoyakim mere?
5 Chegodị otú ezigbo nna si eme ka ụmụ ya mụta àgwà ọma ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha ahụ na nna ha na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka, o nwere ike ime ka ha na-emesapụ aka. Ha hụ otú o si hụ mama ha n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù, o nwere ike ime ka ha na-akwanyere ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha ùgwù. Ebe ọ bụ na ha na-anụ na nna ha anaghị emegbu mmadụ nakwa na ọ na-akwụwa aka ọtọ n’ihe gbasara ego, o kwesịrị ime ka ha ṅomie àgwà ọma ndị ahụ. N’ezie, ọ bụrụ na ụmụaka ahụ achọpụta àgwà ọma nna ha, o nwere ike ime ka ha ṅomie nna ha ma ha too, na-emeso ndị ọzọ otú ahụ nna ha si eme.
6 N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na Onye Kraịst amara Jehova otú ahụ Josaya maara ya, ọ bụghị naanị na ọ ga-aghọta na Jehova bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ala; ọ ga-agụ Baịbụl ma ghọta otú Chineke si emeso ndị mmadụ omume, nke ga-eme ka ọ chọọ iṅomi Nna ya nke eluigwe. Ka àgwà ya na-egosi kwa ụbọchị na ọ ghọtara ihe dị Chineke mma na ihe ọ kpọrọ asị, ọ ga-ahụkwu Jehova n’anya. Ma onye na-anaghị edebe iwu Chineke agaghị ama ezi Chineke n’ihi na ọ na-ajụ nduzi ya. Onye ahụ yiri Jehoyakim, bụ́ onye tụbara akwụkwọ mpịakọta e dere ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo n’ọkụ.—Gụọ Jeremaya 36:21-24.
Ihe Josaya mere mgbe ọ nụrụ okwu Chineke dị iche n’ihe Jehoyakim mere
7. Gịnị mere i ji kwesị ịchọ ịmara Jehova otú ahụ Eze Josaya maara ya?
7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ejere Chineke ozi dị nsọ, chọọkwa ibi n’ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, anyị kwesịrị ịmara Jehova n’ezie. (Jere. 9:24) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime àgwà Chineke, bụ́ ndị e kwuru banyere ha n’akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere. Ka anyị na-atụle àgwà Chineke ndị a, gbalịa ka ị hụ otú i nwere ike isi mara ya ma ṅomie ya dị ka Eze Josaya mere.
Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na Eze Josaya maara Jehova nke ọma? Olee ihe ịmara Jehova dị ka Josaya si mara ya pụtara?
“OBIỌMA YA NA-ADỊRU MGBE EBIGHỊ EBI!”
8. Gịnị ka okwu Hibru e si sụgharịta “obiọma” ma ọ bụ “ịhụnanya na-adịgide adịgide” pụtara, oleekwa otú e si egosi ya?
8 E nwere okwu Hibru e si sụgharịta “obiọma” ma ọ bụ “ịhụnanya na-adịgide adịgide,” nke bụ́ otu n’ime àgwà e ji mara Chineke. N’ọtụtụ asụsụ, o siri ike ịchọta okwu a ga-eji akọwa ihe niile ọ pụtara. Otu akwụkwọ nke na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na ụzọ ihe atọ e kwesịrị iji kọwaa okwu Hibru ahụ bụ obi ike, iguzosi ike, na ịhụnanya. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na a kọwaa okwu ahụ ma leghara ụzọ ihe atọ ahụ anya, nkọwa ahụ agaghị ezu ezu.” N’ihi ya, mmadụ igosi ụdị obiọma ahụ apụtaghị naanị na ọ bụ ezigbo mmadụ. Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi, ya ana-eme ihe niile o nwere ike ime igboro ha mkpa ha, nke ka nke, mkpa ime mmụọ ha. Isi ihe mere o ji eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru otú ahụ bụ na ọ chọrọ ime ihe dị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile mma.
