Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Ndị mmụọ ozi bụ mmụọ, ha enweghị anụ ahụ nkịtị, ya mere, n’ihi gịnị ka unu ji egosi ha n’ihe osise dị ka ndị nwere nkù? Nke a ọ̀ bụ omenala okpukpe efu?
Anyị na-egosikarị ndị mmụọ ozi ebe ha nwere nkù n’ihi nkọwa ihe atụ ndị a na-ahụ na Bible.
I ziri ezi n’ikwu na ndị mmụọ e kere eke adịghị enwe anụ ahụ ndị nwere nkù nkịtị—nke ha ji enwe ihu, aka, ụkwụ, ma ọ bụ akụkụ ahụ ndị ọzọ. Ma n’oge ụfọdụ, mgbe ndị mmụọ ozi bịakwutere ndị ohu Chineke, ọ ghaghị ịbụworị na ha dị ka ndị mmadụ nkịtị, n’ihi na e chere na ha bụ ndị mmadụ.—Jenesis 18:2, 22; 19:1; Ndị Ikpe 6:11-22.
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-anata ọhụụ banyere ndị mmụọ ozi ma na-akọwa ha. Onye amụma ahụ bụ Ezikiel hụrụ “ihe anọ dị ndụ,” n’ọhụụ ọzọ o mesịkwara hụ, ọ kọwara ndị a dị ka ndị mmụọ ozi nọ n’ọkwá nke a maara dị ka ndị cherub. (Ezikiel 1:5; 9:3; 10:3) Nke ọ bụla ná ndị mmụọ ozi ndị a nwere nkù anọ, bụ́ nke na-egosi ikike ha nwere ịzaghachi ngwa ngwa n’akụkụ ọ bụla ebe Chineke nyere ha iwu ịga. “Ha adịghị agha anya n’azụ mgbe ha na-aga; ha na-aga n’ihu . . . Ebe ọ bụla mmụọ Chineke nwere ije ka ha na-aga; ha adịghị agha anya n’azụ mgbe ha na-aga.”—Ezikiel 1:6, 9, 12.
Ma ndị mmụọ ozi a na-ahụ n’ọhụụ adịghị adị n’otu ụdị mgbe nile. Ndị mmụọ ozi ahụ e kere eke ndị Aịsaịa hụrụ bụ́ ndị a kpọrọ ndị seraf nwere nkù isii. (Aịsaịa 6:1, 2) Ọbụna na e nwere ọdịiche ndị dị n’etiti ọhụụ dị iche iche nke Ezikiel. Na nke mbụ, ndị mmụọ ozi ahụ nwere ụkwụ, aka n’okpuru nke ọ bụla n’ime nkù ndị ahụ, na ihu anọ (dị ka ihu nke mmadụ, ọdụm, oké ehi, na ugo). N’ọhụụ ya nke na-eso, otu n’ime ihu ndị ahụ yiri nke cherub kama ịdị ka nke oké ehi, eleghị anya iji gosi ikike dị ukwuu nke ndị cherub nwere. N’ọhụụ ọzọkwa o mesịrị hụ nke ihe ịchọ mma ndị e nwere n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ, Ezikiel hụrụ ndị cherub nwere nanị ihu abụọ, otu nke mmadụ na nke ọzọ nke ọdụm. (Ezikiel 1:5-11; 10:7-17; 41:18, 19) N’Ebe Kachasị Nsọ nke ụlọ ikwuu ahụ, nakwa ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru na Jerusalem, e nwere ndị cherub nwere nkù abụọ. Ndị a nọ n’elu ihe mkpuchi ọlaedo nke akpati ahụ a kpọrọ igbe ọgbụgba ndụ. Cherub abụọ ndị ahụ e ji ọlaedo mee na-echerịta onwe ha ihu, nke ọ bụla nwekwara nkù abụọ na-ekpuchite elu Igbe ahụ. (Ọpụpụ 25:10-22; 37:6-9) N’elu Igbe ahụ (na ihe mkpuchi ya) n’ụlọ nsọ Solomọn, e nwere cherub abụọ ndị buru ibu karị e ji ọlaedo mee elu ahụ ha, ndị na-eguzo n’elu ya, nke ọ bụla n’ime ha nwekwara nkù ndị gbasapụrụ agbasapụ.—1 Ndị Eze 8:6-8; 1 Ihere Emere 28:18; 2 Ihe Emere 5:7, 8.
Josephus dere, sị: “Banyere ndị cherub [ahụ] n’onwe ha, ọ dịghị onye pụrụ ikwu ma ọ bụ chee echiche banyere ihe ha dị ka ya.” N’ihi nke a, ụfọdụ ndị mmụta na ndị ọkà n’ise ihe na-ese ndị mmụọ ozi (karịsịa ndị cherub), na-adabere n’ihe a kpọrọ ihe nlereanya mgbe ochie nke Nso Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke chi ndị dị n’ụdịdị nke anụ ndị nwere nkù. Ma ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya karị bụ okwu Ezikiel kwuru na ndị ahụ ya hụrụ nwere “oyiyi mmadụ.” (Ezikiel 1:5) Ya mere mgbe e sepụtara ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe n’akwụkwọ anyị, anyị na-esekarị ha kpọmkwem n’ụdịdị nke mmadụ. Anyị na-esenye nkù n’ahụ ha n’ihi ọtụtụ nkọwa Bible ndị e nyere banyere ọtụtụ mmụọ ozi dịgasị iche iche dị ka ndị nwere nkù na n’ihi okwu ndị e kwuru banyere ndị mmụọ ozi ‘ifegharị efegharị.’—Mkpughe 14:6; Abụ Ọma 18:10.
N’ikpeazụ, peji 288 nke akwụkwọ bụ Revelation—Its Grand Climax At Hand! na-egosipụta ihe e kere eke bi n’eluigwe nke nwere nkù, na-enwe okpueze n’isi ya nakwa mkpịsị ugodi n’aka ya. Nke a bụ ihe osise nke na-egosipụta kpọmkwem ihe dị ná Mkpughe 20:1: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ.” Anyị na-aghọta mmụọ ozi nke a ji mkpịsị ugodi ịbụ Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube. Ihe osise ahụ na-egosi ya ịbụ onye nwere nkù iji kwekọọ n’eziokwu ahụ bụ na ndị mmụọ ozi a hụrụ n’ọhụụ na-enwekarị nkù.