9. Olee ihe otú Jehova si mesoo ndị Izrel na-egosi?
9 Ụzọ kacha mma a ga-esi ghọta ihe okwu Baịbụl ahụ bụ́ “obiọma” pụtara bụ ịmụ otú Chineke sirila mesoo ezi ndị na-efe ya ofufe kemgbe ụwa. Jehova chebere ndị Izrel ma nye ha nri n’afọ iri anọ ahụ ha nọrọ n’ala ịkpa. N’Ala Nkwa ahụ, Chineke nyere ha ndị ikpe napụtara ha n’aka ndị iro ha ma mee ka ha maliteghachi ife ya ezi ofufe. N’ọtụtụ narị afọ ahụ, Jehova nọnyeere mba Izrel ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe siri ike. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Enwere m ịhụnanya na-adịru mgbe ebighị ebi n’ebe ị nọ. Ọ bụ ya mere m ji were obiọma dọta gị.”—Jere. 31:3.b
10. Olee otú Jehova si egosi obiọma n’otú o si ege ntị n’ekpere, dị ka o meere ndị Juu ahụ nọ na Babịlọn?
10 N’oge anyị a, otú Chineke si egosi obiọma ya na-abara ndị na-efe ya ezigbo uru. Weregodị ihe banyere ekpere dị ka ihe atụ. Jehova na-anụ ekpere niile e ji ezi obi kpee, ma ọ na-akacha ege ntị mgbe ndị ohu ya raara onwe ha nye ya na-ekpeku ya ekpere. Ọ bụrụgodị na anyị ana-ekpe ekpere ruo ọtụtụ afọ banyere otu nsogbu na-ekweghị ala ala, ọ gaghị eme ka Chineke wewere anyị iwe ma ọ bụ mee ka ike gwụ ya ige ntị n’ekpere anyị. E nwere mgbe Jehova dunyere Jeremaya ka ọ gaa zie ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ozi. Isi ebe ahụ ha nọ ruo ụlọ nsọ Chineke karịrị narị kilomita asatọ, nke dị ezigbo anya na Juda, bụ́ ebe ndị ikwu na ibe ha bi. Ma o meghị ka Jehova ghara ịnụ arịrịọ ha na-arịọ ka o meere ha amara nakwa otuto ha na-eto ya. Buru ekpere ndị i ji obi gị dum kpekuo Jehova n’obi ma chee otú obi dị ndị Juu ahụ mgbe ha nụrụ ihe Chineke kwuru, nke e dere na Jeremaya 29:10-12.—Gụọ ya.
11, 12. (a) Gịnị ka Jehova kwuru na ọ ga-emere ndị bi na Jeruselem? (b) Olee enyemaka onye a dọrọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị nwere ike inweta?
11 Ihe ọzọ gosiri na Jehova nwere obiọma bụ na o nwere olileanya na ndị ya ga-agbanwe. Ka mbibi Jeruselem na-eru nso, ndị bi na ya ana-enupụkwara Chineke isi, olee ihe ga-eme ha n’ọdịnihu? Ọ̀ ga-abụ na ụnwụ nri ma ọ bụ ndị Babịlọn nwere ike igbu ha? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere ike ịdọrọ ha n’agha laa mba ọzọ, ha anọọ ọtụtụ afọ n’ebe ahụ, ma eleghị anya nwụọ n’ebe ahụ. Ma Jehova kwuru “okwu ọma,” nke bụ́ ihe ọma ọ ga-emere ndị chegharịrịnụ ma gbanwee ndụ ha. O kwere nkwa na ya “ga-elebara ha anya.” Ọ ga-eme ka ha si na Babịlọn dị anya lọta n’ala ha. (Jere. 27:22) Ọ bụ ya mere ha ga-eji tie mkpu, sị: “Toonụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’ihi na Jehova dị mma; n’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi!”—Jere. 33:10, 11.
12 N’ihi obiọma Jehova, ọ na-agba ndị mmadụ ume, ya bụ, ndị nsogbu ha siri ezigbo ike n’anya mmadụ. Taa, e nwere ụfọdụ ndị nọbu n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ma e mechaa dọọ ha aka ná ntị nke kwesịrị ekwesị. Obi ha nwere ike ịna-ama ha ezigbo ikpe, mee ka ha ghara ịchọ ịlaghachite n’ọgbakọ. Ha nwere ike ịna-eche ma Jehova ọ̀ ga-agbaghara ha ma nabata ha. Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile nwere “okwu ọma” ọ na-agwa ụdị ndị ahụ. O nwere ike iji obiọma nyere ha aka ịgbanwe echiche ọ bụla ma ọ bụ àgwà ọ bụla ha kwesịrị ịgbanwe. E nwere ike ikwu na ihe ahụ e kwuru na paragraf bu ụzọ banyere ndị Juu gbasara ha, nke bụ́ na Jehova ‘ga-eme ka ha lọghachi’ n’etiti ndị ya nwere obi ụtọ.—Jere. 31:18-20.
13. Gịnị mere otú ahụ Jehova si kwado Jeremaya kwesịrị iji gbaa gị ume?
13 Ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke obiọma, ọ na-akwado ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ugbu a ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-akwado ma na-echebe ndị niile bu ụzọ na-achọ Alaeze ya. Cheta na mgbe ọ fọrọ obere ka e bibie Jeruselem, Jeremaya tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga na-enye ya nri ma na-echebe ya. O nweghị mgbe Chineke hapụrụ onye amụma ahụ. (Jere. 15:15; gụọ Abụ Ákwá 3:55-57.) Ọ bụrụ na e nwere otú ọ bụla ihe si na-esiri gị ezigbo ike, ka obi sie gị ike na Jehova na-echeta isi ị na-erubere ya. N’ihi obiọma ya, ọ chọrọ ịna-akwado gị ka i merie ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị.—Tụlee Abụ Ákwá 3:22.
Gịnị kacha amasị gị n’otú Jehova si egosi obiọma? Olee ihe mere i ji chee otú ahụ?
“DỊ NNỌỌ KA JEHOVA DỊ NDỤ . . . N’IKPE ZIRI EZI!”
14. Olee ikpe na-ezighị ezi ị hụrụla n’oge na-adịbeghị anya?
14 A na-atụ ụfọdụ ndị mkpọrọ ọtụtụ afọ n’ihi ihe ọjọọ ọ na-abụghị ha mere. E nweekwala ọtụtụ mgbe ụlọikpe mara mmadụ ikpe ọnwụ, ma mgbe e gbuchara onye ahụ, a chọpụta na aka ya dị ọcha. Ná mba ụfọdụ, e nwere ndị nne na nna na-ahụghị tụrụ rachaa, nke na-eme ka ha ree ụmụ ha ịga gbawa ohu ka ezinụlọ ha nwee ike inweta ihe ha ga na-eri. Olee otú obi na-adị gị mgbe ị nụrụ banyere ikpe na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ taa? Olee otú i chere obi na-adị Jehova? Baịbụl mere ka o doo anya na ọ chọrọ iwepụ ihe niile na-akpata ahụhụ. Ọ bụ naanị ya ga-emeli ya. N’ihi ya, ndị ogbenye na ndị aka ha dị ọcha, bụ́ ndị na-ata ahụhụ taa, kwesịrị ịkara obi. E nwere ihe ụfọdụ Jehova, bụ́ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, na-eme ugbu a iji napụta ha n’ahụhụ ha na-ata ugbu a.—Jere. 23:5, 6.
15, 16. (a) Olee ihe Jeremaya kwuru banyere ụdị onye Jehova bụ? (b) Gịnị mere i ji kwesị ịtụkwasị iwu Chineke na nkwa ya obi?
15 N’oge Jeremaya, ụfọdụ ndị maara àgwà Chineke nke magburu onwe ya, nke bụ́ ikpe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, onye amụma ahụ kwuru na Izrel nwere ike ichegharị ná mmehie ha. Ha ga-ekwu ihe ga-egosi na ha echegharịala n’eziokwu, sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ n’eziokwu, n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume!” (Jere. 4:1, 2) Nke ahụ bụ eziokwu n’ihi na Jehova achọghị ka a na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ma e nwere ihe ndị ọzọ na-egosi na Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.
16 O doro anya na Chineke na-eme ihe o kwuru, ọ dịghịkwa ihu abụọ. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị anaghị emezu nkwa ha kwere ndị ọzọ, Jehova anaghị eme otú ahụ. Chineke nyere ihe ndị dị ka anyanwụ, ọnwa na kpakpando iwu ha na-anaghị ada ada. Iwu ndị ahụ na-abara anyị uru. (Jere. 31:35, 36) Anyị kwesịrị ịtụkwasị nkwa ya na mkpebi ikpe ya obi n’ihi na ha na-aba uru mgbe niile.—Gụọ Abụ Ákwá 3:37, 38.
17. (a) Olee ihe Jehova na-eme mgbe ọ na-ekpe ikpe? (b) Gịnị mere i ji kwesị ịtụkwasị ndị okenye obi mgbe ha na-edozi nsogbu ndị e nwere n’ọgbakọ? (Gụọ igbe dị na peeji nke 148, bụ́ “Ha Na-ekpere Jehova Ikpe.”)
17 Ihe Jehova na-eji ekpe ikpe abụghị naanị ihe anya na-ahụ. Ọ na-eleba anya n’ihe a na-anaghị ahụ anya iji mata ihe niile merenụ. Ọ na-atụlekwa ihe mere ndị a na-ekpe ikpe ji mee ihe ha mere. Taa, ndị dọkịta nwere ike iji nkà na ngwá ọrụ ndị e ji ele obi lee obi onye ọrịa mgbe ọ na-akụ kpim kpim. Ha na-esi otú ahụ amata ma onye ahụ ò nwere ọrịa obi. Ha nwekwara ike inyocha akụrụ, nke na-aza ọbara mmadụ. Jehova na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-enyocha obi ihe atụ na ihe mmadụ bu n’obi. Ọ na-enyochakwa akụrụ ihe atụ, ya bụ, ihe mmadụ na-eche n’ime ime obi ya. Ọ na-esi otú ahụ achọpụta ihe mere mmadụ ji mee ihe o mere nakwa otú obi dị ya n’ihi ihe o mere. Ọ bụrụ na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile achọpụta ọtụtụ ihe mgbe o mechara nnyocha ya, ọ naghị agba ya gharịị. Ọ na-eji ihe ahụ niile ọ chọpụtara ekpe ikpe ziri ezi karịa otú onyeikpe ọ bụla kacha mara ihe si ekpe. Ọ na-ejikwa ha eme ihe kwesịrị ekwesị iji chọpụta ọdịnihu anyị.—Gụọ Jeremaya 12:1a; 20:12.
18, 19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị ghọtara na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi?
18 N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere ị ga-eji tụkwasị Jehova obi, ọ bụrụgodị na akọnuche gị na-ama gị ikpe mgbe ụfọdụ n’ihi ihe i mejọrọ n’oge gara aga. Echefula na Jehova abụghị ọkàiwu na-esi ọnwụ, nke na-achọ ihe ọ ga-aghọgide aka taa mmadụ ahụhụ. Kama nke ahụ, ọ bụ Onyeikpe nwere ọmịiko, nke chọrọ inyere ndị mmadụ aka. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi ma ọ bụ ihe i mere n’oge gara aga ma ọ bụkwanụ ihe onye ọzọ mere gị, rịọ Jehova ka o ‘kpechite ọnụ gị’ ma ọ bụ mee ka obi dajụọ gị, ka i nwee ike ichefu okwu ahụ.c Chineke nwere ike inyere gị aka ịghọta na ya ji ozi dị nsọ ị na-ejere ya kpọrọ ihe nke ukwuu.—Gụọ Abụ Ákwá 3:58, 59.
19 O doro anya na Chineke, bụ́ onye ikpe ziri ezi ya zuru okè, chọrọ ka ndị chọrọ ka ha na ya dị ná mma na-ekpe ikpe ziri ezi. (Jere. 7:5-7; 22:3) Ikwusara mmadụ niile ozi ọma n’akpaghị ókè bụ ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị na-eṅomi ikpe ziri ezi nke Chineke. Ọ bụrụ na i ji obi gị dum na-eme nletaghachi ma na-eduzi ọmụmụ Baịbụl, ị na-eṅomi ikpe ziri ezi nke Chineke otú ọ ga-abara ndị ọzọ uru n’ezie. Olee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu? Chineke chọrọ ka ụdị mmadụ niile mata ụdị onye ọ bụ nakwa ka a zọpụta ha. (Ákwá 3:25, 26) I nwere ihe ùgwù ịbụ onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ, nke na-eme ka ị na-eṅomi ikpe ziri ezi ya n’ọrụ ahụ e ji azọpụta ndị mmadụ!
Olee otú ikpe ziri ezi Jehova si akasi gị obi? Olee otú ị ga-esi kasie ndị ọzọ obi iji gosi na ị na-eṅomi ikpe ziri ezi nke Chineke?
“AGAGHỊ M EBU IWE N’OBI RUO MGBE EBIGHỊ EBI”
20. (a) Gịnị ka Jeremaya mere ka o doo anya banyere otú Jehova si emeso ndị mmadụ? (b) Olee otú Jehova si ‘agbanwe obi ya’ nke na-emetụta otú o si agbaghara mmehie? (Gụọ igbe bụ́ “Olee Otú Jehova Si ‘Agbanwe Obi Ya’?”)
20 Ọtụtụ ndị chere na naanị ihe dị n’akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá bụ ikpe a mara ndị Juu n’ihi ihe ọjọọ ha mere. Ihe ndị na-eche otú ahụ na-eleghara anya bụ na akwụkwọ ndị ahụ kwukwara na Jehova gwara ndị ya na ya ga-eji obi ụtọ gbaghara ha ma ọ bụrụ na ha echegharịa. Ọ gbara ndị Juu ahụ ume, sị: “Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.” N’oge ọzọ, Jeremaya gwara ha, sị: “Meenụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma, rubekwanụ isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru, Jehova ga-agbanwekwa obi ya n’ọdachi ahụ o kwuru ga-adakwasị unu.” (Jere. 18:11; 26:13) N’oge anyị a, Jehova ka na-agbaghara ndị niile ji obi ha dum kwaa ụta maka mmehie ha ma kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme.
21. Gịnị mere Jehova ji agbaghara mmadụ mmehie?
21 Ma ọ bụghị naanị n’ọnụ ka Jehova na-ekwu banyere mgbaghara. Ọ na-eme ihe o kwuru. Jehova si n’ọnụ Jeremaya gbaa ndị ya ume, sị: “Lọghachi, gị Izrel bụ́ onye nnupụisi . . . Agaghị m agbarụrụ unu ihu . . . Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi.” (Jere. 3:12) Ọ bụrụ na Chineke agbaghara onye ọ bụla na-efe ya, ọ naghị eburu onye ahụ iwe n’obi. Kama nke ahụ, Jehova na-achọ ka ya na onye ahụ dịghachi ná mma n’agbanyeghị na onye ahụ mere ihe ọjọọ. N’agbanyeghị mmehie onye ahụ mere, ọ bụrụ na o chegharịa n’ezie ma chọọ mgbaghara Chineke, Jehova ‘ga-akpọrọghachi ya,’ ka ya na ya dị ná mma, ka ọ na-agọzikwa ya. (Jere. 15:19) Okwu ahụ na-akasi obi kwesịrị ịgba onye ọ bụla hapụrụ ezi Chineke ume ịlọghachikwute ya. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na otú Jehova si agbaghara mmehie kwesịrị ime ka anyị bịaruo ya nso?—Gụọ Abụ Ákwá 5:21.
22, 23. Gịnị ka i kwesịrị ibu n’obi ka ị na-eṅomi Jehova n’ịgbaghara ndị ọzọ?
22 Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe mgbe o kwuru okwu ma mee ihe n’echeghị echiche, ị̀ ga-eṅomi Jehova? Chineke kwuru banyere ndị Juu oge ochie na ya “ga-asachapụ” njehie nke ndị ọ gbaghaara mmehie ha. (Gụọ Jeremaya 33:8.) O nwere ike ịsachapụ mmehie ndị ahụ chegharịrịnụ, nke pụtara ichefu mmehie ha. Ọ ga-adị ka onye ahụ ọ̀ malitere ijere ya ozi ọhụrụ. N’eziokwu, ọ bụrụ na Chineke agbaghara mmadụ mmehie ya, ọ pụtaghị na ọ sachapụla mmehie onye ahụ bu pụta ụwa, mee ka onye ahụ zuo okè. Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Chineke kwuru banyere ịsachapụ mmehie ụmụ mmadụ. Anyị kwesịrị ịgbalị ichefu ihe ọjọọ mmadụ mere anyị, ya bụ, gbanwee otú anyị si ele onye ahụ anya. N’ihi gịnị?
23 Ka e were ya na e nyere gị uwe mara ezigbo mma. Ọ bụrụ na uwe ahụ eruo unyi, ihe ị ga-eme ozugbo ọ̀ bụ ịtụfu ya? O yiri ka ị gaghị eme otú ahụ. Ma eleghị anya, ị ga-agbalịsi ike sachapụ unyi ọ bụla dị na ya. Ị chọrọ ka uwe ahụ maa mma otú ahụ ọ maburu ma na-egbuke egbuke. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na nwanna gị emejọọ gị, i kwesịrị ịgbalịsi ike ịkwụsị iwe ọ bụla ị na-ewere ya, nke na-ekweghị apụ gị apụ n’obi. Ebula ihe onye ahụ mere gị n’obi ma ọ bụkwanụ okwu ọjọọ ọ gwara gị. Ọ bụrụ na i chefuo ihe ndị ahụ, ọ ga-eme ka ị gbanwee otú i si ele onye ahụ ị gbaghaara anya nakwa ihe i bu n’obi banyere ya. Ebe ọ bụ na i meela ka ihe na-ezighị ezi ị na-eche banyere onye ahụ pụọ gị n’obi, ọ ga-eme ka ọ dịrị unu mfe ịbụghachi ezigbo enyi.
24, 25. Olee uru ndị ị ga-erite ma ọ bụrụ na ị mara Jehova otú ahụ Eze Josaya si mara ya?
24 Anyị atụleela ụfọdụ n’ime àgwà Jehova na otú o si emeso ndị mmadụ omume, bụ́ ihe ndị anyị na-amụta ka anyị na-amatakwu ụdị onye ọ bụ. Anyị achọpụtala na uru ndị anyị na-erite n’ịmara Jehova nke ọma ga-eme ka anyị na-efe ya otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya. Ọ bụrụ na anyị amata Jehova nke ọma otú ahụ Eze Josaya maara ya, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ, nke bụ́ àgwà ọzọ Chineke nwere.
25 Ọ bụrụ na anyị amarakwuo Jehova, ọ ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike na-eṅomi Jehova, ya bụ, na-eme obiọma, na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-agbaghara ndị ọzọ, anyị na ndị nọ n’ọgbakọ ga-adịkwu ná mma, anyị ejirikwa ha kpọrọkwuo ihe. Anyị ga-achọpụtakwa na ọ ga-eme ka anyị na-akụzikwu ihe nke ọma mgbe anyị gara nletaghachi n’ókèala anyị ma na-eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl, ha ana-enwe ọganihu. Ahụ́ ga-erukwu ndị nwere mmasị ala mgbe ha hụrụ otú anyị si ebi ndụ e ji mara Ndị Kraịst. N’ihi ya, anyị ga-adịkwu njikere inyere ha aka ife Jehova otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya, nke bụ́ ije ije ‘n’ezi ụzọ’ ahụ.—Jere. 6:16.
Olee ihe Abụ Ákwá 5:21 na-akụziri gị?
a Gụọ Isi nke Anọ, paragraf nke iri na abụọ n’akwụkwọ a ka ị hụ ihe ọjọọ mechara mee Jehoyakim.
b Otú otu Baịbụl si sụgharịa ihe ahụ Jehova kwuru bụ: “Ahụrụ m gị n’anya nke ukwuu kemgbe oge ochie, m ka ga na-elekọtakwa gị.” (The New English Bible).
c Ọ bụrụ na nwanna emebie iwu Chineke, e kwesịrị ịgwa ya ndị okenye ọgbakọ ka ha lebara okwu ahụ anya ma jiri Akwụkwọ Nsọ nyere onye ahụ aka.—Jems 5:13-15.